Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Ihe Ndị Jizọs Kwuru Gbanwee Ndụ Gị

Ka Ihe Ndị Jizọs Kwuru Gbanwee Ndụ Gị

Ka Ihe Ndị Jizọs Kwuru Gbanwee Ndụ Gị

“Onye ahụ Chineke zitere na-ekwu ihe Chineke kwuru.”—JỌN 3:34.

1, 2. Gịnị ka e nwere ike iji tụnyere ihe ndị Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu, gịnịkwa mere anyị ga-eji kwuo na o kwuru “ihe Chineke kwuru”?

OTU n’ime dayamọnd kacha ibu e nwere taa bụ Star of Africa (ya bụ, Kpakpando Africa), nke dị narị carat ise na iri atọ (ya bụ, otu narị gram na isii). N’ezie, ọ bụ nkume dị oké ọnụ ahịa! Ma, ihe ndị Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu, bụ́ ndị a ga-eji tụnyere nkume dị oké ọnụ ahịa, bara nnọọ uru karịa ya. Ọ kwesịghị iju anyị anya na nke a dị otú a, n’ihi na ihe Kraịst kwuru bụ okwu Jehova! Baịbụl kwuru banyere Jizọs, sị: “Onye ahụ Chineke zitere na-ekwu ihe Chineke kwuru.”—Jọn 3:34-36.

2 N’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na Jizọs ejirughị nkeji iri atọ zie Ozizi Elu Ugwu ahụ, o kwughachiri ihe iri abụọ na otu e kwuru n’akwụkwọ asatọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’ihi ya, o kwuru nnọọ “ihe Chineke kwuru.” Ugbu a, ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bara ezigbo uru Ọkpara nke Chineke hụrụ n’anya kwuru n’ozizi ahụ na-enweghị atụ, tụleekwa otú anyị nwere ike isi na-eme ha eme.

“Buru Ụzọ Mee Ka Gị na Nwanne Gị Dị n’Udo”

3. Olee ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ gwachara ha ihe iwe nwere ike ịkpata?

3 Anyị, bụ́ Ndị Kraịst, bụ ndị nwere obi ụtọ na ndị udo n’ihi na anyị nwere mmụọ nsọ Chineke, ọṅụ na udo sokwa ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22, 23) Jizọs achọghị ka ndị na-eso ụzọ ya kwụsị ịbụ ndị udo na ndị nwere obi ụtọ. Nke a mere o ji gwa ha na ọ bụrụ na mmadụ ewee iwe ruo ogologo oge, o nwere ike ịkpatara ya ọnwụ. (Gụọ Matiu 5:21, 22.) O kwukwara, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà, i wee nọrọ n’ebe ahụ cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà gawa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ị bịaghachikwara, nye onyinye gị.”Mat. 5:23, 24.

4, 5. (a) Olee “onyinye” Jizọs kwuru okwu ya na Matiu 5:23, 24? (b) Olee ihe mere o ji dị oké mkpa ka gị na nwanne gị i mejọrọ mee udo?

4 “Onyinye” Jizọs kwuru okwu ya ebe a bụ ihe ọ bụla mmadụ wetara ka o jiri chụọ àjà n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Dị ka ihe atụ, iji anụmanụ achụ àjà dị mkpa, n’ihi na ọ bụ otu n’ime ụzọ ndị ohu Jehova si efe ya ofufe n’oge ahụ. Ma, Jizọs kwuru ihe ka mkpa, ya bụ, mmadụ na nwanne ya o mejọrọ ime udo tupu onye ahụ abịa nye Chineke onyinye.

5 Okwu bụ́ “mee ka gị na nwanne gị dị n’udo” pụtara ‘mmadụ na nwanne ya idozi esemokwu.’ N’ihi ya, gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe a Jizọs kwuru? Nke a pụtara na otú anyị si emeso ndị ọzọ ga-ekpebi ma anyị na Jehova ọ̀ ga-adị ná mma ma ọ bụ na anyị na ya agaghị adị. (1 Jọn 4:20) N’oge ochie, ọ bụrụ na mmadụ anaghị emeso ndị ọzọ ihe otú kwesịrị ekwesi, àjà onye ahụ na-achụrụ Chineke enweghị isi.—Gụọ Maịka 6:6-8.

Anyị Aghaghị Ịdị Umeala n’Obi

6, 7. Gịnị mere o ji dị mkpa na anyị ga-adị umeala n’obi mgbe anyị na-achọ ime ka anyị na nwanne anyị nke anyị mejọrọ dịghachi ná mma?

