Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Imeri Ihe Isi Ike Ndị A Na-enweta n’Ozi Ụlọ n’Ụlọ

Imeri Ihe Isi Ike Ndị A Na-enweta n’Ozi Ụlọ n’Ụlọ

Imeri Ihe Isi Ike Ndị A Na-enweta n’Ozi Ụlọ n’Ụlọ

‘Anyị nwere nkwuwa okwu site n’enyemaka Chineke wee gbasie mgba ike zie unu ozi ọma Chineke.’—1 TESA. 2:2.

1. Olee ihe isi ike ndị Jeremaya nwetara, oleekwa otú o si merie ha?

JEREMAYA bụ mmadụ nke nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe. Mgbe Jehova gwara ya na ọ họpụtala ya ịbụ “onye amụma nke mba dị iche iche,” o tipụrụ mkpu, sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Lee, amaghị m okwu ekwu, n’ihi na abụ m nwata.” Ma, ọ tụkwasịrị Jehova obi kweta ịrụ ọrụ ahụ. (Jere. 1:4-10) Ruo ihe karịrị iri afọ anọ, Jeremaya zutere ndị na-enweghị mmasị n’ozi ya, ndị na-achọghị iji anya ahụ ya, ndị kwara ya emo, na ọbụnadị ndị tiri ya ihe. (Jere. 20:1, 2) E nwere oge ndị ọ dị ya ka ya kwụsị. Ma, ọ nọgidere na-agwa ndị a na-achọghị iji ntị anụ ihe ọ na-ekwu ozi a na-agba ha agba ná ntị. Chineke nyere Jeremaya ume ịrụzu ihe Jeremaya na-agaraghị arụli n’ike nke onwe ya.—Gụọ Jeremaya 20:7-9.

2, 3. Olee otú ndị ohu Chineke taa si enweta ihe isi ike ndị yiri nke Jeremaya?

2 Ọtụtụ ndị ohu Chineke taa nwere ike iche na ha erughị eru dị ka Jeremaya chere. Ọ dị mgbe ụfọdụ n’ime anyị chere na ha agaghị ekwusali ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ mgbe ha chechara ihe dị na ya. Ma, mgbe anyị ghọtara na Chineke chọrọ ka anyị kwusaa ozi ọma, anyị kwụsịrị ịtụ ụjọ ma malite ikwusa ya. N’agbanyeghị nke a, ọtụtụ n’ime anyị zutere, ma ọ̀ dịghị ihe ọzọ otu ugboro, ihe ndị mere ka o siere anyị ike ikwusa ozi ọma ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị mfe ịmalite ma nọgide na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ruo ọgwụgwụ.—Mat. 24:13.

3 Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na gị na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, ọ dịkwala anya ị gawara ọmụmụ ihe ha, ma ị chọbeghị ịmalite ikwusawa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ? Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova e mere baptizim nke ahụ́ gbasiri nnọọ ike ma ọ́ na-esiri gị ike iso na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ? Mara na e nwere ọtụtụ ndị dị iche iche na-emeri ihe isi ike ndị dị n’ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ị ga-enwekwa ike imeri ha site n’enyemaka Jehova.

