Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nyere Ha Aka Ịlọghachi n’Egbughị Oge!

Nyere Ha Aka Ịlọghachi n’Egbughị Oge!

Nyere Ha Aka Ịlọghachi n’Egbughị Oge!

“Ònye ka anyị ga-alakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.”—JỌN 6:68.

1. Olee ihe Pita kwuru mgbe ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jizọs kwụsịrị iso ya?

E NWERE otu oge ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst kwụsịrị iso ya n’ihi na ha ekwetaghị otu n’ime ihe ndị ọ kụziri. Jizọs jụrụ ndịozi ya, sị: “Unu onwe unu, ùnu chọkwuru ịla?” Pita zara ya, sị: “Onyenwe anyị ònye ka anyị ga-alakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:51-69) Oleekwanụ ebe ha ga-aga? Okpukpe ndị Juu oge ahụ enweghị “okwu nke ndụ ebighị ebi,” ọ dịghịkwa taa na Babịlọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ma, ugbu a bụ oge onye ọ bụla nke sirila n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo ma ka chọọ ime ihe na-amasị Jehova ‘ga-eteta n’ụra’ ma lọghachi n’ìgwè atụrụ Chineke.—Rom 13:11.

2. Olee ihe e kwesịrị iburu n’uche banyere ihe ndị onye na-adịghị ejekwa ozi na-ekwesịghị ịma ma ọ bụ banyere okwu e kwesịrị ihiwere òtù ikpe?

2 Jehova gosiri na ya na-eche banyere atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel. (Gụọ Ezikiel 34:15, 16.) Otú ahụkwa ka o si agụ ndị okenye agụụ inyere onye ọ bụla yiri atụrụ nke siri n’ìgwè atụrụ ahụ kpafuo aka, inyere atụrụ dị otú a aka bụkwa ọrụ dịịrị ha. Ọ bụrụ na ha agwa onye nkwusa ka ọ gaa mụwara onye na-adịghị ejekwa ozi nke chọrọ enyemaka ihe, gịnị ka e kwesịrị ime ma ọ bụrụ na onye nkwusa ahụ achọpụta na onye ahụ emeela mmehie dị oké njọ? Kama ịga nyewe onye ahụ ndụmọdụ n’okwu kwesịrị ka e hiwere ya òtù ikpe ma ọ bụ gaa kọwara ya ihe ọ na-ekwesịghị ịma, onye nkwusa ahụ kwesịrị ịgwa ya ka ọ gaa kọọrọ ndị okenye. Ọ bụrụ na ọ gaghị, onye nkwusa ahụ kwesịrị ịga gwa ndị okenye n’onwe ya.—Lev. 5:1; Gal. 6:1.

3. Olee otú obi dị nwoke ahụ nwere otu narị atụrụ mgbe ọ chọtara otu nke furu efu?

3 N’isiokwu bu nke a ụzọ, a kpọtụrụ uche n’ihe atụ Jizọs nyere banyere nwoke nwere otu narị atụrụ. Mgbe ọ chọpụtara na otu akpafuola, ọ hapụrụ iri itoolu na itoolu ndị ọzọ ma gawa ịchọ nke ahụ furu efu. Nwoke ahụ nwere nnọọ obi ụtọ mgbe ọ chọtara ya! (Luk 15:4-7) Otú ahụ ka obi na-adị anyị mgbe otu n’ime atụrụ Chineke kpafuru akpafu lọghachiri n’ìgwè atụrụ ya. Eleghị anya, ndị okenye na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ gara leta ya n’ihi otú ha si hụ ya n’anya. Ha onwe ha chọkwara ka onye ahụ lọghachi n’ìgwè atụrụ Chineke ma nweta enyemaka ya, nchebe ya, na ngọzi ya. (Diut. 33:27; Ọma 91:14; Ilu 10:22) Gịnị ka ha nwere ike ime ma ọ bụrụ na e nwere onye ha kwesịrị inyere aka ịlọghachi n’ìgwè atụrụ Chineke?

