Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Taịtọs, Faịlimọn, na Ndị Hibru

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Taịtọs, Faịlimọn, na Ndị Hibru

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Taịtọs, Faịlimọn, na Ndị Hibru

OBERE oge ka a tọhapụchara Pọl onyeozi na mkpọrọ mbụ a tụrụ ya na Rom n’afọ 61 O.A., ọ gara agwaetiti Krit. Mgbe ọ chọpụtara na ọgbakọ ndị nọ n’ebe ahụ chọrọ agbamume, ọ hapụrụ Taịtọs ebe ahụ ka o nwee ike ịgba ha ume. O yiri ka ọ bụ na Masedonia ka Pọl sizi detara Taịtọs akwụkwọ ozi ga-enyere ya aka ịrụ ọrụ o nyere ya, nke ga-egosikwa na ọ bụ Pọl onyeozi dunyere ya ọrụ ahụ.

Tupu oge a, nke bụ́ obere oge tupu ọ pụta n’ụlọ mkpọrọ n’afọ 61 O.A., Pọl degaara Faịlimọn, bụ́ otu nwanna nwoke bi na Kọlọsi, akwụkwọ ozi. Akwụkwọ ozi a bụ arịrịọ ọ rịọrọ nwanna nwoke a bụ́ enyi ya.

N’ihe dị ka n’afọ 61 O.A., Pọl degakwaara ndị Hibru kwere ekwe bi na Judia akwụkwọ ozi. O ji akwụkwọ ozi a gosi otú Iso Ụzọ Kraịst si kara okpukpe ndị Juu. Akwụkwọ ozi atọ a nwechara ndụmọdụ ndị ga-abara anyị uru.—Hib. 4:12.

NỌGIDESIE IKE N’OKWUKWE

(Taị. 1:1–3:15)

Ka Pọl nyechara Taịtọs ntụziaka otú ọ ga-esi ‘họpụta ndị okenye n’obodo dị iche iche,’ ọ dụrụ ya ọdụ ka ọ ‘na-adọsi ndị na-enupụ isi aka ná ntị ike ka ha wee nọgidesie ike n’okwukwe.’ Ọ dụrụ ndị niile nọ n’ọgbakọ ndị dị na Krit ọdụ ka ha “jụ asọpụrụghị Chineke . . . ka [ha] na-ebikwa ndụ n’uche zuru okè.”—Taị. 1:5, 10-13; 2:12.

Pọl nyekwuru ụmụnna nọ na Krit ndụmọdụ ndị ga-enyere ha aka ịnọgidesi ike n’okwukwe. Ọ gwara Taịtọs ka o “zere ajụjụ nzuzu . . . na ịlụ ọgụ banyere Iwu ahụ.”—Taị. 3:9.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:15—Olee otú o si bụrụ na “ihe niile dị ọcha” n’ebe “ndị dị ọcha nọ,” ma ghara ịdị ọcha “n’ebe ndị rụrụ arụ na ndị na-enweghị okwukwe nọ”? Iji ghọta ihe nke a pụtara, ọ ga-adị mma ma anyị buru ụzọ ghọta ihe bụ́ “ihe niile” Pọl na-ekwu okwu ya. Ihe ọ na-ekwu abụghị ihe ndị a katọrọ n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl, kama ọ bụ ihe ndị Akwụkwọ Nsọ nyere onye ọ bụla kwere ekwe ohere iji aka ya kpebie nke ọ ga-ahọrọ ime. Onye echiche ya kwekọrọ n’iwu ndị Chineke nyere na-ele ihe ndị a anya ka ihe dị ọcha. Ma ọ bụghị otú ahụ ka onye echiche ya gbagọrọ agbagọ na onye akọnuche ya rụrụ arụ si ele ha anya. *

3:5—Olee otú e si ‘zọpụta Ndị Kraịst e tere mmanụ site n’ịsa ahụ́’ jirikwa ‘mmụọ nsọ mee ka ha dị ọhụrụ’? A ‘zọpụtara ha site n’ịsa ahụ́’ n’ụdị na Chineke ji ọbara Jizọs, nke bụ́ àjà mgbapụta ọ chụrụ, saa ha ahụ́, ma ọ bụ mee ka ha dị ọcha. E jikwa ‘mmụọ nsọ mee ka ha dị ọhụrụ’ n’ihi na ha aghọọla “ihe e kere ọhụrụ” dị ka ụmụ ndị ikom Chineke e ji mmụọ nsọ mụta.—2 Kọr. 5:17.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:10-13; 2:15. Ọnụ kwesịrị isi ndị okenye ọgbakọ ike mgbe ha na-edozi ihe na-adịghị mma na-eme n’ọgbakọ.

2:3-5. Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, taa, ụmụnna nwaanyị ndị tozuru okè kwesịrị ịbụ “ndị dị nsọ n’omume ha, ghara ịbụ ndị nkwutọ, ka ha bụrụ ndị na-adịghị aṅụ oké mmanya, ndị na-akụzi ihe dị mma.” Ọ bụrụ na ha a na-eme ihe ndị a, ha ga-enwe ike ịkụziri “ndị inyom na-akatabeghị ahụ́” nọ n’ọgbakọ ha ihe mgbe naanị ha na ha nọ.

3:8, 14. Itinye “uche n’ịrụ ezi ọrụ” dị ‘mma bakwaa uru,’ n’ihi na ọ na-enyere anyị aka ịrụpụta ihe ndị dị mma n’ozi Chineke, meekwa ka anyị nọpụ iche n’ụwa ọjọọ a.

JIRI “ỊHỤNANYA” NA-ENYE AGBAMUME

(Faị. 1-25)

A jara Faịlimọn mma n’ihi na ọ bụ ezi ihe nlereanya nke onye nwere “ịhụnanya na okwukwe.” Otú o si na-enye Ndị Kraịst ibe ya ume ọhụrụ nyere Pọl “ọṅụ na nkasi obi dị ukwuu.”—Faị. 4, 5, 7.

Pọl setịpụụrụ ndị nlekọta niile ihe nlereanya site n’otú o si leba anya n’okwu banyere Onesịmọs, bụ́ nke na-agbasachaghị ya. Ọ gaghị nyewe Faịlimọn iwu ihe ọ ga-eme, kama o ji “ịhụnanya” gbaa ya ume. Ọ gwara Faịlimọn, sị: “Ebe m nwere ntụkwasị obi na ị ga-ekwere, ana m edetara gị akwụkwọ, ebe m maara na ị ga-eme ọbụna karịa ihe m na-ekwu.”—Faị. 8, 9, 21.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

10, 11, 18—Olee otú Onesịmọs ‘na-abaghịrị Faịlimọn uru n’oge gara aga’ sizi ‘baa uru’? Onesịmọs bụ ohu si n’aka nna ya ukwu bụ́ Faịlimọn, onye bi na Kọlọsi, gbapụ gbaga Rom. Eleghị anya, Onesịmọs zuuru ego nna ya ukwu iji nweta ego o ji mee ogologo njem ahụ dị otu puku na narị kilomita anọ. N’ezie, ọ baghịrị Faịlimọn uru. Ma mgbe Onesịmọs ruru Rom, Pọl nyeere ya aka ịghọ Onye Kraịst. Ugbu a ọ ghọrọ Onye Kraịst, ohu a ‘na-abaghịrị onyenwe ya uru’ bịaziri ‘baa uru.’

15, 16—Gịnị mere na Pọl agwaghị Faịlimọn ka ọ hapụ Onesịmọs ka o nwere onwe ya? Pọl chọrọ ịnọgide n’ọrụ ya bụ́ ‘ikwusa alaeze Chineke, na-ezikwa ihe banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.’ N’ihi ya, o kpebiri na ya agaghị etinye ọnụ n’ihe ọ bụla na-agbasaghị ikwusa ozi ọma, dị ka nke a metụtara ịgba ohu.—Ọrụ 28:31.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

2. Faịlimọn kwere ka a nọrọ n’ụlọ ya na-enwe ọmụmụ ihe. Ọ bụ ihe ùgwù ma a nọrọ n’ụlọ anyị na-enwe nzukọ ozi ubi.—Rom 16:5; Kọl. 4:15.

4-7. Anyị kwesịrị ibute ụzọ n’ịja ndị kwere ekwe ibe anyị ndị na-egosi na ha nwere okwukwe na ịhụnanya mma.

