Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụdị Onye Ị Chọrọ Ịbụ?

Olee Ụdị Onye Ị Chọrọ Ịbụ?

Olee Ụdị Onye Ị Chọrọ Ịbụ?

ONYEISI ndị uwe ojii nke otu obodo dị na Philippines jụrụ otu onye ọsụ ụzọ, sị, “Gịnị ka i mere nwoke a o ji gbanwee?” Nwoke ahụ tụrụ aka n’ùkwù akwụkwọ dị n’elu tebụl ya wee kwuo, sị: “Ị̀ maara na akwụkwọ a niile bụ akwụkwọ ikpe ndị e kpere ya n’oge gara aga? I wepụrụla anyị otu n’ime ndị na-akpatara anyị isi ọwụwa n’obodo a.” Nwoke a na-ekwu okwu ya ihe a bụbu onye aṅụrụma nke na-alụkarị ọgụ. Gịnị kpaliri nwoke a ime nnukwu mgbanwe ná ndụ ya? Ọ bụ Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee, bụ́ Baịbụl.

Ọtụtụ ndị amalitela ime ihe a Pọl onyeozi dụrụ n’ọdụ ka ha ‘yipụ mmadụ ochie ahụ, nke kwekọrọ n’ụzọ ha si eme omume n’oge gara aga ma yiri mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị.’ (Efe. 4:22-24) Ma mgbanwe ndị ọ dị mkpa ka anyị mee hà buru ibu ma hà dị obere, iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ so n’ihe anyị ga-emerịrị iji gosi na anyị aghọọla ndị na-eso ụzọ Kraịst.

Ma, anyị ime mgbanwe ná ndụ anyị ma nwee ọganihu ruo n’ókè ime anyị baptizim bụ naanị mmalite. Mgbe anyị bịara ka e mee anyị baptizim, anyị dị ka osisi a maliterela iji na-apị otu ihe. I lee ihe ahụ a na-apị anya, ị ga-amatatụwa ihe onye ahụ na-apị ihe chọrọ ịpị, ma ọrụ a ka ga-arụ na ya hiri nne. Ọ ka nwere ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ o kwesịrị ime iji mee ka ihe ahụ ọ na-apị maa mma. Mgbe e mere anyị baptizim, anyị na-akpa àgwà ndị bụ́ isi a chọrọ ka ohu Chineke ọ bụla na-akpa. Ma, anyị ka yiiri mmadụ ọhụrụ ahụ eyiri. Anyị kwesịrị ịnọgide na-eme ka ọ ka mma site n’ime mgbanwe ná ndụ anyị.

Ọbụna Pọl n’onwe ya hụrụ mkpa ọ dị ịnọgide na-eme ka àgwà ya ka mma. O kwuru, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.” (Rom 7:21) Pọl maara ụdị onye ya onwe ya bụ na ụdị onye ọ chọrọ ịbụ. Oleekwanụ maka anyị? Anyị kwesịkwara ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee ihe dị n’ebe m nọ? Olee ụdị onye m bụ? Oleekwa ụdị onye m chọrọ ịbụ?’

Olee ‘Ihe Dị n’Ebe M Nọ’?

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịrụgharị ụlọ merela ochie, i were ágbá tee n’ahụ́ ụlọ ahụ ma hapụ osisi ndị rerela ure dị n’ime ya agaghị aba uru ọ bụla. Ọ bụrụ na e leghara ihe ndị ahụ anya, nsogbu ga-adị. N’otu aka ahụ, mmadụ ime ka ọ̀ bụ onye ezi omume ezughị. Anyị kwesịrị inyocha onwe anyị nke ọma ma chọpụta ebe ndị anyị kwesịrị imezi. Ma ọ́ bụghị ya, àgwà ochie ndị anyị nweburu ga-eselite isi. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka mmadụ nyochaa onwe ya. (2 Kọr. 13:5) Ọ dị mkpa na anyị ga-achọpụta àgwà ndị na-adịghị mma anyị nwere ma hapụ ha. Jehova nyere anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ime nke a.

Pọl dere, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla, ọ na-amabakwa ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị ha, o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ihe mmadụ bu n’obi.” (Hib. 4:12) Okwu Chineke e dere ede, bụ́ Baịbụl, na-agbanwe ndụ ndị mmadụ n’ụzọ na-atụ n’anya. Ọ na-eru n’ala ala obi anyị, ya bụ, n’ụmị ọkpụkpụ. Ọ na-ekpughe ihe anyị na-eche n’echiche na ihe kpaliri anyị ime ihe, mee ka a mata ụdị onye anyị bụ n’ezie, ọ bụghị ụdị onye anyị na-eme ka ndị mmadụ chee na anyị bụ, ma ọ bụ ụdị onye anyị chere na anyị bụ. Lee nnọọ otú Okwu Chineke si enyere anyị aka ịghọta ihe bụ́ nsogbu ndị anyị nwere!

Mgbe anyị na-arụzi ụlọ ochie, e nwere ike naanị ịgbanwe ihe ndị mebiri emebi n’ụlọ ahụ agaghị ezu. Ịmata ihe kpatara ihe ndị ahụ ji mebie ga-enye aka mee ka ha ghara imebikwa ọzọ. N’otu aka ahụ, ihe ka mkpa abụghị naanị ịmata àgwà ọjọọ ndị anyị nwere kama, ịmata ihe mere anyị ji akpa àgwà ndị ahụ ma ọ bụ ihe na-eduba anyị na ha, ga-enyere anyị aka izere ime ha. E nwere ọtụtụ ihe na-ekpebi ụdị onye anyị ga-abụ. Ha gụnyere ọkwá anyị, ebe anyị nweruru ego, ụdị ebe anyị nọ too, omenala anyị, ndị mụrụ anyị, ndị enyi anyị, na okpukpe anyị. Ọbụnadị ụdị ihe ndị anyị na-ekiri na televishọn na ụdị fim ndị anyị na-ekiri, nakwa ụdị egwuregwu ma ọ bụ egwú ndị anyị na-ege, socha ekpebi ụdị onye anyị ga-abụ. Ịchọpụta ihe ndị na-akpali anyị ịkpa àgwà ndị na-ezighị ezi ga-enyere anyị aka izere ịkpa ụdị àgwà ndị a.

Mgbe anyị nyochachara onwe anyị, anyị nwere ike ikwu sị, ‘Ọ bụ otú ahụ ka e si kee m.’ Echiche dị otú a ezighị ezi. Mgbe Pọl na-ekwu okwu banyere ndị nọ n’ọgbakọ dị na Kọrịnt, ndị bụbu ndị na-akwa iko, ndị ikom na-ekwe ka ndị ikom dinaa ha, ndị aṅụrụma, na ihe yiri ha, ọ sịrị: “Nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu. Ma a sachawo unu . . . site ná mmụọ nke Chineke anyị.” (1 Kọr. 6:9-11) Mmụọ nsọ Jehova nwekwara ike inyere anyị aka ime mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ anyị.

Ka anyị tụlee ihe banyere otu nwoke aha ya bụ Marcos, * onye bi na Philippines. Marcos kwuru banyere ezinụlọ a mụrụ ya, sị: “Nne m na nna m na-arụkarị ụka. Ọ bụ nke a mere m ji ghọọ nwa nnupụisi mgbe m dị afọ iri na itoolu.” Marcos bịara ghọọ onye ịgba chaa chaa riri ahụ́, na-ezu ohi, ma na-eji égbè apụnara ndị mmadụ ihe. Ya na ụfọdụ ndị ọzọ nọ na-eme atụmatụ otú ha ga-esi tọrọ otu ụgbọelu, ma nkata ahụ ha kpara mechara kụọ afọ n’ala. Marcos nọgidere na-ebi ndụ ọjọọ a ọbụna ka ọ lụchara nwaanyị. Ihe niile o nwere mechara funahụ ya ebe ọ na-agba chaa chaa. Obere oge ka e mechara, Marcos sonyeere nwunye ya n’ọmụmụ Baịbụl ya na Ndịàmà Jehova na-enwe. Ná mbụ, ọ dị ya ka ya erughị eru ịbụ Onyeàmà Jehova. Ma ka Marcos malitere ime ihe ndị ọ na-amụta ma na-aga ọmụmụ ihe, o bidoro hapụwa àgwà ọjọọ ndị ahụ ọ na-akpabu. Ugbu a ọ bụzi Onye Kraịst e mere baptizim nke na-agachi ozi ọma anya, na-akụziri ndị ọzọ otú ha onwe ha ga-esi gbanwee ndụ ha.

Olee Ụdị Onye Ị Chọrọ Ịbụ?

Olee mgbanwe ndị o nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee iji mezikwuo àgwà ndị e ji mara anyị dị ka Ndị Kraịst? Pọl dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Wepụnụ ha niile n’ebe unu nọ, ya bụ, ọnụma, iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị, wepụkwanụ okwu rụrụ arụ n’ọnụ unu. Unu adịla na-aghara ibe unu ụgha. Yipụnụ mmadụ ochie ahụ na omume ya.” Onyeozi ahụ kwukwara, sị: “Yirinụ mmadụ ọhụrụ ahụ, nke a na-esite n’ezi ihe ọmụma na-eme ka ọ dị ọhụrụ dị ka onyinyo nke Onye ahụ kere ya si dị.”—Kọl. 3:8-10.

N’ihi ya, ihe mgbaru ọsọ anyị bụ́ isi kwesịrị ịbụ iyipụ mmadụ ochie ahụ ma yikwasị nke ọhụrụ. Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ime nke a? Pọl kwuru, sị: “Yirinụ obi ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi, dị ka uwe. Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ. Ma, e wezụga ihe ndị a niile, yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Kọl. 3:12-14) Ịgbalịsi ike ịdị na-akpa àgwà ndị a ga-enyere anyị aka ịbụ ndị ihe ha “na-adịwanye ma Jehova ma mmadụ mma.” (1 Sam. 2:26) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o mere nnọọ omume ndị gosiri na ọ na-asọpụrụ Chineke. Site n’ịmụ banyere ya na iṅomi ya, anyị ga-adị ka Kraịst ma bụrụ ndị “na-eṅomi Chineke.”—Efe. 5:1, 2.

Ụzọ ọzọ anyị si amata mgbanwe ndị anyị kwesịrị ime bụ site n’ịmụ banyere àgwà mmadụ ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl kpara, chebara àgwà ọma na àgwà ọjọọ ha echiche. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere Josef, nwa nna ochie ahụ bụ́ Jekọb. N’agbanyeghị mmeso ọjọọ ndị e mesoro Josef, ọ nọgidere na-enwe obi ụtọ ma na-akpa àgwà dị mma. (Jen. 45:1-15) N’aka nke ọzọ, nwa Eze Devid bụ́ Absalọm mere ka ihe banyere ndị Izrel ọ̀ na-echu ya ụra, nke a mekwara ka ndị mmadụ too ya na ọ bụ nwoke ọma. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ sabo nakwa ogbu mmadụ. (2 Sam. 13:28, 29; 14:25; 15:1-12) Mmadụ ime ka ọ̀ bụ ezigbo mmadụ na ịma mma ahụ́ adịghị eme ka onye ahụ bụrụ ezigbo mmadụ n’ezie.

Anyị Ga-emezili Àgwà Anyị

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịgbanwe àgwà ọjọọ anyị ma bụrụ ndị mara mma n’anya Chineke, ọ dị mkpa na anyị ga-echebara ụdị mmadụ anyị bụ n’ime echiche. (1 Pita 3:3, 4) Ịgbanwe ụdị mmadụ anyị bụ chọrọ anyị ịmata omume ọjọọ ndị anyị na-eme, mata ihe ndị na-akpali anyị ime ha, ma mụtakwa otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ndị ga-egosi na anyị na-asọpụrụ Chineke. Obi ò nwere ike isi anyị ike na anyị ga-agbanweli àgwà ọjọọ anyị ma ọ bụrụ na anyị agbalịa?

Ee, anyị ga-emeli mgbanwe ndị dị mkpa site n’enyemaka Jehova. Dị ka ọbụ abụ ahụ, anyị nwere ike ikpe ekpere, sị: “Chineke, biko, mee ka m nwee obi dị ọcha, tinyekwa mmụọ ọhụrụ, nke iguzosi ike, n’ime m.” (Ọma 51:10) Anyị nwere ike ịrịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ ya ka o nyere anyị aka ná mgbalị anyị na-eme ime ka ndụ anyị kwekọkwuo ná nzube ya. N’ezie, anyị ga-enwe ike ịmakwu mma n’anya Jehova!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ọ bụghị ezigbo aha ya.

[Foto dị na peeji nke 4]

Naanị ite ágbá n’ụlọ a ifufe mebiri ò zuola?

[Foto dị na peeji nke 5]

Àgwà gị ọ̀ dịla ka nke Kraịst?