Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’

‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’

‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’

“Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya kwa ụbọchị, nọgidekwa na-eso m.”—LUK 9:23.

1, 2. (a) Olee ihe Jizọs ji obiọma gwa ndị mmadụ ka ha mee? (b) Olee otú i sirila gosi ma ì kwela ime ihe ahụ Jizọs kwuru?

MGBE ọ fọrọ obere ka Jizọs jechaa ozi ya n’ụwa, ọ nọ na-ezi ozi ọma n’obodo Peria, nke dị n’ofe Jọdan, n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Judia, mgbe otu nwa okorobịa bịakwutere ya wee jụọ ya ihe ọ ga-eme ka o wee nweta ndụ ebighị ebi. Mgbe Jizọs chọpụtara na nwa okorobịa ahụ na-eme ihe e dere n’Iwu Mozis, ọ gwara ya ka o mee otu ihe dị mkpa. Ọ sịrị ya: “Gaa, ree ihe ndị i nwere nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe, bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.” (Mak 10:21) Cheedị ihe ọ dị ka ya na Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke Onye Kacha Ihe Niile Elu, gwara mmadụ ka ọ bịa sowe ya!

2 Nwa okorobịa ahụ ekweghị, ma e nwere ndị ọzọ kwere. Tupu nwoke a abịakwute Jizọs, Jizọs gwara Filip, sị: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” (Jọn 1:43) Filip kwere ma mechaa ghọọ onyeozi Jizọs. Jizọs gwakwara Matiu otu ihe ahụ, o kwekwara. (Mat. 9:9; 10:2-4) N’ezie, Jizọs gwara ndị niile hụrụ ezi omume n’anya ka ha bịa sowe ya mgbe ọ sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya kwa ụbọchị, nọgidekwa na-eso m.” (Luk 9:23) N’ihi ya, ọ dịghị onye ọ bụla nke na-enweghị ike ịghọ onye na-eso Jizọs ma ọ bụrụ na onye ahụ achọọ. Ị̀ chọrọ ime otú ahụ? Ọtụtụ n’ime anyị ekwerela ime ihe ahụ Jizọs ji obiọma gwa anyị ka anyị mee. Mgbe anyị gara ozi ọma, anyị na-agwakwa ndị ọzọ ka ha bịa bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

3. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara isi n’ebe Jizọs nọ kpafuo?

3 Ma, ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ ndị nweburu mmasị n’eziokwu dị na Baịbụl na-akwụsị ịmụ Baịbụl. Ha na-ajụ oyi ma mechaa si n’ebe Jizọs nọ ‘kpafuo.’ (Hib. 2:1) Olee ihe anyị ga-eme ka ụdị ihe a ghara ime anyị? Otu ihe ga-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka bụ onye ahụ ịjụ onwe ya, sị: ‘Oleedị ihe mere m ji malite iso Jizọs? Gịnị ka iso ya pụtara?’ Iburu azịza nke ajụjụ ndị a n’uche ga-enyere anyị aka ikpebisikwu ike ịnọgide n’ụzọ ọma a anyị kpebiri ije ije na ya. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịgba ndị ọzọ ume ka ha bịa sowe Jizọs.

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Na-eso Jizọs?

4, 5. Olee ihe mere Jizọs ji ruo eruo ịbụ onye ndú?

4 Jeremaya onye amụma kwuru, sị: “Jehova, amaara m nke ọma na ụzọ mmadụ adịghị ya n’aka. Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.” (Jere. 10:23) Ihe ndị merela eme na-egosi na ihe a Jeremaya kwuru bụ eziokwu. O doola nnọọ anya na ụmụ mmadụ na-ezughị okè enweghị ike ịchị onwe ha n’enweghị nsogbu. Anyị kweere iso Jizọs n’ihi na anyị ma na o ruru eru ịbụ Onye Ndú anyị otú mmadụ ọ bụla na-agaghị abụli. Tụlee ụfọdụ ihe ndị mere Jizọs ji ruo eruo.

