Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Agaghị Ahapụ Ndị Ya Na-eguzosi Ike n’Ebe Ọ Nọ

Jehova Agaghị Ahapụ Ndị Ya Na-eguzosi Ike n’Ebe Ọ Nọ

Jehova Agaghị Ahapụ Ndị Ya Na-eguzosi Ike n’Ebe Ọ Nọ

‘[Jehova] agaghị ahapụ ndị ya na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi.’—ỌMA 37:28.

1, 2. (a) Olee ihe ndị mere na narị afọ nke iri T.O.A., bụ́ ndị lere okwukwe nke ndị ohu Chineke n’oge ahụ ule? (b) Olee oge atọ Jehova chebere ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ?

ENWERE otu ihe mere na narị afọ nke iri T.O.A., nke mere ka ọ dị mkpa ka ndị Jehova mee mkpebi dị mkpa. E gbochiri agha obodo gaara ịda site n’ikwere ka alaeze ebe ugwu Izrel chịwa onwe ha. Eze ha a họpụtara ọhụrụ bụ́ Jeroboam, mere ihe ngwa ngwa iji hụ na ọchịchị ya kwụsiri ike site n’ihiwe okpukpe ọhụrụ nke ọ chọrọ ka ndị obodo ya niile na-ekpe. Ọ chọrọ ka ndị niile ọ na-achị rube isi n’ihe niile o kwuru. Gịnị ka ndị ohu Jehova ndị kwesịrị ntụkwasị obi ga-eme? Hà ga-anọgide na-efe Chineke? Ọtụtụ puku ndị ohu Jehova mere otú ahụ, Jehova chebekwara ha ka ha nọgidere na-eme ihe ziri ezi.—1 Eze 12:1-33; 2 Ihe 11:13, 14.

2 A na-anwakwa ndị ohu Chineke nọgidere na-efe ya ofufe taa. Baịbụl dọrọ aka ná ntị, sị: “Nweenụ uche ziri ezi, na-echenụ nche. Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” Ànyị ga-enwe ike ‘iguzogide ya ma sie ike n’okwukwe’? (1 Pita 5:8, 9) Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ mere n’oge e chichara Jeroboam eze n’afọ 997 T.O.A. ma hụ ihe anyị nwere ike isi n’ihe ndị mere n’oge ahụ mụta. N’oge ahụ ihe siri ike, e megburu ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi. E nwekwara ndị sirila n’ezi ofufe pụọ bụ́ ndị chọrọ ịghọgbu ha ka ha nọ na-arụ ọrụ ndị na-adịghị mfe ha nwere. N’oge ahụ ihe ndị a niile na-eme, Jehova ahapụghị ndị guzosiri ike n’ebe ọ nọ, ọ gaghịkwa ahapụ ndị ya taa.—Ọma 37:28.

Mgbe A Na-emegbu Ha

3. Gịnị mere na ọchịchị Eze Devid abụghị ọchịchị nchigbu?

3 Ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe ndị mere tupu Jeroboam abụrụ eze. Ilu 29:2 na-ekwu, sị: “Mgbe onye ajọ omume ọ bụla na-achị, ndị mmadụ na-asụ ude.” Mgbe Eze Devid nke Izrel oge ochie na-achị, ndị mmadụ asụghị ude. Devid ezughị okè, ma o guzosiri ike n’ebe Chineke nọ ma tụkwasị ya obi. Devid achịghị ndị ya ọchịchị nchigbu. Jehova gwara Devid mgbe ya na ya gbara ndụ, sị: “Ụlọ gị na alaeze gị ga-eguzosi ike n’ihu gị ruo mgbe ebighị ebi; a ga-emekwa ka ocheeze gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.”—2 Sam. 7:16.

