Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Kwesịrị Isi Ọnwụ na Ị Ga-emerịrị Ihe Masịrị Gị?

Ì Kwesịrị Isi Ọnwụ na Ị Ga-emerịrị Ihe Masịrị Gị?

Ì Kwesịrị Isi Ọnwụ na Ị Ga-emerịrị Ihe Masịrị Gị?

ỤMỤAKA abụọ nọ na-egwu egwu. Otu apụnara onye nke ọzọ ihe o ji egwu egwu, wee sị, “Ọ bụ nke m!” Ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-achọkarị ọdịmma onwe ha naanị malite na nwata. (Jen. 8:21; Rom 3:23) E wezụga nke ahụ, ụwa na-akwado àgwà nke mmadụ ịchọ ọdịmma onwe ya naanị. Ọ bụrụ na anyị achọghị ịbụ ndị na-akpa àgwà a, anyị aghaghị ịgbaso ọchịchọ nke ịchọ ọdịmma onwe anyị naanị mgba. Ọ bụrụ na anyị emeghị otú a, anyị ga-eme ka ụmụnna anyị sụọ ngọngọ, meekwa ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma.—Rom 7:21-23.

Pọl onyeozi gbara anyị ume ka anyị chebara otú ihe anyị na-eme nwere ike isi metụta ndị ọzọ echiche. O dere, sị: “Iwu kwadoro ihe niile; ma ọ bụghị ihe niile bara uru. Iwu kwadoro ihe niile; ma ọ bụghị ihe niile na-ewuli elu.” Pọl kwukwara, sị: ‘Unu abụkwala ihe ịsụ ngọngọ.’ (1 Kọr. 10:23, 32) Ma, mgbe a bịara n’ihe iwu na-emegideghị bụ́ nke mmadụ nwere ike ime ma ọ chọọ, ọ ga-adị mma ma anyị jụọ onwe anyị, sị: ‘M̀ ga-enwe ike ịhapụ ihe ruuru m, ma ọ bụrụ na mụ achọpụta na ọ ga-eme ka udo ghara ịdị n’ọgbakọ? M̀ ga-enwe ike ime ihe Baịbụl kwuru, ọbụna mgbe o siiri m ike ime ya?’

Mgbe Ị Na-achọ Ọrụ

Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụ onye na-achọ ọrụ ga-ekpebiri onwe ya ụdị ọrụ ọ ga-arụ, na ọ gbasaghị ndị ọzọ. Ma, tụlee ihe mere otu nwoke na-azụ ahịa, onye bi n’otu obere obodo dị na South America. E ji ịgba chaa chaa na aṅụrụma mara ya. Ma, mgbe ya na Ndịàmà Jehova mụwara Baịbụl, ọ malitere ime ihe ọ na-amụta na Baịbụl wee gbanwee àgwà ya. (2 Kọr. 7:1) Mgbe o kwuru na ya chọrọ iso ọgbakọ na-ekwusa ozi ọma, ndị okenye ji akọ gbaa ya ume ka o chebara ụdị ihe ọ na-ere echiche. Ọ bụ n’aka ya ka ndị na-ere mmanya ọkụ n’obodo ahụ si azụta mmanya ha na-ere. Ụdị mmanya ọkụ ọ na-ere nwere ihe dị iche iche e ji ya eme. Ma, n’obodo ahụ, ndị mmadụ na-agbanyekarị ya mmanya ọtọ bịrịbịrị ma na-aṅụ ya ka o wee gbuwe ha.

Nwoke ahụ ghọtara na ọ bụrụ na ya ana-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma ma ka na-ere mmanya ọkụ ahụ, ọ ga-ewetara ọgbakọ aha ọjọọ, o nwekwara ike imebi mmekọrịta ya na Chineke. N’agbanyeghị na o nwere ezinụlọ buru ibu ọ na-elekọta, ọ kwụsịrị ire mmanya ahụ. Ọ na-ere akwụkwọ ugbu a iji lekọta ezinụlọ ya. Ugbu a, emeela nwoke a, na nwunye ya baptizim, meekwa abụọ n’ime ụmụ ha ise. Ha jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, obi ha anaghịkwa ama ha ikpe.

Mgbe Ị Na-ahọrọ Ndị Gị na Ha Ga Na-akpakọrịta

Ànyị kwesịrị iche na ọ bụ anyị ga-ekpebi ma anyị na ndị na-abụghị ndị Jehova ọ̀ ga na-akpakọrịta, ka ànyị ga-ege ntị n’ihe Baịbụl kwuru? Otu nwanna nwaanyị chọrọ iso otu nwa okorobịa na-abụghị Onyeàmà gaa oriri na nkwari. N’agbanyeghị na a gwara ya na ihe ahụ ọ na-achọ ime nwere ike itinye ya ná nsogbu, o chere na ya nweere onwe ya ime ihe masịrị ya, wee gawa. Mgbe obere oge gachara ka ha ruru ebe ahụ, e nyere ya mmanya e tinyere ọgwụ mere ka ụra buru ya. O tetara mgbe ọtụtụ awa gafere wee chọpụta na nwa okorobịa ahụ ọ sị na ọ bụ enyi ya edinaala ya.—Tụlee Jenesis 34:2.

Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị mgbe niile ka ụdị ihe ọjọọ a nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị na ndị na-abụghị ndị Jehova na-akpakọrịta, ma, Baịbụl dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” (Ilu 13:20) Nke bụ́ eziokwu bụ na ime ndị na-akpa àgwà ọjọọ enyi nwere ike itinye anyị ná nsogbu! Ilu 22:3 kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.” Ndị enyi anyị nwere ike imebi anyị, nweekwa ike ime ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma.—1 Kọr. 15:33; Jems 4:4.

