Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Kwesịrị Ka Anyị Niile Na-eto Ya

Jehova Kwesịrị Ka Anyị Niile Na-eto Ya

Jehova Kwesịrị Ka Anyị Niile Na-eto Ya

“Toonụ Jaa!”—ỌMA 111:1.

1, 2. Gịnị ka “Haleluja” pụtara, oleekwa otú e si dee ya n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst?

“HALELUJA!” A na-anụkarị okwu a n’okpukpe ndị Krisendọm. Ndị ụfọdụ na-ekwu ya kwa ụbọchị ma ọ bụrụ na ha na ndị ọzọ na-akparịta ụka. Ma, ọ bụ mmadụ ole na ole ma ihe okwu a dị nsọ pụtara. Otú ọtụtụ ndị na-ekwu ya si ebi ndụ na-egosi na ha anaghị asọpụrụ Chineke. (Taị. 1:16) Otu akwụkwọ nke na-akọwa Baịbụl kwuru na “Haleluja” bụ “okwu ndị dere abụ ọma ji akpọ mmadụ niile òkù ka ha soro ha too Jehova.” N’ezie, ọtụtụ ndị ọkà mmụta Baịbụl kwuru na “Haleluja” pụtara “‘Toonụ Jaa,’ [ya bụ] Jehova.”

2 Ọ bụ ya mere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ji sụgharịa okwu dị n’Abụ Ọma 111:1 ka ọ bụrụ “Toonụ Jaa!” Mgbe ndị nọ n’eluigwe na-aṅụrị ọṅụ n’ihi mbibi a ga-ebibi okpukpe ụgha, ha kwuru okwu Grik ya na ya pụtara otu ihe ugboro anọ ná Mkpughe 19:1-6. Mgbe nke a ga-eme, ndị na-efe Jehova ga-enwe ihe pụrụ iche mere ha ga-eji jiri nkwanye ùgwù na-ekwu “Haleluja.”

Ọrụ Ukwu Dị Iche Iche Ọ Rụrụ

3. Gịnị bụ isi ihe mere anyị ji enwe nzukọ mgbe niile?

3 Onye dere Abụ Ọma 111 kwuru ọtụtụ ihe mere Jehova ji kwesị ka anyị niile na-eto ya. Amaokwu nke mbụ kwuru, sị “M ga-eji obi m dum too Jehova n’etiti ìgwè ndị na-akpachi anya bụ́ ndị ziri ezi nakwa n’ime nzukọ ha.” Taa, Ndịàmà Jehova na-ekwu otu ihe a. Isi ihe mere anyị ji enwe nzukọ mgbe niile, ma n’ọgbakọ anyị ma ná mgbakọ dị iche iche, bụ ito Jehova.

4. Olee otú ndị mmadụ ga-esi echebara ọrụ Jehova echiche?

4 “Ọrụ Jehova dị ukwuu, ndị niile ọ na-atọ ụtọ na-echebara ya echiche.” (Ọma 111:2) Hụwa okwu ahụ bụ́ “na-echebara ya echiche” ama. Otu akwụkwọ kwuru na amaokwu a nwere ike ịna-ekwu banyere ndị ‘na-agba mbọ ịchọpụta ihe ọrụ Chineke bụ ma na-echebara ya echiche nke ọma.’ O nwere ezigbo ihe mere Jehova ji kee ihe dị iche iche. O mere ka anyanwụ, ụwa, na ọnwa dịrị n’ebe ha kwesịrị ịdị, ọ dịghị nke na-akpatara ibe ya nsogbu. Nke a mere ka ụwa nwee okpomọkụ na ìhè, ehihie na abalị, udu mmiri na ọkọchị, oge osimiri ji eto na oge o ji ata.

5. Gịnị ka a chọpụtarala n’ihi nghọta mmadụ ghọtakwuru eluigwe na ala?

5 Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtala otú ụwa si dịrị anya n’anyanwụ, ha achọpụtakwala ọtụtụ ihe banyere otú ọnwa anyị hà na otú magburu onwe ya o si agba ụwa gburugburu. Otú e si hazie ihe ndị a dị n’eluigwe na otú ha si arụkọ ọrụ na-eme ka anyị na-enwe udu mmiri, ọkọchị, na ụgụrụ. A chọpụtakwala ọtụtụ ihe banyere ihe mere o ji abụ a tụlie ihe elu ya adaara onwe ya, nakwa banyere ikike ndị ọzọ. N’ihi ya, otu ọkachamara n’ọrụ injinia kwuru n’isiokwu ọ kpọrọ “The Designed ‘Just So’ Universe,” [ya bụ, “Eluigwe na Ala E Keziri Ekezi”], sị: ‘Ọ dị nnọọ mfe ịghọta ihe mere ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị jirila gbanwee obi ha kemgbe iri afọ atọ gara aga. Ha ekwetala na o siri ezigbo ike mmadụ ikwere na eluigwe na ala malitere n’onwe ha n’enweghị onye kere ha. Ka anyị na-aghọtakwu banyere ụwa e keziri ekezi ka anyị na-ahụ nnukwu ihe àmà na-egosi na ọ bụ onye nwere ọgụgụ isi kere ya.’

6. Olee otú otú Chineke si kee mmadụ dị gị n’obi?

6 Ihe ọzọ dị ịtụnanya n’ihe ndị e kere eke bụ otú Chineke si kee anyị. (Ọma 139:14) Mgbe Chineke kere mmadụ, o nyere ya uche na ahụ́ na ihe ndị dị na ya, bụ́ ndị dị mkpa maka ndụ, nyekwa ya ike ọ ga-eji na-arụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, Chineke rụrụ ọrụ ebube dị egwu n’otú o si mee ka mmadụ na-ekwu okwu, na-anụ ihe, nakwa n’otú o si mee ka anyị na-ede ihe na-agụkwa ihe. Ọtụtụ ndị nwere ikike ime ihe ndị a. I nwekwara ihe ọzọ e kere nke ọma, ya bụ, ahụ́ gị, nke e kere ka ọ na-eguzo kwem. Otú e si kee ahụ́ gị na otú i si eguzo kwem, otú ihe niile dị n’ahụ́ gị si arụ ọrụ na otú ahụ́ gị si eme ka ihe i riri nye gị ume ịrụ ọrụ, dị ịtụnanya. O nweghịkwa ihe ndị ọkà mmụta sayensị rụpụtarala nke e nwere ike iji tụnyere otú ụbụrụ gị si arụ ọrụ nke na-eme ka ị na-eche echiche nke ọma. N’ezie, ihe na-enyere ụmụ mmadụ aka ịrụpụta ihe ọ bụla bụ echiche na ụbụrụ Chineke nyere ha. Ọ dịghị Injinia a zụrụ nke ọma nke nwere ike ịrụpụta ihe dị mma ma baa uru ka ihe ihe iri ahụ dị ebube, ya bụ, mkpịsị aka gị iri, nwere ike ime. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ò nwere otú a gaara esi rụpụta ihe ndị mara mma ma ọ bụ wuo ihe ọ bụla ma a sị na Chineke enyeghị anyị mkpịsị aka?’

Ọrụ Dị Ukwuu Jehova Rụrụ na Àgwà Ya

7. Gịnị mere anyị ji kwesị ile Baịbụl anya dị ka otu n’ime ọrụ ndị dị ukwuu Chineke rụrụla?

7 Ọrụ dị ukwuu Jehova rụrụ gụnyere ihe ndị ọzọ magburu onwe ha o meere ụmụ mmadụ, bụ́ ndị e kwuru okwu ha na Baịbụl. Baịbụl n’onwe ya bụ ọrụ dị ukwuu Jehova rụrụ n’ihi otú akwụkwọ dị iche iche dị na ya si kwekọrịta n’ibe ha. Ọ dịghị ka akwụkwọ ndị ọzọ, n’ezie o si “n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe.” (2 Tim. 3:16) Dị ka ihe atụ, akwụkwọ mbụ dị na Baịbụl, bụ́ Jenesis, kwuru otú Chineke si kpochapụ ajọ omume n’ụwa n’oge Noa. Akwụkwọ nke abụọ, bụ́ Ọpụpụ, gosiri otú Jehova si mee ka a mara na ya bụ Chineke site n’ịnapụta ụmụ Izrel n’aka ndị Ijipt ji ha mere ndị ohu. Ọ ga-abụ na ọbụ abụ a bu ihe ndị a n’obi mgbe o dere, sị: “Ọrụ [Jehova] dị ebube, maakwa mma, ezi omume ya na-adịrukwa mgbe ebighị ebi. O mewo ihe a ga-eji na-echeta ọrụ ya dị ebube. Jehova na-eme amara, na-emekwa ebere.” (Ọma 111:3, 4) Ọ̀ bụ na i kweghị na ọrụ dị iche iche Jehova na-arụ kemgbe ụwa, tinyere ihe ndị ọ na-eme n’oge a, bụ ihe ndị a ga-eji na-echeta na ọ “dị ebube, maakwa mma”?

8, 9. (a) Olee ụzọ dị iche iche ọrụ Chineke si dị iche n’ọtụtụ ọrụ ụmụ mmadụ na-arụ? (b) Olee ụfọdụ n’ime àgwà Chineke ndị masịrị gị?

8 Cheta na ọbụ abụ ahụ kwuru okwu banyere àgwà Jehova ndị mara mma, ndị dị ka ezi omume, amara, na ebere. O doro anya na mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ anaghị eme ezi omume. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ anyaukwu, anyaụfụ, na mpako na-eme ka ha ghara ime ezi omume. Ihe na-egosi na nke a bụ eziokwu bụ ajọ ngwá agha ndị mmadụ na-emepụta iji lụọ agha ndị ha na-akpata na iji nweta ego. Ihe ndị a na-ewetara ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha nnukwu nhụsianya. Ihe ọzọ bụ na a na-emegbu ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha site n’ịmanye ha ịrụ ọtụtụ ihe. Ọtụtụ ndị nwere ike icheta otú e si jiri ndị ohu wuo ọtụtụ pyramid. Ọ bụ na pyramid ndị a ka e liri Fero dị iche iche, bụ́ ndị dị mpako. Ọ bụghị naanị na e ji ọtụtụ ihe a na-arụ n’oge a emegbu ndị ọzọ, kama, e ji ha “na-ebibi ụwa.”—Gụọ Mkpughe 11:18.

9 Nke a adịghị ka ọrụ Jehova, bụ́ onye na-arụ ihe ziri ezi mgbe niile. Ọrụ ya gụnyere ebere o meere ụmụ mmadụ na-eme mmehie wee mee ndokwa ịzọpụta ha. Chineke ‘gosiri ezi omume nke ya’ mgbe o nyere ihe mgbapụta ahụ. (Rom 3:25, 26) N’ezie, ‘ezi omume ya na-adịru mgbe ebighị ebi’! Otú Chineke si jiri ndidi na-emeso ụmụ mmadụ na-eme mmehie na-egosi na ọ na-eme amara. Mgbe ụfọdụ, ọ na-arịọ ha “biko” ma ya na-agwa ha ka ha hapụ ime ihe ọjọọ, kama ka ha malite ime ihe ziri ezi.—Gụọ Ezikiel 18:25.

Ọ Na-eme Ihe Ndị O Kwere ná Nkwa

10. Olee otú Jehova si gosi na ya kwụsiri ike n’ọgbụgba ndụ ya na Ebreham gbara?

10 “Ọ na-enye ndị na-atụ egwu ya ihe oriri. Ọ ga na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọma 111:5) O yiri ka ihe ọbụ abụ a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ọgbụgba ndụ ahụ Ebreham na Chineke gbara. Jehova kwere nkwa na ya ga-agọzi mkpụrụ Ebreham nakwa na ha ga-enweta ọnụ ụzọ ámá ndị iro ha. (Jen. 22:17, 18; Ọma 105:8, 9) Mgbe mbụ nkwa ndị a mezuru bụ mgbe mkpụrụ Ebreham ghọrọ mba Izrel. Ha gbaara ndị Ijipt ohu ọtụtụ afọ, ma, ‘Chineke chetara ọgbụgba ndụ ya na Ebreham’ wee napụta ha. (Ọpụ. 2:24) Otú Jehova si meso ha ihe ka oge na-aga gosiri na ọ na-enye ndị ya ihe ndị na-akpa ha. O nyere ha nri ime mmụọ na nke anụ ahụ́. (Diut. 6:1-3; 8:4; Nehe. 9:21) Ka oge na-aga, ha nupụụrụ Chineke isi ọtụtụ mgbe n’agbanyeghị na ọ nọ na-ezigara ha ndị amụma iji gwa ha ka ha lọghachikwute ya. Mgbe ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ ise Chineke napụtara ụmụ Izrel n’Ijipt gafere, o zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ka ọ bịa n’ụwa. Ọtụtụ n’ime ndị Juu jụrụ Jizọs ma kwere ka e gbuo ya. Nke ahụ mere ka Jehova mee ka e nwee mba ọhụrụ, ya bụ, mba ime mmụọ, bụ́ “Izrel nke Chineke.” Mba ahụ na Kraịst bụ mkpụrụ ime mmụọ nke Ebreham, bụ́ nke ahụ Jehova buru amụma na ya ga-eji gọzie ụmụ mmadụ.—Gal. 3:16, 29; 6:16.

11. Olee otú Jehova si “na-echeta ọgbụgba ndụ” ya na Ebreham?

11 Jehova “na-echeta ọgbụgba ndụ ya” na ngọzi ndị o kwere nkwa na ọgbụgba ndụ ahụ ga-eweta. Taa, ọ na-enye ndị ohu ya nri ime mmụọ n’ụba n’ihe karịrị narị asụsụ anọ. Ọ na-azakwa ekpere anyị na-ekpeku ya ka o nye anyị ihe na-akpa anyị, bụ́ nke kwekọrọ n’amaokwu a, nke sịrị: “Nye anyị nri anyị ga-eri taa dị ka ihe ga-ezuru anyị taa si dị.”—Luk 11:3; Ọma 72:16, 17; Aịza. 25:6-8.

Jehova Nwere Ike Dị Egwu

12. Olee otú o si bụrụ na e nyere ụmụ Izrel oge ochie “ihe nketa nke mba dị iche iche”?

12 “Ọ kọworo ndị ya banyere ike o ji rụọ ọrụ, site n’inye ha ihe nketa nke mba dị iche iche.” (Ọma 111:6) Otu n’ime ọrụ gbara ọkpụrụkpụ Jehova rụụrụ ụmụ Izrel, bụ́ nke nwere ike ịbụ ihe ọbụ abụ a na-ekwu maka ya, bụ otú Jehova si jiri ọrụ ebube napụta ha n’Ijipt. Mgbe Jehova mere ka ụmụ Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ, ha meriri alaeze ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan. (Gụọ Nehemaya 9:22-25.) N’eziokwu, Jehova nyere Izrel “ihe nketa nke mba dị iche iche.” Nke a gosiri na Chineke nwere ike dị ukwuu.

13, 14. (a) Olee ụzọ Chineke si gosi ndị Babịlọn ike ya, nke o nwere ike ịbụ ya ka otu ọbụ abụ na-ekwu okwu ya? (b) Olee nnapụta ndị ọzọ dị ukwuu Jehova napụtara ụmụ mmadụ?

13 Anyị ma nke ọma na n’agbanyeghị ihe niile Jehova meere ụmụ Izrel, ha akwanyeghịrị ya ùgwù, ha akwanyeghịrịkwa ndị nna nna ha bụ́ Ebreham, Aịzik, na Jekọb. Ha nọgidere na-enupụrụ Chineke isi ruo mgbe o ji ndị Babịlọn chụpụ ha n’ala ha, ha adọrọkwa ha n’agha. (2 Ihe 36:15-17; Nehe. 9:28-30) Ọ bụrụ na onye dere Abụ Ọma 111 dịrị ndụ mgbe ụmụ Izrel si Babịlọn lọta, dị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl na-ekwu, o nwere ezigbo ihe mere ọ ga-eji too Jehova maka ike ya, nakwa maka imezu ihe ndị o kwere ná nkwa. Chineke gosiri na ya dị ike ma na-eme ihe ndị o kwere ná nkwa mgbe ọ napụtara ndị Juu na Babịlọn, bụ́ alaeze ukwuu na-anaghị ahapụ ndị ha dọọrọ n’agha ka ha laa.—Aịza. 14:4, 17.

14 Mgbe ihe dị ka narị afọ ise gafere, Jehova ji ike ya mee ihe karịrị nke ahụ mgbe ọ napụtara ụmụ mmadụ ndị nwere nchegharị n’aka mmehie na ọnwụ. (Rom 5:12) Otu n’ime ihe nke a rụpụtara bụ na e mere ka otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ nwee ihe ùgwù nke ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst, bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. N’afọ 1919, Jehova ji ike ya napụta ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị ka nọ n’ụwa, n’agbụ okpukpe ụgha. O nweghị ihe ọzọ na-enyere ha aka ịrụzu ihe niile ha na-arụ n’oge ọgwụgwụ a ma e wezụga ike Chineke. Ọ bụrụ na ha ekwesị ntụkwasị obi ruo mgbe ha nwụrụ, ha ga-eso Jizọs Kraịst nọrọ n’eluigwe na-achị ụwa maka ọdịmma nke ndị nwere nchegharị. (Mkpu. 2:26, 27; 5:9, 10) Otú ha ga-esi keta ụwa ga-akarị nnọọ otú ụmụ Izrel oge ochie si keta ya.—Mat. 5:5.

Ụkpụrụ Ndị Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi, Bụ́ Ndị Anyị Kwesịrị Ịtụkwasị Obi

15, 16. (a) Olee ihe ndị so n’ọrụ aka Chineke? (b) Olee iwu dị iche iche Chineke nyere ụmụ Izrel oge ochie?

15 “Eziokwu na ikpe ziri ezi ka e ji mara ọrụ aka ya; iwu ya niile bụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi, ọ na-akwụsi ike ruo mgbe ebighị ebi, ruo mgbe niile ebighị ebi, a na-eji eziokwu na ịkwụwa aka ọtọ edebe ya.” (Ọma 111:7, 8) Mbadamba nkume abụọ, bụ́ ebe e dere iwu iri dị mkpa e nyere ụmụ Izrel, so ‘n’ọrụ aka Jehova.’ (Ọpụ. 31:18) Iwu iri a na iwu ndị ọzọ, bụ́ ndị dịkwa n’Iwu Mozis, hiwere isi n’ụkpụrụ dị iche iche na-adịru mgbe ebighị ebi, bụ́ ndị anyị kwesịrị ịtụkwasị obi.

16 Dị ka ihe atụ, otu n’ime iwu dị ná mbadamba nkume ndị ahụ sịrị: “Mụ onwe m bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.” O kwukwara na Jehova na-egosi “otu puku ọgbọ obiọma, ma ọ bụrụ ndị hụrụ [ya] n’anya ma na-edebe ihe [o] nyere n’iwu.” Iwu dị iche iche bara uru n’oge niile, ndị dị ka “sọpụrụ nna gị na nne gị” na “ezula ohi,” tinyere iwu amamihe dị na ya, nke na-ekwu ka ihe ndị ọzọ nwe ghara ịgụ mmadụ agụụ, dịcha ná mbadamba nkume ndị ahụ.—Ọpụ. 20:5, 6, 12, 15, 17.

Onye Mgbapụta Anyị nke Dị Nsọ, na Onye A Na-atụ Egwu

17. Olee ihe ndị mere ụmụ Izrel ji kwesị idebe aha Chineke nsọ?

17 “Ọ gbapụtawo ndị ya. O nyewo iwu ka ọgbụgba ndụ ya dịruo mgbe ebighị ebi. Aha ya dị nsọ, bụrụkwa ihe a na-atụ egwu.” (Ọma 111:9) O yikwara ka ihe ọbụ abụ a na-ekwu maka ya bụ mmezu Jehova na-emezu ọgbụgba ndụ ya na Ebreham gbara. Ọ bụ nke a mere na Jehova ahapụghị ndị ya mgbe ha bụ ndị ohu n’Ijipt nakwa mgbe a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn. Chineke napụtara ndị ya n’ebe abụọ a. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ụmụ Izrel gaara ejiri maka ihe abụọ a Chineke meere ha debe aha ya nsọ.—Gụọ Ọpụpụ 20:7; Ndị Rom 2:23, 24.

18. Olee ihe mere i ji chee na ọ bụ ihe ùgwù mmadụ ịbụ onye a kpọkwasịrị aha Chineke?

18 Ezigbo Ndị Kraịst taa, bụ́ ndị a napụtara n’aka mmehie na ọnwụ n’oge ha na-enweghị olileanya, kwesịkwara idebe aha Chineke nsọ. Anyị kwesịrị ime ike anyị niile iji mee ihe mbụ dị n’ekpere ahụ Jizọs kụziiri anyị. Ọ sịrị: “Ka e doo aha gị nsọ.” (Mat. 6:9) Ichebara aha ahụ dị ebube echiche kwesịrị ime ka anyị na-atụ egwu Chineke. Onye dere Abụ Ọma 111 ghọtara ihe bụ́ ịtụ egwu Chineke. Ọ sịrị: “Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite amamihe. Ndị niile na-edebe iwu ya nwere ezi nghọta.”Ọma 111:10.

19. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Ọ bụrụ na anyị na-atụ egwu ka anyị ghara imehie Chineke, anyị ga-akpọ ihe ọjọọ asị. Ọ ga-enyekwara anyị aka iṅomi àgwà dị iche iche magburu onwe ha Chineke nwere, ndị dị n’Abụ Ọma 112, bụ́ ebe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ. Ebe ahụ na-egosi otú anyị nwere ike isi ruo eru iso n’ọtụtụ nde mmadụ ga na-eto Chineke ruo mgbe ebighị ebi. O kwesịrị ka anyị na-eto ya ruo mgbe ebighị ebi. “Otuto ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”Ọma 111:10.

Ajụjụ Ndị Anyị Ga-echebara Echiche

• Gịnị mere Jehova ji kwesị ka anyị niile na-eto ya?

• Olee àgwà Jehova ndị anyị na-ahụ n’ọrụ ya?

• Olee ihe mere i ji chee na ọ bụ ihe ùgwù mmadụ ịbụ onye a kpọkwasịrị aha Chineke?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 20]

Isi ihe mere anyị ji ezukọ mgbe niile bụ ito Jehova

[Foto dị na peeji nke 23]

Iwu niile Jehova nyere hiwere isi n’ụkpụrụ dị iche iche na-adịru mgbe ebighị ebi, bụ́ ndị anyị kwesịrị ịtụkwasị obi