Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-eje Ozi Ka Onye Chineke Gosiri ‘Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ’?

Ị̀ Na-eje Ozi Ka Onye Chineke Gosiri ‘Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ’?

Ị̀ Na-eje Ozi Ka Onye Chineke Gosiri ‘Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ’?

“N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ. N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.”—ROM. 12:10.

1. Olee nkwa ndị e kwere anyị n’Okwu Chineke?

OKWU CHINEKE mesiri anyị obi ike ugboro ugboro na Jehova ga-enyere anyị aka mgbe anyị dara mbà n’obi ma ọ bụ mgbe anyị nwere obi mgbawa. Dị ka ihe atụ, tụlee okwu ndị a na-akasi obi: “Jehova na-akwado ndị niile na-ada ada, ọ na-ekulitekwa ndị niile huuru ehuru.” “Ọ na-agwọ ndị e tiwara obi, ọ na-ekechikwa ọnyá na-egbu ha mgbu.” (Ọma 145:14; 147:3) Nna anyị nke eluigwe kwukwara, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’”—Aịza. 41:13.

2. Olee otú Jehova si enyere ndị ohu ya aka?

2 Ma, olee otú Jehova, bụ́ onye bi n’eluigwe nke anyị na-anaghị ahụ anya, si ‘esekpụ anyị n’aka’? Olee otú o si ‘ekulite anyị mgbe obi mgbawa mere ka anyị huru ehuru’? Jehova bụ́ Chineke na-enyere anyị aka n’ọtụtụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, o ji mmụọ nsọ ya enye ndị ya “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Kọr. 4:7; Jọn 14:16, 17) Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee, bụ́ Baịbụl, nke na-enye ike, na-ekulitekwa ndị ohu Chineke. (Hib. 4:12) Ò nwere ụzọ ọzọ Jehova si eme ka anyị dị ike? Anyị ga-ahụ azịza ajụjụ a n’Akwụkwọ Pita nke Mbụ.

“Obiọma Chineke nke Na-erughịrị Mmadụ, nke A Na-egosi n’Ụzọ Dị Iche Iche”

3. (a) Gịnị ka Pita onyeozi kwuru banyere ọnwụnwa? (b) Gịnị ka e kwuru okwu ya ná ngwụcha akwụkwọ ozi nke mbụ Pita dere?

3 Mgbe Pita onyeozi degaara ndị kwere ekwe e ji mmụọ nsọ tee mmanụ akwụkwọ ozi, ọ gwara ha na ha kwesịrị ịna-enwe ọṅụ n’ihi na ha ga-enweta ezigbo ụgwọ ọrụ. O kwukwara, sị: “Ọ bụ ezie na e mewo ka unu nwee mwute site n’ọnwụnwa dị iche iche ruo nwa oge ugbu a, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.” (1 Pita 1:1-6) Hụwa okwu ahụ bụ́ “dị iche iche” ama. Ọ na-egosi na mmadụ ga-enwe ọnwụnwa dị iche iche. Ma, Pita akwụsịghị ebe ahụ, ọ hapụghị ụmụnna ya ka ha na-eche ma hà ga-enwe ike idi ọnwụnwa ndị a dị iche iche ga-abịara ha. Kama nke ahụ, Pita gwara Ndị Kraịst ka obi sie ha ike na Jehova ga-enyere ha aka idi ọnwụnwa ọ bụla bịaara ha, n’agbanyeghị ụdị ọ bụ. Ihe a Pita kwuru iji mesie ha obi ike dị n’akụkụ ikpeazụ nke akwụkwọ ozi o dere, bụ́ ebe o kwuru ihe ndị metụtara “ọgwụgwụ ihe niile.”—1 Pita 4:7.