6 Anyị ịga ka anyị na nwanne anyị nke anyị mejọrọ mee udo nwere ike igosi ma ànyị dị umeala n’obi. Onye dị umeala n’obi anaghị arụ ụka iji gosi nwanne ya na ọ bụghị ya chọrọ okwu. Nke a na-eweta nsogbu, ụdị nke ahụ dị n’etiti Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt oge ochie. Mgbe Pọl onyeozi kwuru okwu banyere nsogbu ahụ, o kwuru otu ihe nwere ike ime ka mmadụ chee echiche. Ọ sịrị: “Ọ pụtara na e meriwo unu ebe ọ bụ na unu na-akpụpụ ibe unu n’ụlọikpe. Gịnị mere unu ekweghị ka e mejọọ unu? Gịnị mere unu ekweghị ka e rigbuo unu?”—1 Kọr. 6:7.

7 Jizọs asịghị na ihe mere anyị ji agakwuru nwanne anyị bụ iji mee ka ọ mata na ọ bụ ya mejọrọ anyị. Ihe mere anyị ga-eji gakwuru ya bụ iji mee ka anyị na ya dịghachi ná mma. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime udo, anyị ga-agwa nwanne anyị hoo haa otú ihe o mere anyị dị anyị n’obi. Anyị kwesịkwara ikweta na ọ dị ihe anyị mere nke kpasuru ya iwe. Ọ bụrụkwa na ọ dị ebe anyị mejọrọ, anyị kwesịrị iji obi umeala rịọ mgbaghara.

‘Ọ Bụrụ na Anya Aka Nri Gị Na-eme Ka Ị Sụọ Ngọngọ’

8. Kọwaa ná nkenke, ihe Jizọs kwuru na Matiu 5:29, 30.

8 N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jizọs nyere ndụmọdụ gbara ọkpụrụkpụ banyere otú anyị ga-esi na-akpa àgwà. Ọ maara na akụkụ ahụ́ anyị na-ezughị okè nwere ike ime ka anyị tinye aka n’ihe ọjọọ. N’ihi ya, ọ sịrị: “Ọ bụrụkwa na anya aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya tụfuo. N’ihi na ọ baara gị uru ka otu akụkụ ahụ́ gị laa n’iyi karịa na a tụbara ahụ́ gị dum na Gehena. Ọ bụrụkwa na aka nri gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, gbubipụ ya tụfuo. N’ihi na ọ baara gị uru ka otu akụkụ ahụ́ gị laa n’iyi karịa na a tụbara ahụ́ gị dum na Gehena.”Mat. 5:29, 30.

9. Olee otú “anya” anyị ma ọ bụ “aka” anyị nwere ike isi mee ka anyị “sụọ ngọngọ”?

9 “Anya” Jizọs kwuru okwu ya ebe a bụ ikike anyị nwere ichebara ihe echiche, “aka” o kwuru okwu ya abụrụ ihe anyị nwere ike iji aka anyị mee. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, akụkụ ahụ́ anyị ndị a nwere ike ime ka anyị “sụọ ngọngọ” ma mee ka anyị kwụsị ‘iso Chineke na-eje ije.’ (Jen. 5:22; 6:9) N’ihi ya, mgbe e nwere ihe chọrọ ime ka anyị nupụrụ Jehova isi, anyị kwesịrị ime ihe ozugbo, nke yiri ịghụpụ anya anyị ma ọ bụ igbupụ aka anyị.

10, 11. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ka anyị wee ghara ịkwa iko?

10 Olee otú anyị nwere ike isi mee ka anya anyị ghara ile ihe rụrụ arụ? Nwoke ahụ na-atụ egwu Chineke bụ́ Job kwuru, sị: “Mụ na anya m agbawo ndụ. Oleezi otú m ga-esi nwee mmasị n’ebe nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nọ?” (Job 31:1) Job lụrụ nwaanyị, kpebisiekwa ike na ya agaghị emebi iwu Chineke nyere banyere omume. Anyị niile kwesịkwara ime otú a ma ànyị alụọla nwaanyị ma ọ bụ di ma ọ bụ na anyị alụbeghị. Ọ bụrụ na anyị achọghị ịkwa iko, anyị ga-ekwe ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi anyị, bụ́ nke na-enyere ndị hụrụ Chineke n’anya aka inwe njide onwe onye.—Gal. 5:22-25.

11 Ọ bụrụ na anyị achọghị ịkwa iko, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘M̀ na-ekwe ka anya m mee ka ịgụ akwụkwọ ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ma ọ bụ ikiri ihe ndị a na televishọn ma ọ bụ n’Ịntanet gụwa m agụụ?’ Ka anyị chetakwa ihe Jems onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe ọchịchọ nke aka ya rapụtara ya wee rafuo ya. Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie; mgbe e mechara mmehie, ọ na-amụpụta ọnwụ.” (Jems 1:14, 15) N’ezie, ọ bụrụ na onye raara onwe ya nye Chineke “na-ele” nwoke ma ọ bụ nwaanyị anya nke na ya na ya inwe mmekọahụ gụwara ya agụụ, o kwesịrị ime ihe ozugbo, nke yiri ịghụpụ anya ya na ịtụfu ya.—Gụọ Matiu 5:27, 28.

12. Olee ndụmọdụ Pọl nyere nke ga-enyere anyị aka ịgbaso ọchịchọ rụrụ arụ mgba?

12 Ebe ọ bụ na aka anyị nwere ike ime ka anyị mebie iwu Jehova, anyị kwesịrị ikpebisi ike na anyị agaghị eme omume rụrụ arụ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ihe Pọl dụrụ anyị ọdụ, sị: “Meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị.” (Kọl. 3:5) Okwu ahụ bụ́ “meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ” na-egosi na anyị aghaghị ime ihe iji hụ na anyị gbasosiri ọchịchọ anụ ahụ́ mgba ike.

13, 14. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị ghara iche banyere ihe ndị rụrụ arụ na ime omume rụrụ arụ?

13 Mmadụ nwere ike ikwe ka e bee ya ụkwụ ma ọ bụ aka n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka ọ dị ndụ. ‘Ịtụfu’ anya anyị na aka anyị, nke bụ́ ihe atụ, dị mkpa ka anyị wee ghara iche ihe rụrụ arụ n’uche ma ọ bụ ime ya eme, bụ́ nke nwere ike ime ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. Ọ bụrụ na anyị anaghị eche banyere ihe rụrụ arụ, ọ bụrụkwa na anyị anaghị eme omume rụrụ arụ, ma ọ bụ na-etinye aka n’ofufe ụgha, agaghị ebibi anyị na Gehena, bụ́ mbibi ebighị ebi.

14 Ebe ọ bụ na anyị ketara mmehie na ezughị okè, anyị ga-agbasi mbọ ike ka anyị wee nọgide na-eme omume ọma. Pọl kwuru, sị: “M na-etipụta ahụ́ m ọnyá, na-achị ya dị ka ohu, ka m wee ghara ịghọ onye a jụrụ ajụ n’ụzọ ọ bụla, mgbe m kwusasịịrị ndị ọzọ ozi ọma.” (1 Kọr. 9:27) Ya mere, ka anyị kpebisie ike ime ihe Jizọs dụrụ anyị n’ọdụ banyere omume, ka anyị ghara ime ihe ga-egosi na anyị enweghị ekele maka àjà ọ chụrụ iji gbapụta anyị.—Mat. 20:28; Hib. 6:4-6.

“Na-enyenụ Ihe”

15, 16. (a) Olee otú Jizọs si setịpụ ihe nlereanya n’inye ihe? (b) Gịnị ka ihe Jizọs kwuru nke dị na Luk 6:38 pụtara?

15 Okwu Jizọs kwuru na ihe nlereanya ya na-enweghị atụ na-akụziri anyị ka anyị nwee mmụọ inye ihe. Ọbịbịa Jizọs bịara n’ụwa n’ihi ụmụ mmadụ na-ezughị okè gosiri na ọ na-enye ihe n’ụba. (Gụọ 2 Kọrịnt 8:9.) Jizọs ji obi ọcha ya hapụ ihe ùgwù dị ebube o nwere n’eluigwe ma ghọọ mmadụ, wee nye ndụ ya maka ụmụ mmadụ na-eme mmehie. A ga-eme ka ụfọdụ n’ime ndị o ji ndụ ya chụọrọ àjà dịrị ebube n’eluigwe, bụ́ ebe ha ga-eso ya chịa n’Alaeze ya. (Rom 8:16, 17) N’ezie, Jizọs gbara anyị ume ka anyị na-enye ndị mmadụ ihe mgbe ọ sịrị:

16 “Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe. Ha ga-awụnyekwa n’apata ụkwụ unu ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma, nke a bịara aka, yọkọta ọnụ, nke jubigakwara ókè. N’ihi na ihe unu ji atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.” (Luk 6:38) ‘Ịwụnye ihe n’apata’ bụ ihe ụfọdụ ndị na-ere ahịa na-eme n’oge ochie, bụ́ ịwụju ihe n’ihe a dụnyere n’uwe elu sara mbara nke onye bịara ịzụ ihe. A na-eji ájị̀ ekedo ya, jirikwa ya mere akpa e ji awụnye ihe. Ọ bụrụ na anyị na-enye ndị ọzọ ihe n’ụba n’echeghị ka e buru ụzọ gwa anyị agwa, nke a nwere ike ime ka e nye anyị ihe n’ụba mgbe anyị nọ n’ezigbo mkpa.—Ekli. 11:2.