4. Olee ihe a chọrọ n’aka Sọlọmọn na ndị ọ na-achị ka Jehova wee nọgide na-agọzi ha?

4 Mgbe Sọlọmọn bụ́ nwa Devid malitere ịchị, e nwere udo na ọganihu nke na a pụrụ iji ọchịchị ya tụnyere Ọchịchị Otu Puku Afọ Jizọs Kraịst nke ga-abịa n’ọdịnihu. (Ọma 72:1, 17) E nweghị nke ọ bụla n’ime ebo iri na abụọ nke Izrel nwere ihe mere ọ ga-eji nupụrụ ọchịchị ya isi. Ma, e nwere ihe a chọrọ n’aka Sọlọmọn na ndị ọ na-achị ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịnọgide na-enweta ngọzi Chineke. Jehova gwara Sọlọmọn, sị: “Ọ bụrụ na i jee ije n’ụkpụrụ m, meekwa ihe ndị m kpere n’ikpe ma debe ihe niile m nyere n’iwu site n’ije ije na ha, mụ onwe m ga-eme ka okwu m gwara Devid nna gị mezuo n’ebe ị nọ, karịsịa, ihe m kwuru banyere ụlọ a ị na-ewu; n’ezie, m ga-ebi n’etiti ụmụ Izrel, agaghịkwa m ahapụ ndị m bụ́ Izrel.”—1 Eze 6:11-13.

5, 6. Gịnị mere mgbe Sọlọmọn kwụsịrị irubere Chineke isi?

5 Mgbe Sọlọmọn mere agadi, ọ hapụrụ Jehova ma malite ikpere arụsị. (1 Eze 11:4-6) Sọlọmọn jiri nwayọọ nwayọọ kwụsị irubere iwu Jehova isi ma malite ịchị ọchịchị aka ike. Nke a ruru n’ókè nke na mgbe ọ nwụchara, ndị Izrel gakwuuru Rehoboam bụ́ nwa ya nwoke nọchiri ya ma kọsara ya nsogbu ha, rịọkwa ya ka o mee ka ihe dịtụrụ ha mfe. (1 Eze 12:4) Gịnị ka Jehova mere mgbe Sọlọmọn kwụsịrị irubere ya isi?

6 Baịbụl na-agwa anyị, sị: “Jehova wee weso Sọlọmọn oké iwe, n’ihi na obi ya apụwo n’ebe . . . Chineke Izrel nọ, bụ́ onye pụtara ìhè n’ihu ya ugboro abụọ.” Jehova wee gwa Sọlọmọn, sị: “N’ihi ihe a i mere wee ghara idebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ m nke m nyere gị n’iwu, aghaghị m ịdọkapụ alaeze a n’aka gị, m ga-enyekwa ya onye na-ejere gị ozi.”—1 Eze 11:9-11.

7. Ọ bụ ezie na Jehova jụrụ Sọlọmọn, olee otú O si lekọta ndị na-eguzosi ike n’ebe Ọ nọ?

7 Jehova zigaziri onye amụma ya bụ́ Ahaịja ka ọ gaa tee onye ga-anapụta ụmụ Izrel, mmanụ. Onye ahụ bụ Jeroboam, bụ́ nwoke rụsiri ọrụ ike n’oge Sọlọmọn na-achị. Ọ bụ ezie na Jehova ahapụghị ndụ ahụ ya na Devid gbara na ndị si n’agbụrụ Devid ga-anọgide na-achị, O kwere ka e kewaa ebo iri na abụọ nke Izrel. Ebo iri ga-abụ nke Jeroboam; ebe ebo abụọ ga-anọgide n’ezinụlọ Devid, bụ́ nke Eze Rehoboam na-achị ugbu a. (1 Eze 11:29-37; 12:16, 17, 21) Jehova gwara Jeroboam sị: “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na i rube isi n’ihe niile m ga-enye gị n’iwu, i wee jee ije n’ụzọ m, meekwa ihe ziri ezi n’anya m site n’idebe ụkpụrụ m na ihe ndị m nyere n’iwu, dị nnọọ ka ohu m Devid mere, m ga-anọnyekwara gị, m ga-ewukwara gị ụlọ nke na-adịgide adịgide, dị nnọọ ka m wuuru Devid, m ga-enyekwa gị Izrel.” (1 Eze 11:38) Jehova mere ihe iji napụta ndị ya n’ọchịchị nchịgbu.

8. Olee ihe isi ike ndị Chineke na-enweta taa?

8 Mmegbu na ikpe na-ezighị ezi juru ebe niile taa. Ekliziastis 8:9 kwuru, sị: “Mmadụ [achịwo] mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.” Ndị ọchụnta ego nwere anyaukwu na ndị ọchịchị na-arụrụ aka, nwere ike ime ka ihe siere ndị mmadụ ike. Ndị ọchịchị, ndị ọchụnta ego a ma ama, na ndị ndú okpukpe na-etinyekarị aka n’omume na-ezighị ezi. N’ihi ya, dị ka onye ezi omume bụ́ Lọt, ndị na-eguzosi ike n’ebe Chineke nọ taa na-enwe “oké mwute n’ihi mmikpu nke ndị na-eleda iwu anya mikpuru onwe ha n’omume rụrụ arụ.” (2 Pita 2:7) N’agbanyeghị na anyị na-agbalị ibi ndụ otú Chineke si chọọ ma ghara inye ndị ọzọ nsogbu, ndị ọchịchị dị mpako na-akpagbukarị anyị.—2 Tim. 3:1-5, 12.

9. (a) Gịnị ka Jehova merela iji napụta ndị ya? (b) Gịnị ga-eme ka obi sie anyị ike na Jizọs ga-anọgide na-eguzosi ike n’ebe Chineke nọ?

9 Ma, e nwere otu eziokwu dị mkpa anyị ga-eburu n’uche: Jehova agaghị ahapụ ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ! Chegodị ihe ndị o merela iji hụ na a gbanwere ndị ọchịchị ọjọọ e nwere n’ụwa taa. E hiwela Alaeze Mesaya nke Jizọs Kraịst ga-abụ onyeisi ya. Jizọs Kraịst amalitela ịchị n’eluigwe kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu narị afọ. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka ndị niile na-atụ egwu Chineke nwere onwe ha kpamkpam. (Gụọ Mkpughe 11:15-18.) Jizọs eguzosielarị ike n’ebe Chineke nọ ruo ọnwụ. Ọ dịghị ihe ga-eme ka o mechuo ndị ọ ga-achị ihu dị nnọọ ka Sọlọmọn mere.—Hib. 7:26; 1 Pita 2:6.

10. (a) Olee otú anyị nwere ike isi gosi na Alaeze Chineke dị anyị mkpa? (b) Mgbe ọnwụnwa bịaara anyị, gịnị ka obi ga-esi anyị ike na ọ ga-eme?

10 Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị nke ga-eme ka nsogbu niile ụmụ mmadụ na-enwe kwụsị. Ọ bụ Jehova Chineke na Alaeze ya ka anyị na-erubere isi. N’ihi na obi siri anyị nnọọ ike na Alaeze ahụ ga-egboro anyị mkpa anyị, anyị na-ajụ asọpụrụghị Chineke nke jupụtara n’ụwa a ma na-agbalịsi ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ezi ọrụ. (Taị. 2:12-14) Anyị na-agbalịsi ike ịhụ na anyị nọgidere n’enweghị ntụpọ n’ụwa a. (2 Pita 3:14) N’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla anyị nwere ike izute ugbu a, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-echebe anyị ka ihe ọ bụla ghara imebi okwukwe anyị. (Gụọ Abụ Ọma 97:10.) Tụkwasị na nke ahụ, Abụ Ọma 116:15 na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọnwụ ndị na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ dị oké ọnụ ahịa n’anya ya.” Ndị ohu Jehova dị oké ọnụ ahịa nye ya nke na ọ gaghị ekwe ka e gbuo ha niile.

Mgbe Ndị Si n’Ezi Ofufe Pụọ Na-achọ Ịrafu Ha

11. Olee otú Jeroboam si gosi na ya eguzosighị ike n’ebe Chineke nọ?

11 Ọchịchị Eze Jeroboam gaara eme ka ihe dịtụrụ ndị Chineke mfe. Kama nke ahụ, Jeroboam mere ka o siere ndị Izrel ike irubere Chineke isi. Ihe ùgwù na nsọpụrụ Jeroboam nwere ejughị ya afọ, ọ malitere ịchọ ụzọ ndị ọ ga-esi mee ka ọchịchị ya gbanyekwuo mgbọrọgwụ. Jeroboam wee malite ịsị n’obi ya: “Ọ bụrụ na ndị a anọgide na-agbago ịchụ àjà n’ụlọ Jehova na Jeruselem, obi ndị a ga-alaghachikwuru onyenwe ha, bụ́ Rehoboam eze Juda; ha ga-egburịrị m wee laghachikwuru Rehoboam eze Juda.” N’ihi ya, Jeroboam hiwere okpukpe ọhụrụ, bụ́ ebe a na-efe nwa ehi ọlaedo abụọ. “O wee debe otu na Betel, debekwa nke ọzọ na Dan. Ihe a wee bụrụ ihe na-eme ka ndị Izrel mehie, ha wee malite ịga n’ihu nke ahụ dị na Dan. O wee malite ịrụ ụlọ n’ebe ndị dị elu, sikwa ná ndị nkịtị na-ahọrọ ndị ọ na-eme ndị nchụàjà, bụ́ ndị na-abụghị ụmụ Livaị.” Jeroboam chepụtara otu ụbọchị n’onwe ya wee meere “ụmụ Izrel ememme, chụọkwa àjà n’elu ebe ịchụàjà iji suree ihe nsure ọkụ.”—1 Eze 12:26-33.

12. Gịnị ka ndị guzosiri ike n’ebe Chineke nọ, bụ́ ndị bi n’alaeze ebe ugwu, mere mgbe Jeroboam hiwere ofufe nwa ehi n’Izrel?

12 Gịnịzi ka ndị guzosiri ike n’ebe Chineke nọ, bụ́ ndị bi n’alaeze ebe ugwu ahụ, ga-eme? Ndị Livaị niile bi n’obodo ndị e nyere ha n’ebe ugwu obodo ahụ mere ka ndị nna nna ha site n’isi n’obodo ndị ahụ pụọ n’egbughị oge. (Ọpụ. 32:26-28; Ọnụ Ọgụ. 35:6-8; Diut. 33:8, 9) Ha hapụrụ ala ha na ihe nketa ha ma kpọrọ ndị ezinụlọ ha kwaga Juda nke dị n’ebe ndịda, ka ha wee nwee ike ịnọgide na-efe Jehova n’enweghị ihe mgbochi. (2 Ihe 11:13, 14) Ndị Izrel ndị ọzọ, bụ́ ndị gara ịnọtụ nwa oge na Juda, biriweziri ebe ahụ kama ịlaghachi n’obodo ha. (2 Ihe 10:17) Jehova mere ka ohere ka dịrị onye ọ bụla chọrọ ịbịakwa fewe ya ofufe, ka ọ ga-abụ n’ọdịnihu, ụmụ Izrel ndị bi n’alaeze ebe ugwu ahụ ga-enwe ike ịhapụ ife nwa ehi ma laghachi na Juda.—2 Ihe 15:9-15.

13. N’oge anyị, olee otú ndị si n’ezi ofufe dapụ si na-anwa ịrafu ndị Chineke?

13 Ndị si n’ezi ofufe pụọ na-agbalị ịrafu ndị Chineke taa. Ụfọdụ ndị ọchịchị anwaala ihiwe okpukpe ha ga-achọ ka ndị obodo ha niile na-ekpe, na-amanyekwa ndị niile ha na-achị ime uche ha. Ndị ụkọchukwu Krisendọm na ndị ọzọ dị mpako agbalịala ime ka à ga-asị na ọ bụ ha bụ òtù ndị nchụàjà ahụ bụ́ ndị eze. Ma, ọ bụ naanị n’etiti ezi Ndị Kraịst ka e nwere ndị bụ́ ndị e tere mmanụ n’ezie, ma bụrụkwa “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze.”—1 Pita 2:9; Mkpu. 14:1-5.

14. Olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe ndị si n’ezi ofufe pụọ chọrọ ịrafu anyị?

14 Dị nnọọ ka ndị Livaị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na narị afọ nke iri T.O.A. mere, ndị kwesịrị ntụkwasị obi nye Chineke n’oge a adịghị ekwe ka ndị si n’ezi ofufe dapụ rafuo ha. Ndị e tere mmanụ na Ndị Kraịst ibe ha ndị ọzọ anaghị egbu oge izere na ịjụ ozizi nke ndị si n’ezi ofufe dapụ. (Gụọ Ndị Rom 16:17.) Ọ bụ ezie na anyị na-eji obi ụtọ na-erubere ndị ọchịchị isi ma na-ezere itinye aka n’ọgba aghara ndị a na-enwe n’ụwa, ọ bụ Alaeze Chineke ka anyị na-akwado. (Jọn 18:36; Rom 13:1-8) Anyị na-ajụ echiche nke ndị na-ekwu na ha na-ejere Chineke ozi ma n’otu oge ahụ omume ha a na-ekwu ihe dị iche.—Taị. 1:16.

15. Gịnị mere anyị ji kwesị iguzosi ike n’akụkụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche”?

15 Chetụdị echiche n’eziokwu ahụ bụ́ na Jehova emeela ka ndị nwere obi eziokwu si n’ụwa ọjọọ a pụta, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ma banye na paradaịs ime mmụọ o kere. (2 Kọr. 12:1-4) N’ihi na anyị nwere ekele dị ukwuu maka nke a, anyị na-anọdewe “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nke nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị.” Kraịst ahọpụtala ohu a ilekọta “ihe niile o nwere.” (Mat. 24:45-47) N’ihi ya, ọ bụrụgodị na anyị aghọtachaghị ihe mere òtù ohu ahụ ji mee ihe ụfọdụ, nke ahụ ekwesịghị ime ka anyị nupụ isi ma ọ bụ laghachi n’ụwa Setan. Kama nke ahụ, iguzosi ike n’ebe Chineke nọ ga-eme ka anyị dị umeala n’obi ma chere mgbe Jehova ga-edozi ihe niile.

Mgbe Anyị Na-arụ Ọrụ Chineke Nyere Anyị

16. Olee ọrụ e nyere otu onye amụma si Juda?

16 Jehova katọrọ Jeroboam n’ihi na ọ hapụrụ ezi ofufe. O zigara otu onye amụma si na Juda ka ọ gaa na Betel dị n’ebe ugwu gaa hụ Jeroboam mgbe ọ nọ na-achụ àjà n’ebe ịchụàjà ya. Onye amụma ahụ ga-ezi Jeroboam ozi ikpe ọmụma. Ihe ịrụ aka adịghị ya na nke a abụghị obere ọrụ.—1 Eze 13:1-3.

17. Olee otú Jehova si chebe onye ozi ya?

17 Ezigbo iwe were Jeroboam mgbe ọ nụrụ okwu ikpe ọmụma Jehova. O setịpụrụ aka ya n’ebe onye nnọchianya Chineke nọ ma jiri oké olu sị: “Jidenụ ya!” Ma tupu e mee ihe o kwuru “aka ahụ o setịpụrụ wee kpọnwụọ ozugbo, o nweghịkwa ike isere ya. E mekwara ka ebe ịchụàjà ahụ tiwaa, ntụ nke ya na abụba gwakọtara wee si n’ebe ịchụàjà ahụ wụpụsịa.” Jeroboam maliteziri ịrịọ onye amụma ahụ ka ọ rịọ Jehova ka obi ya jụrụ, nakwa ka o kpee ekpere ka aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ dịghachi mma. Onye amụma ahụ mere ihe ọ rịọrọ, aka ya wee dịghachi mma. Jehova si otú a chebe onye ozi ya.—1 Eze 13:4-6.

