Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Ga-anọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?

Ị̀ Ga-anọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?

Ị̀ Ga-anọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?

“Ruo mgbe m kubiri ume, m gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe!”—JOB 27:5.

1, 2. Olee ọrụ dị mkpa anyị kwesịrị ịmalite, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

KA E WERE ya na ị nọ na-ekiri ebe e sere otú a ga-esi rụọrọ gị ụlọ. Ihe ị hụrụ masịrị gị nnọọ. Obi amalite ịtọ gị nnọọ ụtọ ka ị na-eche otú ụlọ ahụ ga-esi abara gị na ezinụlọ gị uru. Í kweghị na ụlọ ahụ e sere ese na ihe ọ bụla ị nọ na-eche n’echiche agaghị aba uru ọ bụla ma ọ bụrụ na a rụghị ụlọ ahụ arụ, gị akwaba na ya, ma malite ilekọta ya?

2 N’ụzọ yiri nke ahụ, anyị nwere ike ile iguzosi ike n’ezi ihe anya dị ka ihe dị oké mkpa nke ga-abara anyị na ndị anyị hụrụ n’anya ezigbo uru. Ma iche banyere iguzosi ike n’ezi ihe agaghị abara anyị uru ọ bụla ọ gwụla ma anyị gbalịrị ghọọ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe ma nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe dị ka Ndị Kraịst kwesịrị ime. N’ụwa taa, iwu ụlọ na-efu ezigbo ego. (Luk 14:28, 29) N’otu aka ahụ, ọ na-ewe oge ma chọọkwa mgbalị iji bụrụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe, ma o ruru mgbalị ọ bụla e mere maka ya. Ya mere, ka anyị tụlee ajụjụ atọ: Olee otú anyị nwere ike isi ghọọ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe? Olee otú anyị nwere ike isi nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe dị ka Ndị Kraịst? Gịnị ka e nwere ike ime ma ọ bụrụ na mmadụ akwụsịtụ iguzosi ike n’ezi ihe?

Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Ghọọ Ndị Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?

3, 4. (a) Olee ụzọ ndị Jehova si enyere anyị aka ịghọ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe? (b) Olee otú anyị nwere ike isi ghọọ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe dị ka Jizọs?

3 Anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ na Jehova kwanyeere anyị ùgwù site n’ịhapụ anyị ka anyị jiri aka anyị kpebie ma ànyị ga-abụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ma ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na ọ na-enyere anyị aka ime mkpebi a. Ọ na-akụziri anyị otú anyị ga-esi ghọọ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe, ọ na-enyekwa anyị mmụọ nsọ ya n’ụba, bụ́ nke na-enyere anyị aka ime ihe ọ na-akụziri anyị. (Luk 11:13) Chineke na-echebekwa ndị na-agbalị ije ije n’iguzosi ike n’ezi ihe ka ihe ọ bụla ghara imebi adịm ná mma ha na ya.—Ilu 2:7.

4 Olee otú Jehova sirila kụziere anyị ịbụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe? Ụzọ kachanụ o si kụziere anyị nke a bụ site n’izite Ọkpara ya bụ́ Jizọs n’ụwa. Jizọs rubeere Nna ya isi n’ihe niile. O ‘rubere isi ruo ọnwụ.’ (Fil. 2:8) N’ihe niile Jizọs mere, o rubeere Nna ya nke eluigwe isi, ọbụna mgbe o siri ezigbo ike ime otú ahụ. Ọ gwara Jehova, sị: “Ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.” (Luk 22:42) Ọ ga-adị mma ka onye ọ bụla n’ime anyị jụọ onwe ya, sị, ‘M̀ na-erube isi ka Jizọs?’ Ọ bụrụ na anyị agbalịa jiri ezi obi na-erube isi, anyị ga-abụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ka anyị tụlee ebe ụfọdụ nrubeisi dị ezigbo mkpa ná ndụ.

5, 6. (a) Olee otú Devid si gosi nnọọ mkpa ọ dị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ọbụna mgbe ndị ọzọ na-adịghị ahụ anyị? (b) Olee ihe ndị na-anwa Ndị Kraịst ọnwụnwa taa ma hà ga-eguzosi ike n’ezi ihe mgbe naanị ha nọ?

5 Anyị kwesịrị irubere Jehova isi ọbụna mgbe o yiri ka ọ̀ bụ naanị anyị nọ. Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kwuru mkpa ọ dị mmadụ ịbụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe mgbe naanị ya nọ. (Gụọ Abụ Ọma 101:2.) Devid na ndị mmadụ na-anọkarị n’ihi na ọ bụ eze. O doro anya na e nwedịrị ọtụtụ mgbe ọtụtụ narị ma ọ bụdị ọtụtụ puku mmadụ na-ele ihe ọ na-eme. (Tụlee Abụ Ọma 26:12.) Ọ dị mkpa ka ọ na-eguzosi ike n’ezi ihe n’oge ndị a n’ihi na eze kwesịrị isetịpụrụ ndị ya ezi ihe nlereanya. (Diut. 17:18, 19) Ma, Devid matara na ya kwesịrị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe mgbe naanị ya nọ, ya bụ, ‘n’ime ụlọ ya.’ Gịnịkwanụ banyere anyị?

6 N’Abụ Ọma 101:3, Devid kwuru, sị: “Agaghị m edebe ihe ọ bụla na-abaghị uru n’ihu m.” E nwere ọtụtụ ihe ndị nwere ike idebe ihe ndị na-abaghị uru n’ihu anyị, karịchaa mgbe anyị nọ naanị anyị. Ịntanet na-esiri ọtụtụ ndị ọnyá na nke a. Ọ dị mfe mmadụ ikiri ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụdị ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na ya. Ma ime otú a ọ̀ ga-abụ irubere Chineke isi, bụ́ onye mere ka Devid dee okwu ndị ahụ? Ihe ndị a na-akpali agụụ mmekọahụ na-emebi ihe n’ihi na ọ na-eme ka ihe ọjọọ na-agụ mmadụ agụụ, ọ na-emebikwa akọnuche mmadụ, na-etisa alụmdi na nwunye, na-emekwa ka ndị na-ekiri ya na-ele onwe ha anya ka ndị na-abaghị uru.—Ilu 4:23; 2 Kọr. 7:1; 1 Tesa. 4:3-5.

7. Olee ihe ndị nwere ike inyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe mgbe naanị anyị nọ?

7 Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị mgbe ohu Jehova ọ bụla na-anọ naanị ya. Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya na-ahụ anyị. (Gụọ Abụ Ọma 11:4.) Cheedị otú obi ga-adị Jehova mgbe ọ na-ahụ ka ị na-agbalịsi ike ịghara ịdaba n’ọnwụnwa! Ka anyị na-eme nke a, anyị na-egosi na anyị na-aṅa ntị na ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere na Matiu 5:28. Ya mere, kpebisie nnọọ ike ịghara ile ihe ndị ga-anwa gị ọnwụnwa ime ihe ọjọọ. Ekwela ka omume na-eme ihere, nke bụ́ ikiri ma ọ bụ ịgụ ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, mee ka ị bụrụzie onye na-adịghị eguzosi ike n’ezi ihe, bụ́kwanụ ihe dị oké ọnụ ahịa!

8, 9. (a) Olee ihe ndị chọrọ ime ka Daniel na ndị enyi ya kwụsị iguzosi ike n’ezi ihe? (b) Olee otú Ndị Kraịst na-eto eto taa si eme Jehova na Ndị Kraịst ibe ha obi ụtọ?

8 Anyị nwekwara ike ịbụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe site n’irubere Jehova isi mgbe anyị na ndị na-ekweghị ekwe nọ. Cheta Daniel na ndị enyi ya atọ. Mgbe ha ka na-eto eto, a kpụụrụ ha laa Babịlọn. N’ebe ahụ, bụ́ ebe ndị na-adịghị ihe ọ bụla ha maara banyere Jehova gbara ha gburugburu, a manyere ndị Hibru anọ a iri ihe ndị Iwu Chineke sịrị ha erila. Ụmụ okorobịa a nwere nnọọ ike ịchọta ihe ha ga-akụdo aka rie ihe ndị a. A sị kwuwe, ndị mụrụ ha, ndị okenye, na ndị nchụàjà agaghị ahụ ihe ha anọ na-eme. Ò nwere onye ga-ama ihe ha mere? Jehova n’onwe ya ga-ama. N’ihi ya, ha kwụụrụ chịm ma rubere ya isi n’agbanyeghị mmanye a na-amanye ha nakwa ihe a ga-eme ha ma ọ bụrụ na ha erighị ihe ndị ahụ.—Dan. 1:3-9.

9 N’ụwa niile, Ndịàmà Jehova na-eto eto na-emekwa otu ihe a, ha na-eme ihe Chineke gwara Ndị Kraịst ka ha na-eme, ha adịghịkwa ekwe ka ndị ọgbọ ha mee ka ha tinye aka n’ihe ọjọọ. Mgbe unu bụ́ ndị na-eto eto jụrụ ịṅụ ọgwụ ike, ịlụ ọgụ, ịkpọ mmadụ iyi, ime omume rụrụ arụ, na ihe ọjọọ ndị ọzọ, unu na-erubere Jehova isi. Ka unu na-eme nke a, unu na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ọ ga-abara unu uru, ihe unu na-eme ga-emekwa Jehova na Ndị Kraịst ibe unu obi ụtọ!—Ọma 110:3.

10. (a) Olee echiche na-ezighị ezi ụfọdụ ndị na-eto eto nwere banyere ịkwa iko bụ́kwanụ nke merela ka ha kwụsị iguzosi ike n’ezi ihe? (b) Olee otú iguzosi ike n’ezi ihe ga-esi enyere anyị aka izere ihe ndị nwere ike iduba anyị n’ịkwa iko?

10 Anyị kwesịkwara irubere Jehova isi n’otú anyị si emeso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe anyị. Anyị maara na Okwu Chineke sịrị ka anyị ghara ịkwa iko. Ma, ọ dị mfe mmadụ ịghara ịbụ onye na-erube isi kama bụrụ onye na-eme otú o si masị ya. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-eto eto na-eji ọnụ amị akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ, si n’otule na-enwe mmekọahụ, ma ọ bụ na-ahịọgharị ibe ha aka n’akụkụ ahụ́ ha jiri bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Ha na-ewere na ihe ndị a adịghị njọ n’ihi na ha chere na nke a abụghị “inwe mmekọahụ.” Ha na-echefu, ma ọ bụ kpebie ileghara ihe Baịbụl kwuru banyere ịkwa iko anya, nke bụ́ na ịkwa iko gụnyere ihe ndị a niile, bụ́ ndị e nwere ike iji maka ha chụpụ mmadụ n’ọgbakọ. * Nke ka njọ bụ na ha adịghị echeta mkpa ọ dị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ebe ọ bụ na anyị na-agbalị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, anyị adịghị achọ ihe ndị anyị ga-akụdo aka na-eme ihe ọjọọ. Anyị adịghị achọ otú anyị ga-esi eme ihe yiri mmehie ma ghara inweta ntaramahụhụ. Anyị ekwesịghị ichewe naanị banyere ikpe a ga-ekpe anyị ma anyị mee ihe ọjọọ. Kama nke ahụ, ihe anyị kwesịrị ịdị na-eche bụ otú anyị ga-esi na-eme ihe ga-eme Jehova obi ụtọ ma zere ime ihe ga-ewute ya. Kama ime ihe ndị nwere ike iduba anyị ná mmehie, ka anyị zere ha nnọọ ma ‘gbaara ịkwa iko ọsọ.’ (1 Kọr. 6:18) Anyị ga-esi otú a gosi na anyị bụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ezie.

Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Nọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?

11. Gịnị mere nrubeisi nke ọ bụla ji dị mkpa? Nye ihe atụ.

11 Anyị na-aghọ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe site n’irube isi, n’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, anyị ga-anọgide na-erube isi. Ọ bụrụ na mmadụ erube isi n’otu ihe, nke ahụ nwere ike ịdị ka o nwechaghị ihe ọ bụ. Ma, nrubeisi dị otú ahụ na-abụ mmalite nke ọtụtụ nrubeisi. Iji maa atụ: Otu blọk nwere ike ịdị ka ihe na-adịghị ihe ọ bụ, ma ọ bụrụ na e lezie nnọọ anya dokọta ọtụtụ n’ime ha, ha nwere ike ịghọ ụlọ mara mma. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị anọgide na-erube isi, anyị ga-anọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe.—Luk 16:10.

12. Olee otú Devid si setịpụ ihe nlereanya n’ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe mgbe e mesoro ya mmeso ọjọọ?

12 Anyị kacha egosi na anyị na-eguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụrụ na anyị atachie obi mgbe ihe na-esiri anyị ike, mgbe a na-emegbu anyị, ma ọ bụ mgbe e mesoro anyị mmeso ọjọọ. Tụlee ihe banyere Devid, onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl. Mgbe ọ bụ nwa okorobịa, otu eze nke kwesịrị ịbụ onye na-anọchite anya Jehova kpagburu ya. Eze Sọl metere ihe mere ka ya na Jehova gharazie ịdị ná mma, o kwosokwara Devid, bụ́ onye Chineke họrọziiri, ekworo. Ma, Sọl nọtụkwuru n’ọchịchị ruo nwa oge, ọ kpọrọkwaara ndị agha Izrel na-achụgharị Devid. Jehova kwere ka mmeso ọjọọ a nọgide ruo afọ ole na ole. Devid ò wesara Chineke iwe? Ò kpebiri na ọ baghịzi uru ịtachiwe obi? Mbanụ. Ọ nọgidere na-akwanyere Sọl ùgwù miri emi n’ihi na Sọl bụ onye Chineke tere mmanụ, o kweghịkwa emegwara Sọl mgbe o nwere nnọọ ohere ime otú ahụ.—1 Sam. 24:2-7.

13. Olee otú anyị nwere ike isi nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụrụ na e nwee onye kpasuru anyị iwe ma ọ bụ mejọọ anyị?

13 Ihe nlereanya Devid na-akụziri anyị ezigbo ihe taa! Anyị so n’ọgbakọ zuru ụwa ọnụ ebe e nwere ndị na-ezughị okè, bụ́ ndị nwere ike imejọ anyị ma ọ bụdị kwụsị ife Jehova. N’eziokwu, anyị nwere ihe ùgwù nke ibi n’oge a na-enweghị ike imerụ ndị Jehova niile. (Aịza. 54:17) Ma, olee ihe anyị ga-eme ma e nwee onye mejọrọ anyị ma ọ bụ kpasuo anyị iwe? Ọ bụrụ na anyị ebuwere onye anyị na ya so na-efe Jehova iwe n’obi, nke a nwere ike ime ka anyị kwụsị iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke. Anyị agaghị anwa anwa kwe ka ihe onye ọzọ mere mee ka anyị wesawa Chineke anyị iwe ma ọ bụ kwụsị ife ya ofufe. (Ọma 119:165) Ịtachi obi ọbụna mgbe anyị na-enwe nsogbu ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe.

14. Gịnị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe na-eme mgbe e nwere mgbanwe ụfọdụ n’ọgbakọ na n’ihe ndị anyị kweere?

14 Anyị ga-enwekwa ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụrụ na anyị ezere ịbụ ndị na-atụchagharị ma ọ bụ na-akatọgharị ndị ọzọ. Iguzosi ike n’ezi ihe pụtara ịkwụsi ike n’akụkụ Jehova. Ọ na-agọzi ndị ya ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla e buliri ezi ofufe elu n’ụwa karịa ka a na-ebuli ya ugbu a. (Aịza. 2:2-4) Mgbe a gbanwere otú e sibu akọwa akụkụ Baịbụl ụfọdụ, ma ọ bụ otú e si eme ihe ụfọdụ, anyị kwesịrị ịnabata ha. Obi dị anyị ụtọ ịhụ ihe àmà na-egosi na ìhè ime mmụọ ka na-enwupụwanye. (Ilu 4:18) Ọ bụrụ na o siiri anyị ike ịghọta mgbanwe ọ bụla e mere, ka anyị rịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịghọta ya. Ka ọ dịgodị, ka anyị nọgide na-erube isi ma na-eguzosi ike n’ezi ihe.

Gịnịkwanụ Ma Ọ Bụrụ na E Nwee Onye Kwụsịrị Iguzosi Ike n’Ezi Ihe?

15. Olee naanị onye nwere ike ịkwụsị gị iguzosi ike n’ezi ihe?

15 Nke a bụ ajụjụ e kwesịrị ichebara echiche, ọ́ bụghị ya? Dị ka anyị mụtara n’isiokwu bu ụzọ, ọ dị nnọọ oké mkpa ka anyị na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ma ọ́ bụghị ya, anyị na Jehova agaghị adị ná mma, anyị agaghịkwa enwe olileanya ọ bụla. Buru nke a n’uche: E nwere naanị otu onye n’eluigwe na n’ụwa nke nwere ike ime ka ị kwụsị iguzosi ike n’ezi ihe. Onye ahụ bụ gị onwe gị. Job ghọtara na nke a bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Ruo mgbe m kubiri ume, m gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe!” (Job 27:5) Ọ bụrụ na i mee ụdị mkpebi a ma nọrọ Jehova nso, ọ dịghị ihe ga-eme ka ị kwụsị iguzosi ike n’ezi ihe.—Jems 4:8.

16, 17. (a) Ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie dị oké njọ, gịnị ka ọ na-ekwesịghị ime? (b) Gịnị ka o kwesịrị ime?

16 Ma ụfọdụ akwụsịla iguzosi ike n’ezi ihe. Ụfọdụ Ndị Kraịst na-eme mmehie dị oké njọ taa ọbụna dị ka ụfọdụ mere mgbe ndịozi ka nọ ndụ. Ọ bụrụ na i mee ụdị ihe a, ọ̀ pụtara na o nweghịzi ihe e nwere ike ime banyere ya? Mba. Gịnị ka e nwere ike ime? Ka anyị buru ụzọ kwuo ihe a na-ekwesịghị ime. Ihe ụmụ mmadụ na-achọkarị ime bụ izochiri ndị mụrụ ha, Ndị Kraịst ibe ha, ma ọ bụ ndị okenye ihe ọjọọ ahụ ha mere. Ma, Baịbụl na-echetara anyị na “onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma, ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.” (Ilu 28:13) Ndị na-agbalị izochi mmehie ha na-eme nke ka njọ, n’ihi na ọ dịghị ihe ọ bụla mmadụ nwere ike izochiri Chineke. (Gụọ Ndị Hibru 4:13.) Ụfọdụ na-ebidị ndụ ihu abụọ, na-eme ka hà na-efe Jehova ma na-eme mmehie na nzuzo. Onye na-ebi ụdị ndụ a adịghị eguzosi ike n’ezi ihe, nke bụ́ eziokwu bụ na onye ahụ akwụsịla iguzosi ike n’ezi ihe. Jehova adịghị enwe mmasị n’ofufe ndị na-ekpuchi mmehie ha dị oké njọ na-efe ya. N’ezie, omume ihu abụọ dị otú a na-ewe ya iwe.—Ilu 21:27; Aịza. 1:11-16.

17 Ọ bụrụ na Onye Kraịst emee mmehie dị oké njọ, a naghị achọ ihe ọ ga-eme achọ. Ọ ga-ejekwuru ndị okenye ọgbakọ ka ha nyere ya aka. Jehova ekwuola ihe a ga-eme ma mmadụ na-arịa ọrịa ime mmụọ dị oké njọ. (Gụọ Jems 5:14.) Ekwela ka ụjọ ntaramahụhụ a ga-enye gị mee ka ị ghara ime ihe iji gbakee. A sị kwuwe, ò nwere onye ga-ekwe ka ụfụ ọgwụ a ga-agba ya ma ọ bụ ụfụ ahụ́ a ga-awa ya, bụ́ nke ga-emecha kwụsị, mee ka ọ ghara ịga ka a gwọọ ya ọrịa nwere ike igbu ya?—Hib. 12:11.

18, 19. (a) Olee otú ihe mere Devid si gosi na mmadụ nwere ike ịghọghachi onye na-eguzosi ike n’ezi ihe? (b) Gịnị ka i kpebiri ime banyere iguzosi ike n’ezi ihe gị?

18 Olileanya ọ̀ dị na onye ahụ ga-agbakecha? Mmadụ ò nwere ike ịghọghachi onye na-eguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụrụ na ọ kwụsị iguzosi ike n’ezi ihe? Tụleekwa ihe atụ Devid ọzọ. O mere mmehie dị oké njọ. O nwere anyaukwu n’ebe nwunye onye ọzọ nọ, kwaso nwaanyị ahụ iko, ma kpaa nkata mere e ji gbuo di ya aka ya dị ọcha. Ọ dịghị otú mmadụ ga-esi lee Devid anya dị ka onye na-eguzosi ike n’ezi ihe mgbe o mechara ihe ndị a. Ma, ọnọdụ ya ọ̀ bụ nke na-enweghị mmekwata? Ọ dị mkpa ka e nye Devid ntaramahụhụ kwesịịrị ya, o nwetakwara ya. Otú o sizi jiri obi ya dum chegharịa mere ka Jehova meere ya ebere. Devid mụtara ihe na ntaramahụhụ e nyere ya ma ghọghachi onye na-eguzosi ike n’ezi ihe site n’ịnọgide na-erubere Chineke isi. Ihe mere Devid gosiri na ihe anyị na-agụ n’Ilu 24:16 bụ eziokwu: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.” Gịnị meziri Devid? Tụlee ihe Jehova gwara Sọlọmọn banyere Devid mgbe Devid nwụchara. (Gụọ 1 Ndị Eze 9:4.) Chineke kwuru na Devid bụ nwoke na-eguzosi ike n’ezi ihe. N’ezie, Jehova nwere ike ịsachapụ onye mere mmehie dị oké njọ mmehie ya.—Aịza. 1:18.

19 Ee, ị ga-abụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụrụ na i jiri ịhụnanya na-erube isi. Nọgide na-atachi obi, ọ bụrụkwa na i mee mmehie dị oké njọ, jiri obi gị dum chegharịa. N’ezie, iguzosi ike n’ezi ihe bụ àgwà na-enweghị atụ! Ka anyị niile mee ụdị mkpebi a Devid mere: “Ma mụ onwe m ga-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe nke m.”—Ọma 26:11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú i nwere ike isi bụrụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe?

• Olee otú i nwere ike isi nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe?

• Olee otú mmadụ nwere ike isi ghọghachi onye na-eguzosi ike n’ezi ihe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 8]

‘Ihe Mara Mma Ime’

Otu nwaanyị dị ime ọnwa ise kwuru ihe a banyere otú otu onye ọ na-amaghị si gosi ya obiọma, gosikwa na ya na-eguzosi ike n’ezi ihe. Nwaanyị a gara n’ebe a na-aṅụ kọfị, ka o sicha n’ebe ahụ pụọ, ọ chọpụtara na ya chefuru pọọsụ ya n’ebe ahụ. Ihe dị na pọọsụ ahụ bụ puku dọla abụọ, nke karịrị nnọọ ego ọ na-adị na-eji n’akpa ya. Nwaanyị a mechara gwa otu onye nta akụkọ nke otu ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ n’obodo ahụ, sị: “Obi gbawara m nnọọ.” Ma otu nwa agbọghọ hụrụ pọọsụ ahụ ma chọwa onye nwe ya ozugbo. Mgbe ọ na-achọtalighị onye nwe ya, o wegara pọọsụ ahụ n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, ndị uwe ojii wee chọtazie nwaanyị ahụ dị ime nwe ya. Nwaanyị ahụ ji obi ụtọ kwuo, sị: “Ihe a o meere m bụ ihe mara nnọọ mma ime.” Gịnị mere nwa agbọghọ ahụ ji gbaa mbọ niile a ọ gbara iweghachi ego ahụ? Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na nwa agbọghọ ahụ, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, kwuru na “ọ bụ okpukpe a zụlitere ya n’ime ya mere ya ji mee ihe a gosiri na ya na-eguzosi ike n’ezi ihe.”

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndị na-eto eto nwere ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe mgbe a na-anwa ha ọnwụnwa

[Foto dị na peeji nke 10]

E nwere mgbe Devid kwụsịrị iguzosi ike n’ezi ihe, ma o mechara ghọta onwe ya