Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Sọpụrụ Jehova Site n’Ịkpa Àgwà Dị Ùgwù

Sọpụrụ Jehova Site n’Ịkpa Àgwà Dị Ùgwù

Sọpụrụ Jehova Site n’Ịkpa Àgwà Dị Ùgwù

“Ọrụ [Jehova] dị ebube, maakwa mma.”—ỌMA 111:3.

1, 2. (a) Olee otú ị ga-esi kọwaa okwu ahụ bụ́ “ịdị ebube”? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

BAỊBỤL kwuru na Chineke ‘yi ebube dị ka uwe.’ (Ọma 104:1) Mgbe ụfọdụ, n’anya ụmụ mmadụ, ịdị ebube nwere ike ịpụta iji ejiji dị mma. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi chọrọ ka ụmụ nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst “jiri uwe dị mma n’anya na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè, ọ bụghị ịkpa ụdị isi dị iche iche na iji ọlaedo ma ọ bụ nkume pel chọọ onwe ha mma, ma ọ̀ bụ iji ejiji dị nnọọ oké ọnụ.” (1 Tim. 2:9) Ma àgwà dị ùgwù nke na-eme ka ‘ịdị ebube na ịma mma’ Jehova pụta ìhè karịrị nke ahụ.—Ọma 111:3.

2 Na Baịbụl, a pụkwara ịsụgharị okwu Hibru a kpọrọ “ebube” ịbụ “ịma mma,” “ịdị ukwuu,” “ịdị ùgwù,” na “nsọpụrụ.” Dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu si kwuo ya, “ịdị ebube” pụtara “ịbụ onye ruru eru, onye a na-asọpụrụ, ma ọ bụ onye a na-akwanyere ùgwù.” Ọ dịghịkwa onye ọ bụla ruru eru ka a sọpụrụ ya ma kwanyere ya ùgwù karịa Jehova. N’ihi ya, anyị bụ́ ndị ohu Jehova raara onwe ha nye ya kwesịrị ịhụ na okwu ọnụ na omume anyị ga na-adị ùgwù. Ma, n’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ ji kwesị ịdị na-akpa àgwà dị ùgwù? Olee otú Jehova si egosi ebube na ịma mma ya? Olee otú ebube Chineke kwesịrị isi emetụta anyị? Gịnị ka Jizọs Kraịst nwere ike ịkụziri anyị banyere ịkpa ụdị àgwà a? Oleekwanụ otú anyị ga-esi na-akpa àgwà dị ùgwù dị ka ndị Chineke?

Ihe Mere Anyị Ga-eji Nwee Ike Ịkpa Àgwà Dị Ùgwù

3, 4. (a) Olee ihe anyị kwesịrị ime n’ihi ùgwù a kwanyeere anyị? (b) Onye ka Abụ Ọma 8:5-9 na-ebu amụma banyere ya? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.) (c) Olee ndị Jehova kwanyeere ùgwù n’oge gara aga?

3 Ụmụ mmadụ niile nwere ike ịkpa àgwà dị ùgwù n’ihi na e kere ha n’oyiyi Chineke. Jehova kwanyeere mmadụ mbụ ahụ ùgwù site n’inye ya ọrụ ilekọta ụwa. (Jen. 1:26, 27) Ọbụna mgbe Adam mehiechara, Jehova kwughachiri ọchịchọ ya bụ́ ka mmadụ na-elekọta ụwa. Chineke si otú a ‘kpuwe’ ụmụ mmadụ ebube dị ka okpueze. (Gụọ Abụ Ọma 8:5-9.) * Ùgwù a kwanyeere anyị kwesịrị ịkpali anyị ịdị na-akpa àgwà dị ùgwù—ya bụ iji nsọpụrụ na nkwanye ùgwù na-eto aha Jehova dị ebube.

4 Jehova kwanyeere ndị jeere ya ozi dị nsọ ùgwù n’ụzọ pụrụ iche. Chineke kwanyeere Ebel ùgwù site n’ịnabata àjà ọ chụụrụ ya, ma ọ naraghị nke nwanne Ebel bụ́ Ken. (Jen. 4:4, 5) A gwara Mozis ka o mee ka Jọshụa, bụ́ onye na-aga ịnọchi ya dị ka onye ndú nke ndị Izrel, ‘nweta ụfọdụ n’ime ebube ya.’ (Ọnụ Ọgụ. 27:20) Baịbụl kwuru banyere nwa Devid bụ́ Sọlọmọn, sị: “Jehova wee na-eme ka Sọlọmọn dị nnọọ ukwuu n’anya Izrel dum, meekwa ka o nwee ebube nke ọ na-enwebeghị eze ọ bụla chịrị Izrel tupu ya onwe ya nwere ụdị ya.” (1 Ihe 29:25) Chineke ga-akwanyere Ndị Kraịst e tere mmanụ a kpọlitere n’ọnwụ, bụ́ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi kpọsaa “ebube nke ịma mma ọbụbụeze ya,” ùgwù pụrụ iche. (Ọma 145:11-13) Site n’ito Jehova, “atụrụ ọzọ” Jizọs ndị na-amụba n’ike n’ike nwekwara ọrụ dị ùgwù a gọziri agọzi.—Jọn 10:16.

E Mee Ka A Mara Ebube na Ịma Mma Jehova

5. Olee otú ebube Jehova dịruru ukwuu?

5 Mgbe ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid na-ekwu otú Chineke si dị ukwuu na otú mmadụ si dị nnọọ nta, ọ sịrị: “Jehova bụ́ Onyenwe anyị, lee ka aha gị si dị ebube n’ụwa dum, Gị onye a na-akọ akụkọ ịdị ebube ya n’eluigwe!” (Ọma 8:1) Malite mgbe a na-ekebeghị “eluigwe na ụwa” ruokwa mgbe nzube Chineke ime ka ụwa ghọọ paradaịs ma mee ka ụmụ mmadụ zuo okè ga-emezu, ya bụ site ná mgbe ebighị ebi ruo na mgbe ebighị ebi, Jehova Chineke bụ Onye kacha dị ukwuu nakwa Onye kacha dị ebube n’eluigwe na ụwa.—Jen. 1:1; 1 Kọr. 15:24-28; Mkpu. 21:1-5.

6. Gịnị mere ọbụ abụ ahụ ji kwuo na Jehova yi ebube dị ka uwe?

6 Cheedị nnọọ otú ọ dị ọbụ abụ ahụ na-atụ egwu Chineke mgbe ọ hụrụ otú eluigwe jupụtara na kpakpando si maa nnọọ mma dị ka “nkume ndị dị oké ọnụ ahịa” na-egbuke egbuke! Otú Chineke si ‘setịa eluigwe dị ka ákwà ụlọikwuu’ juru ọbụ abụ ahụ anya, nke a mere ka ọ kọwaa Jehova dị ka onye yi ebube dị ka uwe n’ihi otú ihe ndị O kere si maa mma. (Gụọ Abụ Ọma 104:1, 2.) A na-ahụ ebube na ịma mma nke Onye Okike pụrụ ime ihe niile, bụ́ onye a na-adịghị ahụ anya, n’ihe ndị o kere eke a na-ahụ anya.

7, 8. Olee ihe ndị anyị na-ahụ ná mbara igwe bụ́ ndị na-egosipụta ịdị ebube na ịma mma Jehova?

7 Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere ụyọkọ Milky Way. N’ime imerime kpakpando, planet dị iche iche, nakwa anyanwụ, bụ́ ndị dị na Milky Way, ụwa anyị ha ka otu mkpụrụ ájá dị n’ụsọ oké osimiri na-enweghị nsọtụ. E nwedịrị ihe karịrị otu narị ijeri kpakpando n’ụyọkọ Milky Way naanị! A sị gị gụwa kpakpando ndị a otu otu na tịnkọm tịnkọm ọ bụla dị n’awa iri abụọ na anọ a na-enwe n’ụbọchị na-akwụsịghị akwụsị, ọ ga-ewe gị puku afọ atọ ịgụru otu narị ijeri.

8 Ọ bụrụ na naanị ụyọkọ Milky Way nwere otu narị ijeri kpakpando, gịnịzi banyere mbara igwe niile? Ndị na-enyocha mbara igwe na-ekwu na ụyọkọ Milky Way nwere ike ịbụ otu n’ime ihe dị ka ijeri ụyọkọ iri ise ma ọ bụkwanụ ruo otu narị ijeri ụyọkọ na ijeri iri abụọ na ise ndị ọzọ e nwere. Kpakpando ole dị na mbara igwe niile? Ha karịrị nnọọ akarị nke na a maghị ebe a ga-ebido gụwa ha. Ma, Jehova “na-agụ kpakpando niile ọnụ; Ọ na-akpọ ha niile aha ha.” (Ọma 147:4) Ka ị na-ahụ otú Jehova si yiri ebube na ịma mma dị ka uwe, ọ́ dịghị akpali gị ito aha ukwu ya?

9, 10. Olee otú ụzọ e si emepụta achịcha si egosi na Onye Okike anyị maara ihe?

9 Ka anyị hapụgodị eluigwe nke dị ebube ma tụlee ihe banyere achịcha, bụ́ nke a pụrụ iwere na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ọ bụghị naanị na Jehova bụ “Onye kere eluigwe na ụwa” kamakwa ọ bụ “onye na-enye onye na-agha mkpụrụ mkpụrụ n’ụba, nke na-enyekwa achịcha n’ụba ka ndị mmadụ rie.” (Gụọ Ọma 146: 6, 7; 2 Kọr. 9:10) A na-ahụ ‘ebube na ịma mma’ Chineke n’ọrụ ya ndị dị ike, gụnyere ihe ọkụkụ ndị o kere eke, ndị a na-esi na ha enweta ihe e ji eme achịcha. (Gụọ Abụ Ọma 111:1-5.) Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpee ekpere, sị: “Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa.” (Mat. 6:11) N’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl, okwu e ji mee ihe n’ebe a bụ “achịcha,” ya bụ́, “Nye anyị achịcha taa maka ụbọchị taa.” Achịcha bụ nri bụ́ isi ọtụtụ ndị oge ochie na-eri, gụnyere ndị Izrel. Ọ bụ ezie na e lere achịcha anya dị ka nri dị mfe, otú ihe ndị e ji eme achịcha si agwakọta ghọọ achịcha na-atọ ụtọ abụghị obere ihe.

10 Mgbe e dere Baịbụl, ndị Izrel na-eji ntụ ọka wit ma ọ bụ ntụ ọka bali na mmiri eme achịcha. Mgbe ụfọdụ, ha na-etinye ya ihe na-eko achịcha. Ihe ndị a niile na-agwakọta wee mepụta otu ihe n’ụzọ dị ịtụnanya. A ghọtachabeghị kpọmkwem otú ihe ndị a niile si arụ ọrụ. Otú achịcha si agbari n’ime ahụ́ bụkwa ihe ọzọ dị ezigbo ịtụnanya. Ka a sịkwa ihe mere ọbụ abụ ahụ ji bụọ, sị: “Jehova, lee ka ọrụ gị si dị ọtụtụ! I ji amamihe rụọ ha niile.” (Ọma 104:24) Ihe ndị e kere eke hà na-akpali gị ito Jehova dị ka ha kpaliri Devid?

Olee Otú Ebube na Ịma Mma Chineke Si Emetụta Gị?

11, 12. Olee uru ichebara ihe ndị Chineke kere echiche ga-abara anyị?

