Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụjọ Atụghị Anyị n’Ihi na Jehova Nọnyeere Anyị

Ụjọ Atụghị Anyị n’Ihi na Jehova Nọnyeere Anyị

Ụjọ Atụghị Anyị n’Ihi na Jehova Nọnyeere Anyị

Dị ka Egyptia Petridou si kọọ

N’afọ 1972, Ndịàmà nọ na Saịprọs niile gbakọtara na Nicosia ịnụrụ okwu ihu ọha pụrụ iche nke Nathan H. Knorr, bụ́ onye lekọtawarala ọrụ Ndịàmà Jehova ogologo oge tupu mgbe ahụ, kwuru. Nwanna Knorr matara m ozugbo ọ hụrụ m. Tupudị mụ akọwaara ya onye m bụ, ọ jụrụ m, sị: “È nwere ozi ọ bụla si Ijipt?” Ọ bụ afọ iri abụọ gara aga ka mụ na Nwanna Knorr hụrụ n’obodo m bụ́ Alexandria nke dị n’Ijipt.

A MỤRỤ m n’Alexandria na January 23, 1914. Abụ m nke mbụ n’ime ụmụ anọ mama m na papa m mụrụ. Osimiri dị nso n’ebe anyị bi. N’oge ahụ, Alexandria bụ obodo mara mma ebe ndị si n’obodo dị iche iche bi, a maara ya nke ọma n’ihi ụlọ ndị bụ́ ọkpọka a rụrụ na ya nakwa n’ihi na ọ bụ obodo dịwara kemgbe gboo. Ebe ọ bụ na ndị Yurop na ndị Arab na-ebikọ, mụ na ụmụnne m mụtara ịsụ Arabic, Bekee, French, na Italian, tinyekwara asụsụ ezinụlọ anyị na-asụ bụ́ Grik.

Mgbe m gụchara akwụkwọ, achọtara m ọrụ n’otu ụlọ ọrụ na-adụ ákwà nke ndị French nwe, bụ́ ebe m nọ dụọrọ ụmụ nwaanyị ndị oko ozu ákwà. Ejighị m okpukpe m egwurị egwu, ana m enwekwa mmasị ịgụ Baịbụl n’agbanyeghị na anaghị m aghọtacha ihe m na-agụ.

N’ihe dị ka n’afọ 1935, amatara m otu ọmarịcha nwa okorobịa bụ́ onye Saịprọs. Aha ya bụ Theodotos Petrides. Ọ bụbu ọkà mgba, ọ makwa otú e si eme bred, ọ na-arụkwa ọrụ n’otu ụlọ ọrụ a ma ama na-eme bred. Theodotos malitere nwewe mmasị n’ebe mụ bụ́ nwa agbọghọ pere mpe nwere ntutu isi ojii nọ. Ọ na-anọkarị n’isi windo m agụrụ m egwu ịhụnanya a gụrụ n’asụsụ Grik. Anyị lụrụ na June 30, 1940. Oge ndị ahụ bụ nnọọ oge obi ụtọ. Ụlọ anyị bi nọ n’okpuru nke mama m. Amụrụ m nwa mbụ anyị bụ́ John n’afọ 1941.

Ịmụta Eziokwu Baịbụl

Ọ dị oge okpukpe anyị na-ekpe na-amasịchaghị Theodotos, ọ na-ajụkwa ọtụtụ ajụjụ banyere Baịbụl. Ma amaghị m na ya na Ndịàmà Jehova amụwala Baịbụl. Otu ụbọchị mụ na nwa ọhụrụ anyị nọ n’ụlọ, otu nwaanyị kụrụ aka n’ọnụ ụzọ anyị ma nye m otu kaadị e dere ihe ndị dị na Baịbụl. Iji mee nnọọ ka obi dị ya mma, agụrụ m ya. O nyeziri m akwụkwọ ụfọdụ e ji amụ Baịbụl. Ha bụdị ụdị akwụkwọ ndị ahụ Theodotos welatara!

Agwara m ya na enwere m akwụkwọ ndị ahụ ma sị ya bata n’ime ụlọ. M bidoro ozugbo jụkasịwa Onyeàmà ahụ aha ya bụ Eleni Nicolaou ajụjụ ahụ́. Ma o medara obi jiri Baịbụl zaa m ajụjụ ndị ahụ. Nke a masịrị m nnọọ. M bịara ghọtawa ihe Baịbụl na-ekwu. Mgbe mụ na Eleni kwụsịtụrụ obere ná mkparịta ụka anyị, ọ hụrụ foto di m. O kwuru, sị: “Amaara m nwoke a!” Ugbu a ka m matara ihe di m na-eme kemgbe, nke a tụkwara m n’anya. Di m na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova kemgbe, ọ naghị akpọ m aga, ọ naghịdị agwa m ma ya gawa! Mgbe di m lọtara n’ụbọchị ahụ, agwara m ya, sị: “N’izu a m ga-eso gị gaa ebe ahụ ị gara na Sunday gara aga!”

N’ọmụmụ ihe mbụ m gara, ihe dị ka mmadụ iri nọ na-amụ akwụkwọ Baịbụl bụ́ Maịka. Egeere m ihe niile ha kwuru! Site mgbe ahụ gawa, George na Katerini Petraki na-abịa amụrụ anyị Baịbụl n’uhuruchi Friday ọ bụla. Ọ masịghị papa m na ụmụnne m ndị ọzọ na anyị na Ndịàmà na-amụ Baịbụl, ọ bụ naanị nwanne m nwaanyị bụ onye na-enyeghị anyị nsogbu n’agbanyeghị na ọ dịghị mgbe ọ ghọrọ Onyeàmà. Ma, mama m nabatara eziokwu Baịbụl. N’afọ 1942, iji gosi na anyị ararala onwe anyị nye Jehova, e mere mụ na mama m na di m baptizim n’osimiri dị n’Alexandria.

Ndụ Anyị Akpaghasịa

N’afọ 1939, Agha Ụwa nke Abụọ malitere, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ gbasaruru ebe ndị ọzọ. Ka ọ na-erule ná mmalite afọ ndị 1940, Ọchịagha ndị Germany bụ́ Erwin Rommel na nnukwu ụgbọ agha ya rutere n’obodo dị anyị nso bụ́ El Alamein, ndị agha Britain jukwara n’Alexandria. Anyị kwakọjuru nri ndị a mịkpọrọ amịkpọ. Ka oge na-aga, onye di m na-arụrụ ọrụ gwara ya ka ọ gaa lekọtawa ebe o mepere ọhụrụ a na-eme bred dị na Port Taufiq, bụ́ nke dị nso n’obodo Suez, nke a mekwara anyị ji kwaga ebe ahụ. Ndịàmà abụọ na-asụ Grik gbalịrị ịchọta anyị. Ọ bụ ezie na ha amaghị ebe anyị bi, ha malitere ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ruo mgbe ha hụrụ anyị.

Oge anyị nọ na Port Taufiq, anyị mụụrụ Stavros na Giula Kypraios na ụmụ ha bụ́ Totos na Georgia, Baịbụl, ha ghọkwara ezigbo ndị enyi anyị. Stavros nwere nnọọ mmasị ịmụ Baịbụl nke na ọ na-eweghachi aka elekere niile nọ n’ụlọ ha azụ ka ha jiri otu awa dị ala n’ihe oge na-ekwu, iji mee ka ụgbọ okporo igwe anyị ji ala ghaa anyị ka anyị wee nọtekwuo aka. Anyị na-amụgide Baịbụl ruo ime abalị.

Anyị biri na Port Taufiq ruo ọnwa iri na asatọ, ma mechaa laghachi Alexandria mgbe mama m rịawara ọrịa. Mama m nwụrụ n’afọ 1947, o fegidekwara Jehova ruo ọnwụ ya. N’oge a kwa, Jehova jiri ụmụnna anyị ndị tozuru okè gbaa anyị ume. Anyị nwekwara ohere ile ndị ozi ala ọzọ na-alaghachi ebe ha na-eje ozi ọbịa mgbe ụgbọ mmiri ha kwụsịtụrụ n’Alexandria.

Oge Ọṅụ na Oge Nsogbu

N’afọ 1952, amụrụ m nwa anyị nwoke nke abụọ bụ́ James. Mụ na di m chọpụtara na ọ dị mkpa ka ụmụ anyị na ndị na-efe Jehova na-akpakọrịta, n’ihi ya anyị wepụtara ụlọ anyị ka a nọrọ na ya na-enwe ọmụmụ ihe, anyị na-akpọkarịkwa ndị nọ n’ozi oge niile ka ha bịa n’ụlọ anyị. Nke a mere ka nwa anyị nwoke nke okenye bụ́ John nwee mmasị n’eziokwu Baịbụl, ọ malitekwara ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri na ise. Ọ na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ na-agakwa akwụkwọ abalị iji gụtọpụ akwụkwọ ya.

O teghị aka a chọpụta na Theodotos nwere ọrịa obi, a gwakwara ya kwụsị ịrụ ọrụ ọ na-arụ. Nwa anyị nwoke bụ́ James dị naanị afọ anọ mgbe ahụ. Gịnị ka anyị ga-eme? Jehova ò kweghị nkwa, sị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị”? (Aịza. 41:10) Chetụkwala otú o si tụọ anyị n’anya nakwa ụdị obi ụtọ anyị nwere n’afọ 1956 mgbe a gwara anyị gaa rụwa ọrụ ọsụ ụzọ n’Ismailia, bụ́ nke dị nso Suez Canal! E nwere nsogbu n’Ijipt n’afọ ndị sochirinụ, nke mekwara ka agbamume dịrị ụmụnna anyị mkpa.

N’afọ 1960 naanị ihe onye ọ bụla n’ime anyị bu pụọ n’Ijipt bụ otu akpa otu akpa. Anyị kwagara n’agwaetiti dị na Saịprọs bụ́ ebe a mụrụ di m. N’oge a, Theodotos nọzi n’ute ọrịa, o nwezighịkwa ike ịrụ ọrụ. Ma, otu nwanna nwoke na nwunye ya dị obiọma nyere anyị ụlọ n’ụlọ ha. Ọ dị nnọọ mwute na ka afọ abụọ gachara di m nwụrụ, hapụrụ naanị m James ka dị obere. John, bụ́ onye bizi na Saịprọs, alụọla nwaanyị, nweekwa ezinụlọ nke ya ọ ga-elekọta.

