Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Legodị ma ị ga-azali ajụjụ ndị a na-esonụ:

• Olee nsogbu ụfọdụ Ndị Kraịst na-enweta mgbe ha gbachara akwụkwọ, oleekwa ihe ha kwesịrị ịgbalị ịhụ na ha mere?

Ụfọdụ Ndị Kraịst nwere ike ịchọpụta na ihe anaghị adabachara ha na onye ha lụrụ. Ebe ọ bụ na ha maara na ịgba alụkwaghịm n’ihi ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị abụghị ụzọ kwesịrị ekwesị isi dozie nsogbu, ha na-agbalịsi ike ịhụ na alụmdi na nwunye ha etisaghị.—4/15, peeji nke 17.

• Olee ihe isi ike ndị Onye Kraịst nọ n’ebe a na-elekọta ndị agadi nwere ike inwe?

O nwere ike ọ maghị ọgbakọ ebe ahụ a na-elekọta ndị agadi dị n’ókèala ha. O nwekwara ike ịbụ na ndị ha na ya nọ n’ebe ahụ na-ekpe okpukpe dị iche iche, ha nwekwara ike ịchọ ime ya ka o sonyere ha n’ihe ndị okpukpe ha na-eme. Ndị ikwu onye agadi ahụ na ndị nọ n’ọgbakọ dị ebe ahụ kwesịrị ịghọta nsogbu ndị a ma nye aka ilekọta ya.—4/15, peeji nke 25-27.

• Olee ihe anọ nwere ike inyere di na nwunye aka idozi nsogbu ndị ha na-enwe?

Wepụtanụ oge unu ga-eji kwurịta nsogbu unu nwere. (Ekli. 3:1, 7) Jiri nkwanye ùgwù kwuo otú ọ dị gị n’obi. (Efe. 4:25) Gee di gị ma ọ bụ nwunye gị ntị ma ghọta otú obi dị ya. (Mat. 7:12) Kwekọrịtanụ ihe unu ga-eme ma mekọọnụ ya ọnụ. (Ekli. 4:9, 10)—5/1, peeji nke 10-12.

• Mgbe Jizọs kwuru ka anyị na-ekpe ekpere ka a gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, olee ụgwọ ọ̀ na-ekwu maka ya?

Ịtụle ihe e dere na Matiu 6:12 na nke dị na Luk 11:4 mere ka o doo anya na Jizọs adịghị ekwu banyere ụgwọ ego. Ihe ọ na-ekwu okwu ya bụ mmehie. Anyị kwesịrị iṅomi Chineke site n’ịdị njikere ịgbaghara ndị mehiere anyị.—5/15, peeji nke 9.

• Olee Kọmitii dị iche iche ndị so n’Òtù Na-achị Isi nọ na ha?

Kọmitii Nhazi; Kọmitii Ndị Ọrụ; Kọmitii Mbipụta; Kọmitii Ije Ozi; Kọmitii Izi Ihe; Kọmitii Ihe Odide.—5/15, peeji nke 29.

• Olee ihe mere ka obi sie anyị ike na Iju Mmiri ahụ e nwere n’oge Noa zuru ụwa ọnụ?

Jizọs kwetara na e nwere Iju Mmiri nakwa na o zuru ụwa ọnụ. Ịdọ aka ná ntị ndị e nyere na Baịbụl, bụ́ ndị hiwere isi n’Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ gosiri na o mere eme.—6/1, peeji nke 8.

• Ọ̀ bụ ndị Juu ka ọ̀ bụ ndị Jentaịl mere omume ahụ e kwuru okwu ya ná Ndị Rom 1:24-32?

O nwere ike ịbụ ndị Juu ma ọ bụ ndị Jentaịl, ma ndị Pọl onyeozi na-ekwu okwu ha kpọmkwem bụ ndị Izrel oge ochie, bụ́ ndị na-erubeghị isi n’Iwu ahụ ruo ọtụtụ narị afọ. Ha maara ihe bụ́ iwu Chineke, ma ha edebeghị ya.—6/15, peeji nke 29.

• Ebee ka Tel Arad dị, gịnịkwa mere o ji dị mkpa?

Mkputamkpu ala a dị n’Izrel bụ ebe obodo a kpọrọ Erad n’oge ochie dịbu. Obodo a dị n’ebe ọdịda anyanwụ nke Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka e gwupụtara mpekere ihe dị iche iche e ji ụrọ kpụọ bụ́ ndị e ji mere ihe e ji ede ihe. A hụrụ ụfọdụ aha ndị e dere na Baịbụl n’ihe ndị ahụ e ji ede ihe e gwupụtara, ha gosikwara na aha Chineke dị n’ihe ndị ọzọ na-abụghị Baịbụl.—7/1, peeji nke 23-24.

• Olee otú isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị anyị ga-eruli ga-esi nyere anyị aka inwekwu ọṅụ?

Ọ bụrụ na anyị a na-esi ọnwụ ime ihe anyị na-agaghị emeli n’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe, anyị ga-enye ndụ anyị nsogbu. Ma, anyị ekwesịghị ịdị na-emere onwe anyị ebere gabiga ókè, jiri ihe anyị weere na ọ bụ adịghị ike anyị mere ihe anyị ga-akụdo aka na-ala azụ n’ozi Jehova.—7/15, peeji nke 29.

• Olee ihe ndị nwere ike ime ka o siere ndị nne na nna ike ha na ụmụ ha ndị na-eto eto ịdị na-enwe ezigbo nkwurịta okwu?

Ihe ụfọdụ na-egbochi inwe ezigbo nkwurịta okwu nwere ike ịbụ na nwa ahụ na-eto eto achọghịzi ịdị na-atụpụrụ ndị ọzọ ọnụ, ọ chọrọ inwere onwe ya, nakwa mgbe ụfọdụ ọ ga-achọ ịnọrọ onwe ya. Ọ ga-adị mma ma ndị nne na nna gbalịa ịhụ na ha na ụmụ ha na-akparịta ụka site n’ịhazi ka ha na ha mekọọ ihe ụfọdụ ọnụ, nke a ga-eme ka ndị na-eto eto nwekwuo mmasị ikwu okwu. Ha ga-agbalịzi si n’ihe ụmụ ha na-ekwu ghọta otú obi dị ha.—8/1, peeji nke 10-11.