Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ime Ihe Jizọs Kwuru Si Eme Ka E Nwee Obi Ụtọ

Otú Ime Ihe Jizọs Kwuru Si Eme Ka E Nwee Obi Ụtọ

Otú Ime Ihe Jizọs Kwuru Si Eme Ka E Nwee Obi Ụtọ

“[Jizọs] rịgooro n’elu ugwu; . . . ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya; o wee . . . malite izi ha ihe.”—MAT. 5:1, 2.

1, 2. (a) Olee ihe mere mgbe Jizọs malitere izi Ozizi Elu Ugwu ahụ? (b) Olee otú Jizọs si malite okwu ya?

N’AFỌ 31 O.A., Jizọs kwụsịrị ozi ọma ọ nọ na-ekwusa na Galili ka o wee gaa Ememme Ngabiga na Jeruselem. (Jọn 5:1) Mgbe ọ gaghachiri Galili, o ji otu abalị dum kpee ekpere ka Chineke nyere ya aka ịhọrọ ndịozi iri na abụọ. Mgbe chi bọrọ, ìgwè mmadụ gbakọtara wee na-ekiri ebe Jizọs nọ na-agwọ ndị ọrịa. Jizọs nọdụrụ ala n’akụkụ ugwu n’ihu ndị na-eso ụzọ ya na ndị ọzọ wee malite izi ha ihe.—Mat. 4:23–5:2; Luk 6:12-19.

2 Jizọs malitere okwu ya, ya bụ, Ozizi Elu Ugwu, site n’ịgwa ha na ọ bụ mmadụ na Chineke ịdị ná mma na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. (Gụọ Matiu 5:1-12.) Obi ụtọ pụtara ‘mmadụ inwe afọ ojuju na ọṅụ dị ukwuu.’ Ihe itoolu ndị ahụ Jizọs kwuru okwu ha, bụ́ ndị na-eme ka e nwee obi ụtọ, na-eme ka a mara ihe mere Ndị Kraịst ji enwe obi ụtọ. Ha itoolu ka bakwara uru taa otú ahụ ha bara n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga. Ka anyị tụlee ha otu otu.

“Ndị Maara Mkpa Ime Mmụọ Ha”

3. Gịnị ka mmadụ ịmara mkpa ime mmụọ ya pụtara?

3 “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.” (Mat. 5:3) “Ndị maara mkpa ime mmụọ ha” maara na nduzi Chineke na ebere ya dị ha mkpa.

4, 5. (a) Olee ihe mere ndị maara mkpa ime mmụọ ha ji enwe obi ụtọ? (b) Olee otú anyị nwere ike isi gboo mkpa ime mmụọ anyị?

4 Ndị maara mkpa ime mmụọ ha nwere obi ụtọ “n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.” Nkwere ndị na-eso ụzọ Jizọs oge ochie kweere na ọ bụ Mesaya mere ka ha nwee ike iso ya chịa n’Alaeze Chineke n’eluigwe. (Luk 22:28-30) Ma ànyị nwere olileanya iso Kraịst chịa n’eluigwe ma ànyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa, anyị nwere ike inwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị maara mkpa ime mmụọ anyị n’eziokwu, marakwa nke ọma na nduzi Chineke dị anyị mkpa.

5 Ọ bụghị mmadụ niile maara mkpa ime mmụọ ha, e nwere ọtụtụ ndị na-enweghị okwukwe, ha ejighịkwa ihe dị nsọ kpọrọ ihe. (2 Tesa. 3:1, 2; Hib. 12:16) Anyị ga-egbo mkpa ime mmụọ anyị ma ọ bụrụ na anyị na-amụsi Baịbụl ike, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ma na-agachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya.—Mat. 28:19, 20; Hib. 10:23-25.

Ndị Na-eru Uju, Bụ́ Ndị Nwere “Obi Ụtọ”

6. Olee ndị bụ “ndị na-eru uju,” oleekwa ihe mere ha ji enwe “obi ụtọ”?

6 “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eru uju, n’ihi na a ga-akasi ha obi.” (Mat. 5:4) “Ndị na-eru uju” bụ ụdị ndị ahụ “maara mkpa ime mmụọ ha.” Uju ha na-eru abụghị ime mkpesa maka ọnọdụ ha ná ndụ. Ọ bụ mwute ha na-enwe n’ihi na ha bụ ndị mmehie nakwa n’ihi ihe ndị na-eme n’ụwa n’ihi ezughị okè mmadụ. N’ihi gịnị ka ndị ahụ na-eru uju ji enwe “obi ụtọ”? Ọ bụ n’ihi na ha nwere okwukwe n’ebe Chineke na Kraịst nọ, ha na-enwekwa obi ụtọ n’ihi na ha na Jehova dị ná mma.—Jọn 3:36.

7. Olee otú anyị ga-esi na-ele ụwa Setan anya?

7 Ànyị na-eru uju n’otu n’otu n’ihi ajọ omume jupụtara n’ụwa Setan? Olee otú obi na-adị anyị n’ihi ihe ndị na-eme n’ụwa? Jọn onyeozi dere, sị: “Ihe niile dị n’ụwa, ya bụ, ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ, esighị n’ebe Nna anyị nọ.” (1 Jọn 2:16) Ma, gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na “mmụọ nke ụwa,” ya bụ, mmụọ na-achị ndị na-anaghị efe Chineke, ji nwayọọ nwayọọ na-eme ka anyị ghara iji ofufe Chineke kpọrọ ihe? Ya bụrụ otú ahụ, ka anyị kpesie ekpere ike, na-amụ Okwu Chineke, ma gwa ndị okenye ka ha nyere anyị aka. Ọ bụrụ na anyị abịarukwuo Jehova nso, anyị ‘ga-enweta nkasi obi’ n’agbanyeghị ihe na-enye anyị nsogbu.—1 Kọr. 2:12; Ọma 119:52; Jes. 5:14, 15.

“Ndị Dị Nwayọọ n’Obi” Na-enwe Obi Ụtọ Dị Ukwuu

8, 9. Gịnị ka ịdị nwayọọ n’obi pụtara, gịnịkwa mere ndị dị nwayọọ n’obi ji enwe obi ụtọ?

8 “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Mat. 5:5) “Ịdị nwayọọ n’obi,” ma ọ bụ ịdị umeala n’obi, anaghị egosi na mmadụ adịghị ike ma ọ bụ na onye ahụ na-eme ka ndị mmadụ na-asị na ọ dị nwayọọ. (1 Tim. 6:11) Ọ bụrụ na anyị dị nwayọọ n’obi, anyị ga-egosi na anyị dị umeala n’obi site n’ime uche Jehova nakwa site n’ikwe ka ọ na-eduzi anyị. Otú anyị si emeso ụmụnna anyị ihe na otú anyị si emeso ndị ọzọ na-egosi ma ànyị dị nwayọọ n’obi. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị ga na-eme ihe Pọl onyeozi dụrụ ọdụ ka anyị na-eme.—Gụọ Ndị Rom 12:17-19.

9 Olee ihe mere ndị dị nwayọọ n’obi ji enwe obi ụtọ? Jizọs, bụ́ onye dị nwayọọ n’obi, kwuru na ọ bụ n’ihi na “ha ga-eketa ụwa.” Ọ bụ Jizọs bụ Onye bụ́ isi e nyere ụwa ka ọ bụrụ ihe nketa ya. (Ọma 2:8; Mat. 11:29; Hib. 2:8, 9) “Ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe,” bụ́ ndị dị nwayọọ n’obi, ga-esokwa Jizọs keta ụwa e nyere ya. (Rom 8:16, 17) N’Alaeze Jizọs, ọtụtụ ndị ọzọ dị umeala n’obi ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa.—Ọma 37:10, 11.

10. Ọ bụrụ na anyị adịghị nwayọọ, olee otú ọ ga-esi metụta ihe ùgwù anyị n’ọgbakọ, nakwa mmekọrịta anyị na ndị ọzọ?

10 Anyị kwesịrị ịdị nwayọọ n’obi dị ka Jizọs. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị na-esekarị okwu? Àgwà dị otú a nwere ike ime ka ndị mmadụ na-eze anyị eze. Ọ bụrụ na ọ na-agụ anyị agụụ ka a họpụta anyị ịrụ ọrụ n’ọgbakọ, ụdị àgwà a ga-eme ka a ghara ịhọpụta anyị. (1 Tim. 3:1, 3) Pọl gwara Taịtọs ka ọ nọgide na-echetara Ndị Kraịst nọ na Krit “ka ha ghara inwe mmụọ ịlụ ọgụ, ka ha nwee ezi uche, na-adị nwayọọ n’ụzọ zuru ezu n’ebe mmadụ niile nọ.” (Taị. 3:1, 2) Ọ bụrụ na anyị adị nwayọọ, ọ ga-abara ndị ọzọ nnukwu uru.

Agụụ “Ezi Omume” Na-agụ Ha

11-13. (a) Gịnị ka agụụ ezi omume ịgụ mmadụ nakwa akpịrị ezi omume ịkpọ ya nkụ pụtara? (b) Olee otú e si eme ka “afọ ju” ndị agụụ ezi omume na-agụ, akpịrị ana-akpọkwa ha nkụ maka ya?

11 “Obi ụtọ na-adịrị ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ezi omume, n’ihi na a ga-eme ka afọ ju ha.” (Mat. 5:6) “Ezi omume” Jizọs na-ekwu okwu ya ebe a bụ ime ihe ziri ezi, ya bụ, ime uche Chineke na ihe o nyere n’iwu. Ọbụ abụ kwuru na ‘mkpebi ikpe Chineke nke ziri ezi na-agụsi ya agụụ ike.’ (Ọma 119:20) Ànyị na-ele ezi omume anya dị ka ihe bara oké uru nke na ọ na-agụ anyị agụụ, akpịrị ana-akpọkwa anyị nkụ maka ya?

12 Jizọs kwuru na ndị ezi omume na-agụ agụụ, akpịrị ana-akpọkwa ha nkụ maka ya, ga-enwe obi ụtọ n’ihi na “a ga-eme ka afọ ju ha.” Ha malitere inwe afọ ojuju mgbe Pentikọst afọ 33 O.A. gachara, n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka mmụọ nsọ Jehova malitere inye “ụwa ihe àmà doro anya banyere . . . ezi omume.” (Jọn 16:8) Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ka ndị mmadụ nwee ike ide Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, bụ́ nke bara uru ‘iji nye ọzụzụ n’ezi omume.’ (2 Tim. 3:16) Mmụọ Chineke na-emekwa ka anyị nwee ike ‘iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere n’ezi omume, dị ka uche Chineke si dị.’ (Efe. 4:24) Ọ̀ bụ na ọ naghị akasị anyị obi ịmara na ndị mmehie nwere ike ịghọghachi ndị ezi omume n’anya Chineke ma ọ bụrụ na ha echegharịa ma rịọ mgbaghara n’ihi àjà mgbapụta Jizọs chụrụ?—Gụọ Ndị Rom 3:23, 24.

13 Ọ bụrụ na anyị nwere olileanya ibi n’ụwa, a ga-egbo anyị mkpa agụụ ezi omume nke na-agụ anyị nakwa akpịrị na-akpọ anyị nkụ maka ezi omume mgbe anyị ga-adị ndụ ebighị ebi n’enweghị nsogbu n’ụwa. Ka ọ dịgodị, ka anyị kpebisie ike ịnọgide na-eme uche Jehova. Jizọs sịrị: “Burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.” (Mat. 6:33) Ime nke a ga-eme ka anyị na-arụ ọtụtụ ihe n’ọrụ Chineke, ọ ga-emekwa ka anyị nwee nnọọ ezigbo obi ụtọ.—1 Kọr. 15:58.

Ihe Mere “Ndị Na-eme Ebere” Ji Enwe Obi Ụtọ

14, 15. Olee otú anyị ga-esi na-eme ebere, gịnịkwa mere “ndị na-eme ebere” ji enwe obi ụtọ?

14 “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere, n’ihi na a ga-emere ha ebere.” (Mat. 5:7) “Ndị na-eme ebere” na-enwe ọmịiko n’ebe ndị ọzọ nọ. Jizọs rụrụ ọrụ ebube wee nyere ọtụtụ ndị nọ n’ahụhụ aka n’ihi na o nwere ọmịiko n’ebe ha nọ. (Mat. 14:14) Ọ bụrụ na mmadụ agbaghara onye mejọrọ ya, ọ bụ ebere ka o meere ya, dị ka Jehova na-emere ndị mmehie nwere nchegharị ebere wee gbaghara ha. (Ọpụ. 34:6, 7; Ọma 103:10) Anyị nwere ike isi otú ahụ meere ndị mmadụ ebere. Anyị na-emekwara ndị mmadụ ebere mgbe anyị ji obiọma gwa ha okwu ma ọ bụ mee ihe ga-ebelata ahụhụ nke ndị nọ ná nsogbu. Ụzọ kacha mma anyị si emere ndị ọzọ ebere bụ ịgwa ha eziokwu dị na Baịbụl. Ọmịiko Jizọs nwere n’ebe ìgwè mmadụ gbakọtara n’ebe ọ nọ mere ka ọ “malite izi ha ọtụtụ ihe.”—Mak 6:34.

15 E nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji kweta ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ebere, n’ihi na a ga-emere ha ebere.” Ọ bụrụ na anyị na-emere ndị ọzọ ebere, nke a nwere ike ime ka ha na-emekwara anyị ebere. Ebere anyị meere ndị ọzọ nwere ike ime ka Chineke meere anyị ebere ma ya kpewe anyị ikpe. (Jes. 2:13) Ọ bụ naanị ndị na-eme ebere ka a ga-agbaghara mmehie ha, meekwa ka ha dị ndụ ebighị ebi.—Mat. 6:15.

Ihe Mere “Ndị Dị Ọcha n’Obi” Ji Enwe Obi Ụtọ

16. Gịnị ka ịdị “ọcha n’obi” pụtara, oleekwa otú ndị dị ọcha n’obi si ‘ahụ Chineke’?

16 “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị ọcha n’obi, n’ihi na ha ga-ahụ Chineke.” (Mat. 5:8) Otú anyị si emeso ndị ọzọ, ọchịchọ anyị, nakwa ihe ndị anyị bu n’obi, ga-egosi ma ànyị “dị ọcha n’obi.” Anyị ga-eji ‘obi dị ọcha’ hụ ndị ọzọ n’anya. (1 Tim. 1:5) Anyị “ga-ahụ Chineke” ma ọ bụrụ na anyị dị ọcha n’obi. Nke a apụtaghị na anyị ga-ahụ Jehova ihu na ihu, n’ihi na “ọ dịghị mmadụ ga-ahụ ihu [Chineke] ma dị ndụ.” (Ọpụ. 33:20) Ma, Jizọs kpara àgwà ka Chineke kparuo ya ala mgbe ọ bịara n’ụwa, ọ bụ ya mere o ji sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:7-9) Anyị, bụ́ ndị nọ n’ụwa na-efe Jehova, “ga-ahụ Chineke” site n’ịhụ ihe ọ na-emere anyị. (Job 42:5) Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-ahụ Chineke n’ụdị pụrụ iche mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha aghọọ ndị mmụọ, wee hụ Nna ha nke eluigwe ihu na ihu.—1 Jọn 3:2.

17. Olee ụdị mmadụ anyị ga-abụ ma ọ bụrụ na anyị dị ọcha n’obi?

17 Onye dị ọcha n’obi anaghị atụgharị ihe ndị na-adịghị ọcha n’anya Jehova n’uche ya, n’ihi na ọ naghị eme omume na-adịghị ọcha, ọ na-agbalịkwa ime ihe dị Jehova mma. (1 Ihe 28:9; Aịza. 52:11) Ọ bụrụ na anyị dị ọcha n’obi, ihe anyị na-ekwu na ihe anyị na-eme ga-adị ọcha, anyị agaghịkwa na-ejere Jehova ozi naanị iji mezuo iwu.

“Ndị Na-eme Udo” Bụ Ụmụ Chineke

18, 19. Olee otú “ndị na-eme udo” si akpa àgwà?

18 “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo, n’ihi na a ga-akpọ ha ‘ụmụ Chineke.’” (Mat. 5:9) Ihe e ji ama “ndị na-eme udo” bụ ihe ndị ha na-eme na ihe ndị ha na-anaghị eme. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị Jizọs kwuru okwu ha, anyị ga-abụ ndị na-eme udo, anyị ‘agaghịkwa eji ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.’ Kama nke ahụ, anyị ‘ga na-emere ndị ọzọ ihe ọma mgbe niile.’—1 Tesa. 5:15.

19 Okwu Grik a sụgharịrị “ndị na-eme udo” na Matiu 5:9 pụtara “ndị na-eme ka udo dị.” Ọ bụrụ na anyị chọrọ iso ná ndị na-eme udo, anyị ga na-emekwa ihe na-eweta udo. Ndị na-eme udo anaghị eme ihe ọ bụla ‘ga-ekewa ndị ha na ibe ha dị ná mma.’ (Ilu 16:28) Anyị na-agbalịsi ike ‘ịchụso udo n’ebe mmadụ niile nọ’ n’ihi na anyị bụ ndị na-eme udo.—Hib. 12:14.

20. Olee ndị bụ “ụmụ Chineke” ugbu a, oleekwa ndị ga-emecha ghọọ ụmụ Chineke?

20 Ndị na-eme udo na-enwe obi ụtọ n’ihi na “a ga-akpọ ha ‘ụmụ Chineke.’” Jehova anabatala Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ka ha bụrụ “ụmụ Chineke.” Ebe ha bụ ụmụ Jehova, ha na ya dị ná mma n’ihi na ha nwere okwukwe n’ebe Kraịst nọ, jikwara obi ha dum na-efe “Chineke nke ịhụnanya na nke udo.” (2 Kọr. 13:11; Jọn 1:12) Oleekwanụ maka “atụrụ ọzọ” Jizọs, bụ́ ndị na-eme udo? Jizọs ga-abụrụ ha “Nna Mgbe Ebighị Ebi” n’oge ọ ga-achị otu puku afọ. Ma, ya chịchaa, ọ ga-edo onwe ya n’okpuru Jehova, atụrụ ọzọ ga-aghọkwa ụmụ Chineke n’ụzọ zuru ezu.—Jọn 10:16; Aịza. 9:6; Rom 8:21; 1 Kọr. 15:27, 28.

21. Olee otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ma ọ bụrụ na anyị “na-adị ndụ site na mmụọ nsọ”?

21 Ọ bụrụ na anyị “na-adị ndụ site na mmụọ nsọ,” ọ gaghị esiri ndị ọzọ ike ịchọpụta na anyị bụ ndị na-eme udo. Anyị agaghị “na-akpali ịsọ mpi n’etiti onwe anyị” ma ọ bụ “na-achọrịta ibe anyị okwu.” (Gal. 5:22-26; nsụgharị Bible Nsọ nke Union Version) Kama nke ahụ, anyị na-agba mbọ ka anyị “na mmadụ niile dịrị n’udo.”—Rom 12:18.

Ndị Nwere Obi Ụtọ, n’Agbanyeghị na A Na-akpagbu Ha!

22-24. (a) Olee ihe mere ndị a na-akpagbu n’ihi ezi omume ji enwe obi ụtọ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu abụọ na-esonụ?

22 “Obi ụtọ na-adịrị ndị a kpagbuworo n’ihi ezi omume, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.” (Mat. 5:10) Jizọs kọwakwuru nke a, sị: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, na-aghagide unu ụgha, na-ekwukwa ụdị ihe ọjọọ niile megide unu n’ihi m. Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ obi ụtọ nke ukwuu, n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe; n’ihi na otú ahụ ka ha kpagburu ndị amụma bu unu ụzọ.”Mat. 5:11, 12.

23 Dị ka e mere ndị amụma Chineke n’oge ochie, Ndị Kraịst na-atụ anya na a ga-akọcha ha, kpagbuo ha, ghagidekwa ha ụgha “n’ihi ezi omume.” Ma, anyị na-enwe afọ ojuju na anyị na-asọpụrụ Jehova ma na-eme ihe dị ya mma ma ọ bụrụ na anyị ejiri ikwesị ntụkwasị obi na-edi mkpagbu ndị ahụ. (1 Pita 2:19-21) Mkpagbu a na-akpagbu anyị enweghị ike ime ka mmasị anyị nwere ife Jehova ugbu a ma ọ bụ n’ọdịnihu kwụsịlata. O nweghị ike ịkwụsịlata obi ụtọ ndị ga-eso Kraịst chịa n’Alaeze eluigwe na-enwe, o nweghịkwa ike ime ka ndị a ga-enye ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe Alaeze ahụ ga-amalite ịchị kwụsị inwe ọṅụ. Ngọzi ndị a na-egosi na Chineke nwere obiọma, nakwa na ọ na-egboro anyị mkpa anyị.

24 E nwekwara ihe ndị ọzọ anyị ga-amụta n’Ozizi Elu Ugwu ahụ. N’isiokwu abụọ na-esonụ, a tụlere ihe ndị a. Ka anyị hụ otú anyị ga-esi na-eme ihe ndị ahụ Jizọs Kraịst kwuru.

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• N’ihi gịnị ka “ndị maara mkpa ime mmụọ ha” ji enwe obi ụtọ?

• Gịnị mere “ndị dị nwayọọ n’obi” ji enwe obi ụtọ?

• Olee ihe mere Ndị Kraịst ji enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na a na-akpagbu ha?

• Olee nke kacha masị gị n’ime ihe ndị ahụ na-eme obi ụtọ Jizọs kwuru okwu ha?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 7]

Ihe itoolu ahụ na-eme obi ụtọ Jizọs kwuru okwu ha bara uru taa otú ha bara mgbe o kwuru ha

[Foto dị na peeji nke 8]

Ịkụziri ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl bụ ụzọ dị mma anyị si emere ha ebere