Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kpebisie Ike Ịgbasi Àmà Ike

Kpebisie Ike Ịgbasi Àmà Ike

Kpebisie Ike Ịgbasi Àmà Ike

“O nyekwara anyị iwu ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịgba àmà nke ọma.”—ỌRỤ 10:42.

1. Mgbe Pita na-agwa Kọniliọs okwu, olee ọrụ o kwuru na e nyere ndịozi?

OTU onyeisi ndị agha Ịtali kpọkọrọ ndị ikwu ya na ndị enyi ya maka otu nnọkọ dị ezigbo mkpa nke a nọ na ya nwee otu mgbanwe dị ukwuu n’otú Chineke si emeso ụmụ mmadụ ihe. Nwoke a na-atụ egwu Chineke bụ Kọniliọs. Pita onyeozi gwara ndị ahụ zukọrọnụ na e nyere ndịozi iwu “ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịgba àmà nke ọma” banyere Jizọs. Ozi ọma Pita kwusaara ha rụpụtara ọtụtụ ihe dị mma. E nyere ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù mmụọ nsọ Chineke, mee ha baptizim, ha esorokwa ná ndị ha na Jizọs ga-abụ eze n’eluigwe. Àmà a Pita gbara nke ọma rụpụtara nnọọ ihe dị mma!—Ọrụ 10:22, 34-48.

2. Olee otú anyị si mara na ọ bụghị naanị ndịozi iri na abụọ ahụ ka e nyere ọrụ ikwusa ozi ọma?

2 Ihe a a kọrọ mere n’afọ 36 O.A. Ihe dị ka afọ abụọ tupu mgbe ahụ, e nwere otu ihe merenụ bụ́ nke gbanwere ndụ otu nwoke nke na-akpagbu nnọọ Ndị Kraịst. Nwoke a bụ Sọl onye Tasọs, ọ nọ na-aga Damaskọs mgbe Jizọs zutere ya ma gwa ya, sị: “Banye n’ime obodo, a ga-agwakwa gị ihe ị ga-eme.” Jizọs gwara onye na-eso ụzọ bụ́ Ananayas na Sọl ga-eburu ozi ọma ya “gakwuru ndị mba ọzọ, gakwurukwa ndị eze na ụmụ Izrel.” (Gụọ Ọrụ 9:3-6, 13-20.) Mgbe Ananayas zutere Sọl, ọ gwara ya, sị: “Chineke nke nna nna anyị hà ahọrọwo gị . . . n’ihi na ị ga-abụ onye àmà ya nye mmadụ niile.” (Ọrụ 22:12-16) Olee otú Sọl, bụ́ onye e mechara kpọwa Pọl, jiruru ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ kpọrọ ihe?

Ọ Gbasiri Nnọọ Àmà Ike!

3. (a) Olee akụkọ anyị ga-atụle? (b) Olee ihe ndị okenye ọgbakọ Efesọs mere mgbe e ziri ha na Pọl chọrọ ịhụ ha, oleekwa ezigbo ihe nke a na-akụziri anyị?

3 Ọ ga-amagbu onwe ya ma anyị tụlee ihe niile Pọl mere ka e mechara, ma ka anyị burugodị ụzọ tụlee okwu Pọl kwuru n’ihe dị ka n’afọ 56 O.A., bụ́ nke a kọrọ n’Ọrụ Ndịozi isi iri abụọ. Pọl kwuru okwu a obere oge tupu njem ozi ala ọzọ ya nke atọ abịa ná njedebe. Ọ kwụsịrị n’ọdụ ụgbọ mmiri Maịlitọs, bụ́ nke dị n’Oké Osimiri Aegea, ma zie ozi ka ndị okenye ọgbakọ Efesọs bịa hụ ya. Site na Maịlitọs ruo Efesọs dị ihe dị ka kilomita iri ise, ma ọ ga-akarị nke ahụ n’ihi na ụzọ ya dị rịgọrịgọ. Chetụdị ụdị obi ụtọ ndị okenye Efesọs ahụ nwere mgbe e ziri ha ozi Pọl. (Tụlee Ilu 10:28.) Ọ bụ ezie na obi dị ha ụtọ, ha ga-eme ndokwa ịga Maịlitọs. Ọ̀ ga-adị mkpa ka ụfọdụ n’ime ha nara onye ha na-arụrụ ọrụ ikike ma ọ bụ gbachie ụlọ ahịa ha? Ọtụtụ Ndị Kraịst na-eme nke a taa iji hụ na ha ahapụghị ọbụna otu ihe omume nke mgbakọ distrikti ha na-enwe kwa afọ.

4. Olee ihe Pọl rụzuru n’afọ ole na ole ọ nọrọ n’Efesọs?

4 Olee ihe i chere Pọl nọ na-eme na Maịlitọs n’ime abalị atọ ma ọ bụ abalị anọ ahụ tupu ndị okenye ahụ abịarute? Gịnị ka ị gaara eme ma ọ bụrụ gị? (Tụlee Ọrụ 17:16, 17.) Ihe Pọl gwara ndị okenye ọgbakọ Efesọs ahụ na-enyere anyị aka ịmatụ ihe ọ nọ na-eme. Ọ kọọrọ ha ụdị obi o ji na-ekwusa ozi ọma kemgbe ọtụtụ afọ, tinyere mgbe mbụ ọ bịara Efesọs. (Gụọ Ọrụ 20:18-21.) Ebe ọ maara na ọ dịghị onye ga-agbagha ihe o kwuru, ọ sịrị: ‘Unu maara nke ọma otú m si gbasie àmà ike malite n’ụbọchị mbụ m batara n’ógbè Eshia.’ N’ezie, o kpebisiri ike ịrụzu ọrụ Jizọs nyere ya. Olee otú o si mee nke a n’Efesọs? Otu ụzọ o si mee ya bụ ịga kwusaara ndị Juu ozi ọma n’ebe ọ ga-ahụ ọtụtụ n’ime ha. Luk kọrọ na mgbe Pọl nọ n’Efesọs n’ihe dị ka n’afọ 52 ruo 55 O.A., ọ ‘gwara ndị mmadụ okwu n’ụlọ nzukọ ha n’ụzọ na-eru n’obi.’ Mgbe ndị Juu “malitere ime ka obi ha kpọọ nkụ ma ghara ikwere,” Pọl gakwuuru ndị ọzọ nọ n’obodo ahụ na-ekwusakwara ha ozi ọma. O si otú a kwusaara ndị Juu na ndị Grik ozi ọma ná nnukwu obodo ahụ.—Ọrụ 19:1, 8, 9.

5, 6. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ọ bụ ndị na-ekweghị ekwe ka Pọl kwusaara ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

5 Ka oge na-aga, ụfọdụ ndị Pọl kwusaara ozi ọma na Maịlitọs ha abụrụ Ndị Kraịst, ghọrọ ndị okenye. Pọl chetaara ha ụzọ o si kwusaara ha ozi ọma, sị: “M laghị azụ ịgwa unu nke ọ bụla n’ime ihe ndị bara uru ma ọ bụ izi unu ihe n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.” Ụfọdụ ndị n’oge anyị a sịrị na ihe Pọl na-ekwu ebe a bụ ịgara ndị kwere ekwe nleta ọzụzụ atụrụ. Ma ọ bụghị ya. A na-ekwukarị na a ‘na-ezi ihe n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ’ mgbe a na-ekwu banyere ikwusara ndị na-ekweghị ekwe ozi ọma. Ihe ọzọ Pọl kwuru mere ka nke a doo anya. O kwuru na ya gbasiiri “ma ndị Juu ma ndị Grik àmà ike banyere nchegharị n’ebe Chineke nọ na okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs.” O doro nnọọ anya na ndị Pọl nọ na-ekwusara ozi ọma bụ ndị na-ekweghị ekwe, bụ́ ndị kwesịrị ichegharị ma nwee okwukwe na Jizọs.—Ọrụ 20:20, 21.