5 Nke mbụ, Jehova ji aka ya họpụta Jizọs ka ọ bụrụ Mesaya, bụ́ Onye Ndú. Ò nwere onye ka Onye kere anyị mara ụdị Onye Ndú anyị kwesịrị inwe? Nke abụọ, Jizọs nwere àgwà ndị ga-amasị anyị, bụ́ ndị anyị kwesịrị iṅomi. (Gụọ Aịzaya 11:2, 3.) O setịpụrụ ihe nlereanya na-enweghị atụ. (1 Pita 2:21) Nke atọ, Jizọs hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya, o gosikwara nke a mgbe o ji ndụ ya chụọ àjà n’ihi ha. (Gụọ Jọn 10:14, 15.) Ọ na-egosikwa na ya bụ onye ọzụzụ atụrụ hụrụ atụrụ ya n’anya site n’ịkụziri anyị otú anyị ga-esi na-ebi ndụ nke ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ugbu a, nke ga-emekwa ka anyị nweta ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. (Jọn 10:10, 11; Mkpu. 7:16, 17) N’ihi ihe ndị a na ihe ndị ọzọ, anyị ga-egosi na anyị ma ihe ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ iso ya. Gịnị ka iso Jizọs gụnyere?

6. Gịnị ka iso Jizọs gụnyere?

6 Mmadụ ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst chọrọ ihe karịrị onye ahụ ikwu na ya bụ Onye Kraịst. Taa, ihe dị ka ijeri mmadụ abụọ sị na ha bụ Ndị Kraịst, ma omume ha na-egosi na ha bụ “ndị ọrụ mmebi iwu.” (Gụọ Matiu 7:21-23.) Mgbe ndị mmadụ gosiri na ha chọrọ ịbịa sowe Jizọs, anyị na-eme ka ha mara na ezi Ndị Kraịst kwesịrị ime ka ndụ ha kwekọọ n’ihe Jizọs kụziri nakwa n’otú o si bie ndụ, ha ga-emekwa nke a ụbọchị niile nke ndụ ha. Iji gosi ihe nke a pụtara, tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị ma banyere Jizọs.

Ṅomie Amamihe Jizọs

7, 8. (a) Gịnị bụ amamihe, gịnịkwa mere Jizọs ji mara ihe nke ukwuu? (b) Olee otú Jizọs si gosi na ya ma ihe, oleekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie ya?

7 Jizọs nwere ọtụtụ àgwà ndị magburu onwe ha, ma anyị ga-atụle anọ n’ime ha: amamihe ya, ịhụnanya ya, otú o si dị umeala n’obi, na otú o si na-anụ ọkụ n’obi. Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe banyere amamihe ya, ya bụ, otú o si nwee ike iji ihe ọmụma na nghọta na-eme ihe bara uru. Pọl onyeozi dere, sị: “E ji nlezianya zochie akụ̀ niile dị oké ọnụ ahịa nke amamihe na nke ihe ọmụma n’ime [Jizọs].” (Kọl. 2:3) Ebee ka Jizọs si nweta amamihe a? Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “M na-ekwu ihe ndị a dị nnọọ ka Nna m kụziiri m.” (Jọn 8:28) Amamihe ya si n’aka Jehova, n’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na Jizọs na-eme mkpebi ziri ezi.

