Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Ji Ndị Ozi Ala Ọzọ Tụnyere Igurube

E Ji Ndị Ozi Ala Ọzọ Tụnyere Igurube

Ememme Ngụsị Akwụkwọ nke Klas nke 124 nke Gilied

E Ji Ndị Ozi Ala Ọzọ Tụnyere Igurube

ỌNWA isii ọ bụla, a na-eme ememme ngụsị akwụkwọ maka ndị gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied, a na-akpọkwa ndị niile so n’ezinụlọ Betel United States ka ha bịa ya. Na March 8, 2008, ndị ọbịa si ihe karịrị mba iri atọ bịara sonyere ezinụlọ Betel maka ememme ngụsị akwụkwọ nke klas nke Otu Narị na Iri Abụọ na Anọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Puku mmadụ isii na narị mmadụ anọ na iri na otu bịaranụ sooro ụmụ akwụkwọ ahụ ṅụrịa ọṅụ n’ụbọchị ahụ pụrụ iche nye ha.

Onyeisi oche nke ememme ahụ bụ Stephen Lett, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu mmeghe nke isiokwu ya bụ “Soronụ Igurube Ihe Atụ Jehova Na-aga.” Ná Mkpughe 9:1-4, e ji obere ìgwè Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị maliteghachiri iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ Jehova n’afọ 1919, tụnyere ìgwè igurube nupụtara ma malite ịkpa ike. E chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ na ha esonyela ìgwè igurube ihe atụ a.—Jọn 10:16.

Lon Schilling, bụ́ onye so na Kọmitii Alaka nke United States, kwuru okwu nke abụọ isiokwu ya bụ “Bụrụ Ezigbo Onye Inyeaka.” Nke a dabeere n’ihe nlereanya dị na Baịbụl banyere Akwịla na Prisila (ma ọ bụ, Priska), bụ́ di na nwunye biri ndụ na narị afọ mbụ. (Rom 16:3, 4) Ọ bụ di na nwunye di na nwunye iri abụọ na asatọ mejupụtara klas ahụ. E chetaara ha na iji mee nke ọma n’ozi ala ọzọ ha, ọ dị mkpa ka ha na di ma ọ bụ nwunye ha na-ebi nnọọ nke ọma. Ọ dịghị ebe a kpọrọ Akwịla aha na Baịbụl ma ghara ịkpọta aha nwunye ya bụ́ Prisila. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi na ọgbakọ ji lee ha anya dị ka ndị bụ́ otu. N’otu aka ahụ, ndị di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ taa kwesịrị ịgbalị na-arụkọ ọrụ ọnụ, na-efekọ Jehova ọnụ, ma hụ na ha na-agbakọ aka alụso nsogbu na ihe isi ike ọ bụla ha na-enweta ná mba ebe e zigara ha ọgụ. N’ụzọ dị otú a, ha ga na-enyerịtara ibe ha aka.—Jen. 2:18.

Ọ bụ Guy Pierce, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru isiokwu sochirinụ bụ́ “Gosi Ekele Maka Ịdị Mma Jehova.” Nwanna Pierce kọwara na ime ihe dị mma karịrị mmadụ izere ime ihe ọjọọ. Onye bụ́ ezigbo mmadụ na-eme ihe ọma ka ndị ọzọ wee rite uru na ya. Ịdị mma Jehova Chineke enweghị atụ. (Zek. 9:16, 17) Ịdị mma Chineke na ịhụnanya ya nwere ike ịkpali anyị imere ndị ọzọ ihe ọma. Nwanna Pierce mechiri okwu ya site n’ịja ụmụ akwụkwọ ahụ mma ma kwuo, sị: “Unu na-eme ihe ọma kemgbe. Obi sikwara anyị ike na unu ga-anọgide na-egosi ekele maka ịdị mma Chineke site n’ime ihe ọma n’ọrụ ọ bụla Jehova Chineke ga-enye unu n’ọdịnihu.”

Onye ọzọ kwuru okwu bụ Michael Burnett, onye bụ́bu onye ozi ala ọzọ, bụrụkwa onye a họpụtara ọhụrụ ịbụ onye nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Isiokwu nke okwu ya bụ “Kegide Ya n’Egedege Ihu Gị, n’Agbata Anya Gị Abụọ.” A gwara ndị Izrel ka ha na-echeta otú Jehova si napụta ha n’Ijipt n’ụzọ ọrụ ebube dị ka a ga-asị na ha ‘kegidere ya n’egedege ihu ha’ n’agbata anya ha abụọ. (Ọpụ. 13:16) A dụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ ọdụ ka ha na-echeta ntụziaka niile e nyere ha n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied ka a ga-asị na ha kegidere ya n’agbata anya ha abụọ. Nwanna Burnett kwusiri okwu ike banyere mkpa ọ dị ịdị umeala n’obi na imeru ihe n’ókè, nakwa mkpa ọ dị ime ihe Baịbụl kwuru mgbe a bịara n’idozi nghọtahie dị n’etiti ha na ndị ozi ala ọzọ ibe ha nakwa n’etiti ha na ndị ọzọ.—Mat. 5:23, 24.

Mark Noumair, onye kụzirila nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied ruo ogologo oge, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Olee Abụ A Ga-eji Gị Bụọ?” N’oge ochie, ọ bụ omenala ịbụ abụ mmeri mgbe e meriri n’agha. Otu n’ime abụ ndị a bụrụ mere ka a mara na ebo Reuben, Dan, na Asha anaghị achọ iwepụta onwe ha ịrụ ọrụ, ebe e toro ebo Zebulọn n’ihi na ha na-achụ onwe ha n’àjà. (Ikpe 5:16-18) Ndị ọzọ na-emecha mata otú àgwà Onye Kraịst dị, dị nnọọ ka a na-esi aghọta ihe a na-agụ n’abụ. Jehova na-echeta otú mmadụ si anụrụ ọrụ Ya ọkụ n’obi nakwa otú onye ahụ si eruberu isi ná nduzi ndị ọgbakọ Jehova na-enye, ịnụ ọkụ n’obi ahụ na-aghọkwara ụmụnna ya ndị ọzọ ezi ihe nlereanya. Ka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-egere abụ ihe atụ e ji àgwà ọma anyị bụọ, ha na-abụ ndị a kpaliri iṅomi ihe nlereanya ọma anyị.

Ụmụ akwụkwọ ndị a natara ọzụzụ na Gilied ji ihe dị ka puku awa atọ kwusaa ozi ọma, bụ́ nke so n’ọzụzụ a na-enye ha. Mgbe Sam Roberson nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ịgbaso Nduzi nke Mmụọ Nsọ,” ụmụ akwụkwọ ahụ kọrọ ahụmahụ dị iche iche ha nwere n’ozi ọma mgbe ha nọ n’Ụlọ Akwụkwọ ahụ. Ha mekwara ihe ngosi otú ụfọdụ n’ime ahụmahụ ndị ahụ si mee. Ihe sochiri ahụmahụ ndị ahụ bụ ajụjụ ọnụ nke Patrick LaFranca nke Kọmitii Alaka United States gbara ndị gụcharala akwụkwọ na Gilied kemgbe ma na-eje ozi n’ọtụtụ mba ndị ọzọ. Ndị a na-agụcha akwụkwọ kelere ụmụnna ndị a maka ndụmọdụ ndị ga-abara ha uru ha nyere ha.

Anthony Morris, onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu ikpeazụ nke isiokwu ya bụ “Cheta, Ihe A Na-ahụ Anya Na-adịru Nwa Oge.” Akwụkwọ Nsọ gbara anyị ume ka anyị lekwasị anya ná ngọzi ndị Jehova ga-enye anyị n’ọdịnihu kama ilekwasị anya ná nsogbu ọ bụla na-adịru nwa oge anyị nwere ike ịdị na-enwe ugbu a. (2 Kọr. 4:16-18) Ogbenye ọnụ ntụ, ikpe na-ezighị ezi, mmegbu, ọrịa, na ọnwụ so n’ihe ndị na-enye anyị nsogbu taa. Ụfọdụ n’ime ihe isi ike ndị a nwekwara ike ịbịara ndị ozi ala ọzọ. Ma icheta na ihe ndị a na-adịru nwa oge ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ebute Jehova ụzọ ná ndụ anyị ma na-enwe olileanya na ihe ga-adị mma.

Ememme ngụsị akwụkwọ ahụ mechiri mgbe ndị niile na-agụsị akwụkwọ gbagotere n’elu ikpo okwu igere okwu mmechi Nwanna Lett kwuru. Ọ gbara ha ume ka ha ghara ịda mbà ma kwuo, sị: “Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla anyị na-agaghị edili ma ọ bụrụhaala na Jehova nọnyeere anyị.” Ọ gbara ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ a ume ka ha dị ka igurube, na-agbasi mbọ ike n’ozi Jehova ma na-anụ ọkụ n’obi, na-eguzosi ike n’akụkụ Jehova ma na-erube isi ruo mgbe ebighị ebi.

[Igbe dị na peeji nke 30]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 7

Ọnụ ọgụgụ mba e zigara ha: 16

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 56

Nkezi afọ ndụ ha: 33.8

Nkezi afọ ha nọrọla n’eziokwu: 18.2

Nkezi afọ ha nọrọla n’ozi oge niile: 13.8

[Foto dị na peeji nke 31]

Klas nke Otu Narị na Iri Abụọ na Anọ Na-agụsị Akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied

N’aha ndị e dere n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Nicholson, T.; Main, H.; Senge, Y.; Snape, L.; Vanegas, C.; Pou, L. (2) Santana, S.; Oh, K.; Lemaitre, C.; Williams, N.; Alexander, L. (3) Woods, B.; Stainton, L.; Huntley, E.; Alvarez, G.; Cruz, J.; Bennett, J. (4) Williamson, A.; González, N.; Zuroski, J.; Degandt, I.; May, J.; Diemmi, C.; Tavener, L. (5) Lemaitre, W.; Harris, A.; Wells, C.; Rodgers, S.; Durrant, M.; Senge, J. (6) Huntley, T.; Vanegas, A.; Pou, A.; Santana, M.; Bennett, V.; Tavener, D.; Oh, M. (7) Zuroski, M.; Rodgers, G.; Diemmi, D.; Nicholson, L.; Alvarez, C.; Snape, J. (8) Harris, M.; González, P.; Main, S.; Woods, S.; Stainton, B.; Williamson, D.; Durrant, J. (9) Cruz, P.; Degandt, B.; Williams, D.; Wells, S.; Alexander, D.; May, M.

[Foto dị na peeji nke 32]

Ụlọ Akwụkwọ Gilied dị n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower