Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ị Ga-eji Nọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?

Gịnị Mere Ị Ga-eji Nọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?

Gịnị Mere Ị Ga-eji Nọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?

“Jehova, kpee m ikpe . . . dị ka iguzosi ike n’ezi ihe m si dị.”—ỌMA 7:8.

1, 2. Olee ọnọdụ ụfọdụ nwere ike ime ka o siere Onye Kraịst ike iguzosi ike n’ezi ihe?

TỤLEGODỊ ihe atụ atọ a: E nwere otu nwatakịrị nwoke ụmụ akwụkwọ ibe ya nọ na-eme akaje. Ha nọ na-akpasu ya iwe, na-achọ ime ka ọ kpọwa ha iyi ma ọ bụ lụwa ọgụ. Ọ̀ ga-emegwara ha, ka ọ̀ ga-ejide onwe ya ma si ebe ahụ pụọ? Otu nwoke lụrụla nwaanyị nọ n’ụlọ naanị ya na-achọ ihe n’Ịntanet. Otu ihe pụtara n’ihu kọmputa ya ná mberede na-agwa ya ebe ọ ga-aga n’Ịntanet kirie ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Ọ̀ ga-aga ebe ahụ ka ọ̀ ga-emechi ihe ahụ pụtaranụ? Otu nwanna nwaanyị na ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ nọ na-akpa nkata, ka a na-eme, mkparịta ụka ha agawa n’ebe na-ekwesịghị. Ha ejirila otu nwanna nwaanyị nọ n’ọgbakọ gbawa asịrị. Ọ̀ ga-eso gbara asịrị ahụ gawa, ka ọ̀ ga-agbalị gbanwee ihe ahụ ha na-ekwu?

2 Ọ bụ ezie na ihe atụ atọ a abụghị otu, e nwere ihe jikọrọ ha atọ. A chọchara ka onye nke ọ bụla n’ime ha gosi na ya bụ Onye Kraịst na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ị̀ na-agbalị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ka ị na-eche ihe ndị dịịrị gị ma na-agbalị inweta ihe ndị dị gị mkpa ná ndụ? Kwa ụbọchị, ndị mmadụ na-eche banyere otú ha dị, ahụ́ ike ha, otú ha ga-esi kpata ihe ndị ha ji ebi ndụ, nakwa ihe ha ga-eme ka ha na ndị enyi ha dịrị ná mma na ihe ndị na-akpatara ha esemokwu, nakwa ihe banyere alụmdi na nwunye. Ihe ndị a nwere ike ịdị na-echu anyị ụra. Ma gịnị n’ezie ka Jehova na-achọ ịhụ ka ọ na-enyocha obi anyị? (Ọma 139:23, 24) Ọ bụ ma ànyị na-eguzosikwa ike n’ezi ihe.

3. Olee ihe Jehova nyere anyị ohere ịhọrọ, gịnịkwa ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Jehova, bụ́ Onye “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè” si n’aka, enyela onye ọ bụla n’ime anyị onyinye dị iche iche. (Jems 1:17) Ọ bụ ya nyere anyị onyinye ndị dị ka ahụ́, uche, ahụ́ ike, na nkà dị iche iche. (1 Kọr. 4:7) Ma, Jehova adịghị amanye anyị iguzosi ike n’ezi ihe. Ọ na-ahapụ anyị ka anyị jiri aka anyị kpebie ma ànyị ga-eguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụ na anyị agaghị eme otú ahụ. (Diut. 30:19) N’ihi ya, ọ ga-adị mma ma anyị tụlee ihe iguzosi ike n’ezi ihe pụtara. Anyị ga-atụlekwa ihe atọ mere o ji dị oké mkpa ka anyị na-eguzosi ike n’ezi ihe.

Gịnị Ka Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Pụtara?

4. Gịnị ka iguzosi ike n’ezi ihe gụnyere, gịnịkwa ka anyị nwere ike ịmụta n’iwu Jehova nyere banyere ụdị anụmanụ a ga-eji chụọrọ ya àjà?

4 O yiri ka ọtụtụ ndị aghọtachaghị ihe iguzosi ike n’ezi ihe pụtara. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a sị na ya na-eguzosi ike n’ezi ihe, ihe ọ na-ekwu okwu ya bụ ịkwụwa aka ọtọ. Ịkwụwa aka ọtọ dịkwa mkpa, ma ọ bụ naanị otu n’ime ihe ndị na-egosi na mmadụ na-eguzosi ike n’ezi ihe. Na Baịbụl, iguzosi ike n’ezi ihe gụnyere ime nnọọ omume ziri ezi, na ịghara inwe ntụpọ. Okwu Hibru ndị ọzọ ha na “iguzosi ike n’ezi ihe” yiri sitere n’okwu pụtara ihe ahụ́ dị mma, ihe zuru ezu, ma ọ bụ ihe na-enweghị ntụpọ. E ji otu n’ime okwu ndị a kọwaa ụdị àjà a ga-achụrụ Jehova. Jehova na-anabata àjà a chụụrụ ya naanị ma ọ bụrụ na ahụ́ dị anụ ahụ mma, ma ọ bụ na ahụ́ zuru ya okè. (Gụọ Levitikọs 22:19, 20.) Jehova baara ndị dara iwu ya ma weta anụ dara ngwụrọ, nke na-arịa ọrịa, ma ọ bụ nke kpuru ìsì iji chụọrọ ya àjà ezigbo mba.—Mal. 1:6-8.

5, 6. (a) Olee ihe atụ ndị gosiri na ọ na-amasịkarị anyị inweta ihe ahụ́ zuru okè, ma ọ bụ ihe zuru ezu? (b) Mgbe a bịara n’ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè nọ, anyị ịbụ ndị ga-eguzosi ike n’ezi ihe ọ̀ pụtara na anyị ga-ezurịrị okè? Kọwaa.

5 Mmadụ ịchọ inweta ihe ahụ́ zuru okè na iji ya akpọrọ ihe abụghị ihe ọhụrụ. Ka e were ya na e nwere otu nwoke chọtara akwụkwọ dị ya ezigbo mkpa ọ chọrọla nnọọ ruo ogologo oge. Ma mgbe ọ saghewere ya, ọ chọpụtara na ọtụtụ peeji ndị dị ezigbo mkpa adịghịzi na ya. O nwere ike iji iwe doghachi akwụkwọ ahụ. Ma ọ bụkwanụ, ka e were ya na otu nwaanyị gara ahịa ịzụ àkwá, ọ̀ ga-ahọrọ ndị nke ahụ́ dị mma ka ọ̀ bụ ndị nke gbakere agbake? Ọ ga-ewere ndị nke ahụ́ zuru okè, ndị nke na-enweghị ihe mere ha. N’otu aka ahụ, Chineke na-achọ ndị ga-eji obi ha dum, ma ọ bụ onwe ha niile na-ejere ya ozi.—2 Ihe 16:9.

6 Ma i nwere ike ịdị na-eche na mmadụ ga-ezunụ okè iji nwee ike ịbụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe. N’ihi mmehie anyị na ezughị okè, anyị nwere ike ịdị na-ele onwe anyị anya ka akwụkwọ peeji ya na-ezughị ezu ma ọ bụ àkwá gbakere agbake. Ọ̀ na-adị gị otú a mgbe ụfọdụ? Obi sie gị ike na Jehova adịghị achọ ka anyị zuo okè ka ya. Ọ dịghị achọ ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. * (Ọma 103:14; Jems 3:2) Ma ọ chọrọ ka anyị na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ya mere, ò nwere ihe dị iche n’izu okè na iguzosi ike n’ezi ihe? Ee. Iji maa atụ: Ka e were ya na e nwere otu nwa okorobịa hụrụ otu nwa agbọghọ n’anya ma chọọ ịlụ ya. Ọ ga-abụrụ ya iberibe ịtụ anya na nwa agbọghọ ahụ ga-ezu okè. Ma, o kwesịrị ekwesị ma ọ tụọ anya ka nwa agbọghọ ahụ jiri obi ya dum hụ ya n’anya, ya bụ, ka ọ hụ naanị ya n’anya. N’otu aka ahụ, Jehova bụ “Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.” (Ọpụ. 20:5) Ọ naghị atụ anya ka anyị zuo okè kama, ka anyị jiri obi anyị dum hụ ya n’anya, ka anyị na-efe naanị ya ofufe.

7, 8. (a) Olee otú Jizọs si gosi na ya na-eguzosi ike n’ezi ihe? (b) Olee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru na iguzosi ike n’ezi ihe pụtara?

7 Ka anyị cheta ihe Jizọs zara mgbe a jụrụ ya iwu kacha mkpa n’ime iwu niile. (Gụọ Mak 12:28-30.) Ọ bụghị naanị na Jizọs kwuru nke ọ bụ, o gosipụtara ya n’omume. O setịpụrụ ihe nlereanya kachanụ n’iji uche ya dum, obi ya dum, mkpụrụ obi ya dum, na ike ya dum hụ Jehova n’anya. O gosiri na mmadụ ikwu na ya na-eguzosi ike n’ezi ihe abụghị ya na-egosi na ọ na-eme otú ahụ kama ọ bụ omume ziri ezi onye ahụ ji ezi obi mee na-egosi na ọ na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ezie. Ọ dị mkpa ka anyị na-agbaso nzọụkwụ Jizọs iji nwee ike iguzosi ike n’ezi ihe.—1 Pita 2:21.

