Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Asụsụ ahụ Dị Ọcha’ Ọ̀ Na-aga Gị Were Were n’Ọnụ?

‘Asụsụ ahụ Dị Ọcha’ Ọ̀ Na-aga Gị Were Were n’Ọnụ?

‘Asụsụ ahụ Dị Ọcha’ Ọ̀ Na-aga Gị Were Were n’Ọnụ?

“M ga-agbanwe asụsụ nke ndị dị iche iche ka ọ bụrụ asụsụ dị ọcha, ka ha niile wee na-akpọku aha Jehova.”—ZEF. 3:9.

1. Olee onyinye na-enweghị atụ Jehova nyere anyị?

ỊSỤ asụsụ bụ onyinye sitere n’aka Jehova Chineke bụ́ Onye kere mmadụ, o siteghị n’aka mmadụ. (Ọpụ. 4:11, 12) Ọ bụghị naanị ikike ikwu okwu ka Chineke nyere mmadụ mbụ o kere bụ́ Adam, o nyekwara ya ikike imepụta okwu ọhụrụ, bụ́ nke ga-eme ka o nwee ọtụtụ mkpụrụ okwu. (Jen. 2:19, 20, 23) Nke a bụ nnọọ onyinye na-enweghị atụ! Nke a emedịala ka ụmụ mmadụ nwee ike ịgwa Nna ha nke eluigwe okwu ma na-eto aha ya dị ebube.

2. Gịnị mere na ụmụ mmadụ adịkwaghị asụ otu ụdị asụsụ?

2 Malite mgbe e kere mmadụ ruo ihe dị ka otu puku na narị afọ asaa, mmadụ niile sụrụ naanị otu asụsụ, nwee “otu usoro okwu.” (Jen. 11:1) Ma a bịara nwee ndị nupụrụ isi n’oge Nimrọd. Kama ime ihe Jehova kwuru, ụmụ mmadụ na-enupụ isi gbakọtara n’ebe e mechara kpọọ Bebel, n’ihi na ha chọrọ ịnọgide n’otu ebe. Ha malitere ịrụ otu nnukwu ụlọ elu, ọ bụghị iji nye Jehova otuto, kama ọ bụ iji ‘meere onwe ha aha.’ N’ihi ya, Jehova ghagburu asụsụ ha na-asụbu ma mee ka ha malite ịsụ asụsụ dị iche iche. Nke a mere ka ha gbasaa n’ụwa niile.—Gụọ Jenesis 11:4-8.

3. Gịnị mere mgbe Jehova ghagburu asụsụ ndị nnupụisi ahụ na Bebel?

3 Taa, e nwere ọtụtụ puku asụsụ a na-asụ n’ụwa, ụfọdụ kwuru na a na-asụ ihe karịrị puku asụsụ isii na narị asatọ. Nke ọ bụla n’ime asụsụ ndị a nwere otú e si asụ ya. O yiri ka mgbe ahụ Jehova Chineke ghagburu asụsụ ndị nnupụisi ahụ o mekwara ka ha ghara ichetakwa asụsụ ahụ ha na-asụbu. Ọ bụghị naanị na o tinyere okwu ọhụrụ n’uche ha, kamakwa ọ gbanwere usoro ha si ekwu okwu ma wepụta ụtọ asụsụ ọhụrụ. Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ebe ahụ Bebel nke pụtara “ọgba aghara”! (Jen. 11:9.) Ọ dị nnọọ mma ịmara na ọ bụ naanị Baịbụl na-enye nkọwa na-eju afọ banyere otú ọtụtụ asụsụ ndị a na-asụ taa si malite.

Asụsụ Ọhụrụ nke Dị Ọcha

4. Gịnị ka Jehova buru amụma na ọ ga-eme n’oge anyị a?

4 Ọ bụ ezie na ihe Baịbụl kwuru banyere ihe ahụ Chineke mere na Bebel na-adọrọ nnọọ mmasị, e nwere ihe merela n’oge anyị a, bụ́ nke na-adọrọ mmasị ma dị mkpa karịa ya. Jehova sitere n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Zefanaya kwuo, sị: “Ọ bụ mgbe ahụ ka m ga-agbanwe asụsụ nke ndị dị iche iche ka ọ bụrụ asụsụ dị ọcha, ka ha niile wee na-akpọku aha Jehova, ka ha wee jiri otu obi na-efe ya ofufe.” (Zef. 3:9) Gịnị bụ ‘asụsụ ahụ dị ọcha,’ oleekwa otú anyị ga-esi mụta ịsụ ya ya ana-aga were were n’ọnụ?

5. Gịnị bụ asụsụ ahụ dị ọcha, oleekwa ihe mgbanwe a a gbanwere gaa n’asụsụ a rụpụtara?

5 Asụsụ ahụ dị ọcha bụ eziokwu banyere Jehova Chineke na nzube ya, bụ́ nke dị n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. “Asụsụ” ahụ na-agụnye ịghọta ihe Alaeze Chineke bụ n’ezie nakwa otú Alaeze ahụ ga-esi doo aha Jehova nsọ, gosi na ọ bụ Jehova ruru eru ịchị, ma wetere ụmụ mmadụ na-erube isi ngọzi ndị na-adịru ebighị ebi. Olee ihe asụsụ a a gbanwere rụpụtara? A gwara anyị na ndị mmadụ ga “na-akpọku aha Jehova” ma “jiri otu obi na-efe ya ofufe.” Ihe dị iche n’asụsụ a a gbanwere gaa n’asụsụ dị ọcha na nke ahụ mere na Bebel bụ na o meela ka e too aha Jehova ma mee ka ndị ya dịrị n’otu.

Ịmụ Asụsụ ahụ Dị Ọcha

6, 7. (a) Gịnị ka ịmụ asụsụ ọhụrụ na-agụnye, oleekwa otú nke a ga-esi enye aka n’ịmụ asụsụ ahụ dị ọcha? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ banyere ya ugbu a?

6 Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịmụta asụsụ ọzọ, ọ bụghị naanị okwu ọhụrụ ka ọ ga-ebu n’isi. Ịmụ asụsụ ọhụrụ na-agụnye ịmụ ụzọ ndị na-asụ asụsụ ahụ si eche echiche. Otú e si ahazi okwu n’otu asụsụ na ihe ndị na-akpa ọchị n’asụsụ ahụ nwere ike ịdị iche n’asụsụ ọzọ. Ka mmadụ wee nwee ike ịkpọpụta okwu n’asụsụ ọzọ, otú o si edowe ire ya mgbe ọ na-ekwu okwu na-agbanwe. Otú ahụ ka ọ dị mgbe anyị malitere ịmụ asụsụ dị ọcha nke eziokwu Baịbụl. A chọrọ ihe karịrị ịmụta naanị ụfọdụ ozizi Baịbụl ndị bụ́ isi. Iji nwee ike ịmụta asụsụ a nke ọma, anyị ga-agbanwe otú anyị si eche echiche ma mee ka uche anyị dị ọhụrụ.—Gụọ Ndị Rom 12:2; Ndị Efesọs 4:23.

7 Gịnị ga-enyere anyị aka ịghọta asụsụ ahụ dị ọcha nke ọma, ya ana-agakwa anyị were were n’ọnụ? Dị nnọọ ka ọ na-adị n’ịmụ asụsụ ọhụrụ, e nwere ihe ụfọdụ dị mkpa nwere ike inyere anyị aka ịsụ asụsụ nke eziokwu Baịbụl n’ụzọ na-aga were were n’ọnụ. Ka anyị lee ihe ụfọdụ dị mkpa ndị na-amụ asụsụ ọzọ na-eme, ma hụ otú ihe ndị ahụ nwere ike isi nyere anyị aka ịmụta asụsụ ihe atụ ọhụrụ a.

Ịsụ Asụsụ ahụ Dị Ọcha n’Ụzọ Na-aga Were Were n’Ọnụ

8, 9. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmụta asụsụ ahụ dị ọcha, oleekwa ihe mere nke a ji dị oké mkpa?

