Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Lee Ohu nke Ihe Ya Masịrị Jehova!

Lee Ohu nke Ihe Ya Masịrị Jehova!

Lee Ohu nke Ihe Ya Masịrị Jehova!

“Lee! Ohu m, . . . onye ihe ya masịrị mkpụrụ obi m!”—AỊZA. 42:1.

1. Gịnị ka a gbara ndị Jehova ume ka ha mee, karịchaa ka oge a ga-echeta ọnwụ Kraịst na-eru nso, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ha ga-eji mee nke a?

KA OGE a ga-echeta ọnwụ Kraịst na-eru nso, ndị Chineke kwesịrị ime ihe Pọl onyeozi gbara ha ume ka ha na-eme, ya bụ, ka ha “na-elegide anya n’ebe Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị nọ, bụ́ Jizọs.” Pọl kwukwara, sị: “N’ezie, chesienụ echiche ike banyere onye ahụ nke diri okwu mmegide dị otú ahụ nke ndị mmehie kwuru megide ọdịmma ha, ka ike wee ghara ịgwụ unu, unu ewee daa mbà ná mkpụrụ obi unu.” (Hib. 12:2, 3) Ichesi echiche ike banyere otú Kraịst si kwesị ntụkwasị obi ruo n’iji ndụ ya chụọ àjà, ga-enyere ma Ndị Kraịst e tere mmanụ ma ndị ibe ha, bụ́ atụrụ ọzọ ahụ, aka ịnọgide na-eji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi ma ghara ‘ịda mbà ná mkpụrụ obi ha.’—Tụlee Ndị Galeshia 6:9.

2. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’amụma ndị Aịzaya buru banyere Ọkpara Chineke?

2 Jehova mere ka Aịzaya onye amụma buo ọtụtụ amụma banyere Ọkpara ya. Amụma ndị a ga-enyere anyị aka ‘ilegide anya n’ebe Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị nọ,’ bụ́ Kraịst Jizọs. * Amụma ndị a mere ka anyị mata ụdị onye ọ bụ, ahụhụ ndị ọ ga-ata, na otú a ga-esi bulie ya elu ka ọ bụrụ Eze anyị na Onye Mgbapụta anyị. Amụma ndị a ga-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe Ncheta Ọnwụ Jizọs pụtara, bụ́ nke a ga-echeta n’afọ a mgbe anwụ dara na Thursday, April 9.

A Mata Onye Bụ́ Ohu Ahụ

3, 4. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ohu” nke dị n’akwụkwọ Aịzaya pụtara? (b) Olee otú Baịbụl si mee ka a mata onye bụ́ Ohu ahụ e kwuru okwu ya n’Aịzaya isi 42, 49, 50, 52, na 53?

3 Okwu bụ́ “ohu” dị ọtụtụ ebe n’akwụkwọ Aịzaya. N’ebe ụfọdụ, ọ bụ Aịzaya onye amụma ka a na-ekwu banyere ya. (Aịza. 20:3; 44:26) Mgbe ụfọdụkwa, ọ bụ mba Izrel, ma ọ bụ Jekọb, ka a na-ekwu banyere ya. (Aịza. 41:8, 9; 44:1, 2, 21) Ma, ònye ka a na-ekwu okwu ya n’amụma ndị pụrụ iche e buru banyere Ohu ahụ, bụ́ ndị dị n’Aịzaya isi 42, 49, 50, 52, na 53? Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst mere ka onye bụ́ Ohu Jehova nke e kwuru okwu ya n’ebe ndị ahụ doo anya. Ọ dị mma icheta na onye na-arụrụ ọchịchị Itiopia ọrụ, bụ́ onye e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, nọ na-agụ otu n’ime amụma ndị a mgbe mmụọ nsọ gwara onye na-ezisa ozi ọma bụ́ Filip ka ọ gakwuru ya. Nwoke ahụ, bụ́ onye nọ na-agụ ihe dị ugbu a n’Aịzaya 53:7, 8 jụrụ Filip, sị: “Ana m arịọ gị, Ọ̀ bụ onye ka onye amụma a na-ekwu ihe a banyere ya? Ọ̀ bụ banyere onwe ya ka ọ̀ bụ banyere onye ọzọ?” Filip gwara ya ozugbo na Aịzaya na-ekwu banyere Mesaya, bụ́ Jizọs.—Ọrụ 8:26-35.

