Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Jizọs Kwuru Ọ̀ Na-enyere Gị Aka Ịma Otú Ị Ga-esi Na-ekpe Ekpere?

Ihe Jizọs Kwuru Ọ̀ Na-enyere Gị Aka Ịma Otú Ị Ga-esi Na-ekpe Ekpere?

Ihe Jizọs Kwuru Ọ̀ Na-enyere Gị Aka Ịma Otú Ị Ga-esi Na-ekpe Ekpere?

“Mgbe Jizọs kwusịrị okwu ndị a, otú o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya.”—MAT. 7:28.

1, 2. Gịnị mere otú Jizọs si zie ihe ji ju ìgwè mmadụ anya?

ANYỊ kwesịrị ịnabata ihe Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya, bụ́ Jizọs Kraịst, kwuru, kwesịkwa ime ha. N’ezie, ọ dịghị onye ozizi ọ bụla a ga-eji tụnyere ya. Ọ bụ ya mere otú o si zie ihe mgbe ọ na-ezi Ozizi Elu Ugwu ji ju ndị mmadụ anya!—Gụọ Matiu 7:28, 29.

2 Ọkpara Jehova ezighị ihe ka ndị odeakwụkwọ, bụ́ ndị na-ekwu ogologo okwu mgbe ha na-ezi ozizi ha, bụ́ ozizi ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Kraịst ziri ihe “dị ka onye nwere ikike” n’ihi na ihe o kwuru bụ ihe Chineke gwara ya. (Jọn 12:50) Ya mere, ka anyị hụ otú ihe ndị ọzọ Jizọs kwuru mgbe ọ na-ezi Ozizi Elu Ugwu nwere ike isi nyere anyị aka ịma otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere.

Ekpela Ekpere Ka Ndị Ihu Abụọ

3. Kọwaa ná nkenke ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:5.

3 Ekpere bụ otu n’ime ụzọ dị mkpa anyị si efe Chineke, anyị kwesịkwara ịna-ekpeku Jehova ekpere mgbe niile. Ma, ihe Jizọs kwuru mgbe ọ na-ezi Ozizi Elu Ugwu kwesịrị inyere anyị aka ịma otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere. Ọ sịrị: “Mgbe unu na-ekpekwa ekpere, unu adịla ka ndị ihu abụọ; n’ihi na ọ na-atọ ha ụtọ iguzo n’ụlọ nzukọ, na ebe ụzọ nwere ngalaba na-ekpe ekpere ka ndị mmadụ wee na-ahụ ha. N’ezie, ana m asị unu, Ha enwetazuwo ụgwọ ọrụ ha.”Mat. 6:5.

4-6. (a) Olee ihe mere o ji atọ ndị Farisii ụtọ “iguzo n’ụlọ nzukọ, na ebe ụzọ nwere ngalaba” na-ekpe ekpere? (b) Olee otú ndị ihu abụọ ndị a si ‘nwetazuo ụgwọ ọrụ ha’?

4 Ndị na-eso ụzọ Jizọs ekwesịghị ikpe ekpere ka “ndị ihu abụọ,” bụ́ ndị Farisii na-eme nsọ nsọ. Ha na-emegharị ndị mmadụ anya site n’ime ka ha chee na ha dị nsọ. (Mat. 23:13-32) Ọ na-atọ ndị ihu abụọ ndị a ụtọ “iguzo n’ụlọ nzukọ, na ebe ụzọ nwere ngalaba” na-ekpe ekpere. N’ihi gịnị? Ọ bụ “ka ndị mmadụ wee na-ahụ ha.” Ndị Juu nke narị afọ mbụ na-ekpekarị ekpere ma ha zukọọ n’oge e ji achụ àjà nsure ọkụ n’ụlọ nsọ (ya bụ, n’ihe dị ka n’elekere itoolu nke ụtụtụ nakwa n’elekere atọ nke ehihie). Ọtụtụ ndị bi na Jeruselem na-eso ìgwè ndị na-efe Chineke nọ n’ogige ụlọ nsọ ahụ ekpe ekpere. N’ebe ndị na-abụghị Jeruselem, ndị Juu ndị ji okpukpe ha kpọrọ ihe ‘na-eguzo n’ụlọ nzukọ’ na-ekpe ekpere ugboro abụọ n’ụbọchị.—Tụlee Luk 18:11, 13.

5 Ebe ọ bụ na ọtụtụ mmadụ anaghị anọ ụlọ nsọ ma ọ bụ ụlọ nzukọ nso n’oge ndị ahụ e ji ekpe ekpere, ha nwere ike ịnọ ebe ọ bụla ha nọ n’oge ndị ahụ kpee ekpere. Ụfọdụ ndị na-agba mbọ hụ na ha nọ ‘n’ebe ụzọ nwere ngalaba’ n’oge ndị ahụ e ji ekpe ekpere. Ha na-achọ ka ndị na-agafe n’ebe ndị ahụ “na-ahụ ha.” Ndị ihu abụọ ndị ahụ, bụ́ ndị na-eme nsọ nsọ, “na-ekpekwa ogologo ekpere iji megharịa ndị mmadụ anya,” ka ndị na-ahụ ha wee na-eto ha. (Luk 20:47) Anyị ekwesịghị ime ka ha.

6 Jizọs kwuru na ndị ihu abụọ ndị a “enwetazuwo ụgwọ ọrụ ha.” Ihe dị ha oké mkpa bụ ka ndị mmadụ ibe ha na-akwanyere ha ùgwù ma na-eto ha. Ọ bụ naanị nke a ka ha nwetara. Nke ahụ bụ ụgwọ ọrụ ha, n’ihi na Jehova anaghị aza ekpere ha maka na ha bụ ndị ihu abụọ. Ma, Chineke ga-anụ ekpere nke ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst, dị ka ihe ọzọ Jizọs kwuru banyere ekpere na-egosi.

7. Gịnị ka ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere ka mmadụ nọrọ “n’ọnụ ụlọ” ya na-ekpe ekpere pụtara?

7 “Ma, gị onwe gị, mgbe ị na-ekpe ekpere, banye n’ọnụ ụlọ gị, mgbe i mechisịrị ọnụ ụzọ gị, kpekuo Nna gị nke nọ na nzuzo ekpere; Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụ gị ụgwọ.” (Mat. 6:6) Ndụmọdụ Jizọs nyere ka mmadụ nọrọ n’ọnụ ụlọ ya kpee ekpere mgbe o mechiri ọnụ ụzọ ya apụtaghị na mmadụ ekwesịghị ịnọchite anya ọgbakọ n’ekpere. Jizọs nyere ndụmọdụ a iji katọọ ekpere ndị mmadụ na-ekpe n’ihu ọha ka ndị ọzọ wee hụ ha ma towe ha. Anyị kwesịrị icheta nke a ma ọ bụrụ na anyị enwee ihe ùgwù nke ịnọchite anya ndị Chineke n’ekpere. Ka anyị rubekwa isi na ndụmọdụ ọzọ Jizọs nyere banyere ikpe ekpere.

8. Dị ka Matiu 6:7 kwuru, olee otú na-adịghị mma ndị mmadụ si ekpe ekpere, bụ́ otú anyị na-ekwesịghị isi na-ekpe ekpere?

8 “Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro, dị ka ndị mba ọzọ na-eme, n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu.” (Mat. 6:7) Jizọs kwuru otú ọzọ na-adịghị mma ndị mmadụ si ekpe ekpere. Ha na-ekwughachi otu ihe ugboro ugboro. Ọ naghị ekwu na anyị ekwesịghị ịrịọ Chineke ugboro ugboro n’ekpere ka o meere anyị otu ihe dị anyị mkpa ma ọ bụ kelee ya ugboro ugboro n’ihi ihe o meere anyị. Jizọs kwughachiri “otu okwu” ugboro ugboro n’ekpere ọ nọ n’ogige Getsemeni kpee n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ.—Mak 14:32-39.

9, 10. Gịnị ka ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere anyị ka anyị ghara ikwu otu ihe ugboro ugboro n’ekpere pụtara?

9 Anyị ekwesịghị ikpe ekpere ka “ndị mba ọzọ,” bụ́ ndị na-ekwughachi otu ihe ugboro ugboro n’ekpere. Ha na-ekwughachi ihe ha bu n’isi “ugboro ugboro,” nke ọtụtụ n’ime ha bụ ihe na-adịghị mkpa. Ndị na-efe Bel enwetaghị enyemaka ọ bụla mgbe ha kpọkuru aha chi ụgha ahụ bụ́ Bel “malite n’ụtụtụ ruo n’ehihie, sị: ‘Bel, za anyị!’” (1 Eze 18:26) Taa, ọtụtụ nde mmadụ na-ekwu ogologo okwu mgbe ha na-ekpe ekpere, na-ekwughachikwa otu ihe ugboro ugboro, wee na-eche “na a ga-anụ olu ha.” Ma, Jizọs mere ka anyị mara na ikwu “ọtụtụ okwu” mgbe a na-ekpe ogologo ekpere na ikwughachi otu ihe ugboro ugboro anaghị amasị Jehova. Jizọs sịkwara:

10 “Ya mere, unu emela ka ha, n’ihi na Chineke bụ́ Nna unu maara ihe ndị na-akpa unu tupu unu arịọ ya.” (Mat. 6:8) Ọtụtụ ndị ndú okpukpe ndị Juu kpara àgwà ka ndị Jentaịl site n’ikpe ekpere dị oké ogologo. Ekpere si n’ala ala obi, nke gụnyere inye otuto, inye ekele, na ịrịọ arịrịọ, bụ otu n’ime ụzọ dị mkpa anyị si efe Chineke. (Fil. 4:6) Ma, ọ dịghị mma ikwughachi otu ihe ugboro ugboro, wee na-eche na anyị kwesịrị ime nke a ka Chineke wee nụ ihe na-akpa anyị. Mgbe anyị na-ekpe ekpere, anyị kwesịrị icheta na Onye anyị na-agwa okwu bụ onye ‘ma ihe ndị na-akpa anyị tupu anyị arịọ ya.’

11. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma anyị na-anọchite anya ndị ọzọ n’ekpere?

11 Ihe Jizọs kwuru banyere ụdị ekpere Chineke na-anaghị anụ kwesịrị ichetara anyị na mmadụ ikwu ogologo okwu n’ekpere ma na-egosi na ya ma ihe anaghị amasị Chineke. Anyị kwesịkwara icheta na oge anyị nọchitere anya ndị ọzọ n’ekpere ekwesịghị ịbụ oge anyị ga-eji eme ka ndị na-ege ntị jawa anyị mma. Anyị ekwesịghịkwa ikpe ogologo ekpere nke na ndị na-ege ntị ga na-eche mgbe ha ga-asị “Amen.” Iji ekpere ama ọkwa ma ọ bụ iji ya enye ndị na-ege ntị ndụmọdụ ekwekọghị n’ihe Jizọs ziri n’Ozizi Elu Ugwu ahụ.

Jizọs Akụziere Anyị Otú Anyị Ga-esi Na-ekpe Ekpere

12. Olee otú ị ga-esi kọwaa ihe arịrịọ ahụ bụ́ “ka e doo aha gị nsọ” pụtara?

12 Ọ bụ ezie na Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ka ha ghara imebi ihe ùgwù a pụrụ iche ha nwere ikpe ekpere, ma, ọ kụziiri ha otú ha ga-esi na-ekpe ekpere. (Gụọ Matiu 6:9-13.) Anyị ekwesịghị iburu ekpere ahụ Jizọs kụziiri anyị n’isi ka anyị wee na-ekpeghachi ya ugboro ugboro. Kama nke ahụ, ekpere ahụ na-akụziri anyị otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere. Dị ka ihe atụ, Jizọs butere Chineke ụzọ n’okwu ndị mbụ dị n’ekpere ahụ. Ọ sịrị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Mat. 6:9) Ịkpọ Jehova “Nna anyị” kwesịrị ekwesị n’ihi na ọ bụ Onye kere anyị nke “bi n’eluigwe,” bụ́ ebe dị anya n’ụwa. (Diut. 32:6; 2 Ihe 6:21; Ọrụ 17:24, 28) Okwu bụ́ “anyị” kwesịrị ichetara anyị na ụmụnna anyị na Chineke dịkwa ná mma. “Ka e doo aha gị nsọ” bụ arịrịọ anyị na-arịọ Jehova ka o mee ihe iji doo aha ya nsọ site n’iwepụ ụta niile a na-ata ya kemgbe e nupụụrụ ya isi n’Iden. Jehova ga-aza ekpere ahụ site n’iwepụ ajọ omume n’ụwa, wee si otú a doo aha ya nsọ.—Ezik. 36:23.

13. (a) Olee otú Chineke ga-esi aza ekpere anyị na-ekpe, sị, “ka alaeze gị bịa”? (b) Gịnị ka uche Chineke ime n’ụwa gụnyere?

13 “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Mat. 6:10) Anyị kwesịrị icheta na “alaeze” ahụ nke dị n’ekpere ahụ Jizọs kụziiri anyị bụ ọchịchị Mesaya nke dị n’eluigwe, bụ́ nke Kraịst na “ndị nsọ” e si n’ọnwụ kpọlite na-achị. (Dan. 7:13, 14, 18; Aịza. 9:6, 7) Mgbe anyị na-ekpe ekpere ka ọ “bịa,” anyị na-arịọ ka Alaeze Chineke bịa bibie ndị niile nọ n’ụwa bụ́ ndị na-emegide ọchịchị Chineke. Nke ahụ ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ya gachaa, ụwa dum ga-aghọ paradaịs, ebe ezi omume, udo, na ọganihu ga-adị. (Ọma 72:1-15; Dan. 2:44; 2 Pita 3:13) Uche Jehova na-eme n’eluigwe. Mgbe anyị na-ekpe ekpere ka o meekwa n’ụwa, anyị na-arịọ ka Chineke mee ihe bụ́ nzube ya banyere ụwa, nke gụnyere ibibi ndị bụ́ ndị iro ya n’oge a, dị ka o bibiri ndị iro ya n’oge ochie.—Gụọ Abụ Ọma 83:1, 2, 13-18.

14. Gịnị mere ịrịọ Chineke ka o nye “anyị nri taa maka ụbọchị taa” ji kwesị ekwesị?

14 “Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa.” (Mat. 6:11; Luk 11:3) Mgbe anyị na-arịọ Chineke arịrịọ a n’ekpere, ihe anyị na-arịọ ya bụ ka o nye anyị nri dị anyị mkpa “maka ụbọchị taa.” Nke a na-egosi na anyị nwere okwukwe na Jehova ga-enyeli anyị ihe ndị dị anyị mkpa kwa ụbọchị. Nke a apụtaghị na anyị na-arịọ Chineke ka o nye anyị ọtụtụ ihe. Arịrịọ a anyị na-arịọ ka Chineke nye anyị nri ụbọchị anyị ga-echetara anyị na Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ka onye ọ bụla n’ime ha kporo mana “nke ga-ezuru ya n’ụbọchị.”—Ọpụ. 16:4.

15. Kọwaa ihe arịrịọ ahụ bụ́ “gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ” pụtara.

15 N’ekpere ahụ, ihe ọzọ Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-arịọ na-echetara anyị ihe anyị kwesịrị ime. Jizọs sịrị: “Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ.” (Mat. 6:12) Oziọma Luk gosiri na “ụgwọ” ahụ bụ “mmehie.” (Luk 1:4) Naanị mgbe anyị ga-atụ anya na Jehova ga-agbaghara anyị mmehie anyị bụ mgbe anyị ‘gbaghaara’ ndị mehiere anyị. (Gụọ Matiu 6:14, 15.) Anyị kwesịrị ịgbaghara ndị mehiere anyị kpamkpam.—Efe. 4:32; Kọl. 3:13.

16. Olee otú anyị ga-esi ghọta arịrịọ ahụ anyị na-arịọ ka anyị ghara ịdaba n’ọnwụnwa nakwa ka a napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ?

16 “Ekwela ka anyị daba n’ọnwụnwa, kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Mat. 6:13) Olee otú anyị ga-esi ghọta arịrịọ abụọ a na-agakọ ọnụ, bụ́ ndị dị n’ekpere ahụ Jizọs kụziiri anyị? Otu ihe doro anya bụ na Jehova anaghị anwa anyị ọnwụnwa ka anyị mee mmehie. (Gụọ Jems 1:13.) Kama, ọ bụ Setan, bụ́ “ajọ onye ahụ,” bụ “Onye Ọnwụnwa.” (Mat. 4:3) Ma, mgbe ụfọdụ Baịbụl kwuru na Chineke mere ihe, ihe ọ na-ekwu bụ na Chineke kwere ka ihe ahụ mee. (Rut 1:20, 21; Ekli. 11:5) Ya mere, mgbe anyị na-arịọ Jehova ka ọ ghara ikwe “ka anyị daba n’ọnwụnwa,” ihe anyị na-arịọ ya bụ ka ọ ghara ikwe ka anyị nupụrụ ya isi mgbe ọ bụla a nwara anyị ọnwụnwa ime otú ahụ. N’ikpeazụ, arịrịọ anyị na-arịọ Jehova ka ọ “napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ” bụ ka ọ ghara ikwe ka Setan mee ka anyị sụọ ngọngọ. Obi sikwara anyị ike na ‘Chineke agaghị ekwe ka a nwaa anyị gabiga ihe anyị pụrụ idi.’—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:13.

‘Na-arịọ, Na-achọ, Na-akụ’

17, 18. Gịnị ka ‘na-arịọ, na-achọ, nakwa na-akụ’ pụtara?

17 Pọl onyeozi gbara ụmụnna ya ume, sị: “Nọgidesienụ ike n’ekpere.” (Rom 12:12) Jizọs kwuru ihe gbara ọkpụrụkpụ nke yiri nke a mgbe ọ sịrị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu; na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ, a ga-emeghere unu. N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta, onye ọ bụla nke na-achọkwa na-achọta, onye ọ bụla nke na-akụkwa ka a ga-emeghere.” (Mat. 7:7, 8) Ọ dị mma ka anyị ‘na-arịọ’ ihe ọ bụla kwekọrọ n’uche Chineke. Jọn onyeozi dere ihe kwekọrọ n’ihe ahụ Jizọs kwuru. O dere, sị: “Obi ike anyị nwere n’ebe [Chineke] nọ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.”—1 Jọn 5:14.

18 Ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere anyị ka anyị ‘na-arịọ ma na-achọ’ pụtara na anyị kwesịrị ịna-ekpesi ekpere ike, gharakwa ịkwụsị ruo mgbe anyị nwetara ihe anyị na-arịọ. Ọ dịkwa mkpa ka anyị ‘na-akụ’ iji banye n’Alaeze Chineke ma nweta ngọzi na ụgwọ ọrụ ndị Alaeze ahụ ga-eweta. Ma, ànyị nwere ike inwe obi ike na Chineke ga-aza ekpere anyị? Ee, anyị nwere ike, ma ọ bụrụ na anyị na-erubere Jehova isi, n’ihi na Kraịst kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta, onye ọ bụla nke na-achọkwa na-achọta, onye ọ bụla nke na-akụkwa ka a ga-emeghere.” Ọtụtụ ihe Jehova na-emere ndị ohu ya na-egosi n’eziokwu na Chineke bụ “Onye na-anụ ekpere.”—Ọma 65:2.

