Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịghọta Ọrụ Pụrụ Iche Jizọs Na-arụ ná Nzube Chineke

Ịghọta Ọrụ Pụrụ Iche Jizọs Na-arụ ná Nzube Chineke

Ịghọta Ọrụ Pụrụ Iche Jizọs Na-arụ ná Nzube Chineke

“Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.”—JỌN 14:6.

1, 2. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe mmasị n’ịtụle ọrụ pụrụ iche Jizọs na-arụ n’imezu nzube Chineke?

KEMGBE ụwa, ọtụtụ mmadụ agbalịala ịdị iche ná ndị ọzọ, ma ọ bụ ole na ole n’ime ha meliri ya. Ọ bụdị nnọọ mmadụ ole na ole nwere ike ịpụta kwuo ụzọ ndị ha si dị iche ná ndị ọzọ. Ma, Jizọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke, nwere ọtụtụ ụzọ o si dị nnọọ iche.

2 Gịnị mere anyị ji kwesị inwe mmasị n’ọrụ pụrụ iche Jizọs na-arụ? Ọ bụ n’ihi na e nwere ihe jikọrọ nke a na adịm ná mma anyị na Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova! Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6; 17:3) Ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ Jizọs si dị nnọọ iche. Ịtụle ya ga-eme ka anyị nwekwuo ekele maka ọrụ Jizọs na-arụ ná nzube Chineke.

“Ọkpara Chineke Mụrụ Naanị Ya”

3, 4. (a) Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na Jizọs nwere ọrụ pụrụ iche dị ka Ọkpara a mụrụ naanị ya? (b) Olee ihe mere ọrụ Jizọs rụrụ n’ike ihe ji pụọ iche?

3 Ihe Jizọs bụ abụghị naanị otu n’ime “ọkpara Chineke.” Nke a bụ ihe Setan kpọrọ Jizọs mgbe ọ na-anwa ya ọnwụnwa. (Mat. 4:3, 6) O kwesịrị nnọọ ekwesị na a kpọrọ Jizọs “Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.” (Jọn 3:16, 18) A kọwaala okwu Grik e ji sụgharịta “ọ mụrụ naanị ya” ịbụ “ihe na-enweghị o yiri,” “onye a na-enweghị ụdị ya ọzọ,” ma ọ bụ “ihe pụrụ nnọọ iche.” Jehova nwere nde kwuru nde ndị mmụọ ozi ndị ọzọ bụ́ ụmụ ya. Oleezi otú o si bụrụ na Jizọs bụ “onye a na-enweghị ụdị ya ọzọ”?

4 Jizọs pụrụ iche n’ụdị na ọ bụ naanị ya ka Nna ya kere n’onwe ya. Ọ bụ Ọkpara e bụ ụzọ mụọ. N’ezie, ọ bụ “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke.” (Kọl. 1:15) Ọ bụ “mmalite nke ihe Chineke kere.” (Mkpu. 3:14) Ọrụ Ọkpara a a mụrụ naanị ya so rụọ n’ike ihe pụkwara iche. Ọ bụghị ya bụ Onye Okike ma ọ bụ Onye Malitere okike. Ma Jehova ji ya mere onye ọrụ, ma ọ bụ onye o si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile. (Gụọ Jọn 1:3.) Pọl onyeozi dere, sị: “N’ebe anyị nọ, otu Chineke dị, bụ́ Nna, onye ihe niile si n’aka ya dịrị, anyị onwe anyị dịkwaara ya; otu Onyenwe anyị dịkwa, bụ́ Jizọs Kraịst, onye e si n’aka ya mee ka ihe niile dịrị, anyị onwe anyị sikwa n’aka ya.”—1 Kọr. 8:6.

5. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si gosi ụzọ ndị Jizọs si pụọ nnọọ iche?

5 Ma, e nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere Jizọs ji pụọ nnọọ iche. E nwere ọtụtụ utu aha ma ọ bụ ihe ndị ọzọ a kpọrọ ya n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ndị na-egosi ọrụ pụrụ iche o nwere ịrụ n’imezu nzube Chineke. Ugbu a, ka anyị tụlee ise n’ime utu aha ndị a a kpọrọ Jizọs n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. *

“Okwu Ahụ”

6. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị na a kpọrọ Jizọs “Okwu ahụ”?

6 Gụọ Jọn 1:14. Gịnị mere e ji kpọọ Jizọs “Okwu ahụ,” ma ọ bụ Logos? Utu aha a na-akọwa ọrụ ọ rụrụla kemgbe e kere ihe ndị ọzọ nwere ọgụgụ isi. Jehova na-esi n’aka Ọkpara ya agwa ụmụ ya ndị ọzọ bụ́ mmụọ okwu ma na-enye ha ntụziaka, o sikwa n’aka Ọkpara ya a zie ụmụ mmadụ ndị bi n’ụwa ozi. Ihe Jizọs gwara ndị Juu na-ege ya ntị mere nnọọ ka ọ pụta ìhè na Jizọs bụ Okwu ahụ, ma ọ bụ Ọnụ na-ekwuchitere Chineke. Ọ gwara ha sị: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m. Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ime uche Ya, ọ ga-ama ma ozizi ahụ ò si n’aka Chineke ka ọ bụ na m na-ekwu echiche nke onwe m.” (Jọn 7:16, 17) Jizọs nọgidere na-aza utu aha ahụ bụ́ “Okwu Chineke” ọbụna ka ọ laghachichara n’eluigwe ma dịrị ebube.—Mkpu. 19:11, 13, 16.

7. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie ịdị umeala n’obi Jizọs gosiri n’ọrụ ya dị ka “Okwu ahụ”?

7 Chegodị nnọọ ihe utu aha a pụtara. Ọ bụ ezie na Jizọs kacha ihe niile ọzọ Jehova kere eke mara ihe, ọ dịghị adabere n’amamihe nke onwe ya. Ọ na-ekwu ihe Nna ya gwara ya kwuo. Ọ na-emekwa mgbe niile ka otuto gaara Jehova kama ịnara otutu n’onwe ya. (Jọn 12:50) Nke a bụ nnọọ ihe magburu onwe ya anyị kwesịrị iṅomi! E nyekwala anyị onwe anyị ihe ùgwù a dị oké ọnụ ahịa nke bụ́ ‘izisa ozi ọma nke ihe dị mma.’ (Rom 10:15) Ịghọta ụdị ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ n’ịdị umeala n’obi kwesịrị ịkpali anyị izere isi n’amamihe nke onwe anyị na-akụziri ndị mmadụ ihe. Mgbe a bịara n’ikwusara ndị mmadụ ozi ahụ na-azọpụta ndụ dị n’Akwụkwọ Nsọ, anyị ekwesịghị ‘ịgabiga ihe e dere ede.’—1 Kọr. 4:6.

“Amen Ahụ”

8, 9. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “amen” pụtara, gịnịkwa mere e ji kpọọ Jizọs “Amen ahụ”? (b) Olee otú Jizọs si rụọ ọrụ ya dị ka “Amen ahụ”?

8 Gụọ Mkpughe 3:14. Gịnị mere e ji kpọọ Jizọs “Amen ahụ”? Okwu a sụgharịrị ka ọ bụrụ “amen” si n’okwu Hibru ya na ya nwere otu ụda nke pụtara “ka ọ dị otú ahụ.” Okwu Hibru e si na ya nweta ya pụtara “ikwesị ntụkwasị obi” ma ọ bụ “ihe a pụrụ ịtụkwasị obi.” A na-ejikwa otu okwu a akọwa otú Jehova si bụrụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi. (Diut. 7:9; Aịza. 49:7) N’ihi ya, olee otú Jizọs si pụọ iche mgbe a kpọrọ ya “Amen ahụ”? Lee otú e si zaa ya ná 2 Ndị Kọrịnt 1:19, 20: “Ọkpara Chineke, bụ́ Kraịst Jizọs, onye e kwusara n’etiti unu . . . , abụghị Ee ma bụrụkwa Ee e, kama Ee abụrụwo Ee n’ebe ọ nọ. N’ihi na n’agbanyeghị ole nkwa Chineke dị, ha abụrụwo Ee site na ya. Ya mere, ọ bụkwa site na ya ka a na-asị Chineke ‘Amen’ ka e wee site n’ọnụ anyị nye ya otuto.”

