Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ohu Jehova—Onye ‘A Mara Ube n’Ihi Mmebi Iwu Anyị’

Ohu Jehova—Onye ‘A Mara Ube n’Ihi Mmebi Iwu Anyị’

Ohu Jehova—Onye ‘A Mara Ube n’Ihi Mmebi Iwu Anyị’

“A mara ya ube n’ihi mmebi iwu anyị; a nọkwa na-echi ya ọnụ n’ala n’ihi njehie anyị. . . . A gwọrọ anyị n’ihi ọnyá ya.”—AỊZA. 53:5.

1. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe anyị na-echeta ọnwụ Jizọs, oleekwa amụma ga-enyere anyị aka ime nke a?

OGE NCHETA Ọnwụ Jizọs bụ mgbe anyị ji echeta ihe mere Kraịst ji nwụọ na ihe mbilite n’ọnwụ ya rụzuru. Oge a a ga-echeta ọnwụ Jizọs ga-eme ka anyị cheta na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị, nakwa na e kwesịrị ido aha ya nsọ. Ọ ga-emekwa ka anyị cheta na nzube Jehova ga-emezu. Ọ ga-echetakwara anyị otú a ga-esi azọpụta ụmụ mmadụ. Eleghị anya, ọ dịghị amụma ọzọ dị na Baịbụl nke kọrọ banyere àjà Kraịst ji ndụ ya chụọ na uru àjà ahụ bara karịa nke dị n’Aịzaya 53:3-12. Aịzaya buru amụma banyere otú Ohu ahụ ga-esi taa ahụhụ, kwuokwa kpọmkwem otú Kraịst ga-esi nwụọ nakwa ngọzi ọnwụ ya ga-ewetara ụmụnna ya e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ya.—Jọn 10:16.

2. Gịnị ka amụma Aịzaya na-egosi, oleekwa otú ọ ga-esi emetụta anyị?

2 Narị afọ asaa tupu a mụọ Jizọs n’ụwa, Jehova mere ka Aịzaya buo amụma na Ohu ya ọ họọrọ ga-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna mgbe a ga-anwa ya ọnwụnwa siri oké ike. Nke a na-egosi na obi siri nnọọ Jehova ike na Ọkpara ya agaghị emechu ya ihu. Obi ga-atọ anyị ụtọ mgbe anyị na-atụle amụma a, okwukwe anyị ga-esikwa ike.

‘E Ledara Ya Anya, Ọ Dịghịkwa Ihe E Ji Ya Kpọrọ’

3. Gịnị mere ndị Juu ji kwesị ịnabata Jizọs, ma, olee otú ha si mesoo ya?

3 Gụọ Aịzaya 53:3. Cheedị otú ọ ga-adị Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya ịhapụ ihe na-enye ya ọṅụ, nke bụ́ ịnọ n’akụkụ Nna ya wee na-ejere ya ozi, bịa n’ụwa iji ndụ ya chụọ àjà ka o wee zọpụta ụmụ mmadụ ná mmehie na ọnwụ! (Fil. 2:5-8) Ọ chụrụ àjà ka e wee gbaghara ụmụ mmadụ mmehie ha, bụ́ ihe àjà Iwu Mozis kwuru ka e jiri ụmụ anụmanụ na-achụ bụ ihe atụ ya. (Hib. 10:1-4) A sịgodị na ndị ọzọ anabataghị Mesaya ahụ e kwere ná nkwa, ọ̀ bụ na ndị Juu, bụ́ ndị nọ na-eche ọbịbịa ya, ekwesịghị ịnabata ya ma sọpụrụ ya? (Jọn 6:14) Dị ka Aịzaya buru n’amụma, kama ịsọpụrụ Kraịst, ndị Juu ‘ledara ya anya, ọ dịghịkwa ihe ha ji ya kpọrọ.’ Jọn onyeozi dere sị: “Ọ bịara n’obodo a mụrụ ya, ma ndị nke ya anabataghị ya.” (Jọn 1:11) Pita onyeozi gwara ndị Juu, sị: “Chineke nna nna anyị hà . . . emewo ka Ohu ya bụ́ Jizọs dị ebube, bụ́ onye unu onwe unu raara nye, gọnahụkwa ya n’ihu Paịlet, mgbe o kpebiri ịhapụ ya. Ee, unu gọnahụrụ onye nsọ na onye ezi omume ahụ.”—Ọrụ 3:13, 14.

4. Olee otú Jizọs si mara ihe bụ́ ọrịa?

4 Aịzaya bukwara amụma na Jizọs ga-abụ ‘onye maara ihe bụ́ ọrịa.’ Mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, e nwere mgbe ike gwụrụ ya, ma o nweghị ebe e kwuru na o nwere mgbe ọ rịara ọrịa. (Jọn 4:6) Ma, ọ maara banyere ọrịa ndị o kwusaara ozi ọma na-arịa. O meteere ha ebere ma gwọọ ọtụtụ n’ime ha. (Mak 1:32-34) Jizọs si otú a mezuo amụma ahụ kwuru, sị: “Ọ bụ ọrịa anyị ka ya onwe ya buuru; o bukwaara ihe mgbu anyị.”—Aịza. 53:4a; Mat. 8:16, 17.

Dị Ka À Ga-asị Na ‘Chineke Tiri Ya Ihe’

5. Olee ihe ọtụtụ ndị Juu chere banyere ọnwụ Jizọs, oleekwa ihe mere nke a ji wute Jizọs nke ukwuu?

5 Gụọ Aịzaya 53:4b. Ọtụtụ n’ime ndị ha na Jizọs dịkọrọ ndụ aghọtaghị ihe mere o ji taa ahụhụ ma nwụọ. Ha chere na Chineke nọ na-ata ya ahụhụ, dị ka à ga-asị na Chineke tiri ya ọrịa na-asọ oyi. (Mat. 27:38-44) Ndị Juu boro Jizọs ebubo na ọ na-ekwulu Chineke. (Mak 14:61-64; Jọn 10:33) N’eziokwu, Jizọs abụghị onye mmehie, ọ bụghịkwa onye nkwulu. Ma, n’ihi otú o si hụ Nna ya n’anya nke ukwuu, ọ ga-abụrịrị na o wutere Ohu Jehova a nke ukwuu mgbe a mara ya ikpe ọnwụ maka na ha sị na ọ na-ekwulu Chineke. N’agbanyeghị nke a, ọ dị njikere ime uche Jehova.—Mat. 26:39.

6, 7. Olee otú o si bụrụ na Jehova ‘gwepịara’ Ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, oleekwa ihe mere nke a ji ‘tọọ Chineke ụtọ’?

6 O jughị anyị anya na Aịzaya buru amụma na ndị ọzọ ga-ewere ya na ‘Chineke tiri’ Kraịst ihe, ma ihe juru anyị anya bụ na o buru n’amụma na “ọ tọrọ Jehova ụtọ igwepịa ya.” (Aịza. 53:10) Ebe ọ bụ na Jehova kwuru, sị: “Lee! Ohu m, . . . onye m họọrọ, bụ́ onye ihe ya masịrị mkpụrụ obi m,” oleezi otú ọ ga-esi ‘tọọ Jehova ụtọ igwepịa ya’? (Aịza. 42:1) Olee otú o si bụrụ na nke a tọrọ Jehova ụtọ?

7 Iji ghọta amụma a, ka anyị cheta na mgbe Setan mara Jehova aka, o kwuru na ọ dịghị ohu Chineke ọ bụla, ma n’eluigwe ma n’ụwa, nke ji obi ya dum na-erubere Chineke isi. (Job 1:9-11; 2:3-5) Jizọs gosiri nnọọ na ihe ahụ Setan kwuru bụ ụgha site n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. Ọ bụ ezie na Jehova kwere ka ndị iro Kraịst gbuo ya, o doro anya na o wutere ya nke ukwuu ịhụ ka e gburu Ohu ya ọ họọrọ. Ma, ọ tọrọ Jehova ụtọ nke ukwuu ịhụ ka Ọkpara ya kwesịrị ntụkwasị obi ruo n’isi. (Ilu 27:11) Ihe ọzọ bụ na ọmụma Jehova maara uru ọnwụ Ọkpara ya ga-abara ụmụ mmadụ chegharịrị ná mmehie ha nyere ya ọṅụ dị ukwuu.—Luk 15:7.

“A Mara Ya Ube n’Ihi Mmebi Iwu Anyị”

8, 9. (a) Olee otú e si ‘maa Jizọs ube n’ihi mmebi iwu anyị’? (b) Olee otú Pita si gosi na nke a mere eme?

8 Gụọ Aịzaya 53:6. Ụmụ mmadụ na-eme mmehie nọ na-awagharị ka ụmụ atụrụ furu efu, na-achọ onye ga-anapụta ha n’ọrịa na ọnwụ ha ketara n’aka Adam. (1 Pita 2:25) Ebe ọ bụ na ọ dịghị onye ọ bụla zuru okè n’ime ụmụ Adam, ọ dịghị onye n’ime ha nwere ike iweghachi ihe ahụ Adam tụfuru. (Ọma 49:7) Ma, n’ihi na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, ‘o mewo ka onye ahụ, bụ́ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, onye bụkwa Ohu ya ọ họọrọ, buru njehie anyị niile.’ Kraịst buuru mmehie anyị n’osisi ịta ahụhụ ma nwụchitere anyị ọnwụ mgbe o kwere ka ‘a maa ya ube n’ihi mmebi iwu anyị,’ kwekwa ka ‘e chie ya ọnụ n’ala n’ihi njehie anyị.’

9 Pita onyeozi dere, sị: “A kpọrọ unu ka unu soro ụzọ a, n’ihi na ọbụna Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya. Ya onwe ya buuru mmehie anyị n’ahụ́ ya n’elu osisi ahụ, ka anyị wee sepụ aka ná mmehie ma bie ndụ n’ezi omume.” Pita kwughachiri ihe e kwuru n’amụma Aịzaya sị: “Ọ bụkwa ‘site n’ọnyá ya ka a gwọrọ unu.’” (1 Pita 2:21, 24; Aịza. 53:5) Nke a mere ka ndị mmehie na Chineke nwee ike ịdị ná mma. Pita kwuru, sị: “Kraịst nwụrụ naanị otu ugboro n’ihe banyere mmehie, onye ezi omume n’ihi ndị ajọ omume, ka o wee duga unu n’ebe Chineke nọ.”—1 Pita 3:18.

“A Kpụụrụ Ya Dị Ka Atụrụ A Gaje Igbu Egbu”

10. (a) Olee otú Jọn Onye Na-eme Baptizim si kọwaa Jizọs? (b) Olee ihe mere otú a Jọn si kọwaa ya ji kwesị ekwesị?

10 Gụọ Aịzaya 53:7, 8. Mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim hụrụ Jizọs ka ọ na-abịakwute ya, ọ sịrị: “Lee Nwa Atụrụ Chineke nke na-ewepụ mmehie nke ụwa!” (Jọn 1:29) Mgbe Jọn kpọrọ Jizọs Nwa Atụrụ, ọ ga-abụ na ihe o bu n’uche bụ ihe ahụ Aịzaya kwuru, sị: “A kpụụrụ ya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu.” (Aịza. 53:7) Aịzaya buru amụma, sị: “Ọ wụpụụrụ ọnwụ mkpụrụ obi ya.” (Aịza. 53:12) Ọ dị mma ịmara na n’abalị ahụ Jizọs hiwere Ncheta Ọnwụ ya, o bunyere ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi iko mmanya ma kwuo, sị: “Nke a pụtara ‘ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,’ nke a ga-awụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.”—Mat. 26:28.

11, 12. (a) Gịnị ka nkwere Aịzik kweere ka e jiri ya chụọ àjà na-egosi banyere àjà Kraịst? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche banyere Ebreham ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jehova, mgbe anyị na-echeta ọnwụ Jizọs?

11 Dị ka Aịzik oge ochie mere, Jizọs kwere ka e jiri ya chụọ àjà ka ihe bụ uche Jehova banyere ya wee mezuo. (Jen. 22:1, 2, 9-13; Hib. 10:5-10) Ọ bụ ezie na Aịzik ji obi ya kwe ka e jiri ya chụọ àjà, ọ bụ Ebreham bụ onye chọrọ iji ya chụọ àjà. (Hib. 11:17) N’otu aka ahụ, Jizọs ji obi ya kwere ịnwụ, ma, ọ bụ Jehova nyere ihe mgbapụta ahụ. Àjà Chineke ji Ọkpara ya chụọ bụ ụzọ o si gosi na ya hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu.

12 Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Pọl onyeozi dere, sị: “Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya ya, n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Rom 5:8) N’ihi ya, mgbe anyị na-asọpụrụ Kraịst site n’icheta ọnwụ ya, anyị ekwesịghị ichefu na onye mere ndokwa ka e jiri Jizọs chụọ àjà bụ Ebreham ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jehova. Anyị na-echeta ọnwụ Jizọs iji nye Jehova otuto.

Ohu ahụ Emee “Ka Ọtụtụ Ndị Ghọọ Ndị Ezi Omume”

13, 14. Olee otú Ohu Jehova si mee ka “ọtụtụ ndị ghọọ ndị ezi omume”?

13 Gụọ Aịzaya 53:11, 12. Jehova kwuru ihe Ohu ya ọ họọrọ ga-eme, sị: “Onye ezi omume ahụ, bụ́ ohu m, . . . ga-eme ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị ezi omume.” Olee otú ọ ga-esi mee nke a? Ngwụcha amaokwu nke iri na abụọ mere ka anyị ghọta otú ọ ga-esi mee ya. “[Ohu ahụ] gbachiteere ndị na-emebi iwu.” Ụmụ Adam niile bu mmehie pụta ụwa, ya bụ, ha bụ “ndị na-emebi iwu,” n’ihi ya kwa, ha na-anata “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ,” bụ́ ọnwụ. (Rom 5:12; 6:23) Ọ dị mkpa ka e mee ka ụmụ mmadụ, bụ́ ndị mmehie, na Jehova dịghachi ná mma. Amụma dị n’isi nke iri ise na atọ n’akwụkwọ Aịzaya kọwara nnọọ otú Jizọs si ‘gbachitere’ ụmụ mmadụ na-eme mmehie. Ọ sịrị: “A pịara ya ụtarị nke ga-eme ka anyị nwee udo, a gwọrọ anyị n’ihi ọnyá ya.”—Aịza. 53:5.

14 Kraịst mere ka “ọtụtụ ndị ghọọ ndị ezi omume” site n’iburu mmehie anyị na ịnwụ n’ihi anyị. Pọl dere, sị: “Chineke hụrụ na ọ dị mma ka ihe niile biri n’ime ya [ya bụ, Kraịst] n’ụzọ zuru ezu, na isi n’aka ya mee ka ya na ihe ndị ọzọ niile dị ná mma site n’iji ọbara ahụ ọ wụsịrị n’osisi ịta ahụhụ mee udo, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ihe ndị dị n’elu ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’eluigwe.”—Kọl. 1:19, 20.

15. (a) Olee ndị bụ “ihe ndị dị n’eluigwe” Pọl kwuru okwu ha? (b) Olee naanị ndị ruru eru ịta achịcha ahụ na ịṅụ mmanya ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

15 “Ihe ndị dị n’eluigwe” e mere ka ha na Jehova dịghachi ná mma n’ihi ọbara Kraịst wụsịrị bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị a kpọrọ ka ha soro Kraịst na-achị n’eluigwe. A kpọrọ Ndị Kraịst “a kpọrọ òkù ịga eluigwe” “ndị ezi omume ka ha wee nweta ndụ.” (Hib. 3:1; Rom 5:1, 18) Jehova meziri ka ha bụrụ ụmụ ime mmụọ ya. Mmụọ nsọ na-agbara ha àmà na ha bụ “ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe,” ndị a kpọrọ ka ha bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’Alaeze eluigwe Kraịst. (Rom 8:15-17; Mkpu. 5:9, 10) Ha ghọrọ Izrel ime mmụọ, ya bụ, “Izrel nke Chineke,” e mekwara ka ha soro ‘n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ’ ahụ. (Jere. 31:31-34; Gal. 6:16) Ebe ha so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ha ruru eru ịta achịcha ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs, ruokwa eru ịṅụ mmanya ahụ na-acha ọbara ọbara, bụ́ nke Jizọs kwuru okwu banyere ya, sị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke dabeere n’ọbara m, bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi unu.”—Luk 22:20.