19, 20. N’ihi ihe Jizọs kwuru na Matiu 7:9-11, ole otú o si bụrụ na Jehova yiri nna hụrụ ụmụ ya n’anya?

19 Jizọs ji Chineke tụnyere nna nke hụrụ ụmụ ya n’anya ma na-enye ha ihe ọma. Were ya na ị nọ mgbe Jizọs na-ezi Ozizi Elu Ugwu ahụ ma nụ ka o kwuru, sị: “Ònye n’etiti unu ka nwa ya nwoke ga-arịọ achịcha—ọ gaghị enye ya nkume, ka ọ̀ ga-enye ya? Ma ọ bụ, ma eleghị anya, ya arịọ azụ̀—ọ gaghị enye ya agwọ, ka ọ̀ ga-enye ya? Ya mere, ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya ihe ọma karị!”Mat. 7:9-11.

20 Nna bụ́ mmadụ hụrụ ụmụ ya n’anya n’agbanyeghị na ọ bụ onye “ajọ omume” n’ihi mmehie o ketara eketa. Ọ naghị aghọ ụmụ ya aghụghọ, kama ọ na-agbalị inye ha “ezi onyinye.” Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya, na-emere anyị ụdị ihe ndị ahụ nna na-emere ụmụ ya. Ọ na-enye anyị “ihe ọma,” dị ka inye anyị mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Ọ na-eme ka anyị dị ike wee na-efe Jehova otú ọ chọrọ ka anyị si na-efe ya, bụ́ Onye na-enye anyị “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè.”—Jes. 1:17.

Nọgide Na-erite Uru n’Ihe Jizọs Kwuru

21, 22. Olee ihe mere Ozizi Elu Ugwu ahụ ji pụọ iche, oleekwa otú ihe ndị ahụ Jizọs kwuru dị gị n’obi?

21 N’ezie, Ozizi Elu Ugwu ahụ bụ ozizi kachanụ e ziritụrụla n’ụwa. Ọ pụrụ iche n’ihi otú Jizọs si zie ihe banyere Chineke na ya nakwa otú o si dị mfe nghọta. Dị ka e gosiri n’isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche a, anyị nwere ike irite uru dị ukwuu n’ozizi a ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe a dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-eme. Ihe ndị a Jizọs kwuru nwere ike ime ka ndụ anyị dịkwuo mma ugbu a, ha ga-emekwa ka anyị nwee olileanya inwe obi ụtọ ná ndụ n’ọdịnihu.

22 N’isiokwu ndị a, anyị atụleela naanị ihe ole na ole n’ime ọtụtụ ihe bara nnukwu uru Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ahụ. Ka a sịkwa ihe mere ‘otú o si zie ihe ji ju ndị nụrụ ihe o ziri anya.’ (Mat. 7:28) O doro anya na otú ahụ ka ọ ga-adịkwa anyị ma ọ bụrụ na anyị emee ka ihe ndị a na ihe ndị ọzọ bara oké uru Onye Ozizi Ukwuu ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst, kwuru dịrị n’uche anyị nakwa n’obi anyị.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Gịnị ka Jizọs kwuru banyere ekpere ndị ihu abụọ?

• Gịnị mere anyị ekwesịghị ịna-ekwughachi otu ihe ugboro ugboro mgbe anyị na-ekpe ekpere?

• Olee arịrịọ ndị dị n’ekpere ahụ Jizọs kụziiri anyị?

• Olee otú anyị nwere ike isi ‘na-arịọ, na-achọ ma na-akụ’?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 15]

Jizọs katọrọ ndị ihu abụọ, bụ́ ndị na-ekpe ekpere ka ndị ọzọ wee hụ ha ma nụ otú ha si ekpe ekpere

[Foto dị na peeji nke 17]

Ị̀ ma ihe mere o ji dị mma ka anyị na-ekpe ekpere ka Chineke nye anyị nri ụbọchị anyị?