Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgba Àmà n’Ọma Ahịa

Ịgba Àmà n’Ọma Ahịa

Ịgba Àmà n’Ọma Ahịa

MGBE Pọl onyeozi nọ n’obodo Atens, ọ na-aga n’ọma ahịa kwa ụbọchị ekwusa ozi ọma banyere Jizọs. (Ọrụ 17:17) Ihe mere Pọl ji họrọ ikwusa ozi ọma n’ọma ahịa bụ n’ihi na ọtụtụ ndị Atens na-anọkarị n’ebe ahụ.

Ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gachara, ndị Jehova ka na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ọma ahịa. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na a na-ahụkarị ndị mmadụ n’ọma ahịa. Taa, ọma ahịa a na-ekwu okwu ya nwere ike ịbụ ebe e nwere ọtụtụ ụlọ ahịa. Mgbe ha natachara ikike n’aka onye na-elekọta ụlọ ahịa ma ọ bụ onye nwe ya, ụfọdụ Ndịàmà na-adọwa tebụl n’otu akụkụ ma ọ bụ rụta ebe ha ga-agbasa akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ka ndị mmadụ nwee ike ịhụ ha.

Dị ka ihe atụ, n’otu ebe e nwere ọtụtụ ụlọ ahịa dị n’obodo New Jersey, U.S.A., e nwere ebe a kpọsara akwụkwọ ndị kọwara nnọọ otú ezinụlọ ga-esi na-eme nke ọma n’okpuru ebe e dere isiokwu bụ́ “Olee Otú Ị Ga-esi Mee Ka Ezinụlọ Gị Na-eme nke Ọma?” Gịnị ka nke a rụpụtara? N’otu ụbọchị, ndị mmadụ naara akwụkwọ dị otu narị na iri ise na atọ n’asụsụ isii.

Otu nwaanyị nke bịara n’ebe ahụ a kpọsara akwụkwọ ndị ahụ gere nnọọ ntị nke ọma mgbe otu Onyeàmà na-akọwa ihe ndị Baịbụl kwuru. Nwaanyị ahụ kwetara na ọ dị mkpa ka anyị kwere ka Chineke bata ná ndụ anyị nakwa n’ezinụlọ anyị. Ọ naara akwụkwọ ndị a na-esonụ: Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, na Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè.

N’ehihie, otu nwoke gafetara ebe ahụ a kpọsara akwụkwọ ka ọ na-achọ ịbanye n’otu ụlọ ahịa dị n’akụkụ ebe ahụ. Anya ya gara n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ. Nwanna nwaanyị nọ ebe ahụ hụrụ ụdị anya nwoke ahụ na-ele akwụkwọ ahụ wee jụọ ya, sị, “Ò nwere nke masịrị gị n’akwụkwọ ndị a?” Nwoke ahụ kwere n’isi ma tụọ akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ aka. Nwanna nwaanyị ahụ nyere ya akwụkwọ ahụ nke ọ matịwarala aka iwere. Nwoke ahụ kwuru na ya nwere ụmụ atọ. Ka ha nọ na-ekwu, nwoke ahụ kwuru na ya na ụmụ ya na-adị na-enwe mkparịta ụka otu ugbo n’izu. Ụmụ ya ndị nke okenye abụọ agafechaala afọ iri na atọ. Mgbe ọ na-asagharị akwụkwọ ahụ, o kwuru na ya na ndị ezinụlọ ya ga-eji ya mere ihe ha ga-eji na-enwe mkparịta ụka ha mgbe ụfọdụ. Nwanna nwaanyị ahụ gosikwara ya akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, ma gwa ya na ọ ga-abara ya na nwunye ya uru dị ukwuu mgbe ha na-eme mkpebi n’ezinụlọ ha. Nwoke ahụ kelere nwanna nwaanyị ahụ maka aro ahụ ọ tụụrụ ya, nye onyinye afọ ofufo, ma kweta ka a bịa na nke ya.

Olee otú obi dị Ndịàmà a n’ụbọchị ahụ ha kwusara ozi ọma n’ebe ahụ a na-azụ ahịa? Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Isi otú a gbasaa ozi ọma tọrọ m nnọọ ụtọ. M gaghị echefu ya echefu!” Nwanna nwaanyị ọzọ kwukwara, sị: “Jehova kwuru na a ga-ekwusa ozi ọma ruo n’ebe kasị anya n’ụwa. N’oge a, na Paramus dị n’obodo New Jersey, ozi ọma a agbanweela ndụ ndị na-asụ asụsụ dị iche iche. Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ iso rụọ ọrụ a. Ndị niile so rụọ ya nwere obi ụtọ. Ọ dịghị onye n’ime anyị chọrọ ịla ka chi jiwere.”

Ì nwere ike ịchọta ụzọ ndị ọzọ ị ga-esi kwusaa ozi ọma? Ụzọ bụ́ isi anyị si ekwusa ozi ọma bụ site n’ụlọ rụọ n’ụlọ. (Ọrụ 20:20) Ma, ì nwere ike ịgbalị ikwusa ozi ọma n’ọma ahịa ma ọ bụ n’ebe e nwere ọtụtụ ụlọ ahịa?