Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt

IHE na-eme n’ọgbakọ dị na Kọrịnt na-echu Pọl onyeozi ụra. Ọ nụla na ụmụnna nọ n’ebe ahụ nwere nsogbu n’etiti onwe ha. Ha na-agbachikwa ndị na-eme omume rụrụ arụ nkịtị. Ha edekwaarala Pọl akwụkwọ iji jụta ya ihe ụfọdụ. N’ihi ya, n’ihe dị ka n’afọ 55 O.A., bụ́ mgbe Pọl nọ na njem ozi ala ọzọ ya nke atọ n’Efesọs, o degaara ndị Kọrịnt akwụkwọ ozi nke mbụ n’ime akwụkwọ ozi abụọ o degaara ha.

Akwụkwọ ozi ya nke abụọ, bụ́ nke o yiri ka ò dere ya ọnwa ole na ole o dechara nke mbụ, bụ ebe o dechapụrụ ihe o defọrọ na nke mbụ. Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ụzọ ihe ndị na-eme ma n’obodo Kọrịnt nke narị afọ mbụ ma n’ọgbakọ e nwere n’oge ahụ si yie ihe ndị na-eme taa, ihe Pọl dere n’akwụkwọ ozi ndị ahụ o degaara ndị Kọrịnt baara anyị nnọọ uru taa.—Hib. 4:12.

‘MỤRỤNỤ ANYA, GUZOSIENỤ IKE, DỊNỤ IKE’

(1 Kọr. 1:1–16:24)

Pọl gbara ume, sị: “Ka unu niile na-ekwu otu ihe.” (1 Kọr. 1:10) ‘Ọ dịghị ntọala ọzọ a tọworo karịa Kraịst’ bụ́ ebe Ndị Kraịst ga-ewukwasị àgwà ha. (1 Kọr. 3:11-13) Pọl kwuru banyere onye na-akwa iko n’ọgbakọ ahụ, sị: “Wepụnụ onye ọjọọ ahụ n’etiti unu.” (1 Kọr. 5:13) O kwuru, sị: “Ahụ́ adịrịghị ịkwa iko, kama ọ dịịrị Onyenwe anyị.”—1 Kọr. 6:13.

Iji zaa ha “ihe ndị ahụ [ha] dere maka ha,” Pọl dụrụ ha ọdụ n’ihe banyere ịlụ di na nwunye na ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. (1 Kọr. 7:1) Mgbe Pọl kwuchara okwu banyere ịbụisi n’ọgbakọ Ndi Kraịst, otú ọmụmụ ihe ọgbakọ kwesịrị isi na-aga n’usoro na n’ụzọ kwesịrị ekwesị, nakwa banyere mbilite n’ọnwụ, ọ dụrụ ọdụ, sị: “Mụrụnụ anya, guzosienụ ike n’okwukwe, na-emenụ ka ndị dimkpa, dịnụ ike.”—1 Kọr. 16:13.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:21—Ọ̀ bụ eziokwu na Jehova ji ihe “nzuzu” zọpụta ndị kwere ekwe? Mba. Ma, ebe ọ bụ na “ụwa esighị n’amamihe ya mara Chineke,” ihe o ji azọpụta ndị mmadụ yiri ihe nzuzu n’anya ụwa.—Jọn 17:25.

5:5—Gịnị ka ‘inyefe nwoke ahụ na-eme ihe na-adịghị mma n’aka Setan ka e bibie mmetụta anụ ahụ́ na-enwe, ka e wee chebe ọnọdụ ime mmụọ,’ pụtara? Ọ bụrụ na e si n’ọgbakọ chụpụ onye mere mmehie dị oké njọ nke na-achọghị ichegharị, ọ na-aghọghachị akụkụ nke ụwa ọjọọ Setan. (1 Jọn 5:19) N’ihi ya, a pụrụ ikwu na e nyefeela ya n’aka Setan. Ịchụpụ onye ahụ ga-apụta ibibi, ma ọ bụ iwepụ, àgwà ọjọọ onye ahụ n’ọgbakọ na ichebe mmụọ, ma ọ bụ àgwà e nwere n’ọgbakọ.—2 Tim. 4:22.

7:33, 34—Gịnị bụ “ihe nke ụwa” bụ́ nke onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye na-echegbu onwe ya maka ya? Pọl na-ekwu banyere ihe ndị mmadụ na-achụ ná ndụ, bụ́ ihe Ndị Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye na-echegbu onwe ha maka ya. Ha bụ nri, uwe, na ụlọ, ma ihe ọjọọ ndị a na-eme n’ụwa, bụ́ nke a gwara Ndị Kraịst ka ha zere, esoghị ya.—1 Jọn 2:15-17.

11:26—Ugboro ole ka a ga na-echeta ọnwụ Jizọs, ‘ruokwa’ ole mgbe? Pọl adịghị ekwu na a ga na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs oge niile. Kama nke ahụ, ihe ọ na-ekwu bụ na mgbe ọ bụla Ndị Kraịst e tere mmanụ na-eri ihe nnọchianya e ji echeta ọnwụ Jizọs, otu ugboro n’afọ na Naịsan 14, ha “na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị.” Ha na-eme nke a “ruo mgbe ọ ga-abịarute,” ya bụ, ruo mgbe ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ gaa eluigwe.—1 Tesa. 4:14-17.

13:13—Olee otú ịhụnanya si kara okwukwe na olileanya? Okwukwe na olileanya anaghịzi adị mkpa ozugbo “ihe ndị a na-ele anya ha” mezuru. (Hib. 11:1) Ịhụnanya karịrị okwukwe na olileanya n’echiche bụ́ na ọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.

15:29—Gịnị ka ‘ime mmadụ baptizim ka o wee ghọọ onye nwụrụ anwụ’ pụtara? Ihe Pọl na-ekwu n’ebe a abụghị ka ndị dị ndụ mechitere ndị nwụrụ anwụ baptizim, bụ́ ndị a na-emebeghị baptizim tupu ha anwụọ. Ihe Pọl na-ekwu bụ imikpu Ndị Kraịst e tere mmanụ n’ime ụdị ndụ ga-achọ ka ha nọgide na-eme ezi ihe ruo mgbe ha nwụrụ, mgbe ahụzi a kpọlite ha n’ọnwụ gaa eluigwe dị ka mmụọ.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:26-31; 3:3-9; 4:7. Iwetu onwe anyị ala ma jiri Jehova na-anya isi, ọ bụghị onwe anyị, na-eme ka ọgbakọ dị n’otu.

2:3-5. Mgbe Pọl na-ekwusa ozi ọma na Kọrịnt, bụ́ ebe bụ́ isi a na-amụ nkà ihe ọmụma ndị Grik nakwa ebe a na-agụ oké akwụkwọ, o nwere ike ọ nọ na-eche ma ya ga-agwali ndị na-ege ya ntị okwu otú ha ga-esi kweta n’ihe ọ na-ekwu. Ma o kweghị ka nke a ma ọ bụ ụjọ mee ka ọ ghara izi ozi Chineke gwara ya zie. Anyị ekwesịghịkwa ikwe ka ihe ọ bụla gbochie anyị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Dị ka Pọl mere, anyị kwesịrị ịtụkwasị Chineke obi na ọ ga-enyere anyị aka ma nwee obi ike na ọ ga-eme nke a.

2:16. Inwe “uche nke Kraịst” bụ ịma otú Kraịst si eche echiche na ihe mere o ji eche echiche otú ahụ, ọ pụtakwara iche echiche ka Kraịst, ịmara àgwà ya nke ọma, nakwa iṅomi ya. (1 Pita 2:21; 4:1) Ọ dị nnọọ oké mkpa na anyị ga-atụle nke ọma otú Jizọs si bie ndụ na otú o si jee ozi!