8 Na-ege ntị nke ọma. Ná mmalite, asụsụ ọhụrụ nwere ike ịda ná ntị onye na-anụtụbeghị ya mbụ ka a gaghị aghọta ya aghọta. (Aịza. 33:19) Ma ka onye ahụ na-etinye uche n’ihe ọ na-anụ, ọ ga-abịa ghọtawa okwu ụfọdụ na otú e si akpọ ha. N’otu ụzọ ahụ, a dụrụ anyị ọdụ, sị: ‘Ọ dị mkpa ka anyị mee ka uche anyị dịrị n’ihe anyị nụrụ karịa otú anyị na-eme, ka anyị wee ghara ịkpafu mgbe ọ bụla.’ (Hib. 2:1) Jizọs gwara ụmụazụ ya ugboro ugboro, sị: “Onye nwere ntị, ya gee ntị.” (Mat. 11:15; 13:43; Mak 4:23; Luk 14:35) N’ezie anyị kwesịrị ‘ige ntị ma ghọta’ ihe anyị nụrụ iji nwee ike ịdị na-aghọtakwu asụsụ ahụ dị ọcha.—Mat. 15:10; Mak 7:14.

9 Ige ntị chọrọ itinye uche n’ihe a na-ekwu, ma mgbalị ọ bụla e tinyere iji mee ya adịghị efu ọhịa. (Luk 8:18) Mgbe anyị nọ n’ọmụmụ ihe, uche anyị ọ̀ na-adị n’ihe a na-ekwu, ka ànyị na-eche ihe ọzọ? Ọ dị nnọọ mkpa ka anyị mee ike anyị niile iji hụ na uche anyị dị n’ihe a na-ekwu. Ma ọ́ bụghị ya, anyị nwere ike ịghọ ndị ntị ike n’ịnụ ihe.—Hib. 5:11.

10, 11. (a) Olee ihe ọzọ anyị ga-eme ma e wezụga ige ntị nke ọma? (b) Olee ihe ọzọ ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha gụnyere?

10 Ṅomie ndị asụsụ ahụ na-aga were were n’ọnụ. Ọ bụghị naanị ige ntị nke ọma ka a gbara ndị na-amụ asụsụ ọzọ ume ka ha na-eme, kama a gwakwara ha gbalịa na-eṅomi ma ọ bụ na-ejije otú ndị asụsụ ahụ na-aga were were n’ọnụ si akpọpụta okwu na otú ha si ekwu okwu. Nke a na-eme ka asụsụ ahụ ghara ịdị ha arọ n’ọnụ mgbe ha na-ekwu okwu, bụ́ nke nwere ike ime ka o siere ndị ọzọ ike ịghọta ihe ha na-ekwu. N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị ikwe ka ndị nwerela “nkà” n’ịkụzi asụsụ ahụ dị ọcha zie anyị ihe. (2 Tim. 4:2) Gwa ha nyere gị aka. Dịrị njikere ime ihe ọ bụla ha gwara gị mee mgbe ị kpọhiere okwu.—Gụọ Ndị Hibru 12:5, 6, 11.

11 E wezụga ikwere eziokwu ahụ na ịkụziri ya ndị ọzọ, asụsụ ahụ dị ọcha gụnyekwara ịkpa àgwà n’ụzọ kwekọrọ n’ihe iwu Chineke kwuru. Iji nwee ike ime nke a, anyị kwesịrị iṅomi ndị ọzọ. Nke a na-agụnye iṅomi okwukwe na ịnụ ọkụ n’obi ha. Ọ gụnyekwara iṅomi otú niile Jizọs si bie ndụ. (1 Kọr. 11:1; Hib. 12:2; 13:7) Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme nke a, ọ ga-eme ka ndị Chineke dịrị n’otu, mee ka ha, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, nwee ike iji otu ire na-ekwu okwu.—1 Kọr. 4:16, 17.

12. Olee ihe jikọrọ ibu ihe n’isi na ịmụ asụsụ ọhụrụ?

12 Buru ihe ndị a na-akụziri gị n’isi. Ndị na-amụ asụsụ ọhụrụ kwesịrị iburu ọtụtụ ihe n’isi. Ihe ndị a na-agụnye okwu ọhụrụ. Ibu ihe n’isi nwere ike inyere Ndị Kraịst aka ịmụta asụsụ ahụ dị ọcha. N’ezie ọ ga-adị mma ma anyị buo aha akwụkwọ ndị dị na Baịbụl n’isi n’usoro e si dee ha. Ụfọdụ emeela ya ihe mgbaru ọsọ ha ibu ihe akụkụ Baịbụl ụfọdụ kwuru n’isi ma ọ bụ ịma ebe e kwuru ihe ụfọdụ na Baịbụl. Ibu abụ Alaeze, aha ebo iri na abụọ nke Izrel, aha ndị ozi iri na abụọ Jizọs, nakwa àgwà ndị mejupụtara mkpụrụ nke mmụọ nsọ n’isi, abaarala ndị ọzọ uru. N’oge ochie, ọtụtụ ndị Izrel buru abụ ọma n’isi. Taa kwa, otu nwatakịrị nwoke buru ihe karịrị amaokwu Baịbụl iri asatọ n’isi mgbe ọ dị naanị afọ isii. Ànyị nwere ike ịgbalị ime nke a?

13. Gịnị mere ikwughachi ihe ji dị nnọọ mkpa?

13 Ikwughachi ihe na-enyere anyị aka icheta ihe, ichetaghachiri anyị bụ́ Ndị Kraịst ihe ugboro ugboro bụ ụzọ bụ́ isi e si akụziri anyị ihe. Pita onyeozi kwuru, sị: “M ga-achọ ichetara unu ihe ndị a mgbe niile, ọ bụ ezie na unu maara ha ma bụrụ ndị nọsiri ike n’eziokwu ahụ nke dị n’ime unu.” (2 Pita 1:12) Gịnị mere o ji dị mkpa ka a na-echetara anyị ihe? Ọ bụ n’ihi na ha na-eme ka anyị ghọtakwuo ihe a na-ekwu, mee ka anyị na-elekwu ihe anya otú dị mma, meekwa ka anyị kpebisikwuo ike irubere Jehova isi. (Ọma 119:129) Ịdị na-atụleghachi iwu Chineke mgbe niile na-enyere anyị aka inyocha onwe anyị ma mee ka anyị ghara ịbụ ndị ‘na-echefu ihe ha nụrụ.’ (Jems 1:22-25) Ọ bụrụ na anyị anaghị echetara onwe anyị banyere eziokwu ahụ mgbe niile, ihe ndị ọzọ ga-adọrọ uche anyị, asụsụ ahụ dị ọcha nwere ike ọ gaghịzi na-aga anyị were were n’ọnụ.

14. Gịnị ga-enyere anyị aka mgbe anyị na-amụ asụsụ ahụ dị ọcha?

14 Na-agụpụta ihe agụpụta. (Mkpu. 1:3) Ụfọdụ ndị na-amụ asụsụ ọhụrụ na-agbalị ịmụ ya n’obi ha, ha adịghị ekwupụta ya ekwupụta. Nke a anaghị arụpụta ezigbo ihe. Mgbe a na-amụ asụsụ ahụ dị ọcha, o nwere mgbe ụfọdụ ọ ga-adị mkpa ka anyị gụpụta ihe “n’olu dị ala” ka uche anyị wee nwee ike ịdị n’ihe anyị na-agụ. (Gụọ Abụ Ọma 1:1, 2.) Nke a na-eme ka ihe anyị na-agụ ghara ịpụ anyị apụ n’uche. N’asụsụ Hibru, okwu ahụ bụ́ ‘ịgụ ihe n’olu dị ala’ na ịtụgharị uche yiri. Dị nnọọ ka ọ dị mkpa na nri anyị riri ga-agbari ka o wee nye anyị ihe n’ahụ́, ịtụgharị uche dị anyị mkpa iji nwee ike ịghọta ihe anyị gụrụ nke ọma. Ànyị na-ewepụta nnọọ oge iji tụgharịa uche n’ihe anyị mụrụ? Ọ bụrụ na anyị agụchaa Baịbụl, anyị kwesịrị ichebara ihe anyị gụrụ echiche nke ọma.

