Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Mkpughe—Nke Abụọ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Mkpughe—Nke Abụọ

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Mkpughe—Nke Abụọ

GỊNỊ na-echere ndị na-efe Jehova Chineke na ndị na-anaghị efe ya? Gịnị ga-eme Setan na ndị mmụọ ọjọọ? Olee ngọzi ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi ga-enweta n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst? A zara ajụjụ ndị a na ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa ná Mkpughe 13:1–22:21. * N’ebe ahụ ka e dere ọhụụ itoolu ikpeazụ n’ime ọhụụ iri na isii Jọn onyeozi hụrụ mgbe ọ fọrọ obere ka narị afọ nke mbụ gwụchaa.

Jọn dere, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye na-agụpụta na ndị na-anụ okwu amụma nke a, na ndị na-eme ihe ndị e dere n’ime ya.” (Mkpu. 1:3; 22:7) Ịgụ akwụkwọ Mkpughe na ime ihe anyị gụtara na ya ga-eme ka anyị na-ejere Chineke ozi. Ọ ga-emekwa ka okwukwe anyị nwere na Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, sie ike, meekwa ka anyị nwee olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. *Hib. 4:12.

A WỤPỤ IWE CHINEKE NKE DỊ N’EFERE ASAA

(Mkpu. 13:1–16:21)

Mkpughe 11:18 kwuru, sị: “Mba niile were iwe, iwe [Chineke] wee bịa, na oge a kara aka maka . . . ibibi ndị na-ebibi ụwa.” Iji gosi ihe mere iwe Chineke ji bịa, ọhụụ nke asatọ mere ka a mata ọrụ “anụ ọhịa nke . . . nwere mpi iri na isi asaa.”—Mkpu. 13:1.

N’ọhụụ nke itoolu, Jọn hụrụ “Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo n’Ugwu Zayọn” ya na “otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ,” bụ́ ndị e si “n’etiti ụmụ mmadụ zụta.” (Mkpu. 14:1, 4) Ihe sochirinụ bụ ọkwa ndị mmụọ ozi mara. N’ọhụụ sochiri nke a, Jọn hụrụ “ndị mmụọ ozi asaa ndị ji ihe otiti asaa.” O doro anya na ọ bụ Jehova gwara ndị mmụọ ozi ndị a ka ha wụpụ “iwe Chineke nke dị n’efere asaa” n’akụkụ dị iche iche nke ụwa Setan. Ihe dị n’efere ndị ahụ bụ nkwupụta nke ikpe Chineke mara ụwa Setan na ịdọ aka ná ntị banyere otú ọ ga-esi mee ihe o kpere n’ikpe. (Mkpu. 15:1; 16:1) Ọhụụ abụọ a na-akọwa ikpe ọmụma ndị ọzọ Alaeze ahụ ga-eweta, nke bụ́ ahụhụ nke atọ ahụ nke malitere mgbe a fụrụ opi nke asaa.—Mkpu. 11:14, 15.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

13:8—Gịnị bụ ‘akwụkwọ mpịakọta nke ndụ nke Nwa Atụrụ ahụ’? Nke a bụ akwụkwọ mpịakọta ihe atụ nke ihe dị n’ime ya bụ naanị aha ndị ga-eso Jizọs Kraịst chịa n’Alaeze ya n’eluigwe. Aha Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị ka nọ n’ụwa, ya bụ, ndị nwere olileanya ịga eluigwe, dịkwa n’ime ya.

13:11-13—Olee otú anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ si eme ka dragọn, oleekwa otú o si eme ka ọkụ si n’eluigwe daa? Anụ ọhịa ahụ nke nwere mpi abụọ, bụ́ Britain na America bụ́ ndị na-achị ụwa, na-ekwu okwu ka dragọn. Nke a pụtara na ọ na-eyi ndị mmadụ egwu, na-emeso ha ihe n’ike ma na-amanye ha ịnabata ọchịchị ya. Okwu ahụ bụ́ na ọ na-eme ka ọkụ si n’eluigwe daa pụtara na ọ na-eme ka ọ̀ bụ onye amụma site n’ikwu na ya ji agha abụọ a lụrụ n’ụwa dum n’agbata afọ 1914 na 1945 kpochapụ ihe ndị na-akpata ihe ọjọọ nakwa na ya emeela ka a ghara inwezi ọchịchị Kọmunist.

16:17—Gịnị bụ ‘ikuku’ ahụ a wụsara ihe dị n’efere nke asaa ahụ? ‘Ikuku’ ahụ na-anọchi anya echiche Setan, ya bụ, “mmụọ [ma ọ bụ echiche] nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi.” Onye ọ bụla nke so n’ajọ ụwa Setan na-ekuru ikuku ọjọọ a.—Efe. 2:2.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

13:1-4, 18. “Anụ ọhịa” nke na-anọchi anya ọchịchị ụmụ mmadụ si “n’oké osimiri,” ya bụ, n’etiti ụmụ mmadụ nọ n’ọgba aghara, pụta. (Aịza. 17:12, 13; Dan. 7:2-8, 17) Anụ ọhịa a, bụ́ nke si n’aka Setan, nke o nyekwara ike, nwere akara bụ́ 666, nke na-egosi na o zutụghị okè. Ịghọta ihe anụ ọhịa ahụ bụ ga-eme ka anyị ghara ịsọpụrụ ya ma ọ bụ fewe ya ofufe dị ka ọtụtụ mmadụ na-efe ya.—Jọn 12:31; 15:19.

13:16, 17. N’agbanyeghị ihe isi ike ndị anyị na-enwe ka anyị na-eme ihe ndị dịịrị anyị kwa ụbọchị, ndị dị ka “ịzụ ihe ma ọ bụ ire ihe,” anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị kweta ka anụ ọhịa ahụ chịwa anyị. Ịnabata ‘akara anụ ọhịa ahụ n’aka anyị ma ọ bụ n’egedege ihu anyị’ pụtara na anyị kwere ka anụ ọhịa ahụ na-ekpebiri anyị otú anyị ga-esi na-akpa àgwà na otú anyị ga-esi na-eche echiche.

14:6, 7. Ihe mmụọ ozi ahụ kwuru na-akụziri anyị na anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke e guzoberela. Anyị kwesịrị inyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịtụ egwu Jehova na inye ya otuto.

14:14-20. Mgbe e wechara “ihe ubi nke ụwa,” ya bụ, mgbe a chịkọtachara ndị a ga-azọpụta, oge ga-eruzi ka mmụọ ozi ahụ wụba “mkpụrụ vaịn nke ụwa” “n’ime nnukwu ebe nzọchapụta mmanya nke iwe Chineke.” A ga-ebibizi vaịn ahụ, nke bụ́ ọchịchị rụrụ arụ Setan na-achị ụmụ mmadụ, na “ụyọkọ” mkpụrụ ọjọọ ọ mịpụtara. Anyị kwesịrị ikpebisi ike na anyị agaghị ekwe ka vaịn ụwa mebie anyị.

16:13-16. “Okwu . . . na-adịghị ọcha” bụ okwu ndị mmụọ ọjọọ na-ekwu iji mee ka ndị eze nke ụwa ghara ịtụ egwu mwụpụ a ga-awụpụ iwe Chineke nke dị n’efere asaa. Kama nke ahụ, ọ na-eme ka ha na-emegide Jehova.—Mat. 24:42, 44.

16:21. Ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso, e nwere ike ịkpọsasikwu ikpe Jehova mara ajọ ụwa Setan ike, bụ́ nke akụ́ mmiri ígwé na-anọchi anya ya, ma eleghị anya. N’agbanyeghị nke a, ọtụtụ ụmụ mmadụ ka ga-anọgide na-ekwulu Chineke.

EZE AHỤ NKE NWERE MMERI NA-ACHỊ

(Mkpu. 17:1–22:21)

“Babịlọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, bụ akụkụ kacha asọ oyi nke ajọ ụwa Setan. Ọhụụ nke iri na otu kpọrọ ya “oké nwaanyị akwụna,” ya bụ, nwaanyị na-akwa iko, nke “nọ n’elu otu anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie.” “Mpi iri” nke anụ ọhịa ahụ ọ nọ n’elu ya ga-ala ya n’iyi kpamkpam. (Mkpu. 17:1, 3, 5, 16) N’ọhụụ sochiri, e ji nwaanyị ahụ tụnyere “obodo ukwu,” maakwa ọkwa na ọ dawo. A gwakwara ndị Chineke ka ha ‘si n’ime ya pụta’ ngwa ngwa. Ọtụtụ ndị ruru uju mgbe obodo ukwu ahụ dara. Ma, e nwere ọṅụ n’eluigwe n’ihi “ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpu. 18:4, 9, 10, 15-19; 19:7) N’ọhụụ nke iri na atọ, onye ahụ na-agba “ịnyịnya ọcha” malitere ibuso mba dị iche iche agha. O bibiri ajọ ụwa Setan.—Mkpu. 19:11-16.

Gịnịkwanụ ga-eme “agwọ mbụ ahụ, onye bụ́ Ekwensu na Setan”? Olee mgbe ‘a ga-atụba ya n’ime ọdọ ọkụ’? Nke a bụ otu n’ime ihe ndị Jọn hụrụ n’ọhụụ nke iri na anọ. (Mkpu. 20:2, 10) Ọhụụ abụọ ikpeazụ mere ka anyị mata otú ndụ ga-adị n’Ọchịchị Puku Afọ Kraịst. Ná ngwụcha nke “mkpughe” a, Jọn hụrụ ‘osimiri nke mmiri nke ndụ ka ọ na-asọda n’etiti mbara okporo ámá,’ a kpọkwara “onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ” ka ọ bịa nara otu ihe dị ezigbo mkpa.—Mkpu. 1:1; 22:1, 2, 17.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

17:16; 18:9, 10—Gịnị mere “ndị eze ụwa” ji na-eruru onye ha bibiri uju? Ihe mere ha ji na-eru uju bụ n’ihi ihe ha na-eritebu n’aka ya. Mgbe e bibichara Babịlọn Ukwu ahụ, ndị eze ụwa ghọtara uru ọ na-abara ha. Ha ji aha okpukpe arụ arụrụala. Babịlọn Ukwuu ahụ na-akpọtakwara ha ndị ntorobịa ha na-eziga n’ọgbọ agha. Ọ na-enyekwara ndị ọchịchị aka eme ka ndị mmadụ na-erubere ha isi.

19:12—Olee otú o si bụrụ na ọ dịghị onye ọ bụla maara aha Jizọs, bụ́ nke a na-ekwughị ihe ọ bụ, ma e wezụga Jizọs n’onwe ya? Ọ dị ka aha a ọ̀ bụ ọkwá na ọrụ pụrụ iche Jizọs na-arụ n’ụbọchị Onyenwe Anyị, ndị dị ka ndị nke e kwuru okwu ha n’Aịzaya 9:6. Okwu ahụ bụ́ na ọ dịghị onye ọ bụla maara aha ya ma e wezụga ya onwe ya pụtara na ihe ùgwù ndị a pụrụ iche, ọ pụtakwara na ọ bụ naanị ya nwere ike ịghọta ihe ọkwá dị elu dị otú ahụ bụ. Ma, Jizọs mere ka ndị so n’òtù nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ nweta ụfọdụ n’ime ihe ùgwù ndị a, ya bụ na ‘o dere aha ọhụrụ ya ahụ n’ahụ́ ha.’—Mkpu. 3:12.

19:14—Olee ndị ga-eso Jizọs agba ịnyịnya n’Amagedọn? Ndị mmụọ ozi na ndị e tere mmanụ nwerela mmeri, bụ́ ndị nwetarala ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe, ga-eso ‘n’ụsụụ ndị agha nọ n’eluigwe,’ ndị ha na Jizọs ga-eso alụ agha Chineke.—Mat. 25:31, 32; Mkpu. 2:26, 27.

20:11-15—Olee ndị ka e dere aha ha ‘n’akwụkwọ mpịakọta [ma ọ bụ, akwụkwọ] nke ndụ’? Nke a bụ akwụkwọ mpịakọta e dere aha ndị niile ga-enweta ndụ ebighị ebi, ya bụ, ndị fọdụrụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ, oké ìgwè mmadụ ahụ, na ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’oge ‘mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume.’ (Ọrụ 24:15; Mkpu. 2:10; 7:9) Naanị mgbe a ga-ede aha ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’oge ‘mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume’ ‘n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ’ bụ mgbe ha mere ihe “e dere n’akwụkwọ mpịakọta” ndị a ga-eji zie ha ihe n’Ọchịchị Puku Afọ Kraịst. Ma, e nwere ike ihicha aha ndị ahụ ehicha. A gaghị ehichapụ aha ndị e tere mmanụ n’akwụkwọ ahụ ma ọ bụrụ na ha ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. (Mkpu. 3:5) Aha ndị ga-enweta ndụ n’ụwa ga-adịgide n’akwụkwọ ahụ ma ha gafee ule ikpeazụ a ga-ele ha ná ngwụcha nke puku afọ ahụ.—Mkpu. 20:7, 8.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

17:3, 5, 7, 16. “Amamihe nke si n’elu” na-enyere anyị aka ịghọta “ihe omimi banyere nwaanyị ahụ na banyere anụ ọhịa ahụ [na-acha uhie uhie] na-ebugharị ya.” (Jems 3:17) Anụ ọhịa ahụ bụ́ ihe atụ bụ Njikọ Mba Niile ná mmalite, ma o mechara bụrụ Òtù Mba Ụwa. Ọ̀ bụ na nkọwa a kọwaara anyị ihe omimi a ekwesịghị ime ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke ma na-ama ọkwa ọbịbịa nke ụbọchị ikpe Jehova?

21:1-6. Obi kwesịrị isi anyị ike na anyị ga-enweta ngọzi ndị e buru n’amụma na ha ga-adị n’Alaeze Chineke. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na e kwuru banyere ha, sị: “Ha emezuwo!”

22:1, 17. “Mmiri nke ndụ” na-anọchi anya ndokwa Jehova mere iji mee ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi kwụsị ime mmehie na ịnwụ anwụ. E nwetụrụ mmiri a ugbu a. Ka anyị zaa òkù ahụ a kpọrọ ka anyị bịa “nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu,” jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-akpọ ndị ọzọ ka ha bịa nara nke ha!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji nke]

^ par. 1 Ị chọọ ịma ebe a tụlere Mkpughe 1:1-12:17, gụọ “Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Mkpughe—Nke Mbụ,” nke dị n’Ụlọ Nche January 15, 2009.

^ par. 2 Ị chọọ ịma ebe a tụlere akwụkwọ Mkpughe n’amaokwu n’amaokwu, gụọ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!

[Foto dị na peeji nke 5]

Ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi ga-enweta ngọzi ndị magburu onwe ha mgbe Alaeze Chineke ga-amalite ịchị ụwa