Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Jehova Si Aza Ekpere Si n’Ala Ala Obi

Otú Jehova Si Aza Ekpere Si n’Ala Ala Obi

Otú Jehova Si Aza Ekpere Si n’Ala Ala Obi

“Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”—ỌMA 83:18.

1, 2. Olee ahụmahụ ọtụtụ ndị nwerela, oleekwa ajụjụ ndị e nwere ike ịjụ?

AFỌ ole na ole gara aga, ọdachi nke mere na gburugburu ebe otu nwaanyị bi nyere ya nnọọ nsogbu n’obi. Nwaanyị ahụ bụ onye Roman Katọlik, ọ gakwuukwara ụkọchukwu ha ka ọ gwa ya ihe mere ihe a ji na-eme, ma ọ dịghị njikere inyere ya aka. Nwaanyị ahụ kpegaara Chineke ekpere, sị: “Amaghị m onye ị bụ . . . , ma ama m na ị nọ ya. Biko nyere m aka ịmara onye ị bụ!” Obere oge ka o kpechara ekpere a, Ndịàmà Jehova bịara na nke ya ma kasie ya obi, kụziekwara ya ihe dị ya mkpa ịmụta. Otu n’ime ihe ndị ha kụziiri ya bụ na Chineke nwere aha, nke bụ́ Jehova. Ịmụta nke a metụrụ ya nnọọ n’ahụ́. Ọ sịrị: “Legodị, nke a bụ Chineke m chọwara ịmara kemgbe m bụ nwata!”

2 E nweela ọtụtụ ndị ọ dịrị otú a ọ dị nwaanyị a. Mgbe mbụ ha na-ahụ aha ahụ bụ́ Jehova na-abụkarị mgbe ha gụrụ Abụ Ọma 83:18 na Baịbụl. Ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, amaokwu ahụ na-asị: “Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.” Ì chetụla ihe mere e ji dee Abụ Ọma nke iri asatọ na atọ? Olee ihe ndị ga-eme ka mmadụ niile kweta na ọ bụ naanị Jehova bụ ezi Chineke ahụ? Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’abụ ọma a taa? Anyị ga-elebara ajụjụ ndị a anya n’isiokwu a. *

Ịgba Izu Megide Ndị Jehova

3, 4. Ònye rọrọ Abụ Ọma nke iri asatọ na atọ, oleekwa ihe isi ike ndị ọ na-ekwu okwu ha?

3 Dị ka ihe e dere n’elu Abụ Ọma nke iri asatọ na atọ gosiri, ọ bụ “abụ olu ụtọ Esaf.” O yiri ka onye rọrọ abụ ahụ o si n’ezinụlọ Esaf onye Livaị, bụ́ onye a ma ama na-abụ abụ n’oge ọchịchị Eze Devid. N’abụ ọma ahụ, onye rọrọ ya rịọrọ Jehova ka o mee ihe iji gosi na ọ bụ Ya kwesịrị ịbụ eze nakwa ka o mee ka a mara aha Ya. Ọ ga-abụ na a rọrọ abụ ahụ obere oge ka Sọlọmọn nwụsịrị. N’ihi gịnị ka anyị ji kwuo otú a? Ọ bụ n’ihi na n’oge ọchịchị Devid na Sọlọmọn, eze Taya na Izrel dị ná mma. Ma n’oge a rọrọ Abụ Ọma nke iri asatọ na atọ, ndị Taya na-emegidezi ndị Izrel, ha dunyeziiri ndị iro ndị Izrel úkwù.

4 Onye dere abụ ahụ kpọrọ aha mba iri ndị na-agba izu ibibi ndị Chineke. Ndị iro ndị a gbara Izrel gburugburu, ha bụ́kwa: “Ụlọikwuu Idọm na ndị Ishmel, Moab na ndị Hega, Gibal na Amọn na Amalek, Filistia tinyere ndị bi na Taya. Asiria esonyewokwara ha.” (Ọma 83:6-8) Olee ihe merenụ nke onye rọrọ abụ a na-ekwu okwu ya? Ụfọdụ na-ekwu na abụ a na-ekwu banyere mgbe ahụ ndị Amọn, Moab, na ndị bi n’Ugwu Sia gbakọrọ aka lụsoo ndị Izrel ọgụ n’oge Jehoshafat. (2 Ihe 20:1-26) Ndị ọzọ kweere na abụ a na-ekwu banyere otú ndị agbata obi ndị Izrel si na-ebuso ha agha kemgbe mba Izrel malitere.

5. Olee otú Abụ Ọma nke iri asatọ na atọ si enyere Ndị Kraịst aka taa?

5 Nke ọ bụla ọ bụ, o doro anya na Jehova Chineke mere ka e dee abụ a bụ́ ekpere n’oge mba ya nọ ná nsogbu. Abụ a na-agbakwa ndị Chineke ume taa, bụ́ ndị ndị iro siri ọnwụ na ha ga-ala ha n’iyi nọworo na-akpagbu kemgbe. Ọ ga-agbakwa anyị ume n’oge na-adịghị anya, mgbe Gọg nke Megọg ga-achịkọta ndị agha ya ịgbalị nke ikpeazụ ya ibibi ndị niile na-efe Chineke n’ime mmụọ na eziokwu.—Gụọ Ezikiel 38:2, 8, 9, 16.

Ihe Kacha Echegbu Ọbụ Abụ Ahụ

6, 7. (a) Gịnị ka ọbụ abụ ahụ kpere n’ekpere n’okwu mmeghe nke Abụ Ọma nke iri asatọ na atọ? (b) Gịnị bụ isi ihe na-echegbu ọbụ abụ ahụ?

6 Gee ntị ka ọbụ abụ ahụ na-agwa Chineke otú ọ dị ya n’obi n’ekpere: “Chineke, biko, agbala nkịtị; emechila ọnụ, anọla jụụ, gị Chineke. N’ihi na, lee! ndị iro gị nọ n’ọgba aghara; ndị kpọrọ gị asị nke ukwuu eweliwo isi ha elu. Ha ji aghụghọ na-agbara ndị gị izu . . . N’ihi na ha ejiriwo otu obi gbaa izu; ha wee gbaa ndụ imegide gị.”—Ọma 83:1-3, 5.

7 Gịnị kacha echegbu ọbụ abụ ahụ? O doro anya na ọ na-echekwa otú ọ ga-esi echebe onwe ya na ezinụlọ ya. Ma, isi ihe o kpere n’ekpere bụ banyere nkọcha a na-ewetara aha Jehova nakwa egwu a na-eyi mba a kpọkwasịrị aha Jehova. Ka anyị niile nọgide na-enwe ụdị echiche a ọbụ abụ a nwere mgbe anyị na-edi ihe isi ike ndị anyị na-enweta n’ụbọchị ikpeazụ nke ụwa ochie a.—Gụọ Matiu 6:9, 10.

8. Gịnị mere mba ndị ọzọ ji na-agba izu megide Izrel?

8 Ọbụ abụ ahụ kwuru na ndị iro ndị Izrel kwuru, sị: “Bịanụ ka anyị kpochapụ ha ka ha ghara ịbụkwa mba, ka a gharakwa icheta aha Izrel ọzọ.” (Ọma 83:4) O doro anya na mba ndị a kpọrọ ndị Chineke asị n’ezie! Ma e nwere ihe ọzọ mere ha ji na-agba izu megide ndị Chineke. Ha na-emere ndị Izrel anyaụfụ maka ala ha wee na-etu ọnụ, sị: “Ka anyị weghara ebe obibi Chineke.” (Ọma 83:12) Ihe dị otú a ò metụla n’oge anyị a? Ee!

‘Ebe Obibi Gị Dị Nsọ’

9, 10. (a) N’oge ochie, ebee bụ ebe obibi dị nsọ nke Chineke? (b) Olee ngọzi ndị fọdụrụnụ ná ndị e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ahụ na-enweta taa?

9 N’oge ochie, a kpọrọ Ala Nkwa ahụ ebe obibi dị nsọ nke Chineke. Cheta abụ mmeri ahụ ụmụ Izrel bụrụ mgbe a napụtara ha n’Ijipt: “Gị onwe gị ejiriwo obiọma gị duo ndị ị gbapụtara; gị onwe gị ga-eji ike gị duru ha gaa n’ebe obibi gị dị nsọ.” (Ọpụ. 15:13) Ka oge na-aga, ‘ebe obibi’ ahụ bịara nwee ụlọ nsọ na ndị nchụàjà na isi obodo, bụ́ Jeruselem, na usoro ndị eze sitere n’eriri Devid ndị nọ n’ocheeze Jehova. (1 Ihe 29:23) Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji kpọọ Jeruselem “obodo nke Eze ukwu.”—Mat. 5:35.

10 Gịnịkwanụ banyere oge anyị? N’afọ 33 O.A., a mụrụ mba ọhụrụ, bụ́ “Izrel nke Chineke.” (Gal. 6:16) Mba ahụ, nke ndị mejupụtara ya bụ ụmụnna Jizọs Kraịst bụ́ ndị e tere mmanụ, rụzuru ọrụ ahụ Izrel anụ ahụ́ na-arụlighị, ya bụ, ịgbara aha Chineke àmà. (Aịza. 43:10; 1 Pita 2:9) Jehova kwere ha otu nkwa ahụ o kwere Izrel oge ochie: “M ga-abụkwa Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.” (2 Kọr. 6:16; Lev. 26:12) Na 1919, Jehova kpọbatara ndị fọdụrụ ‘n’Izrel nke Chineke’ n’ọnọdụ ka mma, n’oge ahụkwa, ha nwetara ‘ala,’ ya bụ, ógbè paradaịs ime mmụọ, ebe ha nọ na-arụ ọrụ. (Aịza. 66:8) Kemgbe afọ 1930, ọtụtụ nde “atụrụ ọzọ” abịakwala sonyere ha. (Jọn 10:16) Obi ụtọ na ọganihu ime mmụọ Ndị Kraịst a na-enwe n’oge a na-egosi nnọọ na ọchịchị Jehova kacha zie ezie. (Gụọ Abụ Ọma 91:1, 2.) Nke a na-agbawa nnọọ Setan obi!

11. Olee nzube bụ́ isi nke ndị iro Chineke?

11 N’oge ikpeazụ a, Setan akpaliela ndị òtù ya nọ n’ụwa imegide ndị fọdụrụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị ibe ha bụ atụrụ ọzọ ahụ. Ụdị ihe a mere n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Yurop mgbe ndị Nazi na-achị nakwa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop n’oge ọchịchị ndị Kọmunist nke Soviet Union. O mekwaala n’ọtụtụ mba ndị ọzọ, ọ ga-emekwa ọzọ, karịchaa mgbe Gọg nke Megọg ga-alụso ndị Chineke agha ikpeazụ. N’agha ahụ, ndị mmegide nwere ike iji anyaukwu jichie ihe ndị ohu Jehova nwere, dị ka ndị iro mere n’oge ndị gara aga. Ma ihe bụ́ isi Setan zubere ime bụ itisa anyị ka a ghara ichetakwa aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova ọzọ. Gịnị ka Jehova na-eme banyere mmegide a a na-emegide ọchịchị ya? Leghachigodị anya n’ihe ahụ ọbụ abụ ahụ kwuru.

Ihe Ndị Na-egosi Otú Jehova Ga-esi Enwe Mmeri

12-14. Olee mmeri abụọ a na-agaghị echefu echefu e nwere na nso obodo Megido, bụ́ ndị ọbụ abụ ahụ kwuru okwu ha?

12 Ọbụ abụ ahụ gosiri okwukwe siri ike o nwere na Jehova nwere ikike imebi atụmatụ nke mba ndị na-emegide ndị Jehova. Ọ kọrọ mmeri abụọ kpụ ọkụ n’ọnụ Izrel meriri ndị iro ya na nso obodo Megido oge ochie, bụ́ ebe e nwere ndagwurugwu Megido. N’oge ọkọchị, a na-ahụ ọwara mmiri nke mmiri na-adịghị na ya, bụ́ ebe Osimiri Kaịshọn na-esi na ndagwurugwu ahụ na-asọfe. Ọ bụrụ na nnukwu mmiri ezoo n’oge udu mmiri, ndagwurugwu ahụ na-ejupụta ná mmiri. Eleghị anya ọ bụ nke a mere e jikwa na-akpọ osimiri ahụ “mmiri Megido.”—Ikpe 4:13; 5:19.

13 Ihe dị ka kilomita iri na ise site na ndagwurugwu Megido, e nwere ugwu nta More, bụ́ ebe ndị agha Midian, Amalek, na ndị si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ gbakọtara ibuso Izrel agha n’oge Onyeikpe Gidiọn. (Ikpe 7:1, 12) Ndị agha Gidiọn dị naanị narị atọ meriri nnukwu ndị agha ahụ site n’enyemaka Jehova. Olee otú ha si mee nke a? Ha gbara ndị agha ahụ gburugburu n’abalị dị ka Chineke gwara ha mee, ha jikwa ite ndị ha tinyere ọwa ọkụ n’ime ha. Mgbe Gidiọn gwara ha na o sula, ha kụriri ite ndị ahụ, ọwa ọkụ ndị ahụ wee mụkee ebe niile. N’otu mgbe ahụ, ha gburu opi ha ma tie mkpu, sị: “Mma agha Jehova na nke Gidiọn!” Ndị iro ha bidoro gbawa aghara ma malite igbu ibe ha; ndị na-anwụghị si ụzọ Osimiri Jọdan gbalaga. Ọtụtụ ndị Izrel ndị ọzọ sooro chụwa ndị iro ndị ahụ. Ndị iro niile e gburu dị otu narị puku na iri puku abụọ.—Ikpe 7:19-25; 8:10.

14 Ugwu Tebọ nọ ihe dị ka kilomita isii site n’ugwu nta More, n’ófè ndagwurugwu Megido. Tupu oge Gidiọn, Onyeikpe Berak chịkọtara puku ndị agha Izrel iri iji busoo ndị agha Jebin, bụ́ eze obodo Hezọ nke dị na Kenan, agha. Ọ bụ Sisera bụ ọchịagha eze Jebin. Ndị agha Kenan a nwere narị ụgbọ ịnyịnya itoolu ndị nwere ogologo mma nke na-eso ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ahụ na-agbagharị. Ndị agha Sisera gbabatara ná ndagwurugwu ahụ mgbe ha hụrụ ka ndị Izrel na-ejighị ezigbo ngwá agha zukọtara n’Ugwu Tebọ. Mgbe ha batara, “Jehova wee . . . na-etinye Sisera na ụgbọ ịnyịnya agha ya niile na ndị agha ya niile n’ọgba aghara.” Ikekwe nnukwu mmiri nke malitere izo mere ka ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ha tọ n’ime pọtọpọtọ n’ihi Osimiri Kaịshọn nke na-asọsi ike. Ndị Izrel sụrụ ndị agha ahụ niile akwụ.—Ikpe 4:13-16; 5:19-21.

15. (a) Gịnị ka ọbụ abụ ahụ rịọrọ Jehova n’ekpere ka o mee? (b) Gịnị ka aha agha ikpeazụ nke Chineke na-echetara anyị?

15 Ọbụ abụ ahụ rịọrọ Jehova ka o mee ndị na-achọ ibibi ndị Izrel n’oge ya ụdị ihe ahụ o mere ndị nke gara aga. O kpere ekpere, sị: “Mee ha ihe i mere Midian, ihe i mere Sisera, ihe i mere Jebin n’iyi ndagwurugwu Kaịshọn. A lara ha n’iyi n’En-dọọ; ha ghọrọ nri ala.” (Ọma 83:9, 10) Ọ dị mma ịmara na a kpọrọ agha ikpeazụ Chineke ga-ebuso Setan Ha–Magedọn (nke pụtara “Ugwu Megido”), ma ọ bụ Amagedọn. Aha ahụ na-echetara anyị agha ndị ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ a lụrụ ná nso Megido. Mmeri ndị Jehova nwere n’agha ndị ahụ a lụrụ n’oge ochie na-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-enwerịrị mmeri n’agha Amagedọn.— Mkpu. 16:13-16.

Na-ekpe Ekpere Ka E Gosi na Ọ Bụ Jehova Kwesịrị Ịchị

16. Olee otú ‘ihere sirila ju ndị mmegide n’ihu’ taa?

16 Kemgbe a banyere “n’oge ikpeazụ” ndị a, Jehova anọwo na-eme ka mgbalị niile ndị iro na-eme ịla ndị ohu ya n’iyi na-akụ afọ n’ala. (2 Tim. 3:1) Nke a emeela ka ihere bụrụ nke ndị ahụ na-emegide ndị ya. Abụ Ọma 83:16 mere ka nke a pụta ìhè mgbe ọ sịrị: “Jehova, biko, mee ka ihere ju ha ihu, ka ndị mmadụ wee chọọ aha gị.” Ndị iro akụọla afọ n’ala ná mgbalị ha na-eme n’ọtụtụ mba imechi Ndịàmà Jehova ọnụ. Ná mba ndị ahụ, ntachi obi nke ndị ohu ezi Chineke ahụ, nakwa otú ha si kwụsie ike n’akụkụ Chineke, agbaarala ndị nwere ezi obi àmà, ọtụtụ n’ime ha ‘achọwokwa aha Jehova.’ N’ọtụtụ mba ebe ndị a kpagburu Ndịàmà Jehova n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, e nwere ọtụtụ iri puku, nakwa ọtụtụ narị puku, ndị ji obi ụtọ na-efe Jehova. Jehova emeriela n’ezie! Ihere emegbuola ndị iro ya!—Gụọ Jeremaya 1:19.

17. Olee ihe oge ya na-agwụnahụ ụmụ mmadụ, oleekwa okwu anyị ga-echeta n’oge na-adịghị anya?

17 Ma anyị maara na agha a ebibeghị. Anyị ga-anọgidekwa na-ekwusa ozi ọma—ọbụna na-ekwusara ya ndị mmegide. (Mat. 24:14, 21) Ma, ohere ndị mmegide a nwere ichegharị ma nweta nzọpụta ga-agwụ n’oge na-adịghị anya. Ido aha Jehova nsọ dị mkpa karịa ịzọpụta ụmụ mmadụ. (Gụọ Ezikiel 38:23.) Mgbe mba dị iche iche ga-ezukọta ibibi ndị Chineke dị ka e buru n’amụma, anyị ga-echeta ihe a ọbụ abụ ahụ kpere n’ekpere: “Biko, ka ihere mee ha, ka obi gharakwa iru ha ala mgbe ọ bụla, ka e mechuo ha ihu, ka ha laakwa n’iyi.”—Ọma 83:17.

18, 19. (a) Gịnị na-echere ndị siri ọnwụ na-enupụrụ ọchịchị Jehova isi? (b) Olee otú ngosi Jehova ga-egosipụta n’oge na-adịghị anya na ọ bụ ya kwesịrị ịchị dị gị?

18 A ga-ala ndị niile siri ọnwụ na-emegide ọchịchị Jehova n’iyi. Okwu Chineke na-agwa anyị na ndị “na-adịghị erube isi n’ozi ọma”—bụ́ ndị a ga-ala n’iyi n’Amagedọn—ga-ezute “mbibi ebighị ebi.” (2 Tesa. 1:7-9) Mbibi a ga-ebibi ha na nzọpụta a ga-azọpụta ndị na-efe Jehova ofufe n’ezie ga-egosi n’ụzọ doro anya na Jehova bụ naanị ezi Chineke ahụ. N’ụwa ọhụrụ ahụ, a gaghị echefu oké mmeri ahụ echefu. Ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ná “mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume” ga-amata oké ọrụ ndị Jehova rụrụ. (Ọrụ 24:15) N’ụwa ọhụrụ ahụ, ha ga-ahụ ihe àmà doro anya gosiri na amamihe dị n’irubere ọchịchị Jehova isi. Ndị dị umeala n’obi n’ime ha ga-ekweta ozugbo na ọ bụ naanị Jehova bụ ezi Chineke ahụ.

19 Leenụ ihe ndị magburu onwe ha Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya kwadebere n’ọdịnihu maka ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ya ofufe! Nke a ọ́ dịghị akpali gị ikpe ekpere ka Jehova zaa ekpere ọbụ abụ ahụ nke ikpeazụ ya: “Biko, ka ihere mee [ndị iro gị], ka obi gharakwa iru ha ala mgbe ọ bụla, ka e mechuo ha ihu, ka ha laakwa n’iyi; ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile”?—Ọma 83:17, 18.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Tupu ị mụwa isiokwu a, ị ga-erite uru na ya ma ọ bụrụ na ị gụọ Abụ Ọma nke iri asatọ na atọ iji mara ihe o kwuru nke ọma.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee ọnọdụ ndị Izrel nọ na ya mgbe e dere Abụ Ọma nke iri asatọ na atọ?

• Olee isi ihe na-echegbu onye dere Abụ Ọma nke iri asatọ na atọ?

• Olee ndị ka Setan na-ebuso iro taa?

• Olee otú Jehova ga-esi zaa ekpere ahụ dị n’Abụ Ọma 83:18 nke ikpeazụ ya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Map dị na peeji nke 15]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Olee otú agha ndị e buru ná nso Megido oge ochie si gbasa ọdịnihu anyị?

Osimiri Kaịshọn

Haroshet

Ugwu Kamel

Ndagwurugwu Jezril

Megido

Teanak

Ugwu Gilboa

Olulu Mmiri Herọd

Ugwu More

En-dọọ

Ugwu Tebọ

Oké Osimiri Galili

Osimiri Jọdan

[Foto dị na peeji nke 12]

Gịnị kpaliri otu ọbụ abụ ikpegara Jehova ekpere sitere n’ala ala obi?