Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mmụọ Ozi Jehova Na-ama Ụlọikwuu Gburugburu Ndị Na-atụ Egwu Ya”

“Mmụọ Ozi Jehova Na-ama Ụlọikwuu Gburugburu Ndị Na-atụ Egwu Ya”

“Mmụọ Ozi Jehova Na-ama Ụlọikwuu Gburugburu Ndị Na-atụ Egwu Ya”

Dị ka Christabel Connell si kọọ

Anyị nọ na-aza ajụjụ ndị Christopher nọ na-ajụ anyị banyere Baịbụl nke na ọ dịghị onye n’ime anyị ma na chi ejimiela; anyị amaghịkwa na Christopher na-eme ya nọtụ, ya elee anya na windo. N’ikpeazụ, ọ gwara anyị, sị: “Lawanụ, nsogbu adịghịzi.” O wee duru anyị ruo n’ebe anyị dọwara ígwè anyị wee sị anyị, “ka chi foonụ.” Olee nsogbu ọ hụrụ?

AHA M bụ Christabel Earl mgbe m na-alụbeghị di. A mụrụ m na Sheffield, England, n’afọ 1927. A tụrụ bọmbụ n’ụlọ anyị mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. Ọ bụ ya mere e ji kpọga m n’ụlọ nne nne m ka m nọrọ ebe ahụ gụchaa akwụkwọ. Mgbe m na-aga akwụkwọ n’otu ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik, m nọgidere na-ajụ ndị nọn ihe mere ajọ omume na ime ihe ike ji jupụta ebe niile. Ma ha ma ndị okpukpe ndị ọzọ m jụrụ ajụjụ ahụ enweghị ike ịza m ihe juru m afọ.

M mụrụ ọrụ nọọsụ mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri. Akwagara m London wee malite ọrụ n’ụlọ ọgwụ General Hospital dị na Paddington. Ma, m chọpụtara na ime ihe ike ka njọ na London. M hụrụ otu ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ a nọ n’ihu ụlọ ọgwụ ahụ lụọ n’oge na-adịghị anya mgbe nwanne m nwoke nke tọrọ m gara Agha Korea. Ọ dịghị onye bịara nyere nwoke e merụrụ ahụ́ n’ọgụ ahụ aka, bụ́ onye e tikpọrọ anya abụọ. N’oge na-adịghị anya, mụ na mama m malitere ịga nzukọ ndị mgbaasị, ma nke a emeghị ka m mara ihe mere ajọ omume ji jupụta ebe niile.

A Gbara M Ume Ịmụ Baịbụl

Otu ụbọchị, nwanne m nwoke nke tọchara anyị, bụ́ John, onye bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, bịara leta m. Ọ jụrụ m, sị, “Ị̀ ma ihe mere ihe ọjọọ niile a ji na-eme?” M zara ya, sị, “Amaghị m.” Ya asapee Baịbụl ya gụọ Mkpughe 12:7-12. Mgbe ahụ ka m matara na ọ bụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya bụ ndị bụ́ isi kpatara nsogbu dị n’ụwa. M nabatara ihe o kwuru. N’oge na-adịghịkwa anya, m kwere ka a mụwara m Baịbụl. Ma, ịtụ mmadụ egwu mere ka m ghara ime baptizim n’oge ahụ.—Ilu 29:25.

Nwanne m nwaanyị, bụ́ Dorothy, bụkwa Onyeàmà. Mgbe ya na onye chọrọ ịlụ ya, bụ́ Bill Roberts, si mgbakọ mba niile e nwere na New York (n’afọ 1953) lọta, m gwara ha na o nwere onye mụụrụ m Baịbụl. Bill wee jụọ m, sị: “Ị̀ gụrụ amaokwu Akwụkwọ Nsọ niile dị n’akwụkwọ ahụ? Ị̀ kara azịza ndị dị n’akwụkwọ ahụ akara n’okpuru?” Mgbe m sịrị ya mba, ọ sịrị: “Ọ bụrụ otú ahụ, o nwebeghị ihe ị mụrụ! Gakwuru nwanna nwaanyị ahụ ka unu malite n’isi!” N’oge na-adịghị anya, ndị mmụọ ọjọọ malitere nyewe m nsogbu. M chetara mgbe m rịọrọ Jehova ka o chebe m ma napụta m n’aka ha.

Ịsụ Ụzọ na Scotland na Ireland

E mere m baptizim na January 16, n’afọ 1954. M kwụsịrị ịrụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ ahụ n’ọnwa May wee malite ịsụ ụzọ n’ọnwa June. Mgbe ọnwa asatọ gara, aghọrọ m ọsụ ụzọ pụrụ iche, e wee ziga m Grangemouth, Scotland. N’ime ime ebe ahụ m nọ na-eje ozi, m chọpụtara na ndị mmụọ ozi Jehova “na-ama ụlọikwuu gburugburu” m.—Ọma 34:7.

N’afọ 1956, e zigara m Ireland ka m malite ije ozi n’ebe ahụ. E zigara mụ na mmadụ abụọ ọzọ n’obodo a na-akpọ Galway. Anyị gara n’ụlọ otu ụkọchukwu n’ụbọchị mbụ m gara ozi ọma n’ebe ahụ. Ozugbo ahụ, onye uwe ojii bịara kpụrụ mụ na onye mụ na so na-aga ozi ọma, kpụga anyị n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Ozugbo ọ matara aha anyị na ebe anyị bi, ọ kpọrọ otu onye na fon. Anyị nụrụ mgbe ọ sịrị, “Ee, Fada, m ma kpọmkwem ebe ha bi.” Ọ bụ ụkọchukwu ahụ gwara ya ka ọ bịa kpụrụ anyị! A gwara onye anyị bi n’ụlọ ya ka ọ sị anyị kwapụ. Nke a mere ka alaka ụlọ ọrụ gwa anyị ka anyị kwapụ n’ókèala ahụ. Anyị rutere n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị n’ebe ahụ mgbe nkeji iri gaferela oge ụgbọ kwesịrị ịpụ. Ma, ụgbọ ahụ ka kwụ ebe ahụ, otu nwoke nọkwa n’ebe ahụ iji hụ na anyị bara na ya. Ihe anyị nọrọ na Galway bụ naanị izu atọ!

E zigara anyị Limerick, bụ́ obodo ọzọ ebe Chọọchị Katọlik na-akpa ike. Ndị mmadụ na-atụ anyị ụzụ mgbe niile. Ụjọ na-atụ ọtụtụ ndị ịnabata anyị n’ụlọ ha. Otu afọ tupu mgbe ahụ, e tiri otu nwanna nwoke ihe n’otu obere obodo dị anyị nso a na-akpọ Cloonlara. Ya mere, obi dị anyị ụtọ ịhụ Christopher, bụ́ onye m kwuru okwu ya ná mmalite. Ọ gwara anyị ka anyị bịaghachi n’ụlọ ya iji zaa ya ajụjụ ndị ọ jụrụ banyere ihe ndị dị na Baịbụl. Mgbe anyị bịaghachiri, otu ụkọchukwu batara wee gwa Christopher ka ọ sị anyị lawa. Christopher jụrụ, wee sị ya: “Ọ bụ m gwara ụmụ nwaanyị a ka ha bịa, ha kụkwara aka n’ụzọ tupu ha abata. Ọ dịghị onye kpọrọ gị ebe a, ị kụghịkwa aka n’ụzọ wee bata.” Ụkọchukwu ahụ ejiri iwe pụọ.

Anyị amaghị na ụkọchukwu ahụ agaala kpọkọọ ụmụ nwoke, ha anọrọ n’èzí na-eche mgbe anyị ga-apụta n’ụlọ Christopher. Christopher ma na ha nwere ike imerụ anyị ahụ́, ọ bụ ya mere o ji mee ihe ahụ m kwuru ná mmalite. Ọ hapụrụ anyị ka anyị nọrọ n’ụlọ ya ruo mgbe ha lasara. Anyị mechara nụ na a manyere ya na ezinụlọ ya ịkwapụ n’ebe ahụ, ha ewee kwaga England.

A Kpọrọ M Ịbịa Gilead

M nọ na-eme atụmatụ ịga Mgbakọ Mba Niile nke e nwere n’afọ 1958, nke isiokwu ya bụ “Ime Uche Chineke,” mgbe m natara akwụkwọ e ji gwa m na m ga-agụ akwụkwọ na klas nke iri atọ na atọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Kama ịlọtawa ụlọ mgbe mgbakọ ahụ gachara, amalitere m ije ozi na Collingwood, Ontario, Canada, ruo mgbe Ụlọ Akwụkwọ Gilead ga-amalite n’afọ 1959. Ma, mụ na Eric Connell matara ná mgbakọ ahụ. Ọ natara eziokwu n’afọ 1957 ma malite ịsụ ụzọ n’afọ 1958. Mgbe mgbakọ ahụ gachara, ọ na-edetara m akwụkwọ ozi kwa ụbọchị mgbe m nọ Canada nakwa n’oge niile ahụ m nọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead. M nọ na-eche ihe anyị ga-eme ma m gụchaa akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead.

Ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead bụ oké ihe mere ná ndụ m. Mụ na Dorothy na di ya gụrụ akwụkwọ n’otu klas ahụ. E zigara ha ije ozi na Portugal. Ọ tụrụ m n’anya mgbe a gwara m na m ga-aga Ireland. Obi adịghị m mma na mụ na nwanne m nwaanyị agaghị aga otu ebe. M jụrụ otu n’ime ndị nkụzi anyị ma ò nwere ihe ọjọọ m mere. Ọ sịrị: “O nweghị ihe ọjọọ i mere. Gị na Eileen Mahoney kwetara na unu ga-aga ebe ọ bụla e zigara unu n’ụwa.” Ireland bụ otu n’ime ebe ndị ahụ.

M Lọghachiri Ireland

M lọghachiri Ireland n’August afọ 1959. E zigara m n’Ọgbakọ Dun Laoghaire. N’oge ahụ, Eric lọtara n’England, obi dịkwa ya ụtọ na m nọzi nso. Ya onwe ya chọkwara ịbụ onye ozi ala ọzọ. O kwuru na ebe ọ bụ na a na-ezite ndị ozi ala ọzọ na Ireland, na ya ga-anọ ebe ahụ na-asụ ụzọ. O wee kwata na Dun Laoghaire, anyị alụọ n’afọ 1961.

Ka ọnwa isii gafere, Eric ji ọgba tum tum nwee ajọ ihe mberede. Isi ya kụwara, ndị dọkịta amaghịkwa ma ọ̀ ga-adị ndụ. Ọ nọrọ izu atọ n’ụlọ ọgwụ, mụ akpọlata ya wee nọrọ n’ụlọ na-elekọta ya ruo mgbe ọ gbakere ka ọnwa ise gafere. M nọgidere na-eje ozi ọma otú ike kwere m.

N’afọ 1965, e zigara anyị n’otu ọgbakọ nke ndị nkwusa asatọ nọ, nke dị na Sligo, bụ́ ọdụ ụgbọ mmiri nke dị n’ụsọ oké osimiri, n’ebe ugwu Ireland. Mgbe afọ atọ gachara, anyị gafere n’otu obere ọgbakọ ọzọ dị na Londonderry, n’ime ime ebe ugwu Ireland. Anyị lọtara ozi ọma otu ụbọchị wee hụ na e ji bab waya gbachie okporo ụzọ e si abanye ebe anyị bi. Ọ bụ mgbe ahụ ka nsogbu dị na Northern Ireland malitere. Ndị ntorobịa nọ na-agba ụgbọala ndị mmadụ ọkụ. E kewara Londonderry abụọ, otu bụ nke ndị Protestant, nke ọzọ abụrụ nke ndị Katọlik. Onye ọ bụla chọrọ isi n’otu mpaghara gaa ná mpaghara nke ọzọ na-etinye onwe ya ná nsogbu.

Anyị Nọgidere Na-ekwusa Ozi Ọma n’Oge Nsogbu

Ma, anyị nọ na-ekwusa ozi ọma n’ebe niile. Ọ dị anyị ọzọ ka ndị mmụọ ozi hà mara ụlọikwuu gburugburu anyị. Ọ bụrụ na ọgba aghara amalite n’ebe ọ bụla anyị nọ ozi ọma, anyị na-ahapụ ebe ahụ ozugbo, ihe jụọ oyi anyị agaghachi. Ọ dị otu mgbe e nwere ọgba aghara n’ebe dị nso n’ebe anyị bi, otu ihe nke nọ na-agba ọkụ si n’ebe a na-ere ágbá nke dị nso n’ụlọ anyị daa na windo anyị. Anyị ehighị ụra n’abalị ahụ n’ihi na anyị chere na ọkụ ga-agba ụlọ anyị. Mgbe anyị kwagara Belfast n’afọ 1970, anyị nụrụ na bọmbụ a tụrụ n’ebe ahụ a na-ere ágbá gbara ebe ahụ ọkụ nakwa na ụlọ ahụ anyị bi mgbe ahụ gbakwuru ọkụ.

E nwere ụbọchị ọzọ mụ na otu nwanna nwaanyị nọ ozi ọma, anyị hụrụ otu mkpirikpi paịpụ anyị na-ahụtụbeghị ụdị ya ka ọ tọgbọ na windo. Anyị leghaara ya anya gawa ebe anyị na-aga. Ọ gbawara mgbe nkeji ole na ole gafere. Ndị gbapụtaranụ chere na ọ bụ anyị tụrụ bọmbụ ahụ! Otu nwanna nwaanyị bi nso ebe ahụ kpọọrọ anyị gaa n’ụlọ ya. Mgbe ndị agbata obi ya hụrụ na ọ nabatara anyị, ha kwetara na aka anyị dị ọcha.

N’afọ 1971, anyị gara ịhụ otu nwanna nwaanyị na Londonderry. Mgbe anyị gwara ya ụzọ anyị si bịa na ebe a na-eche nche anyị hụrụ n’ụzọ, ọ jụrụ anyị, sị, “Ọ̀ bụ na ndị nche anọghị n’ebe ahụ?” O juru ya anya mgbe anyị sịrị ya na ha nọ ya, kama na ha hapụrụ anyị, anyị agafee. N’ihi gịnị ka o ji ju ya anya? Ọ bụ n’ihi na tupu ụbọchị ahụ, a nọ ebe ahụ nara otu dọkịta na otu onye uwe ojii ụgbọala ha, gbaakwa ụgbọala ndị ahụ ọkụ.

Anyị kwagara Cork n’afọ 1972. Ka oge na-aga, anyị jere ozi na Naas, mechaakwa kwaga Arklow. N’ikpeazụ, n’afọ 1987, e zigara anyị Castlebar, bụ́ ebe anyị nọ ugbu a. N’ebe a, anyị nwere ihe ùgwù magburu onwe ya nke iso wuo otu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Eric rịasiri ọrịa ike n’afọ 1999. Ma, Jehova na ụmụnna nọ n’ọgbakọ anyị nyeere m aka, mụ ejisie ike lekọta ya ruo mgbe ọ gbakere.

Mụ na Eric agaala Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ ugboro abụọ. Ọ ka bụ okenye ọgbakọ. Ogbu na nkwonkwo na-enyesi m nsogbu ike nke mere ka a gbanwee ọkpụkpụ úkwù m na ọkpụkpụ ikpere ụkwụ m abụọ. Ọ bụ ezie na m nwetara mkpagbu siri ike n’ihi okpukpe m, jeekwa ozi n’oge e nwere ọgba aghara, ma ihe kacha enye m nsogbu bụ nkwụsị m kwụsịrị ịnya ụgbọala. O siiri m ike n’ihi na anaghịzi m enwe ike ịpụ mgbe m chọrọ ịpụ. Ndị ọgbakọ anyị na-enyere anyị aka nke ukwuu. M na-eji mkpara agagharị. M na-ejikwa ọgba tum tum nwere ụkwụ atọ aga ebe ndị dị anya.

A gbakọọ afọ ole mụ na Eric jirila rụọ ọrụ ịsụ ụzọ pụrụ iche, ọ karịrị otu narị afọ. Anyị ji afọ iri itoolu na asatọ n’ime ya jee ozi na Ireland ebe a. Obi anyị abụghị ịla ezumike nká. Anyị anaghị atụ anya na Jehova ga na-arụrụ anyị ọrụ ebube, ma anyị kweere na ndị mmụọ ozi ya dị ike “na-ama ụlọikwuu gburugburu” ndị na-atụ egwu ya, bụ́ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi.