Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Obi Dị n’Otu Na-eguzosi Ike

Jiri Obi Dị n’Otu Na-eguzosi Ike

Jiri Obi Dị n’Otu Na-eguzosi Ike

“M ga-eje ije n’eziokwu gị. Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.”—ỌMA 86:11.

1, 2. (a) Dị ka e dekọrọ n’Abụ Ọma 86:2, 11, gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ule ma ọ bụ ọnwụnwa ndị bịaara anyị? (b) Olee mgbe anyị kwesịrị ịmụta iguzosi ike n’ebe Jehova nọ?

GỊNỊ mere ụfọdụ Ndị Kraịst kwesịrịla ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ n’agbanyeghị na a kpagburu ha ma ọ bụ tụọ ha mkpọrọ ji emecha kwe ka a nwata ha ịchụwa ihe onwunwe ọnwụ ọnwụ? Ihe kpatara ya si n’obi, nke bụ́ ụdị onye anyị bụ n’ezie. Abụ Ọma nke 86 gosiri na e nwere ihe jikọrọ iguzosi ike na obi dị n’otu; ya bụ, obi zuru ezu, nke a na-ekewaghị ekewa. Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kpere ekpere, sị: “Chebe mkpụrụ obi m, n’ihi na m na-eguzosi ike n’ihe. Zọpụta ohu gị nke tụkwasịrị gị obi—ị bụ Chineke m.” Devid gakwara n’ihu, sị: “Jehova, biko, kụziere m ụzọ gị. M ga-eje ije n’eziokwu gị. Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.”—Ọma 86:2, 11.

2 Anyị kwesịrị iji obi anyị dum tụkwasị Jehova obi, ma ọ́ bụghị ya, ihe ndị ọzọ ga-eme ka anyị ghara iguzosi ike n’akụkụ ezi Chineke ahụ. Ọchịchọ ime ihe ga-adị naanị onwe anyị mma dị ka ogbunigwe e liri n’okporo ụzọ anyị si agafe. Ọ bụrụgodị na anyị ejeerela Jehova ozi ruo ogologo oge n’agbanyeghị ihe isi ike ndị anyị nwere, ọnyà Setan nwere ike ịmata anyị. Lee nnọọ ka o si dị oké mkpa na anyị ga-amụta iji obi anyị niile na-eguzosi ike n’akụkụ Jehova ugbu a tupu ule ma ọ bụ ọnwụnwa abịawara anyị! Baịbụl kwuru, sị: “Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị.” (Ilu 4:23) Anyị nwere ọtụtụ ihe ndị bara uru anyị ga-amụta banyere ichebe obi anyị site n’ihe mere otu onye amụma si Juda, bụ́ onye Jehova zigaara Eze Jeroboam nke Izrel.

‘Ka M Nye Gị Onyinye’

3. Gịnị ka Jeroboam mere mgbe ọ nụrụ ozi ikpe ọmụma onye amụma Chineke ziri?

3 Weregodị ya na ị na-ahụ ka ihe a na-eme. Onye nke Chineke ka zichara Eze Jeroboam, bụ́ onye hiwere ofufe nwa ehi n’alaeze ebo iri Izrel nke dị n’ebe ugwu, ozi ikpe ọmụma ga-abịakwasị ya. Nke a kpasuru eze ahụ ezigbo iwe. Ya enye ndị ohu ya iwu ka ha jide onye ozi Chineke ahụ. Ma Jehova nọnyeere onye ozi ya. Ozugbo ahụ, aka eze ji iwe setịpụ akpọnwụọ n’ụzọ ọrụ ebube, ebe ịchụàjà ahụ o ji na-efe chi ụgha etiwaa. Isi ajụọ Jeroboam oyi ozugbo. Ya arịọwa onye nke Chineke ahụ, sị: “Biko, mee ka obi Jehova bụ́ Chineke gị jụrụ, kpeekwara m ekpere ka e mee ka aka m dịghachi mma.” Onye amụma ahụ kpere ekpere, aka eze adịghachi mma.—1 Eze 13:1-6.

4. (a) Gịnị mere ihe eze kwere nkwa inye onye amụma ahụ ji bụrụ ule n’ezie ma onye amụma ahụ ọ̀ ga-eguzosi ike n’ebe Chineke nọ? (b) Gịnị ka onye amụma ahụ zara?

4 Jeroboam wee sị onye nke ezi Chineke ahụ: “Soro m ka anyị gaa n’ụlọ rie ihe, ka m nyekwa gị onyinye.” (1 Eze 13:7) Gịnị ka onye amụma ahụ ga-eme ugbu a? Ọ̀ ga-ekwe soro eze gaa n’ụlọ ya ugbu a o zichara ya ozi ikpe ọmụma Chineke? (Ọma 119:113) Ka ọ̀ ga-ajụ iso eze lawa n’agbanyeghị na o yiri ka eze ahụ ò chegharịala? Jeroboam nwere nnọọ ọtụtụ onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa ọ ga-enye onye ọ bụla dị ya mma. Ọ bụrụ na onye amụma Chineke ahụ bụ onye hụrụ ihe onwunwe n’anya, ihe a eze kwere nkwa inye ya ga-adọ ya ezigbo akpịrị. Ma, Jehova nyere onye amụma ahụ iwu, sị: “Erila ihe oriri, aṅụkwala mmiri, esikwala n’ụzọ i siri gaa laghachi.” Ọ bụ ya mere onye amụma ahụ ji kwuo n’ezoghị ọnụ, sị: “I nyegodị m ọkara ụlọ gị agaghị m eso gị baa iri ihe oriri ma ọ bụ ịṅụ mmiri n’ebe a.” Onye amụma ahụ sikwa ụzọ ọzọ lawa. (1 Eze 13:8-10) Olee ihe mkpebi a onye amụma a mere na-akụziri anyị banyere iji obi anyị dum na-eguzosi ike n’ebe Chineke nọ?—Rom 15:4.

“Na-enwe Afọ Ojuju”

5. Olee ihe jikọrọ ịhụ ihe onwunwe n’anya na iguzosi ike n’ebe Chineke nọ?

5 O nwere ike ịdị anyị ka e nweghị ihe jikọrọ ịhụ ihe onwunwe n’anya na iguzosi ike n’ebe Jehova nọ, ma e nwere. Obi ò siri anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa o kwere inye anyị ihe ndị dị anyị mkpa n’ezie? (Mat. 6:33; Hib. 13:5) Kama ịdọlịwa inweta ihe ndị “ka mma” aka anyị na-agaghị eruli ugbu a n’agbanyeghị ihe ha ga-ewe iji nweta ha, ànyị nwere ike ịhapụgodị ha? (Gụọ Ndị Filipaị 4:11-13.) Ọ̀ na-adị anyị ka anyị jụ ihe ùgwù ije ozi ụfọdụ ndị anyị nwere ike inwe n’ọgbakọ iji nwee ohere inweta ihe ndị anyị chọrọ ugbu a? Ihe anyị na-ebute ụzọ ná ndụ ọ̀ bụ ịnọgide na-ejere Jehova ozi? Ihe anyị ga-aza ga-egosi ma ànyị ji obi anyị niile na-ejere Chineke ozi ma ọ bụ na anyị ejighị. Pọl onyeozi dere, sị: “N’ezie, nsọpụrụ Chineke a, ya na inwe afọ ojuju, bụ ụzọ isi rite uru dị ukwuu. N’ihi na ọ dịghị ihe anyị ji bịa n’ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iwere si n’ime ya pụọ. Ya mere, ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.”—1 Tim. 6:6-8.

6. Olee “onyinye” ndị e nwere ike iche anyị n’ihu, oleekwa ihe ga-enyere anyị aka ikpebi ma ànyị ga-anara ha ma ọ bụ jụ ha?

6 Dị ka ihe atụ, onye anyị na-arụrụ ọrụ nwere ike ibuli anyị n’ọkwá, tinyekwuoro anyị ihe n’ụgwọ ọnwa anyị ma nye anyị ihe ndị ọzọ. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na anyị chọpụtara na anyị nwere ike ịkpatakwu ego ma ọ bụrụ na anyị akwaga mba ọzọ ma ọ bụ obodo ọzọ ịga chọọ ọrụ. Na mbụ, mmadụ nwere ike ile ohere ndị dị otú a anya dị ka ngọzi Jehova. Ma tupu anyị achụwa ihe ndị a, ọ́ gaghị aka mma ma anyị nyochaa ihe mere anyị ji chọọ ime ha? Ajụjụ mbụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị bụ, “Olee otú mkpebi a m na-achọ ime ga-esi emetụta adịm ná mma mụ na Jehova?”

7. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị wepụ ọchịchọ ọ bụla nke ịhụ ihe onwunwe n’anya n’obi anyị kpamkpam?

7 Ụwa Setan adịtụghị akwụsị ịkwalite àgwà ịhụ ihe onwunwe n’anya. (Gụọ 1 Jọn 2:15, 16.) Ihe dị Ekwensu mkpa bụ imerụ obi anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ijisi ike mara mgbe anyị malitewere ịhụ ihe onwunwe n’anya ma hụ na anyị wepụrụ ụdị ọchịchọ ahụ n’obi anyị kpamkpam. (Mkpu. 3:15-17) Jizọs egbughị oge ịjụ alaeze niile nke ụwa Setan chọrọ inye ya. (Mat. 4:8-10) Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ghewenụ anya unu oghe, lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla, n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” (Luk 12:15) Ọ bụrụ na anyị bụ ndị na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ, anyị ga-adabere n’ebe ọ nọ kama ịdabere n’onwe anyị.

Otu Onye Amụma Merela Agadi “Ghọgburu Ya”

8. Olee otú e si lee onye amụma Chineke ule ma ọ̀ ga-eguzosikwa ike n’ebe Chineke nọ?

8 Onye amụma Chineke ahụ agaraghị abanye ná nsogbu ma a sị na ọ lawara nnọọ n’ụlọ ya. Ma, e nwere ọnwụnwa ọzọ bịara ya. Baịbụl na-ekwu, sị: “Otu onye amụma meworo agadi bi na Betel, ụmụ ya wee bata kọọrọ ya” ihe niile mere n’ụbọchị ahụ. Mgbe ha kọchaara ya ihe niile merenụ, agadi nwoke ahụ gwara ha dokwasịrị ya ihe e ji anọkwasị n’ịnyịnya ibu ka o wee chụrụ onye amụma Chineke gawa. Ọ dịghị anya ya ahụ onye amụma ahụ ka ọ na-ezu ike n’okpuru otu nnukwu osisi, wee sị ya: “Soro m gaa n’ụlọ rie nri.” Mgbe onye nke ezi Chineke ahụ jụrụ, agadi nwoke ahụ gwara ya, sị: “Mụ onwe m bụkwa onye amụma dị ka gị, otu mmụọ ozi gwakwara m okwu dị ka Jehova gwara ya, sị, ‘Mee ka o soro gị lọghachi n’ụlọ gị ka o wee rie nri ma ṅụọ mmiri.’” Ma Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị: “Ọ ghọgburu ya.”—1 Eze 13:11-18.

9. Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ndị na-aghọgbu ndị ọzọ, oleekwa ihe ọjọọ omume ha na-akpata?

9 Anyị amaghị ihe mere onye amụma ahụ merela agadi ji mee ihe ahụ o mere, ma ihe anyị maara bụ na ọ ghara ụgha. Ikekwe e nwere mgbe agadi nwoke ahụ bụ onye amụma Jehova kwesịrị ntụkwasị obi. Ma ugbu a, ọ ghọgburu onye ọzọ. Akwụkwọ Nsọ katọrọ nnọọ ụdị omume a. (Gụọ Ilu 3:32.) Ọ bụghị naanị na ndị na-aghọgbu ndị ọzọ na-emebi adịm ná mma nke ha onwe ha na Jehova kama ha na-emekwa ka ndị ahụ ha ghọgburu na Jehova ghara ịdị ná mma.

‘O Sooro Agadi Nwoke ahụ Laghachi’

10. Olee ihe onye amụma Chineke ahụ mere mgbe agadi nwoke ahụ gwara ya ka o soro ya laghachi, gịnịkwa ka nke a kpataara onye amụma ahụ?

10 Onye amụma ahụ si Juda kwesịrị ịghọta na ọ bụ nghọgbu ka onye amụma ahụ mere agadi na-aghọgbu ya. Ọ gaara ajụ onwe ya, sị, ‘Gịnị mere Jehova ga-eji ziga mmụọ ozi ya ka o zie onye ọzọ ihe ọhụrụ ọ chọrọ ka m mee?’ Onye amụma ahụ gaara arịọ Jehova ka o mee ka ihe ahụ dokwuo ya anya, ma ọ dịghị ebe Akwụkwọ Nsọ kwuru na o mere otú ahụ. Kama nke ahụ, “o sooro [agadi nwoke] ahụ laghachi ka o wee rie nri n’ụlọ ya ma ṅụọ mmiri.” Nke a wutere Jehova. Mgbe onye amụma ahụ a ghọgburu mechara lawa Juda, otu ọdụm hụrụ ya n’ụzọ wee gbuo ya. Otú a ka nke onye amụma ahụ na ọrụ ibu amụma ya si gaa!—1 Eze 13:19-25. *