Inwe Nkwuwa Okwu

4. Gịnị nyeere Pọl onyeozi aka ikwusa ozi ọma ahụ n’atụghị egwu?

4 Obi abụọ adịghị ya na ị ghọtala na ọ bụghị ike mmadụ ma ọ bụ amamihe mmadụ ka e ji na-arụzu ọrụ nkwusa a zuru ụwa ọnụ, kama ọ bụ site na mmụọ Chineke. (Zek. 4:6) Ọ bụkwa mmụọ a na-enyere Onye Kraịst ọ bụla aka n’ozi ya. (2 Kọr. 4:7) Tụlee ihe banyere Pọl onyeozi. O dere ihe mere mgbe ndị mmegide kpagburu ya na ndị ozi ala ọzọ ibe ya, sị: ‘Anyị nwere nkwuwa okwu site n’enyemaka Chineke, wee gbasie mgba ike zie unu ozi ọma Chineke mgbe anyị bu ụzọ tasịa ahụhụ, e meekwa anyị ihe ihere na Filipaị.’ (1 Tesa. 2:2; Ọrụ 16:22-24) Ọ pụrụ isiri anyị ike ikweta na e nwere oge ikwusa ozi ọma siiri onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi bụ́ Pọl ike. Ma, dịkwa nnọọ ka anyị niile kwesịrị ime, ọ dị mkpa ka Pọl tụkwasị Jehova obi iji nwee ike iji obi ike kwusaa ozi ọma ahụ. (Gụọ Ndị Efesọs 6:18-20.) Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Pọl?

5. Olee otu ihe ga-enyere anyị aka ikwusa ozi ọma n’atụghị egwu?

5 Ekpere bụ otu ụzọ anyị si enweta ume iji nwee ike iji obi ike na-ekwusa ozi ọma ahụ. Otu onye ọsụ ụzọ, sịrị: “M na-ekpe ekpere ka m nwee ike iji obi ike na-agwa ndị mmadụ okwu, na-ekpekwa ekpere ka m nwee ike iru n’obi ndị mmadụ, nakwa ka m nwee ike iji ọṅụ na-eje ozi m. A sị kwuwe, ọrụ a bụ nke Jehova, ọ bụghị nke anyị, n’ihi ya, anyị enweghị ike imeli ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na o nyeghịrị anyị aka.” (1 Tesa. 5:17) Anyị niile kwesịrị ịnọgide na-ekpe ekpere maka enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke iji nwee ike ịdị na-ekwusa ozi ọma n’atụghị egwu.—Luk 11:9-13.

6, 7. (a) Olee ọhụụ e kpugheere Ezikiel, gịnịkwa ka ọ pụtara? (b) Olee ihe ndị ohu Chineke taa na-amụta site n’ọhụụ Ezikiel?

6 Akwụkwọ Ezikiel kwuru ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịgwa ndị ọzọ okwu n’atụghị egwu. N’ọhụụ, Jehova nyere Ezikiel akwụkwọ mpịakọta e dere abụ “iru uju na ịkwa ákwá na ákwá arịrị” n’ihu na n’azụ ya, ma gwa ya ka o rie ya. Jehova gwara ya, sị: “Nwa nke mmadụ, rijuo afọ, rijuo akwụkwọ a a pịakọtara apịakọta m na-enye gị afọ.” Gịnị ka ọhụụ a pụtara? Ezikiel ga-ebu nnọọ ụzọ ghọta ozi ọ na-aga ikwusa nke ọma. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọ ga-abanye ya n’ime ahụ́, na-emetụta nnọọ otú o si eche echiche. Onye amụma ahụ gara n’ihu ịkọ, sị: “M wee riwe ya, o wee na-atọ m ụtọ n’ọnụ dị ka mmanụ aṅụ.” Ikwusara ọha mmadụ ozi Chineke tọrọ Ezikiel ụtọ ka mmanụ aṅụ. O weere na ịnọchite anya Jehova na ịrụzu ọrụ a Chineke nyere ya bụ ihe ùgwù pụrụ iche, n’agbanyeghị na nke a pụtara na ọ ga-akpọsara ndị obi ha kpọrọ nkụ ozi dị ike.—Gụọ Ezikiel 2:8-3:4, 7-9.

7 E nwere ihe magburu onwe ya ndị ohu Chineke taa na-amụta n’ọhụụ a. Anyị nwekwara ozi dị ike anyị ga-akpọsara ndị ihe anyị na-eme na-adịchaghị amasị. Ka anyị wee nwee ike ịnọgide na-ewere ozi anyị dị ka ihe ùgwù Chineke nyere anyị, anyị ga-anọgide na-agụ ma na-amụ okwu Chineke. Ịgụ ihe elu elu ma ọ bụ ịmụ ihe iji mezuo iwu agaghị ezu ime ka anyị ghọta Okwu Chineke nke ọma. Ì nwere ike ịhazi oge gị iji nwee ike ịdị na-amụkwu Baịbụl nke ọma n’onwe gị ma na-agụchikwu ya anya? Ì nwere ike iwepụtakwu oge iji na-atụgharị uche n’ihe ị na-agụ?—Ọma 1:2, 3.

