Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ị Ga-eruli ma Nwee Ọṅụ

Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ị Ga-eruli ma Nwee Ọṅụ

Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ị Ga-eruli ma Nwee Ọṅụ

“O NWEGHỊZI ihe m na-emeli!” Ugboro ole ka i kwutụrụla ụdị ihe a n’ihi na i nweghị ike imezu ihe i zubere ime? Nne bụ́ Onye Kraịst na-akatabeghị ahụ́ nwere ike ikwu ụdị ihe a n’ihi otú o si dị nnọọ mkpa na ọ ga na-elekọta nwa ọhụrụ ya, ya ana-ewutekwa ya na o nweghịzi ike itinye uche n’ihe ndị metụtara ozi Jehova dị ka o kwesịrị. O nwere ike ịdị Onye Kraịst ọzọ ka ọ dịghị ihe ya dị mma ya n’ihi otú e si zụlite ya nke mere ka o chee na ya enweghị ike imeli ihe a chọrọ n’aka ya n’ọgbakọ. O nwekwara ike ịdị na-ewute Onyeàmà merela agadi na ya adịghị eso eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ dị ka ọ na-emebu mgbe ume ka dị ya n’ahụ́. Christiane, bụ́ onye ọnọdụ ezinụlọ ya gbochiri ime ihe ọ ga-achọ ime n’ozi Jehova kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, naanị okwu a na-ekwu iji gbaa ndị mmadụ ume ka ha banye ọrụ ọsụ ụzọ ezuola ime ka m bewe ákwá.”

Gịnị ka anyị nwere ike ime mgbe ọ bụla ọ dị anyị otú a? Olee otú ụfọdụ Ndị Kraịst sirila setịpụ ihe mgbaru ọsọ ọnọdụ ha ga-ekwe ha ruo? Olee uru ọ na-aba ma mmadụ setịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ga-ekwe ya oruru?

Gosi na I Nwere Ezi Uche

Pọl onyeozi gwara anyị ihe ga-eme ka anyị nọgide na-enwe ọṅụ mgbe ọ sịrị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile n’ime Onyenwe anyị. Aga m asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ! Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche.” (Fil. 4:4, 5) Iji nwee ọṅụ na afọ ojuju n’ozi anyị na-ejere Chineke, anyị kwesịrị inwe ezi uche n’ihe anyị na-atụ onwe anyị anya n’aka, na-echeta ihe anyị nwere ike imeli na ọnọdụ anyị. Ọ bụrụ na anyị a na-esi ọnwụ ime ihe anyị na-agaghị emeli, anyị ga-enye ndụ anyị nsogbu. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịdị na-emere onwe anyị ebere gabiga ókè, jiri ihe anyị weere na ọ bụ adịghị ike anyị mere ihe anyị ga-akụdo aka na-ala azụ n’ozi Jehova otú na-ekwesịghị.

N’agbanyeghị ihe bụ́ ọnọdụ anyị, Jehova chọrọ ka anyị nye ya ihe kasị mma anyị nwere—ya bụ, ka anyị jiri obi anyị dum na-ejere ya ozi. (Kọl. 3:23, 24) Ọ bụrụ na ihe anyị na-enye Jehova abụghị ihe kacha mma anyị nwere ike inye ya, ọ pụtara na anyị adịghị eme ihe kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye ya. (Rom 12:1) E wezụga nke ahụ, anyị agaghị na-enwe afọ ojuju, ezigbo ọṅụ, na ngọzi ndị ọzọ bara ụba a na-enweta site n’iji obi dum na-ejere Jehova ozi.—Ilu 10:22.

