Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú I Nwere Ike Isi Nọgide Na-ekwusa Ozi Ọma?

Olee Otú I Nwere Ike Isi Nọgide Na-ekwusa Ozi Ọma?

Olee Otú I Nwere Ike Isi Nọgide Na-ekwusa Ozi Ọma?

Ò NWEELA mgbe obi dara gị mbà, gị achọọ ịkwụsị ikwusa ozi ọma? Mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ, nchegbu, ọrịa, na nsogbu ndị ọgbọ, nwere ike ime ka o siere anyị ike ikwusa ozi ọma. Ike nwekwara ike ịgwụ anyị ma ọ bụrụ na ndị mmadụ anaghị anabata ozi ọma. Ma, chebara ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ echiche. O diri ọnwụnwa ndị kacha taa akpụ “n’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya.” (Hib. 12:2) Ọ ma na ọ bụrụ na ya emee ihe gosiri na ebubo ndị e boro Chineke bụ okpotokpo ụgha na ya ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.

Ọ bụrụ na ị nọgide na-ekwusa ozi ọma, ị ga-emekwa ka obi Jehova ṅụrịa. Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na o yie ka è nwere ihe ndị na-eme ka ike ikwusa ozi ọma na-agwụ gị? Krystyna, bụ́ onye merela okenye ma na-arịa ọrịa, kwuru, sị: “Ike na-agwụkarị m, obi na-adakarịkwa m mbà. Nsogbu ndị ya na nká so aga, dị ka ọrịa na nchegbu ndị m na-enwe kwa ụbọchị, na-eme ka m ghara inwe mmasị ịga ozi ọma mgbe ụfọdụ.” Olee otú ị ga-esi nọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị ụdị nsogbu ndị a e kwuru okwu ha?

Ṅomie Ndị Amụma

Ka ndị nkwusa Alaeze kwesịrị ntụkwasị obi wee nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma, ha kwesịrị inwe ụdị echiche ndị amụma nwere n’oge ochie. Were Jeremaya dị ka ihe atụ. Mgbe Chineke gwara ya ka ọ bụrụ onye amụma, obi esichaghị ya ike. Ma, Jeremaya nọgidere na-arụ ọrụ ahụ siri ike ruo ihe karịrị afọ iri anọ n’ihi na ọ tụkwasịrị Chineke obi ya niile.—Jer. 1:6; 20:7-11.

Akụkọ banyere Jeremaya gbara Henryk ume. Ọ sịrị: “N’ime ihe karịrị afọ iri asaa m jerela ozi ọma, o nwere oge ndị m dara mbà n’obi n’ihi ihe ndị mmadụ mere m, otú ha si emegide m, ma ọ bụkwanụ n’ihi mmasị ha na-enweghị n’ozi ọma. N’oge ndị ahụ, m na-echeta Jeremaya. Ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ na adịm ná mma ya na Jehova mere ka o nwee ike ịnọgide na-ebu amụma.” (Jer. 1:17) Akụkọ banyere Jeremaya gbakwara Rafał ume. Ọ sịrị: “Jeremaya tụkwasịrị Chineke obi kama ịnọ na-echegbu onwe ya banyere nsogbu ya. Ọ nọgidere na-eje ozi n’atụghị egwu, n’agbanyeghị na o nwere ọtụtụ ndị iro. M na-echeta nke a mgbe niile.”

Onye amụma ọzọ ndụ ya merela ka ọtụtụ ndị nọgide na-ekwusa ozi ọma bụ Aịzaya. Chineke gwara ya na ndị obodo ya agaghị ege ya ntị. Jehova sịrị: “Mee ka obi ndị a ghara ịnabata ihe, meekwa ka ntị ha kpọchie akpọchie.” Nke a ọ̀ pụtara na ihe agaghị agara Aịzaya nke ọma? Ọ bụghị otú ahụ ka Chineke si lee ya anya. Mgbe Chineke chọrọ ka Aịzaya bụrụ onye amụma, Aịzaya sịrị: “Lee m! Ziga m.” (Aịza. 6:8-10) Aịzaya nọgidere na-eje ozi ya. Ị̀ na-anọgide na-ekwusa ozi ọma a gwara anyị ka anyị na-ekwusa?

