Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Ọrụ Ime Ndị Na-eso Ụzọ Na-enye Gị Ọṅụ

Ka Ọrụ Ime Ndị Na-eso Ụzọ Na-enye Gị Ọṅụ

Ka Ọrụ Ime Ndị Na-eso Ụzọ Na-enye Gị Ọṅụ

“Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—MAT. 28:19.

1-3. (a) Olee otú obi na-adị ọtụtụ ndị ma ha nwee ndị ha na-amụrụ Baịbụl? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

OTU nwanna nwaanyị nọ n’otu ìgwè nke na-amụ ihe n’asụsụ Hindi na United States dere, sị: “Anọwo m na-amụrụ otu ezinụlọ si Pakistan ihe kemgbe izu iri na otu. Mụ na ha aghọọla ezigbo enyi. Anya mmiri na-agba m mgbe ọ bụla m chetara na ezinụlọ a ga-alaghachi Pakistan n’oge na-adịghị anya. Ihe na-agba m anya mmiri abụghị naanị na mụ na ha agaghị anọkwa ọzọ kama ọ bụ n’ihi ọṅụ m na-enwe ma m na-akụziri ha ihe banyere Jehova.”

2 Ì nwetụla ọṅụ a na-enweta n’ịmụrụ mmadụ Baịbụl, dị ka nwanna nwaanyị a nwere? Ọrụ ime ndị na-eso ụzọ nyere Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ndị dịrị ndụ na narị afọ mbụ ọṅụ dị ukwuu. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ mmadụ iri asaa o nyere ọzụzụ, ji ozi nyere ha ọṅụ lọta, Jizọs n’onwe ya “nwere oké ọṅụ n’ime mmụọ nsọ.” (Luk 10:17-21) N’otu aka ahụ, ọrụ ime ndị na-eso ụzọ na-enye ọtụtụ ndị ọṅụ dị ukwuu taa. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na n’afọ 2007, ndị nkwusa na-arụsi ọrụ ike, obi dị ụtọ, mụụrụ ihe dị ka nde mmadụ isii na ọkara Baịbụl kwa ọnwa.

3 Ma, ụfọdụ ndị nkwusa enwebeghị ndị ha na-amụrụ Baịbụl. O nwekwara ike ya abụrụ na ọ dịla anya ndị ọzọ mụụrụ ndị mmadụ ihe. Olee ihe isi ike ndị anyị na-enwe mgbe anyị na-agbalị ịmụrụ ndị mmadụ ihe? Olee otú anyị nwere ike isi merie ihe isi ike ndị ahụ? Olee ụgwọ ọrụ ndị anyị na-enweta mgbe anyị mere ihe niile anyị nwere ike ime iji rube isi n’iwu Jizọs nyere, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m”?—Mat. 28:19.

Ihe Isi Ike Ndị Nwere Ike Ime Ka Anyị Ghara Inwe Ọṅụ

4, 5. (a) Olee otú ọtụtụ ndị si eme n’ebe ụfọdụ n’ụwa ma a bịa ikwusara ha ozi ọma? (b) Olee ihe isi ike ndị nkwusa na-enwe n’ebe ndị ọzọ?

4 N’ebe ụfọdụ n’ụwa, ndị mmadụ na-anara akwụkwọ anyị ngwa ngwa, nweekwa mmasị ka anyị mụwara ha Baịbụl. Otu di na nwunye si Australia, ndị nọ na-eje ozi nwa oge na Zambia, dere, sị: “Ọ bụ eziokwu. E nwere ọtụtụ ndị nwere mmasị n’ozi ọma anyị na Zambia. Ịgba àmà okporo ámá na-atọgbu onwe ya! Ndị mmadụ na-abịakwute anyị kwuo magazin nke ha chọrọ.” N’oge na-adịbeghị anya, ụmụnna anyị nọ na Zambia mụụrụ ihe karịrị narị puku mmadụ abụọ Baịbụl, ya bụ, otu onye nkwusa mụụrụ ihe karịrị otu onye Baịbụl.

5 Ma, n’ebe ndị ọzọ, ọ na-esiri ndị nkwusa ike inyefe akwụkwọ na ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’ụzọ chiri anya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ anaghị anọ n’ụlọ mgbe ndị nkwusa gara n’ụlọ ha. Ndị nke nọ ya anọ nwere ike ha enweghị mmasị n’okpukpe. Ọ ga-abụ na a zụlitere ha n’ezinụlọ na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na omume ihu abụọ nke ndị okpukpe ụgha adịghị ha mma. Ndị ọzụzụ atụrụ ụgha agbaala ọtụtụ ndị akpụkpọ, chụsaakwa ha. (Mat. 9:36) O doro anya na ndị dị otú a agaghị enwecha mmasị ịmụ Baịbụl.

6. Olee ihe ndị na-egbochi ụfọdụ ndị imeru ihe otú ha ga-achọ ime?

6 E nwere ihe ọzọ na-eme ka ụfọdụ ndị nkwusa kwesịrị ntụkwasị obi ghara inwe ọṅụ. Ọ bụ ezie na o nwere mgbe ha na-arụchi ọrụ ime ndị na-eso ụzọ anya, ọrịa ma ọ bụ nká anaghịzi ekwe ha meruo otú ha na-emebu. E nwekwara nsogbu ndị ọzọ anyị nwere ike iji aka anyị wetara onwe anyị. Dị ka ihe atụ, ọ̀ na-adị gị ka i rughị eru ịmụrụ mmadụ Baịbụl? O nwere ike ịdị gị otú ọ dị Mozis mgbe Jehova gwara ya ka ọ gaa gwa Fero okwu. Mozis, sịrị: “Biko, Jehova, abụghị m onye okwu na-aga were were n’ọnụ, abụghị m ya kemgbe ụnyaahụ ma ọ bụkwanụ tupu mgbe ahụ.” (Ọpụ. 4:10) Ihe ọzọ yiri mmadụ iche na ya erughị eru bụ mmadụ ịtụ egwu na ya agaghị emeteli ihe a chọrọ n’aka ya. Anyị nwere ike na-echegbu onwe anyị na ọ dịghị onye anyị ga-enyeliri aka ka ọ ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs n’ihi na anyị amaghị akụzi ihe. Nke a nwere ike ime ka anyị kpebie na anyị agaghị amụrụ mmadụ ihe ọbụna mgbe anyị nwere ohere ime otú ahụ. Olee otú anyị ga-esi emeri ihe isi ike ndị a anyị kwuru okwu ha?

Kwadebe Obi Gị

7. Gịnị mere Jizọs ji kwusaara ndị mmadụ ozi ọma?

7 Ihe mbụ anyị kwesịrị ime bụ ịkwadebe obi anyị. Jizọs kwuru, sị: “Ihe jupụtara . . . n’obi ka ọnụ . . . na-ekwu.” (Luk 6:45) Ihe mere Jizọs ji kwusaara ndị ọzọ ozi ọma bụ n’ihi na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ hụrụ otú e sirila mee ka ndị Juu ibe ya na Chineke ghara ịdị ná mma, “o nwere ọmịiko n’ebe ha nọ.” Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ihe ubi hiri nne . . . Na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.”—Mat. 9:36-38.

8. (a) Olee ihe anyị kwesịrị ichebara echiche? (b) Olee ihe anyị na-amụta n’ihe otu onye a na-amụrụ Baịbụl kwuru?

8 Ka anyị na-arụ ọrụ ime ndị na-eso ụzọ, ọ ga-adị mma ma anyị chee echiche banyere uru anyị riterela n’ihi na o nwere onye wepụtara oge ya bịa mụọrọ anyị Baịbụl. Cheekwa banyere ndị anyị ga-ahụ mgbe anyị na-eje ozi ọma nakwa otú ozi ọma anyị na-ezisa ga-esi baara ha uru. Otu nwaanyị degaara alaka ụlọ ọrụ dị ná mba o bi akwụkwọ ozi, sị: “Ọ masịrị m ịgwa unu na m na-ekele Ndịàmà na-abịa n’ụlọ m amụrụ m Baịbụl. Ama m na a ga-enwe oge ahụ́ ga na-agbakasị ha n’ihi na m na-ajụ ọtụtụ ajụjụ, ọtụtụ mgbe, m na-emekwa ka ha ghara ịla mgbe ha kwesịrị ịla. Ma, ha nweere m ndidi, dịkwa njikere ịkụziri m ihe ha mụtara. M na-ekele Jehova, na-ekelekwa Jizọs na mụ na Ndịàmà ndị a matara.”

9. Na gịnị ka Jizọs lekwasịrị anya, oleekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie ya?

9 N’ezie, ọ bụghị mmadụ niile ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mat. 23:37) Ụfọdụ ndị sotụrụ ya ma mechaa jụ ihe ọ na-akụzi, “kwụsịkwa iso ya na-agagharị.” (Jọn 6:66) Ma, Jizọs ekweghị ka nkwụsị a ụfọdụ kwụsịrị iso ya mee ka o chee na ozi ọ na-ezisa abaghị uru. Ọ bụ ezie na ọtụtụ n’ime mkpụrụ Jizọs kụrụ amịghị mkpụrụ, ọ nọgidere na-arụ ọrụ ọma ọ na-arụ. Ọ chọpụtara na ihe a kụrụ n’ubi achaala maka owuwe ihe ubi, iso na-ewe ihe ubi nyekwara ya ọṅụ dị ukwuu. (Gụọ Jọn 4:35, 36.) Ànyị nwere ike ịchọpụta ebe ndị anyị nwere ike iwe ihe ubi n’ókèala anyị, dị ka Jizọs mere, kama ilekwasị anya n’obere ala ihe na-adịghị nke dịcha n’etiti okporo ọka ndị e nwere n’ubi? Ka anyị lee otú anyị nwere ike isi mee nke a.

Na-agha Mkpụrụ ma Buru n’Obi Iwe Ihe Ubi

10, 11. Olee ihe i nwere ike ime iji na-enwe ọṅụ?

10 Onye ọrụ ugbo na-agha mkpụrụ ma buru n’obi na ya ga-ewe ihe ubi. N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị ikwusa ozi ọma ma buru n’obi na anyị ga-amalite ọmụmụ Baịbụl. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị na-agachi ozi ọma anya ma ị naghị ahụ ọtụtụ ndị n’ụlọ ma ọ bụkwanụ na ị naghị ahụ ndị i kwere nkwa na ị ga-abịaghachi na nke ha? Nke a nwere ike ịkụda gị mmụọ. Ị̀ ga-akwụsị ịga ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ? I kwesịghị! Mgbe mbụ ọtụtụ ndị na-anụ ozi ọma ka bụ mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, bụ́ otú anyị si ekwusa ozi ọma kemgbe, nke na-arụpụtakwa ihe.

11 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịnọgide na-enwe ọṅụ, ì nwere ike ịnwale ụzọ ndị ọzọ e si ekwusa ozi ọma iji mee ka ndị ọzọ nụ ozi ọma ahụ? Dị ka ihe atụ, ì zitụla ndị ị hụrụ n’okporo ụzọ ma ọ bụ ndị nọ n’ebe ha na-arụ ọrụ ozi ọma? Ì nwere ike ịkpọ ụfọdụ ndị na fon ma ọ bụkwanụ nweta nọmba fon nke ndị i ziri ozi ọma Alaeze ka i wee nwee ike na-akpọ ha? Ọ bụrụ na ị nọgide na-ekwusa ozi ọma ma na-anwale ụzọ dị iche iche e si ekwusa ya, ị ga-enwe ọṅụ mmadụ na-enwe mgbe e nwere ndị gere ntị n’ozi ọma Alaeze.

Ihe Ị Ga-eme Mgbe Ọtụtụ Ndị Na-enweghị Mmasị

12. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị nọ n’ókèala anyị enweghị mmasị n’ozi ọma?

12 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị nọ n’ókèala gị enweghị mmasị n’okpukpe? Ì nwere ike ikwu ihe ga-eme ka ha nwee mmasị ige gị ntị? Pọl onyeozi degaara ụmụnna ya nọ na Kọrịnt akwụkwọ, sị: “N’ebe ndị Juu nọ, adịrị m ka onye Juu . . . N’ebe ndị na-enweghị iwu nọ, adịrị m ka onye na-enweghị iwu, ọ bụ ezie na abụghị m onye na-enweghị iwu n’ebe Chineke nọ.” Gịnị mere Pọl ji mee ihe ndị a? O kwuru, sị: “Aghọwo m ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ, ka m wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ ndị.” (1 Kọr. 9:20-22) Dị ka Pọl mere, ànyị nwere ike ịchọta isiokwu ga-amasị ndị nọ n’ókèala anyị? Ọtụtụ ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe chọrọ ịma ihe ha ga-eme ka udo dịrị n’ezinụlọ ha. O nwekwara ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha chọrọ ịma ihe ọdịnihu ga-ewetara ha. Ànyị nwere ike izi ha ozi ọma Alaeze Chineke otú ga-amasị ha?

13, 14. Olee otú anyị nwere ike isi nwekwuo ọṅụ n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ?

13 Ọtụtụ ndị nkwusa na-enwekwu ọṅụ n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ, ọbụna n’ebe e nwere ọtụtụ ndị na-enweghị mmasị. Olee otú ha si na-enwekwu ọṅụ? Ọ bụ site n’ịmụ asụsụ mba ọzọ. Otu di na nwunye dị ihe karịrị afọ iri isii chọpụtara na ọtụtụ puku ụmụ akwụkwọ bụ́ ndị China na ndị ezinụlọ ha bi n’ókèala ọgbakọ ha. Nwanna nwoke a kwuru, sị: “Nke a mere ka anyị malite ịmụ asụsụ Chinese. Ọ bụ ezie na nke a pụtara na anyị ga na-eji oge dị ukwuu na-amụ asụsụ ahụ kwa ụbọchị, anyị mụụrụ ọtụtụ ndị China bi n’ókèala anyị Baịbụl.”

14 Ọ bụrụgodị na i nweghị ike ịmụ asụsụ mba ọzọ, i nwere ike iji akwụkwọ bụ́ Good News for People of All Nations nyere ndị na-asụ asụsụ ọzọ aka. I nwekwara ike inweta akwụkwọ e bipụtara n’asụsụ nke ndị ị hụrụ n’ozi ọma. N’eziokwu, ọ ga-ewe gị oge, ị ga-agbakwa mbọ dị ukwuu iji nwee ike izi ndị si mba ọzọ ma na-asụ asụsụ dị iche na nke gị ozi ọma. Ma, echefula ihe e dere n’Okwu Chineke, nke sịrị: ‘Onye na-agha mkpụrụ n’ụba ga-aghọrọ mkpụrụ n’ụba.’—2 Kọr. 9:6.

Ndị Niile Nọ n’Ọgbakọ So Na-arụ Ya

15, 16. (a) Olee otú o si bụrụ na ọ bụ ndị niile nọ n’ọgbakọ na-eso enyere mmadụ aka ịghọ onye na-eso ụzọ Kraịst? (b) Olee otú ndị merela okenye si enye aka?

15 Ma, ọ bụghị naanị otu onye na-enyere mmadụ aka ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs. Ndị niile nọ n’ọgbakọ na-enyere onye ahụ aka. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Jizọs kwuru, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) N’eziokwu, mgbe ndị a na-amụrụ Baịbụl bịara ọmụmụ ihe, ọ na-atọkarị ha ụtọ ịhụ otú mmadụ niile nọ n’ọgbakọ si hụ ibe ha n’anya. Otu onye a na-amụrụ Baịbụl dere, sị: “Ọ na-atọgbu m atọgbu ịga ọmụmụ ihe. Mmadụ niile na-eji obi ụtọ anabata m!” Jizọs kwuru na ndị ezinụlọ mmadụ nwere ike imegide ya ma ọ bụrụ na onye ahụ aghọọ onye na-eso ụzọ ya. (Gụọ Matiu 10:35-37.) Ma, o kwere nkwa na ha ga-enwe ọtụtụ “ụmụnne ndị ikom na ụmụnne ndị inyom na nne na ụmụ” n’ọgbakọ.—Mak 10:30.

16 Ụmụnna anyị ndị merela okenye na-arụ ọrụ dị mkpa n’ime ka onye a na-amụrụ Baịbụl nwee ọganihu. Olee otú ha si eme nke a? Ọ bụrụgodị na ụfọdụ n’ime ndị merela okenye enweghị ike ịmụrụ mmadụ ihe, azịza na-ewuli elu ha na-aza n’ọmụmụ ihe na-eme ka okwukwe ndị niile na-anụ ya sikwuo ike. Otú ha si na-eje ije “n’ụzọ ezi omume” kemgbe na-eme ka ọgbakọ makwuo mma. Ọ na-emekwa ka ndị nwere obi eziokwu bata n’ọgbakọ Chineke.—Ilu 16:31.

Ihe Ga-enyere Anyị Aka Ịkwụsị Ịtụ Egwu

17. Gịnị ka anyị ga-eme iji kwụsị iche na ọ dịghị ihe anyị ga-emeli?

17 Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị gaghị amụliri mmadụ ihe? Cheta na Jehova nyeere Mozis aka site n’inye ya mmụọ nsọ na onye ga-enyere ya aka, bụ́ Erọn, nwanne ya nwoke. (Ọpụ. 4:10-17) Jizọs kwere nkwa na mmụọ nsọ Chineke ga-akwado anyị n’ọrụ ịgba àmà anyị na-arụ. (Ọrụ 1:8) Jizọs zipụkwara ndị na-eso ụzọ ya abụọ abụọ ịga kwusaa ozi ọma. (Luk 10:1) N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịmụrụ mmadụ Baịbụl, rịọ Chineke n’ekpere ka o nye gị mmụọ nsọ ya ka i wee mara ihe ị ga-eme. Na-esokwa ndị ga-eme ka obi sie gị ike na-aga ozi ọma, bụ́ ndị otú ha si ezi ozi ọma nwere ike inyere gị aka. Okwukwe anyị ga-esikwu ike ma anyị cheta na Jehova họọrọ iji ndị na-enweghị ihe e ji ha kpọrọ, ya bụ, “ihe ndị dị ala nke ụwa,” na-arụ ọrụ a dị ukwuu.—1 Kọr. 1:26-29.

18. Gịnị ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịtụ egwu na anyị agaghị enweli ike ịmụrụ mmadụ ihe?

18 Gịnị ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịtụ egwu na anyị agaghị enweli ike ịmụrụ mmadụ ihe? Anyị kwesịrị icheta na inyere mmadụ aka ka ọ ghọọ onye na-eso ụzọ adịghị ka isi nri nke ọ bụ naanị onye na-esi ya ga-eme ka ọ dị ụtọ ma ọ bụkwanụ ka ọ ghara ịdị ụtọ. Kama nke ahụ, ọ chọrọ ihe karịrị mbọ anyị na-agba inyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ. Jehova na-eme nke kacha mkpa, ya bụ, ịdọta onye ahụ n’ebe ọ nọ. (Jọn 6:44) Anyị na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-eme ike anyị ịkụziri onye ahụ ihe otú ga-eme ka o nwee ọganihu. (Gụọ 2 Timoti 2:15.) Onye ahụ a na-amụrụ ihe kwesịkwara ime ihe ọ na-amụta. (Mat. 7:24-27) Ọ na-ewute anyị ma ọ bụrụ na onye a na-amụrụ ihe akwụsị ịmụ ihe. Ọ ga-amasị anyị ma ndị anyị na-amụrụ Baịbụl họrọ ime ihe ziri ezi, ma, onye ọ bụla “ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.”—Rom 14:12.

Olee Uru Ndị Anyị Na-erite?

19-21. (a) Olee uru ndị anyị na-erite n’ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl? (b) Olee otú Jehova si ele ndị niile na-ekwusa ozi ọma anya?

19 Ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl na-eme ka anyị buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Ọ na-emekwa ka eziokwu nke Okwu Chineke gbanyesie mgbọrọgwụ ike n’uche na n’obi anyị. Olee otú o si eme nke a? Otu onye ọsụ ụzọ aha ya bụ Barak kwuru, sị: “Ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl na-eme ka ị na-amụchi Okwu Chineke anya. Achọpụtara m na tupu mụ enwee ike ịkụziri mmadụ ihe ka ọ ghọta ya nke ọma, obi ga-ebugodị ụzọ sie m ike na ihe ahụ m ga-akụziri ya bụ eziokwu.”

20 Ọ bụrụ na o nweghị onye ị na-amụrụ Baịbụl, ọ̀ pụtara na ozi ị na-eje enweghị ihe ọ bụ n’anya Chineke? Mbanụ! Jehova na-enwe obi ụtọ maka mbọ anyị na-agba ito ya. Ndị niile na-ekwusa ozi ọma “na Chineke na-arụkọ ọrụ.” Ma, ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl na-enyekwu anyị ọṅụ ma anyị na-ahụ otú Chineke si eme ka mkpụrụ anyị na-akụ na-eto. (1 Kọr. 3:6, 9) Amy kwuru, sị: “Mgbe ị na-ahụ ka onye ị na-amụrụ Baịbụl na-enwe ọganihu, ị na-ekele Jehova nke ukwuu maka isi n’aka gị nye onye ahụ onyinye dị oké ọnụ ahịa, ya bụ, ohere ịmara onye Jehova bụ na inweta ndụ ebighị ebi.”

21 Ịgbalị ike anyị niile ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ejere Chineke ozi ugbu a. Ọ ga-emekwa ka obi sikwuo anyị ike na anyị ga-abanye n’ụwa ọhụrụ ahụ anyị na-atụ anya ya. Site n’enyemaka Jehova, anyị nwekwara ike inye aka zọpụta ndị na-ege anyị ntị. (Gụọ 1 Timoti 4:16.) Nke a ga-enye anyị ọṅụ dị ukwuu.

Ì Chetara?

• Olee ihe ndị nwere ike ime ka ụfọdụ ndị ghara ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl?

• Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na o yiri ka ọtụtụ ndị nọ n’ókèala anyị enweghị mmasị n’ozi ọma?

• Olee uru ndị anyị na-erite n’ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Ị̀ na-achọpụta ụzọ ndị ọzọ ị ga-esi na-ekwusa ozi ọma iji nwee ike ịchọta ndị nwere obi eziokwu?