4. Gịnị mere ihe e dere na Pita nke mbụ isi anọ amaokwu iri ji akasi anyị obi?

4 Pita kwuru, sị: “Dị ka onye ọ bụla natara onyinye, jirinụ ya na-ejere ibe unu ozi dị ka ezi ndị nlekọta ụlọ n’ihe banyere obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, nke a na-egosi n’ụzọ dị iche iche.” (1 Pita 4:10) N’ebe a, Pita kwuru okwu ahụ bụ́ “dị iche iche” ọzọ. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ọ sịrị, ‘Ọnwụnwa na-abịara anyị n’ụdị dị iche iche, ma, Chineke na-esi n’ụzọ dị iche iche egosi anyị obiọma ya nke na-erughịrị mmadụ.’ Gịnị mere ihe a o kwuru ji akasi anyị obi? Ihe ihe a o kwuru pụtara bụ na ụdị ọnwụnwa ọ sọkwara ya bịara anyị, Chineke ga-egosi anyị ụdị obiọma na-erughịrị mmadụ nke ga-eme ka anyị die ọnwụnwa ahụ. Site n’ihe ahụ Pita kwuru, ị̀ chọpụtara otú Jehova si egosi anyị obiọma ya nke na-erughịrị mmadụ? Ọ na-esi n’aka Ndị Kraịst ibe anyị egosi anyị nke a.

‘Na-ejerenụ Ibe Unu Ozi’

5. (a) Gịnị ka Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ime? (b) Olee ajụjụ ndị e kwesịrị ịza?

5 Pita gwara ndị niile nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, sị: “Karịsịa ihe niile, nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ.” O kwukwara, sị: “Dị ka onye ọ bụla natara onyinye, jirinụ ya na-ejere ibe unu ozi.” (1 Pita 4:8, 10) N’ihi ya, onye ọ bụla nke nọ n’ọgbakọ kwesịrị iso na-eme ka Ndị Kraịst ibe ya dị ike. E nwere ihe dị oké ọnụ ahịa nke Jehova nwe, bụ́ nke e nyefere anyị n’aka ka anyị na-elekọta. Anyị kwesịkwara ime ka o ruo ndị ọzọ aka. Olee ihe bụ́ ihe ahụ e nyefere anyị n’aka ilekọta? Pita sị na ọ bụ “onyinye.” Gịnị ka onyinye ahụ bụ? Olee otú anyị si ‘eji ya ejere ibe anyị ozi’?

6. Olee ụfọdụ n’ime onyinye ndị e nyere Ndị Kraịst?

6 Okwu Chineke sịrị: “Ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè si n’elu bịa.” (Jes. 1:17) N’ezie, ọ bụ obiọma Jehova nke na-erughịrị mmadụ mere o ji nye ndị ya onyinye niile o nyere ha. Otu n’ime onyinye ndị pụrụ iche Jehova na-enye anyị bụ mmụọ nsọ. Onyinye ahụ na-enyere anyị aka ịmụta àgwà ndị na-amasị Chineke, àgwà ndị dị ka ịhụnanya, ịdị mma, na ịdị nwayọọ. Àgwà ndị ahụ ga-eme ka anyị jiri obi anyị dum hụ ụmụnna anyị n’anya, meekwa ka anyị nwee mmasị inyere ha aka. Ezi amamihe na ihe ọmụma sokwa n’onyinye ndị a na-enye anyị site n’enyemaka mmụọ nsọ. (1 Kọr. 2:10-16; Gal. 5:22, 23) N’ezie, ume anyị niile, ike anyị niile, na ihe ndị ọzọ anyị nwere ike ime bụ onyinye anyị ga-eji na-ewetara Nna anyị nke eluigwe otuto na nsọpụrụ. Chineke nyekwara anyị ọrụ ka anyị jiri ike anyị na àgwà anyị na-eme ka obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ na-erute ụmụnna anyị.

Olee Otú Anyị Ga-esi ‘Jiri Ya Na-ejere Ibe Anyị Ozi’?

7. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “dị ka” na-egosi? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

7 Pita kwuru banyere onyinye e nyere anyị, sị: “Dị ka onye ọ bụla natara onyinye, jirinụ ya na-ejere ibe unu ozi.” Okwu ahụ bụ́ “dị ka” na-egosi na ụdị àgwà mmadụ nwere na otú ike ya hà nwere ike ịdị iche na nke onye ọzọ. N’agbanyeghị ụdị onyinye anyị nwere, a gwara onye ọ bụla n’ime anyị ka o ‘jiri ya [ya bụ, onyinye ọ bụla e nyere ya] na-ejere ibe ya ozi.’ Ihe ọzọ bụ na okwu ahụ bụ́ “jirinụ ya na-ejere ibe unu ozi dị ka ezi ndị nlekọta ụlọ” bụ iwu. Ya mere, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-eji onyinye e nyere m eme ka ụmụnna m dị ike?’ (Tụlee 1 Timoti 5:9, 10.) ‘Ka m̀ na-eji ike Jehova nyere m eme ihe ga-abara naanị m uru, ikekwe, jiri ya na-akpakọba akụnụba ma ọ bụ jiri ya na-eme ka a na-anụ aha m?’ (1 Kọr. 4:7) Anyị na-eme ihe dị Jehova mma ma ọ bụrụ na anyị ejiri onyinye e nyere anyị ‘na-ejere ibe anyị ozi.’—Ilu. 19:17; gụọ Ndị Hibru 13:16.

8, 9. (a) Olee ụzọ ụfọdụ Ndị Kraịst nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa si enyere ụmụnna ha aka? (b) Olee otú ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ unu si enyere ibe ha aka?

8 Okwu Chineke gwara anyị ụzọ dị iche iche Ndị Kraịst oge ochie si jeere ibe ha ozi. (Gụọ Ndị Rom 15:25, 26; 2 Timoti 1:16-18.) N’otu aka ahụ, taa, ezi Ndị Kraịst na-eji obi ha dum na-erube isi n’iwu ahụ kwuru ka ha jiri onyinye e nyere ha na-ejere ụmụnna ha ozi. Tụlee ụzọ ụfọdụ ha si eme nke a.

9 Kwa ọnwa, ọtụtụ ụmụnna na-eji ọtụtụ awa akwadebe ihe omume ha nwere n’ọmụmụ ihe. Mgbe ha bịara ọmụmụ ihe ma kwuo ụfọdụ n’ime ihe ha mụtara mgbe ha na-amụ Baịbụl n’ụlọ ha, ihe ha na-ekwu, bụ́ nke jupụtara n’amamihe, na-enyere mmadụ niile nọ n’ọgbakọ aka ịkwụsi ike. (1 Tim. 5:17) E nwere ọtụtụ ụmụnna ndị e ji ịhụnanya na ọmịiko ha nwere n’ebe ụmụnna ha nọ mara. (Rom 12:15) Ụfọdụ na-agakarị n’ụlọ ndị dara mbà n’obi wee kpeere ha ekpere. (1 Tes. 5:14) Ndị ọzọ na-ewepụta oge jiri nlezianya deere Ndị Kraịst ibe ha ọnwụnwa bịaara akwụkwọ ozi ga-agba ha ume. Ndị ọzọkwa na-enyere ndị ahụ́ na-adịghị aka ka ha na-abịa ọmụmụ ihe ọgbakọ. Ọtụtụ puku Ndịàmà na-eso arụ ọrụ enyemaka. Ha na-enyere ụmụnna ha aka wughachi ụlọ ndị ọdachi bibiri. Ezigbo ịhụnanya ụmụnna ndị a nwere n’ebe ụmụnna ha nọ nakwa aka ha na-enyere ụmụnna ha so ‘n’obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, nke a na-egosi n’ụzọ dị iche iche.’—Gụọ 1 Pita 4:11.

Olee nke Ka Mkpa?

10. (a) Olee ọrụ abụọ Pọl ma na ya nwere ịrụrụ Chineke? (b) Olee otú anyị si eṅomi Pọl taa?

10 Ọ bụghị naanị na e nyere ndị ohu Chineke onyinye ha ga-eji na-enyere ụmụnna ha aka, kamakwa e nyere ha ọrụ izi ndị na-abụghị ụmụnna ha ozi. Pọl onyeozi ma na ya nwere ọrụ abụọ a ịrụrụ Jehova. O deere ọgbakọ dị n’Efesọs akwụkwọ ozi banyere “ọrụ nlekọta nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ” nke e nyere ya maka abamuru ha. (Efe. 3:2) Ma, o kwukwara, sị: “Chineke nwapụtaworo na anyị bụ ndị ruru eru ka e nyefee anyị ozi ọma ahụ n’aka.” (1 Tes. 2:4) Dị ka Pọl maara, anyị onwe anyị ma na e nyere anyị ọrụ ikwusa Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, anyị na-eṅomi ihe nlereanya Pọl, bụ́ onye ọ na-enweghị mgbe ike gwụrụ ya ikwusa ozi ọma. (Ọrụ 20:20, 21; 1 Kọr. 11:1) Anyị ma na ikwusa ozi ọma Alaeze nwere ike ịzọpụta ndụ ndị mmadụ. Ma, anyị ga-agbakwa mbọ iṅomi Pọl site n’ịchọpụta otú anyị ga-esi ‘na-enyetụ ụmụnna anyị onyinye ime mmụọ.’—Gụọ Ndị Rom 1:11, 12; 10:13-15.

11. Olee otú anyị kwesịrị isi lee ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ka ụmụnna anyị dị ike anya?

11 Ole nke ka mkpa n’ime ọrụ abụọ a Ndị Kraịst na-arụ? Ịjụ ajụjụ a yiri ịjụ banyere nnụnụ, sị, Olee nke ka mkpa n’ime nku ya abụọ? Azịza ya doro anya. Nnụnụ agaghị efe nke ọma ma ọ bụrụ na o nweghị nku abụọ. N’otu aka ahụ, anyị aghaghị ịrụrụ Chineke ọrụ abụọ a ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ Ndị Kraịst zuru ezu. Ya mere, kama ile ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ka ụmụnna anyị dị ike anya dị ka ọrụ abụọ na-enweghị ihe jikọrọ ha, anyị kwesịrị ile ha anya otú Pita onyeozi na Pọl onyeozi si lee ha anya. Ha lere ha anya dị ka ọrụ abụọ na-aga ụkwụ na ụkwụ. Olee otú ọrụ abụọ a si agakọ?

12. Olee otú anyị ga-esi bụrụ ngwá ọrụ Jehova ji arụ ọrụ?

12 Anyị, bụ́ ndị na-ezisa ozi ọma, kwesịrị ịgbalị izi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke, bụ́ nke na-enye obi ụtọ, otú ọ ga-eru ha n’obi. Ọ bụrụ na anyị emee otú a, anyị nwere ike inyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ma, anyị na-agbalịkwa iji ike ọ bụla anyị nwere na onyinye ndị ọzọ e nyere anyị na-agba ụmụnna anyị ume, na-agwa ha okwu ga-eme ha obi ụtọ, na-emekwara ha ihe ga-abara ha uru. Ọ bụ ụzọ ndị a ka Chineke si egosi anyị niile obiọma ya na-erughịrị mmadụ. (Ilu 3:27; 12:25) Ọ bụrụ na anyị emee otú a, anyị nwere ike inyere ha aka ịnọgide na-eso ụzọ Kraịst. Ọ bụrụ na anyị na-arụ ọrụ abụọ a, ya bụ, izi ndị na-abụghị Ndịàmà ozi ọma na ‘ijere ibe anyị ozi,’ anyị nwere ihe ùgwù magburu onwe ya nke ịbụ ngwá ọrụ Jehova ji arụ ọrụ.—Gal. 6:10.

“Na-enwenụ Obi Ọmịiko n’Ebe Ibe Unu Nọ”

13. Gịnị ga-eme ma anyị ghara ‘ijere ibe anyị ozi’?

13 Pọl gbara ụmụnna ya ume, sị: “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ. N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Rom 12:10) N’ezie, ọ bụrụ na anyị enwee obi ọmịiko n’ebe ụmụnna anyị nọ, anyị ga-eji obi anyị dum na-eje ozi dị ka ndị nlekọta ụlọ n’ihe banyere obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ. Anyị kwesịrị ịma na Setan ga-eme ka anyị ghara ịdị n’otu ma ọ bụrụ na o mee ka anyị ghara ‘ijere ibe anyị ozi.’ (Kọl. 3:14) Ọ bụrụkwa na anyị adịghị n’otu, anyị agaghị eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Setan ma nke ọma na ọ bụrụ na ya emee ka anyị kwụsị ịrụ otu n’ime ọrụ abụọ ahụ Jehova nyere anyị, bụ́ ihe yiri ịgbaji nnụnụ otu nku, na ya emebierela anyị ihe.

14. Ònye na-erite uru mgbe anyị ‘na-ejere ibe anyị ozi’? Nye ihe atụ.

14 ‘Ijere ibe anyị ozi’ na-abara ma ndị obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ ruterela ma ndị na-eme ka o rute ndị ọzọ, uru. (Ilu 11:25) Were Ryan na Roni, bụ́ di na nwunye bi n’Illinois, U.S.A., dị ka ihe atụ. Mgbe ha nụrụ na Ajọ Ifufe Katrina bibiri ọtụtụ narị ụlọ Ndịàmà ibe ha, ịhụnanya ha nwere n’ebe ụmụnna ha nọ mere ka ha gbaa arụkwaghịm n’ọrụ ha, kwapụ n’ụlọ ha, zụọ obere ụlọ ụgbọala na-adọkpụ, dozie ya, wee buru ya gaa Louisiana, nke dị otu puku kilomita na narị anọ site n’ebe ha bi. Ha biri n’ebe ahụ ihe karịrị otu afọ wee jiri oge ha, ike ha, na ihe ndị ọzọ ha nwere na-enyere ụmụnna ha aka. Ryan, bụ́ onye dị afọ iri abụọ na itoolu, kwuru, sị, “Ịrụ ọrụ iji nyere ụmụnna m ọdachi bibiri ụlọ ha aka mere ka mụ na Chineke dịkwuo ná mma. M hụrụ otú Jehova si enye ndị ya ihe na-akpa ha.” Ryan kwukwara, sị: “Mgbe mụ na ụmụnna ndị merela okenye nọ na-arụkọ ọrụ, m si n’aka ha mụta ọtụtụ ihe banyere otú m ga-esi na-enyere ụmụnna m aka. M mụtakwara na e nwere ọtụtụ ihe anyị, bụ́ ndị ntorobịa, kwesịrị ịna-eme n’ọgbakọ Jehova.” Roni, bụ́ onye dị afọ iri abụọ na ise, kwuru, sị: “M nwere obi ekele na m so nyere ndị ọzọ aka. Enwere m ụdị obi ụtọ m na-enwetụbeghị mbụ ná ndụ m. M ma na ọrụ a m so rụọ ga-anọgide na-abara m uru ruo ọtụtụ afọ.”

15. Olee ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-eje ozi dị ka ndị Chineke gosiri obiọma ya na-erughịrị mmadụ?

15 N’ezie, anyị niile na-enweta ngọzi ma ọ bụrụ na anyị erube isi n’iwu Chineke nyere anyị ka anyị kwusaa ozi ọma ma mee ka ụmụnna anyị dị ike. Ndị anyị nyeere aka na Chineke na-adịkwu ná mma, ebe anyị onwe anyị na-enwe ọṅụ dị ukwuu nke mmadụ na-enweta naanị site n’inye ndị ọzọ ihe. (Ọrụ 20:35) Ịhụnanya na-adịkwa n’ọgbakọ dum n’ihi na onye ọ bụla nwere mmasị n’ebe ibe ya nọ. Ihe ọzọ bụ na ịhụnanya anyị nwere n’ebe ibe anyị nọ na-egosi nnọọ na anyị bụ ezi Ndị Kraịst. Jizọs sịrị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Nke kachanụ bụ na ọ na-ewetara Nna anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova, otuto n’ihi na ọ bụ ya ka ndị ohu ya nọ n’ụwa na-eṅomi mgbe ha na-enyere ndị nọ ná mkpa aka. N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji jiri onyinye e nyere anyị na-ejere ibe anyị ozi dị ka ndị Chineke gosiri ‘obiọma ya na-erughịrị mmadụ.’ Ị̀ ga-anọgide na-eme nke a?—Gụọ Ndị Hibru 6:10.

Ì Chetara?

• Olee ụzọ dị iche iche Jehova si eme ka ndị ohu ya dị ike?

• Olee ọrụ ndị e nyere anyị ka anyị na-arụ?

• Olee ụfọdụ n’ime ụzọ ndị anyị nwere ike isi jeere ụmụnna anyị ozi?

• Gịnị ga-eme ka anyị nọgide na-eji onyinye e nyere anyị ‘na-ejere ibe anyị ozi’?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Ị̀ na-eji “onyinye” e nyere gị ejere ndị ọzọ ozi ka ị̀ na-eji ya eme ihe ga-abara naanị gị uru?

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Anyị na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma, na-enyekwara ụmụnna anyị aka

[Foto dị na peeji nke 16]

E kwesịrị ikele ndị na-arụ ọrụ iji nyere ndị ọdachi bibiri ihe ha aka maka iwepụta onwe ha