Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-ebute Ụzọ n’Inye Ndị Ọzọ Nsọpụrụ?

Ị̀ Na-ebute Ụzọ n’Inye Ndị Ọzọ Nsọpụrụ?

Ị̀ Na-ebute Ụzọ n’Inye Ndị Ọzọ Nsọpụrụ?

“N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.”—ROM 12:10.

1. Olee ihe a na-adịghị ahụkarịzi n’ọtụtụ ebe n’ụwa taa?

N’EBE ụfọdụ n’ụwa, ọ bụ omenala na ụmụaka ga na-enye ndị toro eto nsọpụrụ site n’igbu ikpere n’ala mgbe ha na ha nọ. Ọ bụrụ na ha emee nke a, ha agaghị aka ndị tọrọ ha ogologo. N’ebe ndị a, a na-ewerekwa nwa gbanyeere onye tọrọ ya azụ mgbe ọ na-agwa ya okwu ka nwa na-enweghị nsọpụrụ. Ọ bụ ezie na mba dị iche iche nwere otú ha si egosi nsọpụrụ, ụzọ ndị a ha si egosi nsọpụrụ na-echetara anyị Iwu Mozis. Otu n’ime iwu ahụ bụ: “Ị ga-ebiliri onye isi awọ́, sọpụkwara onye mere agadi.” (Lev. 19:32) Ọ dị mwute ikwu na n’ọtụtụ ebe taa, ndị mmadụ anaghị asọpụrụzi ndị ọzọ. N’ezie, nsọpụrụ alaala n’ụwa taa.

2. Olee ndị Okwu Chineke gwara anyị sọpụrụ?

2 Okwu Chineke ejighị inye nsọpụrụ egwuri egwu. Ọ gwara anyị ka anyị sọpụrụ Jehova na Jizọs. (Jọn 5:23) E nyekwara anyị iwu ka anyị sọpụrụ ndị ezinụlọ anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị nakwa ndị ọzọ na-abụghị ndị kwere ekwe ibe anyị. (Rom 12:10; Efe. 6:1, 2; 1 Pita 2:17) Olee ụzọ ụfọdụ anyị si egosi na anyị na-asọpụrụ Jehova? Olee otú anyị si egosi na anyị na-asọpụrụ ma ọ bụ na-akwanyere ụmụnna anyị ùgwù? Ka anyị tụlee ajụjụ ndị a na ụfọdụ ndị ọzọ yiri ha.

Sọpụrụ Jehova na Aha Ya

3. Olee otu ụzọ dị mkpa anyị si asọpụrụ Jehova?

3 Otu ụzọ dị mkpa anyị si asọpụrụ Jehova bụ site n’ịkwanyere aha ya ùgwù kwesịrị ekwesị. A sị ka e kwuwe, anyị bụ ndị ‘o wepụtara maka aha ya.’ (Ọrụ 15:14) Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù ịza aha Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile bụ́ Jehova. Maịka onye amụma kwuru, sị: “Ndị niile dị iche iche ga na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha chi ya; ma anyị onwe anyị ga na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Maị. 4:5) Anyị “na-ejegharị n’aha Jehova” site n’ibi ndụ kwa ụbọchị otú ga-eme ka a ghara ikwujọ Jehova na aha ya. Dị ka Pọl chetaara Ndị Kraịst bi na Rom, ọ bụrụ na anyị adịghị ebi ndụ kwekọrọ n’ozi ọma anyị na-ekwusa, ọ ga-eme ka “a na-ekwulu” aha Chineke, nke bụ́ na anyị ga-ewetara Chineke aha ọjọọ.—Rom 2:21-24.

4. Olee otú i si ele ihe ùgwù nke ịgbara Jehova àmà anya?

4 Anyị na-esitekwa n’ọrụ nkwusa anyị asọpụrụ Jehova. N’oge ochie, Jehova kpọrọ mba Izrel ka ha bụrụ ndị àmà ya, ma ha emelighị nke a. (Aịza. 43:1-12) Ha nupụụrụ Jehova isi ọtụtụ mgbe, “ha mekwara ihe wutere Onye Nsọ Izrel.” (Ọma 78:40, 41) N’ikpeazụ, Jehova jụrụ mba ahụ kpamkpam. Ma anyị onwe anyị taa nwere ekele maka ihe ùgwù nke ịgba àmà banyere aha Jehova na ime ka ndị mmadụ mara aha ya. Anyị na-eme nke a n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, ọ na-agụkwa anyị agụụ ka e doo aha ya nsọ. Olee otú anyị ga-esi ghara ikwusa ozi ọma mgbe anyị maara ihe bụ́ eziokwu banyere Nna anyị nke eluigwe na nzube ya? Ọ na-adị anyị ka ọ dị Pọl onyeozi mgbe ọ sịrị: “Ọ bụ mkpa nke dịịrị m. N’ezie, ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na ezisaghị m ozi ọma!”—1 Kọr. 9:16.

5. Olee otú inwe okwukwe na Jehova na ịsọpụrụ ya si nwee njikọ?

5 Ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru, sị: “Ndị maara aha gị ga-atụkwasị gị obi, n’ihi na gị onwe gị, Jehova, agaghị ahapụ ndị na-achọ gị.” (Ọma 9:10) Ọ bụrụ na anyị maara Jehova n’ezie ma na-asọpụrụ aha ya, anyị ga-atụkwasị ya obi dị nnọọ ka ndị ohu ya oge ochie kwesịrị ntụkwasị obi mere. Inwe okwukwe na ịtụkwasị Jehova obi otú a bụ ụzọ ọzọ anyị si asọpụrụ ya. Lee otú Okwu Chineke si gosi ihe jikọrọ ịtụkwasị Jehova obi na ịsọpụrụ ya. Mgbe ndị Izrel oge ochie kwụsịrị ịtụkwasị Chineke obi, Jehova jụrụ Mozis, sị: “Ruo ole mgbe ka ndị a ga na-akparị m, ruokwa ole mgbe ka ha ga-anọ na-abụ ndị na-enweghị okwukwe n’ebe m nọ n’agbanyeghị ihe ịrịba ama niile m mere n’etiti ha?” (Ọnụ Ọgụ. 14:11) N’aka nke ọzọ, ịtụkwasị Jehova obi na-egosi na anyị na-asọpụrụ ya. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi na ọ ga-echebe anyị ma nyere anyị aka ọbụna mgbe anyị nọ ná nsogbu, anyị na-egosi na anyị na-asọpụrụ ya.

6. Gịnị na-akpali anyị ịkwanyere Jehova ùgwù miri emi?

6 Jizọs kwuru na ịsọpụrụ Jehova ga-esiterịrị n’obi. Mgbe Jizọs na-agwa ndị na-ejighị ezi obi na-efe Chineke okwu, o kwuru ihe Jehova kwuru, sị: “Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị nnọọ anya n’ebe m nọ.” (Mat. 15:8) Ịhụnanya si n’ala ala obi anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-akpali anyị iji obi dum na-asọpụrụ ya. (1 Jọn 5:3) Anyị na-echetakwa nkwa Jehova kwere, sị: “Ndị na-asọpụrụ m ka m ga-akwanyere ùgwù.”—1 Sam. 2:30.

Ndị Nlekọta Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù

7. (a) Olee ihe mere ụmụnna ndị nwere ihe ùgwù n’ọgbakọ ji kwesị ịkwanyere ndị ha na-elekọta ùgwù? (b) Olee otú Pọl si kwanyere ndị kwere ekwe ibe ya ùgwù?

7 Pọl onyeozi dụrụ ndị kwere ekwe ibe ya ọdụ, sị: “N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Rom 12:10) Ụmụnna nwoke ndị nwere ihe ùgwù n’ọgbakọ kwesịrị isetịpụ ihe nlereanya—‘na-ebute ụzọ’—n’ịkwanyere ndị ha na-elekọta ùgwù. N’akụkụ a, ndị nwere nnukwu ibu ọrụ kwesịrị iṅomi Pọl. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8.) Ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ndị ahụ Pọl gara leta maara na ọ dịghị ihe ga-eme ka ọ gwa ha mee ihe ya onwe ya na-adịghị njikere ime. Pọl kwanyeere ndị kwere ekwe ibe ya ùgwù, n’ihi ya kwa ha kwanyeere ya ùgwù. Mgbe Pọl kwuru, sị: “Ya mere, ana m arịọsi unu arịrịọ ike, bụrụnụ ndị na-eṅomi m,” o doro anyị anya na ọtụtụ ndị dị njikere ime ihe ọ gwara ha n’ihi ihe nlereanya ya dị mma.—1 Kọr. 4:16.

8. (a) Olee otu ụzọ dị mkpa Jizọs si kwanyere ndị na-eso ụzọ ya ùgwù? (b) Olee otú ndị nlekọta nke oge a nwere ike isi ṅomie Jizọs?

8 Ụzọ ọzọ nwanna nwoke nwere ihe ùgwù n’ọgbakọ na-esi asọpụrụ ndị ọ na-elekọta bụ site n’ime ka ha mara ihe mere o ji gwa ha mee ihe ụfọdụ ma ọ bụ ihe mere ha ga-eji gbasoo ntụziaka o nyere ha. Ọ bụrụ na o mee nke a, ọ na-eṅomi Jizọs. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs na-agwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpee ekpere ka Chineke zitekwuo ndị ọrụ maka owuwe ihe ubi ya, ọ gwara ha ihe mere ha ga-eji mee nke a. Ọ sịrị: “Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Mat. 9:37, 38) N’otu aka ahụ, mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘na-eche nche,’ ọ gwara ha ihe mere ha ga-eji mee nke a. Ọ sịrị: “N’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.” (Mat. 24:42) Ọtụtụ ugboro, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, ọ bụghị naanị ihe ha kwesịrị ime, kama ihe mere ha ji kwesị ime ya. N’ụzọ dị otú a, ọ kwanyeere ha ùgwù ma sọpụrụ ha. Lee nnọọ otú nke a si bụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya nke ndị nlekọta n’ọgbakọ kwesịrị iṅomi!

Kwanyere Ọgbakọ Jehova na Nduzi Ya Ùgwù

9. Gịnị ka anyị irubere ọgbakọ Ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ na ndị nnọchianya ha isi na-egosi? Kọwaa.

9 Iji kwanyere Jehova ùgwù, anyị kwesịkwara ịkwanyere ọgbakọ ya zuru ụwa ọnụ na ndị nnọchianya ya ùgwù. Mgbe anyị na-aṅa ntị na ndụmọdụ òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi si n’Akwụkwọ Nsọ na-enye, anyị na-akwanyere ndokwa ndị Jehova mere ùgwù. N’ọgbakọ Ndị Kraịst narị afọ mbụ, Jọn onyeozi hụrụ mkpa ọ dị ịbara ndị na-adịghị asọpụrụ ndị a họpụtara ije ozi n’ọgbakọ mba. (Gụọ 3 Jọn 9-11.) Ihe ndị Jọn kwuru gosiri na ọ bụghị naanị ndị nlekọta nọ n’ọgbakọ ka ha na-adịghị akwanyere ùgwù, kamakwa ha adịghị akwanyere ihe ndị ha na-ezi na ntụziaka ndị ha na-enye ùgwù. Ihe na-enye obi ụtọ bụ na ihe ka ọtụtụ ná Ndị Kraịst adịghị otú ahụ. Mgbe ndịozi dị ndụ, o yiri ka òtù ụmụnna niile kwanyeere ndị na-edu ndú ùgwù miri emi.—Fil. 2:12.

10, 11. Si n’Akwụkwọ Nsọ kọwaa ihe mere o ji kwesị ekwesị na a ga-enwe ndị na-edu ndú n’ọgbakọ.

10 Ụfọdụ ekwuola na ebe ọ bụ na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ‘ha niile bụ ụmụnna,’ na e kwesịghị inwe ndị ndú n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Mat. 23:8) Ma, n’Akwụkwọ Nsọ Hibru na nke Grik, e nwere ọtụtụ ihe atụ nke ndị Chineke nyere ọrụ iduzi ndị ọzọ. Akụkọ banyere ndị nna ochie ahụ, ndị ikpe, na ndị eze n’oge ndị Hibru oge ochie na-egosi nnọọ na Jehova na-esi n’aka ndị nnọchianya ya bụ́ mmadụ eduzi ndị ya. Mgbe ndị Izrel na-asọpụrụghị ndị ahụ ọ họpụtara, Jehova na-enye ha ntaramahụhụ.—2 Eze 1:2-17; 2:19, 23, 24.

11 N’otu aka ahụ, Ndị Kraịst narị afọ mbụ rubeere ndịozi isi. (Ọrụ 2:42) Dị ka ihe atụ, Pọl nyere ụmụnna ya ntụziaka. (1 Kọr. 16:1; 1 Tesa. 4:2) N’agbanyeghị nke ahụ, o jikwa obi ya niile rubere ndị nke ka ya isi. (Ọrụ 15:22; Gal. 2:9, 10) N’ezie, Pọl maara otú e kwesịrị isi na-ele ndị na-edu ndú n’ọgbakọ anya.

12. Olee ihe abụọ anyị na-amụta banyere ịbụisi site n’ihe atụ ndị dị na Baịbụl?

12 Anyị na-amụta ihe abụọ n’ebe a. Nke mbụ, Akwụkwọ Nsọ kwadoro ka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” site n’aka Òtù Na-achị Isi nke na-anọchite anya ya, na-ahọpụta ndị ga-enwe ihe ùgwù n’ọgbakọ, e nwekwara ndị a họpụtara iduzi ndị ọzọ a họpụtara ahọpụta. (Mat. 24:45-47; 1 Pita 5:1-3) Nke abụọ, anyị niile, tinyere ụmụ nwoke a họpụtara ahọpụta, kwesịrị ịsọpụrụ ndị a họpụtara iduzi anyị. Oleezi ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi kwanyere ndị nlekọta nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ ùgwù?

Ịkwanyere Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị Ùgwù

13. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-asọpụrụ ndị na-elekọta ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge a?

13 Pọl sịrị: “Ụmụnna anyị, anyị na-arịọ unu ka unu na-akwanyere ndị na-arụsi ọrụ ike n’etiti unu ùgwù, bụ́ ndị na-elekọta unu n’ime Onyenwe anyị ma na-adụ unu ọdụ; jirinụ ịhụnanya na-asọpụrụ ha nke ukwuu n’ụzọ pụrụ iche n’ihi ọrụ ha. Ka unu na ibe unu na-adị n’udo.” (1 Tesa. 5:12, 13) N’eziokwu, e kwesịrị ịgụnye ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ná “ndị na-arụsi ọrụ ike.” N’ihi ya, ka anyị “na-asọpụrụ ha nke ukwuu n’ụzọ pụrụ iche.” Otu ụzọ anyị si eme nke a bụ site n’iji obi anyị niile rube isi na ndụmọdụ na agbamume ndị ha na-enye. Mgbe ndị nlekọta a gwara anyị ihe òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi kwuru, “amamihe nke si n’elu” ga-akpali anyị ịdị “njikere irube isi.”—Jems 3:17.

14. Olee otú ọgbakọ si egosi na ha na-asọpụrụ nnọọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, oleekwa ihe ime nke a na-arụpụta?

14 Gịnịkwanụ ma a gwa anyị mee ihe otú dị iche n’otú anyị si emebu ya? Igosi nkwanye ùgwù nwere ike ịchọ mgbe ụfọdụ ka anyị gbalịsie ike ịghara ịdị na-eche sị, “Anyị adịghị eme ihe otú ahụ n’ebe a” ma ọ bụ, “O nwere ike ịdaba ma e mee ya otú ahụ n’ọgbakọ ọzọ ma ọ bụghị n’ọgbakọ anyị.” Kama iche otú a, anyị kwesịrị ịgbalị ime ihe a gwara anyị mee. Icheta na ọ bụ Jehova nwe ọgbakọ nakwa na Jizọs bụ Onyeisi nke ọgbakọ, ga-enyere anyị aka ime nke a. Ọ bụrụ na ọgbakọ ejiri ọṅụ nabata ihe onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kwuru ma mee ya, anyị na-egosi na anyị na-asọpụrụ ya n’ezie. Pọl onyeozi jara ụmụnna ndị Kọrịnt mma maka otú ha si jiri nkwanye ùgwù rube isi ná ntụziaka Taịtọs, bụ́ okenye si esi bịa, nyere ha. (2 Kọr. 7:13-16) Taa, obi kwesịkwara isi anyị ike na ịdị njikere ime ihe ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị kwuru ga-enye aka dị ukwuu n’ime ka anyị nwee ọṅụ n’ọrụ ikwusa ozi ọma anyị.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 13:11.

