Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha “Na-eso Nwa Atụrụ Ahụ”

Ha “Na-eso Nwa Atụrụ Ahụ”

Ha “Na-eso Nwa Atụrụ Ahụ”

“Ndị a bụ ndị na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’agbanyeghị ebe ọ na-eje.”—MKPU. 14:4.

1. Olee ihe bụ́ uche ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs banyere iso ya?

JIZỌS nọ “na-ezi ihe ná nzukọ ọha mmadụ na Kapaniọm” mgbe o jerela ozi ihe dị ka afọ abụọ na ọkara. “Ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya laghachiri n’ihe ha hapụrụ ahapụ, kwụsịkwa iso ya na-ejegharị” n’ihi ihe o kwuru bụ́ nke wụrụ ha akpata oyi. Mgbe Jizọs jụrụ ndịozi ya iri na abụọ ma hà chọkwuru ịla, Saịmọn Pita zara ya, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi. Anyị ekwerewokwa ma mara na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.” (Jọn 6:48, 59, 60, 66-69) Ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs akwụsịghị iso ya. Mgbe e ji mmụọ nsọ tee ha mmanụ, ha nọgidere na-eme ihe Jizọs gwara ha ka ha na-eme.—Ọrụ 16:7-10.

2. (a) Ònye bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ma ọ bụ “onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi”? (b) Olee otú ohu ahụ sirila nọgide nnọọ “na-eso Nwa Atụrụ ahụ”?

2 Oleekwanụ banyere Ndị Kraịst nke oge a e tere mmadụ? N’amụma Jizọs buru banyere “ihe ịrịba ama nke ọnụnọ [ya] na nke ọgwụgwụ usoro ihe a,” ọ kpọrọ ụmụazụ ya nọ n’ụwa e ji mmụọ nsọ tee mmanụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ma ọ bụ “onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi.” (Mat. 24:3, 45; Luk 12:42) Òtù ohu ahụ anọgidela nnọọ “na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’agbanyeghị ebe ọ na-eje.” (Gụọ Mkpughe 14:4, 5.) N’ụzọ ime mmụọ, onye ọ bụla n’ime ha bụ onye na-amaghị nwaanyị. Nke a pụtara na ha anaghị eji nkwenkwe na omenala dị iche iche nke “Babịlọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, emerụ onwe ha. (Mkpu. 17:5) A hụghị ozizi ụgha ọ bụla “n’ọnụ ha,” ụwa Setan ‘emerụghịkwa’ ha. (Jọn 15:19) N’ọdịnihu, ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa “ga-eso” Nwa Atụrụ ahụ gaa eluigwe.—Jọn 13:36.

3. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị tụkwasị òtù ohu ahụ obi?

3 Jizọs emeela ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche “onye na-elekọta ezinụlọ ya,” ka ọ “na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị.” Ndị ezinụlọ a a ga-enye nri bụ ndị niile so n’òtù ohu ahụ. O mekwara ohu ahụ “onye na-elekọta ihe niile o nwere.” (Mat. 24:45-47) Ihe ndị a “o nwere” gụnyere “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ. (Mkpu. 7:9; Jọn 10:16) Ọ̀ bụ na onye ọ bụla so ná ndị ahụ e tere mmanụ na onye ọ bụla so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ ekwesịghị ịtụkwasị ohu a a họpụtara ka ọ na-elekọta ha obi? E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji tụkwasị òtù ohu ahụ obi. Ihe abụọ gbara ọkpụrụkpụ mere anyị ga-eji mee otú ahụ bụ: (1) Jehova tụkwasịrị òtù ohu ahụ obi. (2) Jizọs tụkwasịkwara òtù ohu ahụ obi. Ka anyị tụlee ihe na-egosi na Jehova Chineke na Jizọs Kraịst tụkwasịrị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, obi kpamkpam.

Jehova Tụkwasịrị Ohu ahụ Obi

4. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na nri ime mmụọ nke ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-enye anyị ga-abara anyị uru?