4 Mgbe a mụrụ Jizọs ọhụrụ, mmụọ nsọ kpaliri otu nwoke bụ́ onye ezi omume, onye aha ya bụ́ Simiọn, ikwu na “nwatakịrị ahụ bụ́ Jizọs” ga-abụ “ìhè nke ga-ewepụ ihe kpuchiri anya mba niile,” dị ka e buru ya n’amụma dị n’Aịzaya 42:6 nakwa n’Aịzaya 49:6. (Luk 2:25-32) E bukwara mkparị ahụ a kparịrị Jizọs n’abalị ahụ a na-ekpe ya ikpe n’amụma dị n’Aịzaya 50:6-9. (Mat. 26:67; Luk 22:63) Mgbe Pentikọst nke afọ 33 O.A. gachara, Pita onyeozi mere ka o doo anya na Jizọs bụ “Ohu” Jehova. (Aịza. 52:13; 53:11; gụọ Ọrụ 3:13, 26.) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’amụma ndị a e buru banyere Mesaya ahụ?

Jehova Enye Ohu Ya Ọzụzụ

5. Olee ọzụzụ Ohu ahụ natara?

5 Otu n’ime amụma ndị Aịzaya buru banyere Ohu Chineke mere ka anyị mata ezigbo mmekọrịta dị n’etiti Jehova na Ọkpara ya tupu Ọkpara ya abịa n’ụwa. (Gụọ Aịzaya 50:4-9.) Ohu ahụ kwuru n’onwe ya na Jehova na-enye ya ọzụzụ mgbe niile. Ọ sịrị: “Ọ na-akpọte m kwa ụtụtụ; ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe dị ka ndị a kụziiri ihe.” (Aịza. 50:4) N’oge ahụ dum, Ohu Jehova a gere Nna ya ntị ma mụta ihe n’aka ya. O rubeere nna ya isi ma ṅomie ya. Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù pụrụ iche ịbụ onye Onye kere eluigwe na ụwa kụziiri ihe.

6. Olee otú Ohu ahụ si gosi na ya na-erubere Nna ya isi n’ihe niile?

6 N’amụma a, Ohu ahụ kpọrọ Nna ya “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova.” Nke a na-egosi na Ohu ahụ matara na ọ bụ Jehova bụ Ọkaaka eluigwe na ala. Iji gosi na ya na-erubere Nna ya isi n’ihe niile, ọ sịrị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova emeghewo ntị m, mụ onwe m enupụghịkwa isi. Atụgharịghị m gawa n’ebe ọzọ.” (Aịza. 50:5) Ọ “nọ n’akụkụ [Jehova] dị ka onye ọkà ọrụ” mgbe a na-eke eluigwe na ụwa na mmadụ. “Onye ọkà ọrụ” a “na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu [Jehova] mgbe niile, ihe na-enye [Ọkpara Chineke] obi ụtọ bụkwa ihe metụtara ụmụ mmadụ.”—Ilu 8:22-31.

7. Olee ihe gosiri na obi siri Ohu a ike na Nna ya ga-enyere ya aka mgbe ọ na-ata ahụhụ?

7 Ọzụzụ a Ohu a natara na otú ihe banyere ụmụ mmadụ si amasị ya mere ka o nwee ike ije ozi ya mgbe ọ bịara n’ụwa, o nyekwaara ya aka idi mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ. Ime uche Nna ya nọgidere na-atọ ya ụtọ n’agbanyeghị mkpagbu ọjọọ a kpagburu ya. (Ọma 40:8; Mat. 26:42; Jọn 6:38) N’oge niile Jizọs nọ na-ata ahụhụ n’ụwa, obi siri ya ike na ihe ya masịrị Nna ya, nakwa na ọ ga-enyere ya aka. Nke a mere Jizọs ji nwee ike ikwu ihe e dere n’amụma Aịzaya, sị: “Onye na-ekwupụta na m bụ onye ezi omume nọ nso. Ònye pụrụ ịlụso m ọgụ? . . . Lee! Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-enyere m aka.” (Aịza. 50:8, 9) N’eziokwu, Jehova nyeere Ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi aka n’oge niile o jere ozi n’ụwa, dị ka amụma ọzọ Aịzaya buru gosiri.

