Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Jehova Bụ Ike M”

“Jehova Bụ Ike M”

“Jehova Bụ Ike M”

Dị ka Joan Coville sị kọọ

A mụrụ m na July 1925 n’obodo Huddersfield dị n’England. Abụ m naanị otu mkpụrụ nwa. Ana m arịakarịkwa ọrịa. Papa m na-agwakarị m sị, “Mgbe ọ bụla ikuku kusara gị, gị arịawa.” O yikwara ka nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu!

MGBE m bụ nwata, ndị ụkọchukwu na-ekpesi ekpere ike ka udo dị, ma mgbe agha ụwa nke abụọ dara, ha kpewara ekpere maka mmeri. Nke a gbagwojuru m anya ma mee ka ajụjụ ụfọdụ bata m n’obi. Ọ bụ ihe dị ka n’oge a ka Annie Ratcliffe, bụ́ naanị Onyeàmà Jehova bi n’ógbè anyị, bịara n’ụlọ anyị.

Otú M Si Mụta Eziokwu

Annie nyere anyị akwụkwọ bụ́ Salvation ma gwa mama m ka ọ bịa ọmụmụ Baịbụl a na-enwe n’ụlọ ya. * Mama m kpọọrọ m mgbe ọ na-aga. M ka na-echeta ihe a mụrụ n’ụbọchị ahụ. Ọ bụ banyere ihe mgbapụta ahụ, o jukwara m anya na ihe e kwuru ụbọchị ahụ tọrọ m ụtọ. Ihe ndị m nụrụ n’ụbọchị ahụ zara ọtụtụ n’ime ajụjụ ndị m nwere. N’izu na-esonụ, anyị gakwara ọzọ. Ihe a kọwara bụ amụma Jizọs banyere ihe ịrịba ama nke oge ikpeazụ. Mgbe mụ na mama m lechara ihe ndị na-eme n’ụwa, anyị chọpụtara ozugbo na ihe a bụ eziokwu ahụ. N’ụbọchị ahụ ka a kpọkwara anyị òkù ka anyị bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Mgbe m gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ahụrụ m ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ ndị ọsụ ụzọ, otu onye n’ime ha bụ Joyce Barber (onye na-azazi Ellis), ya na di ya bụ́ Peter ka na-eje ozi na Betel dị na London. N’oge ahụ, echere m na ọrụ ọsụ ụzọ bụ ihe onye ọ bụla na-arụ. N’ihi ya, amalitere m ikwusa ozi ọma ozugbo, na-etinye awa iri isii n’ọnwa ọ bụla, n’agbanyeghị na m ka na-aga akwụkwọ.

Ka ọnwa ise gachara, na February 11, 1940, e mere mụ na mama m baptizim n’otu mgbakọ sekit e nwere n’oge ahụ n’obodo Bradford. Ọ dịghị mgbe papa m megidere anyị n’ihi okpukpe ọhụrụ a, ma ọ dịghịkwanụ mgbe ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova. Ọ bụ ihe dị ka n’oge ahụ m mere baptizim ka a malitere ịgba àmà okporo ámá. Eso m mee nke a, ebu m akpa m ji tinye magazin na kaadị e ji eme mkpọsa. N’otu ụbọchị Saturday, a gwara m nọrọ n’otu okporo ụzọ na-ekwo nnọọ ekwo, nke dị n’ebe a na-azụ ahịa. N’oge ahụ, m ka na-atụ ụjọ mmadụ, dịkwa nnọọ ka ihe na-adị, o yiri ka ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka ụmụ akwụkwọ ibe m niile họọrọ isi n’ụzọ ahụ gafee.

N’afọ 1940, ọ bịara dị mkpa na a ga-ekewa kọmpịnị anyị (bụ́ ihe a na-akpọ ọgbakọ mgbe ahụ). Ka e kewachara ya, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ndị ọgbọ m niile nọ na kọmpịnị nke ọzọ. Agara m kpesara ohu kọmpịnị (nke a na-akpọzi onyeisi oche ndị nlekọta). Ọ gwara m, sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ndị na-eto eto ibe gị, gaa ozi ọma chọta ha.” Ọ bụkwanụ ihe ahụ o kwuru ka m mere! Ọ dịghị anya mụ ezute Elsie Noble. Ọ natara eziokwu ahụ ma bụrụ ezigbo enyi m ruo taa.

Ịbanye Ọrụ Ọsụ Ụzọ na Ngọzi Ndị So Ya

Mgbe m gụchara akwụkwọ, arụụrụ m otu onye na-ahazi ego ọrụ. Ma, ka m na-ahụ ọṅụ ndị na-eje ozi oge niile na-enwe, abịara m nwekwuo ọchịchọ ịghọ onye ozi oge niile. Na May 1945, enwere m ọṅụ nke ịghọ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ụbọchị mbụ m bidoro ọrụ ọsụ ụzọ, ezigbo mmiri zoro ụbọchị ahụ niile. Ma enwere m obi ụtọ na m pụtara ozi ọma n’ụbọchị ahụ nke na mmiri ahụ na-ezonụ adịghịdị m ka ihe ọ bụla. Abịadịrị m chọpụta na ịdị na-apụ apụ oge niile na iji ịnyịnya ígwè na-agbagharị n’ozi ọma na-enyere m aka inwe ezi ahụ́ ike. Ọ bụ ezie na m na-adịkarị ka onye ahụ́ na-adịghị, ọ dịghị mgbe m kwụsịrị ọrụ ọsụ ụzọ m n’ihi na ahụ́ esighị m ike. N’ime afọ ndị m ji jeere Jehova ozi, achọpụtala m n’ezie na “Jehova bụ ike m.”—Ọma 28:7.

E zigara m ije ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo ebe ndị a na-enweghị Ndịàmà ọ bụla ka m wee nye aka malite ọgbakọ ọhụrụ n’ebe ndị ahụ. Ebe mbụ m jere ozi ruo afọ atọ bụ n’England, mesịakwa jee ozi afọ atọ n’Ireland. Mgbe m na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ na Lisburn, dị n’Ireland, amụụrụ m otu nwoke bụ́ osote pastọ nke otu chọọchị Protestant ihe. Ka ọ na-amụta eziokwu ndị bụ́ isi dị na Baịbụl, ọ nọ na-akụziri ndị chọọchị ya ihe ọhụrụ ndị ahụ ọ na-amụta. Ụfọdụ n’ime ndị chọọchị ya gara kpesara ndị isi chọọchị ha, ha kpọrọ ya ka ọ kọwaara ha ihe na-emenụ. Ọ gwara ha na ya weere ya na ọ bụ ọrụ ya ịkọwara atụrụ ya na-elekọta na ya na-akụziburu ha ụgha. Ọ bụ ezie na ndị ezinụlọ ya kpagburu ya nnọọ, ọ raara ndụ ya nye Jehova ma nọgide na-efe ya ruo ọnwụ.

Ebe nke abụọ m jere ozi bụ na Larne, dị n’Ireland. Ọ bụ naanị m nọ ebe ahụ jee ozi ruo izu isii mgbe onye mụ na ya na-ejekọ ozi gara Mgbakọ Ịba Ụba Ọchịchị Chineke na New York, n’afọ 1950. Oge ahụ siiri m ezigbo ike. Ọ gụsiri m agụụ ike ịga mgbakọ ahụ. Ma, n’ime izu ndị ahụ naanị m nọ na-eje ozi, enwere m ọtụtụ ahụmahụ ndị na-agba ume n’ozi ọma. Ezutere m otu agadi nwoke natara otu akwụkwọ anyị ihe karịrị afọ iri abụọ tupu oge ahụ. Nwoke a agụọla akwụkwọ a ọtụtụ ugboro nke na ọ fọrọ obere ka o buru ihe niile dị n’ime ya n’isi. Ya na nwa ya nwoke, na nwa ya nwaanyị mechara nabata eziokwu.

Ịnara Ọzụzụ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied

N’afọ 1951, a kpọrọ mụ na ndị ọsụ ụzọ iri ndị ọzọ si England ịga klas nke iri na asaa nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied na South Lansing, New York. Ihe ndị a kụziiri anyị n’ọnwa ole na ole ndị ahụ anyị nọrọ ebe ahụ tọgburu m atọgbu! N’oge ahụ, adịghị ekenye ụmụnna nwaanyị ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’ọgbakọ, ma n’ụlọ akwụkwọ Gilied, e nyere anyị bụ́ ụmụnna nwaanyị ihe omume, gwakwa anyị ka anyị kọọ ahụmahụ banyere ozi anyị. Obi wụnyere anyị n’afọ! Mgbe m na-eme ihe omume mbụ e nyere m, aka m ji jide akwụkwọ ebe m dere ihe m na-ekwu magidere ririri ruo mgbe m kwụsịrị. Onye nkụzi anyị bụ́ Nwanna Maxwell Friend, ji ọchị kwuo, sị: “Ọ bụghị naanị na ụjọ tụrụ gị ná mmalite, dị ka ọ na-atụ ndị niile maara ekwu okwu, ma ụjọ tụgidere gị ruo ná ngwụcha okwu gị.” N’oge a anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, anyị niile mewere nke ọma mgbe a bịara n’ime ihe omume n’ihu ụmụ klas anyị ndị ọzọ. Ọ dịghị anya anyị agụchaa akwụkwọ, e zigakwa anyị ọtụtụ mba ndị ọzọ. E zigara m Thailand!

“Mba Ọchị Na-adịghị Akọ n’Ọnụ”

Eweere m ya dị ka onyinye sitere n’aka Jehova na e kenyere mụ na Astrid Anderson ijekọ ozi ala ọzọ ná mba Thailand. Anyị nọrọ izu asaa n’ụgbọ mmiri iji ruo ebe ahụ. Mgbe anyị rutere Bangkok, bụ́ isi obodo Thailand, anyị hụrụ na obodo ahụ nwere ọtụtụ ahịa na-ekwo ekwo na ọtụtụ ọwa mmiri ndị e ji mere okporo ụzọ. N’afọ 1952, e nwere ihe na-erughị otu narị ndị nkwusa Alaeze na iri ise na Thailand.

Mgbe mbụ anyị hụrụ Ụlọ Nche n’asụsụ Thai, ihe anyị nọ na-eche bụ, ‘Ànyị ga-amụtakwa asụsụ nke a n’ụwa a?’ O siiri anyị ezigbo ike ịkpọpụta okwu ndị dị n’asụsụ a otú e si akpọ ha. Dị ka ihe atụ, okwu bụ́ khaù, ọ bụrụ na e jiri ụda elu malite ịkpọ ya ma jirizie ụda ala kpọchaa ya, ihe ọ pụtara bụ “osikapa,” ma ọ bụrụ na e jiri ụda olu na-ede ude kpọọ otu okwu ahụ, ya apụta “ozi.” N’ihi ya, mgbe anyị nọ ozi ọma, ihe anyị nọ nnọọ na-agwa ndị mmadụ bụ, “Anyị wetaara unu osikapa ọma” kama ịgwa ha na anyị wetaara ha “ozi ọma”! Ma nke nta nke nta—ka a chịchara anyị ọchị ọtụtụ mgbe—anyị mụtara asụsụ ahụ.

Ọchị anaghị akọ ndị Thai n’ọnụ. Ka a sịkwa ihe mere e ji akpọ mba Thailand Mba Ọchị Na-adịghị Akọ n’Ọnụ. Ebe mbụ anyị jere ozi bụ n’obodo Khorat (nke a na-akpọzi Nakhon Ratchasima). Anyị jere ozi ebe ahụ afọ abụọ. E mechara ziga anyị obodo Chiang Mai. Ọtụtụ ndị obodo Thai na-ekpe okpukpe Buddha, ha amaghịkwa banyere Baịbụl. N’obodo Khorat, amụụrụ m otu nwoke na-arụ na post ọfịs ihe. Anyị kparịtara banyere nna ochie ahụ bụ́ Ebreham. Ebe ọ bụ na nwoke ahụ anụtụla aha ahụ bụ́ Ebreham mbụ, ọ nọ nnọọ na-ekwe n’isi ka anyị na-akparịta ụka. Ma emechara m chọpụta na ọ bụghị Ebreham nke o bu n’uche ka m na-ekwu okwu ya. Onye nwoke ahụ chere na m na-ekwu banyere ya bụ Abraham Lincoln, onye bụ́bu president mba United States!

Anyị nwere obi ụtọ ịkụziri ndị Thai nwere obi eziokwu Baịbụl, n’otu oge ahụ, ndị Thai kụziiri anyị otú mmadụ nwere ike isi nwee obi ụtọ n’agbanyeghị na o nwere ihe ole na ole. Ihe a anyị mụtara baara anyị uru nke ukwuu, n’ihi na n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ mbụ anyị biri na Khorat, anyị enweghị ọkụ eletrik ma ọ bụ mmiri pọmpụ. N’ebe ndị a e zigara anyị, anyị “amụtawo . . . ma otú e si enwe ihe n’ụba ma otú e si anọ n’ụkọ.” Dịkwa ka Pọl onyeozi, anyị hụrụ otú e si ‘enwe ike site n’aka onye ahụ nke na-enye ike.’—Fil. 4:12, 13.

Onye Ọhụrụ Mụ na Ya Na-ejekọ Ozi na Ebe Ọhụrụ

Na 1945, agara m London. N’oge ahụ, mụ na ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ na ụfọdụ ndị na-eje ozi na Betel gara Ebe A Na-edebe Ihe Ochie na Britain. Otu n’ime ndị mụ na ha so gaa ebe ahụ bụ Allan Coville, onye mechara gaa klas nke iri na otu nke ụlọ akwụkwọ Gilied. E zigara ya France, mechaakwa ziga ya Belgium. * Ka e mechara, mgbe m ka na-eje ozi ala ọzọ na Thailand, ọ jụrụ m ma m̀ ga-ekwe ka anyị lụọ, ekwetakwara m.

Anyị gbara akwụkwọ na Brussels dị na Belgium, na July 9, 1955. Kemgbe ụwa, ọ na-agụ m agụụ ịga ezumike n’obodo Paris ozugbo m gbachara akwụkwọ, n’ihi ya di m mere ndokwa ka anyị gaa otu mgbakọ e nwere na Paris n’izu sochiri izu anyị gbachara akwụkwọ. Ma mgbe anyị ruru ebe ahụ, a rịọrọ di m ozugbo ahụ ka ọ bịa tapịawa okwu ruo ná ngwụsị nke mgbakọ ahụ. Ọ na-apụ n’isi ụtụtụ ọ bụla, anyị na-alọtakwa ebe e nyere anyị ụlọ n’abalị. N’ihi ya, ọ bụ ezie na abịara m Paris ịtụrụ ndụ, m na-anọ n’ebe dị anya ahụ di m, mgbe ọ nọ n’ikpo okwu! N’agbanyeghị nke ahụ, obi dị m ụtọ ịhụ ka di m na-ejere ụmụnna ya ozi, obi sikwara m ike na ọ bụrụ na Jehova anọrọ n’alụmdi na nwunye anyị, anyị ga-enwe obi ụtọ n’ezie.

Ịlụ di kpọgara m n’ókèala ọhụrụ, bụ́ Belgium. Ihe na-agbatakarị m n’uche ma m nụ aha obodo ahụ bụ́ Belgium bụ na ọ bụ ọgbọ agha, ma ọ dịghị anya, mụ achọpụta na ndị Belgium bụ ndị udo. Ebe ọhụrụ a m bịara chọkwara na m ga-amụ asụsụ French, nke bụ́ asụsụ a na-asụ n’ebe ndịda obodo ahụ.

Na 1955, e nwere ihe dị ka puku ndị nkwusa anọ na narị ise na Belgium. Mụ na di m sokwa jee ozi na Betel nakwa n’ọrụ njegharị ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri ise. Anyị jiri ịnyịnya ígwè rịa ugwu dị iche iche ma rịda, ma mmiri ọ̀ na-ezo ma anwụ ọ̀ na-acha, ruo afọ abụọ na ọkara. N’afọ ndị a niile, anyị rahụrụ n’ụlọ Ndịàmà ibe anyị karịrị puku abụọ! Ọtụtụ mgbe, ana m ezute ụmụnna ndị nwoke na ndị nwaanyị na-agbasichaghị ike, ma ha nọgidekwara jiri ike ha niile na-ejere Jehova ozi. Ndụ ha gbara m ume ịghara ịda mba n’ozi m. Ná ngwụcha izu ọ bụla mgbe anyị letachara otu ọgbakọ, anyị na-enweta nnọọ agbamume. (Rom 1:11, 12) Di m bụ nnọọ ezigbo enyi m. Nke a gosiri na okwu ahụ dị n’Ekliziastis 4:9, 10 bụ eziokwu: “Abụọ dị mma karịa otu, . . . n’ihi na ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ pụrụ ikulite ibe ya”!