Ka anyị wee nwee ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na e nwere ndị na-anaghị enwe mmasị n’ozi ọma anyị, anyị kwesịrị ime ka Aịzaya, ya bụ, anyị ekwesịghị ichegbu onwe anyị banyere ndị na-anaghị anabata ozi ọma. Rafał kwuru otú o si merie nkụda mmụọ ọ na-enwe. Ọ sịrị: “M na-agbalị ka m ghara ichegbu onwe m banyere okwu ọjọọ ndị mmadụ na-agwa m n’ozi ọma. Ndị bi n’ókèala m nweere onwe ha ịnabata ozi ọma m na-ezi ha ma ọ bụ jụ ya.” Anna kwukwara, sị: “M na-agbalị ka m ghara iche banyere ihe ọ bụla nwere ike ịkụda m mmụọ. Ihe ndị na-enyere m aka ime nke a bụ na m na-ekpe ekpere ma na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị tupu mụ agawa ozi ọma. Ihe ọ bụla na-akụda mmụọ na-apụ m n’uche ozugbo.”

Ezikiel onye amụma jere ozi n’etiti ndị Juu dị isi ike nọ na Babịlọn, bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha laa. (Ezik. 2:6) A sị na Ezikiel onye amụma ezighị ndị ahụ ozi Chineke sịrị ka o zie ha, onye ajọ omume anwụọkwa n’anụghị ịdọ aka ná ntị ahụ, ọbara onye ahụ gaara adị ya n’isi. Jehova gwara Ezikiel, sị: “N’aka gị ka m ga-ajụta ọbara ya.”—Ezik. 3:17, 18.

Henryk gbara mbọ ime ka Ezikiel. Ọ sịrị: “Achọrọ m ka aka m dị ọcha n’ebe ọbara ndị mmadụ dị. Ọtụtụ mmadụ, bụ́ ndị ndụ ha dị oké ọnụ ahịa, ga-anwụ ma á maghị ihe e mere.” (Ọrụ 20:26, 27) Ọ dịkwa Zbigniew otú a ọ dị Henryk. Ọ sịrị: “Ezikiel nọgidere na-eje ozi ya n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ na-eche. Nke a emeela ka m na-ele ije ozi ọma anya otú Onye kere anyị si ele ya anya.”

Ọ Bụghị Naanị Gị Na-arụ Ya

Ọ bụghị naanị gị na-arụ ọrụ ikwusa ozi ọma. Anyị nwere ike ikwu dị ka Pọl onyeozi kwuru, sị: “Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9) Krystyna, bụ́ onye kwuru na ya na-ada mbà n’obi mgbe ụfọdụ, sịrị: “Ọ bụ nke a mere m ji na-arịọ Jehova ka o nye m ume. Ọ na-enye m ume mgbe niile.” N’eziokwu, mmụọ Chineke dị anyị mkpa ka anyị wee nọgide na-ekwusa ozi ọma!—Zek. 4:6.

Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, mmụọ nsọ na-emekwa ka anyị na-akpa àgwà ndị so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Gal. 5:22, 23) Nke a na-emekwa ka anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. Henryk kwuru, sị: “Ikwusa ozi ọma na-eme ka àgwà m na-aka mma. O meela ka m mụta inwe ndidi na ichebara ndị ọzọ echiche, meekwa ka m ghara ịna-enwe nkụda mmụọ ngwa ngwa.” Ịnọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị nsogbu ndị ị na-enwe ga-eme ka i nwee ike inwekwu mkpụrụ nke mmụọ nsọ n’ụba.

Jehova ji ndị mmụọ ozi ya na-eduzi ọrụ a pụrụ iche. (Mkpu. 14:6) Baịbụl kwuru na e nwere “iri puku kwuru iri puku, na puku kwuru puku” ndị mmụọ ozi. (Mkpu. 5:11) Jizọs na-edunye ndị mmụọ ozi ka ha nyere ndị ohu Chineke nọ n’ụwa aka. Ị̀ na-echeta nke a mgbe ọ bụla ị nọ n’ozi ọma?

Anna kwuru, sị: “Icheta na ndị mmụọ ozi na-anọnyere anyị mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma na-agba m ume. Ndunye Jehova na Jizọs na-edunye ha inyere anyị aka dị ezigbo mkpa.” Iso ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi na-arụkọ ọrụ bụ ihe ùgwù pụrụ iche.

Olee otú iso ndị nkwusa Alaeze ibe anyị na-ekwusa ozi ọma ga-esi mee ka anyị ghara ịda mbà? Anyị bụ ndị a gọziri agọzi n’ihi na anyị nwere ọtụtụ Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi. O doro anya na ị chọpụtala na ihe a akwụkwọ Ilu kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ọ bụ ígwè ka a na-eji amụcha ígwè. Otú ahụ ka ihu mmadụ na-amụcha ihu mmadụ ibe ya.”—Ilu 27:17.

Ọ bụrụ na anyị na ndị ọzọ na-agakọ ozi ọma, anyị ga-amụta ụzọ ọhụrụ dị iche iche ka mma anyị ga-esi na-ekwusa ozi ọma. Elżbieta kwuru, sị, “Iso ndị nkwusa dị iche iche na-aga ozi ọma emeela ka m hụ ụmụnna m n’anya, meekwa ka m hụ ndị anyị na-ezi ozi ọma n’anya.” Gbalịa ka gị na ndị nkwusa dị iche iche na-agakọ ozi ọma. Ọ ga-eme ka ozi ọma gị na-atọ gị ụtọ.

Na-elekọta Onwe Gị nke Ọma

Ka anyị wee nwee ike ịnọgide na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, anyị aghaghị ịhazi ihe anyị na-eme ahazi, na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye mgbe niile, ma na-ezu ike nke ọma. Ya bụ na anyị kwesịrị ilekọta onwe anyị, ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ anụ ahụ́.

Baịbụl kwuru, sị: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru.” (Ilu 21:5) Zygmunt, bụ́ onye dị afọ iri asatọ na asatọ ugbu a, kwuru, sị: “Ịhazi ozi m ahazi na-eme ka ọ na-aga nke ọma. M na-ahazi oge m nke ọma ka m wee nwee oge buru ibu m ga-eji na-ekwusa ozi ọma.”

Ịmụ Akwụkwọ Nsọ nke ọma na-ewusi anyị ike ma na-eme ka anyị jikere nke ọma maka ozi anyị. Otú ahụ anyị si eri nri iji dịrị ndụ, anyị kwesịkwara ịnọgide na-eri nri ime mmụọ ka anyị wee nọgide na-ekwusa ozi ọma. Ịmụ Okwu Chineke kwa ụbọchị na iri nri ime mmụọ “n’oge kwesịrị ekwesị” ga-eme ka anyị nwee ume anyị ga-eji na-ekwusa ozi ọma.—Mat. 24:45-47.

Elżbieta gbanwere ihe ụfọdụ ọ na-eme ná ndụ ka o wee nwee ike ime ka ozi ya ka mma. Ọ sịrị: “M gbubilatara nnọọ oge m na-eji ekiri televishọn ka m wee nwekwuo oge m ga-eji na-akwadebe maka ozi. Mgbe ọ bụla m na-agụ Baịbụl ná mgbede, m na-echeta ndị m ziri ozi ọma. M na-achọta amaokwu Baịbụl na isiokwu ndị ga-enyere ha aka.”

Izu ike nke ọma ga-eme ka i nwee ume, ọ ga-emekwa ka ị na-ejechi ozi ọma anya. Ma, ịtụrụ ndụ gabiga ókè nwere ike ime ka ị ghara iji izi ozi ọma kpọrọ ihe. Andrzej, bụ́ onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anaghị ezu ike nke ọma, ike ga na-agwụ onye ahụ nke ukwuu, nke a ga-emekwa ka ọ malite ịda mbà n’obi. M na-eme ihe niile m nwere ike ime iji hụ na nke a emeghị m.”—Ekli. 4:6.

N’agbanyeghị mgbalị niile anyị na-eme, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-anabata ozi ọma anyị na-ezi. Ma, Jehova agaghị echefu ọrụ anyị na-arụ. (Hib. 6:10) A sịgodị na ọtụtụ ndị achọghị ka anyị zie ha ozi ọma, ha nwere ike ikwu banyere ọbịbịa anyị bịara n’ụlọ ha mgbe anyị lara. O yiri ihe ahụ anyị na-agụ banyere Ezikiel: Ndị mmadụ ‘ga-ama na onye amụma nọrọ n’etiti ha.’ (Ezik. 2:5) N’eziokwu, ikwusa ozi ọma adịghị mfe, ma, anyị na-erite uru dị ukwuu na ya, ndị gere anyị ntị ga-eritekwa uru.

Zygmunt kwuru, sị: “Ikwusa ozi ọma na-eme ka anyị yikwasị mmadụ ọhụrụ, na-emekwa ka anyị gosi na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya.” Andrzej kwukwara, sị: “Ọ bụ ihe ùgwù iso na-arụ ọrụ a na-azọpụta ndụ. Ọ dịghị mgbe a ga-ekwusaru ya otú a na-ekwusa ya taa. Ọ bụrụ na ị nọgide na-ekwusa ozi ọma n’oge a, ị ga-enwetakwa ọtụtụ ngọzi.—2 Kọr. 4:1, 2.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Ọ bụrụ na anyị na-elekọta onwe anyị n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ anụ ahụ́, anyị ga-enwe ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma