Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Lekwa Ụzọ. Jeenụ Ije na Ya”

“Lekwa Ụzọ. Jeenụ Ije na Ya”

“Lekwa Ụzọ. Jeenụ Ije na Ya”

Akụkọ banyere Emilia Pederson

Dị ka Ruth E. Pappas si kọọ ya

A MỤRỤ mama m, bụ́ Emilia Pederson, n’afọ 1878. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye nkụzi, ọ chọrọ iji ndụ ya nyere ndị mmadụ aka ka ha na Chineke dị ná mma. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ nnukwu akpati dị n’ụlọ anyị, nke dị n’obere obodo bụ́ Jasper, Minnesota, U.S.A. O nwetara akpati ahụ ka o were ya kwanye ngwongwo ọ ga-eji gaa China, bụ́ ebe ọ chọrọ ịnọ na-ezi ozi ọma. Ma, mgbe mama ya nwụrụ, ọ hapụrụ ịga China ma nọrọ n’ụlọ ka o wee lekọta ụmụnne ya ndị nke ọ tọrọ. Ọ lụrụ Theodore Holien n’afọ 1907. A mụrụ m na December 2, 1925. A mụrụ anyị asaa. Abụ m nwa nke ikpeazụ.

Mama m nwere ajụjụ ndị dị ya oké mkpa ọ chọrọ ka e jiri Baịbụl zaa ya. Otu n’ime ha bụ banyere ozizi a na-ezi na hel bụ ebe e ji ọkụ ata ndị ajọ omume ahụhụ. Ọ gwara ụkọchukwu ndị Chọọchị Lutheran ka o zi ya ebe ozizi a dị na Baịbụl. Ụkọchukwu ahụ gwara ya na e kwesịrị ịkụzi na hel bụ ebe e ji ọkụ ata ndị mmadụ ahụhụ, ma è dere ya na Baịbụl ma ọ bụ na e deghị ya.

Mama M Amụta Eziokwu Na-agụ Ya Agụụ

Ná mmalite afọ 1901, nwanne mama m nke nwaanyị aha ya bụ Emma, gara Northfield, Minnesota, ịmụ egwú. O bi n’ụlọ Milius Christianson, bụ́ onye nkụzi ya, nke nwunye ya bụ Onye Mmụta Baịbụl, bụ́ ihe a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Emma gwara ha na nwanne ya nwaanyị na-agụkarị Baịbụl. N’oge na-adịghị anya, Oriakụ Christianson detaara mama m akwụkwọ ozi wee zaa ya ọtụtụ ajụjụ o nwere banyere ihe ndị e dere na Baịbụl.

Otu ụbọchị, otu Onye Mmụta Baịbụl aha ya bụ Lora Oathout si Sioux Falls, nke dị na South Dakota, gbaa ụgbọ okporo ígwè bịa Jasper ka o wee kwusaa ozi ọma. Mama m gụrụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl e nyere ya. N’afọ 1915, ọ malitere ikwusara ndị ọzọ eziokwu dị na Baịbụl, na-enyekwa ndị mmadụ akwụkwọ ndị Lora wetaara ya.

N’afọ 1916, mama m nụrụ na Charles Taze Russell ga-abịa mgbakọ na Sioux City, Iowa. Ọ chọkwara ịga. N’oge ahụ, mama m amụọla ụmụ ise, Marvin, bụ́ nke obere, dị naanị ọnwa ise. Ma, ọ kpọọrọ ụmụ ya niile jiri ụgbọ okporo ìgwè gaa mgbakọ ahụ e nwere na Sioux City, bụ́ obodo dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri isii site n’ebe mama m bi. O gere okwu Nwanna Russell kwuru, kirie “Photo-Drama of Creation,” e meekwa ya baptizim. Mgbe ọ lọtara, o dere akụkọ banyere mgbakọ ahụ, e bipụtakwara ihe o dere n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Jasper Journal.

N’afọ 1922, mama m so na puku mmadụ iri na asatọ gara mgbakọ ahụ e nwere na Cedar Point, Ohio. Mgbe ọ lọtara mgbakọ ahụ, ọ nọgidere na-ekwusa banyere Alaeze Chineke. N’eziokwu, ihe nlereanya o setịpụrụ mere ka anyị gbasoo ndụmọdụ ahụ, bụ́: “Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya.”—Aịza. 30:21.