17. Olee otú Jehova si setịpụ ihe nlereanya kachanụ n’inye ihe, oleekwa ụdị inye ihe nke na-eme ka anyị nwee ọṅụ?

17 Jehova hụrụ ndị ji obi ụtọ na-enye ihe n’anya, ọ na-akwụghachikwa ha n’ụba. Jehova setịpụrụ ihe nlereanya kachanụ site n’inye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya “ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Pọl dere, sị: “Onye na-aghakwa mkpụrụ n’ụba ga-aghọrọ mkpụrụ n’ụba. Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” (2 Kọr. 9:6, 7) Iji oge anyị, ume anyị, na ihe ndị ọzọ anyị nwere na-arụ ọrụ ndị metụtara ofufe Jehova na-eme ka anyị nwee ọṅụ, na-emekwa ka anyị nweta ezigbo ụgwọ ọrụ.—Gụọ Ilu 19:17; Luk 16:9.

“Afụla Opi Na-aga”

18. Olee ihe anyị ga-eme, anyị ewee ghara “inweta ụgwọ ọrụ” n’aka Nna anyị nke eluigwe?

18 “Lezienụ anya nke ọma ka unu ghara ịdị na-eme ezi omume unu n’ihu ndị mmadụ ka ha wee hụ unu; ma ọ́ bụghị otú ahụ, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ n’aka Nna unu nke nọ n’eluigwe.” (Mat. 6:1) Ihe Jizọs na-ekwu okwu ya mgbe o kwuru banyere “ezi omume” bụ omume kwekọrọ n’uche Chineke. Ọ naghị ekwu na anyị ekwesịghị ime omume na-amasị Chineke n’ebe ndị mmadụ ga-ahụ anyị. Ihe mere anyị ji kwuo otú a bụ n’ihi na ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee “ka ìhè [ha] na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ.” (Mat. 5:14-16) Ma anyị agaghị “enweta ụgwọ ọrụ” n’aka Nna anyị nke eluigwe ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe naanị ka ‘ndị mmadụ wee hụ anyị’ wee too anyị, dị ka ndị na-eme ihe nkiri na-eme. Ọ bụrụ nke a ka anyị bu n’obi na-eme ihe ọma, anyị na Chineke agaghị adị ná mma, anyị agaghịkwa enweta ngọzi ga-adịru ebighị ebi mgbe Alaeze ahụ ga na-achị.

19, 20. (a) Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru ka anyị ghara ‘ịfụ opi’ mgbe anyị na-enye “onyinye ebere”? (b) Olee otú anyị ga-esi ghara ikwe ka aka ekpe anyị mara ihe aka nri anyị na-eme?

19 Ọ bụrụ na anyị nwere àgwà kwesịrị ekwesị, anyị ga-eme ihe Jizọs dụrụ n’ọdụ, sị: “Ya mere, mgbe ị na-enye onyinye ebere, afụla opi na-aga, dị nnọọ ka ndị ihu abụọ na-eme n’ụlọ nzukọ na n’okporo ámá, ka ndị mmadụ wee nye ha otuto. N’ezie, ana m asị unu, Ha enwetazuwo ụgwọ ọrụ ha.” (Mat. 6:2) “Onyinye ebere” bụ onyinye a na-enye iji nyere ndị nọ ná mkpa aka. (Gụọ Aịzaya 58:6, 7.) Jizọs na ndịozi ya tụkọtara ego ha ji enyere ndị ogbenye aka. (Jọn 12:5-8; 13:29) Ebe ọ bụ na mmadụ anaghị afụ opi ma ọ na-enye onyinye, o doro anya na ihe Jizọs ji kwuo banyere ‘ịfụ opi mgbe a na-enye onyinye ebere’ bụ iji mesie okwu ya ike. Anyị ekwesịghị ime ka ụwa niile mara na anyị na-enye onyinye, dị ka ndị Farisii, bụ́ ndị Juu, mere. Jizọs kpọrọ ha ndị ihu abụọ n’ihi na ha na-anọ “n’ụlọ nzukọ na n’okporo ámá” na-eme ka ndị mmadụ mara na ha nyere onyinye e ji enyere ndị nọ ná mkpa aka. Ndị ihu abụọ a ‘na-enwetazu ụgwọ ọrụ ha.’ Otuto ndị mmadụ na-eto ha nakwa ihu oche e nwere ike na-enye ha n’ebe ndị rabaị a ma ama na-anọ, bụ naanị ụgwọ ọrụ ha na-enweta, n’ihi na Jehova enweghị ihe ọ bụla ọ na-enye ha. (Mat. 23:6) Ma, olee otú ndị na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị isi na-eme n’oge ahụ? Jizọs gwara ha, gwakwa anyị onwe anyị, sị:

20 “Ma gị onwe gị, mgbe ị na-enye onyinye ebere, ekwela ka aka ekpe gị mara ihe aka nri gị na-eme, ka onyinye ebere gị wee bụrụ na nzuzo; Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụ gị ụgwọ.” (Mat. 6:3, 4) Aka anyị abụọ na-arụkọkarị ọrụ ọnụ. N’ihi ya, ihe okwu Jizọs, bụ́ ka anyị ghara ikwe ka aka ekpe anyị mara ihe aka nri anyị na-eme, pụtara bụ na anyị agaghị agwa ụwa niile na anyị nyere onyinye iji nyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka. Anyị agaghịdị agwa ndị nọ anyị nso, otú aka nri si nọrọ aka ekpe nso.

21. Olee otú Onye “na-ahụ ihe na nzuzo” si akwụ anyị ụgwọ?

21 “Onyinye ebere” anyị na-enye ga-abụ na nzuzo ma ọ bụrụ na anyị anaghị eji onyinye anyị nyere maka ndị nọ ná mkpa etu ọnụ. Ọ bụrụ na anyị na-enye onyinye anyị na nzuzo, Nna anyị “nke na-ahụ ihe na nzuzo” ga-akwụ anyị ụgwọ. Ebe ọ bụ na Jehova bi n’eluigwe, ụmụ mmadụ anaghị ahụ ya anya, n’anya ha, Nna anyị nke eluigwe nọ “na nzuzo.” (Jọn 1:18) Otú Jehova, bụ́ onye “na-ahụ ihe na nzuzo,” si akwụ anyị ụgwọ bụ site n’ime ka anyị na ya dịrị ná mma, site n’ịgbaghara anyị mmehie anyị, nakwa site n’inye anyị ndụ ebighị ebi. (Ilu 3:32; Jọn 17:3; Efe. 1:7) Nke a dị nnọọ mma karịa ịnata otuto n’aka ụmụ mmadụ!

Okwu Ndị Dị Ezigbo Mkpa Anyị Ga-eji Kpọrọ Ihe

22, 23. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iji ihe ndị Jizọs kwuru kpọrọ ihe?

22 N’ezie, akụ̀ ime mmụọ ndị magburu onwe ha, ndị yiri nkume dị oké ọnụ ahịa, juru n’Ozizi Elu Ugwu ahụ. E nwere nnọọ ihe ndị magburu onwe ha Jizọs kwuru n’ozizi ahụ bụ́ ndị ga-eme ka anyị nwee ọṅụ n’ime ụwa a nọ ná nsogbu. Anyị ga-enwe obi ụtọ n’ezie ma ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị Jizọs kwuru kpọrọ ihe ma kwe ka ha gbanwee otú anyị si ebi ndụ.

23 A ga-agọzi onye ọ bụla “na-anụ” ihe Jizọs kụziri ma “na-eme” ha. (Gụọ Matiu 7:24, 25.) N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ime ihe ndị Jizọs dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-eme. A ga-atụle ihe ndị ọzọ o kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ahụ n’isiokwu nke na-esonụ.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị gaa ka anyị na nwanne anyị anyị mejọrọ mee udo?

• Gịnị ka anyị nwere ike ime ka “anya aka nri” anyị wee ghara ime ka anyị sụọ ngọngọ?

• Olee otú anyị kwesịrị isi na-enye ihe?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 11]

Ọ ga-adị nnọọ mma ma anyị gakwuru nwanna anyị anyị mejọrọ ka anyị na ya wee ‘mee udo’

[Foto ndị dị na peeji nke 12, 13]

Jehova na-agọzi ndị ji obi ụtọ na-enye ihe