Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji “Otu Obi na Mkpụrụ Obi” Na-efe Chineke

Iji “Otu Obi na Mkpụrụ Obi” Na-efe Chineke

Iji “Otu Obi na Mkpụrụ Obi” Na-efe Chineke

N’OGE Ememme Pentikọst, ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu gbara ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst gburugburu. Ndị a na-eso ụzọ ndị Juu si ihe ha ka Rom, nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ, na Patia, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, bịa Jeruselem. Ìgwè mmadụ a gbakọtaranụ na-asụ asụsụ dị iche iche. Ma, ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị na-agwa ha okwu, bụ ndị Galili. Ọ tụrụ ụfọdụ n’ime ndị a si esi bịa n’anya nke na ha jụrụ, sị: “Olee otú o si bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị na-anụ asụsụ nke ya, bụ́ asụsụ anyị na-asụ kemgbe a mụrụ anyị?”—Ọrụ 2:8.

Pita onyeozi bilitere ma kọwaa ihe kpatara ọrụ ebube a ha na-ahụ. N’egbughị oge, ìgwè mmadụ ahụ kwetara ihe Pita na-agwa ha. E mekwara ọtụtụ puku ndị ọhụrụ baptizim! (Ọrụ 2:41) N’agbanyeghị na ọgbakọ ahụ mụbara ngwa ngwa, ha nọgidere na-adị n’otu. Luk, bụ́ onye so dee Baịbụl, kwuru sị: “Ìgwè mmadụ ahụ bụ́ ndị kweerenụ nwere otu obi na mkpụrụ obi.”—Ọrụ 4:32.

Ọtụtụ puku ndị e mere baptizim na Pentikọst 33 O.A. chọrọ ịnọtukwu na Jeruselem iji nwee ike ịmụtakwu ihe banyere okpukpe ọhụrụ a. Ma ha akwadoghị akwado bịa n’ihi na ha ebughị n’obi ịnọte aka. N’ihi ya, e mere ndokwa ka a tụkọta ego. Ụfọdụ ndị kwere ekwe ji obi ha ree ihe onwunwe ha ma wetere ndịozi ihe ha retere ka e keere ndị nọ ná mkpa. (Ọrụ 2:42-47) Nke a bụ nnọọ omume na-egosi ịhụnanya na mmesapụ aka!

Ezi Ndị Kraịst na-egosipụta nnọọ ụdị ịhụnanya na mmesapụ aka a. Taa, ọgbakọ Ndị Kraịst ji “otu obi na mkpụrụ obi” nọgide na-efe Jehova. Onye Kraịst ọ bụla na-eji obi ya niile ewepụta oge ya, ume ya, na ego ya iji kwusaa ozi ọma ahụ na iji kwadoo ihe ndị metụtara Alaeze Chineke.—Lee igbe bụ́  “Ụzọ Ụfọdụ Ndị Họọrọ Isi Na-enye Ihe.”

[Igbe dị na peeji nke 6 na nke 7]

 ỤZỌ ỤFỌDỤ NDỊ HỌỌRỌ ISI NA-ENYE IHE

ONYINYE NDỊ A NA-ENYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị na-ewepụta, ma ọ bụ na-amawapụta ego iche, bụ́ nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ e dere “Worldwide Work.” (“Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ”)

N’ọnwa ọ bụla, ọgbakọ dị iche iche na-eziga ego ndị a n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-elekọta mba ha. Mmadụ nwekwara ike iziga ego onyinye n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ya. A ga-ede “Watch Tower” n’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla a na-ezigara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba unu. A pụkwara inye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. Onye na-ezite ihe ndị a kwesịrị ide obere akwụkwọ ozi iji kọwaa na ihe ndị a bụ onyinye ma zitekọta ya na onyinye ya.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

Tinyere inye onyinye ego, e nwekwara ụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi nye ihe ka o wee baa uru n’ozi Alaeze ahụ a na-eje n’ụwa niile. Ha gụnyere:

Ịnshọransị: A pụrụ idenye aha Watch Tower dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ anwụọ ma ọ bụkwanụ dị ka ndị ga-eso keta ego a na-erite ma a laa ezumike nká.

Ihe Ndekọ Ego Ụlọ Akụ: Mmadụ pụrụ ime ndokwa ka e nye Watch Tower ego o debere n’ụlọ akụ, ego ọ gbazinyere ụlọ akụ, ma ọ bụ ego ezumike nká ya mgbe ọ nwụrụ, a ga-eme nke a n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ dị ná mba ya na-agbaso.

Aka Òkè na Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: A pụrụ inye Watch Tower aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye.

Ala na Ụlọ: A pụrụ inye ala na ụlọ nke a pụrụ ire ere dị ka onyinye, ọ bụrụkwanụ na ọ bụ ụlọ onye nwe ya ka bi na ya, ọ pụkwara inye ya dị ka onyinye ma ka biri na ya n’oge niile ọ dị ndụ. Mee ka alaka ụlọ ọrụ dị ná mba unu mara tupu ị na-edenyere ya ala na ụlọ ọ bụla.

Ike Ekpe na Atụmatụ Ego: A pụrụ idenyere Watch Tower ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e dere n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Watch Tower aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-egosi, ụdị onyinye ndị a chọrọ nnọọ ka onye na-enye ya mee atụmatụ nke ọma.

Iji matakwuo banyere ụzọ ndị a e si enye onyinye, ị pụrụ ịkpọtụrụ Alaka Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Nigeria, site n’ịkpọ ha na telefon ma ọ bụ idegara ha akwụkwọ ozi, n’adres e dere n’okpuru ebe a ma ọ bụ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba unu.

Jehovah’s Witnesses

P.M.B. 1090,

Benin City 300001,

Edo State, Nigeria.

Telefon: (052) 202020