Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ahụla M Ka Ọ Mụbara na Korea

Ahụla M Ka Ọ Mụbara na Korea

Ahụla M Ka Ọ Mụbara na Korea

Dị ka Milton Hamilton si kọọ

“O wutere anyị ịgwa unu na gọọmenti mba Republic of Korea akagbuola visa unu niile bụ́ ndị ozi ala ọzọ ma kwuo na ha achọghị unu n’obodo ha. . . . N’ihi nke a, unu ga-agagodị Japan.”

MỤ NA nwunye m natara ozi a si Brooklyn, New York, U.S.A. ná ngwụsị afọ 1954. Ná mmalite afọ ahụ, anyị gụchara akwụkwọ na klas nke 23 nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead dị na New York. Anyị na-ejegodị ozi n’Indianapolis nke dị n’Indiana mgbe anyị natara akwụkwọ ozi ahụ.

Nwunye m bụ́ Liz (onye a na-akpọbu Liz Semock), bụ nwa klas m n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Anyị mechara lụọ na 1948. O nwere nnọọ mmasị n’ozi oge niile, ma egwu na-atụ ya ịhapụ United States gaa jewe ozi ná mba ọzọ. Gịnị gbanwere obi ya?

Nwunye m bụ́ Liz kwetara iso m gaa nnọkọ ndị chọrọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead nwere. E nwere nnọkọ ahụ ná mgbakọ mba niile e nwere n’afọ 1953 n’ámá egwuregwu a na-akpọ Yankee, nke dị na New York. Mgbe anyị nwechara nnọkọ ahụ na-agba nnọọ ume, anyị dejupụtara akwụkwọ maka ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Ọ tụrụ anyị nnọọ n’anya na a kpọrọ anyị iso na klas ọzọ, bụ́ nke ga-amalite na February 1954.

E zigara anyị Korea. Agha a nọ na-alụ na Korea kemgbe afọ atọ ka biri nnọọ n’afọ 1953, ọ kpakwara mba ahụ aka ọjọọ. Dị ka a gwara anyị n’akwụkwọ ozi ahụ e kwuru okwu ya ná mmalite, anyị gawara Japan. Anyị ruru ebe ahụ na January 1955 mgbe anyị na ndị ozi ala ọzọ ibe anyị dị mmadụ isii e zigakwara Korea mechara njem were anyị abalị iri abụọ n’oké osimiri. Lloyd Barry, bụ́ onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Japan n’oge ahụ, bịara zute anyị n’ebe ụgbọ mmiri kwụsịrị anyị n’elekere isii nke ụtụtụ. N’oge na-adịghị anya, anyị gawara n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na Yokohama. Anyị mechakwara gaa ozi ọma n’otu ụbọchị ahụ.

Anyị Emechaa Gaa Korea

Ka oge na-aga, anyị nwetara visa iji banye n’obodo Republic of Korea. Na March 7, 1955, anyị banyere ụgbọelu n’ọdụ ụgbọelu Haneda dị na Tokyo, o wekwara anyị awa atọ iji ruo ọdụ ụgbọelu Yoido dị na Seoul. Ihe karịrị narị Ndịàmà abụọ bụ́ ndị Korea bịara zute anyị, anya mmiri gbakwara anyị niile n’ihi ọṅụ. N’oge ahụ, e nwere naanị otu puku Ndịàmà Jehova na Korea niile. Dịkwa nnọọ ka ọtụtụ ndị si mba anyị si eche, anyị onwe anyị chekwara na ndị Eshia niile yiri, nakwa na àgwà ha bụ otu n’agbanyeghị obodo ha si. Ma o teghị aka anyị achọpụta na ọ bụghị otú ahụ anyị si chee ya ka ọ dị. Ọ bụghị naanị na ndị Korea nwere asụsụ nke ha na otú ha si ede ihe nke ha, ha nwekwara ụdị nri nke ha, ọdịdị ha, na uwe ọdịnala ha, tinyekwara ihe ndị ọzọ ha ji dịrị iche, dị ka otú ha si arụ ụlọ.

Ihe mbụ kacha siere anyị ike bụ ịmụta asụsụ ha. Anyị enweghị akwụkwọ ndị anyị ga-eji amụ asụsụ Korean. Anyị bịara ghọta na ọ gaghị ekwe omume iji otú e si akpọpụta okwu na Bekee kpọọ okwu ndị e nwere n’asụsụ Korean. Ọ bụ naanị mgbe mmadụ mụtara mkpụrụ akwụkwọ asụsụ Korean ka ọ ga-enwe ike ịkpọpụta okwu kpọmkwem otú ha si akpọ ya.

Anyị kpọhiere okwu ọtụtụ mgbe. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe nwunye m jụrụ onye nwe ụlọ ma ò nwere Baịbụl. E nwere nnọọ otú onye nwe ụlọ si lee ya anya mgbe ọ na-abanye n’ime ụlọ, ọ gara weta mkpọ mkpá ọkụ. Kama ịjụ ya ma ò nwere sungkyung, bụ́ ihe ha na-akpọ “Baịbụl,” nwunye m jụrụ ya ma ò nwere sungnyang bụ́ ihe ha na-akpọ mkpá ọkụ.

Ka ọnwa ụfọdụ gachara, a gwara anyị gaa chọta ebe ndị ozi ala ọzọ ga na-ebi na Pusan, bụ́ obodo nọ n’Ebe Ndịda Korea nke nwere ọdụ ụgbọ mmiri. Anyị chọtara obere ọnụ ụlọ atọ anyị ga na-akwụ ụgwọ ya, bụ́ ebe anyị abụọ na ụmụnna nwaanyị abụọ ndị e zigara anyị na ha ebe ahụ ga-ebi. Ụlọ ahụ enweghị mmiri pọmpụ na ụlọ mposi wọta sistem. Ọ bụ naanị n’abalị ka mmiri na-enwe ike irute ndị nọ n’okpukpu ụlọ nke abụọ. N’ihi ya, anyị kere ya eke mgbe anyị ga na-ebili n’isi ụtụtụ gbajusịa ihe ndị anyị ji agbanye mmiri. Anyị na-esi mmiri ahụ n’ọkụ ma ọ bụ tinye ya mmiri ọgwụ bụ́ chlorine iji mee ka ọ dị mma ọṅụṅụ.

E nwekwara ihe ndị ọzọ mere ka ije ozi ebe ahụ siere anyị ike. Ọkụ eletrik anaghị enwusi ike, n’ihi ya, anyị enweghị ike iji njin e ji asa ákwà saa ákwà anyị ma ọ bụ dee ha. Ọ bụ paseeji ụlọ ahụ ka anyị ji mere kichin, ọ bụkwa naanị stovu ka anyị ji esi nri. Anyị mechara mụta iji ihe ndị a anyị nwere esi nri, onye ọ bụla na-esikwa n’ụbọchị o ketara. Ka afọ atọ gachara, mụ na nwunye m rịawara ịba ọcha n’anya. Ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ n’oge ahụ rịara ọrịa a. O were anyị ọtụtụ ọnwa iji gbakee, anyị rịakwara ọrịa ndị ọzọ.

Ihe Nyeere Ụmụnna Anyị Aka Idi Nsogbu Ha

Kemgbe iri afọ ise na ise, a na-enwe nsogbu n’ọchịchị mba Korea, bụ́ obodo mmiri gbara gburugburu. Otu ógbè a machiri ịlụ agha na ya kewara mba a abụọ. Ógbè a dị ihe dị ka kilomita iri ise na ise site n’ebe ugwu Seoul, nke bụ́ isi obodo Republic of Korea. N’afọ 1971, Frederick Franz, bụ́ onye si n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn, bịara leta anyị. Edugara m ya n’ógbè a, bụ́ ógbè a kacha eche nche n’ụwa. Ndị ọrụ Òtù Mba Ụwa na ndị na-anọchite anya mba abụọ ahụ ezukọtala n’ebe ahụ ọtụtụ ugboro.

N’ezie, anyị anaghị etinye aka ná ndọrọ ọchịchị ụwa a, tinyere nke e nwere na Korea. (Jọn 17:14) Ihe karịrị Ndịàmà puku iri na atọ e nwere na Korea anọọla iri puku afọ abụọ na isii n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ha jụrụ ibuso mmadụ ibe ha agha. (2 Kọr. 10:3, 4) Ụmụnna anyị ndị nwoke niile na-eto eto nọ n’obodo ahụ maara na otu ụbọchị a ga-akpọ ha bịa gaa agha, ma ụjọ adịghị atụ ha. Ọ dị nnọọ mwute na ndị ọchịchị na-akpọ Ndị Kraịst ndị a “ndị omempụ,” ihe bụ́kwanụ “mpụ” ha mere bụ naanị na ha jụrụ ịlụ agha gbuo mmadụ.

M jụkwara ịga agha mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ n’afọ 1944, n’ihi ya, a tụrụ m mkpọrọ afọ abụọ na ọkara n’ụlọ mkpọrọ ndị United States dị na Lewisburg na Pennsylvania. Ọ bụ ezie na ụmụnna anyị ndị nwoke nọ na Korea ataala ahụhụ ka nke ahụ n’ụlọ mkpọrọ, amaara m ụdị ahụhụ ụmụ okorobịa a bụ́ Ndịàmà tara. Ịmara na ụfọdụ n’ime anyị ndị na-eje ozi ala ọzọ na Korea ataala ụdị ahụhụ ahụ ha na-ata gbara ọtụtụ n’ime ha ume.—Aịza. 2:4.