11 Ọ dịghị mkpa na anyị ga-abụ ndị na-enyocha mbara igwe tupu otú ihu igwe na-adị n’abalị amasịwa anyị ma ọ bụkwanụ bụrụ ndị ọkà mmụta banyere otú ihe si agbanwe tupu achịcha atọwa anyị ụtọ. Otú ọ dị, iji ghọta otú Onye Okike anyị dịruru ukwuu, anyị kwesịrị iwepụta ohere chebara ọrụ ya echiche. Olee uru ichebara ihe ndị a echiche ga-abara anyị? Ọ bụ otu uru ahụ ichebara ọrụ Jehova ndị ọzọ echiche na-aba.

12 Devid bụrụ abụ banyere oké ọrụ Jehova rụụrụ ndị Ya, sị: “M ga na-echebara oké ịma mma nke ebube gị echiche, na-echebakwara okwu banyere ọrụ gị ndị dị ebube echiche.” (Ọma 145:5) Anyị na-egosi na anyị na-echebara ọrụ ndị a echiche site n’ịmụ Baịbụl na iwepụta oge na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị na-agụ n’ime ya. Olee uru nke a ga-aba? Nke a ga-eme ka anyị nwekwuo ekele maka ebube na ịma mma Chineke. Mgbe ahụzi, a ga-akpali anyị isonye Devid n’ịsọpụrụ Jehova na ikwu, sị: “M ga-akọsakwa ịdị ukwuu gị.” (Ọma 145:6) Ichebara oké ọrụ Chineke echiche kwesịrị ime ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma, ọ ga-akpalikwa anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na obi ike na-akọrọ ya ndị ọzọ. Ì ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ma na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta na Jehova Chineke dị ebube, maa mma, ma dị ukwuu?

Jizọs Mere Nnọọ Ka Ebube Chineke Pụta Ìhè

13. (a) Dị ka e kwuru na Daniel 7:13, 14, gịnị ka Jehova nyere Ọkpara ya? (b) Olee otú Jizọs, onye bụ́ Eze, si emeso ndị ọ na-achị?

13 Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ahụ ma sọpụrụ Nna ya nke eluigwe dị ebube ma dị ukwuu. Jehova kwanyeere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ùgwù pụrụ iche site n’inye ya ‘ọchịchị na alaeze.’ (Gụọ Daniel 7:13, 14.) Ma nke a emeghị ka Jizọs bulie onwe ya elu. Kama nke ahụ, ọ bụ Onye Ọchịchị dị ọmịiko nke maara ihe ndị ọ na-achị na-agaghị emeli ma na-akwanyere ha ùgwù. Tụlee otu ihe atụ banyere otú Jizọs, bụ́ Onye A Họpụtara Ịbụ Eze, si mesoo ndị mmadụ ihe, karịsịa ndị a jụrụ ajụ na ndị ọ na-enweghị onye hụrụ ha n’anya.

14. Olee otú e si ele ndị ekpenta anya n’Izrel oge ochie?

14 Ndị na-arịa ekpenta n’oge ochie na-ejikarị nwayọọ nwayọọ anwụ ọnwụ na-agbawa obi. Ọrịa ahụ na-eji nke nta nke nta ezu onye ahụ ahụ́ niile. E lere ịgwọ ekpenta anya dị ka ihe siri ike ka ịkpọlite onye nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Ọnụ Ọgụ. 12:12; 2 Eze 5:7, 14) A na-ewere ndị ekpenta dị ka ndị na-adịghị ọcha, a na-asọkwa ha oyi, a dịghịkwa ekwe ka ha pụta n’ebe ndị mmadụ nọ. Mgbe ha bịawara ebe ndị mmadụ nọ, ha ga na-eti mkpu, sị: “Adịghị m ọcha, adịghị m ọcha!” (Lev. 13:43-46) Onye ekpenta dị ka onye nwụrụ anwụ. Dị ka akwụkwọ ndị rabaị kwuru, onye ekpenta ga-anọ ihe dị ka amaụkwụ isii site n’ebe onye ọzọ nọ. E kwuru na n’otu mgbe a hụrụ onye ekpenta nke nọdị n’ebe dị anya, otu onye ndú okpukpe tụrụ ya nkume ka ọ ghara irute nso.

15. Olee otú Jizọs si mesoo otu onye ekpenta?

15 Otu ihe anyị na-ekwesịghị ichefu bụ otú Jizọs si mesoo onye ekpenta bịakwutere ya ma rịọ ya ka ọ gwọọ ya. (Gụọ Mak 1:40-42.) Kama ịchụpụ onye ekpenta ahụ, Jizọs ji ọmịiko na nkwanye ùgwù mesoo nwoke ahụ a na-asọ oyi ihe. Ihe Jizọs hụrụ bụ onye kwesịrị imere ebere nke chọrọ inwere onwe ya. Ọnọdụ nwoke ahụ metụrụ Jizọs n’obi, ọmịiko Jizọs nwere kpalikwara ya imere nwoke ahụ ihe na-akpa ya. O setịrị aka ya metụ onye ekpenta ahụ ma gwọọ ya.

16. Gịnị ka ị mụtara site n’otú Jizọs si mesoo ndị ọzọ ihe?

16 Olee otú anyị bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs pụrụ isi ṅomie otú Jizọs si mee ka ebube nke Nna ya pụta ìhè? Otu ụzọ bụ site n’ịghọta na mmadụ niile—n’agbanyeghị ihe bụ́ ọnọdụ ha, ọrịa ha na-arịa, ma ọ bụ afọ ndụ ha, kwesịrị ka a kwanyere ha ùgwù. (1 Pita 2:17) Ndị e nyere ọrụ nlekọta, karịsịa ndị bụ́ di, ndị nne na nna, na ndị okenye ọgbakọ, kwesịrị ịkwanyere ndị ha na-elekọta ùgwù ma mee ka ha nọgide na-ele onwe ha anya ka ndị bara uru. Baịbụl mesiri ya ike na nke a bụ ihe a chọrọ n’aka Ndị Kraịst niile mgbe ọ sịrị: “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ. N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.”—Rom 12:10.

Ịkwanyere Ofufe Anyị Na-efe Jehova Ùgwù

17. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’Akwụkwọ Nsọ banyere ịkwanyere Jehova ùgwù mgbe anyị bịara ife ya ofufe?

17 Anyị kwesịrị ịhụ na anyị na-akwanyere Jehova ùgwù mgbe anyị bịara ife ya ofufe. Ekliziastis 5:1 na-ekwu, sị: “Chee ụkwụ gị nche mgbe ọ bụla ị gara n’ụlọ ezi Chineke.” E nyere ma Mozis ma Jọshụa iwu ka ha yipụ akpụkpọ ụkwụ ha mgbe ha nọ n’ebe dị nsọ. (Ọpụ. 3:5; Jọsh. 5:15) Ha ga-eme nke a iji gosi na ha na-akwanyere Jehova ùgwù. A chọrọ ka ndị nchụàjà yiri uwe úkwù “iji kpuchie ahụ́ ha.” (Ọpụ. 28:42, 43) Nke a ga-eme ka ha ghara ikpughe ọtọ ha n’elu ebe ịchụ àjà mgbe ha na-eje ozi. Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ndị nchụàjà kwesịrị ịkwanyere ozi Jehova ùgwù otú Chineke si kwuo.

