Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ị Ga-enye Iji Dị Ndụ Ebighị Ebi?

Gịnị Ka Ị Ga-enye Iji Dị Ndụ Ebighị Ebi?

Gịnị Ka Ị Ga-enye Iji Dị Ndụ Ebighị Ebi?

“Gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere mkpụrụ obi ya?”—MAT. 16:26.

1. Gịnị mere Jizọs anabataghị mba Pita baara ya?

IHE Pita onyeozi nụrụ tụrụ ya n’anya. Onye Ndú ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jizọs Kraịst, nọ na-ekwu “n’ezoghị ọnụ” na n’oge na-adịghị anya na ya ga-ata ahụhụ ma nwụọ! Pita, bụ́ onye o doro anya na o buuru Jizọs ezi ihe n’obi, baara ya mba, sị: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị; ihe a agaghị eme gị ma ọlị.” Jizọs gbanyeere Pita azụ ma lee ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ anya. Eleghị anya ha onwe ha nwekwara echiche yiri nke Pita. Jizọs gwaziri Pita, sị: “Gaa m n’azụ, Setan! Ị bụụrụ m ihe ịsụ ngọngọ, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.”—Mak 8:32, 33; Mat. 16:21-23.

2. Olee otú Jizọs si kọwaa ihe a chọrọ n’aka onye bụ́ ezigbo onye na-eso ụzọ ya?

2 O nwere ike ịbụ na ihe Jizọs gara n’ihu ikwu nyeere Pita aka ịghọta ihe mere Jizọs ji baara ya mba. Jizọs wee “kpọọ ìgwè mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya” ma gwa ha, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, na-eso m mgbe niile. N’ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta mkpụrụ obi ya ga-atụfu ya; ma onye ọ bụla nke tụfuru mkpụrụ obi ya n’ihi m nakwa n’ihi ozi ọma ahụ ga-azọpụta ya.” (Mak 8:34, 35) Okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” nke Jizọs ji mee ihe n’ebe a pụtara “ndụ.” O doro anya na ọ bụghị naanị na ọ na-aga iji ndụ ya achụ àjà kamakwa ọ na-atụ anya na ndị na-eso ụzọ ya ga-adị njikere ịnwụ n’ihi ozi Chineke. Ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, ha ga-enweta ụgwọ ọrụ bara ụba.—Gụọ Matiu 16:27.

3. (a) Olee ajụjụ ndị Jizọs jụrụ ndị na-ege ya ntị? (b) Olee ihe ọ ga-abụ na ajụjụ nke abụọ Jizọs jụrụ chetaara ndị na-ege ya ntị?

3 N’otu oge ahụ, Jizọs jụrụ ajụjụ abụọ na-akpali mmadụ iche echiche: “Olee uru ọ baara mmadụ irite ụwa dum n’uru ma tụfuo mkpụrụ obi ya?” na, “N’ezie, gịnị ka mmadụ ga-eji —gbanwere mkpụrụ obi ya?” (Mak 8:36, 37) Ajụjụ nke mbụ ahụ agaghị esiri mmadụ ike ọzịza. O nweghị uru ọ ga-abara mmadụ ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa dum n’uru ma tụfuo ndụ ya, nke bụ́ mkpụrụ obi ya. Ihe onwunwe ga-abara mmadụ uru naanị ma ọ bụrụ na onye ahụ dị ndụ. Ajụjụ nke abụọ Jizọs jụrụ, nke bụ́, “N’ezie, gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere mkpụrụ obi ya?” nwere ike ichetara ndị na-ege ya ntị ebubo ahụ Setan boro ụmụ mmadụ n’oge Job. Ọ sịrị: “Ihe ọ bụla mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya.” (Job 2:4) Ihe a Setan kwuru nwere ike ịbụ eziokwu n’ebe ndị na-adịghị efe Jehova ofufe nọ. Ọtụtụ ndị ga-eme ihe ọ bụla, ọbụna ihe na-ezighị ezi, naanị iji dịrị ndụ. Ma Ndị Kraịst dị iche.

