Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ‘akwụkwọ Jesha’ na ‘akwụkwọ Agha Jehova.’ (Jọsh. 10:13; Ọnụ Ọgụ. 21:14) Akwụkwọ abụọ a esoghị n’akwụkwọ ndị e kweere na ha so na Baịbụl. Akwụkwọ abụọ a hà sitere n’ike mmụọ nsọ ma mechaa fuo?

Ọ dịghị ihe na-egosi na akwụkwọ abụọ a sitere n’ike mmụọ nsọ ma fuo ka oge na-aga. Ndị dere Baịbụl site n’ike mmụọ nsọ kpọrọ akwụkwọ ole na ole ndị ọzọ aha. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike iso na Baịbụl, kama a kpọrọ ha aha dị iche n’aha anyị ji mara ha ugbu a. Dị ka ihe atụ, 1 Ihe E Mere 29:29 kwuru banyere ‘okwu Samuel onye ọhụ ụzọ,’ ‘okwu Netan onye amụma’ nakwa ‘okwu Gad onye ọhụụ.’ O nwere ike ịbụ na akwụkwọ atọ a bụ akwụkwọ Baịbụl ndị anyị ma ugbu a dị ka Samuel nke Mbụ na Samuel nke Abụọ, ma ọ bụkwanụ Ndị Ikpe.

N’aka nke ọzọ, ụfọdụ akwụkwọ ndị e kwuru okwu ha nwere ike ịbụ akwụkwọ ndị na-adịghị na Baịbụl ma aha ha yiri aha akwụkwọ ndị dị na Baịbụl. Ka anyị were akwụkwọ anọ e nwere n’oge ochie mee ihe atụ: ‘akwụkwọ ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda,’ ‘Akwụkwọ Ndị Eze Juda na Izrel,’ ‘Akwụkwọ Ndị Eze Izrel,’ na ‘Akwụkwọ Ndị Eze Izrel na Juda.’ Ọ bụ ezie na aha akwụkwọ ndị a yiri aha akwụkwọ ndị dị na Baịbụl anyị maara dị ka Ndị Eze nke Mbụ na Ndị Eze nke Abụọ, ma akwụkwọ anọ a esighị n’ike mmụọ nsọ, ha esoghịkwa n’akwụkwọ ndị e kweere na ha so na Baịbụl. (1 Eze 14:29; 2 Ihe 16:11; 20:34; 27:7) Ọ ga-abụ na ha bụ naanị ebe e dere akụkọ ihe mere eme, nke e nwere mgbe Jeremaya onye amụma na Ezra na-ede ihe ndị ha dere na Baịbụl.

N’eziokwu, ụfọdụ ndị so dee Baịbụl kpọrọ aha akwụkwọ ndị na-esighị n’ike mmụọ nsọ e nwere n’oge ha, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ihe ụfọdụ ha dere si n’akwụkwọ ndị ahụ. Esta 10:2 kwuru banyere ‘Akwụkwọ ihe ndị mere n’oge ndị eze Midia na Peshia.’ N’otu aka ahụ, tupu Luk amalite ide Oziọma ya, o si “ná mmalite nyochaa ihe niile n’ụzọ ziri ezi.” Ọ ga-abụ na ihe ọ na-ekwu bụ na tupu ya edee osusu ọmụmụ Jizọs n’Oziọma ya, na ya nyochara akwụkwọ ndị ọzọ e dere osusu ọmụmụ Jizọs. (Luk 1:3; 3:23-38) Ọ bụ ezie na akwụkwọ ndị Luk si na ha nweta ihe o dere esighị n’ike mmụọ nsọ, Oziọma o dere ihe ndị a o nwetara si n’ike mmụọ nsọ. Oziọma ahụ ka bakwaara anyị uru.

Ka anyị lọghachi n’akwụkwọ abụọ ahụ e kwuru okwu ha n’ajụjụ dị n’elu, ya bụ, ‘akwụkwọ Jesha na ‘akwụkwọ Agha Jehova.’ Ọ dị ka ha bụ akwụkwọ dị n’oge ahụ, bụ́ ndị na-esighị n’ike mmụọ nsọ. Ọ bụ ya mere Jehova echebeghị ha. Okwukwu Baịbụl kwuru banyere akwụkwọ abụọ ahụ mere ka ndị ọkà mmụta Baịbụl kwuo na ha bụ ebe e dere uri ma ọ bụ abụ ndị na-ekwu banyere agha dị iche iche ụmụ Izrel na ndị iro ha lụrụ. (2 Sam. 1:17-27) Otu akwụkwọ nke na-akọwa Baịbụl kwuru na ihe ndị dị n’akwụkwọ ndị ahụ ga-abụ “uri na abụ ndị mmadụ maara nke ọma, bụ́ ndị ndị ọrụ ha n’Izrel oge ochie bụ ịgụ egwú chebere.” Ọbụna ụfọdụ ndị amụma Chineke ma ọ bụ ndị ọhụụ dere ihe ndị na-esighị n’ike mmụọ nsọ ma ọ bụ ihe Jehova na-achọghị ka ha dịrị n’Akwụkwọ Nsọ nke “bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie” n’oge anyị a.—2 Tim. 3:16; 2 Ihe 9:29; 12:15; 13:22.

Na e nwere akwụkwọ ndị a kpọrọ aha na Baịbụl, nweekwa ndị e si na ha nweta ihe ụfọdụ e dere na Baịbụl, ekwesịghị ime ka anyị chee na ha si n’ike mmụọ nsọ. Ma, Jehova bụ́ Chineke chebere ihe niile e dere ede, bụ́ ndị “okwu Chineke anyị” dị na ha, ha “ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịza. 40:8) N’eziokwu, ihe Jehova mere ka ha dịrị n’akwụkwọ iri isii na isii dị na Baịbụl bụ ihe dị anyị mkpa iji ‘ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.’—2 Tim. 3:16, 17.