6 Mgbe otu ọkà mmụta na-akọwa nnọọ ihe banyere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, o kwuru banyere ihe e dere n’Ọrụ Ndịozi 20:20, sị: “Pọl anọọla afọ atọ n’Efesọs. Ọ gara n’ụlọ ọ bụla, ma ọ bụkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, o kwusaara mmadụ niile nọ n’obodo ahụ ozi ọma (amaokwu nke 26). Ebe a ka Akwụkwọ Nsọ kwadoro ka a na-ezisa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ nakwa n’ebe ndị mmadụ gbakọrọ.” Ma Pọl ọ̀ bara n’ụlọ ndị mmadụ n’otu n’otu dị ka ọkà mmụta a kwuru ma ọ bụ na ọ baghị, ihe bụ́ isi bụ na ọ chọghị ka ndị okenye ọgbakọ Efesọs ahụ chefuo otú o si kwusaa ozi ọma na ihe ozi ya rụpụtara. Luk kwuru, sị: “Ndị niile bi n’ógbè Eshia nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma ndị Juu ma ndị Grik.” (Ọrụ 19:10) Ma olee otú o si bụrụ na “ndị niile” nọ n’Eshia nụrụ ozi ọma ahụ, gịnịkwa ka nke a na-egosi banyere ozi ọma anyị na-ekwusa taa?

7. Olee otú o nwere ike isi bụrụ na ozi ọma Pọl kwusara baara ọbụna ndị ọ na-agwaghị okwu n’onwe ya uru?

7 Ikwusa ozi ọma n’ebe ọtụtụ mmadụ na-anọkarị nakwa ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ mere ka ọtụtụ mmadụ nụ ozi ọma Pọl. Ì chere na ndị niile a nụrụ okwu Pọl nọwaziri n’Efesọs, e nweghị onye gara rụọ ọrụ ma ọ bụ zụọ ahịa n’ebe ọzọ, gaa biri nso n’ebe ndị ikwu ya bi, ma ọ bụ gaa biri n’ebe a na-adịghị eme oké ụzụ a na-eme n’obodo ukwu? Mbanụ. Ọtụtụ ndị taa na-akwaga n’ebe ọzọ n’ihi ihe ndị a; o nwekwara ike i meela otú ahụ. N’oge ahụ, a na-enwekwa ndị na-esi n’obodo ọzọ abịa ekpori ndụ n’Efesọs ma ọ bụ azụ ahịa. O nwere ike ịbụ na ndị a na Pọl hụrụ ma ọ bụ ha anụ ozi ọma ya oge ha bịara Efesọs. Olee ihe ga-eme ma ha laghachi obodo ha? Ndị nabatara eziokwu ahụ ga-agbara ndị ọzọ àmà. Ndị ọzọ nwere ike ha aghọghị ndị kwere ekwe, ma o yiri ka hà kọọrọ ndị ọzọ ihe ha nụrụ n’Efesọs. N’ihi ya, ndị ikwu, ndị agbata obi, ma ọ bụ ndị na-abịa azụ ahịa nụrụ eziokwu ahụ, ọ ga-abụkwa na ụfọdụ n’ime ha nabatara ya. (Tụlee Mak 5:14.) Olee ihe nke a na-egosi banyere otú àmà ị na-agba nke ọma nwere ike isi rụpụta ihe dị mma?

8. Olee otú o nwere ike ịbụ na ndị bi gburugburu Eshia si nụ ozi ọma ahụ?

8 Pọl dere banyere mgbe mbụ ọ gara ozi ọma n’Efesọs na ‘e megheere ya ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ.’ (1 Kọr. 16:8, 9) Olee ọnụ ụzọ Pọl na-ekwu okwu ya, oleekwa otú o si megheere ya? Ozi ọma Pọl nọgidere na-ekwusa n’Efesọs mere ka ozi ọma ahụ gbasaa. Tụlee ihe banyere obodo atọ bụ́ Kọlọsi, Leodisia na Haịrapọlis, bụ́cha ndị dị Efesọs nso. E nweghị mgbe Pọl gara ebe ndị ahụ, ma ozi ọma ruru ebe ndị ahụ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Epafras si. (Kọl. 2:1; 4:12, 13) Epafras ọ̀ nụrụ ozi ọma Pọl kwusara n’Efesọs ma ghọọ Onye Kraịst? Baịbụl ekwughị. Ma, ọ ga-abụ na Epafras nọchitere anya Pọl site n’ịgbasa eziokwu ahụ n’ógbè ya. (Kọl. 1:7) O nwekwara ike ịbụ na ozi ọma ahụ rutere obodo ndị dị ka Filadelfịa, Sadis, na Tayataịra n’afọ ndị ahụ Pọl nọ na-ekwusa ozi ọma n’Efesọs.

9. (a) Olee ihe Pọl chọsiri ike ime? (b) Olee ihe ga-abụ isiokwu dịịrị afọ 2009?

9 N’ihi ya, ndị okenye ọgbakọ Efesọs nwere nnọọ ọtụtụ ihe mere ha ga-eji kweta ihe Pọl kwuru, mgbe ọ sịrị: “Ọ dịghị ihe m ji mkpụrụ obi m kpọrọ, ma ọ bụrụhaala na m ga-agbacha ọsọ m ma jezuo ozi ahụ m natara n’aka Onyenwe anyị Jizọs, ya bụ, ịgbasi àmà ike banyere ozi ọma nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.” Ọ bụ n’amaokwu Baịbụl a ka e si nweta isiokwu dịịrị afọ 2009, bụ́ nke na-agba nnọọ ume ma na-akpali mmasị. Isiokwu a bụ: ‘Gbasie àmà ike banyere ozi ọma ahụ.’—Ọrụ 20:24.

Ịgbasi Àmà Ike Taa

10. Olee otú anyị si mara na anyị kwesịkwara ịgbasi àmà ike?

10 E wezụga ndịozi, ndị ọzọ bịara sonye ná ndị e nyere iwu “ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịgba àmà nke ọma.” Mgbe Jizọs, bụ́ onye a kpọlitere n’ọnwụ, gwara ihe dị ka narị mmadụ ise na-eso ụzọ ya gbakọtara na Galili okwu, o nyere ha iwu, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” Okwu Jizọs bụ́ “lee! m nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a!” gosiri na e nyere onye ọ bụla bụ́ ezigbo Onye Kraịst taa iwu ahụ.— Mat. 28:19, 20.

11. Olee ọrụ dị mkpa e ji mara Ndịàmà Jehova?

11 Ndị Kraịst na-anụ ọkụ n’obi anọgidela na-erube isi n’iwu ahụ e nyere ha, ha na-agbalịsi ike ‘ịgbasi àmà ike banyere ozi ọma ahụ.’ Ụzọ bụ́ isi ha si eme nke a bụ otú ahụ Pọl gwara ndị okenye ọgbakọ Efesọs na ya si mee nke ya, ya bụ, ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’otu akwụkwọ David G. Stewart, Jr. dere n’afọ 2007 banyere otú a kacha esi arụpụta ihe n’ozi ala ọzọ, o kwuru, sị: “Ụzọ Ndịàmà Jehova si akụziri ndị mmadụ ihe ha kweere na-arụpụta nnọọ ihe ndị dị mma karịa ikwu ya naanị n’ọnụ [ịnọ n’elu ọlta na-ekwu ya]. Ọ na-atọgbu ọtụtụ Ndịàmà Jehova atọgbu ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị ha kweere.” Gịnị ka nke a rụpụtarala? “N’afọ 1999, naanị site na pasent abụọ ruo anọ n’ime ndị m gbara ajụjụ n’isi obodo abụọ dị n’ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe kwuru na e nweela mgbe ndị ozi ala ọzọ nke chọọchị Latter-day Saints ma ọ bụ nke ndị ‘Mormon’ bịara leta ha. Ihe karịrị pasent iri asaa kwuru na Ndịàmà Jehova abịala n’onwe ha leta ha, ọbụna ọtụtụ ugboro.”

12. (a) Gịnị mere anyị ji aga “ọtụtụ ugboro” n’ụlọ ndị nọ n’ókèala anyị? (b) Ì nwere ike ịkọ otu onye ị maara na-anaghị aṅabu ntị n’ozi ọma anyị ma mechaa ṅawa ntị?