4 Ka anyị tụlee ihe mere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, ji enwe ike enye anyị nri ime mmụọ dị anyị mkpa n’oge kwesịrị ekwesị. Jehova sịrị: “M ga-eme ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ ị ga-eso.” Ọ sịkwara: “M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.” (Ọma 32:8) N’eziokwu, ọ bụ Jehova na-agwa ohu ahụ ihe ọ na-eme. N’ihi ya, ka obi sie anyị ike na ihe ohu ahụ ji Akwụkwọ Nsọ na-akụziri anyị na ihe ndị ha na-agwa anyị mee ga-abara anyị uru.

5. Olee ihe gosiri na mmụọ Chineke na-enye òtù ohu ahụ ike?

5 Jehova na-enyekwa òtù ohu ahụ mmụọ nsọ ya. Ọ bụ ezie na a naghị ahụ mmụọ Jehova anya, ma a na-ahụ ihe ọ na-arụpụta n’ahụ́ ndị nwere ya. Chetụkwala ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, merela iji hụ na a gbara àmà banyere Jehova bụ́ Chineke, Ọkpara ya, na Alaeze ya n’ụwa niile. Ndị ohu Jehova ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa banyere Alaeze ahụ n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ, nakwa n’agwaetiti dị iche iche. Nke a ọ́ bụghị ihe doro anya na-egosi na mmụọ Chineke na-enye ohu ahụ ike? (Gụọ Ọrụ 1:8.) Òtù ohu ahụ na-eme ọtụtụ mkpebi ndị dị ezigbo mkpa iji hụ na ha na-enye ndị Jehova nọ n’ụwa niile nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị. Ohu ahụ na-egosi na ya nwere ịhụnanya, dịrị nwayọọ, na-akpakwa àgwà ndị ọzọ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ mgbe ọ na-eme mkpebi ndị a ma na-eme ihe o kpebiri.—Gal. 5:22, 23.

6, 7. Olee ókè Jehova tụkwasịruru ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi obi?

6 Iji ghọta ókè Jehova tụkwasịruru ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi obi, ka anyị tụlee nkwa o kwere ndị niile so n’ohu ahụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Opi ahụ ga-ada, a ga-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ n’ọnọdụ nke apụghị ire ure, a ga-agbanwekwa anyị. N’ihi na ahụ́ a nke pụrụ ire ure aghaghị iyikwasị ereghị ure, ahụ́ a nke pụkwara ịnwụ anwụ aghaghị iyikwasị anwụghị anwụ.” (1 Kọr. 15:52, 53) Ndị na-eso ụzọ Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi, ga-anwụ otú anụ ahụ́ na-ere ure si anwụ. A ga-akpọlitekwa ha n’ọnwụ ha aghọọ mmụọ, ma kara ndị mmụọ ozi, ha ga-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi. A ga-eyikwasị ha anwụghị anwụ, ya bụ, ha ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, a gaghị ebibi ha ebibi. A ga-eyikwasịkwa ha ereghị ure, ya bụ, a ga-enye ha ahụ́ na-agaghị ere ure. Mkpughe 4:4 kọwara na ndị a e si n’ọnwụ kpọlite nọ ọdụ n’ocheeze nakwa na ha kpu okpueze ọlaedo. Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-abụ ndị eze. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ na-egosi na Chineke tụkwasịrị ndị e tere mmanụ obi.

7 Mkpughe 19:7, 8, sịrị: “Ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruwo, nwunye ya ejikerewokwa. Ee, e nyewo ya ikike iyiri ákwà linin ọma nke na-enwu gbaa, nke dịkwa ọcha, n’ihi na ákwà linin ọma ahụ nọchiri anya ezi omume nke ndị nsọ na-eme.” Jehova ahọrọwo Ndị Kraịst e tere mmanụ ka ha bụrụ nwaanyị Ọkpara ya ga-alụ n’ọdịnihu. Leenụ onyinye na-enweghị atụ a ga-enye ha! Ha agaghị ere ure, ha agaghị anwụ anwụ, ha ga-abụ ndị eze, ha ga-abụ “nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ.” Ihe ndị a bụ ezigbo ihe àmà ndị na-egosi na Chineke tụkwasịrị ndị e tere mmanụ obi, bụ́ ndị “na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’agbanyeghị ebe ọ na-eje.”

Jizọs Tụkwasịrị Ohu ahụ Obi

8. Olee otú Jizọs si gosi na ya tụkwasịrị ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ obi?

8 Olee ihe na-egosi na Jizọs tụkwasịrị nnọọ ndị na-eso ụzọ ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ obi? N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, o kwere ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi nkwa, sị: “Ọ bụ unu rapaara m n’ahụ́ n’ọnwụnwa m dị iche iche; mụ na unu na-agbakwa ndụ maka alaeze, dị nnọọ ka mụ na Nna m gbara ndụ, ka unu wee rie ma ṅụọ na tebụl m n’alaeze m, nọdụkwa ala n’ocheeze ikpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.” (Luk 22:28-30) Ọgbụgba ndụ ahụ Jizọs na mmadụ iri na otu ahụ gbara gbasara Ndị Kraịst niile e tere mmanụ, ndị dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. (Luk 12:32; Mkpu. 5:9, 10; 14:1) A sị na Jizọs atụkwasịghị ha obi, ha na ya ọ̀ gaara agba ndụ na ha ga-eso ya chịa ọchịchị n’Alaeze ya?

9. Olee ihe ndị so ‘n’ihe niile Kraịst nwere’?

9 Jizọs Kraịst emewokwa ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, “onye na-elekọta ihe niile o nwere,” ya bụ, ihe niile banyere Alaeze ahụ n’ụwa. (Mat. 24:47) Ụfọdụ n’ime ihe ndị a o nwere bụ isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, alaka ụlọ ọrụ e nwere na mba dị iche iche, Ụlọ Mgbakọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị e nwere n’ụwa dum. Ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ sokwa ha. Ọ̀ dị onye ga-enye onye ọ na-atụkwasịghị obi ihe dị ya mkpa ka o lekọtawa, ka o jirikwa ya na-arụ ọrụ?

10. Olee ihe gosiri na Jizọs Kraịst na-anọnyere ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ?

10 Obere oge tupu Jizọs arịgoo n’eluigwe mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi, wee kwe ha nkwa, sị: “Lee! m nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:20) Jizọs ọ̀ na-eme ihe a o kwere ná nkwa? N’afọ iri na ise gara aga, ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị ihe dị ka puku iri asaa n’ụwa dum. Ma, ugbu a, e nwere ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ n’ụwa dum, nke bụ́ na ọnụ ọgụgụ ọgbakọ e nwere ugbu a ji ihe karịrị puku iri atọ kara nke e nwere n’oge ahụ. Mmadụ olekwanụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs? N’afọ iri na ise gara aga, e mere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ anọ na ọkara baptizim, nke pụtara na e mere ihe karịrị narị mmadụ asatọ baptizim n’ụbọchị ọ bụla. Mmụba a dị ukwuu gosiri n’ụzọ doro anya na Kraịst na-eduzi ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ n’ọmụmụ ihe ha na-enwe n’ọgbakọ ha, na-akwadokwa ha n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ha na-arụ.

Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Nweekwa Uche

11, 12. Olee otú ohu ahụ sirila gosi na ya kwesịrị ntụkwasị obi, nweekwa uche?

11 Ebe ọ bụ na Jehova Chineke na Jizọs Kraịst tụkwasịrị nnọọ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, obi, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụkwasị ya obi? A sị ka e kwuwe, ohu ahụ egosila na ya kwesịrị ntụkwasị obi site n’ịrụ ọrụ e nyere ya. Dị ka ihe atụ, a nọwo na-ebipụta Ụlọ Nche kemgbe otu narị afọ na iri atọ. Ọmụmụ ihe na mgbakọ dị iche iche anọwo na-eme ka okwukwe anyị sie ike.

12 Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nwekwara uche, n’ihi na ọ dịghị mpako, ọ naghị eme ihe ọ bụla n’anataghị ntụziaka n’aka Jehova, ọ na-emekwa ihe ọ bụla Chineke gwara ya n’egbughị oge. Dị ka ihe atụ, ndị ndú okpukpe ụgha na-eji omume ha na okwu ọnụ ha akwado mmadụ ịchọ ọdịmma onwe ya naanị, ha na-akwadokwa omume rụrụ arụ ndị ụwa na-eme. Ma, ohu ahụ na-adọ Ndị Kraịst aka ná ntị banyere ihe ọjọọ ndị dị n’ụwa ọjọọ Setan. Ihe mere ohu ahụ ji enwe ike enye ndụmọdụ ndị amamihe dị na ha n’oge kwesịrị ekwesị bụ na Jehova Chineke na Jizọs Kraịst na-agọzi ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụkwasị ohu a obi kpamkpam. Ma, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị tụkwasịrị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, obi?

‘Soro’ Ndị E Tere Mmanụ Ka Ha Na-eso Nwa Atụrụ Ahụ

13. Dị ka Zekaraya buru n’amụma, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị tụkwasịrị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi obi?

13 Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Zekaraya kwuru banyere “ndị ikom iri,” bụ́ ndị gakwuuru “nwoke bụ́ onye Juu,” wee sị: “Anyị ga-eso unu.” (Gụọ Zekaraya 8:23.) Ebe ọ bụ na a kpọrọ “nwoke bụ́ onye Juu” “unu,” ọ pụtara na o nwere ndị ọ na-anọchi anya ha. N’oge anyị a, ọ na-anọchi anya Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ bụ́ ndị ka fọdụrụ n’ụwa, ya bụ, ndị so ‘n’Izrel nke Chineke.’ (Gal. 6:16) “Ndị ikom iri ndị si n’asụsụ niile nke mba dị iche iche” na-anọchi anya oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ. Oké ìgwè mmadụ ahụ ‘na-eso’ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, otú ahụ Ndị Kraịst e tere mmanụ si eso Jizọs n’agbanyeghị ebe ọ na-eje. Ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ ekwesịtụghị ime ihere ikwu na ha na “ndị a kpọrọ òkù ịga eluigwe” bụ enyi. (Hib. 3:1) Ihere anaghị eme Jizọs ịkpọ ndị e tere mmanụ “ụmụnna.”—Hib. 2:11.

14. Olee otú anyị nwere ike isi jiri obi anyị niile na-akwado ụmụnna Kraịst?

14 Jizọs Kraịst kwuru na ọ bụ ya ka ndị na-akwado ụmụnna ya na-akwado. (Gụọ Matiu 25:40.) Oleezi otú ndị nwere olileanya ibi n’ụwa nwere ike isi na-akwado ụmụnna Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ? Ụzọ kachanụ ha si akwado ha bụ site n’inyere ha aka ịrụ ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Mat. 24:14; Jọn 14:12) Ọnụ ọgụgụ nke ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa na-ebelata ka afọ na-aga, ma, ọnụ ọgụgụ nke atụrụ ọzọ ahụ na-arị elu. Mgbe ndị ahụ nwere olileanya ibi n’ụwa na-ekwusa ozi ọma, ụfọdụ n’ime ha ana-ejekwa ozi oge niile, ha na-enyere ndị ahụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ aka na-arụ ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20) Ha na-enyekwa ụdị onyinye afọ ofufo dị iche iche iji kwado ọrụ a.

15. Olee otú Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị isi na-ele nri ime mmụọ ohu ahụ na-enye anyị n’oge kwesịrị ekwesị nakwa mkpebi dị iche iche ohu ahụ na-eme anya?

15 Olee otú Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị isi na-ele nri ime mmụọ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-enye anyị n’oge kwesịrị ekwesị anya, bụ́ nke anyị na-enweta n’akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, n’ọmụmụ ihe, nakwa ná mgbakọ dị iche iche? Ànyị na-eri nri ndị ahụ nke ọma ma na-eme ihe anyị na-amụta? Olee ihe anyị na-eme ma ọ bụrụ na e nwee ihe ohu ahụ kpebiri ka e mee n’ọgbakọ? Ọ bụrụ na anyị ejiri obi dum na-eme ihe o kwuru, anyị na-egosi na obi siri anyị ike na otú Jehova si eduzi anyị ga-abara anyị uru.—Jems 3:17.