18. Olee otú Jehova si echebe anyị ka anyị na-ejere ya ozi dị nsọ n’atụghị egwu?

18 Ka anyị nọgidesiri ike na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ ma na-enyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, mgbe ụfọdụ anyị na-ezute ndị na-enweghị omume enyi, ma ọ bụdị ndị iwe ji. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Ma anyị agaghị ekwe ka ọjụjụ ndị mmadụ na-ajụ ozi ọma anyị mee ka anyị jụọ oyi n’ozi anyị. Dị ka onye amụma ahụ a na-akpọghị aha ya nke gara zie Jeroboam ozi, anyị nwere “ihe ùgwù nke ijere [Jehova] ozi dị nsọ n’atụghị egwu, . . . . n’iguzosi ike n’ihe.” * (Luk 1:74, 75) Ọ bụ ezie na anyị adịghị atụ anya na a ga-echebe anyị n’ụzọ ọrụ ebube n’oge a, Jehova ka na-eji mmụọ nsọ ya na ndị mmụọ ozi ya echebe anyị ma na-akwado anyị bụ́ Ndịàmà ya. (Gụọ Jọn 14:15-17; Mkpughe 14:6.) Chineke agaghị agbahapụ ndị nọgidere na-ekwu okwu ya n’atụghị egwu.—Fil. 1:14, 28.

Jehova Ga-echebe Ndị Ya Na-eguzosi Ike n’Ebe Ọ Nọ

19, 20. (a) Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na e nweghị mgbe Jehova ga-agbahapụ anyị? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Jehova bụ Chineke anyị nke na-eguzosi ike n’ihe. (Mkpu. 15:4; 16:5) “Ọ na-eguzosikwa ike n’ọrụ ya niile.” (Ọma 145:17) Baịbụl mekwara ka obi sie anyị ike, sị: “Ọ ga-echekwa ụzọ nke ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ nche.” (Ilu 2:8) Mgbe ọ bụla ọnwụnwa bịaara anyị ma ọ bụ ndị si na-ezi ofufe dapụ achọọ iduhie anyị, ma ọ bụkwanụ mgbe anyị na-arụ ọrụ na-adịghị mfe, obi kwesịrị isi ndị na-eguzosi ike n’ebe Chineke nọ ike na Jehova ga-eduzi ha ma kwadoo ha.

20 Ihe onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ichebara echiche ugbu a bụ nke a: Gịnị ga-enyere m aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ n’agbanyeghị ọnwụnwa ma ọ bụ ule ndị nwere ike ịbịara m? Ma ọ bụkwanụ, gịnị ga-enyere m aka iguzosikwu ike n’ebe Chineke nọ?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Anyị ga-atụle ma onye amụma ahụ ọ̀ nọgidere na-erubere Jehova isi nakwa ihe mechara mee ya n’isiokwu na-esonụ.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú Jehova si gosi na ya adịghị ahapụ ndị ya na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ mgbe a na-emegbu ha?

• Olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe ndị si na-ezi ofufe pụọ nwara iduhie anyị?

• Olee otú Jehova si echebe ndị ya na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ mgbe ha na-ekwusa ozi ọma?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Map/Foto dị na peeji nke 5]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

ALAEZE EBE UGWU (Jeroboam)

Dan

SHIKEM

Betel

ALAEZE EBE NDỊDA (Rehoboam)

JERUSELEM

[Foto]

Jehova agbahapụghị ndị ya guzosiri ike n’ebe ọ nọ mgbe Jeroboam hiwere ofufe nwa ehi

[Foto dị na peeji nke 3]

E nwere ihe Jehova chọrọ n’aka Sọlọmọn na ndị ọ na-achị ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịnọgide na-enweta ngọzi ya