8 Lezie ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru na iguzosi ike n’ezi ihe pụtara: Ọ bụ iji obi anyị dum na-ejere Onye bi n’eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, ozi, nakwa ime uche ya na nzube ya. Iguzosi ike n’ezi ihe pụtara na anyị ga na-agbalịsi ike ime ihe na-amasị Jehova Chineke kwa ụbọchị. Ihe ndị na-amasị ya kwesịrị ịbụ ihe ndị anyị na-ebute ụzọ ná ndụ anyị. Ka anyị tụlee ihe atọ mere nke a ji dị oké mkpa.

1. Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Anyị na Okwu Banyere Ọbụbụeze Jehova

9. Gịnị gbasara anyị iguzosi ike n’ezi ihe na okwu banyere onye kwesịrị ịchị eluigwe na ala?

9 Ọ bụghị ma anyị na-eguzosi ike n’ezi ihe ga-ekpebi ma ọ̀ bụ Jehova kwesịrị ịchị ma ọ̀ bụ na ọ bụghị ya. Ọchịchị ya ziri ezi, na-adịrukwa ebighị ebi. Ọ na-achịkwa ma eluigwe ma ụwa. Ọ ga-adịgide otú a n’agbanyeghị ihe onye ọ bụla e kere eke kwuru ma ọ bụ mee. Ma, a katọọla nnọọ ọbụbụeze Chineke n’eluigwe na n’ụwa. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka e gosi n’ihu ihe niile e kere eke nwere ọgụgụ isi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị, ya bụ, ka e gosi na ọchịchị ya kacha zie ezie, na ọ bụghị ọchịchị nchịgbu, nakwa na o ji ịhụnanya na-achị. Ọ na-amasị anyị bụ́ Ndịàmà Jehova ịkọrọ onye ọ bụla chọrọ ige ntị na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị eluigwe na ala. Ma, olee otú anyị onwe anyị ga-esi egosi ebe anyị kwụ? Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị họọrọ ka Jehova na-achị anyị? Ọ bụ site n’ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe.

10. Olee ihe Setan kwuru na ọ bụ ya mere ụmụ mmadụ ji na-eguzosi ike n’ezi ihe, oleekwa otú ị ga-achọ isi zaghachi ya?

10 Ka anyị tụlee otú gị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe si gbasa ọbụbụeze Jehova. Setan ekwuola na o nweghị mmadụ ga-akwado ọchịchị Chineke, nakwa na ọ dịghị onye ga-efe Jehova n’ihi na onye ahụ hụrụ Jehova n’anya, kama ọ bụ n’ihi ihe ọ na-erite n’aka Jehova. Ekwensu nọ n’ihu imerime ndị mmụọ e kere eke gwa Jehova, sị: “Akpụkpọ ahụ́ laara akpụkpọ ahụ́, ọ bụkwa ihe ọ bụla mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya.” (Job 2:4) Ị ga-ahụ na ọ bụghị naanị nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job ka Setan boro ebubo a, o boro ya ụmụ mmadụ niile. Ọ bụ nke a mere Baịbụl ji kpọọ Setan “onye na-ebo ụmụnna anyị ebubo.” (Mkpu. 12:10) Ọ kwara Jehova emo na Ndị Kraịst—gụnyere gị—agaghị anọgide na-eme uche ya. Setan kwuru na ị ga-akwụsị ife Jehova iji chebe akpụkpọ ahụ́ gị. Olee otú ebubo a e boro gị dị gị? Ị́ gaghị achọ ohere iji gosi na Setan bụ onye ụgha? Ọ bụrụ na ị nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, ị ga-eme Setan onye ụgha.

11, 12. (a) Olee ihe atụ ndị gosiri otú mkpebi ndị anyị na-eme kwa ụbọchị si egosi ma ànyị na-eguzosi ike n’ezi ihe? (b) Olee ihe mere iguzosi ike n’ezi ihe ji bụrụ ihe ùgwù?

11 N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị lebara àgwà ndị anyị na-akpa kwa ụbọchị na ihe ndị anyị na-ahọrọ ime anya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ka anyị laghachigodị n’ihe atụ atọ ahụ anyị nyere ná mmalite. Olee ihe ndị ahụ e kwuru okwu ha ga-eme iji gosi na ha na-eguzosi ike n’ezi ihe? Ihe mbụ ga-agbata nnọọ nwata ahụ ụmụ akwụkwọ ibe ya na-eme akaje n’obi ime bụ imegwara ha, ma mgbe o chetara ndụmọdụ a: “Unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere; n’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru,’” o siri ebe ahụ pụọ. (Rom 12:19) Nwoke ahụ lụrụla nwaanyị nke na-achọ ihe n’Ịntanet nwere ike ikiri ihe ndị ahụ na-akpali agụụ mmekọahụ, ma o chetara ihe Job kwuru, sị: “Mụ na anya m agbawo ndụ. Oleezi otú m ga-esi nwee mmasị n’ebe nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nọ?” (Job 31:1) Dị ka Job mere, nwoke ahụ ekweghị ekiri ihe ndị ahụ rụrụ arụ, o zeere ha dị ka à ga-asị na ha bụ nsí. Nwaanyị ahụ mkparịta ụka ha gawara n’iji ndị ọzọ agba asịrị jidere onwe ya mgbe o chetara ndụmọdụ e nyere, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-eme ihe na-amasị onye agbata obi ya n’ihe dị mma maka iwuli ya elu.” (Rom 15:2) Iso gbawa asịrị ahụ agaghị ewuli elu. Nke ahụ ga-emebi aha nwanna ya nwaanyị; ọ gaghịkwa amasị Nna ya nke eluigwe. N’ihi ya, ọ kwara ire ya nga ma gbanwee ihe ha na-ekwu.

12 Na nke ọ bụla n’ihe atụ ndị a, onye ọ bụla n’ime ha họọrọ ime ihe na-egosi na ọ na-asị: ‘Jehova bụ Onye na-achị m. Aga m agbalị ime ihe na-amasị ya n’okwu a.’ Ị̀ na-agbalị ime ihe na-amasị Chineke mgbe ị na-ahọrọ ma ọ bụ na-ekpebi ihe ị ga-eme? Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị na-eme ihe kwekọrọ n’okwu a na-emetụ n’ahụ́ nke dị n’Ilu 27:11: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.” Leenụ ụdị ihe ùgwù anyị nwere ime ka obi Chineke ṅụrịa! Nke a ó rughị mgbalị ọ bụla anyị ga-eme iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe?

2. Ihe Chineke Ga-elekwasị Anya Kpee Anyị Ikpe

13. Olee otú ihe Job na Devid kwuru si egosi na Jehova na-elekwasị anya n’otú anyị si eguzosi ike n’ezi ihe ekpe anyị ikpe?

13 Anyị ahụla na ịdị na-eguzosi ike n’ezi ihe na-enyere anyị aka ịkwado ọbụbụeze Jehova. Ọ bụ ya bụ ihe Chineke ga-elekwasị anya kpee anyị ikpe. Job ghọtara na nke a bụ eziokwu. (Gụọ Job 31:6.) Job maara na Chineke ji “ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi” atụ mmadụ niile. Ịbụ onye na-ekpe nnọọ ikpe ziri ezi na-enyere Jehova aka ịma ma ànyị na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ezie. Devid kwukwara ihe yiri nke a, sị: “Jehova ga-ekpe ndị dị iche iche ikpe. Jehova, kpee m ikpe dị ka ezi omume m si dị nakwa dị ka iguzosi ike n’ezi ihe m si dị. . . . Chineke bụ́ onye ezi omume na-enyocha obi na akụrụ.” (Ọma 7:8, 9) Anyị maara na Chineke nwere ike inyoba anya n’ime mmadụ, ya bụ, n’ime “obi na akụrụ” ihe atụ. Ma, anyị kwesịrị icheta ihe ọ na-achọ. Dị ka Devid kwuru, Jehova na-ekpe anyị ikpe na-adabere n’otú anyị si eguzosi ike n’ezi ihe.

14. Gịnị mere anyị ekwesịghị iche na ezughị okè na mmehie anyị ketara eketa agaghị ekwe ka anyị guzosie ike n’ezi ihe?

14 Chegodị ihe ọ dị ka ya Jehova Chineke inyocha obi ọtụtụ ijeri mmadụ taa. (1 Ihe 28:9) Ugboro ole ka ọ na-ahụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe dị ka Kraịst? O siri nnọọ ike inweta onye dị otú ahụ! Ma, anyị ekwesịghị iche na anyị agaghị enwe ike iguzosi ike n’ezi ihe n’ihi na anyị ezughị okè. Kama nke ahụ, dị ka Devid na Job, anyị nwere ezi ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova ga-ahụ ka anyị na-eguzosi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. Buru nke a n’uche: na mmadụ zuru okè apụtaghị na onye ahụ ga-eguzosi ike n’ezi ihe. Ọ bụ naanị mmadụ atọ zuru okè bitụrụla n’ụwa a, mmadụ abụọ n’ime ha, bụ́ Adam na Iv, eguzosighịkwa ike n’ezi ihe. Ma, ọtụtụ nde ụmụ mmadụ na-ezughị okè eguzosiela ike n’ezi ihe. Gị onwe gị nwekwara ike ime otú ahụ.

3. Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Dị Olileanya Anyị Oké Mkpa

15. Olee otú Devid si gosi na iguzosi ike n’ezi ihe dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ihe ndị anyị na-atụ anya ha n’ọdịnihu?

15 Ebe ọ bụ na Jehova ga-elekwasị anya n’otú anyị si eguzosi ike n’ezi ihe ekpe anyị ikpe, ọ dị mkpa na anyị ga-eguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ihe ndị anyị na-atụ anya ha n’ọdịnihu. Devid maara na nke a bụ eziokwu. (Gụọ Ọma 41:12.) O nwere olileanya ịnọgide bụrụ enyi Chineke ruo mgbe ebighị ebi. Dị ka ezi Ndị Kraịst taa nwere, Devid nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi, ịnọgide na-abịaru Jehova Chineke nso ma na-ejere ya ozi. Devid maara na ya kwesịrị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịhụ mmezu nke olileanya ahụ. N’otu aka ahụ, Jehova na-enyere anyị aka, na-akụziri anyị ihe, ma na-agọzi anyị ka anyị na-anọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe.

16, 17. (a) Gịnị mere i ji kpebisie ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe? (b) Olee ajụjụ ndị a ga-elebara anya n’isiokwu na-esonụ?

16 Olileanya dị oké mkpa ka anyị wee nwee ike inwe obi ụtọ ugbu a. Ọ pụrụ ime ka anyị nwee ọṅụ, bụ́ ihe dị mkpa iji die ihe isi ike. Olileanya nwere ike ichebe echiche anyị. Cheta na Baịbụl ji olileanya tụnyere okpu agha. (1 Tesa. 5:8) Dị ka okpu agha si echebe isi onye agha n’ọgbọ agha, olileanya na-echebe uche anyị ka Setan ghara ịkụnye echiche ya na-ezighị ezi juru n’ụwa a na-ala n’iyi n’ime ya. N’ezie, ndụ anyị enweghị isi ma ọ bụrụ na anyị enweghị olileanya. Anyị kwesịrị inyocha onwe anyị nke ọma, mara ma ànyị na-eguzosikwa nnọọ ike n’ezi ihe nakwa ma ànyị nwere olileanya ya na ya na-agakọ. Echefula na ọ bụrụ na ị na-eguzosi ike n’ezi ihe, ị na-akwado ọbụbụeze Jehova ma na-echebe olileanya dị oké ọnụ ahịa i nwere maka ọdịnihu. Ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị kwụsị iguzosi ike n’ezi ihe!

17 Ebe ọ bụ na iguzosi ike n’ezi ihe dị oké mkpa, e nwere ajụjụ ndị ọzọ ọ ga-adị mkpa ka anyị tụlee. Olee otú anyị si aghọ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe? Olee otú anyị nwere ike isi nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe? Gịnịkwa ka e nwere ike ime ma ọ bụrụ na mmadụ akwụsịtụ iguzosi ike n’ezi ihe? A ga-elebara ajụjụ ndị a anya n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, unu aghaghị izu okè, dị ka Nna unu nke eluigwe zuru okè.” (Mat. 5:48) O doro anya na ọ ghọtara na ọbụna ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ike izu ezu, ma ọ bụ izu okè, ruo n’ókè ụfọdụ. Anyị ga-emeli ihe ahụ e nyere anyị n’iwu ka anyị na-ahụ nnọọ ndị ọzọ n’anya, si otú a na-eme ihe na-amasị Chineke. Ma, Jehova zuru okè n’ihe niile. N’ihi ya, mgbe a na-ekwu banyere Jehova, okwu ahụ bụ́ “iguzosi ike n’ezi ihe” pụtakwara izu okè.—Ọma 18:30.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Gịnị bụ iguzosi ike n’ezi ihe?

• Olee ihe jikọrọ iguzosi ike n’ezi ihe na okwu metụtara onye kwesịrị ịchị eluigwe na ala?

• Olee otú iguzosi ike n’ezi ihe si dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ihe ndị anyị na-atụ anya ha n’ọdịnihu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Ihe ndị na-eme ná ndụ kwa ụbọchị na-ele anyị ule ma ànyị ga-eguzosikwa ike n’ezi ihe