18. Olee otú anyị si akpa àgwà dị ùgwù mgbe anyị na-efe Jehova?

18 Ịkpa àgwà dị ùgwù mgbe anyị bịara ife ofufe gụnyere ịsọpụrụ ndị ọzọ na ịkwanyere ha ùgwù. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a kwanyere anyị ùgwù, anyị kwesịrị ịkwanyere onwe anyị ùgwù. Anyị kwesịrị iji obi ọcha na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù, ọ bụghị ime ya ka e mezuo iwu. O kwesịrị ịkarị ihe anya mmadụ na-ahụ ma bụrụ nke Chineke na-ahụ—ya bụ, ọ ga-esi anyị n’obi. (1 Sam. 16:7; Ilu 21:2) E kwesịrị iji ịkpa àgwà dị ùgwù mara anyị, anyị kwesịkwara igosipụta ya n’otú anyị si emeso ndị ọzọ nakwa n’otú anyị si ele onwe anyị anya. N’ezie, anyị kwesịrị igosipụta ya mgbe niile nakwa n’ihe ọ bụla anyị na-ekwu ma na-eme. Mgbe a bịara n’ihe banyere àgwà na ejiji anyị, anyị kwesịrị icheta ihe Pọl onyeozi kwuru mgbe ọ sịrị: “Anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ n’ụzọ ọ bụla, ka e wee ghara ịhụta mmejọ n’ozi anyị; kama, n’ụzọ niile, anyị na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke.” (2 Kọr. 6:3, 4) Anyị ‘na-achọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe niile.’—Taị. 2:10.

Nọgide Na-akpa Àgwà Dị Ùgwù nke Na-asọpụrụ Chineke

19, 20. (a) Olee ụzọ dị mma anyị ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime mgbe a bịara n’ịkpa àgwà dị ùgwù?

19 Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị bụ́ “ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst,” na-akpa àgwà ndị dị ùgwù. (2 Kọr. 5:20) “Atụrụ ọzọ” ahụ, bụ́ ndị nọgidere na-akwado ha, bụkwa ndị dị ùgwù na-anọchite anya Alaeze Mesaya ahụ. Onye nnọchiteanya na-eji obi ike ekwu okwu n’ụzọ dị ùgwù mgbe ọ na-ekwuchitere ọchịchị ala ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji obi ike na-ekwu okwu n’ụzọ dị ùgwù ka anyị na-akwado ọchịchị Chineke, bụ́ Alaeze ya. (Efe. 6:19, 20) Ọ́ bụghị ùgwù ka anyị na-akwanyere ndị ọzọ mgbe anyị na-ekwusara ha “ozi ọma nke ihe ka mma”?—Aịza. 52:7.

20 Anyị kwesịrị ikpebisi ike ito Chineke site n’ịkpa àgwà dị ùgwù nke na-ewetara ya nsọpụrụ. (1 Pita 2:12) Ka anyị na-akwanyere ya ùgwù n’ụzọ miri emi, na-akwanyere ofufe ya ùgwù ma na-akwanyekwara ndị anyị na ha so na-efe ya ofufe ùgwù. Ka ụzọ dị ùgwù anyị si efe Jehova, bụ́ onye yi ebube na ịma mma dị ka uwe, na-amasị ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Okwu ndị ahụ Devid kwuru n’Abụ Ọma nke asatọ bụkwa amụma banyere nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jizọs Kraịst.—Hib. 2:5-9.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú inwe ekele maka ịma mma nke ebube Jehova kwesịrị isi emetụta anyị?

• Olee ihe anyị pụrụ ịmụta banyere ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù site n’otú Jizọs si mesoo otu onye ekpenta ihe?

• Olee otú anyị pụrụ isi sọpụrụ Jehova n’ụzọ dị ùgwù?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 12]

Olee otú Jehova si kwanyere Ebel ùgwù?

[Foto dị na peeji nke 14]

A na-ahụ oké ọrụ Jehova ọbụna n’achịcha o nyere anyị

[Foto dị na peeji nke 15]

Gịnị ka ị mụtara banyere ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù n’otú Jizọs si mesoo otu onye ekpenta ihe?

[Foto dị na peeji nke 16]

Ịkwanyere ofufe anyị na-efe Jehova ùgwù gụnyere ịsọpụrụ ya