8 Dị ka ihe atụ, Jizọs mere mkpebi ziri ezi mgbe ọ họọrọ otú ọ ga-esi ebi ndụ. O kpebiri na ya agaghị etinye aka n’ọtụtụ ihe. O lekwasịrị anya n’otu ihe: ime uche Chineke. O ji amamihe jiri oge ya na ume ya buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Anyị na-eso ihe nlereanya Jizọs ma ọ bụrụ na anyị agbalịa ‘na-elegide anya otu ebe,’ nke ga-eme ka anyị ghara iji ihe ndị na-abaghị uru, bụ́ ihe ndị na-ewekọrọ ume anyị na oge anyị, na-ebo onwe anyị ibu arọ. (Mat. 6:22) Ọtụtụ Ndị Kraịst na-agbalị ka ha ghara itinye aka n’ọtụtụ ihe, ka ha wee nwee ike iwepụtakwu oge ha ga-eji na-ekwusa ozi ọma. Ụfọdụ amalitela ọrụ ịsụ ụzọ oge niile. Ọ bụrụ na i so ná ndị merela otú a, jisie ike n’ọrụ gị. Ọ bụrụ na anyị ‘eburu ụzọ na-achọ alaeze ahụ,’ anyị ga-enwe obi ụtọ na afọ ojuju dị ukwuu.—Mat. 6:33.

Dịrị Umeala n’Obi Ka Jizọs

9, 10. Olee otú Jizọs si gosi na ya dị umeala n’obi?

9 Àgwà nke abụọ Jizọs nwere nke anyị ga-atụle bụ otú o si dị umeala n’obi. Mgbe e nyere ụmụ mmadụ na-ezughị okè ikike, onwe ha na-ebu ha isi. Ma, Jizọs adịghị otú a. N’agbanyeghị na Jizọs na-arụ ọrụ dị oké mkpa n’imezu nzube Jehova, nke a enweghị otú o si mee ka ọ dịrị mpako. A gwakwara anyị ka anyị dịrị umeala n’obi ka ya. Pọl onyeozi dere, sị: “Nweenụ ụdị echiche a n’ime onwe unu bụ́ nke Kraịst Jizọs nwekwara, onye dịrị n’ụdị Chineke, ma o cheghị echiche ịnara ọkwá n’ike, ya bụ, ka ọ hara ka Chineke. Ee e, kama o mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu, wee dịrị n’oyiyi mmadụ.” (Fil. 2:5-7) Gịnị ka nke a pụtara?

10 Jizọs nwere ihe ùgwù dị ebube, ya bụ, ịnọ n’ihu Nna ya nke eluigwe. Ma, o ji obi ọcha ya ‘mee onwe ya ihe efu.’ E mere ka ndụ ya banye n’akpa nwa nke nwa agbọghọ Juu na-amaghị nwoke. Ọ nọrọ ọnwa itoolu n’afọ ya ruo mgbe a mụrụ ya n’ezinụlọ ọkwa nkà nke ọ na-enweghị ka ọ hà ya. Ọ ghọrọ nwa ọhụrụ nke na-enweghị nke ọ ma. Jizọs ji nwayọọ nwayọọ na-etolite n’ezinụlọ Josef ghọọ nwa na-amụ ije, nwa okoro nta, ruokwa mgbe o ruru afọ iri na ụma. O meghị mmehie ọ bụla. Ma, n’oge niile ọ na-eto, o rubeere nne ya na nna ya bụ́ ndị mmehie isi. (Luk 2:51, 52) Ụdị umeala n’obi nke a enweghị atụ.

11. Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi dịrị umeala n’obi ka Jizọs?

11 Anyị na-egosi na anyị dị umeala n’obi ka Jizọs ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị dum kwere ịrụ ọrụ yiri ka ọ̀ dị ala. Ka anyị were ọrụ ikwusa ozi ọma dị ka ihe atụ. Ọrụ a nwere ike iyi ihe dị ala, karịchaa mgbe ndị mmadụ na-enweghị mmasị na ya, mgbe ha na-eme anyị akaje, ma ọ bụ mgbe ha na-emegide anyị n’ihi ya. Ma, ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwusa ozi ọma, anyị ga-enyere ndị ọzọ aka ịbịa sowe Jizọs. Anyị ga-esi otú a nyere ọtụtụ ndị aka inweta nzọpụta. (Gụọ 2 Timoti 4:1-5.) Ihe atụ ọzọ bụ idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ọcha. Nke a nwere ike ịgụnye ime ihe ndị dị ka ịkwafu ahịhịa, ịsa ala ụlọ, na ịsa ụlọ mposi. Ọrụ ndị a bụ ọrụ dị nnọọ ala. Ma, anyị ma na idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ọcha, bụ́ ebe anyị na-anọ efe Chineke, so n’ozi dị nsọ anyị na-eje. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi ọcha anyị na-arụ ọrụ ndị a yiri ka hà dị ala, anyị na-egosi na anyị dị umeala n’obi, anyị sikwa otú a na-eso nzọụkwụ Kraịst.

Na-anụ Ọkụ n’Obi Ka Jizọs

12, 13. (a) Olee otú Jizọs si gosi na ya na-anụ ọkụ n’obi, gịnịkwa mere o ji jiri ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ya? (b) Gịnị ga-eme ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma?

12 Tụlee otú Jizọs si jiri ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ya. Jizọs mere ọtụtụ ihe mgbe ọ nọ n’ụwa. Eleghị anya, mgbe ọ ka na-eto eto, o so nna ya bụ́ Josef na-akwa nkà. Mgbe Jizọs na-eje ozi, ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ndị gụnyere ịgwọ ndị ọrịa na ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ma, ọrụ bụ́ isi ọ rụrụ bụ ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị na-ege ya ntị ihe. (Mat. 4:23) Anyị, bụ́ ndị na-eso ụzọ ya, nwere otu ọrụ ahụ ịrụ. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie ya? Otu n’ime ụzọ ndị anyị ga-esi mee nke a bụ ịrụ ọrụ a n’ihi otu ihe ahụ mere Jizọs ji rụọ ya.

13 Ọ bụ ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe Chineke nọ bụ ihe kacha mee ka o kwusaara ndị mmadụ ozi ọma ma kụziere ha ihe. Jizọs hụkwara eziokwu ahụ ọ na-akụziri ndị mmadụ n’anya. O weere eziokwu ahụ ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa, ọ dịkwa ya ọkụ n’obi ịkụziri ya ndị ọzọ. O kwesịkwara ịdị anyị otú ahụ, bụ́ ndị nkụzi ma ọ bụ “ndị na-ezi ihe n’ihu ọha.” Chegodị nnọọ ụfọdụ eziokwu dị oké mkpa anyị mụtara n’Okwu Chineke! Anyị ma ihe ahụ na-ese okwu banyere onye kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa, marakwa otú a ga-esi gosi onye kwesịrị ịchị. Anyị ma nke ọma ihe Akwụkwọ Nsọ na-akụzi banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na ngọzi ndị anyị ga-enweta n’ụwa ọhụrụ Chineke. Ma ànyị ka mụtara eziokwu ahụ amụta ma ọ̀ dịla anya anyị mụtara ya, ọ ka dị otú ọ dị, ọ ka bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. (Gụọ Matiu 13:52.) Ọ bụrụ na anyị ejiri nnọọ ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, anyị ga-eme ka ndị ọzọ mara na anyị nwere mmasị n’ihe Jehova kụziiri anyị.

14. Olee otú anyị nwere ike isi na-akụzi ihe ka Jizọs?

14 Cheta otú Jizọs si kụzie ihe. Ọ na-ejikarị Akwụkwọ Nsọ akwado ihe ọ na-akụziri ndị na-ege ya ntị. Ọtụtụ mgbe, ọ na-eji okwu bụ́: “E dere, sị” amalite ihe dị mkpa ọ chọrọ ikwu. (Mat. 4:4; 21:13) Okwu ya ụfọdụ e dere n’Akwụkwọ Nsọ Grik na-egosi na o kwughachiri kpọmkwem ihe e kwuru n’ihe karịrị ọkara akwụkwọ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. E nwekwara ebe ndị o kwutere okwu banyere ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Dị ka Jizọs mere, anyị na-eji Baịbụl akụzi ihe mgbe ọ bụla anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị na-agbalịkwa ịgụrụ ndị mmadụ Akwụkwọ Nsọ mgbe o kwere mee. Anyị si otú a enyere ndị nwere ezi obi aka iji anya ha hụ na ihe anyị na-akụzi bụ uche Chineke, ọ bụghị uche anyị. Ọ na-atọ anyị nnọọ ụtọ mgbe onye anyị na-ekwusara ozi ọma kwere ịgụpụta ihe dị na Baịbụl, kwerekwa ka anyị kọwaara ya ihe e dere n’Okwu Chineke na uru ọ bara! Anyị na-enwe ọṅụ dị ukwuu mgbe ndị dị otú a kwere ịbịa sowe Jizọs.

Iso Jizọs Pụtara Ịhụ Ndị Ọzọ n’Anya

15. Olee àgwà magburu onwe ya Jizọs nwere, oleekwa ihe iche banyere ya nwere ike ịkpali anyị ime?

15 Nke ikpeazụ n’ime àgwà Jizọs anyị chọrọ ịtụle ugbu a na-eme obi ụtọ, ya bụ, ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ịhụnanya nke Kraịst nwere na-akpali anyị.” (2 Kọr. 5:14) Mgbe anyị chetara otú Jizọs si hụ mmadụ niile n’anya nakwa otú o si hụ onye ọ bụla n’ime anyị n’anya, nke a na-akpali anyị iṅomi ya.

16, 17. Olee ụzọ dị iche iche Jizọs si gosi na ya hụrụ ndị ọzọ n’anya?

16 Olee otú Jizọs si gosi na ya hụrụ ndị ọzọ n’anya? Otú o si jiri obi ya dum tọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ụmụ mmadụ bụ ụzọ kachanụ o si gosi na ya hụrụ ha n’anya. (Jọn 15:13) Ma, mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, e nwere ụzọ ndị ọzọ o si gosi na ya hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Dị ka ihe atụ, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị nwere nsogbu. Mgbe ọ hụrụ Meri na ndị ọzọ ya na ha nọ ka ha na-ebe ákwá n’ihi ọnwụ Lazarọs, o metụrụ ya nnọọ n’ahụ́. Ọ bụ ezie na Jizọs na-aga ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ, ihe merenụ ruru ya n’ahụ́ nke na “anya mmiri gbara” ya.—Jọn 11:32-35.

17 Ná mmalite nke ozi Jizọs n’ụwa, otu onye ekpenta bịakwutere ya wee sị ya: “Ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Gịnị ka Jizọs mere? Baịbụl kwuru, sị: “O nwere ọmịiko.” O meziri otu ihe dị ịtụnanya. “O wee matịa aka ya bitụ ya aka, sị ya: ‘Achọrọ m. Dị ọcha.’ Ekpenta ahụ pụrụ n’ahụ́ ya ozugbo, o wee dị ọcha.” Iwu Mozis kwuru na ndị ekpenta bụ ndị na-adịghị ọcha. Jizọs ga-agwọli nwoke ahụ n’emetụghị ya aka. Ma, Jizọs metụrụ ya aka mgbe ọ chọrọ ịgwọ ya. Ikekwe, nke a bụ mbụ mmadụ na-emetụ nwoke ahụ aka kemgbe ọtụtụ afọ. Nke a bụ nnọọ ọmịiko na-enweghị atụ!—Mak 1:40-42.

18. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na ‘ihe banyere onye ọzọ na-emetụ anyị n’obi’?

18 E nyere anyị, bụ́ ndị na-eso ụzọ Kraịst, iwu ka anyị gosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya site n’ịhụ na ‘ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi.’ (1 Pita 3:8) O nwere ike ọ gaghị adịchara anyị mfe ịghọta otú ọ dị nwanna anyị nke na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala ma ọ bụ nke nwere nnọọ nkụda mmụọ, karịchaa, ma ọ bụrụ na anyị enwetụbeghị ụdị nsogbu ahụ ọ na-enwe. Ma, Jizọs nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị na-arịa ọrịa n’agbanyeghị na ya onwe arịatụbeghị ọrịa. Olee otú anyị nwere ike isi gosi ndị mmadụ ọmịiko dị ka Jizọs gosiri? Ọ bụ site n’inwe ndidi wee na-ege ndị nọ ná nsogbu ntị mgbe ha na-akọrọ anyị ihe na-enye ha nsogbu. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịjụ onwe ya sị, ‘Ọ bụrụ m, olee otú ọ gaara adị m?’ Ọ bụrụ na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’ahụ́, anyị ga-enwe ike ‘ịgụgụ mkpụrụ obi dara mbà n’obi.’ (1 Tesa. 5:14) Ime otú a na-egosi na anyị na-eso Jizọs.

19. Olee ihe ihe nlereanya Jizọs na-akpali anyị ime?

19 Anyị nwere ọtụtụ ihe na-adọrọ mmasị anyị na-amụta n’ihe ndị Jizọs Kraịst kwuru nakwa n’ihe ndị o mere! Ka anyị na-amụtakwu banyere ya, anyị ga-achọkwu iṅomi ya, chọọkwa inyere ndị ọzọ aka ime otu ihe ahụ. Ya mere, ka anyị gbalịsie ike ịhụ na iso Mesaya ahụ bụ́ Eze na-atọ anyị ụtọ ugbu a, ọ ga na-atọkwa anyị ụtọ ruo mgbe ebighị ebi!

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

• Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị nwere amamihe, dị ka Jizọs nwere?

• Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi gosi na anyị dị umeala n’obi?

• Olee otú anyị nwere ike isi jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma?

• Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs n’igosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

AKWỤKWỌ NKE NA-ENYERE ANYỊ AKA IṄOMI KRAỊST

Ná mgbakọ distrikti e nwere n’afọ 2007, e wepụtara akwụkwọ bụ́ ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M,’ nke dị narị peeji na iri itoolu na abụọ. Akwụkwọ a ga-enyere Ndị Kraịst aka ịmatakwu banyere Jizọs, nke ka nke, ịmatakwu àgwà ya nakwa ihe ndị o mere. Mgbe a kọwachara ihe dị n’akwụkwọ ahụ n’isi nke mbụ na nke abụọ, a tụlere àgwà ndị pụrụ iche Jizọs nwere na nkenke ná nkebi nke mbụ. A tụlere otú Jizọs si dịrị umeala n’obi, otú o si nwee obi ike, otú o si nwee amamihe, otú o si rube isi, na otú o si tachie obi.

Ná nkebi ndị sochiri, a tụlere otú Jizọs si kụziere ndị mmadụ ihe, otú o si zie ha ozi ọma, nakwa ụzọ ụfọdụ o si gosi ndị mmadụ na ya hụrụ ha n’anya nke ukwuu. E dere akwụkwọ a otú ọ ga-esi nyere Onye Kraịst aka iṅomi Jizọs.

Anyị nwere obi ike na akwụkwọ a ga-eme ka onye ọ bụla n’ime anyị nyochaa onwe ya ma jụọ, sị: ‘M̀ na-eso Jizọs n’ezie? Olee otú m ga-esi na-esochi ya anya?’ Ọ ga-enyekwara “ndị niile nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” aka ịbịa bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst.—Ọrụ 13:48.

[Foto dị na peeji nke 4]

Jizọs kwere ịbịa n’ụwa ka a mụọ ya, o wee bụrụ nwa ọhụrụ bụ́ mmadụ. Olee àgwà o nwere nke mere ka o nwee ike ime nke a?

[Foto dị na peeji nke 6]

Gịnị ga-eme ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma?