Ì Chetara?
Ì Chetara?
Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Legodị ma ị ga-azali ajụjụ ndị a na-esonụ:
• Gịnị mere o ji dị nnọọ mkpa ka anyị na-eguzosi ike n’ezi ihe?
Iguzosi ike n’ezi ihe ga-eme ka anyị jiri ịhụnanya na-akwado ọbụbụeze Jehova ma gosi na Setan bụ onye ụgha. Anyị iguzosi ike n’ezi ihe bụkwa ihe Chineke nwere ike ilekwasị anya wee kpee anyị ikpe, ya mere, ọ dị anyị mkpa n’ihi na ọ ga-eme ka anyị nwee olileanya maka ọdịnihu.—12/15, peeji nke 4-6.
• Olee utu aha ụfọdụ Jizọs nwere, bụ́ ndị na-egosi ọrụ ọ na-arụ iji mezuo nzube Chineke?
Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya. Okwu ahụ. Amen ahụ. Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ. Nnukwu Onye Nchụàjà. Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa.—12/15, peeji nke 15.
• Gịnị mere ọgwụgwa Ịlaịja gwara onye na-ejere ya ozi ka ọ gaa lee anya n’oké osimiri mgbe Ịlaịja na-ekpe ekpere ka mmiri zoo ji bụrụ ihe anyị ga-ahụwa ama? (1 Eze 18:43-45)
Ịlaịja gosiri na ya ma otú mmiri ozuzo si abịa. Ikuku na-eburu mmiri ahụ nke si n’oké osimiri, bụ́ nke rujuru n’ìgwè, buga n’ebe ọ ga-anọ zoo.—1/1, peeji nke 15-16.
• Olee otú anyị nwere ike isi nwekwuo ọṅụ n’ozi ọma?
Anyị kwesịrị ịkwadebe obi anyị, ma lekwasị anya n’otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka. Anyị kwesịrị ikwusa ozi ọma ma buru n’obi na anyị ga-amalite ọmụmụ Baịbụl. Ọ bụrụ na ndị nọ n’ókèala anyị anaghị enwe mmasị n’ozi anyị, anyị nwere ike ikwu ihe ga-eme ka ha nwee mmasị ige anyị ntị.—1/15, peeji nke 8-10.
• Ekpenta e kwuru okwu ya na Baịbụl ọ̀ bụ ụdị nke na-arịa ndị mmadụ taa?
N’oge ochie, ndị mmadụ na-arịa ọrịa nje na-akpata, nke a na-akpọ ekpenta. (Lev. 13:4, 5) Baịbụl kwukwara banyere ekpenta na-apụta n’uwe nakwa n’ụlọ. “Ekpenta” ahụ nwere ike ịbụ ebù. (Lev. 13:47-52)—2/1, peeji nke 19.
• Olee otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi enyere Onye Kraịst aka ịma ihe o kwesịrị ime banyere ili ozu?
N’agbanyeghị na Onye Kraịst nwere ike ibe ákwá mgbe onye ọ hụrụ n’anya nwụrụ, ọ ma na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla. A sịgodị na ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova akọchaa ya, ọ gaghị eme omenala na-akwado nkwenkwe bụ́ na ndị nwụrụ anwụ nwere ike imerụ ndị dị ndụ ahụ́ ma ọ bụ nyere ha aka. Iji zere nsogbu, ụfọdụ Ndị Kraịst na-ebu ụzọ dee otú ha chọrọ ka e si lie ha n’akwụkwọ.—2/15, peeji nke 29-31.
• Dị ka Abụ Ọma 1:1 kwuru, olee ihe atọ anyị kwesịrị izere ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe obi ụtọ?
Amaokwu ahụ kwuru banyere “ndụmọdụ ndị ajọ omume,” “ụzọ ndị mmehie,” nakwa ‘etiti ndị na-akwa emo.’ N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe obi ụtọ, anyị kwesịrị izere ndị na-akwa iwu Chineke emo ma na-eleghara ya anya. Kama anyị na ha ịna-akpakọrịta, iwu Jehova kwesịrị ịna-atọ anyị ụtọ.—3/1, peeji nke 17.
• ‘Akwụkwọ Jesha’ na ‘akwụkwọ Agha Jehova,’ hà so n’akwụkwọ ndị dị na Baịbụl, ma mechaa fuo? (Jọsh. 10:13; Ọnụ Ọgụ. 21:14)
Mba. Ọ dị ka hà bụ akwụkwọ na-esighị n’ike mmụọ nsọ, ndị dị n’oge a na-ede Baịbụl, bụ́ ndị ndị dere Baịbụl kpọrọ aha.—3/15, peeji nke 32.
• Olee ihe gbara ọkpụrụkpụ a gbanwere na Baịbụl a sụgharịrị na Latịn n’oge a?
N’afọ 1979, Pope John Paul nke Abụọ nabatara Nova Vulgata, bụ́ Baịbụl ọhụrụ a sụgharịrị n’asụsụ Latịn. Ná mbipụta nke mbụ ya, aha Chineke, bụ́ Iahveh, dị n’ebe ụfọdụ. (Ọpụ. 3:15; 6:3) Ma, n’afọ 1986, mgbe e bipụtara mbipụta nke abụọ ya, e ji okwu bụ́ Dominus [ya bụ, Onyenwe Anyị] dochie ebe ndị e dere Iahveh.—4/1, peeji nke 22.