Ihe Ọma Si n’Ozi Alaeze ahụ Pụta

Tupu afọ 1925, ndị mụrụ m kwapụrụ na Jasper. Papa m na-enweta ezigbo ego n’ihe ọ na-eme, o nwekwara ezinụlọ buru ibu ọ na-elekọta. Ọ naghị agụ Baịbụl ka mama m, ma o ji obi ya niile na-akwado ọrụ ikwusa ozi ọma. Ọ na-enyekwa ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị a na-akpọ ndị pilgrim n’oge ahụ ụlọ. Mgbe ọ bụla onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nọ n’ụlọ anyị kwuo okwu, ihe dị ka otu narị mmadụ na-ege okwu ya. Ndị mmadụ na-eju ebe niile, ma na palọ, ma n’ebe anyị na-eri nri, ma n’ebe anyị na-ehi ụra.

Mgbe m dị ihe dị ka afọ asaa, nwanne mama m bụ́ Lettie, kpọrọ na fon ma gwa anyị na ndị agbata obi ya, bụ́ Ed Larson na nwunye ya, chọrọ ịmụ Baịbụl. Ha nabatara eziokwu dị na Baịbụl ozugbo, gwakwa onye agbata obi ha bụ́ Martha Van Daalen, bụ́ nwaanyị mụrụ ụmụ asatọ, ka o soro ha na-amụ Baịbụl. Martha na ndị ezinụlọ ya niile ghọrọ Ndị Mmụta Baịbụl. *

N’oge ahụ, Gordon Kammerud, bụ́ nwa okorobịa bi nso n’ụlọ anyị, malitere ịrụrụ papa m ọrụ. A dọrọ Gordon aka ná ntị, sị: “Agala ụmụ nna gị ukwu ndị nke nwaanyị nso. Okpukpe ha nwere otú ọ dị.” Ma, Gordon kwere ka a mụwara ya Baịbụl, o kwetakwara na ya achọtala eziokwu ahụ. Mgbe ọnwa atọ gachara, e mere ya baptizim. Ndị mụrụ ya ghọkwara Ndịàmà, ezinụlọ anyị niile, ya bụ, ezinụlọ Holien, nke Kammerud, na nke Van Daalen, ghọrọ ezigbo enyi.

Mgbakọ Dị Iche Iche Wusiri Okwukwe Anyị Ike

Mgbakọ ahụ mama m gara na Cedar Point gbara ya ume nke ukwuu, nke na ọ dịghị mgbe ọ hapụrụ ịga mgbakọ ọ bụla. Ihe ndị m chetara mere n’oge ahụ bụ mgbakọ ndị anyị gara n’ebe ndị dị anya. Nke anyị gara na Columbus, Ohio, n’afọ 1931 pụrụ iche n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka anyị malitere ịza aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. (Aịza. 43:10-12) M chetakwara mgbakọ anyị gara na Washington, D.C. na 1935, bụ́ ebe a nọ kwuo otu okwu pụrụ iche nke mere ka a mata ndị bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ e kwuru okwu ha ná Mkpughe. (Mkpu. 7:9) Ụmụnne m ndị nwaanyị, bụ́ Lilian na Eunice, so n’ihe karịrị narị mmadụ asatọ e mere baptizim ná mgbakọ ahụ.

Ezinụlọ anyị gara mgbakọ ndị e nwere na Columbus, Ohio, n’afọ 1937; na Seattle, Washington, n’afọ 1938; nakwa na New York City, n’afọ 1939. Ezinụlọ Van Daalen na nke Kammerud na ndị ọzọ so anyị gaa, o nwekwara ebe ndị anyị hiri ụra mgbe anyị na-aga. Leo Van Daalen lụrụ Eunice n’afọ 1940, ha ghọrọ ndị ọsụ ụzọ. N’otu afọ ahụ kwa, Gordon Kammerud lụrụ Lilian, ha ghọkwara ndị ọsụ ụzọ.

Mgbakọ e nwere n’afọ 1941 na St. Louis, Missouri, pụrụ iche. E nyere ọtụtụ puku ndị na-eto eto akwụkwọ bụ́ Children. Mgbakọ ahụ mere ka m mee mgbanwe dị ukwuu. N’oge na-adịghị anya, na September 1, n’afọ 1941, mụ na nwanne m nwoke bụ́ Marvin na nwunye ya bụ́ Joyce, ghọrọ ndị ọsụ ụzọ. Adị m afọ iri na ise mgbe ahụ.

Ọ na-esiri anyị bụ́ ndị ọrụ ugbo ike ịga mgbakọ n’ihi na a na-enwekarị mgbakọ ndị ahụ n’oge a na-ewe ihe ubi. N’ihi ya, mgbe mgbakọ gachara, anyị na-anọ n’azụ ụlọ anyị emegharị ihe ndị e mere ná mgbakọ ndị ahụ ka ndị na-agaghị wee nwee ike ịnụ ihe e kwuru na ha. Anyị na-enwe obi ụtọ dị ukwuu n’oge ndị ahụ anyị na-anọkọ.

Ụlọ Akwụkwọ Gilead na Ozi Ala Ọzọ

Na February afọ 1943, a malitere Ụlọ Akwụkwọ Gilead iji zụọ ndị ọsụ ụzọ ka ha gaa ozi ala ọzọ. Mmadụ isii ndị si n’ezinụlọ Van Daalen gụrụ akwụkwọ na klas nke mbụ. Ha bụ, Emil, Arthur, Homer, na Leo; nwa nwanne papa ha, bụ́ Donald; na Eunice nwanne m, bụ́ nwunye Leo. Anyị sịrị ha gaa nke ọma, ma obi adịchaghị anyị mma n’ihi na anyị amaghị mgbe ọzọ anyị na ha ga-ahụ. Mgbe ha gụchara akwụkwọ, e zigara ha isii na Puerto Rico, bụ́ ebe e nwere ihe na-erughị Ndịàmà iri na abụọ.

Mgbe otu afọ gara, Lilian na Gordon, nakwa Marvin na Joyce, gụrụ akwụkwọ na klas nke atọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead. E zigakwara ha Puerto Rico. Ma, na September afọ 1944, mgbe m dị afọ iri na asatọ, m gụrụ akwụkwọ na klas nke anọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Mgbe m gụchara akwụkwọ na February afọ 1945, m gakwuuru ụmụnne m na Puerto Rico. Nke a magburu onwe ya! N’agbanyeghị na ịmụta asụsụ Spanish siri ike, n’oge na-adịghị anya, ụfọdụ n’ime anyị nwere ihe karịrị mmadụ iri abụọ ha na-amụrụ Baịbụl. Jehova gọziri ozi anyị. Taa, e nwere ihe dị ka puku Ndịàmà iri abụọ na puku ise na Puerto Rico!

Ọdachi Dị Iche Iche Adakwasị Ezinụlọ Anyị

Leo na Eunice nọgidere na Puerto Rico mgbe ha mụchara nwa ha bụ́ Mark n’afọ 1950. N’afọ 1952, ha kpebiri iji oge ezumike ha gaa leta ndị ikwu ha nọ n’ụlọ. N’April 11, ha banyere ụgbọelu gawa. Obere oge ka ụgbọelu ahụ felichara, ọ dabara n’oké osimiri wee kpọkaa. Leo na Eunice nwụrụ. A hụrụ nwa ha dị afọ abụọ, bụ́ Mark, ka o sere n’elu oké osimiri. Otu onye na-anwụghị mgbe ụgbọelu ahụ kpọkara kubara Mark n’ihe na-eme ka mmadụ see n’elu mmiri wee fụnye ya ikuku n’ọnụ, o wee dị ndụ. *

Mgbe afọ ise gachara, na March 7, n’afọ 1957, ka mama m na papa m nọ na-aga Ụlọ Nzukọ Alaeze, ụgbọala ha ji na-aga dara afọ. Papa m nọ n’akụkụ ụzọ na-agbanwe ụkwụ ụgbọala ahụ mgbe ụgbọala ọzọ bịara kụtuo ya, ya anwụọ ozugbo. Ihe hà ka narị mmadụ isii gere okwu olili ozu ya, nke ahụ gbara àmà dị mma n’obodo anyị, bụ́ ebe ọtụtụ mmadụ na-akwanyere papa m ùgwù.

Ozi Ọhụrụ

Tupu papa m anwụọ, e ziteere m akwụkwọ ozi na m ga-amalite ije ozi n’Argentina. N’August 1957, erutere m Mendoza, bụ́ obodo dị n’akụkụ Ugwu Andes. N’afọ 1958, e zitere George Pappas n’Argentina, bụ́ onye gụrụ akwụkwọ na klas nke iri atọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Mụ na George ghọrọ ezigbo enyi. Anyị lụrụ n’April afọ 1960. Mama m nwụrụ n’afọ 1961, mgbe ọ dị afọ iri asatọ na atọ. O ji okwukwe jeere Chineke ozi, o nyekwaara ọtụtụ ndị ọzọ aka ime otú ahụ.

Mụ na George na ndị ozi ala ọzọ ndị ọzọ biri ebe dị iche iche wee jekọọ ozi ọnụ ruo afọ iri. Anyị mechara rụọ ọrụ ilekọta sekit ruo afọ asaa. Anyị lọghachiri na United States n’afọ 1975 iji lekọta ndị ezinụlọ anyị ahụ́ na-adịghị. N’afọ 1980, e nyere di m ọrụ ilekọta sekit ebe e nwere ọgbakọ ndị na-amụ ihe n’asụsụ Spanish. N’oge ahụ, e nwere ihe dị ka narị ọgbakọ isii ndị na-amụ ihe n’asụsụ Spanish na United States. N’ime afọ iri abụọ na isii, anyị lekọtara ọtụtụ n’ime ọgbakọ ndị ahụ, anyị hụkwara ka ha mụbara ruo puku atọ.

Ha Jere Ije ‘n’Ụzọ’ Ahụ

Obi tọrọ mama m ụtọ mgbe ọ hụrụ ka ndị ikwu ya banyere n’ozi oge niile. Dị ka ihe atụ, Carol, onye bụ́ nwa nwanne m nwaanyị nke tọchara anyị, bụ́ Ester, malitere ịsụ ụzọ n’afọ 1953. Ya na Dennis Trumbore lụrụ, ha na-ejekwa ozi oge niile kemgbe ọtụtụ afọ. Nwa Ester nke ọzọ, bụ́ Lois, lụrụ Wendell Jensen. Ha abụọ gụrụ akwụkwọ na klas nke iri anọ na otu n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Ha jekwara ozi afọ iri na ise na Nigeria. Nwanne Leo, bụ́ Ruth La Londe, na di ya, bụ́ Curtiss, kpọọrọ Mark zụọ, bụ́ nwa ahụ ndị mụrụ ya nwụrụ n’ihe mberede ụgbọelu. Mark na nwunye ya, bụ́ Lavonne, jere ozi ịsụ ụzọ ọtụtụ afọ, ha zụkwara ụmụ ha anọ ije ije ‘n’ụzọ’ ahụ.—Aịza. 30:21.

Orlen, bụ́ naanị onye ka dị ndụ n’ime ndị nne na nna ji mụ na ha, akarịala afọ iri itoolu na ise. Ọ ka jikwa okwukwe siri ike na-ejere Jehova ozi. Mụ na George ka jikwa ọṅụ na-eje ozi oge niile.

Ihe Mama M Hapụrụ

Ọ bụ m ji otu n’ime ihe kacha dịrị mama m ezigbo mkpa, ya bụ, kọbọdụ ya. Ọ bụ ihe papa m nyere ya mgbe ha gbara akwụkwọ. Ihe dị n’otu n’ime drọwa kọbọdụ ahụ bụ ihe e ji etinye akwụkwọ, bụ́ nke akwụkwọ ozi dị iche iche dị. Akwụkwọ akụkọ ndị o dere isiokwu ndị gbara àmà dị mma banyere Alaeze Chineke dịkwa na ya. Ụfọdụ n’ime ha akarịala otu narị afọ e dere ha. Akwụkwọ ozi ndị na-eme mama m obi ụtọ, bụ́ ndị ụmụ ya nọ ozi ala ọzọ detaara ya, dịkwa na ya. Ịgụghachi ha ugboro ugboro na-eme m nnọọ obi ụtọ. Akwụkwọ ozi ndị o detaara anyị gbara anyị ume, mesiekwa anyị obi ike. Mama m agaghị ozi ala ọzọ gụrụ ya agụụ. Ma, otú ịga ozi ala ọzọ si dị ya ọkụ n’obi kpaliri mmasị ndị ezinụlọ anyị ndị ọzọ. M na-eche nnọọ otú ọ ga-adị mgbe ezinụlọ anyị buru ibu na mama anyị na papa anyị ga-anọkọta ọnụ ọzọ mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs!—Mkpu. 21:3, 4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụ akụkọ ndụ Emil H. Van Daalen, gaa n’Ụlọ Nche Bekee nke June 15, 1983, peeji nke 27 ruo nke 30.

^ par. 24 Gụọ Teta! Bekee nke June 22, 1952, na peeji nke 3 ruo nke 4.

[Foto dị na peeji nke 17]

Emilia Pederson

[Foto dị na peeji nke 18]

N’afọ 1916: Mama m, na papa m (papa m ku Marvin); N’ala ala, malite n’aka ekpe gaa n’aka nri: Orlen, Ester, Lilian, Mildred

[Foto dị na peeji nke 19]

Leo na Eunice, obere oge tupu ha anwụọ

[Foto dị na peeji nke 20]

N’afọ 1950: Malite n’aka ekpe gaa n’aka nri, n’elu: Ester, Mildred, Lilian, Eunice, Ruth; n’ala ala: Orlen, mama m, papa m, na Marvin

[Foto dị na peeji nke 20]

George na Ruth Pappas, mgbe ha na-arụ ọrụ ilekọta sekit n’afọ 2001