3:10-15; 4:17. Anyị kwesịrị ichebara otú anyị si akụzi ihe echiche nakwa otú anyị si eme ndị na-eso ụzọ, ma gbalịa ime ha n’ụzọ ka mma. (Mat. 28:19, 20) Ọ bụrụ na anyị adịghị ezi ihe nke ọma, onye anyị na-amụrụ ihe nwere ike ịda ma ọnwụnwa bịara ya, nke a nwekwara ike iwute anyị nke ukwuu nke na nzọpụta anyị “ga-adị ka ọ bụ site n’ọkụ.”

6:18. ‘Ịgbara ịkwa iko ọsọ’ abụghị naanị izere àgwà ndị bụ́ por·neiʹa kamakwa ọ gụnyere izere ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, izere omume ndị na-adịghị ọcha, ịghara ịdị na-eche banyere mmekọahụ, ịghara ịchụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ya bụ, izere ime ihe ọ bụla nwere ike iduga n’ịkwa iko.—Mat. 5:28; Jems 3:17.

7:29. Ndị lụrụ di na nwunye kwesịrị ịkpachara anya ịghara ịdị na-eche naanị banyere di ma ọ bụ nwunye ha nke na ịrụ ọrụ Alaeze ahụ na-aghọzi ihe nke abụọ ná ndụ ha.

10:8-11. Ụmụ Izrel kpasuru nnọọ Jehova iwe mgbe ha tamuru ntamu megide Mozis na Erọn. Anyị ga-egosi na anyị maara ihe ma ọ bụrụ na anyị ezere ịtamu ntamu.

16:2. Anyị agaghị na-echefu inye onyinye ego iji na-akwado ihe ndị metụtara Alaeze ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ kpebie ihe anyị ga-enye na otú anyị ga-esi na-enye ya.

“NỌGIDENỤ BỤRỤ NDỊ A NA-AGBAZI”

(2 Kọr. 1:1–13:14)

Pọl gwara ndị Kọrịnt na ha kwesịrị iji “obiọma gbaghara ma kasie” onye mmehie chegharịrị echegharị a dọrọ aka ná ntị obi. Ọ bụ ezie na akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ha wutere ha, obi tọrọ ya ụtọ n’ihi na o ‘wutere ha, ha wee chegharịa.’—2 Kọr. 2:6, 7; 7:8, 9.

‘Dị nnọọ ka ndị Kọrịnt bara ọgaranya n’ihe niile,’ Pọl gbara ha ume ka ha ‘baakwa ọgaranya n’inye ihe.’ Mgbe ọ gwachara ndị mmegide okwu, o nyere mmadụ niile ndụmọdụ ikpeazụ a: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ, nọgidenụ bụrụ ndị a na-agbazi, ndị a na-akasi obi, ndị nwere otu uche, na-ebinụ n’udo.”—2 Kọr. 8:7; 13:11.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:15, 16—Olee otú anyị si bụrụ “ísìsì ụtọ nke Kraịst”? Anyị bụ ísìsì ụtọ nke Kraịst n’ihi na anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru ma na-akọrọ ya ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ihe a “na-esi ísì ụtọ” nwere ike ịdị na-esi ndị ajọ omume ísì ọjọọ, ọ na-esi Jehova na ndị nwere obi eziokwu ísì ụtọ.

5:16—Olee otú o si bụrụ na ndị e tere mmanụ “amaghị onye ọ bụla dị ka anụ ahụ́ si dị”? Ha adịghị ele mmadụ anya dị ka anụ ahụ́ si dị, ya bụ, imelara mmadụ ihe n’ihi na ọ bara ọgaranya, n’ihi agbụrụ o si na ya, ma ọ bụ n’ihi mba onye ahụ si. Ihe ka ha mkpa bụ iso ndị kwere ekwe ibe ha na-emekọrịta ihe.

11:1, 16; 12:11—Pọl ò mesoro ndị Kọrịnt ihe ka onye na-enweghị ezi uche? Mbanụ. Ma, ọtụtụ ndị nwere ike ile ya anya ka onye nganga na onye na-enweghị ezi uche n’ihi ihe ụfọdụ mmadụ mere ka o kwuo mgbe ọ chọrọ ime ka ha ghọta na ya bụ onyeozi n’ezie.

12:1-4—Ònye ka ‘e bugara na paradaịs’? Ebe Baịbụl na-ekwughị banyere onye ọ bụla ọzọ hụrụ ụdị ọhụụ a, ya abụrụkwa na e kwuru ihe a ozugbo Pọl kọchara otú o si bụrụ onyeozi, ọ ga-abụ na Pọl na-akọ banyere ahụmahụ o nwere n’onwe ya. Ọ ga-abụ na ihe onyeozi ahụ hụrụ n’ọhụụ bụ paradaịs ime mmụọ nke ọgbakọ Ndị Kraịst nọ na ya “n’oge ikpeazụ” a.—Dan. 12:4.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

3:5. Ihe amaokwu a na-agwa anyị bụ na Jehova na-eji Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na akụkụ nzukọ ya nke dị n’ụwa, eme ka Ndị Kraịst ruo eruo ikwusa ozi ọma ahụ. (Jọn 16:7; 2 Tim. 3:16, 17) Anyị kwesịrị ịdị na-amụchi Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl anya, nọgide na-ekpe ekpere ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ, na-agachikwa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya ma na-ekere ókè n’ihe omume ndị a na-eme.—Ọma 1:1-3; Luk 11:10-13; Hib. 10:24, 25.

4:16. Ebe ọ bụ na Jehova “na-eme ka mmadụ anyị bụ n’ime dị ọhụrụ kwa ụbọchị,” anyị kwesịrị ịgbalị irite uru mgbe niile ná ndokwa ndị Jehova mere, ghara ikwe ka otu ụbọchị gafee n’emeghị ihe ga-eme ka mmekọrịta anyị na Jehova na-esikwu ike.

4:17, 18. Icheta na “mkpagbu ahụ na-adịru nwa oge, dịkwa mfe” nwere ike inyere anyị aka ịnọgide n’akụkụ Jehova n’oge ihe tara akpụ.

5:1-5. Pọl ji nnọọ okwu mara mma kọwaa otú obi dị ndị e tere mmanụ n’ihi olileanya ha nwere ibi n’eluigwe!

10:13. Anyị ga-amara na ọ gwụkwala ma e zigara anyị ịga nye aka n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu, ebe anyị kwesịrị ịdị na-ekwusa ozi ọma bụ naanị n’ókèala e kenyere ọgbakọ anyị.

13:5. Iji ‘nwalee ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ,’ anyị kwesịrị ịhụ na anyị na-akpa àgwà otú Baịbụl kwuru ka anyị si na-akpa àgwà. Iji ‘na-anwapụta ihe anyị onwe anyị bụ,’ anyị kwesịrị ichebara mmekọrịta anyị na Jehova echiche ma ọ̀ ka sikwara ike, anyị kwesịkwara ịma ma “ikike nghọta” anyị ọ̀ ka dị nkọ, marakwa otú okwukwe anyị siruru n’ike. (Hib. 5:14; Jems 1:22-25) Ọ bụrụ na anyị etinye ndụmọdụ a bụ́ ịgba Pọl nyere n’ọrụ, anyị ga-anọgide na-eje ije n’ụzọ nke eziokwu ahụ.

[Foto dị na peeji nke 26, 27]

Gịnị ka okwu bụ́ “n’oge niile unu na-ata ogbe achịcha a ma na-aṅụ iko a” pụtara?—1 Kọr. 11:26