12 E nwere ike otú a ka ọ dị n’ebe i bi. Ọ ga-abụkwa na i so ná ndị garala leta ndị bi n’ógbè gị. Ka ị na-aga ‘n’onwe gị’ n’ụlọ ndị mmadụ ikwusara ha ozi ọma, i ziela ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị na ndị na-eto eto ozi ọma n’ụlọ ha. O nwere ike ụfọdụ egeghị gị ntị n’agbanyeghị na ị gaala na nke ha “ọtụtụ ugboro.” Ọ ga-abụ na ndị ọzọ getụrụ ntị ka ị na-akọwara ha otu amaokwu Baịbụl ma ọ bụ otu ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ma, o nwekwara ike ịbụ na ndị ọzọ gere ntị nke ọma n’ozi ọma gị, nabatakwa ihe ị gwara ha. Anyị nwere ike izute nke ọ bụla n’ọnọdụ ndị a ka anyị ‘na-agbasi àmà ike banyere ozi ọma ahụ.’ Dịkwa nnọọ ka ị maara, e nwere ọtụtụ ndị a gakwuuru “ọtụtụ ugboro” ma ha egosichaghị mmasị, ma ha emechaa gbanwee obi ha. Ikekwe e nwere ihe mere ha, ma ọ bụ onye ha hụrụ n’anya, nke mere ha ji nwewezie mmasị n’ozi ọma ahụ. Ugbu a, ha bụzi ụmụnna anyị. N’ihi ya, ike agwụla gị, ọ bụrụgodị na ọ dịla anya ị na-ezutebeghị ndị gere gị ntị. Anyị adịghị atụ anya na mmadụ niile ga-abata n’eziokwu ahụ. Ma ihe Chineke chọrọ bụ ka anyị nọgide jiri ịnụ ọkụ n’obi na-agbasi àmà ike.

Ihe Ndị Ozi Ọma Anyị Nwere Ike Ịrụpụta Anyị Na-amaghị

13. Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa nwere ike isi rụpụta ihe dị mma nke anyị na-amaghị?

13 Ọ bụghị naanị ndị Pọl nyeere aka n’onwe ya ha aghọọ Ndị Kraịst ka ozi ya baara uru; otú ahụ ka ọ dịkwa na nke anyị. Anyị na-agbalị ijechi ozi ọma anya site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-ekwusara mmadụ ole anyị nwere ike ozi ọma. Anyị na-ezi ndị agbata obi anyị, ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, na ndị ikwu anyị ozi ọma. Ànyị maara ihe niile ọ ga-arụpụta? Ụfọdụ nwere ike ịnabata ihe anyị gwara ha ozugbo. Mgbe ụfọdụ, mkpụrụ nke eziokwu ahụ nwere ike ọ gaghị eto n’obi ndị ụfọdụ ozugbo ma mechaa gbanye mgbọrọgwụ ma too n’obi onye ọzọ. A sịgodị na nke a emeghị, ndị anyị kwusaara ozi ọma nwere ike ịkọrọ ndị ọzọ ihe anyị kwuru, ihe anyị kweere, na otú anyị si akpa àgwà. N’ezie, o nwere ike ịbụ na ha amaghị ama mee ka mkpụrụ ndị ahụ a kụnyere n’ime ha hụ ala ọzọ dị mma ọ ga-anọ puo.

14, 15. Olee ihe ozi ọma otu nwanna nwoke ziri rụpụtara?

