AnyA Jehova “nke Na-enwu Gbaa” Na-enyocha Mmadụ Niile
AnyA Jehova “nke Na-enwu Gbaa” Na-enyocha Mmadụ Niile
“Anya [Jehova] nke na-enwu gbaa na-enyocha ụmụ mmadụ.”—ỌMA 11:4.
1. Olee ụdị ndị ọ na-amasị anyị ka anyị na ha na-adị ná mma?
OLEE otú i si ewere ndị nwere nnọọ mmasị n’ebe ị nọ? Ha na-agwa gị eziokwu ma ị jụọ ha ihe ha chere banyere gị. Ha na-adị nnọọ njikere inyere gị aka mgbe ọ bụla ị chọrọ enyemaka. Mgbe i mejọrọ ihe, ha na-eji ịhụnanya abara gị mba. (Ọma 141:5; Gal. 6:1) Ọ́ dịghị amasị gị ka ndị dị otú a bụrụ ndị enyi gị? Jehova na Ọkpara ya bụ nnọọ ndị enyi dị otú a. N’ezie, ha nwere mmasị n’ebe ị nọ karịa ka mmadụ ọ bụla nwere n’ebe ị nọ, nke a abụghị n’ihi ihe ha ga-erite n’aka gị; kama ọ bụ n’ihi na ha chọrọ inyere gị aka ‘ijidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.’—1 Tim. 6:19; Mkpu. 3:19.
2. Olee ókè Jehova nweruru mmasị n’ebe ndị ohu ya nọ?
2 Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid gosiri otú Jehova nweruru mmasị n’ebe anyị nọ mgbe ọ sịrị: “Anya [Jehova] na-ahụ, anya ya nke na-enwu gbaa na-enyocha ụmụ mmadụ.” (Ọma 11:4) N’ezie, Chineke na-eme ihe karịrị naanị ile anyị; ọ na-enyocha anyị. Devid dekwara, sị: “I nyochawo obi m, i nyochawo m n’abalị . . . Ị ga-achọpụta na emeghị m atụmatụ ihe ọjọọ.” (Ọma 17:3) O doro nnọọ anya na Devid maara ókè Jehova nweruru mmasị n’ebe ọ nọ. Ọ maara na ọ ga-ewute Jehova ma ya buru ihe ọjọọ n’obi ma ọ bụ kpaa nkata ime ya. Ì weere Jehova otú a Devid si were ya?
Jehova Na-ahụ Ihe Dị n’Obi
3. Olee otú Jehova si gosi na ya ghọtara na anyị bụ ndị na-ezughị okè?
3 Jehova kacha nwee mmasị n’ụdị mmadụ anyị bụ n’ime, ya bụ n’ihe ndị dị anyị n’obi. (Ọma 19:14; 26:2) Iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya, ọ dịghị elekwasị anya n’ebe ndị anyị na-adịghị emecha nke ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe Sera, bụ́ nwunye Ebreham, kwuru ihe na-abụchaghị eziokwu mgbe otu mmụọ ozi nwoghara enwogha jụrụ ya ihe o mere, mmụọ ozi ahụ ghọtara na ọ bụ ụjọ mere o ji gọọ agọ nakwa na ihere mere ya na a chọpụtara ihe o mere. N’ihi ya, naanị ihe mmụọ ozi ahụ mere bụ ịbara ya obere mba. (Jen. 18:12-15) Mgbe nna ochie ahụ bụ́ Job “kpọrọ mkpụrụ obi nke ya onye ezi omume kama ịkpọ Chineke onye ezi omume,” Jehova ejighị maka nke a ghara ịgọzi ya, ọ maara na Job ahụsiela anya n’aka Setan. (Job 32:2; 42:12) Otú ahụkwa ka ọ dị nwaanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ, Jehova ewesaghị ya iwe n’ihi otú o si gwa Ịlaịja onye amụma okwu n’asọghị anya. Chineke ghọtara na ọ nọ ná mwute n’ihi ọnwụ otu mkpụrụ nwa o nwere.—1 Eze 17:8-24.
4, 5. Olee otú Jehova si gosi na ya nwere obiọma n’otú o si mesoo Abimelek ihe?