Ịmalite Mkparịta Ụka Dabeere na Baịbụl

8. Olee ụzọ ụfọdụ ndị nkwusa Alaeze sirila nwee ike ịmalite mkparịta ụka mgbe ha nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ?

8 Ihe na-aka esiri ọtụtụ ndị nkwusa ike mgbe ha nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ bụ otú ha ga-esi amalite mkparịta ụka. N’ezie, ịmalite mkparịta ụka na-esi ike n’ókèala ụfọdụ. Mgbe a nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ, ọ na-akara ụfọdụ ndị nkwusa mma ịmalite mkparịta ụka site n’ikwu okwu ole na ole ha kwadebere, ma nyezie onye nwe ụlọ traktị, dị ka e depụtara n’igbe dị n’okpuru. Isiokwu traktị ahụ ma ọ bụ ihe ndị mara mma e sere na ya nwere ike ime ka onye nwe ụlọ nwee mmasị, ma mee ka anyị jiri ohere ahụ kọtụrụ ya ihe mere anyị ji bịa, jụọkwa ya ajụjụ. Ụzọ ọzọ isi mee nke a bụ igosi onye nwe ụlọ traktị atọ ma ọ bụ anọ ma gwa ya ka ọ họrọ nke masịrị ya. N’ezie, ebumnobi anyị abụghị naanị inyefe traktị ma ọ bụ igosi ndị anyị zutere n’ụlọ ha ihe e kwuru n’ime ha, kama ọ bụ ịmalite mkparịta ụka nke ga-eduga n’ịmụwara ha Baịbụl.

9. Gịnị mere ịkwadebe nke ọma ji dị mkpa?

9 N’agbanyeghị ụzọ ọ bụla ị họọrọ isi malite okwu gị, ịkwadebe nke ọma ga-eme ka ahụ́ ruo gị ala, meekwa ka i jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Otu onye ọsụ ụzọ sịrị: “M na-enwekwu ọṅụ ma m kwadebe nke ọma. Ọ na-eme ka ọ na-agụsi m ike ịgwa ndị mmadụ ihe ahụ m kwadebere.” Onye ọsụ ụzọ ọzọ sịrị, “Ọ bụrụ na m mara ihe akwụkwọ ndị m chọrọ inye ndị mmadụ na-ekwu, ọ na-anụ m ọkụ n’obi inyefe ha.” Ọ bụ eziokwu na e nwere uru ụfọdụ dị n’ikwugharị ihe ị chọrọ ikwu n’obi gị, ọtụtụ ndị achọpụtala na ikwugharị ha n’olu dara ụda na-aka abara ha uru. Nke a na-eme ka ha nwee ike inye Jehova ihe kacha mma ha nwere.—Kọl. 3:23; 2 Tim. 2:15.