4. Olee otú e nwere ike isi ghọta Ndị Galeshia 6:2, 5?

4 Ikekwe ha nwere ike ịgba onye ahụ ume ịlọghachi n’ọgbakọ site n’iji obiọma mee ka ọ mara na Jehova hụrụ atụrụ Ya n’anya, nakwa na ihe ọ na-achọ anyị n’aka bụ naanị ihe ndị anyị ga-emeli. Ihe ndị a gụnyere ịmụ Akwụkwọ Nsọ, ịga ọmụmụ ihe, na ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. E nwere ike ịgụrụ ya Ndị Galeshia 6:2, 5 ma kwuo na Ndị Kraịst nwere ike ibutụrụ ibe ha ibu na-anyị ha, ma “onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya” mgbe a bịara n’ihe metụtara ofufe. Ọ bụghị onye ọzọ ga-efechitere anyị Chineke.

Ọ̀ Bụ “Nchegbu nke Ndụ” Mere Ha Ji Jụọ Oyi?

5, 6. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị ṅaa ntị nke ọma mgbe ndị kwere ekwe ibe anyị kwụsịrịla ije ozi na-ekwu otú ọ dị ha n’obi? (b) Olee otú i nwere ike isi nyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka ịghọta na ịkwụsị ịbịa ọmụmụ ihe na-emebiri ha ihe?

5 Ndị okenye na ndị nkwusa nwerela ahụmahụ kwesịrị ige ntị nke ọma mgbe ndị kwere ekwe ibe ha kwụsịrịla ije ozi na-ekwu otú ọ dị ha n’obi iji nwee ike mara otú ha ga-esi nyere ha aka. Ka e were ya na ị bụ okenye nke gara ileta di na nwunye na-adịghị abịakwa ọmụmụ ihe n’ihi “nchegbu nke ndụ.” (Luk 21:34) E nwere ike ihe kpatara nke a bụ ụkọ ego ma ọ bụ n’ihi na ha enwekwuola ibu ha na-ebu n’ezinụlọ ha. Ọ ga-abụ na ihe mere ha ji kwụsị ịga ọmụmụ ihe bụ na ha chere na nke a ga-eme ka ibu dịtụrụ ha mfe, ma i nwere ike ịgwa ha na ịgha ọmụmụ ihe agaghị enyere ha aka. (Gụọ Ilu 18:1.) I nwere ike iji akọ jụọ ha, sị: “Ùnu enwekwuolanụ obi ụtọ kemgbe unu kwụsịrị ịbịa ọmụmụ ihe? Ezinụlọ unu ọ̀ kakwuolanụ mma? Ọṅụ Jehova ọ̀ ka bụ ebe unu e wusiri ike?”—Nehe. 8:10.

6 Ichebara ajụjụ ndị a echiche nwere ike inyere ha aka ịghọta na ịkwụsị iso ọgbakọ akpa emeela ka mmekọrịta ha na Jehova ghara isikwa ike, meekwa ka ha ghara ịdị na-enwe obi ụtọ otú ha na-enwebu. (Mat. 5:3; Hib. 10:24, 25) E nwekwara ike inyere ha aka ịghọta na ịghara ikwusa ozi ọma emeela ka ha kwụsị inwe ọṅụ. (Mat. 28:19, 20) Oleezi ihe ha kwesịrị ime?

7. Olee ihe anyị nwere ike ịgba ndị sirila n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo ume ka ha mee?

7 Jizọs kwuru, sị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu . . . Ya mere, mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike mgbe niile ka unu wee nwee ike ịgbanahụ ihe ndị a niile a kara aka na ha ga-eme.” (Luk 21:34-36) E nwere ike ịgba ndị sirila n’ìgwè atụrụ ahụ kpafuo ma ka chọọ inweghachi ụdị ọṅụ ha na-enwebu ume ka ha kpee ekpere maka mmụọ nsọ na enyemaka Chineke, gbaakwa ha ume ka ha mee ihe kwekọrọ n’ekpere ha.—Luk 11:13.

Ọ̀ Ga-abụ na Ọ Dị Onye Mere Ha Ji Sụọ Ngọngọ?