4 Ebe ọ bụ na Jehova na-enyocha obi, ọ na-echebara ọbụna ndị na-ekweghị ekwe echiche. Tụlee otú o si mesoo Abimelek bụ́ eze obodo Gira nke dị na Filistia. Abimelek amaghị na Ebreham na Sera bụ di na nwunye gaa kpọrọ Sera ka ọ ghọọ nwunye ya. Ma, tupu Abimelek agaa ya nso, Jehova gwara ya ná nrọ, sị: “Mụ onwe m amarawokwa na ọ bụ n’obi ọcha gị ka i mere ihe a, mụ onwe m nọkwa na-egbochi gị imehie m, ọ bụ ya mere na ekweghị m ka i metụ ya aka. Ma ugbu a, kpọghachi nwunye nwoke ahụ, n’ihi na nwoke ahụ bụ onye Jen. 20:1-7.
amụma, ọ ga-arịọsikwara gị arịrịọ ike. Dịrịkwa ndụ.”—5 N’ezie, Jehova gaara emesi Abimelek na-efe chi ụgha ike. Ma Chineke chọpụtara na nwoke ahụ ebughị ihe ọjọọ n’obi mee ihe ahụ o mere. Jehova ghọtara nnọọ nke a nke ọma ma jiri obiọma gwa eze ahụ ihe ọ ga-eme ka e wee gbaghara ya, ya ‘adịrịkwa ndụ.’ Ọ́ bụghị ụdị Chineke a ka ị ga-achọ ife?
6. Olee ụzọ ndị Jizọs si ṅomie Nna ya?
6 Jizọs ṅomiri Nna ya nke ọma site n’ilekwasị anya n’ebe ndị na-eso ụzọ ya na-eme nke ọma ma dị njikere ịgbaghara ha mgbe ha mejọrọ. (Mak 10:35-45; 14:66-72; Luk 22:31, 32; Jọn 15:15) Àgwà Jizọs kwekọrọ n’ihe a o kwuru na Jọn 3:17: “Chineke zitere ọkpara ya n’ụwa, ọ bụghị ka o kpee ụwa ikpe, kama ka e wee site n’aka ya zọpụta ụwa.” N’ezie, ịhụnanya Jehova na Jizọs nwere n’ebe anyị nọ dị nnọọ ukwuu, ọ dịghịkwa agwụ agwụ. Anyị na-ahụ nke a n’otú o si na-agụ ha agụụ ka anyị nweta ndụ. (Job 14:15) Ụdị ịhụnanya a na-eme ka anyị ghọta ihe mere Jehova ji enyocha anyị, otú o si were anyị, na ihe ọ na-eme banyere ihe ndị ọ hụrụ n’ime anyị.—Gụọ 1 Jọn 4:8, 19.
O Ji Ịhụnanya Na-enyocha Anyị
7. Gịnị mere Jehova ji enyocha anyị?
7 Ị̀ hụlanụ ihe mere na anyị ekwesịghị iwere Jehova dị ka onye uwe ojii nke si n’eluigwe na-ele ma ọ̀ ga-ejide anyị ebe anyị na-eme mmehie! Ọ bụ Setan bụ onye na-ebo anyị ebubo ma na-ekwu na anyị na-efe Chineke naanị n’ihi ihe anyị na-erite n’aka ya. (Mkpu. 12:10) Ọ na-ekwudị na anyị bu ihe ọjọọ n’obi mgbe anyị na-ebughị! (Job 1:9-11; 2:4, 5) Ọbụ abụ ahụ kwuru banyere Chineke, sị: “A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele, Jaa, Jehova, ònye pụrụ iguzo?” (Ọma 130:3) Azịza nke ajụjụ a bụ, E nweghị onye ọ bụ! (Ekli. 7:20) Kama, Jehova ji obi ebere na obiọma na-ele anyị, dị ka nna na-ahụ n’anya nke chọrọ ichebe ụmụ ya ọ hụrụ n’anya ka ihe ọ bụla ghara imerụ ha ahụ́. Ọ na-emekarị ka anyị mata ezughị okè anyị na ebe ndị anyị na-adịghị eme nke ọma ka anyị wee nwee ike izere ihe ndị nwere ike ibutere anyị nsogbu.—Ọma 103:10-14; Mat. 26:41.
8. Olee otú Jehova si ezi ndị ohu ya ihe ma na-adọ ha aka ná ntị?
8 Ntụziaka na ịdọ aka ná ntị ndị anyị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ na nri ime mmụọ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi” na-enye anyị, na-egosicha na Chineke hụrụ anyị n’anya. (Mat. 24:45; Hib. 12:5, 6) Jehova na-ejikwa ọgbakọ Ndị Kraịst na “onyinye n’ụdị mmadụ” e nwere n’ọgbakọ enyere anyị aka. (Efe. 4:8) Jehova na-elekwa anyị iji mara otú anyị si na-eme ihe ndị ọ na-akụziri anyị dị ka nna na-ahụ n’anya, ọ na-achọkwa ụzọ ọ ga-esi nyekwuoro anyị aka. Abụ Ọma 32:8 kwuru, sị: “M ga-eme ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ ị ga-eso. M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.” Ị̀ hụlanụ na ige Jehova ntị mgbe niile dị mkpa! Anyị kwesịrị iweda onwe anyị ala, mara na Jehova bụ Nna na Onye Nkụzi na-ahụ n’anya.—Gụọ Matiu 18:4.
9. Olee àgwà ndị anyị kwesịrị izere, gịnịkwa mere anyị kwesịrị iji zere ha?
9 N’aka nke ọzọ, ya adịtụla mgbe anyị ga-ekwe ka nganga, enweghị okwukwe, ma ọ bụ “ike dị aghụghọ nke mmehie” mee ka obi anyị kpọchie. (Hib. 3:13; Jems 4:6) Mmadụ na-amalitekarị ụdị àgwà a mgbe o bidoro nwewe echiche ma ọ bụ ọchịchọ na-ezighị ezi. O nwedịrị ike iru n’ókè nke ịjụ ndụmọdụ ga-abara ya uru e ji Akwụkwọ Nsọ nye ya. Nke ka njọ bụ na onye ahụ nwere ike ịnọgide n’àgwà ọjọọ ma ọ bụ n’ụzọ ọjọọ ya, nke na ọ ga-eme onwe ya onye iro Chineke—nke bụ́kwanụ ọnọdụ jọgburu onwe ya n’ezie! (Ilu 1:22-31) Tụlee ihe mere Ken bụ́ ọkpara Adam na Iv.
Jehova Na-ahụ Ihe Niile ma Na-eme Ihe Banyere Ha
10. Gịnị mere Jehova anaraghị onyinye Ken, gịnịkwa ka Ken mere?
10 Mgbe Ken na Ebel bịara ịchụrụ Jehova àjà, ebe Jehova lekwasịrị anya abụghị naanị n’onyinye ha, kamakwa n’ihe dị ha n’obi. Ọ bụ nke a mere Chineke ji nabata àjà Ebel, n’ihi na o ji okwukwe chụọ ya, ma ọ naraghị nke Ken, bụ́ nke gosiri n’ụzọ ụfọdụ na Ken enweghị okwukwe. (Jen. 4:4, 5; Hib. 11:4) Kama Ken ga-amụta ihe n’ihe ahụ merenụ ma gbanwee àgwà ya, ọ malitere iwesa nwanne ya iwe dị ọkụ.—Jen. 4:6.
11. Olee otú Ken si gosi na obi ya dị aghụghọ, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị?
11 Jehova chọpụtara na omume Ken na-aga itinye Ken ná nsogbu ma jiri obiọma gwa ya okwu banyere ya. Ọ gwara Ken na ọ bụrụ na o mee ezi ihe, na a ga-enwe ihe a ga-eji bulie ya elu. Ọ dị nnọọ mwute na Ken leghaara ndụmọdụ a Onye kere ya nyere ya anya ma gbuo nwanne ya. Ken gosikwuru na ya nwere obi ọjọọ site n’ụzọ mkparị o si zaghachi Chineke mgbe Ọ jụrụ ya, sị: “Olee ebe Ebel nwanne gị nọ?” Ken ji iwe zaa ya, sị: “Amaghị m. Àbụ m onye nche nwanne m?” (Jen. 4:7-9) Obi dị aghụghọ n’ezie, o nwedịrị ike ime ka mmadụ jụ ndụmọdụ Chineke ji aka ya nye ya! (Jere. 17:9) N’ihi ya, ka anyị mụta ihe site n’ihe a mere Ken ma dị njikere ịjụ echiche ọjọọ na ọchịchọ ọjọọ. (Gụọ Jems 1:14, 15.) Ọ bụrụ na mmadụ ejiri Akwụkwọ Nsọ nye anyị ndụmọdụ, ka anyị nabata ya ma lee ya anya dị ka ụzọ Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya.
Ọ Dịghị Mmehie Jehova Na-adịghị Ahụ
12. Olee otú Jehova si ele ihe ọjọọ anya?
12 Ụfọdụ nwere ike ịdị na-eche na ọ bụrụ na ọ dịghị onye hụrụ ha mgbe ha mere mmehie, ha ga-alagbụrụ ya. (Ọma 19:12) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị mmehie Jehova na-adịghị ahụ. “Ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” (Hib. 4:13) Jehova bụ onyeikpe nke na-enyocha ihe dị anyị n’obi, otú o sikwa ele ime ihe ọjọọ anya na-egosi nnọọ na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ bụ “Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu.” Ma ‘ọ gaghị anwa anwa hapụ inye onye mmehie na-achọghị ichegharị ntaramahụhụ’ ma ọ bụrụ na onye ahụ “elezie anya na-eme mmehie” ma ọ bụ bụrụ ezigbo onye aghụghọ. (Ọpụ. 34:6, 7; Hib. 10:26) Otú Jehova si mesoo Ekan, Ananayas nakwa Safaịra, na-egosi na nke a bụ eziokwu.
13. Olee otú o si bụrụ na echiche na-ezighị ezi nwere ike iso n’ihe mere Ekan ji kpaa àgwà ọjọọ?
13 Ekan nupụrụ isi n’iwu Chineke nyere ma were ihe ụfọdụ ha kwatara n’agha n’obodo Jeriko zoo n’ụlọikwuu ya, ọ ga-abụkwa na ya na ndị ezinụlọ ya niile so mee ihe a. Mgbe a gbara mmehie Ekan n’anwụ, o mere ihe gosiri na ya ghọtara na ihe ya mere dị njọ n’ihi na ọ sịrị: “Mụ onwe m emehiewo Jehova.” (Jọsh. 7:20) Ekan nwere ajọ obi dị ka Ken. Ma ihe bụ́ isi kpatara nke Ekan bụ anyaukwu, bụ́ nke dugara ya n’ịghọ aghụghọ. Ebe ọ bụ na ihe ndị ahụ a kwatara n’agha na Jeriko bụ nke Jehova, ọ pụtara na ọ bụ Chineke ka Ekan zuru ohi, nke a kpataara ya na ezinụlọ ya ọnwụ.—Jọsh. 7:25.
14, 15. Gịnị mere Chineke ji wesa Ananayas na Safaịra iwe, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị?
14 Ananayas na nwunye ya bụ́ Safaịra nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ dị na Jeruselem. Mgbe Pentikọst 33 O.A. gachara, e wepụtara igbe a ga na-atụnye ego a ga-eji na-elekọta ndị ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ si ebe dị anya, bụ́ ndị ka nọ na Jeruselem. Otú e si enweta ego ahụ bụ site n’onyinye afọ ofufo. Ananayas rere otu ubi ya, ma nye ụfọdụ n’ime ego o retere. Ma, ya na nwunye ya kpebiri ime ka à ga-asị na o wetara ihe niile o retere. O doro anya na di na nwunye a chọrọ ka e jiri nke a na-akwanyere ha ùgwù pụrụ iche n’ọgbakọ. Ma ihe a ha mere bụ ịghọ aghụghọ. Jehova kpugheere Pita onyeozi na ha na-egwu wayo, Pita jụkwara Ananayas ihe mere o ji ghọwa aghụghọ. Ozugbo ọ jụchara ya, Ananayas dara nwụọ. O teghị aka Safaịra nwunye ya anwụọkwa.—Ọrụ 5:1-11.
15 Ananayas na Safaịra emeghị mmehie a n’amaghị ama. Ha kpara ụgha ahụ ha ghara akpa iji ghọgbuo ndịozi. Nke ka njọ bụ na ha ‘ghaara mmụọ nsọ na Chineke ụgha.’ Ihe Jehova mere ha gosiri nnọọ na ọ dị njikere ichebe ọgbakọ ahụ ka a ghara inwe ndị ihu abụọ na ya. N’eziokwu, “ọ bụ ihe dị egwu ịdaba n’aka Chineke dị ndụ”!—Hib. 10:31.
Na-eme Ezi Ihe Mgbe Niile
16. (a) Olee otú Setan si agbalị imebi ndị Chineke? (b) Olee ụzọ ndị Ekwensu si eduhie ndị bi n’ógbè gị?
16 Setan na-eme ike ya niile iji hụ na anyị mere ihe ọjọọ nke ga-eme ka Jehova wesa anyị iwe. (Mkpu. 12:12, 17) A na-ahụ nke a n’otú mmekọahụ rụrụ arụ na ime ihe ike si jupụta n’ụwa. Taa, ọ dị mfe ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na kọmputa ma ọ bụ ná ngwá electronics ndị ọzọ. Ya adịtụla mgbe anyị ga-ekwe ka ọnyà Setan mata anyị. Kama nke ahụ, ka anyị mee ka ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, bụ́ onye dere, sị: “M ga-eji ezi uche mee ihe n’ụzọ na-enweghị ntụpọ. . . . M ga-ejegharị n’iguzosi ike n’ezi ihe nke obi m n’ime ụlọ m.”—Ọma 101:2.
17. (a) Gịnị mere Jehova ji emecha gbaa mmehie ndị e mere na nzuzo n’anwụ? (b) Olee ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?
17 Taa, Jehova adịghị agba mmehie dị oké njọ na omume aghụghọ n’anwụ n’ụzọ ọrụ ebube dị ka o mere mgbe ụfọdụ n’oge gara aga. Ma ọ ka na-ahụ ha niile, ọ ga-agbakwa ha niile n’anwụ mgbe ọ chọrọ nakwa n’ụzọ ọ chọrọ isi mee ya. Pọl sịrị: “Mmehie ụfọdụ ndị na-apụta ìhè n’ihu ọha, wee duga ha n’ikpe, ma mmehie nke ndị ọzọ na-apụta ìhè mgbe e mesịrị.” (1 Tim. 5:24) Ọ bụ ịhụnanya bụ isi ihe mere Jehova ji agba ihe ọjọọ n’anwụ. Ọ hụrụ ọgbakọ ya n’anya, ọ chọkwara ka ọ nọgide na-adị ọcha. Ma, ọ na-emere ndị mmehie jiri obi ha niile chegharịa ebere. (Ilu 28:13) N’ihi ya, ka anyị gbalịa jiri obi anyị niile na-ejere Chineke ozi ma jụ ihe niile na-emerụ mmadụ.
Jiri Obi Gị Dum Na-eje Ozi
18. Olee otú Eze Devid chọrọ ka nwa ya nwoke siri na-ele Chineke anya?
18 Eze Devid gwara nwa ya nwoke bụ́ Sọlọmọn, sị: “Mara Chineke nke nna gị, jirikwa obi gị dum na mkpụrụ obi jupụtara n’aṅụrị jeere ya ozi; n’ihi na Jehova na-enyocha obi niile, ọ na-amatakwa ihe niile mmadụ na-eche n’echiche.” (1 Ihe 28:9) Devid chọrọ ka nwa ya nwoke mee ihe karịrị ikwere naanị na e nwere Chineke. Ọ chọrọ ka Sọlọmọn gosi na obi dị ya mma n’otú Jehova si nwee mmasị n’ebe ndị ohu Ya nọ. Obi ọ̀ dị gị ụtọ otú ahụ na Jehova nwere mmasị n’ahụ́ ndị ohu ya?
19, 20. Dị ka Abụ ọma 19:7-11 si kwuo, gịnị nyeere Devid aka ịbịaru Chineke nso, olekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie Devid?
19 Jehova maara na ndị nwere ezi obi ga-abịaru ya nso nakwa na ha ga-ahụkwa ya n’anya ma ha mata àgwà ya ndị magburu onwe ha. N’ihi ya, Jehova chọrọ ka anyị mara ya, ọ chọkwara ka anyị mara àgwà ya ndị na-enweghị atụ. Olee otú anyị ga-esi eme nke a? Ọ bụ site n’ịmụ Okwu ya na inweta ngọzi ya.—Ilu 10:22; Jọn 14:9.
20 Ị̀ na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ma na-amata na ọ bụ ya nyere anyị ya, na-ekpekwa ekpere ka o nyere gị aka ime ihe ndị ị na-agụta? Ị̀ na-ahụ uru dị n’ime ihe Baịbụl kwuru ka e mee? (Gụọ Abụ Ọma 19:7-11.) Ọ bụrụ otú ahụ, okwukwe i nwere na Jehova ga-esikwu ike, ị ga na-ahụkwukwa ya n’anya. Jehova n’onwe ya ga-abịarukwa gị nnọọ nso, gị na ya a na-eje ije ụkwụ na ụkwụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. (Aịza. 42:6; Jems 4:8) N’ezie, Jehova ga-egosi na ya hụrụ gị n’anya site n’ịgọzi gị ma nyere gị aka ịnọ ya nso ka ị na-eje ije n’ụzọ ahụ dị warara nke na-eduba ná ndụ.—Ọma 91:1, 2; Mat. 7:13, 14.
Olee Ihe Ị Ga-aza?
• Gịnị mere Jehova ji enyocha anyị?
• Gịnị mere ụfọdụ ndị ji ghọọ ndị iro Chineke?
• Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị kweere na Jehova na-ahụ anyị?
• Olee otú anyị nwere ike isi nọgide jiri obi anyị niile na-ejere Chineke ozi?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 4]
Olee otú Jehova si ele anyị dị ka nna na-ahụ n’anya si eme?
[Foto dị na peeji nke 5]
Olee ihe ihe mere Ananayas na-akụziri anyị?
[Foto dị na peeji nke 6]
Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide jiri obi anyị niile na-ejere Jehova ozi?