Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Abụ Oké Osimiri”—Ihe Odide nke Jikọrọ Oge Abụọ

“Abụ Oké Osimiri”—Ihe Odide nke Jikọrọ Oge Abụọ

“Abụ Oké Osimiri”—Ihe Odide nke Jikọrọ Oge Abụọ

NA May 22, 2007, e wepụtara otu ibe akwụkwọ mpịakọta nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ nke dịwara kemgbe narị afọ nke asaa ma ọ bụ nke asatọ O.A., n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie dị na Jeruselem ka ndị mmadụ bịa lere ya. Ọ bụ akwụkwọ mpịakọta nke Ọpụpụ 13:19–16:1. Ihe ndị so n’ihe e dere na ya bụ ihe a maara dị ka “Abụ Oké Osimiri,” nke bụ́ abụ mmeri ahụ ndị Izrel bụrụ mgbe a napụtara ha n’ụzọ ọrụ ebube n’Oké Osimiri Uhie. Gịnị mere mwepụta a e wepụtara ibe akwụkwọ mpịakọta a ji bụrụ ihe a na-agaghị echefu echefu?

Ọ bụ n’ihi oge e dere akwụkwọ mpịakọta a. E dere Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ n’agbata narị afọ nke atọ T.O.A. na narị afọ nke mbụ O.A. Tupu a chọta Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ a, bụ́ nke a chọtara ihe dị ka iri afọ isii gara aga, ihe odide Akwụkwọ Nsọ Hibru kasị ochie e nwere bụ Aleppo Codex, bụ́ nke e dere n’ihe dị ka n’afọ 930 O.A. E wezụga ibe Akwụkwọ Nsọ Hibru ole na ole ndị ọzọ, e nweghị ihe odide Hibru ndị ọzọ nọrọla ọtụtụ narị afọ e nweterela.

James S. Snyder, bụ́ onyeisi n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie ahụ dị n’Izrel kwuru, sị: “Ihe odide Abụ Oké Osimiri ahụ jikọrọ ihe mere n’agbata oge e dere Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ ahụ . . . na oge e dere Aleppo Codex.” O kwuru na Abụ Oké Osimiri a na ihe odide Baịbụl ndị ọzọ “na-egosi ụzọ pụrụ iche e si chebe ihe ndị e dere na Baịbụl iji hụ na ha dị otú ha dị ná mbụ.”

E kweere na ibe akwụkwọ mpịakọta a bụ otu n’ime ihe odide ndị a chọtara ná ngwụcha narị afọ nke iri na itoolu n’otu ụlọ nzukọ ndị Juu dị n’obodo Cairo, n’Ijipt. Ma otu onye na-ewekọta ihe odide mgbe ochie nke ndị Hibru amaghị na ihe odide ahụ dị oké mkpa ruo mgbe o ji ya jekwuru otu onye ọkachamara n’ihe mgbe ochie ná ngwụcha afọ ndị 1970. Oge ahụ e wetara ya, ndị ọkachamara gbakọrọ oge ọ ga-abụ na e dere ya ma debe ya ruo mgbe e wepụtara ya n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie ahụ dị n’Izrel.

Mgbe Adolfo Roitman, bụ́ onyeisi Shrine of the Book, nke dị n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie ahụ dị n’Izrel nakwa onye na-elekọta Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, na-ekwu okwu banyere uru ibe mpịakọta akwụkwọ ahụ bara, ọ sịrị: “Ihe odide Abụ Oké Osimiri ahụ na-egosi na ihe odide Masorete nke Baịbụl bụ nke a na-agwagbughị agwagbu kemgbe ọtụtụ narị afọ e dere ya. Ọ dị ịtụnanya na otú e si dee Abụ Oké Osimiri ahụ na narị afọ nke asaa ruo na nke asatọ ka dịkwa otú ahụ taa.”

Baịbụl bụ Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee, ọ bụkwa Jehova bụ onye bụ́ isi hụrụ na e chebere ya ruo taa. Ihe ọzọ bụ na ndị bụ́ ọkà n’idepụta ihe kpachapụrụ nnọọ anya depụta ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ ndị mbụ e nwere. N’ihi ya, obi abụọ adịghị ya na a pụrụ ịtụkwasị Baịbụl ndị anyị nwere taa obi.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 32]

Site n’ikike a natara n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie Izrel, Jeruselem