Otú E Si Lekọta Anyị n’Oge Ihe Isi Ike

Stavros na Dora Kairis nyere anyị ụlọ n’ụlọ ha ka anyị biri. M gburu ikpere n’ala kelee Jehova ọzọ maka igboro anyị mkpa anyị. (Ọma 145:16) Mgbe Stavros na Dora kpebiri ire ụlọ ha ma rụọ ụlọ elu ọhụrụ nke a ga-eji ala ya mere Ụlọ Nzukọ Alaeze, ha rụụrụ mụ na James ọnụ ụlọ abụọ n’akụkụ ụlọ ahụ.

James mechara lụọ nwaanyị, ya na nwunye ya rụgidere ọrụ ọsụ ụzọ ruo mgbe ha mụrụ nwa nke mbụ n’ime ụmụ anọ ha. N’afọ 1974, nke bụ́ afọ abụọ Nwanna Knorr bịachara nleta ahụ a na-enweghị ike ichefu echefu, e nwere oké ọgba aghara n’ọchịchị obodo Saịprọs. * Ọtụtụ mmadụ, tinyere Ndịàmà, hapụrụ ụlọ ha gbaga n’ebe ọzọ. Nwa m nwoke bụ́ John so ná ndị a gbapụrụnụ. Ya na nwunye ya na ụmụ ha atọ kwagara Canada. N’oge a ọtụtụ mmadụ nọ na-akwapụ, anyị nwere obi ụtọ na ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze na Saịprọs mụbara.

Mgbe e bidoro kwụwa m ụgwọ a na-akwụ ndị lara ezumike nká, m bịara na-agachikwu ozi ọma anya. Ma n’afọ ole na ole gara aga, arịatụrụ m obere ọrịa strok nke mere ka m gaa binyere nwa m nwoke bụ́ James na ezinụlọ ya. Mgbe ọrịa m kara njọ, anọrọ m ọtụtụ izu n’ụlọ ọgwụ ma mechaa gaa biri n’ebe a na-elekọta ndị agadi. N’agbanyeghị na m nọ n’ihe mgbu mgbe niile, eziri m ndị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ, ndị ọrịa, na ndị bịara nleta, ozi ọma. Ejikwara m ọtụtụ awa nwee ọmụmụ ihe onwe onye, n’ihi otú ụmụnna sikwa jiri obiọma nyere m aka, m na-aga Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nke dị m nso.

Inweta Nkasi Obi n’Oge Agadi

Ịnụ akụkọ ọma banyere ndị mụ na Theodotos nyeere aka na-akasi m obi. Ọtụtụ n’ime ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha nọ n’ozi oge niile—ụfọdụ na-eje ozi n’Australia, Canada, England, Gris, na Switzerland. Nwa m nwoke bụ́ John na nwunye ya na nwa ha nwoke bizi na Canada. Nwa ha nwaanyị nke okenye na di ya bụ ndị ọsụ ụzọ. A kpọkwara nwa ha nwaanyị nke ikpeazụ bụ́ Linda na di ya bụ́ Joshua Snape, ịga klas nke otu narị na iri abụọ na anọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead.

Nwa m nwoke bụ́ James na nwunye ya bizi na Germany. Ụmụ ha nwoke abụọ na-eje ozi na Betel—otu nọ na nke dị n’Atens, Gris, nke ọzọ nọ na Selters, Germany. Nwa ha nwoke nke ikpeazụ, nwa ha nwaanyị, na di ya, na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ na Germany.

Anyị nwere nnọọ ọtụtụ ihe anyị ga-akọrọ mama m na ezigbo di m bụ́ Theodotos mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ! Obi ga-atọgbu ha atọgbu ma ha hụ na ihe ha hapụụrụ ezinụlọ ha bụ ihe nketa magburu onwe ya. *

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 21 Lee Teta! Bekee nke October 22, 1974, peeji nke 12-15.

^ par. 26 Ka a na-akwadebe ibipụta Ụlọ Nche a, nwanna nwaanyị Petridou nwụrụ mgbe ọ dị iri afọ itoolu na atọ.

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo dị na peeji nke 24]

N’oge a kwa, Jehova jiri ụmụnna anyị ndị tozuru okè gbaa anyị ume

[Map dị na peeji nke 24]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

SAỊPRỌS

NICOSIA

OKÉ OSIMIRI MEDITERENIAN

IJIPT

CAIRO

El Alamein

Alexandria

Ismailia

Suez

Port Taufiq

Suez Canal

[Ebe E Si Nweta Foto]

O si na NASA/Visible Earth imagery

[Foto dị na peeji nke 23]

Mụ na Theodotos n’afọ 1938

[Foto dị na peeji nke 25]

Nwa m nwoke bụ́ John na nwunye ya

[Foto dị na peeji nke 25]

Nwa m nwoke bụ́ James na nwunye ya