10. Olee ihe e nwere ike ime iji mee ka nzukọ ozi ubi nyere ndị nkwusa aka ma baara ha uru?

10 Ọ bụrụ na a tụlee ihe ndị ga-enye aka n’ókèala mgbe a na-enwe nzukọ ije ozi ubi, ọ ga-enyere anyị aka izi ozi ọma nke ọma ma nwee ọṅụ mgbe anyị na-eje ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ọ bụrụ na ihe mmụta dịịrị ụbọchị nke ụbọchị ahụ na-ekwu banyere ikwusa ozi ọma, e nwere ike ịgụpụta ya ma kọwaa ya ná mkpirikpi. Ma, nwanna na-eduzi nzukọ ije ozi ubi ahụ kwesịrị iwepụta nnọọ oge iji tụlee ma ọ bụ mee ihe ngosi dị mfe ga-ekwesị ókèala a na-arụ, ma ọ bụkwanụ tụlee ihe ndị ọzọ e nwere ike iji mee ihe n’ozi n’ụbọchị ahụ. Nke a ga-enyekwuru ndị ahụ chọrọ ịga ozi ọma aka ịgba àmà nke ọma. Ọ bụrụ na ndị okenye na ndị ọzọ na-eduzi nzukọ ozi ubi eburu ụzọ kwadebe nke ọma, ha ga-enwe ike iduzi nzukọ ozi ubi otú e kwesịrị isi duzie ya ma ghara ịgafe oge.—Rom 12:8.

Uru Ige Ntị Na-aba

11, 12. Olee otú iji obiọma na-ege ndị ọzọ ntị si enyere anyị aka ikwusara ha ozi ọma? Nye ihe atụ.

11 Ọ bụghị naanị ịkwadebe nke ọma ga-eme ka anyị na ndị mmadụ malite mkparịta ụka anyị enweekwa ike iru ha n’obi, kama, inwe nnọọ mmasị n’ebe ha nọ dị ezigbo mkpa. Otu ụzọ anyị si egosi na anyị nwere mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ bụ otú anyị si ege ha ntị. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kwuru, sị: “Inwe ndidi na ịdị njikere ige ndị mmadụ ntị na-eme ka ha gee ntị n’ozi ọma ahụ, ọ bụkwa ụzọ magburu onwe ya isi gosi na anyị nwere nnọọ mmasị n’ebe ha nọ.” Iji ndidi nụrụ ihe onye nwe ụlọ nwere ikwu nwere ike ime ka o nwekwuo mmasị ige anyị ntị, dị ka ahụmahụ na-esonụ gosiri.

12 N’otu akwụkwọ ozi gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Le Progrès, nke e bipụtara n’obodo Saint-Étienne, France, otu nwaanyị kọrọ banyere mmadụ abụọ bịara leta ya obere oge ka nwa ya nwaanyị dị naanị ọnwa atọ nwụnahụchara ya. O dere, sị: “M kọtara ozugbo na ha bụ Ndịàmà Jehova. M ka chọrọ iji nwayọọ sị ha lawa mgbe m hụrụ otu broshuọ ha na-enye ndị mmadụ. O kwuru banyere ihe mere Chineke ji kwere ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ. M kpebiziri ịkpọbata ha n’ime ụlọ iji mee ka ha ghọta na ihe ha na-ekwu abụghị eziokwu. . . . Ndịàmà ahụ nọfetụrụ otu awa n’ụlọ m. Ha ji obiọma gee m nnọọ ntị, mgbe ha na-alakwa, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu nke na m kwetara ka ha bịa leta m ọzọ.” (Rom 12:15) Ka oge na-aga, nwaanyị a kwetara ka a mụwara ya Baịbụl. Na ihe nwaanyị a chetara banyere mgbe mbụ ahụ a bịara na nke ya abụghị ihe Ndịàmà ahụ kwuru kama otú ha si gee ya ntị, nwere ọtụtụ ihe ọ na-akụziri anyị.

13. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ozi ọma anyị kwekọọ n’ọnọdụ nke ndị anyị zutere?