“Sọpụrụnụ Ụdị Mmadụ Niile”

15. Olee ụzọ ụfọdụ anyị si asọpụrụ ndị kwere ekwe ibe anyị?

15 Pọl dere, sị: “Abasirila okenye mba ike. Kama nke ahụ, na-arịọ ya arịrịọ dị ka nna gị, na-emeso ụmụ okorobịa dị ka ụmụnne gị ndị nwoke, na-emeso ụmụ nwaanyị mere okenye dị ka ndị nne, na-emeso ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne gị ndị nwaanyị n’ịdị ọcha niile. Na-asọpụrụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ndị bụ́ n’ezie ndị di ha nwụrụ.” (1 Tim. 5:1-3) N’ezie, Okwu Chineke na-adụ anyị ọdụ ka anyị na-asọpụrụ onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na gị na otu nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị enwee nghọtahie? Nke ahụ ọ̀ ga-egbochi gị ịkwanyere ya ùgwù? Ka ị̀ ga-agbanwe echiche gị banyere onye ahụ site n’ịchọpụta àgwà Ndị Kraịst ohu Chineke ahụ nwere? Karịsịa ndị e nyere ọrụ ilekọta ndị ọzọ kwesịrị ịnọgide na-akwanyere ụmụnna ha ùgwù—‘ọ bụghị ime ka ọ bụ ha nwe ìgwè atụrụ ahụ.’ (1 Pita 5:3) N’ezie, n’ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ nke e ji ịhụnanya si n’ala ala obi ha nwere n’etiti onwe ha mara, anyị nwere ọtụtụ ohere iji sọpụrụ ndị ọzọ.—Gụọ Jọn 13:34, 35.

16, 17. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-asọpụrụ ma ndị anyị na-ekwusara ozi ọma ma ndị na-emegide anyị? (b) Olee otú anyị si ‘asọpụrụ ụdị mmadụ niile’?

16 N’ezie, ọ bụghị naanị ndị nọ n’ọgbakọ ka anyị na-asọpụrụ. Pọl degaara Ndị Kraịst oge ya akwụkwọ ozi, sị: “Ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya, ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ.” (Gal. 6:10) N’eziokwu, ọ dịghị mfe ime ihe a ma ọ bụrụ na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ nwa akwụkwọ ibe anyị na-akpaso anyị àgwà ọjọọ. Ọ dịrị otú ahụ, anyị kwesịrị icheta ihe a e dere, sị: “Ewela iwe n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ.” (Ọma 37:1) Ime ihe a a dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-eme ga-enyere anyị aka ịkwanyere ọbụna ndị na-emegide anyị ùgwù. N’otu aka ahụ, mgbe anyị nọ n’ozi ọma, ọ bụrụ na anyị adịghị ebuli onwe anyị elu, ọ ga-enyere anyị aka iji “obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu” na-emeso ndị niile ihe. (1 Pita 3:15) Uwe na ejiji anyị sodị egosi ma ànyị na-akwanyere ndị anyị na-ekwusara ozi ọma ùgwù.

17 N’ezie, ma ọ̀ bụ anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị na-emekọ ihe ma ọ bụ anyị na ndị na-abụghị ndị kwere ekwe ibe anyị, anyị kwesịrị ịgbalị ime ihe a a dụrụ anyị ọdụ ka anyị mee: “Sọpụrụnụ ụdị mmadụ niile, hụnụ òtù ụmụnna dum n’anya, tụọnụ egwu Chineke, sọpụrụnụ eze unu.”—1 Pita 2:17.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

Olee otú ị ga-esi gosi na ị na-asọpụrụ:

• Jehova?

• Ndị okenye ọgbakọ na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị?

• Onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ?

• Ndị ị na-ekwusara ozi ọma?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị Kraịst narị afọ mbụ kwanyeere òtù na-achị isi ùgwù

[Foto dị na peeji nke 24]

Ndị okenye nọ ná mba dị iche iche na-asọpụrụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, bụ́ ndị Òtù Na-achị Isi họpụtara