Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-eguzogidenụ Ekwensu” Dị Ka Jizọs Mere

“Na-eguzogidenụ Ekwensu” Dị Ka Jizọs Mere

“Na-eguzogidenụ Ekwensu” Dị Ka Jizọs Mere

“Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—JEMS 4:7.

1. Olee mmegide Jizọs maara na ya ga-enweta n’ụwa, gịnịkwa ga-esi na ya pụta?

JIZỌS KRAỊST maara na Ekwensu ga-emegide ya. Ihe Chineke gwara agwọ ahụ gosiri na Ekwensu ga-emegide Jizọs. Onye Chineke gwara okwu ahụ kpọmkwem bụ ajọ mmụọ ahụ nupụrụ isi, onye si n’agwọ ahụ kwuo okwu. Jehova sịrị: “M ga-emekwa ka iro dịrị n’etiti gị na nwaanyị ahụ [akụkụ nzukọ Jehova nke dị n’eluigwe] nakwa n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya. Ọ [Jizọs Kraịst] ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.” (Jen. 3:14, 15; Mkpu. 12:9) Imerụ Jizọs ahụ́ n’ikiri ụkwụ pụtara na a ga-emerụ ya ahụ́ nke ga-ala ngwa ngwa, nke bụ́ ogbugbu a ga-egbu Jizọs mgbe ọ nọ n’ụwa. Ihe mere o ji bụrụ mmerụ ahụ́ ga-ala ngwa ngwa bụ n’ihi na Jehova ga-akpọlite ya n’ọnwụ ya arịgoo eluigwe ma dịrị ebube. Ma igwepịa agwọ ahụ n’isi pụtara na a ga-eme Ekwensu ihe ga-akpatara ya ọnwụ ebighị ebi.—Gụọ Ọrụ 2:31, 32; Ndị Hibru 2:14.

2. Gịnị mere obi ji sie Jehova ike na Jizọs ga-eguzogideli Ekwensu?

2 Obi siri Jehova ike na Jizọs ga-arụzu ọrụ e dunyere ya ma guzogidelie Ekwensu n’ụwa. Gịnị mere obi ji sie Jehova ike na Jizọs ga-emeli nke a? Ọ bụ n’ihi na ọ dịla anya o kere Jizọs n’eluigwe, o lechekwaala ya hụ na “onye ọkà ọrụ” a na ‘onye a e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke,’ na-erube isi ma bụrụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. (Ilu 8:22-31; Kọl. 1:15) N’ihi ya, mgbe e zitere Jizọs n’ụwa ma kwe ka Ekwensu nwaa ya ruo mgbe ọ nwụrụ, obi siri Chineke ike na Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ga-emeri Ekwensu.—Jọn 3:16.

Jehova Na-echebe Ndị Ohu Ya

3. Olee otú Ekwensu si ele ndị ohu Jehova anya?

3 Jizọs kpọrọ Ekwensu “onye na-achị ụwa” ma dọọ ndị na-eso ụzọ Ya aka ná ntị na a ga-akpagbu ha, ọbụna dị ka a kpagburu ya. (Jọn 12:31; 15:20) Ụwa, nke dị n’ike aka Setan bụ́ Ekwensu, kpọrọ ezi Ndị Kraịst asị n’ihi na ha na-efe Jehova ma na-ekwusa ezi omume. (Mat. 24:9; 1 Jọn 5:19) Ndị Ekwensu kacha chọọ inweta bụ ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị ga-emecha soro Kraịst chịwa n’Alaeze ya n’eluigwe. Setan na-achọkwa inweta ọtụtụ Ndịàmà Jehova, ndị nwere olileanya ibi ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Okwu Chineke na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.”—1 Pita 5:8.

4. Gịnị na-egosi na ndị Chineke enweela ihe ịga nke ọma n’iguzogide Ekwensu?

4 Anyị na-eguzogideli Ekwensu n’ihi na anyị bụ nzukọ nke Jehova Chineke na-echebe. Tụlee ihe ndị a merenụ: N’ime otu narị afọ gara aga, ụfọdụ ndị ọchịchị obi fere azụ a ma ama agbalịala ikpochapụ Ndịàmà Jehova. Ma ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova anọgidela na-amụba, na-achọkwa iru nde asaa ugbu a n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ e nwere n’ụwa niile. Ọ bụ ndị ọchịchị ndị ahụ obi fere azụ, bụ́ ndị kpagburu ndị Jehova, bụ ndị na-anọghịzi ndụ!

5. Olee otú Aịzaya 54:17 si na-emezu n’isi ndị ohu Jehova?

5 Mgbe Chineke na-agwa ụmụ Izrel oge ochie okwu dị ka “nwaanyị” ya, o kwere ha nkwa, sị: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma, ire ọ bụla nke ga-ekwu okwu megide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe. Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova, ezi omume ha si n’ebe m nọ.” (Aịza. 54:11, 17) Nkwa ahụ na-emezu n’isi ndị Jehova n’ụwa niile “n’ụbọchị ikpeazụ” ndị a. (2 Tim. 3:1-5, 13) Anyị ga-anọgide na-eguzogide Ekwensu, ọ dịghịkwa ngwá agha ọ bụla ọ ga-agbalị iji kpochapụ ndị Chineke ga-aga nke ọma, n’ihi na Jehova nọnyeere anyị.—Ọma 118:6, 7.

6. Gịnị ka amụma Daniel gwara anyị na a ga-eme ọchịchị Ekwensu n’ọdịnihu?

6 N’ọgwụgwụ usoro ihe a nke ji ọsọ na-abịa, a ga-ekpochapụ ihe niile gbasara ọchịchị Setan kpamkpam. Mgbe Daniel na-ede akwụkwọ ya site n’ike mmụọ nsọ, o buru amụma, sị: “N’ụbọchị ndị eze ahụ [ndị na-achị n’oge anyị a], Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị [n’eluigwe]. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile [ndị dị ugbu a], mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.” (Dan. 2:44) Mgbe nke a mere, ma ọchịchị Setan ma nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ga-apụ n’anya. Ihe niile banyere ụwa Ekwensu ga-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi, Alaeze Chineke ga-achịwakwa ụwa niile n’enweghị onye ọ bụla ga-ama ya aka.—Gụọ 2 Pita 3:7, 13.

7. Olee otú anyị si mara na ndị ohu Jehova n’otu n’otu ga-eguzogideli Ekwensu?

7 O doro anya na a ga-echebe nzukọ Jehova nakwa na ọ ga-anọgide na-eme nke ọma. (Gụọ Abụ Ọma 125:1, 2.) Gịnịkwanụ banyere anyị? Baịbụl na-agwa anyị na anyị ga-eguzogideli Ekwensu, ọbụna dị ka Jizọs mere. N’ezie, amụma Kraịst buru site n’ọnụ Jọn onyeozi gosiri na n’agbanyeghị mmegide sitere n’aka Setan, “oké ìgwè mmadụ” ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ga-alanahụ ọgwụgwụ nke usoro ihe a. Dị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru, ha na-eti mkpu n’oké olu, sị: “Nzọpụta anyị si n’aka Chineke anyị, bụ́ onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, nakwa n’aka Nwa Atụrụ ahụ [Jizọs Kraịst].” (Mkpu. 7:9-14) E kwuru na ndị e tere mmanụ meriri Setan, ndị ibe ha, bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ, guzogidelikwara ya. (Jọn 10:16; Mkpu. 12:10, 11) Ma ọ chọrọ anyị ịnọgide na-agbalịsi ike ma na-ekpechi ekpere anya iji nwee ike bụrụ ndị ‘a napụtara n’aka ajọ onye ahụ.’—Mat. 6:13.

Onye Setịpụrụ Ihe Nlereanya Kachanụ n’Iguzogide Ekwensu

8. Olee ọnwụnwa mbụ a kọrọ na Baịbụl Ekwensu nwara Jizọs n’ịkpa, gịnịkwa ka Kraịst zara ya?

8 Ekwensu gbalịrị ime ka Jizọs kwụsị ime uche Chineke. Mgbe ha nọ n’ịkpa, Setan nwara Jizọs ugboro ugboro iji mee ka o nupụrụ Jehova isi. Ma, Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya kachanụ n’iguzogide Setan. Mgbe Jizọs buchara ọnụ ụbọchị iri anọ ehihie na abalị, eleghị anya ezigbo agụụ malitere ịgụ ya. Setan gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.” Ma Jizọs ekweghị eji ike Chineke nyere ya eme ihe ga-abara naanị ya onwe ya uru. Kama ime otú ahụ, Jizọs kwuru, sị: “E dere, sị, ‘Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.’”—Mat. 4:1-4; Diut. 8:3.

9. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji guzogide mgbalị Ekwensu na-eme ịnwata anyị ime ihe obi anyị chọrọ?

9 Taa, Ekwensu na-agbalị ịnwata ndị ohu Jehova site n’ime ka ha na-emezu ọchịchọ anụ ahụ́ ha. N’ihi ya, anyị ga-ekpebisi ike izere ihe ndị nwere ike iduba anyị n’ịkwa iko. Ihe ndị a jukwara ebe niile n’ụwa a e ji omume rụrụ arụ mara. Okwu Chineke kwuru hoo haa, sị: “Gịnị? Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? Unu ekwela ka e duhie unu. Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ma ọ bụ ndị ikom ndị na-ekwe ka ndị ikom dinaa ha, ma ọ bụ ndị ikom na-edina ndị ikom . . . agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Kọr. 6:9, 10) Ya mere, o doro anya na a gaghị ekwe ka ndị na-eme omume rụrụ arụ ma jụ ịgbanwe biri n’ụwa ọhụrụ Chineke.

10. Dị ka e dere na Matiu 4:5, 6, olee ọnwụnwa ọzọ Setan nwara Jizọs iji mee ka ọ kwụsị ime uche Chineke?

10 Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere otu n’ime ọnwụnwa a nwara Jizọs n’ịkpa, sị: “Ekwensu kpọọrọ ya banye n’obodo nsọ ahụ, o wee mee ka o guzoro n’elu ihe a rụbichiri na mgbidi ụlọ nsọ wee sị ya: ‘Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si ebe a wụda; n’ihi na e dere, sị, “Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ha ga-eji aka ha ghọrọ gị, ka ị ghara ịkpọ ụkwụ na nkume mgbe ọ bụla.”’” (Mat. 4:5, 6) Ihe Setan na-ekwu bụ na ime nke a ga-egosi nnọọ na Jizọs bụ Mesaya ahụ. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na Jizọs emee otú ahụ, ọ ga-egosi na ọ dị mpako, nke a agaaraghịkwa adị Chineke mma n’obi. Na nke a kwa, Jizọs mere uche Jehova ma zaghachi Ekwensu site n’ichetara ya otu ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. O kwuru, sị: “E dekwara, sị, ‘Elela Jehova bụ́ Chineke gị ule.’”—Mat. 4:7; Diut. 6:16.

11. Olee otú Setan nwere ike isi nwaa anyị, gịnịkwa nwere ike isi na ya pụta?

11 Setan nwere ike ịnwa anyị ka anyị chọọ ime ihe ndị ga-eme ka aha anyị na-ede ude. O nwere ike ịgbalị ime ka anyị na-eyi uwe ndị na-ewu ewu n’ụwa ma ọ bụ ka anyị sonye n’ihe ntụrụndụ ndị a na-enye enyo. Ma, ọ bụrụ na anyị eleghara ndụmọdụ dị na Baịbụl anya ma ṅomiwe ụwa, ànyị ga-atụ anya ka ndị mmụọ ozi chebe anyị ka anyị ghara ịghọrọ mkpụrụ anyị kụrụ? Ọ bụ ezie na Eze Devid chegharịrị mgbe ya na Bat-shiba mehiechara, ọ ka jikwa isi ya buru ihe ndị si ná mmehie ya pụta. (2 Sam. 12:9-12) Ka anyị ghara ịnwa Jehova n’ụzọ ndị na-ekwesịghị ekwesị, ikekwe site n’ịbụ ndị enyi nke ụwa.—Gụọ Jems 4:4; 1 Jọn 2:15-17.

12. Olee ọnwụnwa e kwuru okwu ya na Matiu 4:8, 9, oleekwa ihe Ọkpara Chineke mere?

12 Ọnwụnwa ọzọ Ekwensu nwara Jizọs n’ịkpa ahụ bụ ikwe nkwa inye ya ọchịchị. Setan gosiri Jizọs alaeze niile nke ụwa na ebube ha ma gwa ya, sị: “Ihe a niile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala fee m ofufe.” (Mat. 4:8, 9) Leenụ ụdị oké ọchịchọ Setan nwere nke bụ́ ka a na-efe ya ofufe e kwesịrị ife naanị Jehova, ọ chọdịrị ka Jizọs kwụsị ife Chineke! Site n’ichewe ihe ọ ga-adị ka ya ma e fewe ya ofufe, mmụọ ozi a na-ejeburu Chineke ozi ghọziri onye mmehie n’ihi anyaukwu. Ọ ghọkwara nnọọ ajọ onye ọnwụnwa bụ́ Setan Ekwensu. (Jems 1:14, 15) Ma Jizọs mere ihe dị nnọọ iche, o kpebisiri ike ịnọgide na-efe Nna ya nke eluigwe ofufe. Ọ gwaziri Ekwensu, sị: “Si ebe a pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’” Jizọs si otú a guzogide Ekwensu ọzọ n’ụzọ doro nnọọ anya. Ọkpara Chineke achọghị itinye aka n’ihe ọ bụla gbasara ụwa Setan, ọ gaghịkwa anwa anwa fee ajọ onye ahụ ofufe!—Mat. 4:10; Diut. 6:13; 10:20.

“Na-eguzogidenụ Ekwensu, Ọ Ga-agbapụkwa n’Ebe Unu Nọ”

13, 14. (a) Mgbe Ekwensu gosiri Jizọs alaeze niile nke ụwa, gịnị ka ọ nọ na-ekwe nkwa inye ya? (b) Olee otú Setan si agbalị imerụ anyị?

13 Site n’igosi Jizọs alaeze niile nke ụwa, Ekwensu na-ekwe nkwa inye ya ike ọchịchị ọ na-enwebeghị mmadụ ọ bụla nwetụrụla ya. Setan bu n’obi na ihe Jizọs hụrụ ga-amasị ya ma mee ka o kweta na o nwere ike ịghọ onye ọchịchị kacha ike n’ụwa ma ọ chọọ. Taa, Ekwensu adịghị enye anyị alaeze nke ụwa, kama ọ na-agbalị iji ihe ndị anyị na-ahụ, ihe ndị anyị na-egere egere, na ihe ndị na-abanye anyị n’uche merụọ obi anyị.

14 Ọ bụ Ekwensu na-achị ụwa a. N’ihi ya, usoro mgbasa ozi ụwa a dị ya n’aka. Ọ bụghịkwa ihe iju anya na ihe juru n’ihe ndị a na-ekiri ekiri, ihe ndị a na-egere egere, na ihe ndị a na-agụ agụ n’ụwa taa bụ omume rụrụ arụ na ime ihe ike. Ndị na-akpọsa ngwá ahịa n’ụwa na-agbalị ime ka ọ na-agụ anyị agụụ inweta imerime ihe ndị na-adịghị anyị mkpa. Ekwensu si otú a anwa anyị mgbe niile inweta ihe ndị dị anyị mma n’anya, ihe ndị na-atọ anyị ụtọ igere na ihe ndị obi anyị chọrọ. Ma ọ bụrụ na anyị ezere ikiri, igere, ma ọ bụ ịgụ ihe ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, ihe anyị na-eme bụ ịsị Ekwensu: “Si ebe a pụọ, Setan!” Anyị sikwa otú a na-eṅomi Jizọs n’ịjụwapụ isi ịnakwere ụwa Setan nke rụrụ arụ. Ihe ọzọ na-egosikwa na anyị abụghị akụkụ nke ụwa Setan bụ otú anyị si akata obi eme ka a mara na anyị bụ Ndịàmà Jehova na ndị na-eso ụzọ Kraịst n’ebe anyị na-arụ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ anyị, n’ebe anyị bi, nakwa mgbe anyị na ndị ikwu anyị nọ.—Gụọ Mak 8:38.

15. Gịnị mere iguzogide Setan ji chọọ ka anyị mụrụ anya mgbe niile?

15 Mgbe Ekwensu kụchara afọ n’ala na nke ugbo atọ ọ nwara Jizọs ka ọ kwụsị ime uche Chineke, “Ekwensu wee hapụ ya.” (Mat. 4:11) Ma, Setan ebughị n’obi ịkwụsị ịnwa Jizọs n’ihi na a gwara anyị, sị: “Ya mere, mgbe Ekwensu nwasịrị ya ọnwụnwa ahụ niile [n’ịkpa], o si n’ebe ọ nọ pụọ ruo oge ọzọ ga-adaba adaba.” (Luk 4:13) Mgbe anyị guzogideliri Ekwensu, anyị kwesịrị ikele Jehova. Ma anyị kwesịkwara ịrịọ Chineke ka ọ nọgide na-enyere anyị aka n’ihi na Ekwensu ga-abịa ịnwa anyị mgbe ọzọ ga-adịrị ya mma—ọ bụghịkwa mgbe anyị tụrụ anya na ọ ga-abịa ịnwa anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịmụrụ anya mgbe niile, dịrị njikere ịnọgide na-ejere Jehova ozi dị nsọ n’agbanyeghị ụdị ọnwụnwa ga-abịara anyị.

16. Olee ikike dị nnọọ ike Jehova na-enye anyị, gịnịkwa mere anyị ji kwesị ịdị na-ekpe ekpere maka ya?

16 Ka anyị wee nwee ike iguzogideli Ekwensu, anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ikike kachanụ e nwere n’eluigwe na ụwa, bụ́ mmụọ nsọ Chineke, anyị ga-enwetakwa ya. Mmụọ nsọ a ga-enyere anyị aka ime ihe ndị anyị na-agaghị emeli n’ike anyị. Jizọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na ha ga-enwetali mmụọ nsọ Chineke mgbe o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!” (Luk 11:13) Ka anyị nọgide na-arịọ Jehova n’ekpere ka o nye anyị mmụọ nsọ ya. Anyị ga-eguzogideli Ekwensu ma ọ bụrụ na ikike a kachanụ enyere anyị aka. E wezụga ikpechi ekpere anya, anyị kwesịkwara iyiri ekike agha ime mmụọ zuru ezu nke si n’aka Chineke, iji wee nwee ike “iguzosi ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu.”—Efe. 6:11-18.

17. Olee ọṅụ nyeere Jizọs aka iguzogide Ekwensu?

17 E nwere ihe ọzọ nyeere Jizọs aka iguzogide Ekwensu, ihe ahụ nwekwara ike inyere anyị aka. Baịbụl na-ekwu, sị: “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu [Jizọs], o diri osisi ịta ahụhụ, leghara ihere anya, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.” (Hib. 12:2) Anyị nwere ike inwe ọṅụ yiri nke a site n’ịkwado ọchịchị Jehova, ịsọpụrụ aha ya, na iburu olileanya nke inweta ndụ ebighị ebi n’uche. Leedị ụdị ọṅụ anyị ga-enwe mgbe a ga-ekpochapụ Setan na ọrụ ya niile ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ, “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” (Ọma 37:11) N’ihi ya, nọgide na-eguzogide Ekwensu, dị ka Jizọs mere.—Gụọ Jems 4:7, 8.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee ihe na-egosi na Jehova na-echebe ndị ya?

• Olee otú Jizọs si setịpụ ezi ihe nlereanya n’iguzogide Setan?

• Olee ụzọ ndị i nwere ike isi guzogide Ekwensu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 29]

Anyị ga-abụ ndị iro Chineke ma ọ bụrụ na anyị abụrụ ndị enyi ụwa

[Foto dị na peeji nke 31]

Jizọs ekweghị anara alaeze niile nke ụwa nke Setan kwere nkwa inye ya