Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Cuneiform Mgbe Ochie na Baịbụl

Cuneiform Mgbe Ochie na Baịbụl

Cuneiform Mgbe Ochie na Baịbụl

MGBE a ghagbuchara asụsụ ụmụ mmadụ na Bebel, a bịara nwee ụzọ dị iche iche e si ede ihe. Ndị bi na Mesopotemia, dị ka ndị Sumer na ndị Babịlọn, mụtara ide ihe n’ụdị cuneiform. E si n’okwu Latịn nweta okwu ahụ bụ́ cuneiform. Ọ bụ akara ndị nwere akụkụ atọ e ji mkpịsị e ji ede ihe n’oge ochie dee ihe n’ụrọ na-akpọghị akpọ.

Ndị ọkà mmụta ihe ochie egwupụtala ihe ndị e dere n’ụdị cuneiform, bụ́ ndị kọrọ banyere ihe ndị mere eme nakwa ndị mmadụ a kọrọ akụkọ ha n’Akwụkwọ Nsọ. Olee ihe anyị maara banyere ụzọ mgbe ochie a e si ede ihe? Oleekwa otú ihe ndị ahụ e dere si agba akaebe na ihe e dere na Baịbụl bụ eziokwu?

Ihe Odide Ndị Dịterela Aka

Ndị ọkà mmụta na-ekwu na ná mmalite, e ji ihe osise ede ihe na Mesopotemia, nke pụtara na a na-enwe ihe e sere ese nke na-anọchi anya otu okwu ma ọ bụ ahịrịokwu. Dị ka ihe atụ, n’ihe odide ndị mbụ, isi oké ehi na-anọchi anya oké ehi ahụ n’onwe ya. Ma a malitere ide ihe n’ụdị cuneiform mgbe ọ dịwara mkpa ka e nwee ihe ndị e ji edekọ ihe. Akwụkwọ bụ́ NIV Archaeological Study Bible na-ekwu, sị: “Akara na-anọchizi anya, ọ bụghị naanị mkpụrụ okwu dị iche iche kamakwa nkeji okwu dị iche iche, ndị e nwere ike iwekọta wee kpọpụta otu mkpụrụ okwu.” A bịara nwee ihe dị ka akara dị narị abụọ e ji ede ihe n’ụdị cuneiform, ha niile “na-anọchi nnọọ anya okwu e kwuru ekwu, na otú e si ekwu ya na ụtọ asụsụ ya.”

Ka ọ na-erule oge Ebreham biri ndụ, ihe dị ka n’afọ 2,000 T.O.A., ide ihe n’ụdị cuneiform akakwuola mma. N’ime puku afọ abụọ sochirinụ, a malitere ide ihe dị ka asụsụ iri na ise n’ụdị cuneiform. Ọ bụ ná mbadamba ụrọ ka e dere ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ihe odide niile e nwetarala dị n’ụdị cuneiform. N’ime otu narị afọ na iri afọ ise gara aga, a chọtala ọtụtụ mbadamba ụrọ ndị dị otú ahụ n’obodo Ọọ, Uruk, Babịlọn, Nimrud, Nippur, Ashur, Ninive, Mari, Ebla, Ugarit, na Amarna. Akwụkwọ bụ́ Archaeology Odyssey na-ekwu, sị: “Ndị ọkachamara na-ekwu na e gwupụtala ihe dị ka mbadamba ụrọ dị otu nde ma ọ bụ nde abụọ, bụ́ ndị e dere ihe na ha n’ụdị cuneiform, a ka na-achọtakwa ihe dị ka puku iri abụọ na ise ma ọ bụ karịa kwa afọ.”

Ndị ọkà mmụta na-amụ banyere cuneiform gburugburu ụwa nwere nnukwu ọrụ nke ịsụgharị ihe ndị a e dere n’ụdị cuneiform. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, “ọ bụ naanị ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ndị a e dere n’ụdị cuneiform ka dịnụ ka a gụrụla naanị otu ugbo n’oge anyị a.”

Ọ bụ mgbe a chọtara ihe ndị e dere n’ụdị cuneiform n’asụsụ abụọ ma ọ bụ atọ ka a malitere ịghọta ihe e dere na ha. Ndị ọkà mmụta chọpụtara na ọ bụ otu ihe ahụ ka e dere n’ụdị cuneiform n’asụsụ dị iche iche. Ihe nyeere ha aka ịghọta ihe ndị e dere bụ mgbe ha chọpụtara na n’ihe odide ndị ahụ, e kwughachiri aha ndị mmadụ, utu aha, osuso ọmụmụ ndị eze na ọbụnadị okwu ụfọdụ ndị ji na-eto onwe ha ugboro ugboro.

Site n’ihe dị ka n’afọ 1851 gawa, ndị ọkà mmụta nweziri ike ịgụ asụsụ mba Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu n’oge ochie, asụsụ Akkadian, ma ọ bụ asụsụ ndị Asiria na Babịlọn na-aghọta, bụ́ ndị e dere n’ụdị cuneiform. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Ozugbo a ghọtara asụsụ Akkadian, ihe ndị ọzọ banyere otú e si dee ihe ndị ahụ bịaziri kwe nghọta, nke a mekwara ka ọ dị mfe ịsụgharị asụsụ ndị ọzọ e dere n’ụdị cuneiform.” Olee ihe jikọrọ ihe odide ndị a na Akwụkwọ Nsọ?

Ihe Akaebe nke Kwekọrọ n’Ihe Baịbụl Kwuru

Baịbụl kwuru na ọ bụ ndị eze bụ́ ndị Kenan chịrị Jeruselem tupu Devid emerie ha n’agha ma weghara obodo ha n’ihe dị ka afọ 1070 T.O.A. (Jọsh. 10:1; 2 Sam. 5:4-9) Ụfọdụ ndị ọkà mmụta ekwetaghị nke a. Ma n’afọ 1887, otu nwaanyị bụ́ ogbenye nke na-arụ ọrụ ugbo, chọtara otu mbadamba ụrọ n’obodo Amarna, dị n’Ijipt. Ndị ọkà mmụta mechara chọpụta na ihe dị ka narị ihe odide atọ na iri asatọ dị ná mbadamba ụrọ ahụ bụ akwụkwọ ozi ndị eze Ijipt bụ́ (Amenhotep nke Atọ na Akhenaton) na ndị eze Kenan degaara onwe ha banyere ihe metụtara obodo ha. Isii n’ime akwụkwọ ozi ahụ si n’aka ‘Abdi-Heba, eze Jeruselem.

Akwụkwọ bụ́ Biblical Archaeology Review na-ekwu, sị: “Ihe mbadamba ụrọ ahụ a hụrụ n’obodo Amarna kwuru nke gosiri nnọọ na Jeruselem bụ obodo, ọ bụghị ógbè ebe a rụrụ ọtụtụ ụlọ, nakwa na ‘Abdi-Heba’ bụ . . . gọvanọ, onye nwere ụlọ nke ya ma nwee ndị agha Ijipt iri ise na-eche nche n’ebe dị iche iche na Jeruselem, gosiri na Jeruselem bụ otu obere obodo dị n’elu ugwu ma nwee eze.” Otu akwụkwọ ahụ mechara kwuo, sị: “Dabere n’ihe e dere n’akwụkwọ ozi ahụ e nwetara n’obodo Amarna, obi nwere ike isi anyị ike na obodo a ma ama otú a n’oge ahụ, dị adị.”

Aha Ndị Dị n’Ihe Ndekọ Ndị Asiria na Babịlọn

Ndị Asiria, nakwa ka e mechara ndị Babịlọn, dere akụkọ banyere mba ha ná mbadamba ụrọ, na n’ihe ndị a tụrụ atụ, enyo, nakwa n’ihe ndị a kpụrụ akpụ e ji echeta ihe. N’ihi ya, mgbe ndị ọkà mmụta chọpụtara otú e si agụ cuneiform ndị e dere n’asụsụ Akkadian, ha hụrụ na aha ndị mmadụ dị na Baịbụl dịkwa n’ihe odide ndị ahụ.

Akwụkwọ bụ́ The Bible in the British Museum na-ekwu, sị: “N’okwu Dr Samuel Birch kwuru n’afọ 1870, bụ́ nke ọ gwara òtù ọhụrụ, bụ́ Òtù Na-ahụ Maka Ihe E Gwutere n’Ala Na-akwado Baịbụl, o kwuru na [n’ihe ndị e dere n’ụdị cuneiform], ya hụrụ aha ndị eze Hibru bụ́ Ọmraị, Ehab, Jihu, Azaraya, . . . , Menahem, Pika, Hoshia, Hezekaya na Manase, eze ndị Asiria bụ́ Tiglat-Piliza . . . [nke atọ], Sagọn, Senakerib, Isa-hadọn na Ashurbanipal, . . . nakwa eze ndị Siria bụ́ Benhadad, Hazel na Rizin.”

Akwụkwọ bụ́ The Bible and Radiocarbon Dating tụlere otú akụkọ banyere mba Izrel na Juda, bụ́ nke a kọrọ na Baịbụl, na ihe ndị e dere n’ụdị cuneiform oge ochie si kwekọọ. Gịnị ka a chọpụtara? “Aha ndị eze Juda na Izrel dị iri na ise ma ọ bụ iri na isii, ndị gbara n’ihe odide ndị mba ọzọ na-abụghị nke ndị Izrel, kwekọrọ nnọọ n’aha ndị eze ndị nke dị na Baịbụl nakwa n’oge ha biri ndụ [dịkwa nnọọ ka e si dee ha n’akwụkwọ Baịbụl bụ́] Ndị Eze. E nweghịdị ma ọ bụla aha otu onye eze nke na-adịghị ebe o kwesịrị ịdị, ọ dịghịkwanụ nke kpọrọ aha eze a na-akpọghị aha ya n’akwụkwọ Ndị Eze.”

Otu ihe odide a ma ama e dere n’ụdị cuneiform, bụ́ nke a chọtara n’afọ 1879, nke a kpọrọ Cyrus Cylinder, kwuru na ka Saịrọs merichara Babịlọn n’agha n’afọ 539 T.O.A., o mekwara otu ihe e ji mara ya, nke bụ́ ịgwa ndị a dọọrọ n’agha ka ha laghachi n’ala ha. Ndị Juu so ná ndị ritere uru n’ihe a o mere. (Ezra 1:1-4) Ọtụtụ ndị ọkà mmụta nke narị afọ nke iri na itoolu ekweghị n’ihe a e kwuru na Baịbụl na Saịrọs mere. Ma, ihe ndị e dere n’ụdị cuneiform n’oge ndị Peshia na-achị, nke gụnyere Cyrus Cylinder, gosiri nnọọ n’ụzọ doro anya na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu.

N’afọ 1883, a hụrụ ebe e debere ihe ndị e dere n’ụdị cuneiform karịrị narị asaa n’obodo Nippur dị nso Babịlọn. N’ime ihe karịrị aha puku abụọ na narị ise e dere na ha, iri asaa n’ime ha bụ aha ndị Juu. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Edwin Yamauchi si kwuo ya, “ndị a a kpọrọ aha ha bụ ndị ha na ndị ọzọ bịanyere aka n’akwụkwọ nkwekọrịta, ndị na-arụchitere ndị ọzọ ọrụ, ndị akaebe, ndị na-anakọta ụtụ isi, na ndị na-arụ ọrụ n’obí eze.” E nwere nnọọ ọtụtụ ihe ndị na-agba akaebe na ndị Juu nọgidere na-arụ ọrụ ndị a na nso Babịlọn n’oge ihe a mere. Nke a kwekọrọ n’amụma e buru na Baịbụl na n’agbanyeghị na “ndị fọdụrụ” ná ndị Izrel laghachiri Judia mgbe a dọrọchara ha n’agha laa Asiria na Babịlọn, e nwere ọtụtụ ndị nke na-alaghachighị.—Aịza. 10:21, 22.

N’ime puku afọ mbụ T.O.A., a ka na-ede ihe n’ụdị cuneiform, jirikwa mkpụrụ akwụkwọ na-ede. Ma ndị Asiria na ndị Babịlọn mechara hapụ ide ihe n’ụdị cuneiform ma jirizie naanị mkpụrụ akwụkwọ na-ede ihe.

A ka nwere ọtụtụ narị puku mbadamba nkume ndị dị n’ebe ndebe ihe mgbe ochie ndị a ka ga-amụ ihe banyere ha. Ndị nke ndị ọkachamara mụrụla banyere ha na-agba nnọọ akaebe na Baịbụl bụ ihe anyị nwere ike ịtụkwasị obi. Ònye ma akaebe ndị nke a na-amụbeghị banyere ha ga-agba?

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 21]

Foto a natara ndị na-ahụ maka Ebe A Na-edebe Ihe Ochie na Britain ikike see