15, 16. Anyị ekwesịghị ikwe ka nsogbu ndị anyị na-enwe ná ndụ mee ka anyị chegbuwe onwe anyị. Ihe nwere ike ịgbanwe ma ka mma dị ka o mere na nke Onesịmọs.

21. Pọl tụrụ anya na Faịlimọn ga-agbaghara Onesịmọs. A na-atụkwa anya na anyị onwe anyị ga na-agbaghara nwanna ọ bụla mehiere anyị.—Mat. 6:14.

“JISIE IKE RUO NTOZU OKÈ”

(Hib. 1:1–13:25)

Iji gosi na inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs karịrị ọrụ nke Iwu, Pọl kọwara otú Onye Malitere Iso Ụzọ Kraịst si dị nnọọ ukwuu, kọwaa otú o si bụrụ onye nchụàjà, kwuo banyere àjà o ji ndụ ya chụọ, nakwa banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. (Hib. 3:1-3; 7:1-3, 22; 8:6; 9:11-14, 25, 26) Ọ ga-abụrịrị na ihe ndị a Pọl kọwara nyeere ndị Hibru ahụ ghọrọ Ndị Kraịst aka idi mkpagbu mgbe ndị Juu mechara kpagbuwe ha. Pọl gbara ndị Hibru bụ́ ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha “jisie ike ruo ntozu okè.”—Hib. 6:1.

Olee uru inwe okwukwe na-abara Onye Kraịst? Pọl dere, sị: “Ọ bụrụkwa na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị [Chineke] ezi mma.” Ọ gbara ndị Hibru ume, sị: “Ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ ahụ e debere n’ihu anyị,” na-eji okwukwe na-eme nke a.—Hib. 11:6; 12:1.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:14, 15—Na Setan “nwere ikike ịkpata ọnwụ” ọ̀ pụtara na o nwere ike ime ka onye ọ bụla ọ chọrọ nwụchuo ọnwụ? Mba, ọ bụghị ihe ọ pụtara. Ma, malite mgbe Setan kpatara mmebi iwu n’Iden, ụgha ndị ọ ghara akpatala ọnwụ n’ihi na Adam mehiere wee si otú a bufeere ụmụ mmadụ mmehie na ọnwụ. (Rom 5:12) E wezụga nke ahụ, ndị Setan ji arụ ọrụ n’ụwa akpagbuola ọtụtụ ndị ohu Chineke ruo n’ókè nke igbu ha, dịkwa nnọọ ka ha gburu Jizọs. Ma nke ahụ apụtaghị na Setan nwere nnọọ ikike igbu onye ọ bụla ọ chọrọ. Ọ bụrụ na o nwere ikike dị otú ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ gaara ekpochapụla ndị niile na-efe Jehova. Jehova na-echebe ndị ya niile dị ka otu ìgwè, ọ naghịkwa ekwe ka Setan gbuchapụ ha. Ọ bụrụgodị na Chineke ekwe ka ụfọdụ n’ime anyị nwụọ n’ihi mkpagbu Setan, obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-emezi nsogbu niile Setan kpataara anyị.

4:9-11—Olee otú anyị si ‘abanye n’izu ike nke Chineke’? Ná ngwụsị nke ụbọchị isii nke okike, Chineke zuru ike n’ọrụ ya, obi sikwara ya ike na nzube ya maka ụwa na ụmụ mmadụ ga-emezu. (Jen. 1:28; 2:2, 3) Anyị ‘na-abanye n’izu ike ahụ’ site n’izere ịdị na-achọ ihe anyị ga-eji zọrọ isi anyị mgbe anyị mere ihe ọjọọ nakwa site n’ịnabata ndokwa Chineke mere iji zọpụta anyị. Mgbe anyị gosiri okwukwe na Jehova ma rube isi n’ihe ndị Ọkpara ya nyere n’iwu kama ime ihe ndị na-amasị naanị onwe anyị, anyị na-enweta ngọzi nke na-eme ka anyị na-ezu ike ma na-enwe ume ọhụrụ kwa ụbọchị.—Mat. 11:28-30.

9:16—Ònye bụ “onye e ji gbaa ndụ” n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? Jehova bụ Onye malitere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ebe Jizọs bụ “onye e ji gbaa ndụ” ahụ. Jizọs bụ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ahụ, ọnwụ ya bụkwa àjà a chọrọ iji mee ka ọgbụgba ndụ ahụ nwee isi.—Luk 22:20; Hib. 9:15.

11:10, 13-16—Olee “obodo” Ebreham nọ na-echere? Nke a abụghị obodo nkịtị kama ọ bụ obodo ihe atụ. Ebreham nọ na-echere “Jeruselem nke eluigwe,” bụ́ nke ndị mejupụtara ya bụ Jizọs Kraịst na ndị ha na ya ga-eso achị, ndị dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. A kpọrọ ndị a ha na Kraịst ga-eso chịa “obodo nsọ ahụ, bụ́ Jeruselem Ọhụrụ” mgbe ha nọ n’eluigwe. (Hib. 12:22; Mkpu. 14:1; 21:2) Ebreham nọ na-atụ anya ibi ndụ mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa.

12:2—Gịnị bụ “ọṅụ e debere n’ihu [Jizọs]” bụ́ nke ‘o ji maka ya die osisi ịta ahụhụ’? Ọ bụ ọṅụ nke ịhụ ihe ozi ya ga-arụpụta—nke gụnyere ido aha Jehova nsọ, igosi na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị, na iji ndụ ya gbapụta ụmụ mmadụ n’ọnwụ. Jizọs lekwasịkwara anya n’ụgwọ ọrụ ọ ga-enweta nke bụ́ ịchị achị dị ka Eze na ije ozi dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà, bụ́ nke ga-abara ụmụ mmadụ uru.

13:20—Gịnị mere e ji kwuo na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ bụ ọgbụgba ndụ “ebighị ebi”? E nwere ihe atọ mere e ji kwuo nke a: (1) Ọ dịghị ọgbụgba ndụ ọzọ ga-anọchi ya, (2) ihe ndị ọ rụpụtara ga-adịru ebighị ebi, nakwa (3) “atụrụ ọzọ” ahụ ga-anọgide na-erite uru n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ma Amagedọn gachaa.—Jọn 10:16.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

5:14. Anyị kwesịrị ịdị na-amụchi Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl anya, ma na-eme ihe ndị anyị mụtara na ya. E nweghị ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi ‘zụọ ikike nghọta anyị iji na-amata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.’—1 Kọr. 2:10.

6:17-19. Ịhụ na olileanya anyị gbadosiri ụkwụ ike ná nkwa Chineke kwere na n’iyi ọ ṅụrụ ga-enyere anyị aka ịghara ịhapụ ije ije n’ụzọ nke eziokwu.

12:3, 4. Kama ‘ike ịgwụ anyị, anyị ewee daa mbà ná mkpụrụ obi anyị’ n’ihi ụmụ obere ule ma ọ bụ mmegide ndị nwere ike ịbịara anyị, anyị kwesịrị ijisi ike ruo ntozu okè ma gbalịkwuo ịdị na-edi ihe isi ike. Anyị kwesịrị ịdị njikere ịlụ ọgụ ‘ruo n’ọbara,’ ya bụ, ruo ọnwụ.—Hib. 10:36-39.

12:13-15. Anyị ekwesịghị ikwe ka “mgbọrọgwụ ọ bụla nke na-egbu mmadụ,” ma ọ bụ onye ọ bụla nke nọ n’ọgbakọ nke na-akatọ otú ihe si na-aga, gbochie anyị ‘imere ụkwụ anyị ụzọ kwụ ọtọ.’

12:26-28. A ga-eme ka “ihe ndị e meworo eme,” bụ́ ndị ọ na-abụghị Chineke mere ha—nke bụ́ usoro ihe niile dị ugbu a, ọbụnadị “eluigwe” ọjọọ—maa jijiji ma pụọ n’anya. Mgbe nke ahụ mere, ọ bụ naanị “ihe ndị a na-adịghị eme ka ha maa jijiji,” nke bụ́ Alaeze ahụ na ndị na-akwado ya, ga-adịgide. Lee ka o si dị nnọọ mkpa na anyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa Alaeze ahụ ma na-ebi ndụ dị ka Chineke si chọọ!

13:7, 17. Icheta ndụmọdụ a e nyere anyị ka anyị na-erubere ndị nlekọta nọ n’ọgbakọ anyị isi ma na-edo onwe anyị n’okpuru ha ga-enyere anyị aka ịdị na-akwado mkpebi ndị ha na-eme.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]