N’ihe Banyere Uwe na Ejiji

Otú e si akwa uwe na otú e si eji ejiji na-agbanwe site n’oge ruo n’oge. Ma, ihe Baịbụl kwuru banyere otú uwe na ejiji anyị kwesịrị ịdị anaghị agbanwe agbanwe. Pọl dụrụ ụmụ nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst ọdụ ka ha “jiri uwe dị mma n’anya na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè.” Ndụmọdụ a gbasakwara ndị nwoke. (1 Tim. 2:9) Pọl anaghị ekwu na Ndị Kraịst ekwesịghị iyi uwe a chọrọ mma, ọ naghịkwa ekwu na ha niile ga na-eyi otu ụdị uwe. Ma, gịnị ka imeru ihe n’ókè pụtara? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na onye na-emeru ihe n’ókè bụ “onye na-adịghị mpako ma ọ bụ okomoko, . . . onye na-eji ejiji kwesịrị ekwesị, onye na-ekwu okwu dị mma, ma ọ bụ onye na-akpa ezigbo àgwà.”

Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ nwere ike ikwu n’eziokwu na m na-emeru ihe n’ókè ma ọ bụrụ na m na-achọkarị iji ejiji n’ụzọ ga-eme ka ndị ọzọ na-ele m? Otú m si eji ejiji ọ̀ na-eme ka ndị ọzọ chewe na mụ abụghị ezigbo mmadụ ma ọ bụ nyowe m enyowe?’ Ejiji anyị ekwesịghị ime ka ndị ọzọ ‘sụọ ngọngọ,’ kama, anyị kwesịrị ‘ilekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe anyị, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.’—2 Kọr. 6:3; Fil. 2:4.

N’ihe Banyere Achụmnta Ego

Mgbe e nwere ezigbo nsogbu n’ọgbakọ dị na Kọrịnt banyere ndị e mejọrọ na ndị e rigburu, Pọl dere, sị: “Gịnị mere unu ekweghị ka e mejọọ unu? Gịnị mere unu ekweghị ka e rigbuo unu?” Pọl nyere Ndị Kraịst ndụmọdụ ka ha leghara ihe ụfọdụ anya kama ịkpụpụ nwanna ha n’ụlọikpe. (1 Kọr. 6:1-7) Otu nwanna nwoke bi na United States nabatara ndụmọdụ a. Ya na nwanna ọ na-arụrụ ọrụ sere okwu n’ihi ụgwọ o ji ya. N’ihi ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, ha abụọ nọkọrọ ọtụtụ ugboro, ma ha edozilighị nsogbu ahụ. N’ikpeazụ, ha wegaara “ọgbakọ,” ya bụ, ndị okenye, okwu ahụ.—Mat. 18:15-17.

Ma, ọ dị mwute na okwu ahụ ekweghị ndị okenye ndozi. Mgbe nwanna ahụ e ji ụgwọ kpere ekpere ọtụtụ ugboro, o kpebiri ịhapụ ihe ka ukwuu n’ime ego ọ sị na e ji ya n’ụgwọ. N’ihi gịnị? O mechara kwuo, sị, “Esemokwu a na-eme ka m ghara inwe ọṅụ, na-erikwa oge dị oké mkpa a gaara eji na-arụ ọrụ ọgbakọ.” Mgbe nwanna nwoke ahụ mere ihe ahụ o kpebiri, ọ maliteghachiri inwe ọṅụ, ọ hụkwara na Jehova na-agọzi ozi ya.

N’ihe Ndị Na-abụghị Oké Ihe

Ọ bụrụ na anyị anaghị esi ọnwụ ime ihe ndị masịrị anyị, ọ ga-eme ka anyị nweta ngọzi n’ihe ndị anyị chere na ha abụghị oké ihe. N’ụbọchị mbụ nke otu mgbakọ, otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ bịara n’oge wee chọta oche dị ha mma ha ga-anọ. Mgbe ihe omume malitere, otu di na nwunye na ọtụtụ ụmụ ha gbabatara n’ebe ahụ a nọ na-enwe mgbakọ. Mgbe di na nwunye ahụ bụ́ ndị ọsụ ụzọ hụrụ na ezinụlọ ahụ na-achọ oche ga-aba ha niile, ha biliiri ha n’oche abụọ ha nọ. Nke a mere ka ezinụlọ ahụ niile nọrọ ọdụ n’otu ebe. Mgbe ụbọchị ole na ole gafere ka e mechara mgbakọ ahụ, di na nwunye ahụ bụ́ ndị ọsụ ụzọ nwetara akwụkwọ ozi nke ezinụlọ ahụ ji kelee ha. N’akwụkwọ ozi ahụ, ha kwuru na obi jọrọ ha njọ maka na ha abịaghị n’oge. Ha nweziri obi ụtọ n’ihi ihe ọma ahụ di na nwunye ahụ bụ́ ndị ọsụ ụzọ meere ha.

Mgbe ọ bụla ọ dapụtara, ka anyị hapụ ime ihe masịrị anyị n’ihi ndị ọzọ. Ọ bụrụ na anyị na-egosi ndị ọzọ ịhụnanya nke na-adịghị “achọ ọdịmma nke ya,” ọ ga-eme ka e nwee udo n’ime ọgbakọ, meekwa ka anyị na ndị agbata obi anyị dị n’udo. (1 Kọr. 13:5) Ma, uru a kacha erite na ya bụ na ọ na-eme ka anyị na Jehova nọgide na-adị ná mma.

[Foto dị na peeji nke 20]

Ì nwere ike ịhapụ ime ihe masịrị gị n’ihe banyere ejiji?

[Foto dị na peeji nke 20, 21]

Ì nwere ike ibiliri ụmụnna gị n’oche?