Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-enyocha Anyị Maka Ọdịmma Anyị

Jehova Na-enyocha Anyị Maka Ọdịmma Anyị

Jehova Na-enyocha Anyị Maka Ọdịmma Anyị

“Anya [Jehova] na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.”—2 IHE 16:9.

1. Gịnị mere Jehova ji enyocha anyị?

JEHOVA bụ Nna na-enweghị atụ. Ọ maruru anyị ala ruo n’ókè nke ịmara ọbụna “ihe niile [anyị] na-eche n’echiche.” (1 Ihe 28:9) Ma, ọ dịghị enyocha anyị iji hụ nnọọ ebe ndị anyị na-adịghị eme nke ọma. (Ọma 11:4; 130:3) Kama, ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya mere o ji chọọ inyere anyị aka ka ihe ọ bụla ghara imebi mmekọrịta anyị na ya, ma ọ bụ mee ka anyị ghara inweta ndụ ebighị ebi.—Ọma 25:8-10, 12, 13.

2. Olee ndị Jehova na-egosi ike ya maka ha?

2 Ike Jehova enweghị atụ, ọ na-ahụkwa ihe niile. N’ihi ya, o nwere ike inyere ndị ohu ya aka mgbe ọ bụla ha kpọkuru ya nakwa mgbe a na-anwa ha. 2 Ihe E Mere 16:9 kwuru, sị: “Anya [Jehova] na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” N’ihe a e kwuru ebe a, ị ga-ahụ na Jehova na-egosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ, ya bụ, ndị obi ha dị ọcha na ndị bu ezi ihe n’obi. Ọ bụghị otú a ka Jehova si emeso ndị aghụghọ na ndị ihu abụọ.—Jọsh. 7:1, 20, 21, 25; Ilu 1:23-33.

Soro Chineke Na-eje Ije

3, 4. Gịnị ka ‘iso Chineke na-eje ije’ pụtara, oleekwa ihe atụ ndị dị na Baịbụl bụ́ ndị na-enyere anyị aka ịghọta ihe ọ pụtara?

3 Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta na Onye kere eluigwe na ala anyị na-ekwe ka ụmụ mmadụ soro ya na-eje ije n’ụzọ ihe atụ. Ma n’ezie Jehova chọrọ ka anyị soro ya na-eje ije. N’oge Baịbụl, Inọk na Noa ‘so Chineke jee ije.’ (Jen. 5:24; 6:9) Mozis “guzosiri ike dị ka à ga-asị na ọ na-ahụ onye ahụ anya bụ́ Onye a na-apụghị ịhụ anya.” (Hib. 11:27) Eze Devid wedara onwe ya ala soro Nna ya nke eluigwe jee ije. Ọ sịrị: “N’ihi na [Jehova] nọ m n’aka nri, a gaghị eme ka m maa jijiji.”—Ọma 16:8.

4 Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị enweghị ike ijide Jehova n’aka n’ụzọ nkịtị soro ya na-eje ije. Ma anyị nwere ike ime nke a n’ụzọ ihe atụ. Olee otú anyị nwere ike isi mee ya? Ọbụ abụ ahụ bụ́ Esaf dere, sị: “Mụ na gị nọ mgbe niile; I jidewo aka nri m. Ị ga-eji ndụmọdụ gị na-edu m.” (Ọma 73:23, 24) Ihe anyị na-ekwu bụ na anyị na Jehova na-eje ije mgbe anyị na-eme kpọmkwem ihe o kwuru. Ebe bụ́ isi anyị si amata ihe o kwuru bụ n’Okwu ya e dere ede nakwa site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.”—Mat. 24:45; 2 Tim. 3:16.

5. Olee otú Jehova si enyocha ndị nọsiri ike n’akụkụ ya, dị ka nna na-ahụ n’anya na-eme, oleekwa otú anyị kwesịrị isi were Jehova?

5 Jehova adịghị eji ndị so ya na-eje ije egwuri egwu, n’ihi ya, ọ na-elekọta ha dị ka nna na-ahụ n’anya, na-echebe ha, ma na-ezi ha ihe. Chineke kwuru, sị: “M ga-eme ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ ị ga-eso. M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.” (Ọma 32:8) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ahụ ebe mụ na Jehova na-eje ije, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-egere okwu amamihe ọ na-ekwu, marakwa na o ji ịhụnanya na-enyocha m? Ịmara na mụ na Jehova so, ọ̀ na-eme ka m na-akpachapụ anya banyere ihe ndị m na-eche n’echiche, ihe ndị m na-ekwu, na ihe ndị m na-eme? Ọ bụrụkwanụ na mụ emehie, m̀ na-aghọta na Jehova abụghị Chineke na-achọghị ịma banyere anyị nakwa na ọ bụghị onye obi tara mmiri, kama ọ bụ Nna na-ahụ n’anya ma nwee obi ebere, bụ́ onye chọrọ inyere ndị mmehie chegharịrị echegharị aka ịbịaghachikwute ya?’—Ọma 51:17.

6. Olee ihe Jehova ji kara nne ma ọ bụ nna bụ́ mmadụ?

6 Mgbe ụfọdụ, Jehova nwedịrị ike ịbịa nyere anyị aka tupu anyị abanye ná nsogbu. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịchọpụta na obi anyị, bụ́ nke na-adịkarị aghụghọ, amalitela ịchọ ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị. (Jere. 17:9) Ọ bụrụ na ọ chọpụta nke a, o nwere ike ịbịa nyere anyị aka ọsọ ọsọ karịa ka nne ma ọ bụ nna ọ bụla nwere ike ime, n’ihi na “anya ya nke na-enwu gbaa” na-ahụ ime obi anyị, iji nyochaa ihe ndị anyị bu n’obi. (Ọma 11:4; 139:4; Jere. 17:10) Tụlee ihe Chineke mere banyere otu ihe mere ná ndụ Barọk, bụ́ odeakwụkwọ Jeremaya onye amụma nakwa ezigbo enyi ya.

Ọ Ghọọrọ Barọk Nna n’Ezie

7, 8. (a) Ònye bụ Barọk, oleekwa ihe na-adịghị mma o yiri ka ọ malitere iche n’obi ya? (b) Olee otú Jehova si gosi Barọk na ya bụ nna na-ahụ n’anya?

7 Barọk bụ odeakwụkwọ maara nke a na-akọ, onye ji ikwesị ntụkwasị obi soro Jeremaya rụọ ọrụ tara akpụ, nke bụ́ ịgwa Juda okwu ikpe Jehova. (Jere. 1:18, 19) E nwere mgbe Barọk, bụ́ onye ọ ga-abụ na o si n’ezinụlọ a ma ama, malitere ịchọwara onwe ya “ihe ukwu.” Ikekwe ọ bịara chọwa ịbụ onye a ma ama ma ọ bụ ịba ọgaranya. Nke ọ bụla ọ bụ, Jehova chọpụtara na Barọk enwewela ọchịchọ ọjọọ n’obi ya. Jehova siri n’ọnụ Jeremaya gwa Barọk okwu ozugbo, sị: “Ị sịwo: ‘Efuola m, n’ihi na Jehova atụkwasịwo iru uju n’ihe mgbu m! Ike agwụwo m n’ihi ude m na-asụ, enweghịkwa m ebe izu ike.’” Chineke kwuziri, sị: “Ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu. Kwụsị ịchọ ya.”—Jere. 45:1-5.

8 Ọ bụ ezie na Jehova ezoghị ọnụ gwa Barọk ihe a, ọ gwaghị ya okwu ahụ n’iwe, kama ọ gwara ya okwu otú nna bu ọdịmma nwa ya n’obi si agwa nwa ya okwu. Ọ ga-abụ na Chineke chọpụtara na ọ bụ ezie na Barọk chọrọ inweta ihe ukwu, ọ pụtaghị na obi ya jọrọ njọ ma ọ bụ dị aghụghọ. Jehova makwa na ọ fọrọ obere ka e bibie Jeruselem na Juda, ọ chọghịkwa ka ọ bụrụ n’oge a ka Barọk ga-abịa dawa mbà. N’ihi ya, iji mee ka ohu ya ghọta onwe ya, Chineke chetaara ya na Ya “ga-eme ka ọdachi dakwasị anụ ahụ́ niile,” gwakwa Barọk na ọ ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na o mee ihe kwesịrị ekwesị. (Jere. 45:5) E nwere ike ikwu na ihe Chineke gwara ya bụ: ‘Barọk, meghee anya gị. Cheta ihe na-aga ime Juda na Jeruselem na-enupụ isi n’oge na-adịghị anya. Nọgide na-ejere m ozi ka i wee dị ndụ! M ga-echebe gị.’ Ọ ga-abụ na okwu Jehova ruru Barọk n’obi, n’ihi na o mere ihe Jehova gwara ya, ma lafere mbibi ahụ e bibiri Jeruselem, bụ́ nke mere ka afọ iri na asaa gachara.

9. Olee otú ị ga-esi aza ajụjụ ndị a jụrụ na paragraf a?

9 Ka ị na-echebara akụkọ banyere Barọk echiche, tụlee ajụjụ na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a: Gịnị ka otú ahụ Chineke si nyere Barọk aka na-egosi banyere Jehova na otú o si ewere ndị ohu ya? (Gụọ Ndị Hibru 12:9.) N’ihi oge a dị oké egwu anyị bi na ya, gịnị ka anyị nwere ike ịmụta site na ndụmọdụ ahụ Chineke nyere Barọk nakwa site n’ihe Barọk mere? (Gụọ Luk 21:34-36.) Olee otú ndị okenye ọgbakọ nwere ike isi ṅomie ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị ohu ya nọ dị ka Jeremaya mere?—Gụọ Ndị Galeshia 6:1.

Ọkpara ahụ Ṅomiri Ịhụnanya Nna Ya

10. Olee otú e si kwadebe Jizọs ka o nwee ike ịrụ ọrụ ya dị ka Onyeisi nke ọgbakọ Ndị Kraịst?

10 Tupu oge Ndị Kraịst, Jehova siri n’ọnụ ndị amụma ya na ndị ohu ya ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi gosi ndị ya na ya hụrụ ha n’anya. Taakwa, Jehova kacha esi n’aka Jizọs Kraịst, bụ́ onyeisi nke ọgbakọ Ndị Kraịst, egosi nke a. (Efe. 1:22, 23) N’ihi ya, n’akwụkwọ Mkpughe, a kọwara Jizọs dị ka nwa atụrụ nke nwere “anya asaa, bụ́ anya ndị pụtara mmụọ asaa nke Chineke, bụ́ ndị e zigara n’ụwa dum.” (Mkpu. 5:6) N’ezie, Jizọs na-aghọta ihe n’ụzọ na-enweghị atụ n’ihi na o nwere mmụọ nsọ Chineke n’ụba. Ọ na-ahụkwa ihe anyị bu n’obi, ọ makwaara ihe niile na-emenụ.

11. Olee ọrụ Kraịst na-arụ, oleekwa otú ụzọ o si emeso anyị ihe si yie nke Nna ya?

11 Jizọs abụghị onye uwe ojii si n’eluigwe na-ele ma ọ̀ ga-ejide anyị ná mmehie, dị ka Jehova na-abụghị. Ọ na-eji ịhụnanya enyocha anyị. Otu n’ime utu aha Jizọs nke bụ́ “Nna Mgbe Ebighị Ebi,” na-echetara anyị ọrụ ọ ga-arụ nke bụ́ inye ndị niile nwere okwukwe na ya ndụ ebighị ebi. (Aịza. 9:6) Ọzọkwa, ebe Jizọs bụ Onyeisi nke ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ pụrụ ịkpali Ndị Kraịst ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ma dị njikere inyere ndị ọzọ aka, karịsịa ndị okenye, ịkasi ndị ụfọdụ obi ma ọ bụ nye ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa.—1 Tesa. 5:14; 2 Tim. 4:1, 2.

12. (a) Gịnị ka akwụkwọ ozi ndị ahụ e degaara ọgbakọ asaa ahụ dị n’Eshia Maịnọ na-egosi banyere Jizọs? (b) Olee otú ndị okenye si eṅomi Kraịst mgbe ha na-elekọta ìgwè atụrụ Chineke?

12 E gosiri otú Kraịst si hụ nnọọ ìgwè atụrụ ahụ n’anya n’akwụkwọ ozi ahụ o degaara ndị okenye nke ọgbakọ asaa ahụ dị n’Eshia Maịnọ. (Mkpu. 2:1-3:22) N’akwụkwọ ozi ndị ahụ, Jizọs gosiri na ya maara ihe na-eme n’ọgbakọ nke ọ bụla nakwa na ya bu nnọọ ọdịmma ndị na-eso ụzọ ya n’obi. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa, karịsịa ebe ọ bụ na ọhụụ ndị ahụ e dekọrọ ná Mkpughe na-emezu “n’ụbọchị Onyenwe anyị.” * (Mkpu. 1:10) Kraịst na-esikarị n’aka ndị okenye, ndị bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ ọgbakọ, egosi na ya hụrụ anyị n’anya. O nwere ike ịkpali ndị a bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ” ịkasị anyị obi, ịgba anyị ume, ma ọ bụ inye anyị ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa. (Efe. 4:8; Ọrụ 20:28; gụọ Aịzaya 32:1, 2.) Ị̀ na-ewere ọrụ ha na-arụ dị ka ụzọ Kraịst si egosi na ya nwere mmasị n’ebe ị nọ?

Enyemaka nke Na-abịa n’Ezi Oge

13-15. Olee otú Chineke nwere ike ịhọrọ isi zaa ekpere anyị? Nye ihe atụ.

13 Ọ̀ dịtụla mgbe i kpesiri nnọọ ekpere ike maka enyemaka, a zaa gị ekpere gị site n’ime ka otu Onye Kraịst tozuru okè bịa leta gị ma gbaa gị ume? (Jems 5:14-16) Ma ọ̀ bụkwanụ ya abụrụ na i nwetere enyemaka site n’okwu ihu ọha e kwuru n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ site n’otu akwụkwọ anyị ị gụrụ. Jehova na-esikarị n’ụzọ ndị dị otú a aza ekpere. Dị ka ihe atụ, mgbe otu okenye kwuchara okwu ihu ọha, otu nwanna nwaanyị e mesoro mmeso ọjọọ izu ole na ole tupu o kwuo okwu ihu ọha ahụ bịakwutere ya. Kama ịgwawa okenye ahụ nsogbu ya, o kelere ya nnọọ maka isi ihe ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ o wepụtara mgbe ọ na-ekwu okwu ihu ọha ahụ. Ihe ndị ahụ o kwuru bụ ihe ndị dị ya mkpa iji die nsogbu ya, ha kasikwara ya nnọọ obi. Obi dị ya ụtọ na ọ bịara ọmụmụ ihe ahụ!

14 Iji hụ otú e si enweta enyemaka site n’ekpere, tụlee ihe banyere mmadụ atọ a tụrụ mkpọrọ, bụ́ ndị mụtara eziokwu Baịbụl mgbe ha ka nọ n’ụlọ mkpọrọ ma ghọọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim. N’ihi ihe ike ndị mkpọrọ mere otu ụbọchị, e gbochiri ndị niile nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ ime ọtụtụ ihe a na-ekwebu ha mee. Nke a mere ka ha kpebizie ime isi ike. Iji gosi iwe ha, ndị mkpọrọ ahụ kpebiri na ha agaghị eweghachi efere ha ga-eji rie nri ụtụtụ. Ugbu a, ndị nkwusa atọ a a na-emebeghị baptizim amaghị ihe ha ga-eme. Ọ bụrụ na ha esonye ná nnupụisi ahụ, ha ga-emebi iwu Jehova e dekọrọ ná Ndị Rom 13:1. Ọ bụrụ na ha esonyeghị, ndị mkpọrọ ibe ha iwe ji ga-emesi ha ike.

15 Ebe ọ bụ na o nweghị otú ha atọ ga-esi nọkọọ kpebie ihe ha ga-eme, onye nke ọ bụla n’ime ha kpere ekpere maka amamihe. N’ụtụtụ ahụ, ha atọ chọpụtara na ha kpebiri ime otu ihe, nke bụ́ na ha agaghị eri nri ụtụtụ. Mgbe ndị nche ụlọ mkpọrọ bịara ibukọrọ efere ndị mkpọrọ ji rie nri, mmadụ atọ ahụ enweghị nke ha ji. Obi tọgburu ha atọgbu na “Onye na-anụ ekpere” nọ ha nso!—Ọma 65:2.

Inwe Obi Ike na Ihe Ga-aka Mma n’Ọdịnihu

16. Olee otú ikwusa ozi ọma si egosi na Jehova na-eche banyere ndị yiri atụrụ?

16 Ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile bụkwa ihe ọzọ na-egosi na Jehova na-eche banyere ndị nwere ezi obi, n’agbanyeghị ebe ha bi. (Jen. 18:25) Mgbe mgbe, Jehova nwere ike iji ndị mmụọ ozi ya duga ndị ohu ya na nke ndị yiri atụrụ—ọ sọgodị ya ya bụrụ na ndị a bi n’ebe ozi ọma ahụ na-erubeghị. (Mkpu. 14:6, 7) Dị ka ihe atụ, Chineke jiri mmụọ ozi ziga Filip, bụ́ onye na-ekwusa ozi ọma na narị afọ mbụ, ka ọ gakwuru ọnaozi Etiopia na-alaghachi obodo ya ma kọwaara ya Akwụkwọ Nsọ. Gịnị si na ya pụta? Nwoke ahụ nabatara ozi ọma ahụ ma ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs e mere baptizim. *Jọn 10:14; Ọrụ 8:26-39.