Okwu a sụgharịrị ịbụ “ezi uche” na Baịbụl pụtakwara mmadụ ichebara onwe ya echiche. Ihe ọ pụtara n’ụzọ nkịtị bụ ikwenye ekwenye. Okwu ahụ pụtakwara mmadụ ịghara ịta ndụ ya ahụhụ. Ya mere, ọ bụrụ na anyị nwere ezi uche, anyị ga-enwe ike ile ọnọdụ anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Nke ahụ ò siri ike omume? Ọ na-esiri ụfọdụ ike, ọ bụ eziokwu na ha onwe ha na-emetere ndị ọzọ ebere. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ike na-agwụkarị enyi anyị n’ihi na ọ na-adọlịgbu onwe ya, ọ̀ bụ na anyị agaghị agbalị inyere ya aka site n’ịgwa ya ihe mere o ji dị mma ka ọ hazigharịa ihe ụfọdụ ná ndụ ya? N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị ịghọta ihe ndị na-egosi na anyị na-adọlịgbu onwe anyị.—Ilu 11:17.

Ọ na-esi ike mmadụ ịma ihe ọ ga-emeli ma ọ bụrụ na ọ bụ nne na nna ọ na-esi ike imeta ha mma zụlitere ya. Mgbe ndị ụfọdụ dị obere, ha na-adọlị ịhụ na ha metere ihe niile nke ọma ka ndị mụrụ ha wee nwee ike ịhụ ha n’anya. Ọ bụrụ na ọ dị anyị otú ahụ, anyị nwere ike inwe echiche na-ezighị ezi banyere otú Jehova si ele anyị anya. Jehova hụrụ anyị n’anya n’ihi na anyị ji obi anyị dum na-ejere ya ozi. Okwu Chineke na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova “maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, Ọ na-echeta na anyị bụ ájá.” (Ọma 103:14) Ọ maara ihe ndị anyị na-agaghị emeli, ọ na-ahụkwa anyị n’anya mgbe anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere ya ozi otú ike anyị ha. Icheta na Chineke anyị abụghị onye ọ na-esi ike imeta mma ga-enyere anyị aka ịghara ịtụ anya ime ihe anyị na-agaghị emeli, kama na-amara otú ike anyị ha.—Maị. 6:8.

Ma, ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ịma otú ike ha ha. Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, gbalịanụ jekwuru Onye Kraịst nwere ahụmahụ nke maara gị nke ọma ka o nyere gị aka. (Ilu 27:9) Dị ka ihe atụ, ị̀ chọrọ ịbanye ọrụ ọsụ ụzọ oge niile? Nke ahụ magburu onwe ya! Ọ̀ na-esiri gị ike ịmalite? Eleghị anya ị chọrọ enyemaka iji kpakọọ ndụ gị ọnụ. Ma ọ bụkwanụ ezigbo enyi gị nọ n’ọgbakọ nwere ike inyere gị aka ịma ma ọtụtụ ibu ezinụlọ i bu hà ga-ekwe gị ịmalite ọrụ ọsụ ụzọ ugbu a. Enyi gị ahụ nwere ike inyere gị aka ịma ma ọrụ ndị ị na-achọ iwerekwu hà ga-agbaji gị aka, ma ọ bụkwanụ onye ahụ nwere ike inyere gị aka ịmara mgbanwe ndị ị pụrụ ime iji nwee ike imekwu ihe n’ozi Jehova. Di nwekwara ike inyere nwunye ya aka ịma ihe o nwere ike imeli. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịgwa ya ka o zuo ike nke ọma tupu ya amalite ijekwu ozi dị ukwuu n’ọnwa ọhụrụ. Nke a nwere ike ime ka o nwetakwuo ume ma nyere ya aka ịnọgide na-enwe ọṅụ n’ozi ya.

Chọọ Ihe Ndị Ị Ga-emeli

Nká na ọrịa nwere ike igbochi anyị ime ihe anyị ga-achọ ime n’ozi Jehova. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, o nwere ike ịdị gị ka ị naghị eritecha uru otú kwesịrịnụ n’ọmụmụ ihe onwe onye ma ọ bụ n’ọmụmụ ihe ọgbakọ n’ihi na i ji oge na ume gị na-elekọta ụmụ gị. Ma, ọ̀ ga-abụ na ilekwasị nnọọ anya n’ihe ndị ị na-agaghị emeli na-egbochi gị ịhụ ihe ndị ị ka nwere ike ime?

Ọtụtụ puku afọ gara aga, otu onye Livaị kwupụtara ọchịchọ ya ime otu ihe na-agaghị ekwe ya omume. O nwere ohere ije ozi n’ụlọ nsọ izu abụọ n’afọ ọ bụla. Ma o kwupụtara ọchịchọ mara mma o nwere ibirizi ebiri n’akụkụ ebe ịchụàjà. (Ọma 84:1-3) Gịnị nyeere nwoke a kwesịrị ntụkwasị obi aka ikwe ka ihe ùgwù nke o nwere ju ya afọ? Ọ chọpụtara na ọbụna ịnọ otu ụbọchị n’ogige ụlọ nsọ bụ ihe ùgwù pụrụ iche. (Ọma 84:4, 5, 10) N’otu aka ahụ, kama ịnọ na-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị anyị na-agaghị emeli, anyị kwesịrị ịgbalị ịma ihe ndị anyị ga-emeli ma nwee ekele maka ha.

Were Nerlande, bụ́ nwanna nwaanyị bi na Canada dị ka ihe atụ. Ọ na-anọ n’oche nkwagharị, nke a mekwara ka ọ ghara ịdị na-agaru ozi ọma ókè ọ ga-achọ ịgaru. Ma ọ gbanwere otú o si ele ihe anya ma were otu ebe e nwere ọtụtụ ụlọ ahịa nọ ya nso mere ebe ọ ga na-ekwusa ozi ọma. O kwuru, sị: “M na-anọ n’oche nkwagharị m ná nso otu bench dị n’ebe ahụ e nwere ọtụtụ ụlọ ahịa. Ọ na-atọ m ụtọ ịgbara ndị bịara nọrọ ọdụ iji zurutụ ike àmà.” Isi otú a na-ekwusa ozi ọma na-enye Nerlande obi ụtọ dị ukwuu.

Mee Mgbanwe Ma Ọ́ Dị Mkpa

Ụgbọ mmiri nwere ike ịdị na-efe ọsọ ka ikuku na-eku ákwà ifufe ya. Ma, mgbe oké ifufe bịara, ọkwọ ụgbọ mmiri ahụ na-emezigharị ákwà ifufe ụgbọ ya. Ọ gaghị achịkwali oké ifufe ahụ, ma ọ bụrụ na o mezigharịa ihe ụfọdụ, ọ ka nwere ike iduzi ụgbọ ya ka o chee ihu ebe kwesịrịnụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọtụtụ mgbe, anyị agaghị egbochili nsogbu ndị yiri oké ifufe na-abịara anyị ná ndụ. Ma anyị nwere ike ịchịkwa ndụ anyị ruo ókè anyị nwere ike site n’ịgbanwe otú anyị si eji ike anyị, ọgụgụ isi anyị, na uche anyị eme ihe. Ọ bụrụ na anyị aghọta na ọnọdụ anyị agbanweela, nke a ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe afọ ojuju na ọṅụ n’ozi Chineke.—Ilu 11:2.

Tụlee ihe atụ ụfọdụ. Ọ bụrụ na ume adịchaghị anyị, ọ ga-aka mma ma anyị hapụ ịrụ ọrụ ndị na-agwụ ike n’ụbọchị ka anyị wee nwee ike ịga ọmụmụ ihe n’uhuruchi. Nke a ga-eme ka anyị nwee ike irite nnọọ uru site n’iso ụmụnna anyị ezukọ. Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na otu nwanna nwaanyị enweghị ike iso gaa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ihi na nwa ya ejighị ahụ́, o nwere ike ịgwa nwanna nwaanyị ọzọ ka ọ kpọrọ onye ọ na-amụrụ ihe bịa n’ụlọ ya ka ya na ya soro mụọrọ onye ahụ ihe mgbe nwa ya na-ehi ụra.

Oleekwanụ ma ọ bụrụ ma ọnọdụ gị ekweghị gị kwadebe ihe niile a ga-amụ n’ọmụmụ ihe ọgbakọ? I nwere ike ikpebi ókè ị ga-akwadebeli ma kwadebe ha nke ọma dị ka i nwere ike. Site n’imezigharị ihe mgbaru ọsọ ndị anyị pụrụ iru ngwa ngwa, anyị nwere ike inwe ihe ndị anyị ga na-eme ma nwee obi ụtọ.

Ịgbanwe ihe mgbaru ọsọ anyị nwere ike ịchọ obi ike na mgbalị siri ike n’aka anyị. Serge na Agnès, bụ́ di na nwunye bi na France, gbanwere nnọọ ihe ha bubu n’uche ime. Serge kwuru, sị: “Mgbe anyị chọpụtara na Agnès dị ime, anyị maara na anyị agaghị aghọkwa ndị ozi ala ọzọ dị ka anyị chọrọ. Serge, onye bụzi nna ọmarịcha ụmụ nwaanyị abụọ, kọwara otú ha si setịpụ ihe mgbaru ọsọ ọhụrụ. Ọ na-ekwu, sị: “Ebe ọ bụ na anyị enweghịzi ike ije ozi ná mba ọzọ, anyị kpebiri ịghọ ‘ndị ozi ala ọzọ’ ná mba anyị. Anyị sonyere otu ìgwè na-asụ asụsụ ala ọzọ.” Hà ritere uru n’ihe mgbaru ọsọ ọhụrụ a ha setịpụrụ? Serge kwuru, sị: “Obi anyị na-agwa anyị na anyị bara ezigbo uru n’ọgbakọ.”

Odile bụ nwanna nwaanyị nọ na France onye dị afọ iri asaa nke na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo n’ikpere, bụ́ nke mere ka ọ ghara inwe ike iguzo ọtọ ruo ogologo oge. Obi adịghị ya mma na ọrịa ya adịghị ekwe ka o soro na-aga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ma ọ daghị mbà. Ọ gbanwere ihe ndị ọ na-eme ma jiri telifon na-agba àmà. O kwuru, sị: “Ọ dị mfe omume ma na-atọ ụtọ karịa ka m chere!” Ụzọ a o sizi na-ekwusa ozi ọma mere ka ọ maliteghachi ịnụ ọkụ n’obi n’ozi ọma.

Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Ga-ekwe Oruru Na-eweta Obi Ụtọ

Ịma ihe anyị ga-emeli ga-eme ka anyị ghara ịdị na-enwe mwute ọtụtụ mgbe. Ọ bụrụ na anyị esetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ga-ekwe oruru, anyị ga-enwe obi ụtọ ná ndị anyị metere n’agbanyeghị na ha adịghị nnukwu. N’ụzọ dị otú a, ihe anyị rụzuru ga na-enye anyị ọṅụ n’agbanyeghị na ha dị obere.—Gal. 6:4.

Ọ bụrụ na anyị esetịpụrụ onwe anyị ihe mgbaru ọsọ ndị ga-ekwe anyị oruru, anyị ga-enwe ike ịghara ịchọ oké ihe n’aka Ndị Kraịst ibe anyị. Ebe anyị maara ihe ha nwere ike imeli, anyị ga na-ekele ha mgbe niile maka ihe ndị ha meere anyị. Ọ bụrụ na anyị na-ekele ndị ọzọ maka enyemaka ọ bụla anyị nwetara n’aka ha, anyị ga-eme ka e nwee mmụọ imekọ ihe ọnụ na ịdị n’otu. (1 Pita 3:8) Cheta na Jehova, bụ́ Nna nke na-ahụ n’anya, adịghị achọ ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. Mgbe anyị setịpụkwara ihe mgbaru ọsọ ndị ezi uche dị na ha na ndị ga-ekwe oruru, ihe ndị anyị na-eme n’ozi Jehova ga-enye anyị afọ ojuju na ọṅụ.

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo dị na peeji nke 29]

Iji nwee ọṅụ na afọ ojuju n’ozi anyị na-ejere Chineke, anyị kwesịrị isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ikike anyị na ọnọdụ anyị ga-ekwe anyị ruo

[Foto dị na peeji nke 30]

Nerlande nwere ọṅụ ime ihe o nwere ike ime n’ozi ọma

[Foto dị na peeji nke 31]

Mụta “imezigharị ákwà ifufe”

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Wave Royalty Free/age fotostock

[Foto dị na peeji nke 32]

Isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ọhụrụ baara Serge na Agnès uru