14 Ka anyị were Ryan na nwunye ya bụ́ Mandi, ndị bi na Florida, U.S.A., dị ka ihe atụ. N’ebe Ryan na-arụ ọrụ, ọ gbaara onye ọrụ ibe ya àmà. Otú Ryan si eji ejiji na otú o si ekwu okwu masịrị nwoke ahụ bụ́ onye Hindu. Mgbe ha na-akparịta ụka, Ryan kwuru okwu banyere mbilite n’ọnwụ na ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. N’otu uhuruchi n’ọnwa January, nwoke ahụ jụrụ nwunye ya bụ́ Jodi, ihe ọ maara banyere Ndịàmà Jehova. Nwaanyị a bụ onye Katọlik, o kwuru na naanị ihe ya maara banyere Ndịàmà Jehova bụ na ha na-aga “ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ.” N’ihi ya, Jodi dere okwu bụ́ “Ndịàmà Jehova” n’ebe a na-achọ ihe n’Ịntanet, bụ́ nke kpọgara ya na www.watchtower.org, bụ́ ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. Ruo ihe dị ka ọnwa atọ, Jodi gụrụ ọtụtụ akwụkwọ anyị ndị dị n’ebe ahụ, tinyere Baịbụl na isiokwu ndị masịrị ya.

15 Ka oge na-aga, Jodi hụrụ Mandi, onye bụ́ nọọsụ ibe ya. Obi dị Mandi ụtọ ịza Jodi ajụjụ ndị ọ jụrụ ya. Ka obere oge gachara, ha nwere otu mkparịta ụka were ogologo oge, bụ́ nke Jodi kpọrọ “site n’Adam ruo n’Amagedọn.” Jodi kwetara ka a bịa mụwara ya Baịbụl n’ụlọ ya. O teghị aka ya amalite ịga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ọnwa October, Jodi ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, e meekwa ya baptizim n’ọnwa February. O dere, sị: “Enwere m nnọọ obi ụtọ na afọ ojuju ugbu a m matara eziokwu ahụ.”

16. Gịnị ka ahụmahụ nwanna ahụ si Florida na-egosi banyere mgbalị anyị na-eme ịhụ na anyị gbasiri àmà ike?

16 Ryan amaghị na ozi ọma o ziri otu nwoke ga-eme ka onye ọzọ bata n’eziokwu ahụ. N’ezie, na nke ya, o mechara mata ihe mkpebi ya ‘ịgba àmà nke ọma’ rụpụtara. Ma, o nwere ike ịbụ na i kwusaara ndị mmadụ ozi ọma n’ụlọ ha, n’ebe ha na-arụ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ n’oge ị na-anọghị n’ozi, ma ị maghị na o si ebe ahụ gbasara gawa. Dịkwa nnọọ ka Pọl na-amaghị ihe niile ozi ọma o kwusara “n’ógbè Eshia” rụpụtara, o nwere ike o nweghị otú ị ga-esi amatacha ihe ọma niile àmà ị na-agbasi ike ga-arụpụta. (Gụọ Ọrụ 23:11; 28:23.) Ma, ọ dị nnọọ ezigbo mkpa ka ị nọgide na-agbasi àmà ike!

17. Gịnị ka i kpebisiri ike ime n’afọ 2009?

17 N’afọ 2009, ka anyị niile na-arụsi ọrụ ahụ e nyere anyị ike, nke bụ́ ịga na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ nakwa n’ụzọ ndị ọzọ. Ọ bụrụ na anyị emee otú a, anyị ga-enwe ike ikwu ka Pọl, bụ́ onye sịrị: “Ọ dịghị ihe m ji mkpụrụ obi m kpọrọ, ma ọ bụrụhaala na m ga-agbacha ọsọ m ma jezuo ozi ahụ m natara n’aka Onyenwe anyị Jizọs, ya bụ, ịgbasi àmà ike banyere ozi ọma nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.”

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú Pita na Pọl onyeozi nakwa ndị ọzọ na narị afọ mbụ si gbasie àmà ike?

• Gịnị mere ozi ọma anyị na-ekwusa ga-eji nwee ike ịrụpụta ihe karịrị ihe anyị maara?

• Gịnị bụ isiokwu dịịrị afọ 2009, oleekwa ihe mere i ji chee na o kwesịrị ekwesị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

Isiokwu dịịrị afọ 2009 ga-abụ: ‘Gbasie àmà ike banyere ozi ọma ahụ.’ —Ọrụ 20:24.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị Okenye Efesọs maara na Pọl na-agba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ

[Foto dị na peeji nke 18]

Olee otú gị ịgbasi àmà ike ga-abaruru ndị mmadụ uru?