Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ozi Ụlọ n’Ụlọ Ji Dị Mkpa n’Oge A?

Gịnị Mere Ozi Ụlọ n’Ụlọ Ji Dị Mkpa n’Oge A?

Gịnị Mere Ozi Ụlọ n’Ụlọ Ji Dị Mkpa n’Oge A?

“Kwa ụbọchị, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha nọ na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.”—ỌRỤ 5:42.

1, 2. (a) Olee ụzọ e si ekwusa ozi ọma nke e ji mara Ndịàmà Jehova? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

A NA-AHỤ ha n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ebe niile n’ụwa. Mmadụ abụọ jikeere nnọọ nke ọma na-abịa n’ụlọ mmadụ iji zie onye nwe ụlọ ozi dị nkenke sitere na Baịbụl banyere Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ enwee mmasị n’ihe ha na-agwa ya, ha nwere ike inye ya akwụkwọ e ji amụ Baịbụl ma kwe nkwa ịdị na-abịa amụrụ ya Baịbụl n’ụlọ ya n’efu. Ha mechaa nke a ha agaa n’ụlọ ọzọ. Ọ bụrụ na i so arụ ọrụ a, ị ga-achọpụta na ndị mmadụ na-amatakarị na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova tupu gị ebidodị kwuwe okwu. N’ezie, ozi ụlọ n’ụlọ aghọọla ihe e ji mara anyị.

2 E nwere ụzọ dị iche iche anyị si arụ ọrụ ahụ Jizọs nyere, nke bụ́ ikwusa ozi ọma na ime ndị mmadụ ka ha ghọọ ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 28:19, 20) Anyị na-agba àmà n’ọma ahịa, n’okporo ámá, na n’ebe ndị ọzọ ndị mmadụ na-anọkarị. (Ọrụ 17:17) Anyị na-eji telefon na akwụkwọ ozi agbara ọtụtụ ndị àmà. Anyị na-akọrọ ndị anyị na ha na-ezute mgbe anyị na-eme ihe ndị dịịrị anyị n’ụbọchị eziokwu Baịbụl. Anyị nwedịrị ebe mmadụ nwere ike ịga n’Ịntanet gụọ akwụkwọ anyị ndị dabeere na Baịbụl n’ihe karịrị narị asụsụ atọ. * Ụzọ a niile e si agbasa ozi Baịbụl na-arụpụta ihe ndị dị mma. Ma n’ọtụtụ ebe, ụzọ anyị kacha esi ekwusa ozi ọma bụ ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Gịnị mere anyị ji esi otú a ekwusa ozi ọma? Olee otú o si bịa ghọọ ụzọ bụ́ isi ndị Chineke si ekwusa ozi ọma taa? Gịnịkwa mere o ji dị mkpa n’oge a?

Ụzọ Ndịozi Si Kwusaa Ozi Ọma

3. Olee ntụziaka Jizọs nyere ndịozi ya banyere ikwusa ozi ọma, oleekwa ihe nke a na-egosi banyere otú ha kwesịrị isi na-ekwusa ya?

3 Ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ sitere n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe Jizọs zipụrụ ndịozi ya ka ha gaa kwusaa ozi ọma, ọ gwara ha, sị: “N’obodo ukwu ma ọ bụ obodo nta ọ bụla unu banyere, chọpụtanụ onye kwesịrị ekwesị n’ime ya.” Olee otú ha ga-esi chọpụta ndị kwesịrị ekwesị? Jizọs gwara ha gaa n’ụlọ ndị mmadụ, ọ sịrị: “Mgbe unu na-abanye n’ụlọ, keleenụ ndị ezinụlọ ahụ; ọ bụrụkwa na ụlọ ahụ kwesịrị ekwesị, ka udo unu na-asị ka o nwee dịkwasị ya.” Hà kwesịrị ịga n’ụlọ ndị mmadụ mgbe a na-agwaghị ha bịa? Lee ihe ọzọ Jizọs kwuru: “N’ebe ọ bụla ọ na-adịghị onye nabatara unu ma ọ bụ onye gere ntị n’okwu unu, mgbe unu na-apụ n’ụlọ ahụ ma ọ bụ n’obodo ahụ, tichapụnụ ájá dị n’ụkwụ unu.” (Mat. 10:11-14) Ntụziaka ndị a Jizọs nyere gosiri na ka ndịozi ahụ na-agazu “ókèala ahụ malite n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ezisa ozi ọma,” ha ga-aga leta ndị mmadụ n’ụlọ ha n’echeghị ka a kpọọ ha akpọọ.—Luk 9:6.

4. Olee kpọmkwem ebe ndị e kwuru okwu na Baịbụl banyere ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

4 Baịbụl kwuru nnọọ na ndịozi Jizọs kwusara ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Dị ka ihe atụ, Ọrụ 5:42 kwuru banyere ha, sị: “Kwa ụbọchị, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha nọ na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.” N’ihe dị ka iri afọ abụọ ka e mechara, Pọl onyeozi chetaara ndị okenye nọ n’ọgbakọ Efesọs, sị: “M laghị azụ ịgwa unu nke ọ bụla n’ime ihe ndị bara uru ma ọ bụ izi unu ihe n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.” Pọl ọ̀ gara leta ndị okenye ndị ahụ tupu ha aghọọ ndị kwere ekwe? Ọ ga-abụ na o mere otú ahụ, n’ihi na otu n’ime ihe ndị ọ kụziiri ha bụ “banyere nchegharị n’ebe Chineke nọ na okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs.” (Ọrụ 20:20, 21) Akwụkwọ bụ́ Word Pictures in the New Testament nke Robertson dere kwuru banyere Ọrụ Ndịozi 20:20, sị: “Ọ dị nnọọ mma ịmara na ndị a bụ́ aka ochie n’ikwusa ozi ọma kwusara ya site n’ụlọ ruo n’ụlọ.”

Ụsụụ Igurube nke Oge A

5. Olee otú e si kọwaa ọrụ ikwusa ozi ọma n’amụma Joel?

5 Ọrụ ikwusa ozi ọma a rụrụ na narị afọ mbụ dị nnọọ obere ma e jiri ya tụnyere ọrụ ka ukwuu a na-arụ n’oge anyị a. Joel onye amụma ji ọrụ ikwusa ozi ọma nke Ndị Kraịst e tere mmanụ na-arụ tụnyere ụmụ ahụhụ na-emebisị ihe, nke gụnyere igurube. (Joel 1:4) Igurube ndị a na-aga dị ka ụsụụ ndị agha, ha na-agafere ihe ọ bụla nọchiiri ha ụzọ, na-abanye n’ime ụlọ ọ bụla ma na-erichapụ ihe niile dị n’ụzọ ha si aga. (Gụọ Joel 2:2, 7-9.) Nke a bụ nnọọ ụzọ kwesịrị ekwesị isi kọwaa otú ndị Chineke si nọgidesie ike n’ọrụ ha taa ma na-agbalịsi ike ịhụ na ọ dịghị ebe ozi ọma ha na-erughị! Ụzọ bụ́ isi Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị ibe ha bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ si emezu amụma a bụ ịga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. (Jọn 10:16) Olee otú anyị bụ́ Ndịàmà Jehova si malite iṅomi otú ahụ ndịozi si kwusaa ozi ọma?

6. N’afọ 1922, olee agbamume e nyere ka a gbaa àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ma gịnị ka ụfọdụ mere?

6 Malite n’afọ 1919 gawa, e kwusiri okwu ike na Onye Kraịst ọ bụla nwere ibu ọrụ iso na-ekwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, isiokwu bụ́ “Ije Ozi Dị Oké Mkpa,” nke pụtara n’Ụlọ Nche (Bekee) nke August 15, 1922, chetaara Ndị Kraịst e tere mmanụ mkpa ọ dị “iwegara ndị mmadụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na ịdị na-aga n’ụlọ ha ezi ha ozi ọma, na-agba àmà na alaeze eluigwe dị nso.” A kọwara ụzọ e kwesịrị isi na-ezi ya na Bulletin (nke a na-akpọzi Ozi Alaeze Anyị). N’agbanyeghị nke a, ọnụ ọgụgụ ndị kwusara ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ dị obere ná mbụ. Ọtụtụ ekweghị aga. Ha welitere ihe mgbochi dị iche iche, ma ihe bụ́ nsogbu ha n’ezie bụ na ụfọdụ chere na ha etofeela ịgagharị site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-ekwusa ozi ọma. Ka a nọgidere na-ekwusi okwu ike ka a na-aga ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ọtụtụ n’ime ndị a jiri nke nta nke nta hapụ nzukọ Jehova.

7. Olee mkpa e nwere n’afọ ndị 1950?

7 N’ime ọtụtụ afọ ndị sochirinụ, ọtụtụ sooro na-ekwusa ozi ọma ahụ. Otú ọ dị, ọ bịara doo anya na e kwesịrị inyekwu ndị mmadụ ọzụzụ n’otú e si eje ozi ụlọ n’ụlọ. Were ihe mere na United States dị ka ihe atụ. Ná mmalite afọ ndị 1950, naanị ihe ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ anọ nke Ndịàmà bi n’obodo ahụ na-eme bụ ikesa akwụkwọ ịkpọ òkù ma ọ bụ ịchịrị magazin guzoro n’okporo ama dị iche iche. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị bi ná mba ahụ adịghị agachi ozi ọma anya, ha na-anọcha ọtụtụ ọnwa n’ekwusaghị ozi ọma. Gịnị ka a ga-eme iji nyere Ndị Kraịst niile raarala onwe ha nye Chineke aka ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

8, 9. Olee ọzụzụ a malitere inye site n’afọ 1953, oleekwa ihe nke a rụpụtarala?

8 Ná mgbakọ mba niile e nwere na New York City n’afọ 1953, e kwusikwuru nnọọ okwu ike banyere ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Nwanna Nathan H. Knorr kwuru na ọrụ bụ́ isi ndị okenye ọgbakọ niile nwere kwesịrị ịbụ inyere Onyeàmà ọ bụla aka ịdị na-aga ozi ọma mgbe niile site n’ụlọ ruo n’ụlọ. O kwuru, sị: “Onye ọ bụla kwesịrị inwe ike ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ.” Iji hụ na e mere nke a, a malitere nyewe Ndịàmà nọ n’ụwa niile ọzụzụ. E nyere ndị na-amalitebeghị ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ọzụzụ otú ha ga-esi gakwuru ndị mmadụ n’ụlọ ha, soro ha tụgharịa uche n’ihe Baịbụl na-ekwu, ma zaa ha ajụjụ ndị ha jụrụ.

9 Ọzụzụ a rụpụtara ihe magburu nnọọ onwe ya. N’ime afọ iri, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa n’ụwa niile na ọnụ ọgụgụ ọmụmụ Baịbụl ndị e duziri mụbara ihe karịrị okpukpu abụọ. Taa, ihe fọrọ obere ka o ruo nde ndị nkwusa Alaeze asaa na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile. Mmụba a niile pụrụ iche e nwere na-egosi na Jehova na-agọzi ozi ụlọ n’ụlọ ndị ya na-eje.—Aịza. 60:22.

Ịka Ndị Ga-adị Ndụ Akara

10, 11. (a) Olee ọhụụ e kpugheere Ezikiel, dị ka e dekọrọ n’Ezikiel isi nke 9? (b) Olee otú ọhụụ ahụ si na-emezu taa?

10 A pụrụ isi n’ọhụụ ahụ e gosiri Ezikiel onye amụma ghọta otú ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ dịruru mkpa. N’ọhụụ ahụ, Ezikiel hụrụ ụmụ nwoke isii ji ngwá ọgụ n’aka ha, nakwa onye nke asaa bụ́ onye yi uwe linin ma fanye mpi ink nke odeakwụkwọ n’úkwù. A gwara nwoke nke asaa ahụ ka ọ ‘gagharịa n’ime obodo ahụ, kaa ndị na-eze ume ma na-asụ ude n’ihi ihe arụ niile a na-eme n’ime ya akara n’egedege ihu.’ Mgbe a kachara akara ahụ, a gwara mmadụ isii ahụ ji ngwa ọgụ ka ha gbuo ndị niile na-enweghị akara ahụ.—Gụọ Ezikiel 9:1-6.

11 Anyị ghọtara na ná mmezu amụma a, nwoke ahụ “yi uwe linin” na-anọchi anya ihe fọdụrụ ná Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Ndị e tere mmanụ na-eji ọrụ ikwusa ozi ọma na nke ime ndị na-eso ụzọ aka ndị ghọrọ akụkụ nke “atụrụ ọzọ” Kraịst akara n’ụzọ ihe atụ. (Jọn 10:16) Gịnị bụ akara ahụ? Ọ bụ ihe na-agba akaebe, nke yiri ka ọ̀ nọ n’egedege ihu ha, na atụrụ ndị a bụ ụmụazụ Jizọs Kraịst raara onwe ha nye Chineke e meekwa ha baptizim, nakwa na ha eyirila mmadụ ọhụrụ ahụ ma dị ka Kraịst. (Efe. 4:20-24) Ndị a yiri atụrụ na Ndị Kraịst e tere mmanụ ghọrọ otu ìgwè atụrụ, ha na-enyekwara ndị e tere mmanụ aka n’ọrụ ha dị mkpa bụ́ ịkakwa ndị ọzọ akara.—Mkpu. 22:17.

12. Olee otú ọhụụ Ezikiel hụrụ banyere ịka akara n’egedege ihu si gosi mkpa ọrụ ịchọ ndị yiri atụrụ bụ́ nke na-aga n’ihu ugbu a dị?

12 Ọhụụ Ezikiel gosiri otu ihe mere anyị ekwesịghị igbu oge n’ịchọ ndị “na-eze ume ma na-asụ ude.” Ọ bụ n’ihi na o metụtara ndụ. N’oge na-adịghị anya, ndị agha eluigwe Jehova ga-eji mezuo ihe o kpere n’ikpe, bụ́ ndị ụmụ nwoke isii ahụ ji ngwá ọgụ na-anọchi anya ha, ga-egbu ndị na-enweghị akara ihe atụ ahụ. Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu banyere ikpe ahụ na-abịanụ, o dere na Onyenwe anyị Jizọs na ‘ndị mmụọ ozi ya dị ike, ga-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị na-amaghị Chineke, na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.’ (2 Tesa. 1:7, 8) Ghọta na a ga-ekpe ndị mmadụ ikpe dabere n’otú ha si nabata ozi ọma ahụ. N’ihi ya, a ga-anọgide na-akpọsa ozi Chineke ruo na mgbe ọgwụgwụ. (Mkpu. 14:6, 7) Nke a na-egosi na ndị ohu Jehova niile raara onwe ha nye ya nwere nnukwu ọrụ ha ga-arụ.—Gụọ Ezikiel 3:17-19.

13. (a) Olee ụgwọ ọ dị Pọl onyeozi ka ò ji, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee ụgwọ ọ dị gị ka ì ji ndị nọ n’ókèala unu?

13 Pọl onyeozi weere ikwusa ozi ọma dị ka ụgwọ o ji eji. O dere, sị: “Eji m ndị niile ụgwọ, ma ndị Grik ma Ndị Ala ọzọ, ma ndị maara ihe ma ndị na-amaghị ihe: ya mere, ọ na-agụsi m agụụ ike izisakwara unu ozi ọma n’ebe ahụ na Rom.” (Rom 1:14, 15) Iji gosi na ya nwere ekele maka ebere e meere ya, Pọl ghọtara na ya ji ụgwọ inyekwara ndị ọzọ aka irite uru n’obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke dị nnọọ ka ya onwe ya ritere. (1 Tim. 1:12-16) Ọ dị ya ka ò ji onye ọ bụla ọ hụrụ ụgwọ, bụ́kwanụ ụgwọ ọ ga-akwụ naanị site n’ikwusara onye ahụ ozi ọma. Ọ̀ na-adị gị ka i ji ndị nọ n’ókèala unu ụdị ụgwọ a?—Gụọ Ọrụ 20:26, 27.

14. Olee ihe bụ́ isi mere anyị ji ekwusa ozi ọma n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

14 Ọ bụ ezie na ichebe ndụ ndị mmadụ dị mkpa, e nwere ihe ọzọ dị nnọọ mkpa karịa ichebe ndụ nke mere anyị ji kwesị ịdị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’amụma ahụ e dekọrọ na Malakaị 1:11, Jehova, sịrị: “Malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda ya, aha m ga-adị ukwuu n’etiti mba niile, . . . a ga-ewetara aha m onyinye, bụ́ onyinye dị ọcha; n’ihi na aha m ga-adị ukwuu n’etiti mba niile.” Iji mezuo amụma a, ndị ohu Jehova raara onwe ha nye ya na-eto aha ya n’ihu ọha n’ụwa niile ka ha ji obi umeala na-eje ozi ha. (Ọma 109:30; Mat. 24:14) ‘Ịchụrụ Chineke àjà otuto’ bụ isi ihe mere anyị ji ekwusa ozi ọma n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.—Hib. 13:15.

Ihe Ndị Dị Oké Mkpa Ga-eme n’Ọdịnihu

15. (a) Olee otú ụmụ Izrel si rụọ ọrụ bukwuru ibu ka ha na-aga mgbidi Jeriko gburugburu n’ụbọchị nke asaa? (b) Gịnị ka nke a na-egosi banyere ọrụ ime nkwusa anyị?

15 Olee ihe ndị a ka ga-emekwu n’ọrụ nkwusa a? Nnọchibido ahụ a nọchibidoro Jeriko, bụ́ nke e dekọrọ n’akwụkwọ Jọshụa, na-egosi ihe a ka ga-emekwu. Cheta na tupu Chineke ebibie Jeriko, a gwara ụmụ Izrel ka ha gaa obodo ahụ gburugburu otu ugboro n’ụbọchị ruo ụbọchị isii. Ma n’ụbọchị nke asaa, ha ga-aga ya ihe karịrị otu ugboro. Jehova gwara Jọshụa, sị: “Unu ga-aga obodo ahụ gburugburu ugboro asaa, ndị nchụàjà ga na-afụkwa opi ndị ahụ. Ọ ga-erukwa na mgbe ha fụrụ opi asaa ahụ e ji mpi ebule mee, . . . ndị agha niile ga-eji oké olu tie mkpu agha; mgbidi obodo ahụ ga-adaru ala.” (Jọsh. 6:2-5) O kwere omume na a ga-enwe mmụba yiri nke a n’ọrụ ikwusa ozi ọma anyị. Obi abụọ adịghị ya na mgbe a ga-ebibi usoro ihe dị ugbu a, ọ ga-abụ na a gbaala àmà banyere aha Chineke na Alaeze ya n’ụzọ a na-emetụbeghị ya mbụ kemgbe ụwa malitere.

16, 17. (a) Olee ihe a ga-arụzu tupu “oké mkpagbu ahụ” akwụsị? (b) Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

16 Oge nwere ike iru mgbe ozi a anyị na-ekwusa ga-adị ka “mkpu agha.” N’akwụkwọ Mkpughe, e ji “oké akụ́ mmiri ígwè, tinyere nkume ọ bụla nke ịdị arọ ya dị ihe dị ka otu talent” * nọchie anya okwu ikpe dị ike. Mkpughe 16:21 kwukwara, sị: “Ihe otiti ya dị ukwuu hie nne.” Anyị amabeghị òkè ozi ụlọ n’ụlọ ga-ekere n’ịkpọsa ikpe ikpeazụ ndị ahụ. Ma otu ihe doro anyị anya bụ na tupu “oké mkpagbu ahụ” akwụsị, a ga-eme ka a mara aha Jehova n’ụzọ a na-emetụbeghị ya mbụ kemgbe e kere mmadụ.—Mkpu. 7:14; Ezik. 38:23.

17 Ka anyị na-echere ihe ndị a dị oké mkpa gaje ime n’ọdịnihu, ka anyị nọgide jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Olee nsogbu ndị anyị na-enweta ka anyị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, oleekwa otú anyị ga-esi merie ha? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Adres ebe a pụrụ ịga gụọ akwụkwọ anyị n’Ịntanet bụ www.watchtower.org.

^ par. 16 Ọ bụrụ na ọ bụ talent nke ndị Grik ka a na-ekwu, akụ́ mmiri nke ọ bụla ga-adị ihe dị ka kilogram iri abụọ n’arọ.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mere anyị ji ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

• Olee otú e si kwusie okwu ike banyere ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’oge anyị a?

• Gịnị mere o ji bụrụ na ndị ohu Jehova raara onwe ha nye ji ụgwọ ikwusa ozi ọma?

• Olee ihe ndị dị oké mkpa ga-eme n’ọdịnihu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Ọ̀ dị gị ka ì ji ndị mmadụ ụgwọ ikwusara ha ozi ọma dị ka ọ dị Pọl onyeozi?

[Foto dị na peeji nke 5]

Nwanna Knorr n’afọ 1953