13 Ọ bụrụ na anyị ejiri obiọma na-aṅa ndị ọzọ ntị, ihe anyị na-eme bụ inye ha ohere ịgwa anyị ihe mere Alaeze ahụ ji dị ha mkpa. Nke a na-eme ka anyị nwee nnọọ ike ikwusara ha ozi ọma otú ọ ga-aka baara ha uru. E nwere ike ị chọpụtala na ndị nkwusa na-eme nke ọma n’ozi ha na-abụkarị ndị nke na-ege ndị ọzọ ntị nke ọma. (Ilu 20:5) Ha na-egosi ezi mmasị n’ebe ndị ha na-ezute n’ozi ọma nọ. Ọ bụghị naanị aha na ebe ha bi ka ha na-amata kamakwa ha na-amata ihe ndị na-amasị ha na ihe ndị na-akpa ha. Ọ bụrụ na mmadụ agwa ha ihe na-enye ya nsogbu n’obi, ha na-aga mee nchọnchọ ma gaghachi ngwa ngwa ịkọrọ ya ihe ha chọpụtara. Dị ka Pọl onyeozi mere, ha na-eme ka ozi ọma ha kwekọọ n’ọnọdụ nke ndị ha zutere. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 9:19-23.) Inwe ụdị mmasị a n’ebe ndị mmadụ nọ na-eme ka ha ṅaa ntị n’ozi ọma ahụ ma gosipụta nnọọ “obi ọmịiko nke Chineke anyị.”—Luk 1:78.

Gosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ

14. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie àgwà Jehova ka anyị na-ekwusa ozi ọma?

14 Jehova gosiri na ya ji onye ọ bụla n’ime anyị kpọrọ ihe site n’ike anyị otú anyị ga-enwe ike ịhọrọ ihe masịrị anyị. Ọ bụ ezie na ọ bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ọ dịghị onye ọ na-amanye ka o fee ya, kama ọ na-achọ ka ndị mmadụ bịa fee ya n’ihi na ha hụrụ ya n’anya, ọ na-agọzikwa ndị gosiri ekele maka ihe ndị magburu onwe ha ọ na-emere anyị. (Rom 2:4) Ebe anyị bụ ndị ozi ya, anyị kwesịrị ịdị na-agbara ndị ọzọ àmà mgbe niile n’ụzọ na-egosi na anyị na-eṅomi Chineke anyị nwere obi ebere. (2 Kọr. 5:20, 21; 6:3-6) Iji nwee ike ime nke a, anyị kwesịrị igosi mmasị n’ebe ndị bi n’ókèala anyị nọ. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ime nke a?

15. (a) Gịnị ka Jizọs gwara ndịozi ya ka ha mee ma ọ bụrụ na ndị mmadụ ajụ ozi ha? (b) Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ilekwasị anya n’ịchọta ndị kwesịrị ekwesị?

15 Jizọs gwara ụmụazụ ya na ha ekwesịghị ichegbubiga onwe ha ókè ma ọ bụrụ na mmadụ anabataghị ozi ha bịara izi ya, kama nke ahụ ha kwesịrị ilekwasị anya n’ịchọ ndị kwesịrị ekwesị. (Gụọ Matiu 10:11-15.) Ihe nwere ike inyere anyị aka ime nke a bụ isetịpụ obere ihe mgbaru ọsọ ndị anyị ga-eruli. Otu nwanna nwoke ji onwe ya tụnyere onye na-achọ akụ̀ ndị nọ n’ime ala. N’obi ya, ọ na-atụ anya mgbe ọ bụla igwute ọlaedo. Ihe mgbaru ọsọ nwanna nwoke ọzọ bụ “ịhụ na n’izu ọ bụla na ya zutere otu onye gosiri mmasị, ma hụ na ya gaghachiri na nke onye ahụ n’egbughị oge.” Ụfọdụ ndị nkwusa na-agbalịsi ike ịgụrụ onye nwe ụlọ ọ́ dịkarịa ala otu ebe na Baịbụl ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. Olee ihe mgbaru ọsọ ga-ekwe gị oruru nke i nwere ike isetịpụrụ onwe gị?

16. Olee ihe ndị mere anyị ji kwesị ịnọgide na-ekwusa ozi ọma?

16 Ọ bụghị naanị mgbe ndị nọ n’ókèala anyị nabatara ozi ọma anyị ka anyị ga-ewere na anyị nwere ihe ịga nke ọma n’ozi anyị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ọ bụ ezie na ozi ọma na-arụ ọrụ dị mkpa n’ime ka a zọpụta ndị obi ha ziri ezi, ma e nwekwara ihe ndị ọzọ dị mkpa ọ na-arụzu. Ikwusa ozi ọma na-enye anyị ohere igosi na anyị hụrụ Jehova n’anya. (1 Jọn 5:3) Ọ na-eme ka anyị ghara ịbụ ndị ikpe ọbara ga-ama. (Ọrụ 20:26, 27) Ọ na-adọ ndị na-amaghị Chineke aka ná ntị na “oge awa nke ikpe si n’aka [Chineke] eruwo.” (Mkpu. 14:6, 7) Nke ka nke bụ́ na a na-esite n’ikwusa ozi ọma ahụ eto aha Jehova n’ụwa niile. (Ọma 113:3) N’ihi ya, ma ndị mmadụ hà gere ntị ma ọ̀ bụ na ha egeghị, anyị ga-anọgide na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. N’ezie, mgbalị niile anyị na-eme iji kwusaa ozi ọma ahụ magburu onwe ha n’anya Jehova.—Rom 10:13-15.

17. Olee ihe ndị mmadụ ga-aghọta n’oge na-adịghị anya?

17 Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị taa adịghị anabata ozi ọma anyị, ha ga-akwa mmakwaara n’oge na-adịghị anya. (Mat. 24:37-39) Jehova mere ka obi sie Ezikiel ike na mgbe okwu ikpe ahụ ọ kpọsara ga-emezu, mba Izrel na-enupụ isi “ga-amarakwa na onye amụma nọrọ n’etiti ha.” (Ezik. 2:5) N’otu aka ahụ, mgbe Chineke ga-ekpe usoro ihe a ikpe, ndị mmadụ ga-aghọta na ọ bụ otu ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova dunyere Ndịàmà Jehova ozi ahụ ha kwusara n’ihu ọha na site n’ụlọ ruo n’ụlọ nakwa na ọ bụ Ndịàmà a na-anọchite anya Jehova n’ezie. Anyị nwere nnọọ ihe ùgwù magburu onwe ya ịza aha Jehova na ikwusa ozi ya n’oge ndị a dị oké mkpa! Site n’enyemaka ya, ka anyị nọgide na-emeri ihe isi ike ndị anyị na-enweta n’ozi ụlọ n’ụlọ.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú anyị ga-esi nwee ike ikwusa ozi ọma n’atụghị egwu?

• Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ịmalite mkparịta ụka dabeere na Baịbụl mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

• Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị nwere ezigbo mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ?

• Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịnọgide na-egosi mmasị n’ebe ndị bi n’ókèala anyị nọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

Ụzọ Isi Malite Mkparịta Ụka Ndị Dabeere na Baịbụl

Iji Malite:

▪ Mgbe i kelechara onye nwe ụlọ, i nwere ike inye ya traktị ma kwuo, sị, “Ihe mere m ji bịa n’ụlọ gị taa bụ ịkọrọ gị otu ihe na-agba ume n’isiokwu a dị mkpa.”

▪ Ma ọ bụkwanụ i nwere ike inye ya traktị ma kwuo, sị, “Abịara m n’ụlọ gị taa n’ihi na m chọrọ ịma ná mkpirikpi ihe i nwere ikwu n’isiokwu a.”

Ọ bụrụ na ọ naara traktị ahụ:

▪ Egbula oge ịjụ ya ihe o chere banyere isiokwu traktị ahụ.

▪ Gee ya ntị nke ọma ma mata ihe o chere. Jiri obiọma kelee ya maka ihe o kwuru.

Iji gaa n’ihu n’okwu unu:

▪ Gụọ ma kọwaa otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ karịa, na-eme ka okwu gị kwekọọ n’ihe ndị na-amasị onye ahụ na mkpa ndị o nwere.

▪ Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ egosi mmasị, nye ya akwụkwọ e ji amụ Baịbụl ma gosi ya otú e si eji ya amụ Baịbụl ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. Gwa ya na ị ga-alọghachi.