15. Olee otú anyị nwere ike isi mụọ “ụtọ asụsụ” nke asụsụ ahụ dị ọcha?

15 Leruo ụtọ asụsụ ahụ anya. Ka anyị na-amụ asụsụ ọhụrụ, ọ dị mkpa ka anyị leba anya n’otú okwu si agakọ ma ọ bụ okwu ndị ha na ibe ha kwesịrị ịgakọ n’asụsụ ahụ. Nke a na-eme ka anyị nwee ike ịghọta otú e si asụ asụsụ ahụ, ma nwee ike ịsụ ya otú e si asụ ya. Dị nnọọ ka asụsụ si nwee ụkpụrụ okwu, asụsụ dị ọcha nke eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ nwere “ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ.” (2 Tim. 1:13) Anyị kwesịrị ịgbaso “ụkpụrụ” ahụ.

16. Olee àgwà anyị kwesịrị izere, oleekwa otú anyị ga-esi zere ya?

16 Nọgide na-agbalị. Mmadụ nwere ike ịmụtaru asụsụ ọzọ otú ya na ndị ọzọ nwere ike iji ya kwurịta ihe ole na ole ma mechaa kwụsị ịgbalị ịmụtakwu ya. Ndị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha nwekwara ike ime ụdị ihe a. (Gụọ Ndị Hibru 5:11-14.) Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịghara ikwe ka nke a mee? Dịrị njikere ịnọgide na-amụ ya. “Ebe anyị hapụworo ozizi ndị mbụ banyere Kraịst, ka anyị jisie ike ruo ntozu okè. Ka anyị ghara ịtọwa ntọala ọzọ, ya bụ, ịmụ ọzọ banyere isi n’ọrụ nwụrụ anwụ chegharịa, inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ, ozizi banyere baptizim na ibikwasị aka n’isi, mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ na ikpe ebighị ebi.”—Hib. 6:1, 2.

17. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-amụchi ihe anya? Nye ihe atụ.

17 Nwee kpọmkwem oge ị ga-eji na-amụ ihe. Ịmụ ihe obere obere ma na-amụchi ya anya ka mma karịa iji ọtụtụ awa na-amụ ihe ma ghara ịmụchi ya anya. Na-amụ ihe mgbe uche gị ga-adị n’ihe ị na-amụ, ya bụ, mgbe ọ na-adịghị ihe ga-adọpụ gị uche ngwa ngwa. Ịmụ asụsụ ọhụrụ yiri igbuwa ụzọ n’ime oké ọhịa. Ka a na-aga n’ụzọ ahụ mgbe mgbe ka ọ ga-eme ka ọ dịkwuo mfe isi na ya na-aga. Ma ọ bụrụ na a kwụsị isi n’ụzọ ahụ na-aga ruo oge ụfọdụ, ọ gaghị ara ahụ́ ọhịa eruchie ya. N’ihi ya, ọ dị nnọọ mkpa ịdị na-aga n’ụzọ ahụ mgbe mgbe! (Dan. 6:16, 20) ‘Mụrụ anya mgbe niile’ ma na-ekpechi ekpere anya ka ị na-agbalị ịsụ asụsụ dị ọcha nke eziokwu Baịbụl.—Efe. 6:18.

18. Gịnị mere anyị ji kwesị ịdị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha mgbe niile?

18 Na-asụ ya mgbe niile! O nwere ike ihe mere ụfọdụ ndị na-amụ asụsụ ọhụrụ ji ala azụ ịsụ ya bụ n’ihi na ihere na-eme ha ma ọ bụkwanụ n’ihi na ụjọ na-atụ ha na ha ga-asụhie ya. Nke a agaghị ekwe ha nwee ọganihu. Mgbe a bịara n’ịmụ asụsụ, ịsụ ya mgbe niile ga-eme ka onye ahụ bụrụ aka ochie na ya. Ka onye ahụ na-amụ asụsụ na-asụ asụsụ ọhụrụ ahụ ọ na-amụ, ọ gaghịzi na-ara ya ahụ́. Otú ahụ ka anyị kwesịkwara ịdị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha mgbe niile. “Mmadụ na-eji obi enwe okwukwe maka ezi omume, ma ọnụ ka mmadụ na-eji eme nkwupụta ihu ọha maka nzọpụta.” (Rom 10:10) Ọ bụghị naanị mgbe a na-eme anyị baptizim ka anyị na-eme “nkwupụta ihu ọha” kamakwa anyị na-eme ya mgbe anyị na-eji ohere ọ bụla anyị nwere na-ekwu banyere Jehova, nakwa mgbe anyị nọ n’ozi ọma. (Mat. 28:19, 20; Hib. 13:15) Anyị na-enwe ohere iji asụsụ ahụ dị ọcha aza ajụjụ n’ụzọ dị nkenke ma doo anya n’ọmụmụ ihe.—Gụọ Ndị Hibru 10:23-25.

Iji Otu Obi Na-eji Asụsụ ahụ Dị Ọcha Na-eto Jehova

19, 20. (a) Olee ihe na-atụ n’anya Ndịàmà Jehova na-arụzu taa? (b) Gịnị ka i kpebiri ime?

19 Cheedị ihe ọ dị ka ya ịnọ na Jeruselem n’ụtụtụ Sunday na Sivan 6, n’afọ 33 O.A.! N’ụtụtụ ahụ, tupu elekere itoolu akụọ, ndị gbakọtara n’otu ụlọ elu dị n’ebe ahụ ‘malitere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche’ n’ụzọ ọrụ ebube. (Ọrụ 2:4) Taa, ndị ohu Chineke enweghịzi onyinye nke ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche. (1 Kọr. 13:8) Ma, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’ihe karịrị narị asụsụ anọ na iri atọ.

20 Obi dị anyị nnọọ ụtọ na n’agbanyeghị asụsụ ọ bụla anyị na-asụ, anyị niile ji otu obi na-asụ asụsụ dị ọcha nke eziokwu Baịbụl! Nke a dị nnọọ iche n’ihe ahụ mere na Bebel. A pụrụ ikwu na ndị Jehova ji otu asụsụ na-ewetere aha ya otuto. (1 Kọr. 1:10) Ka anyị kpebisie ike ‘iji otu obi’ soro ụmụnna anyị n’ụwa niile na-eje ozi ka anyị na-amụ ịsụ otu asụsụ ahụ n’ụzọ na-aga were were n’ọnụ, iji wetere Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova otuto.—Gụọ Abụ Ọma 150:1-6.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Gịnị bụ asụsụ ahụ dị ọcha?

• Gịnị ka anyị ịsụ asụsụ ahụ dị ọcha gụnyere?

• Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ịdị na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha n’ụzọ na-aga were were n’ọnụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 23]

Gbalịa Mee Ka Asụsụ ahụ Dị Ọcha Na-aga Gị Were Were n’Ọnụ Site

◆ n’ige ntị nke ọma.

Luk 8:18; Hib. 2:1

◆ n’iṅomi ndị ọ na-aga were were n’ọnụ.

1 Kọr. 11:1; Hib. 13:7

◆ n’ibu ihe ndị a na-akụziri gị n’isi na ikwughachi ha.

Jems 1:22-25; 2 Pita 1:12

◆ n’ịgụpụta ihe agụpụta.

Ọma 1:1, 2; Mkpu. 1:3

◆ n’ileru “ụtọ asụsụ” ahụ anya.

2 Tim. 1:13

◆ n’ịnọgide na-agbalị.

Hib. 5:11-14; 6:1, 2

◆ n’inwe kpọmkwem oge ị ga-eji na-amụ ihe.

Dan. 6:16, 20; Efe. 6:18

◆ n’ịdị na-asụ ya.

Rom 10:10; Hib. 10:23-25

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ndị Jehova ji otu obi na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha