Otú Ndị Kraịst Si Eli Ozu Kwesịrị Ịdị Ùgwù, Dị Chineke Mma, O Kwesịghịkwa Ịgabiga Ókè
Otú Ndị Kraịst Si Eli Ozu Kwesịrị Ịdị Ùgwù, Dị Chineke Mma, O Kwesịghịkwa Ịgabiga Ókè
ONYE ọ bụla nọ na-ebe ákwá. Ndị onye ha nwụrụ eyiri akwa ojii na-atụ onwe ha n’ala, ha ekweghịkwa ka onye ọ bụla gụgụọ ha. Ụfọdụ ndị ana-agba egwú na-ada oké ụda. Ndị ọzọ ana-eri, na-aṅụ, na-enwe aṅụrị, na-achịsikwa ọchị ike. Mmanya ana-egbu ụfọdụ, bụ́ ndị ji mmanya ngwọ na biya juru ebe niile ṅụrachaa anya. Olee ihe a na-eme? N’ebe ụfọdụ n’ụwa, ọ bụ otú a ka e si eli ozu, bụ́ ebe ọtụtụ mmadụ na-abịa iji sị onye nwụrụ anwụ gaa nke ọma.
Ọtụtụ Ndịàmà Jehova bi n’ebe dị iche iche, bụ́ ebe ndị ikwu ha na ndị agbata obi ha kweere n’ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere ndị nwụrụ anwụ, na-atụkwa ha ụjọ. Ọtụtụ nde mmadụ kweere na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ na-aghọ mmụọ wee gakwuru ndị nna ochie nwụrụ anwụ, kwerekwa na o nwere ike inyere ndị dị ndụ aka ma ọ bụ merụọ ha ahụ́. Ọ bụ nkwenkwe a mere ndị mmadụ na-ejikarị eme omenala dị iche iche mgbe ha na-eli ozu. N’eziokwu, ibere onye nwụrụ anwụ ákwá abụghị ihe ọjọọ. O nwere mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya beere ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ákwá. (Jọn 11:33-35, 38; Ọrụ 8:2; 9:39) Ma, ọ dịghị mgbe ha ruru uju otú ndị ọzọ bi n’oge ahụ si eru uju. (Luk 23:27, 28; 1 Tesa. 4:13) Gịnị mere ha emeghị otú ahụ? Otu n’ime ihe mere ya bụ na ha ma ihe bụ́ eziokwu banyere ọnwụ.
Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị . . . Ịhụnanya ha na ịkpọasị ha na ekworo ha alaworị n’iyi . . . Ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol [ya bụ, ili nkịtị nke ndị mmadụ], ebe ị na-aga.” (Ekli. 9:5, 6, 10) Amaokwu ndị a dị na Baịbụl e ji ike mmụọ nsọ dee mere ka o doo anya na mmadụ anaghị ama ihe ọ bụla mgbe ọ nwụrụ. Ọ naghị enwe ike iche echiche, inwe mmetụta, ikwu okwu, ma ọ bụ ịghọta ihe ọ bụla. Olee otú ịmara eziokwu ndị a dị mkpa dị na Baịbụl ga-esi emetụta otú Ndị Kraịst si eli ozu?
‘Kwụsịnụ Imetụ Ihe Na-adịghị Ọcha Aka’
N’agbanyeghị agbụrụ Ndịàmà Jehova ma ọ bụ omenala a na-eme n’ebe ha bi, ha anaghị etinye aka n’omenala ọ bụla a na-eme nke na-akwado na ndị nwụrụ anwụ ma ihe nakwa na ha nwere ike imerụ ndị dị ndụ ahụ́ ma ọ bụ nyere ha aka. Omenala ndị dị ka ịmụrụ onye nwụrụ anwụ anya abalị, ịkwa ozu, ememme e ji echeta ndị nwụrụ anwụ, ịchụrụ ndị nwụrụ anwụ àjà, na ịgba mkpe, ekwesịghị ekwesị. Ha anaghịkwa amasị Chineke n’ihi na ihe ndị mmadụ ji eme ha bụ maka ozizi ndị mmụọ ọjọọ nke na-adịghị na Baịbụl, nke bụ́ na mkpụrụ obi mmadụ ma ọ bụ mmụọ ya anaghị anwụ anwụ. (Ezik. 18:4) Ezigbo Ndị Kraịst “apụghị ịdị na-eri na ‘tebụl Jehova’ na-erikwa na tebụl ndị mmụọ ọjọọ,” n’ihi ya, ha anaghị eme omenala ndị ahụ. (1 Kọr. 10:21) Ha na-erube isi n’iwu ahụ bụ́: “Kewapụnụ onwe unu, . . . kwụsịkwanụ imetụ ihe na-adịghị ọcha aka.” (2 Kọr. 6:17) Ma, mmadụ ikewapụ onwe ya n’omenala ndị ahụ anaghị adịcha mfe.