11. Olee ezi ihe nlereanya Ahaịja setịpụrụ?

11 Ma Ahaịja onye amụma, bụ́ onye e zigara ka ọ gaa tee Jeroboam mmanụ ịbụ eze, nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ruo mgbe o mere agadi. Mgbe Ahaịja katarala nnọọ ahụ́, kpuokwa ísì, Jeroboam zigara nwunye ya ka ọ gaa jụta Ahaịja ma nwa ha na-arịa ọrịa ọ̀ ga-agbake n’ọrịa ahụ. Ahaịja atụghị ụjọ ịgwa ya na nwa ahụ ga-anwụ. (1 Eze 14:1-18) Otu n’ime ngọzi ndị Ahaịja nwetara bụ na n’Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee, a kpọtụrụ uche n’ihe o dere. Olee otú nke a si mee? Mgbe Ezra onye nchụàjà na-ede akwụkwọ Ihe E Mere, ọ kpọtụrụ uche n’ihe Ahaịja dere.—2 Ihe 9:29.

12-14. (a) Olee ihe anyị nwere ike isi n’ihe mere onye amụma Chineke ahụ mụta? (b) Nye ihe atụ iji gosi mkpa ọ dị mmadụ ilezi anya nke ọma na ikpe ekpere tupu ya ekpebie ihe ọ ga-eme banyere ndụmọdụ ndị sitere na Baịbụl ndị okenye nyere ya.

12 Baịbụl ekwughị ihe mere na onye amụma Chineke ahụ ebughị ụzọ jụọ Jehova ma ọ̀ bụ ya soro agadi nwoke ahụ laghachi n’ebe ahụ gaa rie ma ṅụọ. Ọ̀ ga-abụ na agadi nwoke ahụ gwara ya ihe ọ chọrọ ịnụ? Olee ihe anyị nwere ike isi na nke a mụta? Ọ dị mkpa na anyị ga-aghọta nnọọ ihe mere iwu ndị Jehova nyere ji kwesị ekwesị. Anyị kwesịkwara ikpebisi ike irube isi na ha ihe ọ sọkwara ya ya mee.

13 Ụfọdụ na-egere naanị ihe ha chọrọ ịnụ mgbe mmadụ na-enye ha ndụmọdụ. Dị ka ihe atụ, otu onye nkwusa nwere ike inweta ọrụ na-adịghị enye ya ohere iso na-eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ ma ọ bụ nke na-egbochi ya iso ezinụlọ ya na-anọkọ. O nwere ike ịgakwuru otu okenye ọgbakọ ka o nye ya ndụmọdụ. Okenye ahụ nwere ike ịmalite ihe ọ chọrọ ịgwa ya site n’ikwu na ọ bụghị ya ga-atụrụ nwanna ahụ otú ọ ga-esi akpata ihe ọ ga-eji elekọta ezinụlọ ya. Okenye ahụ na nwanna ahụ nweziri ike ịtụle ihe ikweta ịrụ ọrụ ahụ nwere ike ime mmekọrịta nwanna ahụ na ezinụlọ ya na Jehova. Nwanna nwoke ahụ, ọ̀ ga-echeta naanị ihe mbụ ahụ okenye ahụ kwuru, ka ọ̀ ga-echebara ihe ndị ọzọ o mesịrị kwuo echiche nke ọma? O doro anya na nwanna ahụ kwesịrị ikpebi ime ihe ga-akacha nyere ya aka mee ka ya na Jehova dịkwuo ná mma.

14 Tụlegodị ihe atụ ọzọ. Otu nwanna nwaanyị di ya bụ onye na-ekweghị ekwe nwere ike ịjụ otu okenye ma ọ̀ ga-adị mma ma ya na di ya kewaa. Obi abụọ adịghị ya na okenye ahụ ga-agwa ya na ọ bụ ya ka ọ dịịrị ikpebi ihe ọ ga-eme. O nweziri ike igosi ya ihe ndị Baịbụl kwuru n’okwu ahụ. (1 Kọr. 7:10-16) Nwanna nwaanyị ahụ, ọ̀ ga-echebara ihe ahụ okenye ahụ gwara ya ezigbo echiche? Ka ò kpebielarị ịhapụ di ya? Tupu ya ekpebie ihe ọ ga-eme, ọ ga-adị ezigbo mkpa ka o kpee ekpere ka Jehova nye ya amamihe ka ọ na-eji ndụmọdụ dị na Baịbụl na-ekpebi ihe ọ ga-eme.

