Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Gbara Ndị Ozi Ala Ọzọ Ume Ka Ha Dịrị Ka Jeremaya

A Gbara Ndị Ozi Ala Ọzọ Ume Ka Ha Dịrị Ka Jeremaya

Ememme Ngụsị Akwụkwọ nke Klas nke 125 nke Gilead

A Gbara Ndị Ozi Ala Ọzọ Ume Ka Ha Dịrị Ka Jeremaya

MGBE Geofrey Jackson, onye so n’Òtù Na-achị Isi, na-agwa puku mmadụ isii na otu narị na iri ise na isii bịara ememme ngụcha akwụkwọ nke klas nke otu narị na iri abụọ na ise nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead okwu na September 13, 2008, ọ sịrị: “Klas Gilead nke a pụrụ iche.” A gụnye ụmụ akwụkwọ iri ise na isii ndị gụchara akwụkwọ na klas a, a ga-enwe ihe karịrị puku mmadụ asatọ e si n’ụlọ akwụkwọ Gilead ziga ije ozi ala ọzọ “n’ebe kasị anya n’ụwa”!—Ọrụ 1:8.

Nwanna Jackson, onye bụ́ onyeisi oche nke ememme ahụ, jụrụ sị, “Ị̀ ga-abụ onye e nwere ike ịtụkwasị obi, nke ga-eme ka ị rụpụta ihe n’ozi gị?” O kwuru ihe anọ na-eme ka mmadụ bụrụ onye e nwere ike ịtụkwasị obi: mmadụ iji ozi ya kpọrọ ihe, isetịpụ ezigbo ihe nlereanya, iji Okwu Chineke na-akụzi ihe mgbe niile, na mmadụ ịgbasi mbọ ike ka a mara aha Jehova.

David Schafer, bụ́ onye so Kọmitii Izi Ihe na-arụ ọrụ, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ị̀ Ga-aghọta Ihe Niile?” Ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ na ọ bụrụ na ha anọgide na-achọ Jehova, jirikwa obi umeala na-anabata nduzi nke “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ha “ga-aghọta ihe niile” dị mkpa ka ha wee nwee ike ije ozi ala ọzọ.—Ilu 28:5; Mat. 24:45.

Onye ọzọ kwuru okwu bụ John E. Barr, onye so n’Òtù Na-achị Isi. Isiokwu ya bụ “Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Kewapụ Gị n’Ịhụnanya Chineke.” Nwanna Barr, bụ́ onye kwuru okwu ka nna, gwara ndị ahụ gụchara akwụkwọ na ndị mụrụ ha okwu gbara ha ume. Ihe o kwuru mere ka ụjọ ghara ịtụ ha maka ihe ndị ahụ na-aga ije ozi ala ọzọ nwere ike ịhụ n’ebe ha ga-eje ozi. Ọ sịrị: “Ọ dịghị ebe ọzọ mmadụ ga-anọ ahụ́ eruo ya ala ná ndụ ma ọ́ bụghị n’ịhụnanya Chineke.” Ọ dịghị ihe ọ bụla nwere ike ikewapụ ndị ozi ala ọzọ n’ịhụnanya Chineke ọ gwụla ma ha ji aka ha kewapụ onwe ha n’ebe Chineke nọ.

Sam Roberson, onye na-eje ozi ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova, gbara ndị bịara ememme ahụ ume ka ha yiri “uwe ahụ kacha mma.” Ọ bụrụ na ndị ahụ gụchara akwụkwọ ana-amụ banyere ihe ndị Jizọs mere, na-emekwa ihe ndị ha na-amụta, ha ‘ga-eyiri Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dị ka uwe.’ (Rom 13:14) William Samuelson, bụ́ onye na-elekọta Ngalaba Na-ahụ Maka Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova, kwukwara ihe ndị na-eme ka mmadụ bụrụ onye a na-akwanyere ùgwù. Ọ bụghị mmadụ na-ekwu onye e kwesịrị ịkwanyere ùgwù, kama ọ bụ Chineke.

Michael Burnett, bụ́ otu n’ime ndị na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ Gilead, gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ajụjụ ọnụ banyere ahụmahụ ndị ha nwere n’ozi ọma. N’agbanyeghị na mgbe ụmụ akwụkwọ ahụ nọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead dị na Patterson, New York, e kenyere ha izi ozi ọma n’ókèala ebe a na-ezikarị ozi ọma, ha nwetara ndị nwere mmasị. Gerald Grizzle, bụ́ onye na-eje ozi ná Ngalaba Na-ahụ Maka Mgbakọ, gbara ụmụnna atọ bịara Ụlọ Akwụkwọ Ndị Kọmitii Alaka ajụjụ ọnụ. Ihe ha kwuru nyeere ndị ahụ gụchara akwụkwọ na Gilead aka ịkwadebe maka ihe ndị ha ga-ahụ n’ebe ha ga-eje ozi ala ọzọ.

Ọ bụ David Splane, onye so n’Òtù Na-achị Isi, onye gụkwara akwụkwọ na klas nke iri anọ na abụọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Dịrị Ka Jeremaya.” Ọ bụ ezie na ụjọ tụrụ Jeremaya mgbe Jehova ziri ya ozi, Jehova mesiri ya obi ike. (Jere. 1:7, 8) Chineke ga-emekwara ndị a na-aga ịmalite ije ozi n’ala ọzọ otú ahụ. Nwanna Splane kwuru, sị: “Ọ bụrụ na gị na mmadụ enwee nghọtahie, nọdụ ala dee ihe iri onye ahụ na-eme na-amasị gị. Ọ bụrụ na i derughị iri, mara na ị maghị onye ahụ nke ọma.”

Jeremaya hapụrụ ime ọtụtụ ihe na-amasị ya. Mgbe ọ chọrọ ịkwụsị ọrụ e nyere ya, o kpere ekpere, Jehova wee nọnyere ya. (Jere. 20:11) Nwanna Splane kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla unu nwere nkụda mmụọ, gwanụ Jehova ihe na-enye unu nsogbu n’obi. Unu ga-ahụ otú Jehova ga-esi nyere unu aka.”

Ná mmechi, onyeisi oche nke ememme ahụ chetaara ndị niile bịaranụ na ụmụ akwụkwọ ahụ amụtala ọtụtụ ụzọ ha ga-esi bụrụ ndị e nwere ike ịtụkwasị obi. Ka ha na-agba àmà n’ebe e zigara ha, ozi ọma ha ga-arụpụta ihe ka mma ma ọ bụrụ na ndị mmadụ achọpụta na ha bụ ndị e nwere ike ịtụkwasị obi.—Aịza. 43:8-12.

[Igbe dị na peeji nke 22]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 6

Ọnụ ọgụgụ mba e zigara ha: 21

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 56

Nkezi afọ ndụ ha: 32.9

Nkezi afọ ha nọrọla n’eziokwu: 17.4

Nkezi afọ ha nọrọla n’ozi oge niile: 13

[Foto dị na peeji nke 23]

Klas nke Otu Narị na Iri Abụọ na Ise nke Gụchara Akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead

E nyere aha ndị e dere n’okpuru ebe a nọmba n’ahịrị n’ahịrị, site n’ihu gaa n’azụ. N’ahịrị nke ọ bụla, aha ha dịkwa n’usoro site n’aka ekpe gaa n’aka nri.

(1) Hodgson, A.; Wall, A.; Beerens, K.; Hortelano, M.; Newman, L.; De Caso, A. (2) Jenkins, J.; Jarzemski, T.; Méndez, N.; Corona, V.; Canalita, L. (3) Fryer, H.; Savage, M.; Tidwell, K.; Erickson, N.; Dyck, E.; McBeath, R. (4) Perez, L.; Puse, L.; Skidmore, A.; Young, B.; McBride, N.; Rondón, P.; Goodman, E. (5) Beerens, M.; Ferguson, J.; Pearson, N.; Chapman, L.; Wardle, J.; Canalita, M. (6) Perez, P.; De Caso, D.; Young, T.; Rondón, D.; Goodman, G.; Jenkins, M.; Dyck, G. (7) Corona, M.; Wall, R.; Puse, S.; Méndez, F.; Jarzemski, S.; Savage, T. (8) Newman, C.; Ferguson, D.; Skidmore, D.; Erickson, T.; McBride, J.; Pearson, M.; Chapman, M. (9) Hodgson, K.; Wardle, A.; McBeath, A.; Tidwell, T.; Fryer, J.; Hortelano, J.