17. Gịnị mere anyị ekwesịghị ichegbu onwe anyị gabiga ókè banyere ọdịnihu?

17 Ka usoro ihe a na-eru ọgwụgwụ ya, a ga-anọgide na-enwe “ihe ụfụ nke nhụjuanya” e buru n’amụma. (Mat. 24:8) Dị ka ihe atụ, ọnụ ahịa ihe oriri nwere ike ịrị elu n’ihi na ndị chọrọ ya dị ọtụtụ, n’ihi oké ọkọchị ma ọ bụkwanụ n’ihi ọnọdụ akụnụba na-agbanwe agbanwe. O nwere ike isi ike inweta ọrụ, e nwekwara ike ịmanye ndị nke e were n’ọrụ ịrụ ọrụ ruo ọtụtụ awa. Nke ọ bụla ọ sọrọ ya mee, ndị niile na-ebute ofufe Jehova ụzọ ma nọgide ‘na-elegide anya ha otu ebe’ ekwesịghị ichegbu onwe ha gabiga ókè. Ha maara na Chineke hụrụ ha n’anya nakwa na ọ ga-elekọta ha. (Mat. 6:22-34) Dị ka ihe atụ, tụlee otú Jehova si lekọta Jeremaya mgbe Jeruselem nọ n’ihe isi ike tupu e bibie ya n’afọ 607 T.O.A.

18. Olee otú Jehova si gosi na ya hụrụ Jeremaya n’anya mgbe a nọchibidoro Jeruselem?

18 Ná ngwụsị nke oge ahụ ndị agha Babịlọn nọchibidoro Jeruselem, a tụrụ Jeremaya mkpọrọ n’Ogige Ndị Nche. Olee otú ọ ga-esi nweta nri? A sị na a tụghị ya mkpọrọ, ọ gaara ama otú ọ ga-esi enweta nri. Ma ugbu a, na o riela nri agwụla ma ndị nọ ya nso hà nyere ya, ma ọtụtụ n’ime ha kpọrọ ya asị! N’agbanyeghị nke a, kama ịtụkwasị mmadụ obi, Jeremaya tụkwasịrị Chineke obi, bụ́ onye kwere nkwa ilekọta ya. Jehova ò lekọtara Jeremaya otú o kwuru? À na-ajụkwa ajụ! Ọ hụrụ nnọọ na kwa ụbọchị Jeremaya na-enweta “otu ogbe achịcha . . . ruo mgbe achịcha gwụrụ n’obodo.” (Jere. 37:21) Jeremaya, na Barọk, Ibed-melek, na ndị ọzọ, lafeere ụnwụ nri, ọrịa na ọnwụ n’oge ahụ.—Jere. 38:2; 39:15-18.

19. Olee ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ime ka anyị na-echere ihe ga-eme n’ọdịnihu?

19 N’ezie, “anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike.” (1 Pita 3:12) Ì nwere obi ụtọ na Nna gị nke eluigwe na-elekọta gị? Obi ọ̀ na-eru gị ala na anya ya na-elekwasị gị maka ọdịmma gị? Kpebisienụ ike ịnọgide soro Chineke na-eje ije—n’agbanyeghị ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-anọgide na-elekọta ndị niile na-erubere ya isi, dị ka nna hụrụ ụmụ ya n’anya na-eme.—Ọma 32:8; gụọ Aịzaya 41:13.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Ọ bụ ezie na ndị e bu n’obi dee akwụkwọ ozi ndị ahụ bụ ụmụazụ Kraịst e tere mmanụ, ihe ndị e kwuru na ha metụtakwara ndị ohu Chineke niile.

^ par. 16 Ebe ọzọ a kọrọ otú Chineke si eduzi ọrụ nkwusa a n’onwe ya bụ n’Ọrụ 16:6-10. N’ebe ahụ e kwuru na ‘mmụọ nsọ machibidoro Pọl na ndị ha na ya so iwu’ ikwusa ozi ọma n’Eshia na Bitinia. Kama ịgawa ebe ahụ, a gwara ha gaa Masedonia, bụ́ ebe ọtụtụ ndị dị umeala n’obi gere ha ntị.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị ‘so Chineke na-eje ije’?

• Olee otú Jehova si gosi na ya hụrụ Barọk n’anya?

• Olee otú Jizọs, bụ́ onye Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst, si ṅomie àgwà Nna ya?

• Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi gosi na anyị tụkwasịrị Chineke obi n’oge a dị oké egwu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Dị ka Jeremaya si nyere Barọk aka, ndị okenye ọgbakọ n’oge a na-egosi na ha na-eche banyere ndị ọzọ dị ka Jehova na-eme

[Foto dị na peeji nke 10]

Olee otú Jehova nwere ike isi nye aka mgbe enyemaka dị mkpa?