Dịrị Umeala n’Obi

15. Olee ihe anyị si n’ihe onye amụma Chineke ahụ mejọrọ mụta?

15 Gịnị ọzọ ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ onye amụma ahụ si Juda bịa na-emeteghị? Ilu 3:5 na-ekwu, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị.” Kama ịnọgide na-adabere na Jehova dị ka ọ na-emebu, onye amụma ahụ si Juda tụkwasịrị obi ná nghọta nke onwe ya. Ihe a o mejọrọ riri isi ya, mebiekwa adịm ná mma ya na Chineke. Ihe a mere onye amụma ahụ na-enyere anyị aka ịhụ mkpa ọ dị ịdị umeala n’obi na ịnọgidesi ike n’ebe Jehova nọ ka anyị na-ejere ya ozi!

16, 17. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide n’ebe Jehova nọ?

16 Ọ dị mfe obi anyị iduhie anyị n’ihi na ọ na-achọkarị ọdịmma onwe ya. “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite.” (Jere. 17:9) Ka anyị wee nwee ike ịnọgide n’ebe Jehova nọ, anyị aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji hụ na anyị yipụrụ mmadụ ochie ahụ na ọchịchọ ya nke ibuli onwe onye elu, zerekwa ịdabere naanị ná nghọta nke onwe anyị. Anyị kwesịkwara iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ, “nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.”—Gụọ Ndị Efesọs 4:22-24.

17 Ilu 11:2 na-ekwu, sị: “Ndị dị obi umeala nwere amamihe.” Iji obi umeala na-adabere na Jehova ga-enyere anyị aka izere ime ihe ndị ga-akpatara anyị oké nsogbu. Dị ka ihe atụ, ihe ndị na-eme ka mmadụ daa mbà n’obi nwere ike ime ka anyị ghara ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị. (Ilu 24:10) Ike nwere ike ịdị na-agwụ anyị ime ihe ụfọdụ Ndị Kraịst na-eme ruo n’ókè na anyị nwere ike ichewe na anyị anwaala ike anyị kemgbe ọtụtụ afọ, anyị amalitezie iche na oge eruola ka anyị zuo ike ma hapụrụ ndị ọzọ ọrụ ndị ahụ. Ma ọ bụkwanụ anyị nwere ike ịchọwa ibi ndụ e weere dị ka “ndụ dị otú o kwesịrị.” Ma ọ bụrụ na anyị ‘ana-agbalịsi ike’ ma ‘nwee ọtụtụ ihe anyị na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị,’ anyị ga-echebe obi anyị.—Luk 13:24; 1 Kọr. 15:58.

18. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị amaghị ihe anyị ga-eme eme?

18 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee mkpebi ndị tara akpụ, o nwekwara ike isiri anyị ike ịma ihe anyị kwesịrị ime mgbe ahụ. Ànyị ga-asị ka anyị mee ihe obi anyị gwara anyị na ọ kacha mma? Mgbe ọ bụla anyị hụtara onwe anyị n’ọnọdụ ndị dị otú a, anyị ga-egosi na anyị bụ ndị maara ihe ma ọ bụrụ na anyị arịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Jems 1:5 na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke, n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe.” Nna anyị nke eluigwe ga-enye anyị mmụọ nsọ ya, bụ́ nke dị anyị mkpa iji mee mkpebi ndị dị mma.—Gụọ Luk 11:9, 13.

Kpebisie Ike Ịnọgide Na-eguzosi Ike n’Ebe Jehova Nọ

19, 20. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

19 Ihe ndị mere n’afọ ndị sochirinụ ka Sọlọmọn dapụchara n’ezi ofufe nwalere ndị ohu Chineke ma hà ka ga-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ. Ọ bụ eziokwu na a nwatara ọtụtụ ndị n’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ, ma e nwere ụfọdụ ndị nọgidere na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ.

20 Kwa ụbọchị, anyị na-enwe mkpebi ụfọdụ ma ọ bụ ihe ụfọdụ ndị anyị ga-ahọrọ ime bụ́ ndị ga-anwale anyị ma ànyị ga-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ. Anyị onwe anyị nwekara ike igosi na anyị bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ka anyị nọgide na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ ka anyị niile na-eme ka obi anyị dị n’otu, ka obi siekwa anyị ike na ọ ga-anọgide na-agọzi ndị ya na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ.—2 Sam. 22:26.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Baịbụl agwaghị anyị ma ọ̀ bụ Jehova mere onye amụma ahụ merela agadi ji nwụọ.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Gịnị mere anyị ji kwesị ịgbalịsi ike iwepụ ọchịchọ ịhụ ihe onwunwe n’anya kpamkpam n’obi anyị?

• Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ?

• Olee otú ịdị umeala n’obi ga-esi nyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ebe Chineke nọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Ọ̀ na-esiri gị ike imeri ọnwụnwa?

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ị̀ ga-eji ekpere tụlee ndụmọdụ ndị sitere na Baịbụl?