Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Legodị ma ị ga-azali ajụjụ ndị a na-esonụ:

• Olee otú “asụsụ ahụ dị ọcha,” nke bụ́, eziokwu banyere Chineke na nzube ya, nwere ike isi na-aga anyị were were n’ọnụ? (Zef. 3:9)

Dị nnọọ ka ndị na-amụ asụsụ na-eme, ka asụsụ ahụ dị ọcha wee na-aga anyị were were n’ọnụ, anyị kwesịrị ige ntị nke ọma, ṅomie ndị asụsụ ahụ na-aga were were n’ọnụ, buo aha akwụkwọ ndị dị na Baịbụl na akụkụ Baịbụl ụfọdụ n’isi, kwughachi ihe ndị anyị mụtara, na-agụpụta ihe agụpụta, leruo ụtọ asụsụ ahụ ma ọ bụ ụkpụrụ nke eziokwu ahụ anya, nọgide na-agbalị, nwee kpọmkwem oge anyị ga-eji na-amụ ihe, na-asụkwa asụsụ ahụ dị ọcha mgbe niile.—8/15, peeji nke 21-25.

• Olee ihe ụfọdụ ịmara onye Chineke bụ gụnyere?

Ọ gụnyere ịmara na “Jehova bụ aha ya,” nakwa na ọ chọrọ ka anyị jiri aha ya bụ́ Jehova mara ya. (Ọpụ. 15:3) Ọ bụ “Chineke nke ịhụnanya na nke udo.” (2 Kọr. 13:11) Ọ bụ Chineke nke “nwere ihe ọmụma zuru okè” na “Chineke nke nzọpụta.” (1 Sam. 2:3; Ọma 25:5) Chineke ga-abịaru ndị maara ya nso.—9/1, peeji nke 4-7.

• Olee otú e nwere ike isi webata ihe atụ “ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ” n’alụmdi na nwunye?

E ji okwu ahụ bụ́ “ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ” mee ihe atụ. (Ekli. 4:12) Ọ bụrụ na e webata ihe atụ a n’alụmdi na nwunye, ụdọ abụọ na-anọchi anya di na nwunye, bụ́ ndị a tụhịkọtara ha na nke atọ ahụ nọ n’etiti, bụ́ nke na-anọchi anya Chineke. Di na nwunye na Chineke ịdị n’otu na-eme ka ha nwee ike imeri nsogbu ndị ha na-ezute, ọ bụkwa isi ihe ga-enyere ha aka inwe obi ụtọ kasị ukwuu n’alụmdi na nwunye ha.—9/15, peeji nke 16.

• Olee ihe a na-ekwu okwu ya mgbe a na-ekwu banyere “ibikwasị aka n’isi” ná Ndị Hibru 6:2?

Ọ bụghị ịhọpụta ndị okenye ka a na-ekwu okwu ya ebe a, o yiri ka ọ bụ ibikwasị aka n’isi iji mee ka a nata onyinye nke mmụọ nsọ. (Ọrụ 8:14-17; 19:6)—9/15, peeji nke 32.

• Olee mkpa ndị onye bụ́ ezigbo nna na-achọpụta na ụmụ ya nwere?

Ụfọdụ mkpa ha bụ (1) ịhụ ha n’anya, (2) isetịpụrụ ha ezigbo ihe nlereanya, (3) inwe ezinụlọ obi ụtọ, (4) ịkụziri ha banyere Chineke, (5) ịdọ ha aka ná ntị, (6) ichebe ha.—10/1, peeji nke 18-21.

• Olee otú ndị okenye si asọpụrụ ndị ọzọ?

Otu ụzọ okenye nwere ike isi mee nke a bụ ịghara ịgwatụdị ha mee ihe ya onwe ya na-adịghị njikere ime. Ọ na-asọpụrụkwa ndị ọ na-elekọta site n’ime ka ha mara ihe mere o ji gwa ha mee ihe ụfọdụ ma ọ bụ ihe mere ha ga-eji gbasoo ntụziaka o nyere ha.—10/15, peeji nke 22.

• Olee ihe ụfọdụ ndị na-eme ka e nwee obi ụtọ n’ezinụlọ?

Abụọ n’ime ha bụ: (1) Jiri alụmdi na nwunye gị kpọrọ ihe. (2) Zere ịkpa n’èzí. Ma alụmdi na nwunye gị ọ̀ na-agazi agazi ma ọ̀ na-enwe nsogbu, ọ dị mkpa ka i gosi nwunye gị ma ọ bụ di gị na obi gị dị n’ebe ọ nọ nakwa na ị chọrọ ime ka alụmdi na nwunye unu na-agazi agazi; ihe abụọ ndị a ga-enye aka mee ka e nwee obi ụtọ n’ezinụlọ.—11/1, peeji nke 18-21.

• Olee ihe okenye ọgbakọ nwere ike ịmụta n’otú onye ọzụzụ atụrụ n’Izrel oge ochie si eji ogologo mkpara isi ya rọrọ arọ eduzi atụrụ ya?

Onye ọzụzụ atụrụ n’Izrel oge ochie na-eji ogologo mkpara isi ya rọrọ arọ eduzi atụrụ ya. Ka atụrụ ya na-abanye ma ọ bụ na-apụ n’ogige atụrụ ahụ, ha na-agafe ‘n’okpuru mkpara ahụ,’ nke a na-emekwa ka onye ọzụzụ atụrụ ahụ nwee ike ịgụ ha ọnụ. (Lev. 27:32) N’otu aka ahụ, Onye Kraịst bụ́ onye ọzụzụ atụrụ kwesịrị ịma banyere ìgwè atụrụ Chineke nke e nyere ya ka ọ na-elekọta.—11/15, peeji nke 9.

• Olee otú nne nwere ike isi gosi na ya weere ịdị ọcha dị ka ihe dị mkpa?

Nje nwere ike ịbanye ná nri n’ụzọ dị iche iche, n’ihi ya ọ ga na-akwọ aka ya nke ọma tupu ya emetụ ihe oriri aka ma na-ekpuchi ihe oriri ekpuchi. Ọ na-edebe ụlọ ya ọcha ka òké na ọchịcha na ụmụ ahụhụ ghara ịdị na-enyegharị nsogbu. Ihe ndị ọzọ ọ ga-eme bụ ịsụ ákwà mmiri na ịsa efere na ịsa ahụ́. Ihe ndị a kwekọrọ n’ihe Baịbụl kwuru.—12/1, peeji nke 9-11.