Ngọzi Ndị M Nwetara n’Ihi Iji ‘Ike Jehova’ Nyere M Jeere Ya Ozi

Ruo ọtụtụ afọ, mụ na di m bụ́ Allan nwetara ọtụtụ ahụmahụ ndị na-enye obi ụtọ site n’inyere ndị ọzọ aka ịbịa fewe Jehova. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1983, anyị gara leta otu ọgbakọ ndị na-asụ asụsụ French n’obodo Antwerp. Anyị nọrọ n’ụlọ otu ezinụlọ, bụ́ ebe Benjamin Bandiwila, bụ́ otu nwanna nwoke na-eto eto si Zaire (nke a na-akpọzi Democratic Republic of Congo), bi. Benjamin bịara na Belgium ịga ụlọ akwụkwọ dị elu. Ọ gwara anyị sị, “Ụdị ndụ a unu na-ebi na-atọ m ụtọ, ọ dị m ka m bụrụ unu, iji ndụ m niile na-ejere Jehova ozi.” Di m gwara ya, sị: “Ọ dị gị ka ị bụrụ anyị; ma ị na-achụso agụmakwụkwọ ụwa. Ì cheghị na ihe ị na-ekwu na ihe ị na-eme adabaghị?” Ihe ahụ di m kwuru n’ezoghị ọnụ mere ka Benjamin chebara ndụ ya echiche. Mgbe ọ laghachiri Zaire, ọ malitere ọrụ ọsụ ụzọ, ugbu a kwa, o sozi n’otu n’ime ndị Kọmitii Alaka mba ya.

N’afọ 1999, a wara m ahụ́ ma wepụ ọnyá dị na nkọlọ m. Kemgbe ahụ, atakwuola m ahụ́, adịzi m naanị kilogram iri atọ n’arọ. Adị m nnọọ pekepeke ka ‘arịa e ji ụrọ kpụọ.’ Ma, ana m ekele Jehova na o nyere m “ike karịrị ike nkịtị.” Mgbe a wachara m ahụ́, Jehova nyekwara m ume isonye di m n’ọrụ njegharị ya. (2 Kọr. 4:7) Ma na March 2004, di m rahụrụ o tetaghị. Ọ na-ewute m nke ukwuu na mụ na ya anọghịzi, ma ịmara na Jehova ga-echeta ya na-akasi m obi.

Adị m afọ iri asatọ na atọ ugbu a, anọọkwala m afọ iri isii na atọ n’ozi oge niile. M ka na-ezisa ozi ọma, na-eduzi ọmụmụ Baịbụl n’ụlọ, na-ejikwa ohere ọ bụla dapụtaranụ na-akọrọ ndị mmadụ banyere nzube Jehova ndị magburu onwe ha. Mgbe ụfọdụ, ana m adị na-eche, sị, ‘Gịnị ka ndụ m gaara adị ka ya ma ọ bụrụ na amaliteghị m ọrụ ọsụ ụzọ n’afọ 1945?’ N’oge ahụ, ahụ́ na-esighị m ike gaara eme m ka m ghara ịmalite ọrụ ọsụ ụzọ. Ma obi dị m ụtọ na m malitere ọrụ ọsụ ụzọ mgbe m ka na-eto eto! E nweela m ihe ùgwù nke iji anya m hụ na ọ bụrụ na anyị ebute Jehova ụzọ ná ndụ anyị, ọ ga-abụ ike anyị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 E bipụtara akwụkwọ ahụ bụ́ Salvation n’afọ 1939. A naghịzi ebipụta ya.

^ par. 22 A kọrọ akụkọ ndụ Nwanna Coville n’Ụlọ Nche bekee nke March 15, 1961.

[Foto dị na peeji nke 18]

Mụ na onye mụ na ya jekọrọ ozi ala ọzọ bụ́ Astrid Anderson (ọ nọ n’aka nri)

[Foto dị na peeji nke 18]

Mgbe mụ na di m nọ n’ọrụ njegharị n’afọ 1956

[Foto dị na peeji nke 20]

Mụ na di m n’afọ 2000