9 Jizọs bụ “Amen” nke nkwa niile Chineke kwere. Ndụ o biri n’ụwa a n’emeghị mmehie ọ bụla, tinyere àjà o ji ndụ ya chụọ, mere ka e jide n’aka na nkwa niile Jehova Chineke kwere ga-emezu, meekwa ka mmezu ha kwe omume. Otú Jizọs si kwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ gosiri na ihe Setan kwuru, bụ́ nke e dekọrọ n’akwụkwọ Job, bụ ụgha. Setan kwuru na ọ bụrụ na o siere ndị ohu Chineke ike inweta ihe ndị na-akpa ha ná ndụ, ma ọ bụ ha ana-ata ahụhụ, ma ọ bụ zute ọnwụnwa, na ha ga-agọnahụ Chineke. (Job 1:6-12; 2:2-7) A bịa n’ihe niile Chineke kere eke, ọ bụ Ọkpara a Chineke bu ụzọ mụọ bụ onye kacha gosi na ihe ahụ Setan kwuru bụ ụgha. Jizọs gosikwara nnọọ na ya kwụ n’akụkụ Nna ya n’ihe iseokwu ahụ ka mkpa nke bụ́ igosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị eluigwe na ala.

10. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie otú Jizọs si rụọ ọrụ ya pụrụ iche dị ka “Amen ahụ”?

10 Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs n’ọrụ pụrụ iche ọ na-arụ dị ka “Amen ahụ”? Ọ bụ site n’ịnọgide na-ejere Jehova ozi na ịnọgide na-akwado ọbụbụeze ya. Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị a, ọ pụtara na anyị na-eme ihe a gbara anyị ume ka anyị mee n’Ilu 27:11: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.”

“Onye Ogbugbo nke Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ”

11, 12. Olee ihe mere ọrụ Jizọs dị ka Onye Ogbugbo ji pụọ nnọọ iche?

11 Gụọ 1 Timoti 2:5, 6. Jizọs bụ “otu onye ogbugbo n’etiti Chineke na mmadụ.” Ọ bụ “onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ.” (Hib. 9:15; 12:24) Ma, a na-akpọkwa Mozis onye ogbugbo—onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. (Gal. 3:19) Oleezi ihe mere ọrụ Jizọs dị ka Onye Ogbugbo ji pụọ iche?

12 N’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl, okwu e si na ya sụgharịta okwu bụ́ “onye ogbugbo” bụ okwu ndị ọkàiwu. E ji ya akọwa na Jizọs bụ Onye Ogbugbo iwu kwadoro (ma ọ bụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọkàiwu) nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke mere ka o kwe omume ịmụta mba ọhụrụ, nke bụ́ “Izrel nke Chineke.” (Gal. 6:16) Ndị mejupụtara mba a bụ Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, bụ́ ndị ghọrọ “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze” n’eluigwe. (1 Pita 2:9; Ọpụ. 19:6) Ọgbụgba ndụ iwu ahụ, nke Mozis bụ onye ogbugbo ya, emelighị ka e nwee mba dị otú ahụ.

13. Gịnị ka ọrụ Jizọs dị ka Onye Ogbugbo gụnyere?

13 Gịnị ka ọrụ Jizọs na-arụ dị ka Onye Ogbugbo gụnyere? Jehova na-eme ka ọbara Jizọs baara ndị a kpọbatara n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ uru. N’ụzọ dị otú a, Jehova kpọrọ ha ndị ezi omume n’ụzọ iwu kwadoro. (Rom 3:24; Hib. 9:15) Chineke nweziri ike ịnabata ha n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke mere ka ha na-atụ anya ịghọ ndị nchụàjà bụ́ ndị eze n’eluigwe! Jizọs, bụ́ Onye Ogbugbo ha, na-enyere ha aka ịnọgide na-ebi ndụ dị ọcha n’ihu Chineke.—Hib. 2:16.

14. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst niile, n’agbanyeghị ebe bụ́ olileanya ha, ji kwesị inwe ekele maka ọrụ Jizọs na-arụ dị ka Onye Ogbugbo?

14 Oleekwanụ maka ndị na-esoghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, bụ́ ndị nwere olileanya ibi ndụ ebighị ebi n’ụwa, ọ bụghị n’eluigwe? Ọ bụ ezie na ndị a esoghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ha na-erite uru na ya. A na-agbaghara ha mmehie ha, a na-akpọkwa ha ndị ezi omume dị ka ndị enyi Chineke. (Jems 2:23; 1 Jọn 2:1, 2) Ma olileanya anyị ọ̀ bụ ibi ndụ n’eluigwe ma ọ̀ bụ n’ụwa, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ezigbo ihe mere ọ ga-eji nwee ekele maka ọrụ Jizọs na-arụ dị ka Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.

“Nnukwu Onye Nchụàjà”

15. Olee otú ọrụ Jizọs dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà si dị iche na nke ndị ọzọ jerela ozi dị ka nnukwu ndị nchụàjà?

15 E nweela ọtụtụ ụmụ nwoke ndị jere ozi dị ka ndị nchụàjà n’oge ochie, ma ọrụ Jizọs dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà pụrụ nnọọ iche. Olee otú o si pụọ iche? Pọl kọwara nke a, sị: “Ọ dịghị ya mkpa, dị ka ọ dị nnukwu ndị nchụàjà ahụ, ịdị na-achụ àjà kwa ụbọchị, nke mbụ maka mmehie nke ya, mgbe ahụzi maka mmehie nke ndị ya: (n’ihi na nke a ka o mere naanị otu ugboro mgbe ọ chụrụ onwe ya n’àjà;) n’ihi na Iwu ahụ na-ahọpụta ndị ikom nwere adịghị ike ka ha bụrụ nnukwu ndị nchụàjà, ma ihe ahụ e ji ịṅụ iyi kwuo mgbe Iwu ahụ gasịrị họpụtara otu Ọkpara, bụ́ onye a na-eme ka o zuo okè ruo mgbe ebighị ebi.”—Hib. 7:27, 28. *

16. Gịnị mere àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ ji pụọ nnọọ iche?

16 Jizọs bụ nwoke zuru okè, dị nnọọ ka Adam zuru tupu ya emehie. (1 Kọr. 15:45) N’ihi ya, Jizọs bụ naanị mmadụ ruru eru ịchụ àjà zuru okè, nke bụ́ àjà na-adịghị mkpa ka a chụọ ya ọzọ. Iwu Mozis kwuru ka a na-achụ àjà kwa ụbọchị. Ma àjà niile ahụ a chụrụ na ozi niile ndị nchụàjà jere bụ naanị ihe ndị na-egosi ihe Jizọs ga-arụzu. (Hib. 8:5; 10:1) N’ihi ya, ọrụ Jizọs dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà pụrụ nnọọ iche n’ụdị na ọ na-arụzu ihe karịrị ihe nnukwu ndị nchụàjà ndị ọzọ rụrụ nakwa n’ihi na ọ ga-anọgide na-arụ ọrụ a.

17. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe ekele maka ọrụ Jizọs na-arụrụ anyị dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà, oleekwa otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere ekele?

17 Ọrụ Jizọs dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà dị anyị mkpa n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ka anyị na Chineke dịrị ná mma. Jizọs bụụrụ anyị nnọọ Nnukwu Onye Nchụàjà na-enweghị atụ! Pọl dere, sị: “Nnukwu onye nchụàjà anyị nwere abụghị onye na-apụghị imere anyị ebere n’adịghị ike anyị, kama ọ bụ onye a nwalere n’ụzọ niile dị ka anyị onwe anyị, ma o nweghị mmehie.” (Hib. 4:15) N’ezie, inwe ekele maka ọrụ a Jizọs na-arụrụ anyị kwesịrị ịkpali anyị ‘ịghara ịdịrị onwe anyị ndụ ọzọ, kama dịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ihi anyị.’—2 Kọr. 5:14, 15; Luk 9:23.

“Mkpụrụ” ahụ E Kwere ná Nkwa

18. Olee amụma e buru ka Adam mehiechara, oleekwa ihe e mechara kpughee banyere amụma a?

18 N’ogige Iden, mgbe o yiri ka ihe niile o funahụla ụmụ mmadụ, ya bụ, mgbe o yiri ka ọ dịghịkwa ihe ga-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma, na anyị agaghịkwa enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi, anyị agaghịzi enwe obi ụtọ, nakwa na anyị agaghịzi ebi na Paradaịs, Jehova Chineke buru amụma na a ga-enwe Onye Nzọpụta. A kpọrọ onye a “mkpụrụ” ahụ. (Jen. 3:15) Mkpụrụ a a na-amaghị onye ọ ga-abụ mechara bụrụ isi ihe gbara n’ọtụtụ amụma ndị e buru na Baịbụl ruo ọtụtụ narị afọ. Ọ ga-esi n’agbụrụ Ebreham, Aịzik, na Jekọb. Ọ ga-esikwa n’agbụrụ Eze Devid.—Jen. 21:12; 22:16-18; 28:14; 2 Sam. 7:12-16.

19, 20. (a) Ònye bụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa? (b) Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na e nwere ndị ọzọ so ná mkpụrụ ahụ e buru n’amụma ma e wezụga Jizọs?

19 Ònye bụ Mkpụrụ a e kwere ná nkwa? Azịza ya dị ná Ndị Galeshia 3:16. (Gụọ ya.) Ma Pọl onyeozi mechara kwuo banyere Ndị Kraịst e tere mmanụ n’akwụkwọ Ndị Galeshia ahụ, sị: “Ọ bụrụkwa na unu bụ ndị nke Kraịst, unu bụ n’ezie mkpụrụ Ebreham, ndị nketa dị ka nkwa e kwere si dị.” (Gal. 3:29) Olee otú o si bụrụ na Kraịst bụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, a bịakwa nwee ndị ọzọ so ná mkpụrụ ahụ?

20 E nweela ọtụtụ ndị kwuru na ha si n’agbụrụ Ebreham, e nwedịrị ụfọdụ n’ime ha ndị mere ka hà bụ ndị amụma. Ụfọdụ okpukpe na-ewere ihe ha na-ekwu na ndị amụma ha si n’agbụrụ Ebreham dị ka ihe dị oké mkpa. Ma ndị a niile hà bụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa? Mba. Dị ka Pọl onyeozi kwuru n’ike mmụọ nsọ, ọ bụghị ndị niile si n’agbụrụ Ebreham bụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. E sighị n’ụmụ ndị ụmụ Ebreham ndị ọzọ mụrụ gọzie ụmụ mmadụ. Mkpụrụ ahụ a ga-esi na ya gọzie ụmụ mmadụ ga-esi naanị n’Aịzik. (Hib. 11:18) N’ezie, ọ bụ naanị Jizọs Kraịst, bụ́ onye e dekọrọ osuso ọmụmụ ya sitere n’Ebreham na Baịbụl, bụ onye bụ́ isi ná mkpụrụ ahụ e buru amụma ya. * Ndị niile, bụ́ ndị mechara soro n’akụkụ nke ọzọ nke mkpụrụ Ebreham ahụ, ghọrọ mkpụrụ Ebreham n’ihi na ha “bụ ndị nke Kraịst.” Ee, ọrụ Jizọs na-arụ n’imezu amụma a pụrụ nnọọ iche.

21. Olee ihe tọrọ gị ụtọ banyere otú Jizọs si rụzuo ọrụ pụrụ iche o nwere ịrụ n’imezu nzube Jehova?

21 Olee ihe anyị mụtara site n’ịtụle ọrụ ndị a pụrụ iche Jizọs na-arụ n’imezu nzube Jehova? Site ná mgbe e kere Ọkpara a Chineke mụrụ naanị ya gawa, ọkpara a pụrụ nnọọ iche, e nweghị ụdị ya ọzọ. Ma kemgbe ụwa, Ọkpara Chineke a pụrụ iche, onye mechara bụrụ Jizọs, ji nnọọ obi umeala na-ejere Nna ya ozi otú Nna ya si chọọ, ọ dịghịkwa mgbe ọ chọrọ ka e towe ya. (Jọn 5:41; 8:50) Lee nnọọ ka Jizọs si setịpụrụ anyị ihe nlereanya magburu onwe ya taa! Dị nnọọ ka Jizọs mere, ka anyị hụ na anyị na-eme “ihe niile iji nye Chineke otuto.”—1 Kọr. 10:31.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A na-ede “ahụ” n’azụ ụfọdụ n’ime utu aha ndị a iji gosi na utu aha ndị a bụ “n’ụzọ ụfọdụ” ‘utu aha dịịrị naanị otu onye’ dị ka otu onye ọkà mmụta si kọwaa ya.

^ par. 15 Dị ka otu ọkà mmụta Baịbụl si kwuo, okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ, “naanị otu ugboro” kọwara otu ihe dị mkpa Baịbụl na-akụzi nke “na-egosi nnọọ otú ọnwụ Kraịst si bụrụ ihe gbapụrụ iche, ihe pụrụ nnọọ iche, ma ọ bụ ihe na-enweghị nke yiri ya.”

^ par. 20 N’agbanyeghị na ndị Juu nke narị afọ mbụ O.A. chere na ebe ha si n’agbụrụ Ebreham, na ha ga-abụ ndị Chineke họọrọ ịbụ ndị ya, ha nọkwa na-atụ anya otu onye ga-abịa nke ga-abụ Mesaya ahụ ma ọ bụ Kraịst.—Jọn 1:25; 7:41, 42; 8:39-41.

Ì Chetara?

• Olee ihe i si n’utu aha ma ọ bụ ihe ndị a na-akpọ Jizọs mụta banyere ọrụ ndị pụrụ iche ọ na-arụ? (Lee igbe.)

• Olee otú i nwere ike isi ṅomie ihe nlereanya nke Ọkpara Jehova a pụrụ iche?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 15]

Ụfọdụ Utu Aha Ndị Na-egosi Ọrụ Pụrụ Iche Jizọs Na-arụ n’Imezu Nzube Chineke

Ọkpara Chineke Mụrụ Naanị Ya. (Jọn 1:3) Ọ bụ naanị Jizọs ka Nna ya kere n’onwe ya.

Okwu ahụ. (Jọn 1:14) Jizọs bụ Ọnụ na-ekwuchitere Jehova. Chineke si n’aka Ọkpara ya agwa ihe ndị ọzọ o kere eke ihe ndị ọ chọrọ ka ha mara, na-enyekwa ha ntụziaka.

Amen ahụ. (Mkpu. 3:14) Ndụ Jizọs biri n’ụwa n’emeghị mmehie ọ bụla, tinyere àjà o ji ndụ ya chụọ, mere ka e jide n’aka na nkwa niile Jehova Chineke kwere ga-emezu, meekwa ka mmezu ha kwe omume.

Onye Ogbugbo nke Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ ahụ. (1 Tim. 2:5, 6) N’ihi na ọ bụ Onye Ogbugbo iwu kwadoro, Jizọs mere ka o kwe omume ịmụ mba ọhụrụ, bụ́ “Izrel nke Chineke,” nke Ndị Kraịst ga-abụ “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze” ndị ga-anọ n’eluigwe mejupụtara.—Gal. 6:16; 1 Pita 2:9.

Nnukwu Onye Nchụàjà. (Hib. 7:27, 28) Naanị Jizọs bụ mmadụ ruru eru ịchụ àjà zuru okè, nke na-agaghị adị mkpa ka a chụọ ya ọzọ. O nwere ike ịsachapụ anyị mmehie ma mee ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ọnwụ mmehie na-akpata.

Mkpụrụ ahụ E Kwere ná Nkwa. (Jen. 3:15) Ọ bụ naanị otu onye, bụ́ Jizọs Kraịst, bụ onye bụ́ isi ná mkpụrụ ahụ e buru amụma ya. Ndị ọzọ niile, bụ́ ndị mechara soro ná mkpụrụ Ebreham ahụ, “bụ ndị nke Kraịst.”—Gal. 3:29.