N’Africa nakwa n’ebe ndị ọzọ, ọtụtụ ndị kweere na ọ bụrụ na e meghị omenala ndị ahụ, na a ga-akpasu ndị nna ochie nwụrụ anwụ iwe. A na-ele onye na-emeghị ihe ndị a anya dị ka onye merụrụ ala, nakwa na ihe o mere nwere ike iweta ọdachi n’obodo. Obodo dị iche iche na ndị ikwu Ndịàmà Jehova na-akatọ ha, na-akparị ha ma na-amachibido ha iwu n’ihi na ha anaghị eme omenala ndị na-adịghị n’Akwụkwọ
Nsọ ma ha na-eli ozu. A na-ekwu na ụfọdụ n’ime ha anaghị eso ndị ọzọ emekọrịta ihe nakwa na ha anaghị akwanyere ndị nwụrụ anwụ ùgwù. Mgbe ụfọdụ, ndị na-ekweghị ekwe na-esi ọnwụ na ọ bụ ha ga-eme ndokwa otú a ga-esi lie Onye Kraịst. N’ihi ya, olee ihe anyị ga-eme ka anyị na ndị ahụ kwenyesiri ike n’omenala ndị ahụ na-anaghị amasị Chineke ghara ise okwu? Nke ka nke, olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara itinye aka n’omenala ndị ahụ na-adịghị ọcha nakwa n’ihe ndị nwere ike imebi mmekọrịta anyị na Jehova?Mee Ka A Mara Ihe Ị Chọrọ
N’ebe ụfọdụ n’ụwa, ọ bụ ndị okenye nọ n’obodo onye ahụ nwụrụ anwụ na ndị ikwu ya ga-eso ekpebi otú a ga-esi lie ya. N’ihi ya, Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ga-emerịrị ka o doo anya na ọ bụ Ndịàmà Jehova ga-ahazi otú a ga-esi lie ya ma ya nwụọ, nakwa na ọ bụ ha ga-eli ya, meekwa ka ihe metụtara olili ya kwekọọ na Baịbụl. (2 Kọr. 6:14-16) Mgbe a na-eli Onye Kraịst, e kwesịghị ime ihe ga-enye akọnuche ụmụnna anyị nsogbu ma ọ bụ mee ka ndị ọzọ ma ihe anyị kweere na ihe anyị na-akụzi banyere ndị nwụrụ anwụ sụọ ngọngọ.
Ọ bụrụ na a gwa onye nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ka o kwuo okwu olili ozu, ndị okenye ga-atụrụ ezinụlọ ahụ onye ha nwụrụ aro dị iche iche ma mee ka ha ghọta ihe ndị dị na Baịbụl, bụ́ ndị metụtara olili ozu. Nke a ga-eme ka ihe niile a ga-eme banyere olili ozu ahụ kwekọọ n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na ụfọdụ ndị na-abụghị Ndịàmà achọọ ka e mee ihe megidere ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-adị mma ka Ndị Kraịst kwụsie ike ma jiri obi ike kọwaara ha ihe Ndị Kraịst kweere. Ha ga-ejikwa obiọma na nkwanye ùgwù mee nke ahụ. (1 Pita 3:15) Gịnị ka a ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ikwu mmadụ, bụ́ ndị na-abụghị Ndị Kraịst, ekwuo na a ga-emerịrị omenala ndị ahụ? Ndị Kraịst nọ n’ezinụlọ ahụ ga-ewepụ aka n’olili ozu ahụ. (1 Kọr. 10:20) Ọ bụrụ na ha emee nke a, e nwere ike ikwu okwu olili ozu dị nkenke n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’ebe ọzọ kwesịrị ekwesị ka e wee jiri okwu “nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ” kasie ndị ahụ na-eru uju ọnwụ nke onye ha hụrụ n’anya obi. (Rom 15:4) N’agbanyeghị na e buteghị ozu ahụ n’ebe ahụ, e kwesịrị ikwu okwu ahụ n’ụzọ dị ùgwù ma kwesị ekwesị. (Diut. 34:5, 6, 8) Ihe na-adịghị mma ndị na-abụghị Ndị Kraịst chọrọ ka e mee nwere ike ime ka nchegbu anyị na-enwe na uju anyị na-eru n’oge onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ ka njọ, ma ịmara na Chineke, bụ́ onye na-enye “ike karịrị ike nkịtị,” agaghị echefu mkpebi anyị mere iji hụ na e mere ihe dị mma ga-akasi anyị obi.—2 Kọr. 4:7.
Dee Ihe Ị Chọrọ Ka E Mee n’Akwụkwọ
Ọ bụrụ na mmadụ eburu ụzọ dee otú ọ chọrọ ka e si lie ya n’akwụkwọ, ọ ga-eme ka ọ dịrị ndị na-abụghị Ndịàmà nọ n’ezinụlọ ya mfe ịkwado ihe ụmụnna chọrọ ime, ebe ọ bụ na ha anaghị achọ ịgbagha ihe mmadụ kwuru tupu ya anwụọ. Otú a ga-esi lie mmadụ, ebe a ga-eli ya, na onye ga-ekpebi ihe niile a ga-eme mgbe a na-eli ya ma hụ na e mere ha, bụ ihe ndị dị mkpa e kwesịrị ide n’akwụkwọ. (Jen. ) A na-aka akwanyere ihe e dere n’akwụkwọ ùgwù ma ọ bụrụ na onye dere ya na ndị ọzọ bịanyere aka na ya. Ndị ji ihe ndị ha na-amụta na Baịbụl na-eme atụmatụ maka ọdịnihu, ma na ha ekwesịghị ichere ruo mgbe ha mere okenye ma ọ bụ mgbe ha dara ọrịa ha na-agaghị agbake agbake tupu ha emee ihe ndị a.— 50:5Ilu 22:3; Ekli. 9:12.
Obi anaghị ekwe ụfọdụ ndị dee ihe ndị dị otú ahụ n’akwụkwọ. Ma, ime otú ahụ na-egosi na onye ahụ bụ Onye Kraịst tozuru okè na onye na-achọ ọdịmma ndị ọzọ. (Fil. 2:4) Ọ ka mma ka mmadụ jiri aka ya kpebie ihe ndị a kama ịhapụrụ ya ndị ezinụlọ ya na-eru uju, bụ́ ndị e nwere ike ịmanye ime ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị ndị onye ahụ nwụrụ anwụ na-ekweghị na ha ma ọ bụ na-akwadoghị mgbe ọ nọ ndụ.
Mee ka Olili Ozu Bụrụ nke E Meruru n’Ókè
N’ọtụtụ ebe n’Africa, ọtụtụ ndị kweere na e kwesịrị ime nnukwu ememme mgbe a na-eli ozu ka ndị nna ochie nwụrụ anwụ wee ghara iwe iwe. Ndị ọzọ na-eji ememme olili ozu ‘egosi ihe ha ji biri,’ ya bụ, ha ji ya egosi na ha so ná ndị ọnụ na-eru n’okwu nakwa na ha bụ aka ji akụ̀. (1 Jọn 2:16) Ha na-ewepụta oge buru ibu na nnukwu ego, gbasiekwa mbọ ike ka e wee sị na ha liziri onye ahụ elizi. Iji mee ka ọtụtụ mmadụ bịa olili ozu ahụ, ha na-amapawa foto onye ahụ nwụrụ anwụ n’ebe dị iche iche, si otú ahụ na-akpọsa olili ozu ahụ. Ha na-ebi foto onye ahụ nwụrụ anwụ n’uwe ma chịnye ha ndị na-eruru onye ahụ uju. Ha na-azụ igbe ozu a chọrọ oké mma, nke dakwara oké ọnụ, ka ndị mmadụ wee jaa ha mma. N’otu mba dị n’Africa, ụfọdụ na-arụdị igbe ozu yiri ụgbọala, ụgbọelu, ụgbọ mmiri, na ihe ndị ọzọ iji gosi na onye ahụ nwụrụ anwụ bụ aka ji akụ̀ na onye ọnụ na-eru n’okwu. E nwere ike ibupụta ozu onye ahụ n’igbe ma dọwa ya n’àkwà a chọrọ oké mma. Ọ bụrụ na ọ bụ nwaanyị nwụrụ, a na-eyiwe ya uwe agbamakwụkwọ na-acha ọcha, yiwe ya ihe olu na ihe ntị dara oké ọnụ ma tee ya ihe otite dị iche iche. Ndị Chineke hà kwesịrị ime ihe ndị dị otú a?
Ndị Kraịst tozuru okè ma na ha ekwesịghị itinye aka n’ihe ndị na-amaghị Chineke na-eme. Anyị ma na imebiga ihe ókè na omenala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị ‘esighị n’ebe Chineke nọ, kama ha si n’ụwa nke na-agabiga agabiga.’ (1 Jọn 2:15-17) Anyị aghaghị ịkpachara ezigbo anya ka anyị ghara inwe mmụọ ịsọ mpi, bụ́ àgwà Ndị Kraịst na-ekwesịghị inwe, nke bụ́ igosi ndị ọzọ na anyị ka ha. (Gal. 5:26) Ihe ndị na-eme eme na-egosi na ihe na-emekarị ka ndị mmadụ na-eme oké ememme ili ozu nke ga-esiri ha ike ịchịkwa bụ n’ihi na ha na-atụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ nakwa n’ihi na ha chọrọ igosi na ha so ná ndị ọnụ na-eru n’okwu. Ndị na-abụghị Ndị Kraịst nwere ike ịnọ ebe ha na-akwanyere onye nwụrụ anwụ ùgwù mewe omume rụrụ arụ. N’oge olili ozu ndị dị otú ahụ, ndị mmadụ nwere ike na-eti mkpu ákwá, na-ejide ozu ahụ aka, na-agwa ya okwu ka ọ̀ ka dị ndụ, na-atụsa ya ego na ihe ndị ọzọ. Ọ bụrụ na e mee ihe ndị dị otú a n’ebe Ndị Kraịst na-eli ozu, ọ ga-ewetara aha Jehova na ndị ya nkọcha dị ukwuu.—1 Pita 1:14-16.
Ọmụma anyị ma na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla kwesịrị ime ka anyị jiri obi ike ghara ime ka ndị ụwa mgbe anyị na-eli ozu. (Efe. 4:17-19) N’agbanyeghị na Jizọs kacha mmadụ niile ukwuu, e meghị ememme ọ bụla mgbe e liri ya. (Jọn 19:40-42) Ndị nwere “uche nke Kraịst” anaghị ele ụdị olili ozu a anya ka ihe ihere. (1 Kọr. 2:16) N’ezie, ọ bụrụ na Ndị Kraịst ezere imebiga ihe ókè mgbe ha na-eli ozu, ọ ga-eme ka ha ghara ime ihe ọ bụla Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, meekwa ka ihe gaa nke ọma nakwa n’usoro, bụ́ otú ndị hụrụ Chineke n’anya kwesịrị isi na-eme ihe.
È Kwesịrị Ịna-aṅụrị Ọṅụ Mgbe A Na-eli Ozu?
O nwere ike ịbụ omenala na mgbe e lichara ozu, ndị ikwu, ndị enyi, ndị agbata obi, na ndị ọzọ na-agbakọ ka ha wee rie, ṅụọ ma gbaa egwú mgbe egwú na-ada oké ụda na-akụ. Ndị mmadụ na-aṅụbigakarị mmanya ókè, na-emekwa omume rụrụ arụ mgbe ha na-eme ememme olili ozu. Ụfọdụ ndị na-ekwu na oriri na nkwari ahụ na-eme ka ọnwụ onye ahụ ghara iwute ndị mmadụ gabiga ókè. Ụfọdụ na-ekwu na nke a bụ omenala ha. Ma, ọtụtụ ndị kweere na e kwesịrị ime ememme dị otú ahụ iji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ùgwù na iji too ha nakwa iji mee ka mkpụrụ obi nke onye ahụ nwụrụ anwụ nwee ike ịgakwuru ndị nna ya ochie.
Ezigbo Ndị Kraịst achọpụtala na amamihe dị na ndụmọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ, nke sịrị: “Inwe mwute dị mma karịa ịchị ọchị, n’ihi na site n’inwe mgbarụ ihu, obi na-adị mmadụ mma karị.” (Ekli. 7:3) Ha makwa na mmadụ ịnọrọ jụụ chebara ndụ a dị mkpụmkpụ na olileanya nke mbilite n’ọnwụ echiche bara uru. N’eziokwu, ndị ha na Jehova dị ná mma ma na ‘ụbọchị ọnwụ mmadụ dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.’ (Ekli. 7:1) N’ihi ya, ịmara na ime oriri na nkwari mgbe a na-eli ozu nwere ihe jikọrọ ya na ndị mmụọ ọjọọ nakwa na ndị mmadụ na-anọ ebe ahụ eme omume rụrụ arụ, bụ ihe mere ezigbo Ndị Kraịst ekwesịghị ime ememme dị otú ahụ ma ọ bụ gaa n’ebe a na-eme ya. Ọ bụrụ na anyị anọrọ n’ebe a na-eri oriri oké mkpọtụ mgbe a na-eme ememme ili ozu, ọ na-egosi na anyị anaghị akwanyere Chineke ùgwù, gosikwa na anyị achọghị ịma ma ihe anyị na-eme ọ̀ ga-eme ka ụmụnna anyị sụọ ngọngọ.
Mee Ka Ndị Ọzọ Hụ na O Nwere Ihe Dị Iche
Obi dị anyị ụtọ na anyị anaghị atụ ụjọ na-enweghị isi nke ndị na-amaghị eziokwu na-atụ ndị nwụrụ anwụ! (Jọn 8:32) Ebe ọ bụ na anyị bụ “ụmụ nke ìhè,” anyị na-eru uju n’ụzọ na-egosi na anyị ma ihe dị n’Okwu Chineke. Anyị ga-egosikwa na anyị anaghị emebiga ihe ókè, na anyị na-akwanyere Chineke ùgwù, nakwa na anyị nwere olileanya na ndị nwụrụ anwụ ga-ebilite n’ọnwụ. (Efe. 5:8; Jọn 5:28, 29) Olileanya dị otú a na-eme ka anyị ghara irubiga uju ókè ka ndị “na-enweghị olileanya.” (1 Tesa. 4:13) Nke a ga-eme ka anyị ghara ime ihe ga-ewute Chineke anyị na-efe, meekwa ka anyị ghara ịtụ mmadụ egwu.—1 Pita 3:13, 14.
Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, ọ ga-eme ka ndị mmadụ ‘hụ ihe dị iche n’etiti ndị na-ejere Chineke ozi na ndị na-adịghị ejere ya ozi.’ (Mal. 3:18) Otu ụbọchị, ọnwụ agaghịkwa adị ọzọ. (Mkpu. 21:4) Tupu Jehova emeere anyị nkwa a magburu onwe ya o kwere, ka anyị bụrụ ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-enweghị mmerụ n’anya Jehova, ka anyị kewapụkwa onwe anyị kpamkpam n’ụwa ọjọọ a ma ghara itinye aka n’omenala ndị na-anaghị amasị Chineke.—2 Pita 3:14.
[Foto dị na peeji nke 30]
Ọ dị mma ka anyị dee otú anyị chọrọ ka e si lie anyị n’akwụkwọ
[Foto dị na peeji nke 31]
Otú Ndị Kraịst si eli ozu kwesịrị ịdị ùgwù n’anya Chineke, o kwesịghịkwa ịgabiga ókè