Ozi Ohu ahụ Jere n’Ụwa

8. Gịnị gosiri na Jizọs bụ ‘onye Jehova họọrọ,’ dị ka e buru n’amụma dị n’Aịzaya isi iri anọ na abụọ amaokwu mbụ?

8 Baịbụl gwara anyị ihe mere mgbe e mere Jizọs baptizim na 29 O.A. Ọ sịrị: “Mmụọ nsọ wee bekwasị ya . . . , otu olu wee si n’eluigwe kwuo, sị: ‘Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.’” (Luk 3:21, 22) Jehova si otú a mee ka a mara ‘onye ọ họọrọ,’ bụ́ onye e kwuru okwu ya n’amụma Aịzaya. (Gụọ Aịzaya 42:1-7.) Mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, o mezuru amụma a n’ụzọ pụrụ iche. Mgbe Matiu na-ede Oziọma ya, o kwughachiri ihe e dere n’Aịzaya 42:1-4 ma gosi na o mezuru n’isi Jizọs.—Mat. 12:15-21.

9, 10. (a) Olee otú Jizọs si mezuo ihe e dere n’Aịzaya 42:3 mgbe ọ na-eje ozi n’ụwa? (b) Olee otú Kraịst si ‘weta ikpe ziri ezi’ mgbe ọ nọ n’ụwa, oleekwa mgbe ọ ‘ga-eme ka e nwee ikpe ziri ezi n’ụwa’?

9 Ndị ndú okpukpe ndị Juu ledara ndị Juu ndị ọzọ anya. (Jọn 7:47-49) E megburu nnọọ ndị nkịtị emegbu nke na e nwere ike iji ha tụnyere “ahịhịa amị a zọturu azọtu” ma ọ bụ “owu oriọna” nke na-achọ ịnyụ anyụ. Ma, Jizọs nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị ogbenye na ndị nọ n’ahụhụ. (Mat. 9:35, 36) Ọ kpọrọ ndị dị otú a òkù, sị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume.” (Mat. 11:28) Jizọs ‘wetakwara ikpe ziri ezi’ site n’ịkụziri ndị mmadụ ihe bụ́ ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi n’anya Jehova. (Aịza. 42:3) O gosikwara na e kwesịrị iji ezi uche na ebere na-eme ihe e dere n’Iwu Chineke. (Mat. 23:23) Jizọs gosikwara na ya na-ekpe ikpe ziri ezi site n’ikwusara ma ọgaranya ma ogbenye ozi ọma n’akpaghị okè.—Mat. 11:5; Luk 18:18-23.

10 Aịzaya bukwara amụma na ‘onye Jehova họọrọ’ ‘ga-eme ka e nwee ikpe ziri ezi n’ụwa.’ (Aịza. 42:4) Ebe ọ bụ Eze nke Alaeze Mesaya, ọ ga-eme nke a n’oge na-adịghị anya mgbe ọ ga-ebibi ọchịchị niile dị ugbu a ma jiri ọchịchị ezi omume ya dochie ha. Ọ ga-eme ka e nwee ụwa ọhụrụ ebe ‘ezi omume ga-ebi.’—2 Pita 3:13; Dan. 2:44.

“Ìhè” na “Ọgbụgba Ndụ”

11. Olee otú Jizọs si bụrụ “ìhè nke mba niile” na narị afọ mbụ, oleekwa otú ọ ka si bụrụ ìhè nke mba niile taa?

11 Jizọs ghọrọ “ìhè nke mba niile,” bụ́ nke mezuru ihe e dere n’Aịzaya 42:6. Mgbe ọ na-eje ozi n’ụwa, ọ bụ ndị Juu bụ ndị bụ́ isi o wetaara ìhè ime mmụọ. (Mat. 15:24; Ọrụ 3:26) Ma Jizọs kwuru, sị: “Abụ m ìhè nke ụwa.” (Jọn 8:12) Ọ ghọọrọ ma ndị Juu ma mba niile ìhè, ọ bụghị naanị site n’ịkụziri ha eziokwu Chineke kamakwa site n’iji ndụ ya zuru okè chụọ àjà maka mmadụ niile. (Mat. 20:28) Mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ịbụ ndị àmà ya ‘ruo n’ebe kasị anya nke ụwa.’ (Ọrụ 1:8) Mgbe Pọl na Banabas na-eje ozi, ha kwughachiri okwu bụ́ “ìhè nke mba niile” ma gosi na o metụtara ozi ọma ha na-ekwusara ndị na-abụghị ndị Juu. (Ọrụ 13:46-48; tụlee Aịzaya 49:6.) Ụmụnna Jizọs ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa na ndị ibe ha ka na-arụ ọrụ ahụ, ya bụ, ime ka ìhè ime mmụọ na-enwusawanye nakwa inyere ndị mmadụ aka inwe okwukwe na Jizọs, onye bụ́ “ìhè nke mba niile.”