4. Gịnị mere ajụjụ ndị ahụ Jizọs jụrụ ji nwee ihe dị mkpa ọ pụtaara Ndị Kraịst?

4 Anyị maara na Jizọs abịaghị n’ụwa naanị iji mee ka anyị nwee ezi ahụ́ ike, akụnụba, na ogologo ndụ n’ụwa a. Ọ bịara ime ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ, anyị jikwa olileanya a kpọrọ oké ihe. (Jọn 3:16) Onye Kraịst nwere ike isi otú a ghọta ajụjụ mbụ ahụ Jizọs jụrụ: “Olee uru ọ ga-abara mmadụ irite ụwa dum n’uru ma tụfuo olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi?” Azịza ya bụ na ọ dịghị uru ọ bụla ọ ga-aba. (1 Jọn 2:15-17) Iji nwee ike ịza ajụjụ nke abụọ ahụ Jizọs jụrụ, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Olee ihe ndị m dị njikere ịchụ n’àjà ugbu a ka obi nwee ike isikwu m ike na m ga-adị ndụ n’ụwa ọhụrụ?’ Ihe anyị ga-aza n’ajụjụ ahụ, bụ́ nke anyị na-esi n’omume anyị egosi, ga-egosi otú obi siruru anyị ike na anyị ga-enweta ihe ahụ anyị na-ele anya ya.—Tụlee Jọn 12:25.

5. Olee ihe anyị ga-eme iji nweta onyinye nke ndụ ebighị ebi?

5 Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na a na-arụta ndụ ebighị n’ọrụ. Ndụ—ọbụna nwa nke mkpụmkpụ a anyị na-adị ugbu a—bụ onyinye. Anyị agaghị azụtali ya ma ọ bụ mee ihe ọ bụla ga-eme ka anyị ruo eruo inweta ya. Naanị ihe ga-eme ka anyị nweta onyinye nke ndụ ebighị ebi bụ “inwe okwukwe n’ebe Kraịst Jizọs nọ” nakwa na Jehova, bụ́ “onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Gal. 2:16; Hib. 11:6) Ma, anyị ga-arụ ọrụ iji gosi na anyị nwere okwukwe ebe ọ bụ na “okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ ihe nwụrụ anwụ.” (Jems 2:26) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị atụgharịtụkwuo uche n’ajụjụ ahụ Jizọs jụrụ, ọ ga-adị mma ma anyị chesie echiche ike banyere ihe anyị dị njikere ịchụ n’àjà n’ụwa ochie a na ihe anyị dị njikere ime n’ozi Jehova iji gosi na okwukwe anyị dị ndụ n’ezie.

“Kraịst Emeghị Ihe Masịrị Onwe Ya”

6. Olee ihe bụ́ isi ná ndụ Jizọs?

6 Kama itinye uche n’ihe nke ụwa nke oge ya, Jizọs lekwasịrị anya n’ihe ndị dị mkpa, o kweghịkwa ka a nwata ya ịchụwa ihe onwunwe. Ọ chụrụ ọtụtụ ihe n’àjà, ọ nọgidekwara na-erubere Chineke isi. Kama ime ihe masịrị ya onwe ya, o kwuru, sị: “M na-eme ihe dị [Chineke] mma mgbe niile.” (Jọn 8:29) Olee ókè Jizọs dịruru njikere ime ihe na-amasị Chineke?

7, 8. (a) Olee ihe ndị Jizọs chụrụ n’àjà, oleekwa otú e si kwụghachi ya ụgwọ? (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

7 N’otu oge, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Mat. 20:28) Mgbe ahụ Jizọs gwara ụmụazụ ya na n’oge na-adịghị anya ya ‘ga-enye mkpụrụ obi ya,’ Pita gwara ya ka o meere onwe ya ebere. Ma Jizọs ekweghị ka nke a kụda ya mmụọ. O ji obi ọcha ya nye mkpụrụ obi ya, ya bụ, ndụ ya zuru okè, maka ụmụ mmadụ. N’ihi otú a Jizọs si jiri obi ya meere ndị ọzọ ihe, o doro anya na ọ ga-enwetarịrị ụgwọ ya n’ọdịnihu. A kpọlitere ya n’ọnwụ ma ‘bulie ya elu ka ọ nọrọ n’aka nri Chineke.’ (Ọrụ 2:32, 33) O si otú a ghọọrọ anyị ezigbo ihe nlereanya.

8 Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst nọ na Rom ọdụ ka ha ghara “ịdị na-eme ihe na-amasị” ha onwe ha ma chetara ha na “ọbụna Kraịst emeghị ihe masịrị onwe ya.” (Rom 15:1-3) Ya mere, olee ókè anyị ga-emeru ihe a Pọl onyeozi dụrụ n’ọdụ ma gbalịsie ike iṅomi Kraịst?

Jehova Chọrọ Ka Anyị Nye Ihe Ndị Kasị Mma Anyị Nwere

9. Gịnị ka nrara Onye Kraịst raara onwe ya nye Chineke pụtara n’ezie?

9 N’Izrel oge ochie, Iwu Mozis kwuru na a ga-atọhapụ ndị Hibru bụ́ ohu n’afọ nke asaa ha gbawara ohu ma ọ bụ n’afọ Jubili. Ma, e nwekwara ihe ọzọ ndị ohu nwere ike ime ma ha chọọ. Ọ bụrụ na ohu ahụ hụrụ nna ya ukwu n’anya, o nwere ike ịhọrọ ịnọgide bụrụ ohu n’ụlọ nna ya ukwu ná ndụ ya niile. (Gụọ Diuterọnọmi 15:12, 16, 17.) Anyị na-ahọrọ ime ihe yiri nke a mgbe anyị raara onwe anyị nye Chineke. Anyị ji obi anyị niile kweta ime uche Chineke, ọ bụghị ihe ndị anyị chọrọ. Mgbe anyị na-eme nke a, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu, gosikwa na anyị chọrọ ijere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi.

10. Olee otú o si bụrụ na ọ bụ Chineke nwe anyị, oleekwa otú ịmara nke a kwesịrị isi metụta echiche na omume anyị?

10 Ọ bụrụ na gị na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl ugbu a, gị esoro na-ekwusa ozi ọma, ma na-aga ọmụmụ ihe, jisie ike. Anyị nwere olileanya na n’oge na-adịghị anya, ị ga-achọ ịrara onwe gị nye Jehova ma jụọ ụdị ajụjụ ahụ onye ọnaozi Etiopia jụrụ Filip: “Gịnị na-egbochi ime m baptizim?” (Ọrụ 8:35, 36) Adịm ná mma gị na Chineke ga-adịzi ka nke Ndị Kraịst ahụ Pọl degaara akwụkwọ, sị: “Ọ bụghịkwa unu nwe onwe unu, n’ihi na e ji ihe dị oké ọnụ ahịa zụta unu.” (1 Kọr. 6:19, 20) Ma ànyị nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ bụ ibi n’ụwa, ọ bụrụ na anyị ararala onwe anyị nye Jehova, ọ bụzi ya nwe anyị. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị kwụsị ịdị na-achọ ime ihe ga-amasị naanị onwe anyị, ‘kwụsịkwa ịbụ ohu mmadụ’! (1 Kọr. 7:23) Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù na-enweghị atụ ịbụ ohu Jehova na-eguzosi ike n’akụkụ ya, onye Jehova nwere ike iji mee ihe masịrị ya!

11. Olee ụdị àjà a gbara Ndị Kraịst ume ka ha na-achụ, gịnịkwa ka nke a pụtara n’ezie, dị ka e gosiri n’àjà ndị Iwu Mozis kwuru ka a na-achụ?

11 Pọl dụrụ ndị kwere ekwe ibe ya ọdụ, sị: “Unu nyefee Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma, ya bụ, ozi dị nsọ site n’ike iche echiche unu.” (Rom 12:1) O yiri ka okwu ndị a ò chetaara ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst àjà ndị ha na-achụbu iji fee Chineke ofufe, tupu ha aghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ha maara na n’Iwu Mozis, ọ bụ anụmanụ ndị kasị mma ka a ga-eji achụrụ Jehova àjà. Jehova agaghị anara nke ọ bụla na-abụghị nke kasị mma. (Mal. 1:8, 13) Otú ahụ ka o kwesịkwara ịdị mgbe anyị na-enye ahụ́ anyị dị ka “àjà dị ndụ.” Anyị na-enye Jehova ihe kacha mma anyị nwere, ọ bụghị ihe fọrọ mgbe anyị mezuchara ihe bụ́ ọchịchọ anyị. Mgbe anyị raara onwe anyị nye Chineke, anyị nyefere ya “mkpụrụ obi” anyị kpamkpam, ya bụ ndụ anyị—gụnyere ume, ihe onwunwe, na ikike anyị. (Kọl. 3:23) Olee otú anyị ga-esi eme nke a?

Jiri Oge Gị Mee Ihe Kwesịrị Ekwesị

12, 13. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi nye Jehova ihe kacha mma anyị nwere?

12 Otu ụzọ anyị si enye Jehova ihe kacha mma anyị nwere bụ site n’iji oge anyị eme ihe kwesịrị ekwesị. (Gụọ Ndị Efesọs 5:15, 16.) Nke a chọrọ na anyị ga-abụ ndị nwere njide onwe onye. Ọnwụnwa ndị juru n’ụwa na ezughị okè anyị ketara eketa na-akpali anyị iji oge anyị na-achụ ihe ndị e ji ekpori ndụ ma ọ bụ ihe ndị ga-abara naanị anyị uru. N’ezie, “e nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla,” nke a gụnyere oge maka ntụrụndụ na oge anyị ga-eji arụ ọrụ ego ndị anyị ga-eji akpata ihe anyị ga-eji na-ebu ibu ndị dịịrị anyị dị ka Ndị Kraịst. (Ekli. 3:1) Ma, Onye Kraịst raara onwe ya nye Jehova kwesịrị ịdị na-ahazi oge ya nke ọma ma jiri ya na-eme ihe otú kwesịrị ekwesị.

13 Mgbe Pọl gara Atens, ọ hụrụ na “ndị Atens, tinyere ndị mba ọzọ niile bịara ịnọtụ nwa oge n’ebe ahụ adịghị eji oge ezumike ha eme ihe ọzọ ma e wezụga ịkọ ma ọ bụ ige ntị n’ihe ọhụrụ.” (Ọrụ 17:21) Ọtụtụ ndị taa na-ejikwa oge ha eme ihe ndị na-abaghị uru. Ụfọdụ ihe ndị na-adọpụ uche taa gụnyere ikiri televishọn, igwu egwuregwu vidio, na ịchọgharị ihe n’Ịntanet. A na-enwekwukwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-achọ iwekọrọ oge anyị. Ọ bụrụ na anyị ekwere ka ihe ndị a na-ewekọrọ oge anyị, anyị nwere ike ileghara mkpa ime mmụọ anyị anya. Anyị nwedịrị ike ịmalite ichewe na anyị enweghị ohere maka “ihe ndị ka mkpa”—ihe ndị metụtara ozi anyị na-ejere Jehova.—Fil. 1:9, 10.

14. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị nnọọ ichebara echiche?

14 Ya mere, dị ka ohu Jehova raara onwe ya nye, jụọ onwe gị sị, ‘Ịgụ Baịbụl, ịtụgharị uche, na ikpe ekpere, hà so n’ihe ndị m haziri ịdị na-eme kwa ụbọchị?’ (Ọma 77:12; 119:97; 1 Tesa. 5:17) ‘M̀ na-ewepụta oge iji kwadebe ọmụmụ ihe? M̀ na-agba ndị ọzọ ume site n’ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe?’ (Ọma 122:1; Hib. 2:12) Okwu Chineke kwuru na Pọl na Banabas “nọtụrụ ogologo oge na-ekwu okwu n’atụghị egwu site n’ikike Jehova.” (Ọrụ 14:3) Ì nwere ike ịhazigharị ihe ndị ị na-eme iji nwee ike itinyekwu oge, ọbụna wepụtakwuo “ogologo oge,” iji na-ekwusa ozi ọma, ikekwe malite ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ?—Gụọ Ndị Hibru 13:15.

15. Olee otú ndị okenye si eji oge ha eme ihe otú kwesịrị ekwesị?

15 Mgbe Pọl onyeozi na Banabas letara ọgbakọ dị n’Antiọk, “ha na ndị na-eso ụzọ Jizọs nọrọ ruo ogologo oge” ka o wee nwee ike ịgba ha ume. (Ọrụ 14:28) Ndị okenye hụrụ ụmụnna ha n’anya taa na-ejikwa ihe ka ukwuu n’oge ha ewusi ndị ọzọ ike. E wezụga ozi ọma ha na-eso ekwusa, ndị okenye na-agbalịsikwa ike ịzụ ìgwè atụrụ Jehova, na-achọ ndị nke furu efu, na-enyere ndị nke ahụ́ na-adịghị aka, ma na-arụ ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ e nwere n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke e merela baptizim, ọnọdụ gị ọ̀ ga-ekwe gị ịgbalị iru eru ibukwu ibu ọrụ ndị ọzọ e nwere n’ọgbakọ?

16. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi “na-eme ihe ọma n’ebe . . . ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ”?

16 Ọtụtụ ndị enwetala ọṅụ n’inyere ndị ọdachi ndị na-emere onwe ha na ndị nke ụmụ mmadụ kpatara dakwasịrị aka. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị gaferela afọ iri isii nke na-ejekwa ozi na Betel na-aga ebe dị ezigbo anya iji nyere ndị ọdachi dakwasịrị aka. Gịnị mere o ji eji oge ezumike ya eme ihe dị otú a? O kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na enweghị m aka ọrụ pụrụ iche, obi dị m ụtọ inye aka n’ebe ọ bụla ọ dị mkpa. Ịhụ otú ụmụnna m ndị ihe niile ha nwere lara n’iyi si nọgidesie ike n’okwukwe agbaala m ume nke ukwuu.” Ọzọkwa, ọtụtụ puku mmadụ n’ụwa niile na-enye aka ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ. Mgbe anyị na-eso eme ihe ndị a, anyị na-egosi na anyị ji obi ọcha “na-eme ihe ọma n’ebe . . . ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.”—Gal. 6:10.

“M Nọnyeere Unu Ụbọchị Niile”

17. Olee ihe gị onwe gị ga-eji gbanwere ịdị ndụ ebighị ebi?

17 A na-aga ibibi ụmụ mmadụ ndị kewapụrụ onwe ha n’ebe Chineke nọ. Anyị amaghị kpọmkwem mgbe nke ahụ ga-eme. Ma anyị maara na “oge fọdụrụ dị ntakịrị” nakwa na “ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe.” (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:29-31.) Nke a mere anyị ji kwesị ichebakwuru ajụjụ ahụ Jizọs jụrụ echiche: “Gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere mkpụrụ obi ya?” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị ga-eme ihe ọ bụla Jehova sịrị anyị mee iji nweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (1 Tim. 6:19) N’eziokwu, ọ dị oké mkpa ka anyị ṅaa ntị na ndụmọdụ Jizọs nyere ka anyị ‘na-eso ya mgbe niile’ nakwa ka anyị ‘buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ.’—Mat. 6:31-33; 24:13.

18. Olee ihe obi siri anyị ike na ọ ga-eme, gịnịkwa mere obi ji sie anyị ike otú a?

18 N’eziokwu, iso Jizọs adịghị mfe mgbe niile, dịkwa ka Jizọs dọrọ aka ná ntị, ụfọdụ ndị anwụọla n’ihi ya. Ma, dị ka Jizọs mere, anyị na-ajụ ọnwụnwa nke ‘imere onwe anyị ebere.’ Obi siri anyị ike na ọ ga-emere anyị ihe ọ gwara ụmụazụ ya e tere mmanụ na narị afọ mbụ iji mesie ha obi ike, sị: “M nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:20) Ya mere, ka anyị jiri oge anyị na ikike anyị na-eje ozi dị nsọ ruo n’ókè o kwere anyị mee. Ka anyị na-eme nke a, anyị na-egosi na obi siri anyị ike na Jehova ga-echebe anyị gafee oké mkpagbu ahụ ma ọ bụkwanụ kpọlite anyị n’ọnwụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. (Hib. 6:10) Anyị si otú a na-egosi na anyị ji onyinye nke ndụ kpọrọ ihe nke ukwuu.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee otú Jizọs si gosi na ya dị nnọọ njikere ijere Chineke na ụmụ mmadụ ozi?

• Gịnị mere mmadụ ji kwesị ịjụ onwe ya, oleekwa otú e si eme nke a?

• N’Izrel oge ochie, olee naanị ụdị àjà Jehova na-anara, oleekwa ihe nke ahụ na-akụziri anyị taa?

• Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi jiri oge anyị na-eme ihe ndị kwesịrị ekwesị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Jizọs mere ihe masịrị Chineke mgbe niile

[Foto dị na peeji nke 28]

Ndị Izrel nwere ekele ji ihe ndị kacha mma ha nwere kwadoo ofufe Chineke

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Anyị na-eme ihe na-amasị Chineke site n’iji oge anyị eme ihe ndị kwesịrị ekwesị