8, 9. Olee ihe ndị onye okenye nwere ike ịgwa onye kwụsịrị ijere Jehova ozi n’ihi ihe onye ọzọ nọ n’ọgbakọ mere?

8 Ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ ezughị okè, e nwere ike inwe nghọtahie, nke a nwekwara ike ime ka mmadụ sụọ ngọngọ. Ụfọdụ ahapụla ọgbakọ mgbe onye a na-akwanyere ùgwù n’ọgbakọ mere ihe na-adịghị mma. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe dị otú a mere onye a ji kwụsị ije ozi, okenye ahụ gara ileta ya nwere ike ịgwa ya na Jehova adịghị eme ka mmadụ sụọ ngọngọ. N’ihi ya, gịnị mere mmadụ ga-eji hapụ Chineke na ndị Ya? Kama ime otú ahụ, ó kwesịghị ịnọgide na-ejere Chineke ozi, nwee obi ike na “onyeikpe nke ụwa dum” maara ihe merenụ nakwa na ọ ga-edozi okwu ahụ otú ka mma? (Jen. 18:25; Kọl. 3:23-25) Ọ bụrụ na mmadụ azọhie ụkwụ ma daa ada, ọ gaghị ama ama nọrọ n’ala ebe ahụ, ọ ga-achọ otú ọ ga-esi bilie.

9 Iji nyere onye ahụ aka ịlọghachi, onye okenye nwere ike ịgwa ya na ka oge na-aga, ụfọdụ na-achọpụta na ihe ahụ mere ha ji kwụsị ije ozi na-abịa yie ka ọ dịghịzi ihe ọ bụ. N’ezie, e nwere ike ihe ahụ mere ha ji kwụsị ife Jehova adịghịzi. Ọ bụrụ na ọ bụ aka ná ntị a dọrọ onye ahụ mere o ji kwụsị ijere Jehova ozi, ikpe ekpere na ichebara ihe merenụ echiche nwere ike ime ka o kwubie na aka ná ntị ahụ a dọrọ ya kwesịdịịrị ya nakwa na ya agaraghị ekwe ka nke a mee ka ya kwụsị ijere Jehova ozi.—Ọma 119:165; Hib. 12:5-13.

Ọ̀ Ga-abụ Ihe Ụfọdụ A Kụziri Mere Ha Ji Pụọ?

10, 11. Olee ihe i nwere ike ikwu ka ị na-agbalị inyere ndị na-ekwetechaghị n’otú e si kọwaa nkụzi Baịbụl ụfọdụ?

10 E nwere ike ihe mere ụfọdụ ji hapụ ìgwè atụrụ Chineke bụ n’ihi na ha ekwetaghị ihe ụfọdụ a kụziri site n’Akwụkwọ Nsọ. Ndị Izrel a tọhapụrụ n’agbụ n’Ijipt “chefuru ọrụ [Chineke]” rụụrụ ha, ‘ha echereghịkwa ndụmọdụ ya.’ (Ọma 106:13) Ichetara onye ahụ na “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-enye nri ime mmụọ ndị na-edozi ahụ́ nwere ike inyere ya aka. (Mat. 24:45) Ọ bụ ná nri a ha na-enye ka onye ahụ si mụta eziokwu ahụ ná mmalite. Gịnịzi mere ọ gaghị ejisi ike maliteghachi ije ije n’eziokwu ahụ?—2 Jọn 4.

11 Mgbe okenye na-agbalị inyere ndị siri n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo aka, o nwere ike ịkọrọ ha banyere ndị na-eso ụzọ ahụ hapụrụ Jizọs n’ihi na ha ekwetaghị otu n’ime ihe ndị ọ kụziri. (Jọn 6:53, 66) Ịhapụ Kraịst na ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi mere ka ha kwụsị inwe mmasị n’ihe ime mmụọ, meekwa ka ha gharazie inwe ọṅụ. Ndị a kwụsịrị iso ọgbakọ na-akpakọrịta hà achọtalanụ ebe ọzọ a na-enye nri ime mmụọ mara abụba? Mba, n’ihi na e nweghị ebe ọzọ!

Ọ̀ Ga-abụ na Ha Mere Mmehie Dị Oké Njọ?

12, 13. Ọ bụrụ na onye sirila n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo ekwupụta na ya emeela mmehie dị oké njọ, olee otú e nwere ike isi nyere ya aka?

12 Ihe mere ụfọdụ ji kwụsị ịga ozi ọma na ọmụmụ ihe bụ n’ihi na ha emeela mmehie dị oké njọ. Ha nwere ike iche na ọ bụrụ na ha agwa ndị okenye ihe ha mere, a ga-achụpụ ha n’ọgbakọ. Ma a gaghị achụ ha n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ha akwụsị omume ahụ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị ma jiri obi ha niile chegharịa. (2 Kọr. 7:10, 11) Kama ịchụ ha, a ga-anabataghachi ha, ndị okenye ga-enyekwara ha aka ka ha na Chineke dịghachi ná mma, nke bụ́ ihe dị ha mkpa.

13 Ọ bụrụ na ị bụ onye nkwusa tozuru okè a gwara gaa nyere onye na-adịkwaghị eje ozi aka, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ gwa gị na ya emeela mmehie dị oké njọ? Dị ka e buru ụzọ kwuo, kama ịgawa n’ihu n’okwu ahụ, tụọrọ ya aro ka ọ gakwuru ndị okenye. Ọ bụrụ na ọ chọghị ịga, ị ga-egosi na ị na-eche banyere aha Jehova na ọdịmma nke ọgbakọ site n’ime ihe Chineke kwuru ka e mee banyere okwu ndị dị otú ahụ. (Gụọ Levitikọs 5:1.) Ndị okenye ga-ama otú ha ga-esi enyere onye ọ bụla chọrọ ịlọghachi ma maliteghachi ime uche Chineke aka. O nwere ike ịdị mkpa ka e jiri ịhụnanya dọọ onye ahụ aka ná ntị. (Hib. 12:7-11) Ọ bụrụ na onye ahụ aghọta na ya emehiela Chineke, kwụsị ime ihe ahụ, ma jiri obi ya niile chegharịa, ndị okenye ga-enyere ya aka, Jehova nwekwara ike ịgbaghara ya.—Aịza. 1:18; 55:7; Jems 5:13-16.

E Nwee Ọṅụ n’Ihi Otu Nwa Nwoke Lọghachirinụ

14. N’okwu nke aka gị, kọọ ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere nwa mmefu.

14 Mgbe a na-achọ inyere atụrụ kpafuru akpafu aka, onye a gwara ka o nyere ya aka nwere ike ịkpọtụ uche n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere, bụ́ nke e dekọrọ na Luk 15:11-24. N’ihe atụ ahụ, otu nwa okorobịa rikpọrọ ihe nketa ya site n’ibi ndụ rụrụ arụ. N’ikpeazụ, ọ bịara kpọọ ndụ ịla n’iyi ahụ ọ na-ebi asị. Ezigbo agụụ ji ya, ọ gụsiri ya ike ịlaghachi n’ụlọ ha, o kpebiekwala ịla! Mgbe ọ ka nọdị n’ebe dị anya, nna ya hụrụ ya, gbakwuru ya ma dakwasị ya n’olu, jiri nwayọọ susuo ya ọnụ, obi jupụtakwara ya n’aṅụrị. Ịtụgharị uche n’ihe atụ a nwere ike ime ka onye sirila n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo lọghachi. Ebe ọ bụ na a gaje ibibi usoro ihe a n’oge na-adịghị anya, o kwesịrị ‘ịlọghachịkwute’ Jehova n’egbughị oge.

15. Gịnị mere ụfọdụ ji apụ n’ọgbakọ?

15 Ọtụtụ ndị hapụrụ ọgbakọ adịchaghị ka nwa mmefu ahụ. Ụfọdụ jiri nwayọọ nwayọọ pụọ, dị nnọọ ka ụgbọ mmiri furu ụzọ si jiri nke nta nke nta bamikwuo ná mmiri. Ndị ọzọ na nchegbu nọ nnọọ na-alụ nke na ha leghaara mmekọrịta ha na Jehova anya. Ma ndị ọzọkwa kwere ka ihe onye nọ n’ọgbakọ mere mee ka ha pụọ n’ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ ihe mere ha ji pụọ bụ n’ihi na ha ekwetaghị n’otu ihe a kụziri site n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụ ole na ole kpara àgwà Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Ma, ihe ndị e kwuru e nwere ike ime na nke ọ bụla n’ọnọdụ ndị a nwere ike inyere gị aka ịma otú ị ga-esi nyere ndị sirila n’ìgwè atụrụ Chineke pụọ n’ihi ihe ndị a ma ọ bụ n’ihi ihe ndị ọzọ aka tupu oge agwụnahụ ha.

“Ị̀ Lọla, Nwa M?”

16-18. (a) Olee otú otu okenye siri nyere otu nwanna kwụsịrịla ije ozi kemgbe ọtụtụ afọ aka? (b) Gịnị mere nwanna a ji kwụsị ije ozi, olee otú e si nyere ya aka, oleekwa otú ọgbakọ si mesoo ya mgbe ọ lọghachiri?

16 Otu okenye ọgbakọ kwuru, sị: “Ọ na-amasịkarị ndị okenye ọgbakọ anyị ịga leta ndị na-adịghị ejekwa ozi. M chetara otu nwanna nwoke m mụụrụ ihe ma nyere aka ịghọta eziokwu ahụ. O ruola ihe dị ka iri afọ abụọ na ise ọ kwụsịrịla ije ozi, ihe na-esikwara ya ike, n’ihi ya, m kọwaara ya otú ime ihe ndị e kwuru na Baịbụl nwere ike isi nyere ya aka. Ka oge gatụrụ, o bidoro bịawa ọmụmụ ihe ma kweta ka a bịa na-amụrụ ya ihe ka mkpebi ya ịlọghachi n’ìgwè atụrụ ahụ wee nwee ike isikwu ike.”

17 Gịnị mere nwanna ahụ ji kwụsị ije ozi? O kwuru, sị: “Amalitere m ibute ihe nke ụwa ụzọ kama mmekọrịta mụ na Jehova. M bịaziri kwụsị ịmụ ihe, kwụsịkwa ịga oziọma na ọmụmụ ihe. Tupu mụ amara ihe na-emenụ, akwụsịrị m iso ọgbakọ na-akpakọrịta. Ma ihe nyeere m aka ịlọghachi bụ otú okenye ahụ si gosi nnọọ mmasị n’ebe m nọ.” Nsogbu nwanna nwoke a kwụsịlatara mgbe o kwetara ka a bịa mụwara ya ihe. Ọ sịrị, “Abịara m ghọta na adịghịzi m enweta ịhụnanya na nduzi Jehova na nke nzukọ ya.”

18 Olee otú e si mesoo nwanna nwoke a mgbe ọ lọghachiri n’ọgbakọ? O kwuru, sị: “Ọ dị m otú ahụ ọ dị nwa mmefu ahụ Jizọs Kraịst kwuru okwu ya. N’ezie, otu nwanna nwaanyị merela agadi, bụ́ onye nọ n’ọgbakọ anyị kemgbe afọ iri atọ gara aga ma ka jiri obi ya niile na-ejere Jehova ozi, sịrị m, ‘Ị̀ lọla, nwa m?’ Ihe a o kwuru ruru m nnọọ n’obi. N’eziokwu, alọla m. M na-ekelekwa nnọọ okenye ahụ na ụmụnna m niile nọ n’ọgbakọ maka otú ha si gosi m na ha hụrụ m n’anya, otú ha siri nabata m, jiri ndidi nyere m aka, ma gosi m na ha nwere mmasị n’ebe m nọ. Otú ha si hụ Jehova na mmadụ ibe ha n’anya nyeere m aka ịlọghachi n’ìgwè atụrụ Chineke.”

Gwa Ha Ka Ha Mee Ngwa Ngwa Lọghachi!

19, 20. Olee otú i nwere ike isi gbaa ndị kwụsịrịla ijere Jehova ozi ume ịlọghachi n’ìgwè atụrụ Chineke n’egbughị oge, oleekwa otú ị ga-esi gosi ha na Chineke adịghị atụ anya ihe anyị na-agaghị emeli n’aka anyị?

19 Anyị bi n’ụbọchị ikpeazụ, ụwa ochie a gajekwa ịgwụ n’oge na-adịghị anya. N’ihi ya, gbaa ndị kwụsịrịla ijere Jehova ozi ume ka ha bịawa ọmụmụ ihe. Gwa ha malite ozugbo. Chetara ha na Setan na-achọ imebi mmekọrịta ha na Chineke ma mee ka ha chewe na nsogbu ha na-enwe ná ndụ a ga-ebi ma ha kwụsị ife Jehova. Mee ka obi sie ha ike na ha ga-enweta ezigbo ume ọhụrụ naanị ma ha nọgide jiri obi ha niile na-eso Jizọs.—Gụọ Matiu 11:28-30.

20 Chetara ha na Chineke chọrọ ka anyị na-eme ike anyị. Mgbe a baara Meri nwanne Lazarọs mbá na ọ na-emefusi ego mgbe ọ wụrụ Jizọs mmanụ dara oké ọnụ n’isi, obere oge tupu Jizọs anwụọ, Jizọs sịrị: “Hapụnụ ya. . . . O mere ihe o nwere ike ime.” (Mak 14:6-8) Jizọs toro nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke na-enweghị ka ọ hà ya, bụ́ onye nyere obere onyinye n’ụlọ nsọ. Nwaanyị ahụ mekwara ihe o nwere ike ime. (Luk 21:1-4) Ọtụtụ n’ime anyị nwere ike ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Site n’enyemaka Jehova, ọtụtụ n’ime ndị na-adịghị ejekwa ozi ugbu a nwekwara ike ime ihe ndị a.

21, 22. Olee ihe ndị ị ga-eme ka obi sie ndị lọghachikwutere Jehova ike na ha ga-enweta?

21 Ọ bụrụ na onye yiri atụrụ nke siri n’ìgwè atụrụ Chineke kpafuo na-atụ egwu ihe ụmụnna ga-eme ma ya lọghachikwute ha, i nwere ike ichetara ya ọṅụ e nwere mgbe nwa mmefu ahụ laghachiri n’ụlọ ha. Ndị na-alọghachi n’ọgbakọ na-emekwa ka e nwee ụdị ọṅụ ahụ. Gbaa ha ume ka ha mee ihe ugbu a iji guzogide Ekwensu ma bịaruo Chineke nso.—Jems 4:7, 8.

22 A ga-eji ọṅụ anabata ndị na-alọghachikwute Jehova. (Ákwá 3:40) O doro anya na ha nwere obi ụtọ dị ukwuu n’oge ndị ahụ ha jeere Chineke ozi. Ndị lọghachiri n’ìgwè atụrụ Chineke ugbu a n’egbughị oge ga-enweta ọtụtụ ngọzi n’ọdịnihu!

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú i nwere ike isi nyere Onye Kraịst kwụsịrị ije ozi n’ihi ihe onye nọ n’ọgbakọ mere aka?

• Olee ihe ndị nwere ike inyere onye hapụrụ ìgwè atụrụ Chineke n’ihi na otú o chere e kwesịrị isi kụzie ihe abụghị otú e si kụzie ya aka?

• Olee otú e nwere ike isi nyere onye na-ala azụ ịlọghachi n’ọgbakọ aka?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Gee ntị nke ọma mgbe onye kwere ekwe ibe gị kwụsịrịla ijere Jehova ozi na-ekwu otú ọ dị ya n’obi

[Foto dị na peeji nke 15]

Icheta ihe atụ Jizọs nyere banyere nwa mmefu ahụ nwere ike ịkpali ụfọdụ ịlọghachi n’ìgwè atụrụ Chineke