12. Olee otú Jehova si nye Ohu ya ka ọ bụrụ “ọgbụgba ndụ nke ndị mmadụ”?

12 N’otu amụma ahụ, Jehova gwara Ohu ya ọ họọrọ, sị: “M ga-echebe gị, meekwa ka ị bụrụ ọgbụgba ndụ nke ndị mmadụ, bụrụkwa ìhè nke mba niile.” (Aịza. 42:6) Setan gbalịsiri ike ka ọ laa Jizọs n’iyi ka o wee gbochie ya ijezu ozi ya n’ụwa, ma, Jehova chebere ya ruo mgbe oge ruru ka ọ nwụọ. (Mat. 2:13; Jọn 7:30) Jehova mechara kpọlite Jizọs n’ọnwụ ma mee ka ọ bụụrụ ụmụ mmadụ nọ n’ụwa “ọgbụgba ndụ,” ma ọ bụ ihe ibé. Ọgbụgba ndụ a mere ka obi sie anyị ike na Ohu Chineke a nke kwesịrị ntụkwasị obi ga-anọgide na-abụ “ìhè nke mba niile” ma na-eme ka ndị nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ si na ya pụta.—Gụọ Aịzaya 49:8, 9. *

13. Mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, olee otú o si napụta “ndị nọ ọdụ n’ọchịchịrị,” oleekwa otú o si nọgide na-eme nke a?

13 Iji mee ihe e kwuru n’ọgbụgba ndụ a, Ohu a Jehova họọrọ ‘ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì,’ “kpọpụta ndị mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ,” ma napụta “ndị nọ ọdụ n’ọchịchịrị.” (Aịza. 42:7) Mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, o mere ihe ndị a site n’ịgba ozizi ụgha ndị okpukpe na-ezi n’anwụ nakwa site n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Mat. 15:3; Luk 8:1) O si otú a kpọpụta ndị Juu ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya na mkpọrọ ime mmụọ. (Jọn 8:31, 32) Jizọs tọhapụkwara ọtụtụ nde mmadụ ndị na-abụghị ndị Juu n’agbụ ime mmụọ site n’ịkụziri ha eziokwu ahụ. O nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ‘gaa mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.’ O kwekwara ha nkwa na ya ga-anọnyere ha “ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:19, 20) Kraịst Jizọs si n’ebe ọ nọ n’eluigwe na-elekọta ọrụ nkwusa ozi ọma a na-arụ n’ụwa dum.

Jehova Ebulie “Ohu” ahụ Elu

14, 15. N’ihi gịnị ka Jehova ji bulie Ohu ya elu, oleekwa otú o si mee nke a?

14 N’amụma ọzọ e buru banyere Ohu ya bụ́ Mesaya, Jehova sịrị: “Lee! Ohu m ga na-eji nghọta eme ihe. Ọ ga-anọ n’ọkwá dị elu. A ga-ebuli ya elu, ọ ga-adịkwa elu nke ukwuu.” (Aịza. 52:13) Jehova buliri Ọkpara ya elu n’ihi otú o si na-erubere ọchịchị ya isi nakwa n’ihi otú o si kwesị ntụkwasị obi mgbe e lere ya ule tara nnọọ akpụ.

15 Pita onyeozi dere banyere Jizọs, sị: “Ọ nọ n’aka nri Chineke, n’ihi na ọ gara eluigwe; e mekwara ka ndị mmụọ ozi na ndị na-achị achị na ndị dị ike nọrọ n’okpuru ya.” (1 Pita 3:22) Pọl onyeozi dekwara ihe yiri nke a, sị: “O wedara onwe ya ala wee rube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’osisi ịta ahụhụ. N’ihi nke a, Chineke buliri ya elu ka ọ nọrọ n’ọkwá ka elu, o jikwa obiọma nye ya aha dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ, ka ikpere ọ bụla wee gbuo n’ala n’aha Jizọs, ma nke ndị nọ n’eluigwe ma nke ndị nọ n’elu ụwa ma nke ndị nọ n’okpuru ala, ka ire ọ bụla wee kwupụtakwa na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị iji wetara Chineke bụ́ Nna otuto.”—Fil. 2:8-11.

16. Olee otú e si mee ka Jizọs ‘dị elu nke ukwuu’ n’afọ 1914, oleekwa ihe ndị o merela kemgbe ahụ?

16 Jehova bulikwuru Jizọs elu na 1914. E mere ka ‘ọ dị elu nke ukwuu’ mgbe Jehova mere ya Eze nke Alaeze Mesaya. (Ọma 2:6; Dan. 7:13, 14) Kemgbe ahụ, Kraịst anọwo “na-enwe mmeri n’etiti ndị iro [ya].” (Ọma 110:2) O bu ụzọ merie Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya wee chụdata ha n’ụwa. (Mkpu. 12:7-12) Ka nke ahụ gachara, Kraịst rụrụ ọrụ o ji bụrụ Saịrọs Ka Ukwuu mgbe ọ tọhapụrụ ndị fọdụrụ n’ụmụnna ya ndị nọ n’ụwa e tere mmanụ n’agbụ nke “Babịlọn Ukwu ahụ.” (Mkpu. 18:2; Aịza. 44:28) Ọ nọwo na-eduzi ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile, bụ́ nke e jirila chịkọta “ndị fọdụrụ” n’ụmụnna ime mmụọ ya nakwa ọtụtụ nde “atụrụ ọzọ,” bụ́ ndị na-enyere “ìgwè atụrụ nta” ahụ aka.—Mkpu. 12:17; Jọn 10:16; Luk 12:32.

17. Olee ihe ndị anyị mụtarala site n’ịtụle amụma ndị Aịzaya buru banyere “ohu” ahụ?

17 O doro anya na ịtụle amụma ndị a pụrụ iche dị n’akwụkwọ Aịzaya emeela ka anyị nwekwuo ekele maka Eze anyị na Onye Mgbapụta anyị, bụ́ Jizọs Kraịst. Otú o si doo onwe ya n’okpuru Nna ya mgbe ọ na-eje ozi n’ụwa gosiri na ọzụzụ Nna ya nyere ya tupu ya abịa n’ụwa baara ya uru. O gosila na ya bụ “ìhè nke mba niile” site n’ozi ọma o kwusara, nakwa site n’otú o si na-elekọta ọrụ nkwusa ozi ọma ruo taa. Dị ka anyị na-aga ịhụ, amụma ọzọ e buru banyere Ohu ahụ bụ́ Mesaya na-egosi na ọ ga-ata ahụhụ ma jiri ndụ ya chụọ àjà maka anyị, bụ́ ihe ndị anyị kwesịrị ‘ichesi echiche ike banyere ha’ ka oge a ga-echeta ọnwụ ya na-eru nso.—Hib. 12:2, 3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Amụma ndị a dị n’Aịzaya 42:1-7; 49:1-12; 50:4-9; na 52:13–53:12.

Ntụleghachi

• Ònye bụ “ohu” ahụ e kwuru okwu ya n’amụma Aịzaya, oleekwa otú anyị si mara?

• Olee ọzụzụ Ohu ahụ natara n’aka Jehova?

• Olee otú Jizọs si bụrụ “ìhè nke mba niile”?

• Olee otú e si bulie Ohu ahụ elu?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 21]

Filip mere ka o doo anya na “ohu” ahụ Aịzaya kwuru okwu ya bụ Jizọs, onye bụ́ Mesaya ahụ

[Foto dị na peeji nke 23]

Jizọs, bụ́ Ohu Jehova họọrọ, nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị ogbenye na ndị nọ n’ahụhụ

[Foto dị na peeji nke 24]

Nna Jizọs buliri ya elu ma mee ya Eze nke Alaeze Mesaya