16. Gịnị mere Ndị Kraịst niile ji kwesị ige ụmụnna Kraịst ntị?

16 Jizọs kwuru, sị: “Atụrụ m na-ege ntị n’olu m, amakwaara m ha, ha na-esokwa m.” (Jọn 10:27) Nke a bụ ihe Ndị Kraịst e tere mmanụ na-eme. Oleekwanụ maka ndị ‘na-eso’ ha? Ndị dị otú ahụ aghaghị ige Jizọs ntị. Ha aghaghịkwa ige ụmụnna ya ntị. A sị ka e kwuwe, ọ bụ ụmụnna Kraịst ka e nyere ọrụ iduzi ndị Chineke na ilekọta ha. Olee ihe ige ntị n’olu ụmụnna Kraịst pụtara?

17. Olee otú anyị si egosi na anyị na-ege òtù ohu ahụ ntị?

17 Taa, ndị na-anọchi anya ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, bụ Òtù Na-achị Isi, bụ́ ndị na-edu ndú ma na-ahazi ọrụ ikwusa ozi ọma n’ụwa dum. Ndị so n’Òtù Na-achị Isi bụ ndị okenye e tere mmanụ ferela Jehova ọtụtụ afọ. E nwere ike ịkpọ ha “ndị na-edu ndú” n’etiti anyị. (Hib. 13:7) Ndị nlekọta a e tere mmanụ “nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ . . . n’ọrụ Onyenwe anyị,” n’ihi na ha na-elekọta ndị nkwusa Alaeze karịrị nde asaa n’ụwa dum, bụ́ ndị nọ n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ. (1 Kọr. 15:58) Anyị na-egosi na anyị na-ege òtù ohu ahụ ntị site n’ịkwado Òtù Na-achị Isi ya n’ụzọ niile.

A Na-agọzi Ndị Na-ege Ohu ahụ Ntị

18, 19. (a) Olee otú a ga-esi gọzie ndị gere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, ntị? (b) Olee ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

18 Kemgbe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, malitere ọrụ ya, ọ nọwo “na-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ bụrụ ndị ezi omume.” (Dan. 12:3) Ụfọdụ n’ime ndị a nwere olileanya na a ga-azọpụta ha mgbe a ga-ebibi ụwa ọjọọ a. O nweghị ihe a ga-eji tụnyere mmadụ ịbụ onye ezi omume n’anya Chineke!

19 N’ọdịnihu, mgbe ‘obodo nsọ ahụ, bụ́ Jeruselem Ọhụrụ, ga-esi n’eluigwe, n’ebe Chineke nọ, gbadata dị ka nwaanyị a na-alụ ọhụrụ a kwadebeere di ya, olee ihe Chineke ga-emere ndị gere ohu ahụ ntị? Baịbụl sịrị: “Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.” (Mkpu. 21:2-4) N’ihi ya, ka anyị jisie ike na-ege Kraịst na ụmụnna ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ndị kwesịkwara ntụkwasị obi, ntị.

Olee Ihe Ị Mụtara?

• Olee ihe gosiri na Jehova tụkwasịrị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, obi?

• Olee ihe na-egosi na Jizọs tụkwasịrị nnọọ òtù ohu ahụ obi?

• Olee ihe mere anyị ji kwesị ịtụkwasị onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi, obi?

• Olee otú anyị si egosi na anyị tụkwasịrị ohu ahụ obi?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 25]

Ị̀ ma onye Jehova họọrọ ka ọ bụrụ nwaanyị Ọkpara ya ga-alụ n’ọdịnihu?

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Jizọs Kraịst enyefeela ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, ihe “o nwere”

[Foto dị na peeji nke 27]

Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị na-akwado ndị ahụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