Nsogbu Anyị Nwere

Otu esemokwu bilitere n’afọ 1977 nwalere ma ànyị ga-anọgide na-anọpụ iche. Ndị ọchịchị chere na ọ bụ anyị na-eme ka ụmụ okorobịa Korea ghara ịga agha na ibu ngwá agha. N’ihi ya, ndị ọchịchị kpebiri na ha agaghị ekwe ka ndị ozi ala ọzọ siri n’obodo ahụ pụọ n’ihi ihe ọ bụla lọghachi. Ha mere nke a site n’afọ 1977 ruo 1987. A sị na anyị si na Korea gaa ebe ọ bụla ọzọ n’afọ ndị ahụ, a garaghị ekwe ka anyị lọghachi. N’ihi ya, anyị agaghịdị leta ndị ikwu anyị n’afọ ndị ahụ niile.

Anyị gara hụ ndị ọchịchị ọtụtụ ugboro ma kọwaara ha ebe anyị bụ́ ndị na-eso ụzọ Kraịst kwụ. Ha mechara chọpụta na e nweghị ihe nwere ike imenye anyị ụjọ, n’ihi ya ka afọ iri gachara, ha kwere ka anyị na-apụ ma na-abata. N’afọ ndị ahụ, ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ siri n’obodo ahụ laa n’ihi ọrịa, ma ndị ọzọ alaghị, obi dịkwa anyị ụtọ na anyị alaghị.

N’ihe dị ka n’afọ 1985, ndị na-emegide ozi anyị boro ndị na-elekọta ụlọ ọrụ iwu kwadoro nke na-ahụ maka ọrụ anyị, ebubo ụgha na ha na-agwa ụmụ okorobịa agala agha. N’ihi ya, ndị ọchịchị kpọrọ onye ọ bụla n’ime anyị iji gbaa anyị ajụjụ. Na January 22, 1987, ndị ọkàiwu gọọmenti chọpụtara na ihe a bụ ebubo ụgha. Nke a nyere aka dozie nghọtahie ọ bụla nwere ike iselite isi.

Chineke Gọziri Ọrụ Anyị

Mmegide a na-emegide ọrụ ikwusa ozi ọma anyị na Korea kara njọ n’afọ ndị ahụ n’ihi na anyị achọghị ịga agha. Nke a mere ka o siere anyị nnọọ ike inweta ebe ndị anyị ga-anọ enwe mgbakọ anyị ndị buru ibu. N’ihi ya, anyị wuru Ụlọ Mgbakọ na Pusan, nke bụ́ Ụlọ Mgbakọ mbụ a rụrụ n’Eshia. Ọ bụ m kwuru okwu e ji nyefee Jehova ụlọ mgbakọ ahụ n’April 5, 1976, otu puku mmadụ na narị mmadụ atọ bịakwara ihe omume ahụ.

Kemgbe 1950, a kpọtala ọtụtụ iri puku ndị agha United States na Korea. Ọtụtụ n’ime ha ghọrọ Ndịàmà na-ejechi ozi anya mgbe ha laghachiri United States. Ha na-edetakarịrị anyị akwụkwọ ozi, obi dịkwa anyị ụtọ na anyị nyeere ha aka ịbịa mara Jehova.

O wutere m mgbe nwunye m m hụrụ n’anya bụ́ Liz, nwụnahụrụ m na September 26, 2006. Ọ na-agụsi m nnọọ agụụ ike ịhụ ya ọzọ. N’ime afọ iri ise na otu ọ nọrọ ebe a, o ji obi ụtọ nabata ọrụ ọ bụla e nyere ya, ọ dịtụghịkwa mgbe o mere mkpesa. Ọ dịtụghị mgbe ọ tụrụ aro ma ọ bụdị kwutetụ okwu ka anyị laghachi United States, bụ́ ebe o kwuru mbụ na ya agaghị ahapụ ahapụ!

M ka na-eje ozi na Betel dị na Korea. Ezinụlọ Betel ahụ esila ná mmadụ ole na ole na-eje ozi na ya mgbe ahụ ruo ihe dị ka narị mmadụ abụọ na iri ise taa. Ọ bụụrụ m ihe ùgwù iso ná mmadụ asaa nọ na Kọmitii Alaka, bụ́ ndị na-elekọta ọrụ anyị ná mba a.

Ọ bụ ezie na mba Korea dara ogbenye mgbe anyị rutere, o sozi ná mba ndị bara ọgaranya n’ụwa taa. E nwere ihe karịrị iri puku Ndịàmà itoolu na puku ise na Korea, ihe fọrọ obere ka o ruo iri puku anọ n’ime ha bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ ndị nke inye aka. Ihe a niile so n’ihe mere m ji nwee obi ụtọ ijere Chineke ozi ebe a ma hụ ka ìgwè atụrụ ya mụbara.

[Foto dị na peeji nke 24]

Mgbe anyị na ndị ozi ala ọzọ ibe anyị rutere Korea

[Foto dị na peeji nke 24, 25]

Mgbe anyị na-eje ozi na Pusan

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na Nwanna Franz n’afọ 1971 n’ógbè ahụ a machiri ịlụ agha na ya

[Foto dị na peeji nke 26]

Mụ na nwunye m obere oge tupu ya anwụọ

[Foto dị na peeji nke 26]

Alaka ụlọ ọrụ dị na Korea, bụ́ ebe m ka na-eje ozi n’ezinụlọ Betel