16. Gịnị bụ “ihe ndị dị n’elu ụwa,” oleekwa otú e si eme ka ha bụrụ ndị ezi omume n’anya Jehova?

16 “Ihe ndị dị n’elu ụwa” bụ atụrụ ọzọ nke Kraịst, ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ohu ahụ Jehova họọrọ na-emekwa ka ndị a ghọọ ndị ezi omume n’anya Jehova. Ebe ha nwere okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst chụrụ ma ‘saa uwe mwụda ha, meekwa ka ọ na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ,’ Jehova kpọrọ ha ndị ezi omume, ọ bụghị na ha bụ ụmụ ime mmụọ ya, kama ha bụ ndị enyi ya. Ọ na-emekwa ka ha nwee olileanya ịlanahụ ‘oké mkpagbu ahụ.’ (Mkpu. 7:9, 10, 14; Jems 2:23) Ebe atụrụ ọzọ a na-esoghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ha enweghị olileanya ibi n’eluigwe. N’oge a na-echeta ọnwụ Jizọs, ha anaghị ata achịcha, ha anaghịkwa aṅụ mmanya, bụ́ ihe ndị ahụ na-anọchi anya ahụ́ na ọbara Jizọs, kama ha na-eji nkwanye ùgwù ekiri ihe na-aganụ.

Ekele Dịrị Jehova na Ohu Ya nke Ihe Ya Masịrị Ya!

17. Olee otú ịtụle amụma dị iche iche Aịzaya buru banyere Ohu ahụ si nyere anyị aka ịkwadebe uche anyị maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?

17 Ntụle a anyị tụlere amụma dị iche iche Aịzaya buru banyere Ohu ahụ bụ ụzọ dị mma isi kwadebe uche anyị maka Ncheta Ọnwụ Kraịst. O meela ka anyị “na-elegide anya n’ebe Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị nọ.” (Hib. 12:2) Anyị amatala na Ọkpara Chineke abụghị onye nnupụisi. Ọ dịghị ka Setan. Obi dị ya ụtọ na Jehova ziri ya ihe, o kwekwara na Jehova bụ Eze Kachasị Elu. Anyị ahụla na mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị o kwusaara ozi ọma, ọ gwọkwara ọtụtụ n’ime ha ọrịa, nyekwara ha aka mee ka ha na Chineke dịghachi ná mma. O si otú a gosi ihe ya onwe ya, ya bụ, Eze bụ́ Mesaya, ga-eme n’usoro ihe ọhụrụ mgbe ‘ọ ga-eme ka e nwee ikpe ziri ezi n’ụwa.’ (Aịza. 42:4) Otú o si jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa Alaeze Chineke, dị ka “ìhè nke mba niile,” na-echetara ndị na-eso ụzọ ya na ha kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile.—Aịza. 42:6.

18. Gịnị mere amụma Aịzaya ji na-eme ka anyị na-ekele Jehova nke ukwuu, na-ekelekwa Ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi?

18 Amụma Aịzaya na-emekwa ka anyị ghọtakwuo nnukwu àjà Jehova chụrụ mgbe o zitere Ọkpara ya n’ụwa ka ọ bịa taa ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị. Ihe tọrọ Jehova ụtọ bụ ịhụ otú Ọkpara ya si kwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, ọ bụghị ịhụ ka Ọkpara ya na-ata ahụhụ. O kwesịrị ịtọ anyị ụtọ otú o si tọọ Jehova mgbe anyị ghọtara ihe niile Jizọs mere iji gosi na Setan bụ onye ụgha na iji doo aha Jehova nsọ, wee si otú a gosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị. Kraịst bukwaara mmehie anyị ma nwụchitere anyị ọnwụ. O si otú a mee ka ìgwè atụrụ nta, bụ́ ụmụnna ya e tere mmanụ, na atụrụ ọzọ ahụ bụrụ ndị ezi omume n’anya Jehova. Mgbe anyị zukọtara icheta ọnwụ Jizọs, ka anyị kelee Jehova nke ukwuu, keleekwa Ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi.

Ntụleghachi

• Olee otú o si bụrụ na “ọ tọrọ Jehova ụtọ igwepịa” Ọkpara ya?

• Olee otú e si ‘maa Jizọs ube n’ihi mmebi iwu anyị’?

• Olee otú Ohu ahụ si mee “ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị ezi omume”?

• Olee otú ịtụle amụma ndị a kwuru banyere Ohu ahụ sirila kwadebe uche na obi gị maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 26]

“E ledara ya anya, ọ dịghịkwa ihe anyị ji ya kpọrọ”

[Foto dị na peeji nke 28]

“Ọ wụpụụrụ ọnwụ mkpụrụ obi ya”

[Foto dị na peeji nke 29]

“Atụrụ ọzọ” ahụ na-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs ma jiri nkwanye ùgwù na-ekiri ihe na-aganụ